Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Luk 1:1-24:53
  • Luk

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Luk
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Luk

OZI ỌMA LUK DERE

1 Ọtụtụ ndị edeela ihe ndị mere eme anyị kweere na ha bụ eziokwu.+ 2 Ndị ọzọ, ndị ji anya ha hụ ihe ndị a+ ma kwusaa ozi Chineke,+ gwara anyị ha. 3 N’ihi ya, Tiofilọs+ onye ukwu, enyochaala m ihe ndị a niile, kpebiekwa idetara gị ha n’usoro ha si mee, 4 ka obi wee sie gị ezigbo ike na ihe niile a kụziiri gị bụ eziokwu.+

5 N’oge Herọd*+ bụ eze Judia, e nwere otu onye nchụàjà aha ya bụ Zekaraya nke so n’òtù ndị nchụàjà a na-akpọ Abaịja.+ Nwunye ya si n’ezinụlọ Erọn. Aha ya bụ Elizabet. 6 Ha abụọ bụ ndị ezi omume n’anya Chineke. Ha na-edebe iwu Jehova* na ntụziaka ya niile n’enweghị ntụpọ. 7 Ma ha amụtaghị nwa, n’ihi na Elizabet bụ nwaanyị aga. Ha abụọ emeekwala agadi.

8 Ka Zekaraya onye nchụàjà nọ na-arụ ọrụ ya n’oge ndị òtù ya ketara ije ozi+ n’ihu Chineke, 9 dị ka ndị nchụàjà na-eme, o ruuru ya ịmụnye insens* ọkụ+ mgbe ọ banyere n’ụlọ nsọ Jehova.*+ 10 Ìgwè mmadụ nọkwa na-ekpe ekpere n’èzí n’oge e ji amụnye insens* ọkụ. 11 Mmụọ ozi Jehova* pụtara n’ihu ya guzoro n’aka nri ebe ịchụàjà insens.* 12 Ma ihe Zekaraya hụrụ mapụrụ ya obi, ezigbo ụjọ ejide ya. 13 Ma, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Zekaraya, atụla egwu, n’ihi na a nụla arịrịọ ị na-arịọ. Elizabet nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Jọn.+ 14 Ị ga-enwekwa ọṅụ na ezigbo obi ụtọ. Ọtụtụ ndị ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi na a mụrụ ya.+ 15 N’ihi na ọ ga-abụ onye ukwu n’anya Jehova.*+ Ma, ọ gaghị aṅụ mmanya ma ọ bụ ihe ọ bụla na-aba n’anya.+ Chineke ga-enyekwa ya mmụọ nsọ malite mgbe ọ ka nọ n’afọ nne ya.+ 16 Ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị Izrel laghachikwuru Jehova* bụ́ Chineke ha.+ 17 Chineke ga-emekwa ka nwa gị jiri ụdị obi na ike Ịlaịja nwere butere ya ụzọ,+ iji mee ka obi ndị nna dịrị ka nke ụmụ,*+ meekwa ka ndị na-enupụ isi kpawa àgwà ka ndị ma ihe na ndị ezi omume, iji kwadebere Jehova* otu ndị.”+

18 Zekaraya wee gwa mmụọ ozi ahụ, sị: “Olee otú m ga-esi mara na ihe a ga-eme? N’ihi na akaala m nká, nwunye m emeekwala agadi.” 19 Mmụọ ozi ahụ wee sị ya: “Abụ m Gebriel,+ onye na-eguzo n’ihu Chineke.+ E zitere m ka m gwa gị okwu ma zie gị ozi ọma a. 20 Ma, ị ga-ada ogbi, ị gaghịkwa ekwu okwu ruo ụbọchị ihe ndị a ga-eme, n’ihi na i kweghị ihe m kwuru nke ga-emezu mgbe oge ya ruru.” 21 Ka nke a na-eme, mmadụ niile nọ na-eche Zekaraya, o jukwara ha anya na ọ nọrọ ọdụ n’ụlọ nsọ ahụ. 22 Mgbe ọ pụtara, o nweghị ike ịgwa ha okwu. O jizi aka na-agwa ha okwu n’ihi na ọ daala ogbi. Mgbe ha hụrụ ihe a, ha ghọtara na ọ hụrụ ihe dị ebube* n’ụlọ nsọ ahụ. 23 Ma, mgbe ụbọchị o ji eje ozi dị nsọ* zuru, ọ lara n’ụlọ ya.

24 Ka ụbọchị ole na ole gara, Elizabet nwunye ya bịara dịrị ime, wee nọrọ n’ụlọ ọnwa ise n’apụtaghị apụta. Ọ sịrị: 25 “Nke a bụ otú Jehova* si mesoo m. O cheela ihu ebe m nọ iji wepụ nkọcha ndị mmadụ na-akọcha m.”+

26 Mgbe ime ya ruru ọnwa isii, Chineke zipụrụ mmụọ ozi Gebriel+ ka ọ gaa Nazaret nke dị na Galili, 27 gakwuru nwa agbọghọ na-amaghị nwoke+ nke otu nwoke aha ya bụ Josef kwere nkwa ịlụ. Nwoke a si n’ezinụlọ Devid. Aha nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke bụ Meri.+ 28 Mgbe mmụọ ozi ahụ ruru, ọ sịrị ya: “Ndeewo, onye e meere amara dị ukwuu. Jehova* nọnyeere gị.” 29 Ma ihe o kwuru gbara ya gharịị, ya ana-achọ ịghọta ihe mere o ji si otú ahụ kelee ya. 30 N’ihi ya, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Meri, atụla egwu, n’ihi na Chineke emeerela gị amara. 31 Ị ga-adị ime, mụọ nwa nwoke.+ Ị ga-agụkwa ya Jizọs.+ 32 Onye a ga-abụ onye ukwu,+ a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kacha Elu.+ Jehova* bụ́ Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya bụ́ Devid.+ 33 Ọ ga-achị ezinụlọ Jekọb ruo mgbe ebighị ebi, Alaeze ya agaghịkwa agwụ agwụ.”+

34 Ma Meri sịrị mmụọ ozi ahụ: “Olee otú ihe a ga-esi mee, ebe ọ bụ na mụ na nwoke ọ bụla enwetụbeghị mmekọahụ?”+ 35 Mmụọ ozi ahụ asị ya: “Mmụọ nsọ ga-arụ ọrụ n’ime gị,+ ike nke Onye Kacha Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi ya kwa, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ,+ Ọkpara Chineke.+ 36 Elizabet onye ikwu gị, onye a sị na ọ bụ nwaanyị aga, adịla ime nwa nwoke n’agadi ya. Nke a bụkwa ọnwa isii ya. 37 N’ihi na o nweghị ihe Chineke kwuru nke ọ na-agaghị emeli.”+ 38 Meri wee sị: “Abụ m ohu Jehova.* Ka ihe i kwuru meere m.” Mmụọ ozi ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.

39 N’oge ahụ, Meri gawara ngwa ngwa n’ala bụ́ ugwu ugwu, n’otu obodo dị na Juda. 40 Ọ banyere n’ụlọ Zekaraya ma kelee Elizabet. 41 Ka Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa o bu n’afọ maliri elu, Elizabet jupụtakwara na mmụọ nsọ 42 wee tie mkpu, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ n’ime ụmụ nwaanyị niile. Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị bụkwa! 43 Ònye ka m bụ na nne nke Onyenwe m bịara ileta m? 44 N’ihi na ozugbo m nụrụ ekele gị, obi tọrọ nwa m bu n’afọ ụtọ, ya amalie elu. 45 Nwaanyị nke kweere na-enwekwa obi ụtọ n’ihi na ihe ndị ahụ Jehova* gwara ya ga-emezucha.”

46 Meri wee sị: “Mkpụrụ obi m* na-eto Jehova,*+ 47 agaghịkwa m akwụsị ịṅụrị ọṅụ n’ime Chineke bụ́ Onye Nzọpụta m,+ 48 n’ihi na o chetala ohu ya nwaanyị, onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.+ N’ihi na si ugbu a gawa, ọgbọ niile ga na-asị na m bụ onye a gọziri agọzi,+ 49 n’ihi na Chineke, Onye dị ike, emeerela m ọtụtụ ihe dị ebube, aha ya dịkwa nsọ.+ 50 Sikwa n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, ọ na-emere ndị na-atụ egwu ya ebere.+ 51 O ji aka ya dị ike mee ihe a niile. Ọ chụsasịala ndị mpako.+ 52 Ọ kwatuola ndị na-achị achị,+ buliekwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha elu.+ 53 O jirila ihe ọma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ,+ meekwa ka ndị nwere akụ̀ gbara aka laa. 54 Ọ gbatarala Izrel bụ́ ohu ya ọsọ enyemaka, si otú a gosi na o chetara nkwa o kwere.+ 55 O kwere nkwa na ya ga-emere Ebreham na ụmụ* ya ebere ruo mgbe ebighị ebi,+ ọ bụkwa ihe a ka ọ gwara nna nna anyị hà.” 56 Meri nọnyeere ya ruo ihe dị ka ọnwa atọ, ya alaghachi n’ụlọ ya.

57 Mgbe o ruru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. 58 Ndị agbata obi ya na ndị ikwu ya nụkwara na Jehova* emeerela ya ebere na-enweghị atụ, ha esoro ya na-aṅụrị ọṅụ.+ 59 N’ụbọchị nke asatọ, ha bịara ibi nwatakịrị ahụ úgwù,+ ha chọkwara ịgụ ya aha nna ya, bụ́ Zekaraya. 60 Ma nne ya sịrị: “Mba, a ga-agụ ya Jọn.” 61 Mgbe o kwuru ihe a, ha sịrị ya: “E nweghị onye ikwu gị na-aza aha a.” 62 Ha wee jiri aka jụọ nna ya aha ọ chọrọ ka a gụọ ya. 63 Ya asị ka e nye ya ihe e ji ede ihe,* ya edee, “Jọn bụ aha ya.”+ O wee ju ha niile anya. 64 Ọnụ ya meghere ozugbo, ire ya emegharịwakwa, ya amalite ikwu okwu,+ na-eto Chineke. 65 Egwu wee jide ndị agbata obi ha niile. A malitekwara ịkọsa ihe a niile n’ala Judia niile. 66 Ndị niile nụrụ ya wee buru ya n’obi, na-asị: “Gịnị ka nwatakịrị a ga-aghọ?” N’ihi na Jehova* nọnyeere ya.*

67 Chineke nyere Zekaraya bụ́ nna nwa ahụ mmụọ nsọ, ya ebuo amụma, sị: 68 “Ka e too Jehova* bụ́ Chineke Izrel,+ n’ihi na o chetala ndị ya wee napụta ha.+ 69 O meekwala ka e nwee onye nzọpụta dị ike*+ n’ụlọ ohu ya Devid,+ 70 dị ka o si n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ kwuo n’oge ochie.+ 71 O kwuru banyere ịzọpụta anyị n’aka ndị iro anyị nakwa n’aka ndị niile kpọrọ anyị asị.+ 72 Ọ ga-emezu nkwa o kwere nna nna anyị hà, meekwara ha ebere. Ọ ga-echetakwa ọgbụgba ndụ ya dị nsọ,+ 73 nke bụ́ iyi ọ ṅụụrụ Ebreham nna nna anyị.+ 74 Mgbe Chineke napụtachara anyị n’aka ndị iro anyị, ọ ga-eme ka anyị na-efe ya n’atụghị egwu, 75 ka anyị jisie ya aka ike, bụrụkwa ndị ezi omume n’anya ya n’oge niile anyị dị ndụ. 76 Ma gịnwa, bụ́ nwatakịrị, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye Kacha Elu, n’ihi na ị ga-ebutere Jehova* ụzọ iji kwadebe ụzọ ya,+ 77 iji mee ka ndị ya mata na otú Chineke ga-esi zọpụta ha bụ ịgbaghara mmehie ha+ 78 n’ihi obi ebere ya. N’ihi ebere a, Chineke ga-eme ka anyị hụ ìhè dị ka mgbe chi bọrọ, 79 ka ìhè wee nwuoro ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị nakwa ndị nọ n’ebe ọnwụ dị ka ọchịchịrị nke kpuchiri ha.+ Ìhè ahụ ga-emekwa ka anyị mata ihe anyị ga-eme iji nwee udo.”

80 Nwatakịrị ahụ wee too, na-eme nke ọma.* Ọ nọgidekwara n’ọzara ruo ụbọchị ọ pụtara n’ihu ọha gosi Izrel onwe ya.

2 N’oge ahụ, Siza Ọgọstọs kwuru ka e deba aha mmadụ niile bi n’ụwa n’akwụkwọ. 2 (Nke a bụ nke mbụ e debara aha ndị mmadụ n’akwụkwọ, ọ bụkwa mgbe Kwiriniọs bụ gọvanọ Siria.) 3 Onye ọ bụla wee gaa n’obodo ya ka e deba aha ya n’akwụkwọ. 4 N’ihi ya, Josef+ si na Nazaret dị na Galili gawa obodo Devid a na-akpọ Betlehem,+ nke dị na Judia, n’ihi na o si n’ezinụlọ Devid. 5 Ọ gara ka e deba aha ya na Meri nwunye ya n’akwụkwọ.+ N’oge a, Meri dị ime ọmụmụ.+ 6 Ka ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ruru. 7 O wee mụọ nwa nwoke, bụ́ nwa mbụ ya,+ jiri ákwà fụọ ya ma nyiwe ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri,+ n’ihi na o nweghị ebe ha ga-anọ n’ụlọ ndị njem.

8 N’otu obodo ahụkwa, e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi n’ọhịa. Ha na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị. 9 Na mberede, mmụọ ozi Jehova* bịara guzo n’ihu ha, ebube Jehova* enwuo dị ka ìhè gburugburu ha, ezigbo ụjọ wee jide ha. 10 Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha: “Ụjọ atụla unu, n’ihi na ana m ezisara unu ozi ọma banyere ihe ga-eme ka mmadụ niile ṅụrịa ezigbo ọṅụ. 11 N’ihi na n’obodo Devid,+ a mụụrụ unu onye nzọpụta+ taa, onye bụ́ Kraịst Onyenwe anyị.+ 12 Ihe a bụ ihe unu ga-eji mata onye ọ bụ: Unu ga-ahụ nwa ọhụrụ e ji ákwà fụọ, nke dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri.” 13 Na mberede, ìgwè ndị mmụọ ozi bịakwutere mmụọ ozi ahụ dị ka ụsụụ ndị agha,+ na-eto Chineke, sị: 14 “Ka otuto dịrị Chineke n’ebe kacha elu, ka udo dịkwa n’ụwa maka ndị Chineke meere amara.”*

15 Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha laghachi n’eluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ malitere ịgwa ibe ha, sị: “Ka anyị garuo Betlehem ozugbo hụ ihe a merenụ, nke Jehova* mere ka anyị mara.” 16 Ha gara ngwa ngwa hụ Meri na Josef nakwa nwa ọhụrụ ahụ dina n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri. 17 Mgbe ha hụrụ ya, ha kọrọ ihe mmụọ ozi ahụ gwara ha banyere nwatakịrị a. 18 Ihe ndị ọzụzụ atụrụ ahụ kọrọ jukwara ndị niile nụrụ ya anya. 19 Ma Meri buuru okwu a niile n’obi, na-eche ihe ihe ndị a pụtara.+ 20 Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ wee laghachi, na-eto Chineke, na-ajakwa ya mma maka na ihe niile ha nụrụ na ihe niile ha hụrụ gosiri na ihe a gwara ha bụ eziokwu.

21 N’ụbọchị nke asatọ mgbe a mụchara ya, ha biri ya úgwù,+ gụọkwa ya Jizọs. Tupu Meri adịrị ime ya, aha a ka mmụọ ozi ahụ kwuru na a ga-agụ ya.+

22 Mgbe o ruru ụbọchị a ga-eme ka ha dị ọcha otú Iwu Mosis kwuru,+ ha kuuru ya gaa Jeruselem ka ha gosi ya Jehova,* 23 dị ka e si dee ya n’Iwu Jehova.* E dere, sị: “A ga-enyefe Jehova* nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ.”*+ 24 Ha wetara ihe a ga-eji chụọ àjà dị ka Iwu Jehova* kwuru, sị: “Ị ga-anwụta nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ.”+

25 Ma, e nwere otu nwoke nọ na Jeruselem aha ya bụ Simiọn. Nwoke a bụ onye ezi omume na onye na-asọpụrụ Chineke. Ọ nọ na-eche mgbe Chineke ga-akasi Izrel obi,+ mmụọ nsọ na-edukwa ya. 26 Chineke sikwa n’ike mmụọ nsọ mee ka ọ mara na ọ gaghị anwụ ruo mgbe ọ hụrụ Kraịst Jehova* zitere. 27 Mmụọ nsọ duuru ya, ya abata n’ụlọ nsọ. Ka nne na nna nwatakịrị ahụ bụ́ Jizọs ku ya bata ka e meere ya ihe Iwu kwuru na a ga na-eme,+ 28 o kuuru nwa ahụ ma too Chineke, sị: 29 “Ugbu a, Ọkaakaa Onyenwe anyị, ị ga-ahapụ ohu gị ka ọ nwụọ+ n’udo otú i kwuru, 30 n’ihi na anya m ahụla onye nzọpụta i zitere,+ 31 onye i zitere ka mba niile hụ.+ 32 Onye a bụ ìhè+ nke ga-ewepụ ihe kpuchiri anya mba niile,+ ọ bụkwa ebube nke ndị gị bụ́ Izrel.” 33 Nne na nna nwa ahụ nọkwa na-atụgharị uche n’ihe ndị a na-ekwu banyere ya. 34 Simiọn gọzikwara ha, gwakwa Meri, bụ́ nne nwa ahụ, sị: “Ọ bụ Chineke zitere nwa a. Ma, ụfọdụ ndị ga-ada n’ihi ya,+ ndị ọzọ ga-ebilikwa n’ihi ya.+ N’agbanyeghị na Chineke ga-egosi ndị mmadụ ihe àmà na ya nọnyeere ya, ọtụtụ ndị ga-ekwutọ ya+ 35 (Meri, a ga-amanye ogologo mma agha n’ahụ́ gị*),+ ka e wee mata ihe dị ọtụtụ ndị n’obi.”

36 E nwekwara otu nwaanyị bụ́ onye amụma. Ọ bụ Ana nwa Fanuel, onye si n’ebo Asha. Nwaanyị a akaala nká, ya na di ya bikwara afọ asaa mgbe ha lụchara.* 37 Ọ bụkwa nwaanyị di ya nwụrụ nke dị afọ iri asatọ na anọ ugbu a. Ụkwụ ya anaghị akọ ụkọ n’ụlọ nsọ. Ọ na-eje ozi dị nsọ ehihie na abalị, na-ebu ọnụ, na-ekpesikwa ekpere ike. 38 N’oge ahụ, ọ bịaruru nso, malite ikele Chineke, na-agwakwa ndị niile na-eche oge Chineke ga-anapụta Jeruselem banyere nwatakịrị ahụ.+

39 Mgbe ha mechara ihe niile otú Iwu Jehova* kwuru,+ ha laghachiri obodo ha bụ́ Nazaret nke dị na Galili.+ 40 Nwatakịrị ahụ nọkwa na-eto ma na-agbasi ike, na-enwekwukwa amamihe. Ihe ya nọkwa na-amasị Chineke.+

41 N’afọ ọ bụla, nne ya na nna ya na-aga Jeruselem maka Ememme Ngabiga.+ 42 Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, ha gara Jeruselem dị ka a na-eme n’oge ememme ahụ.+ 43 Mgbe e mechara ememme ahụ, ha ana-alọta, nwatakịrị ahụ bụ́ Jizọs nọdụrụ na Jeruselem, ma nne ya na nna ya amaghị. 44 Ebe ha chere na o so n’ìgwè mmadụ ndị na-ala, ha gara njem otu ụbọchị tupu ha amalite ịchọ ya ebe ndị ikwu na ibe ha nọ. 45 Ma, ha ahụghị ya. Ha laghachiri Jeruselem, na-achọ ya ebe niile. 46 Mgbe ụbọchị atọ gachara, ha chọtara ya n’ụlọ nsọ ebe ya na ndị nkụzi nọ, ya anọrọ ọdụ, na-ege ha ntị, na-ajụkwa ha ajụjụ. 47 Ma otú o si aghọta ihe na ihe ọ na-aza ha juru ndị niile na-ege ya ntị anya.+ 48 Mgbe nne ya na nna ya hụrụ ya, o juru ha anya, nne ya wee sị ya: “Nwa m, à na-akpọkwanụ ihe a i mere anyị gịnị? Mụ na nna gị chị obi n’aka na-achọgharị gị kemgbe.” 49 Ma ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m? Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?”+ 50 Ma, ha aghọtaghị ihe ahụ ọ gwara ha.

51 O wee soro ha gbadaa ma laghachi Nazaret. Ọ nọkwa na-edo onwe ya n’okpuru ha.*+ Nne ya bukwaara okwu a niile n’obi.+ 52 Jizọs nọkwa na-eto, na-enwekwu amamihe. Ihe ya nọkwa na-amasị ma Chineke ma ndị mmadụ.

3 N’afọ nke iri na ise n’ọchịchị Taịbiriọs Siza, oge Pọntiọs Paịlet bụ gọvanọ Judia, Herọd*+ abụrụ onye na-achị Galili, Filip nwanne ya ana-achị Ituria na Trakọnaịtis, Laịsenias ana-achịkwa Abilini, 2 mgbe Anas bụ otu n’ime ndị isi nchụàjà, Kayafas+ abụrụ nnukwu onye nchụàjà, okwu Chineke ruru Jọn+ nwa Zekaraya ntị n’ala ịkpa.+

3 O wee na-aga n’obodo niile dị gburugburu Osimiri Jọdan, na-ekwusara ndị mmadụ na ha kwesịrị ime baptizim iji gosi na ha echegharịala ka e wee gbaghara ha mmehie ha,+ 4 dị ka e dere n’akwụkwọ Aịzaya onye amụma, sị: “E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị: ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova!* Meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.+ 5 A ga-ekpochi ndagwurugwu niile, meekwa ka ugwu ukwu niile na ugwu nta niile dị larịị. Ụzọ ndị gbagọrọ agbagọ ga-akwụrụ ọtọ, ụzọ ndị na-adịghị larịị adịkwa larịị. 6 Mmadụ* niile ga-ahụkwa otú Chineke ga-esi zọpụta ndị mmadụ.’”+

7 Ọ malitere ịgwa ìgwè mmadụ na-abịa ka o mee ha baptizim, sị: “Unu ụmụ ajụala, ònye gwara unu ka unu gbanahụ iwe Chineke na-abịanụ?+ 8 Burunụ ụzọ mịa mkpụrụ gosiri na unu echegharịala. Unu agwakwala onwe unu, sị, ‘Ebreham bụ nna anyị.’ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike isi na nkume ndị a mee ka Ebreham nweta ụmụ. 9 N’eziokwu, e dowelarị anyụike na mgbọrọgwụ osisi. N’ihi ya, a ga-egbutu osisi ọ bụla na-anaghị amị ezigbo mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.”+

10 Ìgwè mmadụ ahụ jụrụ ya, sị: “Gịnịzi ka anyị kwesịrị ime?” 11 Ya asị ha: “Onye nwere uwe abụọ, ya chịrị otu chịnye onye na-enweghị. Onye nwere ihe ọ na-eri, ya meekwa otu ihe ahụ.”+ 12 Ndị ọnaụtụ bịakwara ka o mee ha baptizim.+ Ha sịrị ya: “Onye Ozizi, gịnị ka anyị kwesịrị ime?” 13 Ya asị ha: “Unu anala ihe ọ bụla karịrị ego a na-akwụ n’ụtụ isi.”+ 14 Ndị agha jụkwara ya, sị: “Gịnị ka anyị kwesịrị ime?” Ya asịkwa ha: “Unu anarala onye ọ bụla ihe n’ike ma ọ bụ bo onye ọ bụla ebubo ụgha,+ kama ka ihe a na-enye unu* ju unu afọ.”

15 Ebe ọ bụ na ndị Juu nọ na-atụ anya Kraịst, ha niile nọ na-eche n’obi ha banyere Jọn, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst?”+ 16 Jọn gwara ha niile, sị: “Mụnwa ji mmiri na-eme unu baptizim. Ma onye ka m ike na-abịa, onye m na-erughị eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+ Ọ ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim.+ 17 O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka iji dowe ebe ọ na-azọcha ọka ezigbo ọcha. Ọ ga-ekpokọtakwa ọka wit n’ụlọ ọ na-akwasa ihe, ma ọ ga-eji ọkụ a na-enweghị ike imenyụ emenyụ gbaa mkpo ya ọkụ.”

18 Ọ gwakwara ha ọtụtụ ihe ndị ọzọ gbara ha ume, na-ezikwa ha ozi ọma. 19 Ma Jọn gwara Herọd onye na-achị Galili gbasara ihe ọjọọ niile ọ na-eme, gwakwa ya na ọ dịghị mma na ọ kpọọrọ Herodias nwunye nwanne ya. 20 N’ihi ya, Herọd mekwuru ihe ọjọọ ọzọ: Ọ kpọchiri Jọn n’ụlọ mkpọrọ.+

21 Ma mgbe Jọn nọ na-eme ndị ahụ niile baptizim, o mekwara Jizọs baptizim.+ Ka Jizọs nọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere,+ 22 mmụọ nsọ wee bịa n’ụdị nduru bekwasị ya. Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.”+

23 Jizọs+ dị ihe dị ka afọ iri atọ+ mgbe o bidoro ozi ya. Dị ka ndị mmadụ chere, ọ bụ

nwa Josef,+

nwa Hilaị,

24 nwa Matat,

nwa Livaị,

nwa Melkaị,

nwa Janaị,

nwa Josef,

25 nwa Matatayas,

nwa Emọs,

nwa Nehọm,

nwa Eslaị,

nwa Nagaị,

26 nwa Meyat,

nwa Matatayas,

nwa Semein,

nwa Josek,

nwa Joda,

27 nwa Joanan,

nwa Risa,

nwa Zerubabel,+

nwa Shieltiel,+

nwa Niraị,

28 nwa Melkaị,

nwa Adaị,

nwa Kosam,

nwa Elmedam,

nwa Ea,

29 nwa Jizọs,

nwa Eliiza,

nwa Jorim,

nwa Matat,

nwa Livaị,

30 nwa Simiọn,

nwa Judas,

nwa Josef,

nwa Jonam,

nwa Elayakim,

31 nwa Milia,

nwa Mena,

nwa Matata,

nwa Netan,+

nwa Devid,+

32 nwa Jesi,+

nwa Obed,+

nwa Boaz,+

nwa Salmọn,+

nwa Nashọn,+

33 nwa Aminadab,

nwa Anaị,

nwa Hezrọn,

nwa Pirez,+

nwa Juda,+

34 nwa Jekọb,+

nwa Aịzik,+

nwa Ebreham,+

nwa Tira,+

nwa Nehọ,+

35 nwa Sirọg,+

nwa Riu,+

nwa Pileg,+

nwa Iba,+

nwa Shila,+

36 nwa Kaịnan,

nwa Apakshad,+

nwa Shem,+

nwa Noa,+

nwa Lemek,+

37 nwa Metusela,+

nwa Ịnọk,

nwa Jered,+

nwa Mahalelel,+

nwa Kaịnan,+

38 nwa Ịnọsh,+

nwa Set,+

nwa Adam,+

nwa Chineke.

4 Jizọs wee si n’Osimiri Jọdan pụọ, mmụọ nsọ Chineke nyere ya eduru ya gaa n’ala ịkpa+ 2 ruo ụbọchị iri anọ. Ebe ọ na-erighị ihe ọ bụla n’ụbọchị ndị ahụ, agụụ gụwara ya mgbe ụbọchị ndị ahụ gachara. N’ihi ya, Ekwensu nwara ya,+ 3 sị: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.” 4 Ma Jizọs sịrị ya: “E dere, sị, ‘Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ.’”+

5 N’ihi ya, Ekwensu kpọọrọ ya gaa n’otu ugwu, gosi ya alaeze niile nke ụwa n’otu ntabi anya.+ 6 Ekwensu wee sị ya: “M ga-enye gị ikike a niile na ebube ha, n’ihi na e nyefeela ha n’aka m,+ ọ bụkwa onye ọ bụla m chọrọ ka m ga-enye ha. 7 N’ihi ya, ọ bụrụ na i fee m ofufe,* ha niile ga-abụ nke gị.” 8 Jizọs asị ya: “E dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova* bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi dị nsọ.’”+

9 O wee duru ya banye Jeruselem ma mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri n’elu ụlọ nsọ, wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si ebe a wụda,+ 10 n’ihi na e dere, sị, ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chebe gị.’ 11 E dekwara, sị: ‘Ha ga-eji aka ha ghọrọ gị, ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume.’”+ 12 Jizọs asị ya: “E kwuru, sị, ‘Anwala Jehova* bụ́ Chineke gị ọnwụnwa.’”+ 13 Mgbe Ekwensu nwachara ya ọnwụnwa ahụ niile, o si ebe Jizọs nọ pụọ ka ọ dịwa oge ọzọ ga-adaba adaba.+

14 Jizọs wee laghachi Galili,+ mmụọ nsọ na-edukwa ya. Ndị bi gburugburu ebe ahụ nọkwa na-ekwu okwu ọma banyere ya. 15 Ọ malitekwara izi ihe n’ụlọ nzukọ ha, mmadụ niile na-ajakwa ya mma.

16 O wee gaa Nazaret,+ bụ́ ebe ọ nọ too, banye n’ụlọ nzukọ+ otú ọ na-emekarị n’Ụbọchị Izu Ike, wee guzo ọtọ ka ọ gụọ ihe. 17 E wee nye ya akwụkwọ mpịakọta Aịzaya onye amụma. O meghekwara akwụkwọ mpịakọta ahụ ma chọta ebe e dere, sị: 18 “Jehova* nyere m mmụọ ya, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma. O zitere m ka m gwa ndị e ji eji na a hapụla ha, na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ, na ịhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa,+ 19 nakwa ikwusa gbasara oge Jehova* ji anabata ndị mmadụ.”+ 20 O wee fụkọta akwụkwọ mpịakọta ahụ, nyeghachi ya onye na-eje ozi ebe ahụ ma nọdụ ala. Ndị niile nọ n’ụlọ nzukọ ahụ wee legide ya anya. 21 O wee bido ịsị ha: “Taa ka ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ unu nụrụ ugbu a mezuru.”+

22 Ha niile wee malite ikwu okwu ọma banyere ya. Otú o si na-ekwu okwu na-eru ha n’obi tụkwara ha n’anya,+ ha ana-asị: “Onye a ọ́ bụghị nwa Josef?”+ 23 O wee sị ha: “Ama m na unu ga-asị m, ‘Ọgwọ ọrịa, gwọọ onwe gị. Ihe ndị ahụ anyị nụrụ i mere na Kapaniọm,+ mee ha ebe a, n’obodo gị.’” 24 N’ihi ya, ọ sịrị: “N’eziokwu, ana m asị unu na o nweghị onye amụma a na-akwanyere ùgwù n’obodo ya.+ 25 Dị ka ihe atụ, n’eziokwu, ana m asị unu: N’oge Ịlaịja dị ndụ, e nwere ọtụtụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ n’Izrel mgbe e mechiri eluigwe ka mmiri ghara izo afọ atọ na ọnwa isii, nke mere ka oké ụnwụ daa n’ala a niile.+ 26 Ma e zighị Ịlaịja ka ọ gakwuru nke ọ bụla n’ime ụmụ nwaanyị ndị ahụ, kama naanị onye e ziri ya ka ọ gakwuru bụ otu nwaanyị di ya nwụrụ na Zarefat dị na Saịdọn.+ 27 E nwekwara ọtụtụ ndị ekpenta n’Izrel n’oge Ịlaịsha onye amụma dị ndụ. Ma o nweghị onye n’ime ha a gwọrọ. Ọ bụ naanị Neeman onye Siria ka a gwọrọ.”+ 28 Iwe wee ju ndị niile na-anụ ihe ndị a n’ụlọ nzukọ ahụ obi,+ 29 ha ebilie kpụrụ ya gaa n’azụ obodo ahụ ọsọ ọsọ. Ha duuru ya gaa n’ọnụ ọnụ ugwu, ebe obodo ha dị, ka ha wee tụda ya ka o jiri isi daa. 30 Ma o si n’etiti ha mịfere gawara onwe ya.+

31 O wee gbadaa Kapaniọm, bụ́ obodo dị na Galili. O wee na-ezi ha ihe n’Ụbọchị Izu Ike.+ 32 Otú o si ezi ihe jukwara ha anya,+ n’ihi na ọ na-ezi ha ihe ka onye Chineke nyere ikike. 33 Ma n’ime ụlọ nzukọ ahụ, e nwere otu nwoke mmụọ ọjọọ ji, onye tiri mkpu,+ sị: 34 “Jizọs onye Nazaret,+ gịnị jikọrọ anyị na gị? Ị̀ bịara ibibi anyị? Ama m gị nke ọma, Onye Nsọ nke Chineke.”+ 35 Ma Jizọs baara ya mba, sị: “Mechie ọnụ, sikwa n’ime ya pụta.” N’ihi ya, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ tụchara nwoke ahụ n’ala n’etiti ha, o si n’ime ya pụta n’emerụghị ya ahụ́. 36 O wee ju mmadụ niile anya, ha amalitekwa ịgwa ibe ha, sị: “Olee ụdị okwu bụ ihe a? N’ihi na o ji ikike na ike o nwere na-enye ndị mmụọ ọjọọ* iwu, ha ana-apụ.” 37 N’ihi ya, ndị mmadụ nọ na-akọsa banyere ya n’ebe niile gburugburu obodo ahụ.

38 Mgbe o si n’ụlọ nzukọ ahụ pụọ, ọ banyere n’ụlọ Saịmọn. Ma oké ahụ́ ọkụ ji nne nwunye Saịmọn, ha rịọkwara ya ka o nyere ya aka.+ 39 O wee guzoro ya n’akụkụ mee ka ahụ́ ọkụ ahụ kwụsị. Nwaanyị ahụ biliri ozugbo jewere ha ozi.

40 Ma mgbe anyanwụ na-ada, ndị niile nwere ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute ya. Ọ na-ebikwasị onye nke ọ bụla n’ime ha aka n’isi gwọọ ya.+ 41 Ndị mmụọ ọjọọ sikwa n’ime ọtụtụ mmadụ pụta, na-eti mkpu, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke.”+ Ma, ọ na-abara ha mba. Ọ naghịkwa ekwe ka ha kwuo okwu,+ n’ihi na ha ma na ọ bụ ya bụ Kraịst.+

42 Ma mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gawa n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.+ Ma ìgwè mmadụ ahụ malitere ịchọ* ya, wee bịarute ebe ọ nọ. Ha gbalịkwara ka ọ ghara isi ebe ha nọ pụọ. 43 Ma ọ sịrị ha: “M ga-ekwusarịrị ozi ọma Alaeze Chineke n’obodo ndị ọzọ, n’ihi na ọ bụ ya mere e ji zite m.”+ 44 N’ihi ya, ọ gara n’ụlọ nzukọ ndị dị na Judia na-ekwusa ozi ọma.

5 N’otu oge, Jizọs guzo n’akụkụ ọdọ mmiri Genesaret,*+ ìgwè mmadụ ana-enu ibe ha aka ka ha ruo ya nso gere okwu Chineke. 2 O wee hụ ụgbọ abụọ a dọsara n’akụkụ ọdọ mmiri ahụ, ma ndị ọkụ azụ̀ esila na ha pụta na-asacha ụgbụ ha.+ 3 Ka ọ banyere n’otu n’ime ụgbọ ndị ahụ, ọ gwara Saịmọn, onye nwe ụgbọ ahụ, ka ọ kwọrọ ya banyekwuo na mmiri. O wee nọrọ n’ụgbọ ahụ, malitekwa izi ìgwè mmadụ ahụ ihe. 4 Mgbe ọ kwụsịrị ịgwa ìgwè mmadụ ahụ okwu, ọ sịrị Saịmọn: “Kwọrọ ụgbọ a banye n’ebe miri emi, wụnyekwanụ ụgbụ unu ka unu gbute azụ̀.” 5 Ma Saịmọn sịrị ya: “Onye Ozizi, n’agbanyeghị anya niile anyị mụrụ n’abalị, anyị egbuteghị ihe ọ bụla.+ Ma, ebe ị sị m wụnye ụgbụ na mmiri, m ga-awụnye ya.” 6 Mgbe ha wụnyere ya, ha gbutere ọtụtụ azụ̀, nke mere na ụgbụ ha malitere ịdọka.+ 7 N’ihi ya, ha feere ndị ibe ha nọ n’ụgbọ nke ọzọ aka ka ha bịa nyere ha aka. Ha bịakwara kpojuo ụgbọ abụọ ahụ, nke mere na ụgbọ ndị ahụ malitere imi. 8 Mgbe Saịmọn Pita hụrụ ihe a, ọ dara n’ala n’ụkwụ Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, si ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.” 9 N’ihi na mgbe ha gbutere azụ̀ ndị ahụ, o juru ya na ndị niile ya na ha nọ anya. 10 O jukwara ma Jems ma Jọn, ụmụ Zebedi,+ anya, bụ́ ndị ha na Saịmọn na-arụkọ ọrụ. Ma Jizọs sịrị Saịmọn: “Kwụsị ịtụ egwu. Si ugbu a gawa, ị ga na-akụta ndị mmadụ ná ndụ.”+ 11 N’ihi ya, ha kwọọrọ ụgbọ ndị ahụ gaghachi n’elu ala. Ha hapụkwara ihe niile soro ya.+

12 N’oge ọzọ, ka Jizọs nọ n’otu n’ime obodo ndị ahụ, otu nwoke ekpenta zuru ahụ́ hụrụ ya, gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, rịọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-emeli ka m dị ọcha.”+ 13 O wee matịa aka bitụ ya aka, sị: “Achọrọ m. Dị ọcha.” Ozugbo ahụ, a gwọrọ ya ekpenta ya.+ 14 O wee gwa nwoke ahụ ka ọ ghara ịkọrọ onye ọ bụla. Ọ sịrị ya: “Kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị, nyekwa ihe Mosis kwuru na onye ekpenta ga-enye ma ọ dị ọcha,+ ka e wee mara na a gwọọla gị.”+ 15 Ma akụkọ banyere ya nọ na-agbasa, oké ìgwè mmadụ na-agbakọtakwa ka ha gee ya ntị, ka ọ gwọọkwa ha ọrịa ha.+ 16 Ma, ọ na-agakarị ikpe ekpere ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.

17 E nwere otu ụbọchị ọ nọ na-ezi ihe, ndị Farisii na ndị na-akụzi Iwu, bụ́ ndị si n’obodo niile dị na Galili na Judia na Jeruselem bịa, nọkwa ọdụ n’ebe ahụ. Jehova* nyekwara ya ike ọ ga-eji na-agwọ ọrịa.+ 18 Ma, e nwere ụmụ nwoke ji àkwà* buru otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi bubata ya ma dọwa ya n’ihu Jizọs.+ 19 Ma, n’ihi ìgwè mmadụ ahụ, ha ahụghị ụzọ ha ga-esi buba ya. N’ihi ya, ha rịgooro n’elu ụlọ, sikwa n’uko ụlọ buda ya na àkwà ahụ n’etiti ndị nọ n’ihu Jizọs. 20 Mgbe Jizọs hụrụ na ha nwere okwukwe, ọ sịrị: “Nwoke m, a gbagharala gị mmehie gị.”+ 21 Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii wee malite ịgwa ibe ha, sị: “Ònye bụ onye a na-ekwulu Chineke? Ònye ga-agbagharali mmehie ma ọ́ bụghị naanị Chineke?”+ 22 Ma ebe ọ bụ na Jizọs ma ihe ha na-eche, ọ gwara ha, sị: “Gịnị ka unu na-eche n’obi unu? 23 Olee nke ka mfe? Ọ̀ bụ ịsị, ‘A gbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị, ‘Bilie gawa ije’? 24 Ma, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ nwere ikike n’ụwa ịgbaghara mmehie—” ọ gwara nwoke ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Ana m asị gị, Bilie buru àkwà* gị, lawa n’ụlọ gị.”+ 25 O wee bilie n’ihu ha, buru àkwà* ya lawa n’ụlọ ya, na-eto Chineke. 26 O wee ju ha niile anya, ha amalitekwa ito Chineke. Egwu wee jide ha, ha ana-asị: “Anyị ahụla ihe dị ebube taa.”

27 Mgbe ihe a mechara, Jizọs pụrụ hụ otu onye ọnaụtụ aha ya bụ Livaị ka ọ nọ ọdụ n’ebe a na-anakọta ụtụ. O wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 28 Ọ hapụkwara ihe niile, bilie soro ya. 29 Livaị mekwaara ya oké oriri n’ụlọ ya, e nwekwara ìgwè ndị ọnaụtụ na ndị ọzọ ndị ha na ha nọ na-eri nri.+ 30 N’ihi ya, ndị Farisii na ndị òtù ha bụ́ ndị odeakwụkwọ malitere ịtamu ntamu na-asị ndị na-eso ụzọ ya: “Gịnị mere unu ji soro ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya?”+ 31 Jizọs sịrị ha: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.+ 32 Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama abịara m ịgwa ndị mmehie ka ha chegharịa.”+

33 Ha asị ya: “Ndị na-eso ụzọ Jọn na-ebu ọnụ ugboro ugboro, na-ekpesikwa ekpere ike. Otú ahụkwa ka ndị na-eso ụzọ ndị Farisii na-eme. Ma ndị na-eso ụzọ gị na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya.”+ 34 Jizọs asị ha: “Unu agaghị emeli ka ndị enyi nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na-ebu ọnụ mgbe ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ. 35 Ma, oge na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ+ n’ebe ha nọ. Ha ga-ebuzi ọnụ mgbe ahụ.”+

36 O mekwaara ha otu ihe atụ, sị: “E nweghị onye na-esi n’uwe elu ọhụrụ achabita ibé ákwà ma dụnye ya n’uwe elu ochie. Ọ bụrụ na mmadụ emee otú ahụ, ibé ákwà ọhụrụ ahụ na-adọkapụ, ibé ákwà nke si n’uwe ọhụrụ ahụ na nke ochie ahụ agaghịkwa agakọ.+ 37 E nweghịkwa onye na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ochie. Ọ bụrụ na mmadụ emee otú ahụ, mmanya ọhụrụ ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ahụ, mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama akpụkpọ ahụ emebiekwa. 38 Kama e kwesịrị ịgbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ọhụrụ. 39 E nweghị onye ṅụrụ mmanya ochie nke na-achọ nke ọhụrụ, n’ihi na ọ na-asị, ‘Nke ochie dị mma.’”

6 Ma o si n’ubi ọka wit na-agafe n’ụbọchị izu ike, ndị na-eso ụzọ ya nọkwa na-aghọrọ ụyọkọ ọka wit,+ na-agbachasị ha, na-ata.+ 2 Ụfọdụ n’ime ndị Farisii wee sị ha: “Gịnị mere unu ji na-eme ihe iwu kwuru ka a ghara ime n’Ụbọchị Izu Ike?”+ 3 Ma Jizọs sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya?+ 4 Ọ banyere n’ụlọ Chineke were achịcha a na-enye Chineke taa. O nyekwara ndị so ya, ha ataa. Ma, iwu kwuru na o nweghị onye kwesịrị ịta ya ma e wezụga ndị nchụàjà.”+ 5 Ọ gwakwara ha, sị: “Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izu Ike.”+

6 N’ụbọchị izu ike ọzọ,+ ọ banyere n’ụlọ nzukọ ma malite izi ihe. E nwekwara otu nwoke aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ ebe ahụ.+ 7 Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ na-ele Jizọs anya ka ha hụ ma ọ̀ ga-agwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike, n’ihi na ha na-achọ ihe ha ga-eji bo ya ebubo. 8 Ma, ọ ma ihe ha na-atụgharị n’uche.+ N’ihi ya, ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie, guzoro n’etiti.” O wee bilie guzoro ebe ahụ. 9 Jizọs sịziri ha: “Ka m jụgodị unu, Iwu ò kwuru ka a na-eme ihe ọma n’Ụbọchị Izu Ike ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ, ịzọ ndụ* ka ọ̀ bụ ibibi ya?”+ 10 Mgbe o lechara ha niile anya, ọ sịrị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa aka ya, aka ya adị mma. 11 Ma ezigbo iwe were ha, ha amalite ịgba izu ihe ha ga-eme Jizọs.

12 Otu ụbọchị, ọ pụrụ gaa n’ugwu ka o kpee ekpere,+ ọ nọkwa na-ekpe ekpere abalị ahụ niile.+ 13 Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya, ya ahọrọ mmadụ iri na abụọ n’ime ha, kpọọkwa ha ndịozi.+ Ha bụ: 14 Saịmọn, onye ọ gụkwara Pita, Andru nwanne ya, Jems, Jọn, Filip,+ Batolomiu, 15 Matiu, Tọmọs,+ Jems nwa Alfiọs, Saịmọn onye a na-akpọ “onye na-anụ ọkụ n’obi,” 16 Judas nwa Jems, na Judas Iskarịọt, onye mechara rara ya nye.

17 Ya na ha wee gbadata, ya eguzoro n’ebe dị larịị, ìgwè ndị na-eso ụzọ ya nọkwa ya, ha na oké ìgwè mmadụ ndị si Judia na Jeruselem nakwa Taya na Saịdọn bụ́ obodo ndị dị n’ụsọ osimiri. Ha bịara ka ha nụrụ okwu ya nakwa ka ọ gwọọ ha ọrịa ha. 18 Ọ gwọkwara ndị mmụọ ọjọọ* ji. 19 Ìgwè mmadụ ahụ niile nọkwa na-achọ ibitụ ya aka, n’ihi na ike si n’ahụ́ ya na-apụ+ wee na-agwọ ha niile.

20 O wee lee ndị na-eso ụzọ ya anya ma malite ịsị:

“Unu ndị bụ́ ogbenye na-enwe obi ụtọ, n’ihi na Alaeze Chineke bụ nke unu.+

21 “Unu ndị agụụ na-agụ ugbu a na-enwe obi ụtọ, n’ihi na afọ ga-eju unu.+

“Unu ndị na-ebe ákwá ugbu a na-enwe obi ụtọ, n’ihi na unu ga-achị ọchị.+

22 “Unu na-enwe obi ụtọ mgbe ọ bụla ndị mmadụ kpọrọ unu asị,+ nakwa mgbe ọ bụla ha chụpụrụ unu,+ kọchaa unu ma mebie aha unu wee kwuo na unu bụ ndị ọjọọ, n’ihi Nwa nke mmadụ. 23 Ọ bụ ihe ndị ahụ ka ndị nna nna ha mere ndị amụma. Ṅụrịanụ ọṅụ n’ụbọchị ahụ, maliekwanụ elu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.+

24 “Ma unu ndị bara ọgaranya ga-ata ahụhụ,+ n’ihi na unu enwetazuola ihe niile unu ga-enweta.+

25 “Unu ndị afọ juru ugbu a ga-ata ahụhụ, n’ihi na agụụ ga-agụ unu.

“Unu ndị na-achị ọchị ugbu a ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu ga-eru uju ma bee ákwá.+

26 “Mmadụ niile kwuwe okwu ọma banyere unu, unu ga-ata ahụhụ,+ n’ihi na ụdị ihe a ka ndị nna nna ha mere ndị amụma ụgha.

27 “Ma ana m asị unu ndị na-ege ntị: Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya, na-emekwaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma.+ 28 Na-agọzinụ ndị na-abụ unu ọnụ, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akparị unu.+ 29 Onye maa gị ụra n’otu ntì, tụgharịara ya ntì nke ọzọ. Onye nara gị uwe elu gị, ajụla inye ya uwe ime gị.+ 30 Onye ọ bụla rịọrọ gị ihe, nye ya,+ agwakwala onye naara gị ihe gị ka o nyeghachi gị ihe ahụ.

31 “Na-emesokwanụ ndị mmadụ otú unu chọrọ ka ha na-emeso unu.+

32 “Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee oké ihe unu mere? N’ihi na ndị mmehie hụkwara ndị hụrụ ha n’anya n’anya.+ 33 Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, olee oké ihe unu mere? Ndị mmehie na-emekwa otu ihe ahụ. 34 Ọ bụrụkwa na ndị unu na-agbazinye ihe* bụ ndị unu na-atụ anya ka ha kwụghachi unu, olee oké ihe unu mere?+ Ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ihe, na-atụkwa anya na ha ga-akwụghachi ha. 35 Kama nke ahụ, unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya, na-emekwanụ ihe ọma. Na-agbazinyekwanụ ihe n’atụwaghị anya inweta ihe ọ bụla.+ Ụgwọ ọrụ unu ga-adịkwa ukwuu, unu ga-abụkwa ụmụ nke Onye Kacha Elu, n’ihi na obiọma ya na-erute ma ndị ọjọọ ma ndị na-anaghị ekele ndị meere ha ihe.+ 36 Na-emenụ ebere otú Nna unu na-eme ebere.+

37 “Kwụsịkwanụ ikpe ikpe, a gaghịkwa ekpe unu ikpe.+ Kwụsịkwanụ ịma ndị mmadụ ikpe, a gaghịkwa ama unu ikpe. Na-agbagharanụ* ndị mmadụ, a ga-agbagharakwa* unu.+ 38 Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.+ Ha ga-awụjukwa uwe unu n’ọnụ, ihe ha wụnyere ga na-awụfukwa n’agbanyeghị na ha bịara ya aka, yọkọọkwa ya ọnụ. N’ihi na ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.”

39 O wee meere ha otu ihe atụ, sị: “Onye ìsì ò nwere ike idu onye ìsì? Ọ̀ bụ na ha abụọ agaghị adaba n’olulu?+ 40 Nwa akwụkwọ* anaghị aka onye nkụzi ya. Ma, onye ọ bụla a kụziiri ihe nke ọma ga-adị ka onye nkụzi ya. 41 Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa dị n’anya nwanna gị, ma ị hụghị ogologo osisi dị n’anya gị?+ 42 Gịnị mere ị ga-eji asị nwanna gị, ‘Nwanna m, chere ka m wepụ irighiri ahịhịa dị n’anya gị,’ ebe gịnwa na-ahụghị ogologo osisi dị n’anya nke gị? Onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ ogologo osisi dị n’anya gị, ka i nwee ike ịhụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa n’anya nwanna gị.

43 “N’ihi na o nweghị osisi ọma na-amị mkpụrụ rere ure, o nweghịkwa osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ ọma.+ 44 N’ihi na a na-eji mkpụrụ osisi amata osisi ọ bụla.+ Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ anaghị aghọta mkpụrụ fig n’ogwu, ha anaghịkwa aghọta mkpụrụ vaịn n’osisi ogwu. 45 Ezigbo mmadụ na-esi n’ezigbo akụ̀ dị n’obi ya ewepụta ihe ọma, ma ajọ mmadụ na-esi n’ajọ akụ̀ ya ewepụta ihe ọjọọ. N’ihi na ọ bụ ihe juru mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.+

46 “Gịnịzi mere unu ji akpọ m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ma unu anaghị eme ihe m na-ekwu?+ 47 Onye ọ bụla nke na-abịakwute m ma na-anụ okwu m, na-emekwa ha, m ga-agwa unu onye o yiri.+ 48 O yiri onye chọrọ ịrụ ụlọ, nke gwuru ala gwumie ya egwumie, tọọkwa ntọala n’elu oké nkume. Mgbe e nwere idei mmiri, osimiri asọkwasịkwa ụlọ ahụ, ma o nweghị ike ime ka ọ maa jijiji n’ihi na a rụrụ ya nke ọma.+ 49 Ma, onye na-anụ ma ọ naghị eme ya eme+ yiri onye rụrụ ụlọ n’elu ala n’atọghị ntọala. Osimiri sọkwasịrị ya, ụlọ ahụ wee dakpọọ ozugbo, laakwa n’iyi.”

7 Mgbe ọ gwachara ìgwè mmadụ ahụ ihe niile ọ chọrọ ịgwa ha, ọ banyere Kapaniọm. 2 Ma, e nwere otu onyeisi ndị agha ohu ya ọ hụrụ n’anya na-arịa ọrịa, nọrọkwa n’ọnụ ọnwụ.+ 3 Mgbe ọ nụrụ banyere Jizọs, o ziri ụfọdụ ndị okenye ndị Juu ka ha gaa rịọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya. 4 Ha bịakwutere Jizọs malite ịrịọsi ya ike, sị: “Nwoke a kwesịrị ka i meere ya ihe a, 5 n’ihi na ọ hụrụ obodo anyị n’anya, ọ rụkwaara anyị ụlọ nzukọ.” 6 N’ihi ya, Jizọs sooro ha gawa. Ma mgbe o rutewere ụlọ onyeisi ndị agha ahụ nso, nwoke ahụ ziri ndị enyi ya ka ha gwa Jizọs, sị: “Nna anyị ukwu, enyela onwe gị nsogbu, n’ihi na ekwesịghị m ka ị bata n’ụlọ m.+ 7 Ọ bụ ya mere na mụ abịaghị n’onwe m. Kama kwuo naanị okwu, ahụ́ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi mma. 8 N’ihi na n’agbanyeghị na m nọ n’okpuru ndị ọzọ, e nwekwara ndị agha nọ n’okpuru m. M na-asị onye agha nke a, ‘Gawa!’ ya agawa. M na-asịkwa onye nke ọzọ, ‘Bịa!’ ya abịa. M na-asịkwa ohu m, ‘Mee nke a!’ ya emee ya.” 9 Mgbe Jizọs nụrụ ihe ndị a, o juru ya anya, ya atụgharịa chee ìgwè mmadụ na-eso ya n’azụ ihu, sị ha: “Ana m asị unu, ahụtụbeghị m onye okwukwe ya siri ike otú a n’Izrel.”+ 10 Mgbe ndị ahụ e ziri ozi laghachiri n’ụlọ ahụ, ha hụrụ na ahụ́ adịla ohu ahụ mma.+

11 Obere oge ihe a mechara, ọ gawara obodo a na-akpọ Nen, ndị na-eso ụzọ ya na ìgwè mmadụ sokwa ya na-aga. 12 Ka o rutere nso n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, e nwere onye nwụrụ anwụ a na-ebupụ. Ọ bụ nwa nwoke nne ya mụrụ naanị ya.+ Nne ya bụkwa nwaanyị isi mkpe. Ọtụtụ ndị obodo ahụ sokwa ya. 13 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meteere ya ebere,+ wee sị ya: “Ebezila.”+ 14 O wee garuo nso bitụ ihe ahụ e ji buru ozu ahụ aka, ndị bu ya eguzoro otu ebe. O wee sị: “Nwa okorobịa, ana m asị gị, bilie!”+ 15 Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ, malite ikwu okwu, Jizọs akpọnyezie ya nne ya.+ 16 Egwu wee jide ha niile, ha amalitekwa ito Chineke, na-asị: “Nnukwu onye amụma abịakwutela anyị.”+ Ha ana-asịkwa, “Chineke echetala ndị ya.”+ 17 Akụkọ ihe a o mere wee gbasaa ebe niile na Judia na obodo niile gbara ya gburugburu.

18 Ndị na-eso ụzọ Jọn kọkwaara ya ihe a niile.+ 19 N’ihi ya, Jọn kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ma zie ha ka ha gakwuru Onyenwe anyị, sị ya: “Ọ̀ bụ gị bụ Onye anyị na-atụ anya ya kemgbe,+ ka è nwere onye ọzọ ga-abịa?” 20 Mgbe ụmụ nwoke ahụ bịakwutere ya, ha sịrị ya: “Jọn Onye Na-eme Baptizim ziri anyị ka anyị bịa jụọ gị, sị, ‘Ọ̀ bụ gị bụ Onye anyị na-atụ anya ya kemgbe, ka è nwere onye ọzọ ga-abịa?’” 21 N’oge ahụ, ọ gwọrọ ọtụtụ mmadụ ọrịa dị iche iche ha na-arịa,+ chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, meekwa ka ọtụtụ ndị ìsì hụwa ụzọ. 22 O wee sị ha: “Gaanụ kọọrọ Jọn ihe unu hụrụ na ihe unu nụrụ: Ndị ìsì na-ahụzi ụzọ,+ ndị ngwọrọ na-ejekwa ije. A na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe.+ A na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, a na-ezikwa ndị ogbenye ozi ọma.+ 23 Onye ihe gbasara m na-anaghị eme obi abụọ* na-enwe obi ụtọ.”+

24 Mgbe ndị Jọn ziri ozi lawara, Jizọs malitere ịgwa ìgwè mmadụ ahụ banyere Jọn, sị: “Gịnị ka unu gara ịhụ n’ala ịkpa? Ọ̀ bụ ahịhịa amị nke ifufe na-ebugharị?+ 25 Gịnịzi ka unu gara ịhụ? Ọ̀ bụ onye yi uwe mara mma?*+ N’eziokwu, ndị yi uwe mara mma ma na-ebi ndụ okomoko nọ n’ụlọ ndị eze. 26 Gịnịkwanụ ka unu gara ịhụ? Ọ̀ bụ onye amụma? N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma.+ 27 Onye a bụ onye ahụ e dere banyere ya, sị: ‘Lee, m na-ezipụ onye ozi m ga-ebu gị ụzọ bịa,* ọ ga-edozikwa ụzọ ị ga-esi bịa.’+ 28 Ana m asị unu, n’ime ndị niile ụmụ nwaanyị mụrụ, o nweghị onye ka Jọn ukwuu, ma onye dị ala n’Alaeze Chineke ka ya ukwuu.”+ 29 (Mgbe ndị ọnaụtụ na mmadụ niile nụrụ ya, ha kwuru na Chineke bụ onye ezi omume, n’ihi na ọ bụ Jọn mere ha baptizim.+ 30 Ma ndị Farisii na ndị ma Iwu ledara ndụmọdụ* Chineke nyere ha anya,+ ebe ọ bụ na Jọn emeghị ha baptizim.)

31 “Oleezi ndị m kwesịrị iji ọgbọ a tụnyere? Oleekwa ndị ha yiri?+ 32 Ha yiri ụmụaka ndị nọ ọdụ n’ọma ahịa na-agwa ibe ha, sị: ‘Anyị gbuuru unu ọjà, ma unu agbaghị egwú. Anyị bere ezigbo ákwá, ma unu ebeghị ákwá.’ 33 Jọn Onye Na-eme Baptizim bịakwara, ọ naghị ata achịcha, ọ naghịkwa aṅụ mmanya,+ ma unu na-asị: ‘Mmụọ ọjọọ ji ya.’ 34 Nwa nke mmadụ bịara na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya, ma unu na-asị: ‘Ọ na-eri oké nri, na-aṅụkwa oké mmanya. Ọ bụ enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie.’+ 35 Ma, ihe na-egosi na mmadụ ma ihe bụ ihe ndị dị mma ọ na-eme.”+

36 Ma otu onye n’ime ndị Farisii nọ na-arịọ ya ka ọ bịa na nke ya. N’ihi ya, ọ gara n’ụlọ onye Farisii ahụ nọdụ na-eri ihe na tebụl. 37 Ma, otu nwaanyị a ma n’obodo ahụ na ọ bụ onye mmehie matara na ọ nọ na-eri ihe n’ụlọ onye Farisii ahụ, o wee weta mkpọ̀ alabasta nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya.+ 38 Ọ gara n’azụ Jizọs nọrọ n’akụkụ ụkwụ ya na-ebe ákwá, ma bido iji anya mmiri ya na-ede ụkwụ ya, jirikwa ntutu isi ya na-ehicha ụkwụ ya. O jikwa nwayọọ susuo ụkwụ ya ọnụ ma wụọ mmanụ ahụ na-esi ísì ọma n’ụkwụ ya. 39 Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ Jizọs hụrụ ihe a, o kwuru n’obi ya, sị: “A sị na nwoke a bụ onye amụma n’eziokwu, ọ gaara ama onye na-ebitụ ya aka, marakwa ụdị nwaanyị ọ bụ, na ọ bụ onye mmehie.”+ 40 Ma Jizọs sịrị ya: “Saịmọn, e nwere ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ya asị: “Onye Ozizi, kwuwe.”

41 “Mmadụ abụọ ji otu onye na-agbazinye ndị mmadụ ego ụgwọ. Otu onye ji ya narị mkpụrụ ego dinarịọs* ise (500), ma onye nke ọzọ ji ya iri ise. 42 Mgbe ha na-enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ ụgwọ ha ji, ọ gbaghaara ha abụọ kpamkpam. Olee onye nke ga-aka ahụ ya n’anya?” 43 Saịmọn asị ya: “Echere m na ọ bụ onye nke ahụ ụgwọ o ji ka.” Ya asị ya: “Ị zatara ya.” 44 O wee tụgharịa lee nwaanyị ahụ anya, sị Saịmọn: “Ị̀ hụrụ nwaanyị a? Abatara m n’ụlọ gị, i nyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ. Ma nwaanyị a ji anya mmiri ya dee ụkwụ m, jirikwa ntutu isi ya hichaa ya. 45 I susughị m ọnụ,* ma kemgbe m batara, nwaanyị a akwụsịghị isusu ụkwụ m ọnụ. 46 Ị wụghị m mmanụ n’isi, ma nwaanyị a wụrụ mmanụ na-esi ísì ọma n’ụkwụ m. 47 N’ihi ya, ana m asị gị, a gbagharala ya mmehie ya n’agbanyeghị na ọ dị ọtụtụ,+ n’ihi na ọ hụrụ m n’anya nke ukwuu. Ma onye a gbaghaara ntakịrị ihe anaghị ahụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu.” 48 O wee sị nwaanyị ahụ: “A gbagharala gị mmehie gị.”+ 49 Ndị ya na ha nọ na-eri ihe na tebụl wee malite ịgwa ibe ha, sị: “Ònye bụ onye a na-agbaghara mmehie?”+ 50 Ma ọ sịrị nwaanyị ahụ: “Okwukwe gị azọpụtala gị.+ Lawa n’udo.”

8 Mgbe obere oge gachara, ọ gara n’obodo ukwu na n’obodo nta dị iche iche, na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.+ Ndịozi ya iri na abụọ sokwa ya, 2 ha na ụmụ nwaanyị ụfọdụ a gwọrọ ọrịa dị iche iche, chụpụkwa ndị mmụọ ọjọọ ji ha. Ụmụ nwaanyị ndị ahụ bụ: Meri onye a na-akpọ Magdalin, onye mmụọ ọjọọ asaa si n’ahụ́ ya pụta, 3 Joana+ nwunye Kuza, bụ́ nwoke na-elekọta ụlọ Herọd, Suzana na ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị ọzọ, ndị ji ihe ha nwere na-ejere ya na ndịozi ya ozi.+

4 Ma mgbe ìgwè mmadụ na ndị si n’obodo dị iche iche bịakwute ya gbakọtara, o mere otu ihe atụ,+ sị: 5 “Ọgha mkpụrụ gawara ịgha mkpụrụ ya. Ka ọ nọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ n’ime ha dara n’akụkụ ụzọ, a zọọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ abịa tụrụchaa ha.+ 6 Ụfọdụ dara n’elu nkume. Mgbe ha pulitere, ha kpọnwụrụ n’ihi na mmiri ha ga-amịrị adịghị.+ 7 Ụfọdụ dara n’ebe ogwu juru. Ogwu ndị ha na ha tolitekọrọ wee kpagbuo ha.+ 8 Ma ndị ọzọ dara n’ala dị mma. Mgbe ha pulitere, ha mịrị mkpụrụ okpukpu otu narị (100).”+ Ka ọ na-ekwu ihe ndị a, ya asị: “Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”+

9 Ma ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ihe atụ a pụtara.+ 10 Ya asị: “Ọ bụ unu ka Chineke mere ka unu ghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ nke Alaeze Chineke. Ma a na-emere ndị ọzọ ihe atụ,+ ka ha wee na-ele anya ma ghara ịhụ ihe ọ bụla, ka ha wee na-anụ ihe ma ghara ịghọta ihe ọ bụla.+ 11 Ma leenụ ihe ihe atụ ahụ pụtara: Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke.+ 12 Ndị ahụ dara n’akụkụ ụzọ bụ ndị nụrụ okwu ahụ, Ekwensu abịa wepụ ya n’obi ha ka ha ghara ikwere, ka a gharakwa ịzọpụta ha.+ 13 Ndị ahụ dara n’elu nkume bụ ndị na-eji ọṅụ anabata okwu ahụ mgbe ha nụrụ ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ ọ bụla. Ha na-ekwere, ma ọ naghị anọte aka n’obi ha. Ha na-akwụsịkwa ikwere okwu ahụ ma ọnwụnwa bịara ha.+ 14 Ma ndị ahụ dara n’ebe ogwu juru bụ ndị nụrụ okwu ahụ, ma nchegbu na akụnụba+ na ikpori ndụ na-emegharị ha anya.+ Ihe ndị a na-akpagbu okwu ahụ ha nụrụ, ha anaghịkwa amị mkpụrụ.+ 15 Ma ndị ahụ dara n’ala dị mma bụ ndị ji ezigbo obi nụ okwu ahụ, ya adịgide n’obi ha,+ ha ana-edi nsogbu ndị bịaara ha, na-amịkwa mkpụrụ.+

16 “O nweghị onye na-amụnye ọkụ* were ihe kpuchie ya ma ọ bụ dọsa ya n’okpuru àkwà.* Kama, ọ na-adọsa ya n’elu ihe e ji adọsa ọkụ, ka ọ na-enwuru ndị na-abata n’ụlọ.+ 17 N’ihi na e nweghị ihe e zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè. E nweghịkwa ihe ọ bụla e kpuchiri nke ọma nke a na-agaghị amata, nke na-agaghịkwa apụta ìhè.+ 18 N’ihi ya, na-egenụ ntị nke ọma, n’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe ka a ga-enyekwu.+ Ma onye ọ bụla na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o chere na ya nwere.”+

19 Ma nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke+ gawara ebe ọ nọ, ma ha enweghị ike ịgaru ebe ọ nọ n’ihi ìgwè mmadụ.+ 20 Ma, a gwara ya, sị: “Nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo n’èzí, na-achọ ịhụ gị.” 21 Ya asị ha: “Nne m na ụmụnne m ndị nwoke bụ ndị a na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya.”+

22 Otu ụbọchị, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ụgbọ, o wee sị ha: “Ka anyị gafee n’ofe nke ọzọ nke mmiri a.” Ha wee jiri ụgbọ ahụ gawa.+ 23 Ma ka ha na-aga, ụra buuru ya. Oké ifufe malitekwara ife na mmiri ahụ, mmiri ana-awụbakwa n’ụgbọ ha, ya afọ obere ka ụgbọ ahụ kpuo.+ 24 N’ihi ya, ha gakwuuru ya ma kpọtee ya, sị: “Onye Ozizi, Onye Ozizi, mmiri na-achọ iri anyị!” Mgbe o tetara, ọ baara ifufe na ebili mmiri ahụ mba, ha adajụọ, ebe niile adaa jụụ.+ 25 O wee sị ha: “Ùnu nwekwara okwukwe?” Ma ezigbo ụjọ tụrụ ha, ya ejukwa ha anya, ha ana-asị ibe ha: “Onye a ọ̀ bụdị onye? Ifufe na oké osimiri na-erubedịrị ya isi.”+

26 Ha wee kwụsị n’ikpere mmiri dị n’obodo ndị Geresa,+ nke chere Galili ihu. 27 Ma mgbe Jizọs pụtara n’elu ala, ya na otu nwoke mmụọ ọjọọ ji, nke si n’obodo ahụ, zuru n’ụzọ. Ọ dịkwala anya nwoke ahụ na-eyibeghị ákwà. Ọ naghịkwa anọ n’ụlọ, kama ọ na-anọ ebe a na-eli ozu.*+ 28 Mgbe ọ hụrụ Jizọs, o tisiri mkpu ike ma sekpuru ala n’ihu ya, jirikwa oké olu, sị: “Jizọs, Ọkpara Chineke Onye Kacha Elu, gịnị jikọrọ mụ na gị? Biko, emekpala m ahụ́.”+ 29 (N’ihi na Jizọs nọ na-agwa mmụọ ọjọọ ahụ* ka o si n’ime nwoke ahụ pụta. Mmụọ ọjọọ ahụ na-enyekarị nwoke ahụ nsogbu.*+ A na-ekekwa nwoke ahụ agbụ ígwè, tụọ ya ịga ugboro ugboro, na-echekwa ya nche. Ma ọ na-adọbi agbụ ndị ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ na-achụbakwa ya n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị.) 30 Jizọs jụrụ ya, sị: “Gịnị bụ aha gị?” Ya asị: “Ìgwè,” n’ihi na ọtụtụ mmụọ ọjọọ abanyela n’ime ya. 31 Ha nọkwa na-arịọsi ya ike ka ọ ghara ịgwa ha ka ha baa n’abis.*+ 32 Ma, e nwere ìgwè ézì+ ndị nọ n’ugwu dị ebe ahụ na-ata ahịhịa. N’ihi ya, ha rịọrọ ya ka o kwe ka ha banye n’ime ézì ndị ahụ. O wee kwe ha.+ 33 Mmụọ ọjọọ ndị ahụ wee si n’ime nwoke ahụ pụọ banye n’ime ézì ndị ahụ. Ìgwè ézì ahụ nuuru daba n’ọdọ mmiri, mmiri erie ha. 34 Ma mgbe ndị na-azụ ézì ndị ahụ hụrụ ihe merenụ, ha gbaara ọsọ gaa n’obodo ha nakwa gburugburu ya kọọ ihe merenụ.

35 Ma ndị mmadụ pụtara ka ha hụ ihe merenụ. Ha wee bịakwute Jizọs ma hụ nwoke ahụ mmụọ ọjọọ si n’ime ya pụta ka o yi uwe, nọrọ ọdụ n’akụkụ ụkwụ Jizọs, isi kpakọkwara ya ọnụ. Egwu wee tụọ ha. 36 Ndị hụrụ otú ihe ahụ si mee kọọrọ ndị ahụ bịaranụ otú e si mee ka ahụ́ dị nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji mma. 37 Ọtụtụ ndị si obodo ndị gbara Geresa gburugburu gwara Jizọs ka o si ebe ha nọ pụọ, n’ihi na ezigbo ụjọ ji ha. O wee banye n’ụgbọ mmiri ka ọ pụọ. 38 Ma, nwoke ahụ mmụọ ọjọọ jibu nọ na-arịọ ya ka ya soro ya. Ma ọ gwara nwoke ahụ ka ọ lawa, sị:+ 39 “Laghachi n’ụlọ gị, na-akọkwa ihe Chineke meere gị.” O wee lawa, na-akọsa n’obodo ahụ niile ihe Jizọs meere ya.

40 Mgbe Jizọs laghachiri Galili, ndị obodo ahụ nabatara ya nke ọma, n’ihi na ha niile nọ na-atụ anya ya.+ 41 Ma, otu nwoke aha ya bụ Jaịrọs bịara. Nwoke a bụ onyeisi oche ụlọ nzukọ. O wee gbuo ikpere n’ala n’ihu Jizọs, malite ịrịọsi ya ike ka ọ bịa n’ụlọ ya,+ 42 n’ihi na otu nwa nwaanyị ọ mụrụ naanị ya, onye dị ihe dị ka afọ iri na abụọ, nọ n’ọnụ ọnwụ.

Ka Jizọs nọ na-aga, ìgwè mmadụ nọ na-adagide ya. 43 E nwere otu nwaanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara+ kemgbe afọ iri na abụọ. O nwebeghịkwa onye nwere ike ịgwọ ya.+ 44 O si n’azụ bịaruo Jizọs nso ma bitụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka.+ Ozugbo ahụkwa, ọrịa oruru ọbara na-arịa ya akwụsị. 45 Jizọs wee sị: “Ònye bitụrụ m aka?” Mgbe ha niile nọ na-agọ agọ, Pita sịrị: “Onye Ozizi, ìgwè mmadụ gbara gị gburugburu ma na-adagide gị.”+ 46 Ma Jizọs sịrị: “O nwere onye bitụrụ m aka, n’ihi na ama m na ike+ pụrụ m n’ahụ́.” 47 Mgbe nwaanyị ahụ hụrụ na Jizọs amatala ihe o mere, ọ maara jijiji bịa sekpuru ala n’ihu ya, kwuokwa n’ihu mmadụ niile ihe mere o ji bitụ ya aka na otú e si gwọọ ya ozugbo. 48 Ma ọ sịrị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma. Lawa n’udo.”+

49 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, otu onye na-anọchite anya onyeisi oche ụlọ nzukọ bịara, sị: “Nwa gị nwaanyị anwụọla. Enyezila Onye Ozizi nsogbu.”+ 50 Mgbe Jizọs nụrụ ihe a, ya asị Jaịrọs: “Atụla egwu, naanị nwee okwukwe, ọ ga-adịkwa ndụ.”*+ 51 Mgbe o rutere, o kweghị ka onye ọ bụla soro ya banye n’ụlọ ahụ ma e wezụga Pita, Jọn, Jems na nne na nna nwata nwaanyị ahụ. 52 Ma mmadụ niile nọ na-ebe ákwá, na-eti aka n’obi, na-eru uju maka na ọ nwụọla. O wee sị ha: “Kwụsịnụ ibe ákwá,+ n’ihi na ọ nwụghị anwụ, kama ọ na-ehi ụra.”+ 53 Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo, n’ihi na ha ma na ọ nwụọla. 54 Ma o seere ya n’aka ma sị ya: “Nwatakịrị, bilie!”+ 55 O wee dịrị ndụ,*+ biliekwa ozugbo,+ Jizọs agwa ha ka e nye ya nri ka o rie. 56 Aṅụrị wee ju nne ya na nna ya obi. Ma, Jizọs gwara ha ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe merenụ.+

9 O wee kpọkọta ndịozi ya iri na abụọ, nye ha ikike ịgwọ ọrịa+ na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ niile.+ 2 O zipụkwara ha ka ha gaa kwusaa gbasara Alaeze Chineke ma gwọọ ọrịa. 3 Ọ gwakwara ha, sị: “Unu ewerela ihe ọ bụla maka njem a. Unu ejila mkpara ma ọ bụ obere akpa nri, ma ọ bụ achịcha ma ọ bụ ego.* Unu achịkwala uwe abụọ.*+ 4 Kama n’ụlọ ọ bụla unu banyere, nọrọnụ ebe ahụ ruo mgbe unu ga-apụ.+ 5 N’obodo ọ bụla ndị mmadụ na-anabataghịkwa unu, mgbe unu si na ya na-apụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu ka ọ bụụrụ ha ihe àmà.”+ 6 Ha wee gaa n’obodo niile, na-ezisa ozi ọma, na-agwọkwa ọrịa ebe niile.+

7 Herọd* onye na-achị ógbè ahụ wee nụ ihe niile na-emenụ. Ihe a niile gbakwara ya gharịị n’ihi na ụfọdụ nọ na-asị na a kpọlitela Jọn n’ọnwụ.+ 8 Ma ndị ọzọ na-asị na Ịlaịja apụtala, ndị ọzọ ana-asịkwa na otu n’ime ndị amụma oge ochie esila n’ọnwụ bilie.+ 9 Herọd sịrị: “Ọ bụ m gbupụrụ Jọn isi.+ Ònyezi bụ onye a m na-anụ ọtụtụ ihe gbasara ya?” N’ihi ya, ọ nọ na-achọsi ike ịhụ onye ọ bụ.+

10 Mgbe ndịozi ahụ lọtara, ha kọọrọ Jizọs ihe niile ha mere.+ O wee kpọrọ ha gaa ebe naanị ha ga-anọ n’obodo a na-akpọ Betsaịda.+ 11 Ma mgbe ìgwè mmadụ ahụ matara, ha chọọrọ ya gawa. Ọ nabatakwara ha nke ọma, malite ịgwa ha gbasara Alaeze Chineke. Ọ gwọkwara ndị ahụ́ na-adịghị.+ 12 Mgbe chi jiwere, ndịozi ya iri na abụọ bịara sị ya: “Gwa ìgwè mmadụ a ka ha lawa, ka ha gaa n’ime obodo nakwa n’obodo nta ndị dị gburugburu ebe a chọta ebe ha ga-ehi na ihe ha ga-eri, n’ihi na ndị mmadụ anaghị anọkarị ebe a anyị nọ.”+ 13 Ma ọ sịrị ha: “Nyenụ ha nri ka ha rie.”+ Ha asị: “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ka anyị nwere. Oleekwa otú anyị ga-esi azụta ihe mmadụ niile a ga-eri?” 14 N’eziokwu, ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise nọ ebe ahụ. Ma ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Hazienụ ha n’ìgwè n’ìgwè, ka ha nọdụkwa ala, ihe dị ka mmadụ iri ise mmadụ iri ise.” 15 Ha wee hazie ha otú ahụ, ha niile anọdụkwa ala. 16 O wee were ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe kpee ekpere.* O wee nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha nye ìgwè mmadụ ahụ. 17 Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nkata iri na abụọ.+

18 E mechaa, mgbe naanị ya nọ na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, ya ajụọ ha, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”+ 19 Ha asị: “Jọn Onye Na-eme Baptizim. Ma ndị ọzọ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọkwa na-asị na otu n’ime ndị amụma oge ochie esila n’ọnwụ bilie.”+ 20 Ya asị ha: “Ma, ònye ka ununwa chere na m bụ?” Pita asị: “Kraịst nke Chineke.”+ 21 O wee gwasie ha ike ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla ihe a.+ 22 Ma ọ sịrị ha: “Nwa nke mmadụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ, ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ajụkwa ya, a ga-egbukwa ya.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.”+

23 O wee gwa mmadụ niile, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya+ ma buru osisi ịta ahụhụ* ya kwa ụbọchị na-eso m.+ 24 N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta ndụ* ya ga-atụfu ya, ma onye ọ bụla nke tụfuru ndụ* ya n’ihi m ga-azọpụta ya.+ 25 N’eziokwu, olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ ya ma ọ bụ merụọ onwe ya ahụ́?+ 26 N’ihi na onye ọ bụla ihere ịbụ onye na-eso ụzọ m na ihere okwu m na-eme, ihere onye ahụ ga-eme Nwa nke mmadụ mgbe ọ ga-abịa n’ebube ya na n’ebube Nna ya nakwa nke ndị mmụọ ozi dị nsọ.+ 27 Ma n’eziokwu, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo ebe a na-agaghị anwụ ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Alaeze Chineke.”+

28 N’eziokwu, ihe dị ka ụbọchị asatọ o kwuchara ihe ndị a, ọ kpọọrọ Pita, Jọn, na Jems gbagoo n’ugwu ka o kpee ekpere.+ 29 Ka ọ nọkwa na-ekpe ekpere, ihu ya gbanwere, uwe ya ana-enwukwa gbaa. 30 Ya na ụmụ nwoke abụọ nọkwa na-akparịta ụka. Ha bụ Mosis na Ịlaịja. 31 Ndị a pụtara ìhè n’ebube ma malite ikwu gbasara otú Jizọs ga-esi si n’ụwa laa, nke ga-eme na Jeruselem.+ 32 Ma ụra buuru Pita na ndị ya na ha nọ. Mgbe ha tetara, ha hụrụ ebube Jizọs,+ hụkwa ụmụ nwoke abụọ ahụ ha na ya guzo. 33 Mgbe ụmụ nwoke abụọ ahụ si ebe ọ nọ na-apụ, Pita sịrị Jizọs: “Onye Ozizi, ọ dị mma na anyị nọ ebe a. N’ihi ya, ka anyị maa ụlọikwuu atọ, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Ịlaịja.” Ma ọ maghị ihe ọ na-ekwu. 34 Ma ka ọ na-ekwu ihe ndị a, ígwé ojii malitere ikpuchi ha. Ka ha banyere n’ígwé ojii ahụ, ụjọ tụwara ha. 35 Otu olu+ sikwa n’ígwé ojii ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họọrọ.+ Geenụ ya ntị.”+ 36 Mgbe olu ahụ nọ na-ekwu okwu, ha hụziri naanị Jizọs. Ma n’oge ahụ, ha akọrọghị onye ọ bụla ihe ha hụrụ.+

37 N’echi ya, mgbe ha si n’ugwu ahụ gbadata, ìgwè mmadụ zutere ya.+ 38 Ma, otu nwoke nke so n’ìgwè mmadụ ahụ tiri mkpu, sị: “Onye Ozizi, biko, nyere nwa m nwoke aka,* n’ihi na ọ bụ naanị ya ka m mụrụ.+ 39 Ma, mmụọ ọjọọ na-enye ya nsogbu. Ọ na-abụ ya nọkata, ya etiwe mkpu. Ihe ọdụdọ na-adọkwa ya, ya ana-agbọ ụfụfụ n’ọnụ. Ọ na-esikwara ya ike ịhapụ ya ma o merụchaa ya ahụ́. 40 Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ ya, ma ha enweghị ike ịchụpụ ya.” 41 Jizọs asị ya: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke rụkwara arụ,+ ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ tupu unu enwee okwukwe? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme? Kpọta nwa gị ebe a.”+ 42 Ma ka nwa ahụ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kụrụ ya n’ala, meekwa ka ihe ọdụdọ dọsie ya ike. Ma, Jizọs baara mmụọ ọjọọ ahụ* mba ma gwọọ nwatakịrị nwoke ahụ, kpọnyekwa ya nna ya. 43 Ma, ike dị ebube Chineke nwere tụrụ ha niile n’anya.

Ka ihe niile Jizọs na-eme nọ na-atụ ha niile n’anya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: 44 “Geenụ ntị nke ọma, chetakwanụ ihe a, na a ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ.”+ 45 Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-ekwu. N’eziokwu, e zochiiri ha ya ka ha ghara ịghọta ya, egwu ekweghịkwa ha ịjụ ya ajụjụ gbasara okwu a.

46 Ha wee malite ise okwu, na-azọ onye ọ bụ ya kacha ukwuu n’ime ha.+ 47 Ebe Jizọs ma ihe ha na-eche n’obi ha, ọ kpọrọ otu nwatakịrị, gwa ya ka o guzoro n’akụkụ ya, 48 wee sị ha: “Onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị a n’aha m na-anabatakwa m. Onye ọ bụla nke na-anabata m na-anabatakwa onye zitere m.+ N’ihi na onye na-eme onwe ya ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.”+

49 Jọn wee sị: “Onye Ozizi, anyị hụrụ onye ji aha gị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, anyị gbalịkwara igbochi ya n’ihi na ọ naghị eso anyị.”+ 50 Ma Jizọs sịrị ya: “Unu anwala igbochi ya, n’ihi na onye na-anaghị emegide unu dịnyeere unu.”

51 Mgbe ụbọchị Jizọs ga-alaghachi eluigwe ruwere nso,+ o kpebisiri ike ịga Jeruselem. 52 N’ihi ya, o zipụrụ ndị ozi ka ha buru ya ụzọ gawa. Ha wee gawa ma banye n’otu obodo nke dị na Sameria, ịga kwadebere ya ihe. 53 Ma ha anabataghị ya,+ n’ihi na o kpebiri ịga Jeruselem. 54 Mgbe Jems na Jọn, bụ́ ndị na-eso ụzọ ya,+ hụrụ ihe merenụ, ha sịrị: “Onyenwe anyị, ị̀ chọrọ ka anyị kwuo ka ọkụ si n’eluigwe daa laa ha n’iyi?”+ 55 Ma ọ tụgharịrị baara ha mba. 56 Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya wee gawa obodo ọzọ.

57 Ma ka ha na-aga n’ụzọ, otu onye sịrị ya: “M ga-eso gị jee ebe ọ bụla ị na-eje.” 58 Jizọs wee sị ya: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, nnụnụ nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ na-atọgbọ isi ya.”+ 59 O wee gwa onye ọzọ, sị: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” Nwoke ahụ asị ya: “Onyenwe anyị, hapụ m ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”+ 60 Ma ọ sịrị ya: “Hapụ ndị nwụrụ anwụ+ ka ha lie ndị ha nwụrụ anwụ, ma gaa kwusaa Alaeze Chineke n’ebe niile.”+ 61 Onye ọzọ sịkwara: “M ga-eso gị, Onyenwe anyị. Ma hapụgodị m ka m sị ndị ezinụlọ m ka e mesịa.” 62 Jizọs sịrị ya: “O nweghị onye jidere aka n’ọ́gụ̀ ma na-ele anya n’ihe ndị dị n’azụ+ nke kwesịrị iketa Alaeze Chineke.”+

10 Mgbe ihe ndị a mechara, Onyenwe anyị họpụtakwuru mmadụ iri asaa ma zipụ ha abụọ abụọ+ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo ọ bụla na ebe ọ bụla ọ ga-aga. 2 O wee sị ha: “N’eziokwu, ihe a ga-ewe n’ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. N’ihi ya, na-arịọnụ onye nwe ubi ahụ ka o zite ndị ọrụ n’ubi ya.+ 3 Gaanụ. M na-eziga unu dị ka ụmụ atụrụ nọ ebe anụ ọhịa wolf nọ.+ 4 Unu ewerela akpa ego ma ọ bụ obere akpa nri ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ.+ Unu ekelekwala onye ọ bụla* n’okporo ụzọ. 5 N’ụlọ ọ bụla unu bara, burunụ ụzọ sị: ‘Udo dịrị ụlọ a.’+ 6 Ọ bụrụ na onye udo anọghị ebe ahụ, udo unu ga-alọghachikwute unu. Ma ọ bụrụ na onye udo nọ ebe ahụ, ọ ga-enwe udo unu sị ka o nwee. 7 N’ihi ya, nọrọnụ n’ụlọ ahụ,+ na-erinụ ihe, na-aṅụkwanụ ihe ha nyere unu,+ n’ihi na e kwesịrị ịkwụ onye ọrụ ụgwọ ọrụ ya.+ Unu esikwala n’ụlọ e nyere unu gaa biri n’ụlọ ọzọ.

8 “N’obodo ọ bụla unu bara, ha anabata unu, rienụ nri ha nyere unu, 9 gwọọkwanụ ndị na-arịa ọrịa ebe ahụ, sịkwanụ ha: ‘Alaeze Chineke adịla nso.’+ 10 Ma n’obodo ọ bụla unu bara ma ha anabataghị unu, gaanụ n’okporo ámá ya, sị: 11 ‘Anyị na-etichapụrụ unu ájá anyị zọọrọ n’obodo unu.+ Ma, burunụ n’uche na Alaeze Chineke adịla nso.’ 12 Ana m asị unu na ọ ga-adịrị Sọdọm mfe n’ụbọchị ahụ karịa obodo ahụ.+

13 “Korezin na Betsaịda, unu ga-ata ezigbo ahụhụ, n’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ na Taya na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube ndị a rụrụ n’ime unu, ha gaara echegharị kemgbe, yiri ákwà iru uju nọdụ ọdụ ná ntụ.+ 14 N’ihi ya, ọ ga-adịrị Taya na Saịdọn mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa unu. 15 Gịnwa kwa, Kapaniọm, à ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Ị ga-agbadaru n’ili.*

16 “Onye ọ bụla na-ege unu ntị na-ege m ntị.+ Onye ọ bụla na-eleda unu anya na-eledakwa m. Onye ọ bụla na-eleda m anya na-eledakwa onye zitere m.”+

17 Mmadụ iri asaa ahụ wee lọta, na-aṅụrị ọṅụ, na-asị: “Onyenwe anyị, anyị ji aha gị mee ka ndị mmụọ ọjọọ rubere anyị isi.”+ 18 O wee sị ha: “Ahụrụ m Setan ka ọ dara+ dị ka àmụ̀mà nke si n’eluigwe. 19 Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ na imeri ike niile nke onye iro.+ E nweghịkwa ihe ga-emerụ unu ahụ́. 20 Ma, unu aṅụrịla ọṅụ maka na ndị mmụọ ọjọọ na-erubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ maka na e deela aha unu n’eluigwe.”+ 21 N’oge ahụ, mmụọ nsọ mere ka ọṅụ ju Jizọs obi, ya asị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m eto gị n’ihu ọha n’ihi na i zochiiri ndị ma ihe na ndị ọkachamara+ ihe ndị a nke ọma ma mee ka ụmụaka mara ha. Nna, ọ bụ otú ị chọrọ ya.+ 22 Nna m enyefeela m ihe niile, o nweghịkwa onye ma m* ma e wezụga Nna m.+ O nweghịkwa onye ma Nna m ma e wezụga m na onye ọ bụla m chọrọ ịkụziri gbasara ya.”+

23 O wee gwa ndị na-eso ụzọ ya mgbe naanị ya na ha nọ, sị: “Ndị na-ahụ ihe ndị unu na-ahụ na-enwe obi ụtọ.+ 24 N’ihi na ana m asị unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị eze chọrọ ịhụ ihe ndị unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha,+ ha chọkwara ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.”

25 Ma, otu nwoke ma Iwu biliri ka ọ nwaa ya, wee sị ya: “Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”+ 26 Ya asị ya: “Gịnị ka e dere n’Iwu? Gịnị ka ị gụtara?” 27 Ya azaa, sị: “‘Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile na ike gị niile na uche gị niile hụ Jehova* bụ́ Chineke gị n’anya,+ hụkwa ‘onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.’”+ 28 O wee sị ya: “Ị zatara ya. Na-eme ya, ị ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi.”+

29 Ma, ebe nwoke ahụ chọrọ igosi na ya bụ onye ezi omume,+ ọ sịrị Jizọs: “Ònye n’eziokwu bụ onye agbata obi m?” 30 Jizọs asị: “Otu nwoke si Jeruselem na-agbada Jeriko ma daba n’aka ndị ohi. Ha agbaa ya ọtọ, kụọkwa ya ihe, wee pụọ, hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma. 31 Ma ọ dabara na otu onye nchụàjà nọ na-agbada n’okporo ụzọ ahụ. Ma mgbe ọ hụrụ ya, ya esi n’akụkụ nke ọzọ gafere. 32 Mgbe onye Livaị rutekwara ebe ahụ hụ ya, ya esi n’akụkụ nke ọzọ gafere. 33 Ma otu onye Sameria+ nke si n’ụzọ ahụ na-agafe rutere ebe ọ nọ. Mgbe ọ hụrụ ya, ya emetere ya ebere. 34 N’ihi ya, ọ gakwuuru ya wee kechie ọnyá ndị dị ya n’ahụ́, wụkwasị ha mmanụ na mmanya. O wee kukwasị ya n’elu anụmanụ ya ma bute ya n’ụlọ ndị njem wee lekọta ya. 35 N’echi ya, o wepụtara mkpụrụ ego dinarịọs* abụọ, nye onye na-elekọta ụlọ ndị njem ahụ, sị ya: ‘Lekọtawa ya. M ga-akwụ gị ihe ọ bụla i mefuru n’elu nke a mgbe m ga-abịaghachi ebe a.’ 36 Ònye n’ime mmadụ atọ a ka i chere gosiri na ọ bụ onye agbata obi+ nwoke ahụ dabara n’aka ndị ohi?” 37 O wee sị ya: “Ọ bụ onye nke meteere ya ebere.”+ Jizọs asịzie ya: “Gawa, na-emekwa otú ahụ.”+

38 Ma ka ha nọ na-aga, ọ banyere n’otu obodo. N’ebe a, otu nwaanyị aha ya bụ Mata+ nabatara ya n’ụlọ ya. 39 Nwaanyị a nwekwara nwanne nwaanyị. Aha ya bụ Meri. Ọ nọdụrụ ala n’akụkụ ụkwụ Onyenwe anyị ma na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu. 40 Ma ọtụtụ ihe Mata nọ na-eme mere ka ọ ghara ige ntị n’ihe Jizọs na-ekwu. N’ihi ya, ọ gakwuuru Jizọs wee sị ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na ị hụghị na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ihe niile ka m mewe? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41 Onyenwe anyị asị ya: “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe. 42 Ma, ọtụtụ ihe adịghị anyị mkpa. Otu ihe ezuola. Meri họọrọ ihe ka mma,+ a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.”

11 Otu ụbọchị, mgbe o kpechara ekpere, otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere, dị ka Jọn kụziiri ndị na-eso ụzọ ya.”

2 O wee sị ha: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ: ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ.+ Ka Alaeze gị bịa.+ 3 Nye anyị nri ga-ezuru anyị n’ụbọchị ọ bụla.+ 4 Gbaghara anyị mmehie anyị,+ n’ihi na anyịnwa na-agbagharakwa onye ọ bụla mehiere anyị.*+ Ekwekwala ka a nwata anyị.”*+

5 Ọ sịkwara ha: “Ka e were ya na otu n’ime unu nwere enyi, ya agakwuru ya n’etiti abalị wee sị ya, ‘Enyi m, gbazinye m ogbe achịcha atọ, 6 n’ihi na otu enyi m si ebe dị anya bịa n’ụlọ m, enweghịkwa m ihe m ga-enye ya.’ 7 Onye ahụ esi n’ime ụlọ sị ya: ‘Enyezila m nsogbu. Akpọchiela m ụzọ, mụ na ụmụntakịrị m edinarakwala n’àkwà.* Enwekwaghị m ike ibili nye gị ihe ọ bụla.’ 8 Ana m asị unu, ọ bụrụgodị na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọ bụla maka na ọ bụ enyi ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọ chọrọ maka na ọ nọgidesiri ike na-arịọ ya.+ 9 N’ihi ya, ana m asị unu, na-arịọnụ,+ a ga-enye unu. Na-achọnụ, unu ga-achọta. Na-akụnụ aka n’ụzọ, a ga-emeghere unu ya.+ 10 N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta,+ onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, onye ọ bụla nke na-akụkwa aka n’ụzọ ka a ga-emeghere ụzọ. 11 N’eziokwu, ònye n’ime unu bụ́ nna ka nwa ya ga-arịọ azụ̀, ya enye ya agwọ kama inye ya azụ̀,+ 12 ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ rịọ ya àkwá, ya enye ya akpị? 13 N’ihi ya, ọ bụrụ na unu ma otú e si enye ụmụ unu ezigbo onyinye, ọ bụ eziokwu na unu bụ ndị ajọ omume, ọ̀ bụ na Nna unu nke nọ n’eluigwe agaghị enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ ha na-arịọ ya?”+

14 E mechaa, ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ mere ka otu nwoke daa ogbi.+ Mgbe ọ chụpụchara mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ ekwuwe okwu. Ọ tụkwara ìgwè mmadụ ahụ n’anya.+ 15 Ma ụfọdụ n’ime ha sịrị: “Ọ bụ ike Bielzebọb,* onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ, ka o ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 16 Ma, ndị ọzọ gwara ya ka ọ rụọ ọrụ ebube+ n’aha Chineke iji nwaa ya. 17 Ebe ọ ma ihe ha na-eche,+ ọ sịrị ha: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya ga-ada. Ezinụlọ ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya agaghị adịgide. 18 Ọ bụrụkwa na Setan ekewaa na-emegide onwe ya, olee otú alaeze ya ga-esi kwụrụ? N’ihi na unu na-ekwu na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ. 19 Ọ bụrụ na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ ike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ọ bụ ya mere ha ga-eji bụrụ ndị ga-ekpe unu ikpe. 20 Ma ọ bụrụ na ọ bụ ike Chineke*+ ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, n’eziokwu, Alaeze Chineke akwaala unu.+ 21 Ọ bụrụ na onye siri ike achịrị ngwá agha na-eche obí ya nche, o nweghị ihe na-eme ihe ndị o nwere. 22 Ma ọ bụrụ na onye ka ya ike alụso ya ọgụ wee merie ya, ọ ga-eburu ngwá agha ya niile ọ tụkwasịrị obi pụọ, kesaakwa ihe ndị ọ naara ya. 23 Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m. Onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.+

24 “Mgbe mmụọ ọjọọ* si n’ime mmadụ pụọ, ọ na-aga ebe mmiri na-adịghị ka ọ chọta ebe ọ ga-ezu ike. Ọ bụrụ na ọ chọtaghị, ọ na-asị, ‘M ga-alaghachi n’ụlọ m ebe m si pụọ.’+ 25 Mgbe o rukwara, ọ na-ahụ na a zachaala ụlọ ahụ nke ọma, chọọkwa ya mma. 26 Ọ na-agazi kpọrọ mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya. Mgbe ha banyere, ha na-ebiri ebe ahụ. Ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ na-akazi nke mbụ njọ.”

27 Ma ka ọ nọ na-ekwu ihe ndị a, otu nwaanyị nke so n’ìgwè mmadụ ahụ sịrị ya: “Nwaanyị mụrụ gị ma nye gị ara na-enwe obi ụtọ.”+ 28 Ma ọ sịrị: “Mba, kama ọ bụ ndị na-anụ okwu Chineke ma na-eme ya na-enwe obi ụtọ.”+

29 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ nọ na-ezukọta, ọ malitere ịsị: “Ọgbọ a bụ ọgbọ ọjọọ. Ọ na-achọ ihe àmà. Ma o nweghị ihe àmà a ga-egosi ya ma ọ́ bụghị ọrụ ebube ahụ a rụụrụ Jona.+ 30 N’ihi na otú ahụ ihe mere Jona+ si bụụrụ ndị Ninive ihe àmà, ka Nwa nke mmadụ ga-esi abụrụ ọgbọ a. 31 A ga-akpọlite eze nwaanyị ndịda+ na ọgbọ a n’Ụbọchị Ikpe, ọ ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụ okwu onye amamihe Solomọn na-ekwu. Ma, onye ka Solomọn nọ ebe a.+ 32 Ndị Ninive na ọgbọ a ga-ebili n’Ụbọchị Ikpe. Ndị Ninive ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ ihe Jona kwusara.+ Ma, onye ka Jona nọ ebe a. 33 Mmadụ mụnye ọkụ,* ọ naghị adọsa ya n’ebe zoro ezo ma ọ bụ n’okpuru nkata, kama, ọ na-adọsa ya n’elu ihe e ji adọsa ọkụ+ ka ọ na-enwuru ndị na-abata n’ụlọ. 34 Anya dị ka ihe na-enye ahụ́ ìhè. Ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe,* ahụ́ gị niile ga-abụ ìhè ìhè. Ma ọ bụrụ na ihe anya gị na-ahụ na-eme ka ị bụrụ onye anyaụfụ,* ahụ́ gị niile ga-agba ọchịchịrị.+ 35 N”ihi ya, kpachara anya ka ìhè dị n’ime gị ghara ịbụ ọchịchịrị. 36 Ọ bụrụ na ahụ́ gị niile bụ ìhè ìhè n’enweghị ebe gbara ọchịchịrị, ọ ga na-enwu gbaa ka ebe ọkụ* na-enye gị ìhè.”

37 Mgbe o kwuchara ihe a, otu onye Farisii gwara ya ka o soro ya rie nri. O wee gaa n’ụlọ ya ma nọdụ ala na-eri ihe na tebụl. 38 Ma, o juru onye Farisii ahụ anya mgbe ọ hụrụ na o bughị ụzọ kwọọ aka* tupu ya eriwe nri.+ 39 Ma Onyenwe anyị sịrị ya: “Unu ndị Farisii, unu na-eme ka azụ iko na azụ efere dị ọcha, ma ihe juru n’obi unu bụ anyaukwu na ime ihe ọjọọ.+ 40 Ndị na-enweghị uche, ọ́ bụghị onye kere elu ahụ́ anyị kekwara ime ahụ́ anyị? 41 Ma, werenụ ihe dị n’ime nye onyinye ebere,* ihe niile gbasara unu ga-adịkwa ọcha. 42 Ma unu ndị Farisii ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ mint na mkpá akwụkwọ ruu na nke akwụkwọ ọ bụla ọzọ,+ ma unu na-eleghara ịhụ Chineke n’anya na ikpe ikpe ziri ezi anya. Unu kwesịrị ịna-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị ahụ, ma unu ekwesịghị ileghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu anya.+ 43 Unu ndị Farisii ga-ata ahụhụ, n’ihi na ọ na-atọ unu ụtọ ịnọ n’oche ihu* n’ụlọ nzukọ, nakwa ka a na-ekele unu n’ọma ahịa.+ 44 Unu ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu yiri ili*+ ndị na-apụtaghị ìhè,* nke ndị mmadụ na-eje ije n’elu ha n’amaghị ihe ha bụ.”

45 Otu n’ime ndị ma Iwu wee sị ya: “Onye Ozizi, ị na-akparịkwa anyị n’ihe ndị a ị na-ekwu.” 46 O wee sị ya: “Unu ndị ma Iwu ga-atakwa ahụhụ, n’ihi na unu na-ebo ndị mmadụ ibu siri ike obubu, ma ununwa anaghị arụtụ ibu ndị ahụ otu mkpịsị aka unu.+

47 “Unu ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu na-arụ ili* ndị amụma, ma, ọ bụ nna nna unu hà gburu ha.+ 48 N’eziokwu, unu ma ihe nna nna unu hà mere. Ma, unu nabatara ihe ha mere, n’ihi na ha gburu ndị amụma,+ ma unu na-arụ ili ha. 49 Ọ bụ ya mere amamihe Chineke ji sịkwa: ‘M ga-ezigara ha ndị amụma na ndịozi. Ha ga-egbu ụfọdụ n’ime ha, kpagbuokwa ụfọdụ, 50 ka ọbara ndị amụma niile e gburu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa wee dị n’isi ọgbọ a,+ 51 malite n’ọbara Ebel+ ruo n’ọbara Zekaraya, onye e gburu n’agbata ebe ịchụàjà na ụlọ nsọ.’+ N’eziokwu, ana m asị unu, ọbara ha ga-adị n’isi ọgbọ a.

52 “Unu ndị ma Iwu ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu ekweghị ka ndị mmadụ mara Chineke. Ununwa abanyeghị n’Alaeze Chineke, unu na-egbochikwa ndị chọrọ ịbanye.”*+

53 Mgbe o si ebe ahụ pụọ, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii malitere inye ya ezigbo nsogbu, na-ajụkwa ya ọtụtụ ajụjụ, 54 chebiri ya, ka ha jiri okwu ọnụ ya nweta ya.+

12 N’oge ahụ, mgbe ọtụtụ puku ndị mmadụ gbakọtara nke na ha nọ na-azọ ibe ha ụkwụ, ọ malitere ịgwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Lezienụ anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii, ya bụ, otú ha si dịrị ihu abụọ.+ 2 Ma e nweghị ihe ọ bụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe. E nweghịkwa ihe nzuzo a na-agaghị amata.+ 3 N’ihi ya, ihe ọ bụla unu kwuru n’ọchịchịrị, a ga-anụ ya n’ìhè. A ga-anọkwa n’elu ụlọ kwusaa ihe unu nọ n’ime ụlọ unu takwunyere mmadụ. 4 Ana m asịkwa unu, ndị enyi m,+ unu atụla egwu ndị na-egbu ahụ́, ha gbuchaa ya, ha enweghị ike ime ihe ọ bụla ọzọ.+ 5 Ma, aga m agwa unu onye unu ga-atụ egwu: Onye unu ga-atụ egwu bụ onye nwere ikike ịtụba mmadụ na Gehena*+ ma o gbuchaa ya. N’eziokwu, ana m asị unu, tụọnụ ya egwu.+ 6 Ọ̀ bụ na a naghị ere nza ise mkpụrụ ego abụọ* nke ga-azụta ntakịrị ihe? Ma, o nweghị otu n’ime ha Chineke na-echefu.*+ 7 Ọ madị ole ntutu niile dị n’isi unu dị.+ Unu atụla egwu. Unu bara uru karịa ọtụtụ nza.+

8 “Ana m asị unu, onye ọ bụla nke na-agwa ndị mmadụ na ya ma m,+ Nwa nke mmadụ ga-agwakwa ndị mmụọ ozi Chineke na ọ ma onye ahụ.+ 9 Ma, onye ọ bụla nke na-agọnahụ m n’ihu ndị mmadụ, m ga-agọnahụ ya n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke.+ 10 Onye ọ bụla nke kwuluru Nwa nke mmadụ, a ga-agbaghara ya. Ma a gaghị agbaghara onye ọ bụla kwuluru mmụọ nsọ.+ 11 Ma mgbe ha kpọọrọ unu gaa n’ebe ọha mmadụ na-ezukọ,* ma ọ bụ n’ihu ndị ọchịchị ma ọ bụ n’ihu ndị isi, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi zara ọnụ unu ma ọ bụ ihe unu ga-asa ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu,+ 12 n’ihi na mmụọ nsọ ga-agwa unu n’oge ahụ ihe unu kwesịrị ikwu.”+

13 Otu onye n’ime ìgwè mmadụ ahụ wee sị ya: “Onye Ozizi, gwa nwanne m nwoke ka mụ na ya kee akụ̀ nna anyị.” 14 Ọ sịrị ya: “Nwoke m, ònye mere m onyeikpe ma ọ bụ onye na-ekere unu ihe?” 15 Ọ gwaziri ha, sị: “Lezienụ anya ka unu ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla,+ n’ihi na mmadụ nwegodị ọtụtụ ihe, ihe o nwere anaghị eme ka ọ dị ndụ.”+ 16 O meere ha otu ihe atụ, sị: “Ala nke otu onye bara ọgaranya mepụtara ihe nke ọma. 17 N’ihi ya, ọ malitere ịgwa onwe ya, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na enweghị m ebe m ga-akwasa ihe m wetara n’ubi m?’ 18 N’ihi ya, ọ sịrị: ‘Ihe m ga-eme bụ:+ M ga-akwada ụlọ m na-akwasa ihe ma rụọ nke ka ibu. N’ebe ahụ ka m ga-akwasa mkpụrụ m niile na ihe m niile. 19 M ga-agwakwa onwe m,* sị: “I* nwere ọtụtụ ezigbo ihe ị kpakọtara ga-ezuru gị ruo ọtụtụ afọ. Tụsara ahụ́, na-eri, na-aṅụ, na-enwekwa aṅụrị.”’ 20 Ma Chineke sịrị ya: ‘Onye na-enweghị uche, n’abalị a ka a na-achọ ndụ* gị n’aka gị. Ònye ka ihe ndị ị kwakọtara ga-abụ nke ya?’+ 21 Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọtara onwe ya akụ̀ ma ọ bụghị ọgaranya n’anya Chineke.”+

22 Ọ gwaziri ndị na-eso ụzọ ya: “Ọ bụ ya mere m ji asị unu, kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere ndụ* unu maka ihe unu ga-eri, ma ọ bụ maka ihe unu ga-eyi n’ahụ́.+ 23 N’ihi na ndụ* dị mkpa karịa nri, ahụ́ dịkwa mkpa karịa ákwà. 24 Leruonụ ugoloọma anya: Ha anaghị akụ mkpụrụ, ha anaghịkwa ewe ihe ubi. Ha enweghịkwa ọba ma ọ bụ ụlọ ha na-akwasa ihe. Ma Chineke na-enye ha nri.+ Ọ̀ bụ na unu abaghị uru karịa nnụnụ?”+ 25 Ònye n’ime unu ga-agbakwụnyeli otu kubit* n’afọ ndụ ya maka na ọ na-echegbu onwe ya? 26 N’ihi ya, ọ bụrụ na unu agaghị emeli obere ihe a, gịnị mere unu ji echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ?+ 27 Leruonụ otú okooko lili si eto anya: Ha anaghị arụgbu onwe ha n’ọrụ, ha anaghịkwa akpa ogho. Ma ana m asị unu, na Solomọn eyighị uwe mara mma ka otu n’ime ha n’agbanyeghị ebube ya niile.+ 28 Ọ bụrụkwa na Chineke si otú a yiwe ahịhịa ndụ dị n’ọhịa uwe, nke dị ebe a taa, ma echi, a tụba ya n’ekwú, ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karịa, unu ndị okwukwe nta? 29 N’ihi ya, kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Kwụsịkwanụ iche oké echiche,+ 30 n’ihi na ihe ndị a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. Ma, Nna unu ma na ihe ndị a dị unu mkpa.+ 31 Kama, na-achọnụ Alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a.+

32 “Ìgwè atụrụ nta, unu atụla egwu,+ n’ihi na ọ dị Nna unu mma inye unu Alaeze.+ 33 Reenụ ihe unu nwere ma were ihe unu retara nye onyinye ebere.*+ Nwetanụ obere akpa ego ndị na-anaghị aka aka, ya bụ, akụ̀ na-anaghị agwụ agwụ n’eluigwe,+ ebe onye ohi na-anaghị eru nso, ebe egu* na-agaghịkwa eri ya. 34 N’ihi na n’ebe akụ̀ unu dị, n’ebe ahụ ka obi unu ga-adịkwa.

35 “Yirinụ uwe unu, jikerekwanụ,*+ ka mpanaka* unu na-enwukwa enwu.+ 36 Dịrịkwanụ ka ndị na-eche ka nna ha ukwu si ebe ọ gara ịlụ nwaanyị lọta,+ ka ọ ga-abụ, ọ lọta kụọ aka n’ụzọ, ha emegheere ya ụzọ ozugbo. 37 Ndị ohu ahụ ga-enwe obi ụtọ ma nna ha ukwu lọta wee hụ na ha na-eche nche. N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-eyiri ákwà ọ ga-eji jee ozi, nọdụkwa ala ka o rie ihe na tebụl. Ọ ga-abịakwa jeere ha ozi. 38 Ọ bụrụkwa na ọ lọta n’oge nche nke abụọ,* ma ọ bụdị na nke atọ,* ma hụ na ha na-eche nche, ha ga-enwe obi ụtọ. 39 Ma maranụ na a sị na onyeisi ezinụlọ ma oge onye ohi ga-abịa, ọ garaghị ekwe ka ọ bata n’ụlọ ya.+ 40 Dịrịkwanụ njikere, n’ihi na Nwa nke mmadụ na-abịa n’oge unu na-echeghị na ọ ga-abụ.”+

41 Pita wee sị ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị ka ị na-emere ihe atụ a, ka ọ̀ bụ mmadụ niile?” 42 Onyenwe anyị wee sị: “Ònye n’eziokwu bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwere uche,* onye nna ya ukwu ga-eme onye na-elekọta ndị na-ejere ya ozi, ka ọ na-enye ha ihe oriri ga-ezuru ha n’oge kwesịrị ekwesị?+ 43 Ohu ahụ ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ. 44 N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere. 45 Ma, ọ bụrụ na ohu ahụ ekwuo n’obi ya, sị: ‘Nna m ukwu na-egbu oge ịbịa,’ wee malite iti ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eje ozi ihe, na-eri, na-aṅụ, mmanya ana-egbukwa ya,+ 46 nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya nakwa n’oge ọ na-amaghị. Ọ ga-atakwa ya ezigbo ahụhụ ma kpọga ya n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ. 47 Ma ohu nke ma ihe nna ya ukwu chọrọ, ma ọ dịghị njikere, o meghịkwa ihe nna ya ukwu chọrọ, a ga-apịa ya ọtụtụ ọnụ ụtarị.+ 48 Ma onye na-amaghị ihe nna ya ukwu chọrọ, wee mee ihe kwesịrị ka a pịa ya ụtarị, a ga-apịa ya ọnụ ụtarị ole na ole. N’eziokwu, onye ọ bụla e nyere ihe ukwu, a ga-achọ ihe ukwu n’aka ya. Onye e nyere ihe ukwu ka ọ na-elekọta, a ga-achọkwa ihe ukwu n’aka ya.+

49 “Abịara m ịmụnye ọkụ n’ụwa. Ebe ọ bụ na a mụnyela ya, gịnịzi ka m na-achọ? 50 N’eziokwu, e nwere baptizim m na-aga ime. Obi agaghịkwa adị m mma ruo mgbe m mere ya.+ 51 Ùnu chere na m bịara ime ka udo dịrị n’ụwa? Ana m asị unu, mba, kama ọ bụ ikewa ndị mmadụ.+ 52 N’ihi na si ugbu a gawa, mmadụ ise bi n’otu ụlọ ga-ekewa, mmadụ atọ ga na-emegide mmadụ abụọ, mmadụ abụọ ana-emegide mmadụ atọ. 53 Ha ga-ekewa, nna ga na-emegide nwa ya nwoke, nwa nwoke ana-emegide nna ya, nne ana-emegide nwa ya nwaanyị, nwa nwaanyị ana-emegide nne ya. Nne di ga na-emegide nwunye nwa ya, nwunye nwa ana-emegide nne di ya.”+

54 Ọ gwakwara ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Mgbe unu hụrụ ka ihu ígwé na-agbachi n’ebe ọdịda anyanwụ, unu na-ekwu ozugbo ahụ, sị, ‘Ezigbo mmiri ga-ezo.’ Ọ na-emekwa otú ahụ. 55 Mgbe unu hụrụ na ifufe si n’ebe ndịda na-efe, unu na-asị, ‘Oké okpomọkụ ga-adị,’ ọ na-adịkwa. 56 Ndị ihu abụọ, unu ma otú e si amata otú ihu ígwé ga-adị, gịnịzi mere na unu anaghị aghọta ihe na-eme n’oge a?+ 57 Gịnị mere na unu anaghị amata ihe unu kwesịrị ime? 58 Dị ka ihe atụ, mgbe gị na onye gbara gị akwụkwọ na-agakwuru onye na-achị achị, gbalịa ka unu dozie okwu ahụ ọsọ ọsọ mgbe unu ka nọ n’ụzọ, ka ọ ghara ịkpụga gị n’ihu ọkàikpe, ọkàikpe enyefeekwa gị n’aka onye nche ụlọikpe, onye nche ụlọikpe atụbakwa gị n’ụlọ mkpọrọ.+ 59 N’eziokwu, ana m asị gị, ị gaghị esi ebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụrụ obere mkpụrụ ego ikpeazụ i nwere.”*

13 N’oge ahụ, ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ kọọrọ Jizọs gbasara ndị Galili Paịlet gburu ebe ha na-achụ àjà. 2 Ma, ọ sịrị ha: “Ùnu chere na ndị Galili ahụ mekarịrị ndị Galili ndị ọzọ niile ná mmehie n’ihi ihe a mere ha? 3 Ana m asị unu, mba. Ma, a ga-ebibi unu niile otú e bibiri ha ma ọ bụrụ na unu echegharịghị.+ 4 Ka ùnu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ ụlọ elu dị na Siloam dagburu mekarịrị ndị ọzọ niile bi na Jeruselem ná mmehie? 5 Ana m asị unu, mba. Ma, a ga-ebibi unu niile otú e bibiri ha ma ọ bụrụ na unu echegharịghị.”

6 O mekwaara ha ihe atụ a: “Otu nwoke kụrụ osisi fig n’ubi vaịn ya. O wee bịa na-achọgharị mkpụrụ na ya, ma o nweghị nke ọ hụrụ.+ 7 O wee gwa onye na-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ahụ, sị, ‘Kemgbe afọ atọ ka m na-abịa na-achọ mkpụrụ n’osisi fig a, ma o nweghị nke m na-ahụ. Gbutuo ya. Gịnị mere ọ ga-eji mee ka a ghara inwe ihe bara uru a ga-eji ala a mee?’ 8 Ya asị ya: ‘Nna m ukwu, hapụkwuo ya otu afọ ka m gwuo ala gburugburu ya tinye nsị anụ. 9 Ọ bụrụ na o mechaa mịa mkpụrụ n’ọdịnihu, ọ dị mma, ma ọ bụrụ na ọ mịghị, e gbutuzie ya.’”+

10 N’otu Ụbọchị Izu Ike, Jizọs nọ n’otu ụlọ nzukọ na-ezi ihe. 11 Ma, e nwere otu nwaanyị nọ ebe ahụ mmụọ ọjọọ mere ka ọ na-arịa ọrịa* kemgbe afọ iri na asatọ. Nwaanyị a na-ehu ehu, o nweghịkwa ike iguzo kwem. 12 Mgbe Jizọs hụrụ ya, ọ gwara ya, sị: “Nwaanyị, a gwọọla gị ọrịa gị.”+ 13 O bikwasịkwara ya aka, ya eguzoro kwem n’otu ntabi anya, malite ito Chineke. 14 Ma iwe were onyeisi oche ụlọ nzukọ ahụ maka na Jizọs gwọrọ onye ahụ n’Ụbọchị Izu Ike, ya asị ìgwè mmadụ ahụ: “E nwere ụbọchị isii e kwesịrị ịrụ ọrụ.+ N’ihi ya, bịanụ n’ụbọchị ndị ahụ ka a gwọọ unu. Unu abịala n’Ụbọchị Izu Ike.”+ 15 Ma, Onyenwe anyị sịrị ya: “Ndị ihu abụọ,+ ò nwere onye n’ime unu na-anaghị atọpụ ehi ya ma ọ bụ jakị ya n’ụlọ anụ n’Ụbọchị Izu Ike ma kpụrụ ya gaa ka o nye ya mmiri?+ 16 Setan mere ka nwaanyị a, bụ́ nwa Ebreham, na-arịa ọrịa a kemgbe afọ iri na asatọ. Ọ̀ bụ na e kwesịghị ịgwọ ya n’Ụbọchị Izu Ike?” 17 Mgbe o kwuru ihe a, ihere malitere ime ndị niile na-emegide ya. Ma ìgwè mmadụ ahụ niile malitere ịṅụrị ọṅụ n’ihi ihe niile dị ebube o mere.+

18 O kwuziri, sị: “Gịnị ka Alaeze Chineke dị ka ya? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? 19 Ọ dị ka mkpụrụ osisi mọstad mmadụ weere kụọ n’ubi ya. O wee too ma ghọọ osisi, ụmụ nnụnụ ebiri n’alaka ya.”+

20 Ọ sịkwara: “Gịnị ka m ga-eji tụnyere Alaeze Chineke? 21 Ọ dị ka ihe iko achịcha otu nwaanyị weere tinye n’ime ntụ ọka juru arịa* atọ buru ibu ruo mgbe ntụ ọka ahụ niile koro.”+

22 Ka Jizọs na-aga Jeruselem, o si n’otu obodo ukwu banye n’ọzọ, sikwa n’otu obodo nta banye n’ọzọ, na-ezi ndị mmadụ ihe. 23 Ma otu nwoke sịrị ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta?” O wee sị ha: 24 “Gbalịsienụ ike ka unu si n’ọnụ ụzọ dị warara banye.+ N’ihi na ana m asị unu, ọtụtụ ndị ga-achọ ịbanye ma ha agaghị abanyeli. 25 Ọ bụrụ na onyeisi ezinụlọ ebilie kpọchie ụzọ, unu ga-eguzoro n’èzí na-akụ aka n’ụzọ, sị, ‘Onyenwe anyị, megheere anyị ụzọ.’+ Ma ọ ga-asị unu: ‘Amaghị m ebe unu si.’ 26 Unu ga-amalitekwa ịsị, ‘Anyị na gị rikọrọ ihe, ṅụkọọkwa ihe, i zikwara ihe n’okporo ámá anyị.’+ 27 Ma ọ ga-asị unu, ‘Amaghị m ebe unu si. Sinụ ebe m nọ pụọ. Unu bụ ndị ajọ omume.’ 28 Ọ bụ ebe ahụ ka unu ga-ebe ákwá, taakwa ikikere ezé, mgbe unu ga-ahụ Ebreham, Aịzik, Jekọb, na ndị amụma niile n’Alaeze Chineke, ununwa anọrọ n’èzí.+ 29 Ndị mmadụ ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ bịa, sikwa n’ebe ugwu nakwa n’ebe ndịda, ha ga-anọdụkwa ala na-eri ihe na tebụl n’Alaeze Chineke. 30 Ma, e nwere ndị ikpeazụ ga-abụ ndị mbụ, e nwekwara ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ.”+

31 N’oge ahụ, ụfọdụ ndị Farisii bịara sị ya: “Si ebe a pụọ, n’ihi na Herọd chọrọ igbu gị.” 32 O wee sị ha: “Gaanụ gwa nkịta ọhịa ahụ, sị, ‘Ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-agwọkwa ndị ọrịa taa na echi, m ga-emechakwa n’ụbọchị nke atọ.’ 33 Ma, m ga na-arụ ọrụ m taa, echi, na nwanne echi. O nweghịkwa ihe ga-eme m ruo mgbe m ruru Jeruselem, n’ihi na ọ bụ na Jeruselem ka a na-egbu ndị amụma.+ 34 “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume,+ achọọla m ịchịkọta ụmụ gị ọtụtụ ugboro dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya, ma ị chọghị ya.+ 35 A hapụrụla unu ụlọ unu.+ Ana m asị unu, unu agaghị ahụ m ruo mgbe unu ga-asị: ‘Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova* bụ onye a gọziri agọzi.’”+

14 N’otu Ụbọchị Izu Ike, Jizọs banyere n’ụlọ otu onye na-achị achị bụ́ onye Farisii ịga rie nri. Ha nọkwa na-ele ya anya ka ha mara ihe ọ ga-eme. 2 Ma, e nwere otu nwoke nọ ebe ahụ ụkwụ ya na aka ya zara aza. 3 Jizọs wee jụọ ndị Farisii na ndị ahụ ma Iwu, sị: “È kwesịrị ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike, ka ọ̀ bụ na e kwesịghị?”+ 4 Ma ha gbachiri nkịtị. N’ihi ya, o seere nwoke ahụ n’aka, gwọọ ya ma sị ya lawa. 5 O wee sị ha: “Ò nwere onye n’ime unu nwa ya nwoke ma ọ bụ ehi ya ga-adaba n’olulu mmiri+ n’Ụbọchị Izu Ike, ya ahapụ ịdọpụta ya ozugbo?”+ 6 Ma, ha azalighị ya ajụjụ a.

7 Mgbe ọ hụrụ otú ndị a kpọrọ òkù si na-ahọrọ ebe kacha mma ha ga-anọ,+ ọ gwara ha, sị: 8 “Mgbe mmadụ kpọrọ gị oriri agbamakwụkwọ, agala nọdụ ebe kacha mma.+ O nwere ike ịbụ na e nwere onye a na-akwanyere ùgwù karịa gị ọ kpọkwara. 9 Onye ahụ kpọrọ unu oriri ga-abịa sị gị, ‘Ka onye a nọrọ ebe ahụ ị nọ.’ Ị ga-ejizi ihere bilie gaa nọrọ ebe kacha ala. 10 Kama, mgbe a kpọrọ gị oriri, gaa nọdụ n’ebe kacha ala, ka ọ ga-abụ na mgbe onye ahụ kpọrọ gị bịara, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, gaa nọdụ n’ebe ka elu.’ Ị ga-enwezi ùgwù n’anya ndị ọbịa ibe gị niile.+ 11 N’ihi na onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala. Onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”+

12 Ọ gwakwara nwoke ahụ kpọrọ ya òkù, sị: “Mgbe ị na-akpọ ndị mmadụ ka ha bịa rie nri ehihie ma ọ bụ nri anyasị, akpọla ndị enyi gị ma ọ bụ ụmụnne gị ma ọ bụ ndị ikwu gị ma ọ bụ ndị agbata obi gị bara ọgaranya, n’ihi na ha nwekwara ike ịkpọ gị ka ị bịa rie nri n’ụlọ ha. 13 Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, na ndị ìsì.+ 14 Ị ga-enwekwa obi ụtọ maka na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ gị ụgwọ. N’ihi na a ga-akwụ gị ụgwọ mgbe a ga-akpọlite ndị ezi omume n’ọnwụ.”+

15 Mgbe otu n’ime ndị ọbịa ibe ya nụrụ ihe ndị a, ọ sịrị ya: “Onye ga-eri ihe* n’Alaeze Chineke ga-enwe obi ụtọ.”

16 Jizọs sịrị ya: “Otu nwoke mere nnukwu oriri,+ kpọọkwa ọtụtụ ndị ka ha bịa. 17 Mgbe oge oriri ahụ ruru, ọ gwara ohu ya ka ọ gaa gwa ndị ahụ ọ kpọrọ òkù, sị, ‘Bịanụ, n’ihi na a kwadochaala ihe niile.’ 18 Ma, ha niile malitere ikwu ihe mere na ha agaghị abịali.+ Onye mbụ sịrị ya, ‘Azụrụ m ubi. M ga-aga hụ ya. Biko, ewela iwe. Agaghị m abịali.’ 19 Onye ọzọ sịkwara, ‘Azụrụ m ehi iri e jikọrọ abụọ abụọ, m na-agakwa ileru ha anya. Biko, ewela iwe, agaghị m abịali.’+ 20 Onye ọzọ sịkwara, ‘M ka lụrụ nwaanyị. N’ihi ya, agaghị m abịali.’ 21 N’ihi ya, ohu ahụ lọtara kọọrọ nna ya ukwu ihe ndị a. Nna ya ukwu ewee iwe ma sị ya, ‘Gaa ọsọ ọsọ n’okporo ámá, kpọta ndị ogbenye na ndị nwere nkwarụ na ndị ìsì na ndị ngwọrọ ebe a.’ 22 Mgbe oge gatụrụ, ohu ahụ sịrị, ‘Nna anyị ukwu, emeela m ihe i kwuru. Ma, ụlọ gị ejubeghị.’ 23 Nna ya ukwu asị ya, ‘Gaa n’okporo ụzọ na n’ụzọ ndị dị warara, gwasie ndị mmadụ ike ka ha bịa, ka ụlọ m ju eju.+ 24 N’ihi na ana m asị unu, o nweghị onye ọ bụla n’ime ndị ahụ m kpọrọ òkù ga-eri nri a m siri.’”+

25 Mgbe e mechara, ìgwè mmadụ sooro ya gawa ebe ọ na-aga. O wee tụgharịa sị ha: 26 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute m ma ọ hụghị m n’anya karịa nne ya na nna ya na nwunye ya na ụmụ ya na ụmụnne ya ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwaanyị, nakwa ndụ ya,*+ ọ gaghị abụli onye na-eso ụzọ m.+ 27 Onye ọ bụla na-ebughị osisi ịta ahụhụ* ya, na-esokwa m, agaghị abụli onye na-eso ụzọ m.+ 28 Dị ka ihe atụ, ò nwere onye n’ime unu chọrọ ịrụ ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka ọ mara ma ò nwere ihe ga-ezu iji rụchaa ya? 29 Ma ọ́ bụghị ya, o nwere ike ịtọ ntọala ya ma ọ gaghị arụchali ya. Ndị niile hụrụ ya ga-amalitekwa ịkwa ya emo, 30 na-asị: ‘Onye a bidoro ịrụ ụlọ ma ọ rụchalighị ya.’ 31 Ọ bụrụ na eze nke nwere puku ndị agha iri (10,000) na-aga ịlụso eze ọzọ nwere puku ndị agha iri abụọ (20,000) agha, ọ ga-ebu ụzọ nọdụ ala, ya na ndị ndụmọdụ ya agbaa izu, ka ọ mara ma ọ̀ ga-emeri ma ọ bụ na ọ gaghị emeri. 32 N’eziokwu, ọ bụrụ na ọ chọpụta na ọ gaghị emerili eze nke ọzọ, ọ ga-eziga ndị nnọchianya ya mgbe eze ahụ ka nọ ebe dị anya, ka ha rịọ ya ka ya na ya mee udo. 33 N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime unu na-ahapụghị ihe niile o nwere agaghị abụli onye na-eso ụzọ m.+

34 “N’eziokwu, nnu dị mma. Ma ọ bụrụ na ọ naghịzi atọ ka nnu, gịnị ka a ga-eji mee ka ọ tọwakwa ka nnu?+ 35 Ọ dịghị mma ka e tinye ya n’ala ma ọ bụkwanụ ka e were ya mere nri ala. Ndị mmadụ na-awụfu ya. Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”+

15 Ndị ọnaụtụ niile na ndị mmehie niile nọ na-abịakwute ya ka ha nụ okwu ya.+ 2 Ma, ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ nọ na-atamu ntamu, sị: “Nwoke a na-anabata ndị mmehie, ha na ya na-erikọkwa ihe.” 3 O wee meere ha ihe atụ a: 4 “Ònye n’ime unu nke nwere otu narị (100) atụrụ, ka ọ ga-abụ, otu n’ime ha fuo, ya aghara ịhapụ iri itoolu na itoolu n’ala ịkpa gaa chọwa nke ahụ furu efu ruo mgbe ọ chọtara ya?+ 5 Mgbe ọ chọtara ya, ọ na-ekukwasị ya n’ubu ya ma na-aṅụrị ọṅụ. 6 Ya laruokwa, ọ na-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbata obi ya, sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’+ 7 Ana m asị unu na otú ahụ ka a ga-aṅụrị ọṅụ n’eluigwe ma otu onye mmehie chegharịa+ karịa ka a ga-aṅụrị n’ihi ndị ezi omume iri itoolu na itoolu ndị nchegharị na-adịghị mkpa.

8 “Ma ọ bụ, ò nwere nwaanyị nwere mkpụrụ ego drakma* iri, nke ọ ga-abụ, otu mkpụrụ ego drakma* funahụ ya, ya aghara ịmụnye ọkụ* ma zachaa ụlọ ya, chọọkwa ya nke ọma ruo mgbe ọ chọtara ya? 9 Mgbe ọ chọtara ya, ọ na-akpọkọta ndị enyi ya* na ndị agbata obi ya, sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ maka na achọtala m mkpụrụ ego drakma* funahụrụ m.’ 10 Ana m asị unu, otú ahụkwa ka ndị mmụọ ozi Chineke si aṅụrị ọṅụ ma otu onye mmehie chegharịa.”+

11 O kwukwara, sị: “Otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ. 12 Nke nta asị nna ya, ‘Nna m, kee ihe i nwere, nye m nke ruuru m.’ N’ihi ya, o keere ha ihe o nwere. 13 Mgbe ụbọchị ole na ole gachara, nwa ya nwoke nke nta chịkọtara ihe ya niile gawa obodo dị anya. O biwere ndụ ọjọọ* n’ebe ahụ, nke mere ka o mefuchaa ihe o nwere. 14 Mgbe o mefuchara ihe niile, oké ụnwụ dara n’obodo ahụ niile, agụụ amalitekwa ịgụgbu ya. 15 Ọ gadịrị ka ọ rụwara otu n’ime ụmụ amaala obodo ahụ ọrụ, onye ahụ eziga ya n’ọhịa ya ka ọ na-azụ ézì.+ 16 Ọ na-agụkwa ya agụụ iwere nri* ézì na-eri rijuo afọ, ma o nweghị onye na-enye ya ihe ọ bụla.

17 “Mgbe anya doro ya, ọ sịrị, ‘Ọtụtụ ndị na-arụrụ nna m ọrụ nwejuru nri enweju, ebe agụụ na-achọ igbu m ebe a. 18 M ga-ebili laghachikwuru nna m, sị ya: “Nna m, emehiela m Chineke bi n’eluigwe, mehiekwa gị. 19 Erukwaghị m eru ka a kpọọ m nwa gị. Were m ka otu n’ime ndị na-arụrụ gị ọrụ.”’ 20 O biliziri lakwuru nna ya. Mgbe ọ ka nọ ebe dị anya, nna ya hụrụ ya ma metere ya ebere. O wee gbara ọsọ gaa makụọ ya* ma jiri nwayọọ susuo ya ọnụ.* 21 Nwa ya nwoke wee sị ya, ‘Nna m, emehiela m Chineke bi n’eluigwe, mehiekwa gị.+ Erukwaghị m eru ka a kpọọ m nwa gị.’ 22 Ma nna ya sịrị ndị ohu ya, ‘Ngwa, chịtanụ uwe mwụda kacha mma yiwe ya, gbanyenụ ya ọla n’aka, yiwekwanụ ya akpụkpọ ụkwụ n’ụkwụ. 23 Kpụtakwanụ nwa ehi gbara agba, gbuo ya ka anyị rie ma nwee aṅụrị, 24 n’ihi na nwa m nwoke a nwụrụ anwụ ma dị ndụ ọzọ.+ O fukwara efu, ma a hụla ya.’ Ha bidoro ṅụrịwa ọṅụ.

25 “Ma nwa ya nwoke nke okenye nọ n’ubi. Mgbe ọ na-alọta ma rutewe n’ụlọ ha, ọ nụrụ ụda egwú a na-akụ na ụda egwú a na-agba. 26 N’ihi ya, ọ kpọrọ otu n’ime ndị na-eje ozi ma jụọ ya ihe na-eme. 27 O wee sị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtala, nna gị gbukwara nwa ehi gbara agba, n’ihi na ọ lọtara n’udo.’* 28 Ma iwe were ya, o kweghịkwa aba n’ụlọ. Nna ya wee pụta rịọwa ya ka ọ bata. 29 Ọ gwara nna ya, sị, ‘Agbaarala m gị ohu ọtụtụ afọ, o nwebeghịkwa mgbe m nupụụrụ gị isi. Ma, o nwetụbeghị mgbe i nyere m nwa ewu ka mụ na ndị enyi m rie. 30 Ma ozugbo nwa gị nwoke a ya na ndị akwụna richara ihe gị* lọtara, i gbuuru ya nwa ehi gbara agba.’ 31 O wee sị ya, ‘Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile bụ́ nke m bụkwa nke gị. 32 Ma anyị kwesịrị ime oriri, ṅụrịakwa ọṅụ, n’ihi na nwanne gị nwoke a nwụrụ anwụ ma dị ndụ ọzọ, o fukwara efu, ma a hụla ya.’”

16 Jizọs gwakwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “E nwere otu nwoke bara ọgaranya a gwara na onye na-elekọtara ya ụlọ na-emefusị akụ̀ ya. 2 N’ihi ya, nwoke ahụ kpọrọ onye ahụ, sị ya, ‘Ihe m na-anụ gbasara gị adịghị mma. Weta akwụkwọ i ji dekọọ otú i si mefuo ego m, n’ihi na achọghịzi m ka ị na-elekọta ụlọ m.’ 3 Onye ahụ na-elekọta ụlọ wee gwa onwe ya, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme, ebe ọ bụ na nna m ukwu ga-achụ m n’ọrụ? Ike adịghị m igwu ala, ihere ịrịọ arịrịọ na-emekwa m. 4 Ehee, ama m ihe m ga-eme, ka ọ ga-abụ, a chụọ m n’ọrụ ilekọta ụlọ, ndị mmadụ anabata m n’ụlọ ha.’ 5 O wee kpọọ ndị niile ji nna ya ukwu ụgwọ n’otu n’otu. Ya asị onye nke mbụ, ‘Gịnị ka i ji nna m ukwu n’ụgwọ?’ 6 Ya asị, ‘Narị galọn* mmanụ oliv isii (600).’ O wee sị ya, ‘Were akwụkwọ e dere ihe unu kwekọrịtara ma nọdụ ala dee narị atọ (300) ọsọ ọsọ.’ 7 Ọ jụkwara onye ọzọ, sị, ‘Gịnị ka gịnwa ji n’ụgwọ?’ Ya asị, ‘Otu narị (100) akpa ọka wit.’* O wee sị ya, ‘Were akwụkwọ e dere ihe unu kwekọrịtara ma dee iri asatọ.’ 8 Nna ukwu onye ahụ na-elekọta ụlọ jara ya mma, n’ihi na n’agbanyeghị na ọ bụ onye ajọ omume, ọ kpara àgwà onye ma ihe. N’ihi na ndị oge a* ma ihe n’otú ha si emeso ndị ọgbọ ha ihe karịa ụmụ nke ìhè.+

9 “Ana m asịkwa unu: Jirinụ akụ̀ ajọ omume metara onwe unu ndị enyi,+ ka ọ ga-abụ, mgbe akụ̀ ahụ na-adịkwaghị, ha anabata unu n’ebe unu ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.+ 10 Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kacha nta kwesịkwara ntụkwasị obi n’oké ihe. Onye bụ́ onye ajọ omume n’ihe kacha nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe. 11 N’ihi ya, ọ bụrụ na unu ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihe gbasara akụ̀ ajọ omume, ònye ga-enyefe ezigbo akụ̀ n’aka unu? 12 Ọ bụrụkwa na unu ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihe onye ọzọ, ònye ga-enye unu ihe a kwadebeere unu?+ 13 O nweghị onye ga-abụli ohu nna ukwu abụọ. N’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.”+

14 Ma ndị Farisii, ndị hụrụ ego n’anya, nọ na-ege ntị n’ihe a niile. Ha wee malite ịkwa ya emo.+ 15 N’ihi ya, ọ sịrị ha: “Unu na-eme ka ndị ezi omume n’ihu ndị mmadụ,+ ma Chineke ma obi unu.+ N’ihi na ihe bara uru n’anya ndị mmadụ bụ ihe arụ n’anya Chineke.+

16 “Ihe Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma* kwuru dị ruo mgbe Jọn bidoro ozi ya. Si n’oge ahụ gawa, a na-ezisa ozi ọma Alaeze Chineke, ụdị mmadụ niile na-agbalịsikwa ike ịbanye na ya.+ 17 N’eziokwu, ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịla n’iyi karịa otu mkpụrụ akwụkwọ nke dị n’Iwu ahụ ịhapụ imezu.+

18 “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm* ma lụọ nwaanyị ọzọ na-akwa iko, onye lụkwara nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm* na-akwa iko.+

19 “E nwere otu nwoke bara ọgaranya, onye na-eyi ezigbo ákwà pọpụl na ákwà linin, na-ekpori ndụ, na-ebikwa ndụ okomoko kwa ụbọchị. 20 Ma e nwere onye arịrịọ a na-ebute n’ọnụ ụzọ ámá ya. Aha ya bụ Lazarọs. Ọnyá jukwara ya n’ahụ́. 21 Ọ na-agụkwa ya agụụ iri ihe si na tebụl ọgaranya ahụ na-adapụ. Nkịta na-abịakwa aracha ọnyá ya. 22 Ma ka oge na-aga, onye arịrịọ ahụ nwụrụ, ndị mmụọ ozi eburu ya gaa busa n’akụkụ* Ebreham.

“Ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya. 23 O si n’ili* ebe ọ nọ na-ata ahụhụ lelie anya hụ Ebreham n’ebe dị anya, hụkwa Lazarọs ka ọ nọ n’akụkụ ya.* 24 O wee tie mkpu, sị, ‘Nna m Ebreham, meere m ebere. Zie Lazarọs ka o detụ ọnụ mkpịsị aka ya na mmiri ma tasa m n’ire, n’ihi na m na-ahụsi anya n’ọkụ a na-eresi ike.’ 25 Ma Ebreham sịrị, ‘Nwa m, cheta na i rijuru ihe ọma afọ mgbe ị nọ ndụ, ma Lazarọs tara ezigbo ahụhụ. Ma ugbu a, a na-akasi ya obi ebe a, gịnwa ana-ahụsi anya. 26 E wezụgakwa ihe a niile, e meela ka nnukwu olulu dị n’agbata anyị na unu, ka ndị chọrọ isi ebe a gakwuru unu ghara inwe ike ịgafe, ndị mmadụ agaghịkwa esi ebe ahụ gafeta ebe anyị nọ.’ 27 O wee sị, ‘Ọ bụrụ otú ahụ, nna m, biko, ziga ya n’ụlọ nna m, 28 n’ihi na enwere m ụmụnne ndị nwoke ise, ka ọ gaa gwa ha, ka ha ghara ịbata ebe a a na-ata ụdị ahụhụ a.’ 29 Ma Ebreham sịrị, ‘Ha nwere akwụkwọ Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma. Ha mee ihe ha kwuru.’+ 30 Ya asị, ‘Mba, nna m Ebreham. Ha agaghị ege ha ntị. Ma, ọ bụrụ na mmadụ esi n’ọnwụ bilie gaa gwa ha, ha ga-echegharị.’ 31 Ma ọ sịrị ya, ‘Ọ bụrụ na ha emeghị ihe Mosis+ na ndị amụma dere, ha agaghịkwa ege ntị ma mmadụ si n’ọnwụ bilie gaa gwa ha okwu.’”

17 Jizọs wee gwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A ga na-enwe ihe nwere ike ime ka mmadụ mehie. Ma, onye na-eme ka onye ọzọ mehie ga-ata ahụhụ. 2 Ọ ga-akara ya mma ma ọ bụrụ na e weere nkume e ji egwe nri konye ya n’olu ma tụba ya n’oké osimiri karịa na ọ ga-eme ka otu n’ime ndị a dị nta mehie.+ 3 Kpacharanụ anya. Ọ bụrụ na nwanna gị emehie gị, dụọ ya ọdụ.+ Ọ bụrụkwa na o chegharịa, gbaghara ya.+ 4 Ọ bụrụgodị na o mehie gị ugboro asaa n’ụbọchị, bịakwutekwa gị ugboro asaa n’ụbọchị, sị, ‘Echegharịala m,’ gbaghara ya.”+

5 Ndịozi ahụ wee sị Onyenwe anyị: “Mee ka anyị nwekwuo okwukwe.”+ 6 Onyenwe anyị asị: “Ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-agwa osisi mọlberi ojii a, sị, ‘Fopụ onwe gị ma kụọ onwe gị n’oké osimiri.’ Ọ ga-erubekwara unu isi.+

7 “Ọ bụrụ na otu n’ime unu nwere ohu na-akọrọ ya ubi ma ọ bụ nke na-azụrụ ya atụrụ, olee ihe ọ ga-asị ya ma o si n’ubi lọta? Ọ̀ ga-asị ya, ‘Bịa ebe a ozugbo, nọdụ ala rie ihe na tebụl’? 8 Mba. Kama ọ ga-asị ya: ‘Siere m ihe ka m rie nri anyasị, yirikwa eprọn jeere m ozi. M richaa ihe, ṅụchaakwa ihe, i nweziri ike iri ihe, ṅụọkwa ihe.’ 9 Ọ̀ ga-etowe ohu ahụ maka na ọ rụrụ ọrụ o kwesịrị ịrụ? Mba. 10 Ununwa kwa, mgbe unu mere ihe niile unu kwesịrị ime, sịnụ: ‘Anyị bụ ndị ohu na-abaghị uru ọ bụla. Ihe anyị mere bụ ihe anyị kwesịrị ime.’”+

11 Ka ọ na-aga Jeruselem, o si n’agbata Sameria na Galili na-agafe. 12 Ka ọ na-abanyekwa n’otu obodo, ndị ekpenta iri hụrụ ya. Ma ha guzo n’ebe dị anya.+ 13 Ha wee tie mkpu, sị: “Jizọs, Onye Ozizi, meere anyị ebere!” 14 Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha: “Gaanụ gosi ndị nchụàjà onwe unu.”+ Ma ka ha na-aga, a gwọrọ ha.+ 15 Mgbe otu n’ime ha hụrụ na a gwọọla ya, ọ laghachiri, jiri oké olu na-eto Chineke. 16 O wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala n’ụkwụ Jizọs, na-ekele ya. Ọ bụkwa onye Sameria.+ 17 Jizọs sịrị ya: “Ọ́ bụghị mmadụ iri ka a gwọrọ? Oleekwanụ mmadụ itoolu ndị ọzọ? 18 E wezụga nwoke a bụ́ onye mba ọzọ, è nwere onye ọzọ lọghachiri ka o too Chineke?” 19 O wee sị ya: “Bilie lawa. Okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+

20 Mgbe ndị Farisii jụrụ ya oge Alaeze Chineke ga-abịa,+ ọ sịrị ha: “Alaeze Chineke agaghị abịa otú mmadụ niile ga-ama. 21 Ndị mmadụ agaghịkwa asị, ‘Ọ dị ebe a!’ ma ọ bụ, ‘Ọ dị ebe ahụ!’ N’ihi na Alaeze Chineke dị n’etiti unu.”+

22 Ọ gwaziri ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Oge na-abịa mgbe unu ga-achọ ịhụ otu n’ime ụbọchị Nwa nke mmadụ ma unu agaghị ahụ ya. 23 Ndị mmadụ ga-asịkwa unu, ‘Leenụ ya ebe ahụ!’ ma ọ bụ, ‘Leenụ ya ebe a!’ Unu apụla, unu esokwala ha.+ 24 N’ihi na otú ahụ ọ na-abụ àmụ̀mà gbuo, ìhè ya esi n’otu akụkụ eluigwe ruo n’akụkụ ọzọ n’eluigwe, otú ahụkwa ka ọ ga-adị n’ụbọchị+ Nwa nke mmadụ.+ 25 Ma, Nwa nke mmadụ ga-eburịrị ụzọ taa ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ajụkwa ya.+ 26 Dịkwa ka ọ dị n’oge Noa,+ otú ahụ ka ọ ga-adị n’oge Nwa nke mmadụ:+ 27 ndị mmadụ nọ na-eri, na-aṅụ, ụmụ nwoke ana-alụ nwaanyị, a na-ekekwa ụmụ nwaanyị di ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ,+ Iju Mmiri abịa bibie ha niile.+ 28 Otú ahụ ọ dị n’oge Lọt ka ọ ga-adịkwa:+ ndị mmadụ nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụ, na-ere, na-akụ ihe, na-arụkwa ụlọ. 29 Ma n’ụbọchị Lọt si na Sọdọm pụta, ọkụ na sọlfọ* si n’eluigwe zoo ma bibie ha niile.+ 30 Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị ahụ mgbe Nwa nke mmadụ ga-egosi ndị mmadụ onwe ya.+

31 “N’ụbọchị ahụ, onye nọ n’elu ụlọ, ya arịdakwala ka ọ gaa buru ihe dị n’ụlọ ya. Onye nọkwa n’ubi, ya alaghachila ka o were ihe ndị ọ hapụrụ n’ụlọ. 32 Chetanụ nwunye Lọt.+ 33 Onye ọ bụla nke na-achọ ịzọpụta ndụ* ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla nke tụfuru ndụ ya ga-azọpụta ya.+ 34 Ana m asị unu, n’abalị ahụ, mmadụ abụọ ga-edina n’otu àkwà.* A ga-akpọrọ otu onye, ma a ga-ahapụ onye nke ọzọ.+ 35 Ụmụ nwaanyị abụọ ga na-egwe nri n’otu nkume e ji egwe nri. A ga-akpọrọ otu onye, ma a ga-ahapụ onye nke ọzọ.” 36* —— 37 Ha wee sị ya: “Onyenwe anyị, ebee ka ihe a ga-eme?” Ya asị ha: “Ebe ozu dị, ebe ahụkwa ka ugo ga-ezukọta.”+

18 O wee meere ha otu ihe atụ na-egosi ihe mere ha ji kwesị ịna-ekpe ekpere mgbe niile n’adaghị mbà.+ 2 Ọ sịrị: “N’otu obodo, e nwere otu ọkàikpe na-anaghị atụ egwu Chineke, nke na-anaghịkwa akwanyere mmadụ ùgwù. 3 N’obodo ahụ, e nwekwara otu nwaanyị isi mkpe. Ọ nọ na-agakwuru ọkàikpe ahụ, na-asị, ‘Gbalịa kpee ikpe ziri ezi n’ikpe onye mụ na ya sere okwu.’ 4 O kweghịkwa ná mmalite. Ma, o mechara gwa onwe ya, sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke, anaghịkwa m akwanyere mmadụ ọ bụla ùgwù, 5 ma n’ihi nsogbu nwaanyị isi mkpe a na-enye m, m ga-ekpe ikpe ziri ezi n’okwu ya, ka ọ ghara ịna-abịa enyegbu m ná nsogbu.’”+ 6 Onyenwe anyị wee sị: “Ùnu nụrụ ihe ọkàikpe ahụ kwuru n’agbanyeghị na ọ bụ onye ajọ omume? 7 Ebe ọ bụ na Chineke na-enwere ndị ọ họọrọ ndidi,+ bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị,+ ọ̀ bụ na ọ gaghị ahụ na e kpeere ha ikpe ziri ezi? 8 Ana m asị unu, ọ ga-ahụ na e kpeere ha ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ. Ma, mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ ụdị okwukwe* a n’ụwa?”

9 O mekwaara ndị na-ewere onwe ha ka ndị ezi omume ma na-ele ndị ọzọ anya ka ndị na-enweghị ihe ha bụ ihe atụ a: 10 “Ụmụ nwoke abụọ gara n’ụlọ nsọ ikpe ekpere. Otu bụ onye Farisii, nke ọzọ bụ onye ọnaụtụ. 11 Onye Farisii ahụ guzooro ọtọ malite ikpe ekpere n’obi ya, sị, ‘Chineke, ana m ekele gị na adịghị m ka ndị ọzọ, bụ́ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, na ndị na-akwa iko. Adịghịkwa m ka onye ọnaụtụ a. 12 Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izu. M na-enyekwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile m kpatara.’+ 13 Ma onye ọnaụtụ ahụ guzo ebe dị anya. Ọ chọghịdị ileli anya lee eluigwe, kama ọ nọ na-eti aka n’obi, na-asị, ‘Chineke, meere m ebere. Abụ m onye mmehie.’+ 14 Ana m asị unu, nwoke a lara n’ụlọ ya bụrụ onye ezi omume karịa onye Farisii ahụ.+ N’ihi na onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda ala, ma onye na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”+

15 Ndị mmadụ nọkwa na-akpọtara ya ụmụaka ha ka o bitụ ha aka. Ma, mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, ha malitere ịbara ha mba.+ 16 Ma, Jizọs kpọrọ ụmụntakịrị ahụ ka ha bịakwute ya, sị: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochila ha n’ihi na Alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ.+ 17 N’eziokwu, ana m asị unu na onye ọ bụla na-anabataghị Alaeze Chineke otú nwatakịrị si anabata ihe emekataghị banye na ya.”+

18 Otu n’ime ndị na-achị achị wee jụọ ya, sị: “Ezigbo Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m nweta ndụ ebighị ebi?”+ 19 Jizọs asị ya: “Gịnị mere i ji akpọ m ezigbo onye? E nweghị onye bụ́ ezigbo onye, ma e wezụga otu onye, ya bụ, Chineke.+ 20 Ị manụ ihe ndị e nyere n’iwu: ‘Akwala iko,+ egbula mmadụ,*+ ezula ohi,+ agbala akaebe ụgha,+ sọpụrụ nne gị na nna gị.’”+ 21 O wee sị: “M na-edebe iwu a niile kemgbe m bụ nwata.” 22 Mgbe Jizọs nụrụ ihe o kwuru, ọ sịrị ya: “E nwere otu ihe ị ka ga-eme: Ree ihe niile i nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe. Bịazie bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 23 Mgbe ọ nụrụ ihe a, o wutere ya nnọọ, n’ihi na ọ bara ezigbo ọgaranya.+

24 Jizọs lere ya anya wee sị: “Ọ ga-esiri ndị nwere ego ezigbo ike ịbanye n’Alaeze Chineke.+ 25 N’eziokwu, ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga e ji akwa ákwà gafere karịa ọgaranya ịba n’Alaeze Chineke.”+ 26 Ndị nụrụ ihe a sịrị: “Ònyezi ka a ga-azọpụta?”+ 27 Ya asị: “Ihe na-ekweghị omume n’anya ụmụ mmadụ kwere Chineke omume.”+ 28 Pita wee sị ya: “Ma anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị.”+ 29 O wee sị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, e nweghị onye hapụrụ ụlọ ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ụmụnne ndị nwoke ma ọ bụ nne na nna ma ọ bụ ụmụ n’ihi Alaeze Chineke,+ 30 nke na-agaghị enweta ihe ka ya okpukpu okpukpu n’oge a, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.”*+

31 O wee kpọpụ ndịozi ya iri na abụọ iche, sị ha: “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-emezukwa ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke mmadụ.+ 32 Dị ka ihe atụ, a ga-enyefe ya n’aka ndị mba ọzọ.+ A ga-akwa ya emo,+ mee ya ihe ihere, gbụọkwa ya asọ mmiri.+ 33 Ha pịachaakwa ya ihe, ha ga-egbu ya.+ Ma ọ ga-ebili n’ụbọchị nke atọ.”+ 34 Ma, ha aghọtaghị ihe nke ọ bụla n’ime ihe ndị a pụtara, n’ihi na e zochiiri ha ihe okwu a pụtara, ha aghọtaghịkwa ihe ndị o kwuru.

35 Ma ka Jizọs na-eru Jeriko nso, otu onye ìsì nọ ọdụ n’akụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.+ 36 Mgbe ọ nụrụ mkpọtụ ìgwè mmadụ na-agafe, ọ malitere ịjụ ihe na-eme. 37 Ha asị ya: “Jizọs onye Nazaret na-agafe.” 38 O wee tie mkpu, sị: “Jizọs, Nwa Devid, meere m ebere!” 39 Ndị nọ ya n’ihu wee malite ịbara ya mba, na-agwa ya ka o mechie ọnụ. Ma ọ nọ na-etisikwu mkpu ike, sị: “Nwa Devid, meere m ebere!” 40 Jizọs wee kwụsị ma sị ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, Jizọs jụrụ ya, sị: 41 “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ya asị: “Onyenwe anyị, mee ka m hụwa ụzọ.” 42 N’ihi ya, Jizọs sịrị ya: “Hụwa ụzọ. Okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+ 43 O wee hụwa ụzọ ozugbo. Ọ malitekwara iso ya,+ na-eto Chineke. Mgbe ndị ahụ niile hụrụ ihe merenụ, ha toro Chineke.+

19 Jizọs banyere Jeriko, na-achọ isi na ya gaa ebe ọzọ. 2 N’ebe ahụ, e nwere otu nwoke aha ya bụ Zakịọs. Ọ bụ onyeisi ndị ọnaụtụ. Ọ bakwara ọgaranya. 3 Ọ nọ na-achọ ịhụ Jizọs, ma o nweghị ike ịhụ ya n’ihi na ndị mmadụ karịrị akarị, yanwa dịkwanụ mkpụmkpụ. 4 N’ihi ya, ọ gbaara gaa n’ihu ihu ma rịgoro n’osisi sịkamọ* ka ọ hụ ya, maka na ọ ga-esi n’ụzọ ahụ agafe. 5 Mgbe Jizọs rutere ebe ahụ, o lere anya n’elu, sị ya: “Zakịọs, rịdata ọsọ ọsọ, n’ihi na m ga-abịa n’ụlọ gị taa.” 6 O wee rịdata ozugbo ma jiri obi ụtọ nabata ya n’ụlọ ya. 7 Mgbe ndị mmadụ hụrụ ihe a, ha niile malitere ịtamu ntamu, sị: “Leenụ, ọ gara nọrọ n’ụlọ nwoke bụ́ onye mmehie.”+ 8 Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, sị: “Onyenwe anyị, m ga-enye ndị ogbenye ọkara ihe m nwere. Ihe ọ bụla m pụnaara onye ọ bụla,* m ga-enyeghachi ya okpukpu anọ.”+ 9 Mgbe o kwuru ihe a, Jizọs sịrị ya: “Chineke azọpụtala gị na ezinụlọ gị taa, n’ihi na ị bụkwa nwa Ebreham. 10 N’ihi na Nwa nke mmadụ bịara ịchọ ndị furu efu na ịzọpụta ha.”+

11 Ka ha nọ na-ege ntị n’ihe ndị a, o meere ha ihe atụ ọzọ, n’ihi na ọ nọ nso na Jeruselem. Ha nọkwa na-eche na Alaeze Chineke na-aga ịbịa ozugbo.+ 12 O wee sị: “Otu nwoke bụ́ nwa eze gara n’ala dị anya+ ka e chie ya eze. Ọ lọta ya abụrụ eze. 13 Ọ kpọrọ mmadụ iri n’ime ndị ohu ya, nye ha maịna* iri, sị ha, ‘Zụwanụ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’+ 14 Ma ndị obodo ha kpọrọ ya asị. Ha wee zie ndị ozi ka ha gaa sị ya: ‘Anyị achọghị ka ị bụrụ eze anyị.’

15 “Mgbe e chichara ya eze ya alọta, ọ kpọrọ ndị ohu ahụ o nyere ego* ka ọ mata uru ha ritere n’ahịa ha zụrụ.+ 16 Onye mbụ bịara, sị ya, ‘Onyenwe m, eji m otu maịna i nyere m rite maịna iri ọzọ n’uru.’+ 17 Ya asị ya, ‘Ezigbo ohu, i mere nke ọma. Chịwa obodo iri, n’ihi na i gosila na i kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe dị nnọọ nta.’+ 18 Onye nke abụọ bịara, sị ya, ‘Onyenwe m, eji m otu maịna i nyere m rite maịna ise ọzọ n’uru.’+ 19 Ọ gwakwara onye nke a, sị, ‘Gịnwa, chịwa obodo ise.’ 20 Ma onye ọzọ bịara, sị ya, ‘Onyenwe m, lee maịna gị. M kechiri ya n’ákwà dewere gị. 21 Ị manụ na ị bụ onye aka ike. Egwu gị na-atụ m n’ihi na ị na-ewere ihe ị na-edebeghị, ị na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’+ 22 O wee sị ya, ‘Ajọ ohu, eji m ihe i kwuru na-ekpe gị ikpe. Ị̀ na-ekwu na ị ma na m bụ onye aka ike, na m na-ewere ihe m na-edebeghị, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị?+ 23 Gịnịzi mere na i tinyeghị ego m* n’ụlọ akụ̀? Mgbe m lọtara, m gaara anara ya na ọmụrụ nwa ya.’

24 “Ọ gwaziri ndị guzo n’akụkụ, sị, ‘Natanụ ya maịna ahụ nye onye ahụ nke nwere maịna iri.’+ 25 Ma ha sịrị ya, ‘Onyenwe anyị, o nwekwaranụ maịna iri.’— 26 ‘Ana m asị unu, onye ọ bụla nke nwere ihe, a ga-enyekwu ya. Ma onye na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o nwere enwe.+ 27 Kpọtanụ ndị iro m ndị a na-achọghị ka m bụrụ eze ha, gbuo ha n’ihu m.’”

28 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, ọ gbagowere Jeruselem. 29 Mgbe o ruru Betfeji na Betani nso n’ugwu a na-akpọ Ugwu Oliv,+ ọ gwara mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya,+ sị: 30 “Gaanụ n’obodo a unu na-ahụ. Mgbe unu banyere n’ime ya, unu ga-ahụ nwa jakị e liwere eliwe, nke mmadụ ọ bụla na-anọtụbeghị n’elu ya. Tọpụnụ ya, kpụtakwanụ ya ebe a. 31 Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ unu, sị, ‘Gịnị mere unu ji na-atọpụ ya?’ sịnụ ya, ‘Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ya.’” 32 Mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya gara hụ ya otú ahụ ọ gwara ha.+ 33 Ma ka ha nọ na-atọpụ nwa jakị ahụ, ndị nwe ya sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-atọpụ nwa jakị ahụ?” 34 Ha asị: “Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ya.” 35 Ha wee kpụgara ya Jizọs. Ha wụkwasịkwara uwe elu ha n’elu nwa jakị ahụ, Jizọs anọrọ n’elu ya.+

36 Ka ọ na-aga, ha ana-agbasa uwe elu ha n’okporo ụzọ.+ 37 Ozugbo o rutere nso n’okporo ụzọ e si aga Ugwu Oliv, ìgwè mmadụ niile na-eso ụzọ ya malitere iji oké olu na-aṅụrị ọṅụ ma na-eto Chineke maka ọrụ ebube niile ha hụrụ, 38 sị: “Onye ahụ nke na-abịa dị ka Eze n’aha Jehova* bụ onye a gọziri agọzi! Ka udo dịrị n’eluigwe, ka e tookwa Chineke onye nọ ebe kacha elu!”+ 39 Ma, ụfọdụ n’ime ndị Farisii so n’ìgwè mmadụ ahụ sịrị ya: “Onye Ozizi, baara ndị na-eso ụzọ gị mba.”+ 40 Ma ọ sịrị: “Ana m asị unu, ọ bụrụ na ndị a agbachi nkịtị, nkume ga-eti mkpu.”

41 Mgbe o rutere Jeruselem nso, o lere ya anya ma beere ya ákwá,+ 42 sị: “Ọ gaara adị mma ma a sị na ị ghọtara n’ụbọchị taa ihe ndị ga-eme ka e nwee udo. Ma ugbu a, e zochiela ha ka anya gị ghara ịhụ ha.+ 43 N’ihi na ụbọchị na-abịa mgbe ndị iro gị ga-eji osisi pịrị ọnụ gbaa ogige gburugburu gị. Ha ga-agbakwa gị gburugburu ma si n’akụkụ niile na-enye gị nsogbu.+ 44 Ha ga-akụtu gị na ụmụ gị n’ala.+ Ha agaghịkwa ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya n’ime gị,+ n’ihi na ị ghọtaghị oge Chineke bịara kpee gị ikpe.”*

45 O wee banye n’ụlọ nsọ ma malite ịchụpụ ndị na-ere ihe,+ 46 sị ha: “E dere, sị, ‘Ụlọ m ga-abụkwa ụlọ ekpere,’+ ma unu emeela ya ọgba ndị ohi.”+

47 Ọ nọgidekwara na-ezi ihe kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ. Ma ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị isi ndị Juu nọ na-achọ igbu ya.+ 48 Ma ha amaghị otú ha ga-esi eme ya, n’ihi na mmadụ niile nọ na-esogharị ya ka ha nụ okwu ya.+

20 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-ezi ndị mmadụ ihe n’ụlọ nsọ ma na-ezisa ozi ọma, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye bịara 2 sị ya: “Gwa anyị, Ebee ka i si nweta ikike i ji eme ihe ndị a? Ma ọ bụ, ònye nyere gị ikike ime ihe ndị a?”+ 3 Ya asị ha: “M ga-ajụkwa unu otu ajụjụ, unu zaakwa m: 4 Baptizim Jọn mere ndị mmadụ, ò si n’eluigwe, ka ò si n’aka mmadụ?” 5 Ha gwara ibe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị, ‘Gịnị mere na unu ekwetaghị ihe o kwuru?’ 6 Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’aka mmadụ,’ ndị a niile ga-atụ anyị nkume, n’ihi na ha kweere na Jọn bụ onye amụma.”+ 7 N’ihi ya, ha sịrị na ha amaghị ebe o si. 8 Jizọs wee sị ha: “M gaghịkwa agwa unu ebe ikike m ji eme ihe ndị a si.”

9 O wee malite imere ìgwè mmadụ ahụ ihe atụ, sị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn+ ma nyefee ya n’aka ndị ọrụ ubi, gaakwa mba ọzọ, nọtee aka.+ 10 Ma mgbe oge e ji aghọ mkpụrụ vaịn ruru, o zipụrụ otu ohu ya ka ọ gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ ka ha nye ya ụfọdụ n’ime mkpụrụ si n’ubi vaịn ahụ. Ma, ndị ọrụ ubi ahụ tikasịchara ya ahụ́, chụlaa ya n’enyeghị ya ihe ọ bụla.+ 11 Ma o zigakwaara ha ohu ọzọ. Ha tikwara onye nke ahụ ihe ma menye ya ihere, chụlaa ya n’enyeghị ya ihe ọ bụla. 12 O zigakwara onye nke atọ. Ha merụkwara ya ahụ́ ma chụlaa ya. 13 Onye nwe ubi vaịn ahụ wee sị, ‘Gịnị ka m ga-eme? M ga-eziga ọkpara m m hụrụ n’anya.+ Ikekwe, ha ga-akwanyere yanwa ùgwù.’ 14 Mgbe ndị ọrụ ubi ahụ hụrụ ya, ha gwara ibe ha, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-eketa ubi a. Ka anyị gbuo ya, ka ihe ọ ga-eketa bụrụzie nke anyị.’ 15 Ha wee kpọpụ ya n’ubi vaịn ahụ, gbuo ya.+ Gịnịzi ka onye nwe ubi vaịn ahụ ga-eme ha? 16 Ọ ga-abịa gbuo ndị ọrụ ubi a ma nyefee ndị ọzọ ubi vaịn ahụ.”

Mgbe ha nụrụ ihe a, ha sịrị: “Tụfịakwa!” 17 Ma o legidere ha anya, sị: “Gịnịzi ka ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ pụtara: ‘Nkume ndị na-arụ ụlọ jụrụ aghọọla nkume ji ụlọ?+ 18 Onye ọ bụla nke dara n’elu nkume a ga-akụri.+ Nkume a ga-egwerikwa onye ọ bụla ọ dakwasịrị.”

19 Ndị odeakwụkwọ na ndị isi nchụàjà chọrọ ijide ya n’oge ahụ, n’ihi na ha matara na o bu ha n’obi mee ihe atụ ahụ.+ Ma ha tụrụ ìgwè mmadụ ahụ egwu. 20 Ma, ebe ha na-achọ otú ha ga-esi nweta Jizọs, ha kwụrụ ụfọdụ ndị ụgwọ na nzuzo ma ziga ha ebe ọ nọ ka ha mee ka hà bụ ndị ezigbo mmadụ, ka ha jiri ihe ọ ga-ekwu mata ya n’ọnyà,+ iji nyefee ya n’aka ndị ọchịchị nakwa n’aka gọvanọ.* 21 Ha wee sị ya: “Onye Ozizi, anyị ma na ihe ị na-ekwu na ihe ị na-ezi bụ eziokwu, ị naghịkwa ele mmadụ anya n’ihu, kama ihe ị na-akụzi banyere Chineke bụ eziokwu. 22 È kwesịrị ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na e kwesịghị?” 23 Ma ọ matara na ha ji aghụghọ bịa. O wee sị ha: 24 “Gosinụ m otu mkpụrụ ego dinarịọs.* Isi ònye na aha ònye dị na ya? Ha asị: “Ọ bụ nke Siza.” 25 Ya asị ha: “N’ihi ya, kwụọnụ Siza ihe Siza,+ ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”+ 26 Ha ejilighị ihe o kwuru nweta ya n’ihu ìgwè mmadụ ahụ. Kama, ha gbara nkịtị n’ihi na ihe ọ zara juru ha anya.

27 Ma, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite n’ọnwụ adịghị,+ bịara sị ya:+ 28 “Onye Ozizi, Mosis dere, sị, ‘Ọ bụrụ na nwanne mmadụ lụrụ nwaanyị ma nwụọ n’amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke kwesịrị ịlụwa nwunye ya, sikwa n’aka ya mụtara nwanne ya nwoke nwa.’+ 29 Ma, e nwere ụmụnne asaa. Nke mbụ lụrụ nwaanyị ma nwụọ n’amụtaghị nwa. 30 Onye nke abụọ lụụrụ ya, nwụọkwa. 31 Otu ihe ahụ mekwara onye nke atọ. Otú ahụ ka o mere ha asaa. Ha niile nwụchara n’amụtaghị nwa. 32 N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ nwụkwara. 33 A kpọlite ha n’ọnwụ, ònye n’ime ha ka ọ ga-abụ nwunye ya, ebe ọ bụ na mmadụ asaa ahụ lụchara ya?”

34 Jizọs asị ha: “Ụmụ nke oge a* na-alụ nwunye, a na-ekekwa ha di. 35 Ma, ndị e weere ka ndị ruru eru ịdị ndụ n’oge ahụ na ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ agaghị alụ nwunye, a gaghịkwa eke ha di.+ 36 N’eziokwu, ha agaghịkwa anwụ ọzọ, n’ihi na ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi. Ebe ha ga-esikwa n’ọnwụ bilie, ha ga-abụ ụmụ Chineke. 37 Mgbe Mosis dere gbasara osisi ogwu na-ere ọkụ, o kwuru na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ kpọrọ Jehova* ‘Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’+ 38 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, n’ihi na n’anya ya, ha niile dị ndụ.”+ 39 Ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ ahụ asị ya: “Onye Ozizi, i kwutere ya,” 40 n’ihi na obi akaghịzi ha ịjụ ya ajụjụ ọ bụla.

41 O wee sị ha: “Gịnị mere ndị mmadụ ji asị na Kraịst bụ nwa Devid?+ 42 N’ihi na Devid kwuru n’akwụkwọ Abụ Ọma, sị, ‘Jehova* gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m 43 ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị bụrụ ihe i ji agbakwasị ụkwụ.”’+ 44 Ebe ọ bụ na Devid kpọrọ ya Onyenwe m, oleezi otú o si bụrụ nwa ya?”

45 Ka mmadụ niile nọ na-ege ntị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: 46 “Kpacharanụ anya maka ndị odeakwụkwọ. Ọ na-atọ ha ụtọ iyi uwe mwụda na-agagharị, ọ na-atọkwa ha ụtọ ka a na-ekele ha n’ọma ahịa, nakwa ka ha na-anọ n’oche ihu* n’ụlọ nzukọ nakwa n’isi oche ná nri anyasị.+ 47 Ha na-anara ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ihe niile ha nwere,* na-ekpekwa ogologo ekpere ka ndị mmadụ hụ ha. Ikpe a ga-ama ha ga-akarị nke ndị ọzọ.”

21 Mgbe Jizọs lere anya n’ebe igbe ndị a na-atụnye ego dị, ọ hụrụ ka ndị bara ọgaranya na-atụnye onyinye ha n’ime ha.+ 2 O wee hụ otu nwaanyị di ya nwụrụ, bụ́ onye dara ogbenye, ka ọ tụnyere obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụta ihe dị nnọọ ntakịrị.*+ 3 Jizọs wee sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na nwaanyị a di ya nwụrụ, nke dara ogbenye, tụnyere ego karịrị nke ha niile tụnyere.+ 4 N’ihi na ndị a niile si n’ọtụtụ ihe ha nwere na-atụnye onyinye ha n’igbe. Ma nwaanyị a tụnyere ihe niile o nwere, n’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye ọnụ ntụ.”*+

5 E mechaa, mgbe ụfọdụ ndị nọ na-ekwu banyere ụlọ nsọ, otú e si jiri nkume dị mma na ihe ndị e nyere Chineke chọọ ya mma,+ 6 ọ sịrị ha: “Ùnu hụrụ ihe ndị a niile? Oge na-abịa mgbe a ga-akwatu nkume a niile. E nweghị otu nkume a ga-ahapụ n’elu ibe ya.”+ 7 Ha wee jụọ ya, sị: “Onye Ozizi, olee mgbe ihe ndị a ga-eme? Gịnị ga-abụkwa ihe àmà ga-egosi na ihe ndị a agawala ime?”+ 8 O wee sị: “Lezienụ anya ka a ghara iduhie unu.+ N’ihi na ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m, sị, ‘Ọ bụ m bụ ya.’ Ha ga-asịkwa, ‘Oge ahụ a kara aka dị nso.’ Unu esokwala ha.+ 9 Mgbe unu na-anụkwa mkpọtụ agha na ọgba aghara, unu atụla ụjọ. N’ihi na ihe ndị a ga-ebu ụzọ mee, ma ọgwụgwụ agaghị abịa ozugbo ahụ.”+

10 Ọ gwakwara ha, sị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha,+ alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.+ 11 A ga-enwe oké ala ọma jijiji, ụkọ nri na ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.+ A ga-ahụkwa ihe ndị na-atụ egwu, nweekwa oké ihe àmà dị iche iche n’eluigwe.

12 “Ma tupu ihe a niile emee, ndị mmadụ ga-ejide unu ma kpagbuo unu,+ kpụrụ unu gaa n’ụlọ nzukọ, tụbakwa unu n’ụlọ mkpọrọ. A ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ n’ihi aha m.+ 13 Unu ga-eji ohere ahụ gbaara ndị ọzọ àmà. 14 N’ihi ya, kpebienụ n’obi unu na unu agaghị ebu ụzọ mụgharịa otú unu ga-esi azara ọnụ unu.+ 15 N’ihi na m ga-enye unu amamihe, nyekwara unu aka ka unu mara ihe unu ga-ekwu. Ndị iro unu agaghịkwa enwe ike ịgbagha ihe unu kwuru.+ 16 Ndị nne na nna unu na ụmụnne unu na ndị ikwu unu na ndị enyi unu ga-ararakwa unu nye. Ha ga-egbukwa ụfọdụ n’ime unu.+ 17 Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.+ 18 Ma, otu mkpụrụ ntutu isi unu agaghị ala n’iyi.+ 19 Ọ bụrụ na unu atachie obi ruo ọgwụgwụ, unu ga-enweta ndụ.*+

20 “Ma, mgbe unu hụrụ ka ìgwè ndị agha gbara Jeruselem gburugburu,+ maranụ na oge a ga-eme ka ọ tọgbọrọ nkịtị adịla nso.+ 21 Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.+ Ka ndị nọkwa na Jeruselem si na ya pụọ. Ka ndị nọkwa n’ime ime obodo ghara ịbanye na ya. 22 N’ihi na n’oge ahụ, Chineke ga-ekpe ndị mmadụ ikpe, ka ihe niile e dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo. 23 Ụmụ nwaanyị ndị dị ime na ndị ji nwa n’aka n’oge ahụ ga-ata ahụhụ.+ N’ihi na ezigbo nsogbu ga-adị n’ala a, a ga-atakwa ndị ala a ahụhụ. 24 A ga-ejikwa mma agha gbuo ha. A ga-adọrọkwa ha n’agha laa ná mba niile.+ Ndị mba ọzọ* ga-azọ Jeruselem ụkwụ, ruo mgbe oge ndị mba ọzọ ga-ezu.+

25 “A ga-ahụkwa ihe àmà dị iche iche n’anyanwụ na n’ọnwa nakwa na kpakpando.+ Mba dị iche iche ga-ahụju anya n’ụwa n’amaghị ihe ha ga-eme n’ihi otú oké osimiri si ebigbọ na otú o si amali elu. 26 Ndị mmadụ ga-atụbọkwa n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-eme n’ụwa, n’ihi na a ga-eme ka ihe* ndị dị n’eluigwe maa jijiji. 27 Mgbe ahụ, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ+ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii n’ike na ebube dị ukwuu.+ 28 Ma mgbe ihe ndị a niile malitere ime, guzonụ kwem, weliekwanụ isi unu elu, n’ihi na oge Chineke ga-anapụta unu eruola nso.”

29 O mekwaara ha otu ihe atụ, sị: “Leruonụ osisi fig na osisi ọzọ niile anya.+ 30 Mgbe ha mara ifuru, unu na-ahụ ya, mara na oge osisi ji amị mkpụrụ dị nso. 31 Ma ununwa, mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na Alaeze Chineke dị nso. 32 N’eziokwu, ana m asị unu na e nweghị ihe ga-eme ka ọgbọ a nwụchaa ruo mgbe ihe ndị a niile mere.+ 33 Eluigwe na ụwa ga-ala n’iyi.* Ma, e nweghị ihe ga-eme ka okwu m laa n’iyi.*+

34 “Ma kpacharanụ anya ka iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya+ na nchegbu nke ndụ ghara ịnyịgbu obi unu,+ ụbọchị ahụ abịa mgbe unu na-atụghị anya ya 35 dị ka ọnyà.+ N’ihi na ọ ga-abịa mgbe ndị niile bi n’ụwa na-atụghị anya ya. 36 N’ihi ya, mụrụnụ anya,+ na-arịọsikwanụ arịrịọ ike+ mgbe niile ka unu nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile ga-eme, nweekwa ike iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”+

37 N’ehihie, ọ na-ezi ihe n’ụlọ nsọ. Ma n’abalị, ọ na-apụ gaa nọrọ n’ugwu a na-akpọ Ugwu Oliv. 38 Mmadụ niile na-abịakwutekwa ya n’ụlọ nsọ n’isi ụtụtụ ka ha nụ okwu ya.

22 Ma Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko, nke a na-akpọ Ememme Ngabiga,+ na-eru nso.+ 2 Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na-atụkwa egwu ndị mmadụ.+ N’ihi ya, ha nọ na-achọ otú kacha mma ha ga-esi gbuo Jizọs.+ 3 Ma Setan banyere n’ime Judas, onye a na-akpọ Iskarịọt, onye bụ́kwa otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs.+ 4 O wee gakwuru ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị nche ụlọ nsọ, ya na ha akpaa otú ọ ga-esi rara ya nye n’aka ha.+ 5 Ihe a mere ha obi ụtọ, ha ekweta inye ya ego ọlaọcha.+ 6 O wee kwere, malitekwa ịchọ oge ga-adaba adaba ọ ga-eji rara ya nye n’aka ha mgbe ìgwè mmadụ na-anọghị ya.

7 Ụbọchị Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko wee ruo. Ọ bụ ụbọchị a na-achụ anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’àjà.+ 8 Jizọs wee gwa Pita na Jọn, sị: “Gaanụ kwadebere anyị nri Ememme Ngabiga ka anyị rie.”+ 9 Ha asị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị kwadebe ya?” 10 Ya asị ha: “Mgbe unu banyere Jeruselem, unu ga-ahụ otu nwoke bu udu mmiri. Soronụ ya baa n’ụlọ ọ ga-abanye.+ 11 Sịnụ onye nwe ụlọ ahụ, ‘Onye Ozizi sịrị: “Olee ọnụ ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie nri Ememme Ngabiga?”’ 12 Nwoke ahụ ga-egosi unu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu, e doziri edozi. Kwadebenụ ya n’ebe ahụ.” 13 Ha wee gawa hụ ya otú ahụ o si gwa ha. Ha kwadebekwara maka Ememme Ngabiga ahụ.

14 Mgbe oge ruru, ya na ndịozi ya nọdụrụ ala ka ha rie ihe na tebụl.+ 15 O wee sị ha: “Ọ gụsiri m agụụ ike iso unu rie nri Ememme Ngabiga a tupu mụ ataa ahụhụ. 16 Ana m asị unu, agaghị m eri ya ọzọ ruo mgbe ihe niile gbasara ya mezuru n’Alaeze Chineke.” 17 Ka ọ naara iko, o kelere Chineke, sị: “Burunụ ya. Onye ṅụrụtụ ihe dị n’ime ya, ya ebunye ibe ya. 18 Ana m asị unu, si ugbu a gawa, agaghị m aṅụ mmanya vaịn ọzọ ruo mgbe Alaeze Chineke ga-abịa.”

19 O wekwaara otu ogbe achịcha,+ kelee Chineke, nyawaa ya, were ya nye ha, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m,+ nke m ga-enye n’ihi unu.+ Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”+ 20 O bukwaara iko ahụ mgbe ha richara nri anyasị, sị: “Iko a pụtara ọgbụgba ndụ ọhụrụ+ nke ga-enwe isi mgbe m wụpụrụ ọbara m n’ihi unu.+

21 “Ma, mụ na onye ga-arara m nye nọ na tebụl a.+ 22 N’ihi na ihe niile e dere gbasara Nwa nke mmadụ ga-emezu.+ Ma, onye ga-arara ya nye ga-ata ahụhụ.”+ 23 Mgbe ha nụrụ ihe a, ha malitere ịjụ ibe ha onye n’ime ha na-eche ime ụdị ihe a.+

24 Ma, ha malitere ise ezigbo okwu, na-azọ onye kacha ukwuu n’ime ha.+ 25 Ma ọ sịrị ha: “Ndị eze ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, a na-akpọkwa ndị na-achị ha Ndị Ome Mma.+ 26 Ma, unu ekwesịghị ịdị otú ahụ.+ Kama ka onye kacha ukwuu n’etiti unu dịrị ka onye kacha nta,+ ka onye na-edu unu bụrụkwa onye na-eje ozi. 27 N’ihi na olee onye ka ukwuu? Ọ̀ bụ onye na-eri ihe, ka ọ̀ bụ onye na-ebunye ya nri?* Ọ́ bụghị onye na-eri ihe? Ma, ọ bụ m na-ejere unu ozi.+

28 “N’eziokwu, unu ahapụghị m+ n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị bịaara m.+ 29 Mụ na unu na-agbakwa ndụ na unu ga-achị n’alaeze, dịkwa ka mụ na Nna m gbara ndụ,+ 30 ka unu wee rie ma ṅụọ na tebụl m n’Alaeze m,+ nọdụkwa ala n’ocheeze+ na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.+

31 “Saịmọn, Saịmọn, Setan ekwuola na ya chọrọ ịyọcha unu niile ka ọka wit.+ 32 Ma arịọsiela m arịrịọ ike ka ị ghara ịda mbà n’okwukwe.+ Ma, mgbe okwukwe gị siri ike ọzọ, meekwa ka okwukwe ụmụnna gị sie ike.”+ 33 O wee sị ya: “Onyenwe anyị, adị m njikere iso gị gaa mkpọrọ, sorokwa gị nwụọ.”+ 34 Ma ọ sịrị ya: “Pita, ana m asị gị, tupu oké ọkpa akwaa taa, ị ga-ekwu ugboro atọ na ị maghị onye m bụ.”+

35 Ọ sịkwara ha: “Mgbe m zipụrụ unu, unu agawa n’ejighị obere akpa ego na obere akpa nri na akpụkpọ ụkwụ,+ ò nwere ihe kọrọ unu?” Ha asị ya: “Mba.” 36 Ya asị ha: “Ma ugbu a, ka onye nwere obere akpa ego were ya. Ka onye nwere obere akpa nri were ya. Ka onye na-enweghịkwa mma agha ree uwe elu ya zụta otu. 37 Akwụkwọ Nsọ sịrị: ‘A gụnyere ya ná ndị na-emebi iwu.’+ Ana m asị unu, ihe a bụ gbasara m, ọ ga-emezukwa n’isi m.”+ 38 Ha wee sị ya: “Onyenwe anyị, anyị ji mma agha abụọ.” Ya asị ha: “O zuola.”

39 Mgbe ọ pụrụ, ọ gawara n’Ugwu Oliv otú ọ na-emekarị. Ndị na-eso ụzọ ya sokwaara ya.+ 40 Mgbe ha ruru ebe ahụ, ọ sịrị ha: “Na-ekpenụ ekpere, ka a ghara ịnwata unu.”+ 41 O wee si n’ebe ha nọ pụọ gatụ ntakịrị, gbuo ikpere n’ala malite ikpe ekpere, 42 sị: “Nna, ọ bụrụ na ị chọọ, ekwela ka m ṅụọ ihe dị n’iko a. Ma, ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.”+ 43 Otu mmụọ ozi nke si n’eluigwe pụtara n’ihu ya wee mee ka obi sie ya ike.+ 44 Ma ebe obi na-erughị ya ala, ọ nọ na-ekpesi ekpere ike.+ Ọsụsọ ya dịkwa ka ọbara, na-atapụsịkwa n’ala. 45 Mgbe o si ebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere bilie gakwuru ndị na-eso ụzọ ya, ọ hụrụ ka ha na-ehi ụra, n’ihi na ihe na-ewute ha n’obi mere ka ike gwụ ha.+ 46 O wee sị ha: “Gịnị mere unu ji ehi ụra? Bilienụ, na-ekpekwanụ ekpere, ka a ghara ịnwata unu.”+

47 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ìgwè mmadụ bịara, nwoke ahụ a na-akpọ Judas, bụ́ otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, dukwa ha. O wee bịaruo Jizọs nso ka o susuo ya ọnụ.+ 48 Ma Jizọs sịrị ya: “Judas, ì ji isusu ọnụ arara Nwa nke mmadụ nye?” 49 Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe na-aga ime, ha sịrị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ anyị jiri mma agha lụso ha ọgụ?” 50 Otu onye n’ime ha gbudịrị ohu nnukwu onye nchụàjà mma, bepụ ntị aka nri ya.+ 51 Ma Jizọs sịrị: “O zuolanụ.” O wee bitụ ntị nwoke ahụ aka, gwọọ ya. 52 Jizọs wee gwa ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị nche ụlọ nsọ na ndị okenye chọ ya bịa ebe ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ka à ga-asị na unu bịara ijide onye ohi?+ 53 Mgbe mụ na unu na-anọ n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị,+ unu ejideghị m.+ Ma, oge a bụ oge unu nakwa oge e nyere ndị nọ n’ọchịchịrị ikike.”+

54 Ha wee jide ya, kpụrụ ya pụọ,+ kpụbata ya n’ụlọ nnukwu onye nchụàjà. Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ha.+ 55 Mgbe ha kwanyere ọkụ n’etiti mbara èzí wee nọdụ ala, Pita sokwa ha nọrọ ọdụ ebe ahụ.+ 56 Ma otu nwa agbọghọ na-eje ozi ebe ahụ hụrụ ya ka ọ nọ ọdụ n’akụkụ ọkụ ahụ, wee leruo ya anya, sị: “Ya na nwoke a na-anọkwa.” 57 Ma ọ gọrọ agọ, sị: “Nwaanyị, amaghị m onye ọ bụ.” 58 Mgbe obere oge gara, onye ọzọ hụrụ ya ma sị: “Ị bụkwa otu n’ime ha.” Ma Pita sịrị: “Nwoke m, ọ bụghị eziokwu.”+ 59 Mgbe ihe dị ka otu awa gara, nwoke ọzọ malitere ikwusi ike, sị: “O doro m anya na ya na nwoke a na-anọ, n’ihi na n’eziokwu, ọ bụ onye Galili!” 60 Ma Pita sịrị: “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu.” N’otu ntabi anya, ka ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, oké ọkpa kwara. 61 Onyenwe anyị tụgharịziri legide Pita anya, Pita echeta okwu Onyenwe anyị gwara ya, sị: “Tupu oké ọkpa akwaa taa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ 62 O wee pụọ n’èzí bee ezigbo ákwá.

63 Ndị ahụ ji Jizọs malitere ịkwa ya emo,+ na-etikwa ya ihe.+ 64 Mgbe ha kpuchiri ya ihu, ha sịrị ya: “Buo amụma, gwa anyị onye tiri gị ihe.” 65 Ha gwakwara ya ọtụtụ okwu ọjọọ ndị ọzọ iji kwuluo ya.

66 Mgbe chi bọrọ, ìgwè ndị okenye ndị Juu, ma ndị isi nchụàjà ma ndị odeakwụkwọ, zukọtara.+ Ha wee kpụrụ ya banye n’ụlọ nzukọ Sanhedrin ha, sị ya: 67 “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.”+ Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụrụgodị na mụ agwa unu, unu agaghị ekwe. 68 Ọ bụrụkwa na mụ ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza. 69 Ma, si ugbu a gawa, Nwa nke mmadụ+ ga-anọdụ ala n’aka nri Chineke dị ike.”+ 70 Ha niile wee sị: “Ị̀ na-ekwu na ị bụ Ọkpara Chineke?” O wee sị ha: “Ọ bụ unu kwuru na m bụ.”* 71 Ha wee sị: “Ọ̀ ka bara uru ịchọwa ndị akaebe ọzọ, n’ihi na anyị anụla ya n’ọnụ ya?”+

23 Ìgwè mmadụ ahụ niile wee bilie kpụrụ Jizọs kpụgara Paịlet.+ 2 Ha wee malite ibo ya ebubo,+ sị: “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eme ka ndị obodo anyị na-emegide ndị ọchịchị. Ọ na-asịkwa na e kwesịghị ịkwụ Siza ụtụ isi,+ nakwa na ya bụ Kraịst, bụ́ eze.”+ 3 Paịlet wee jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ Eze ndị Juu?” Ya asị: “Ọ bụ gị kwuru ya.”*+ 4 Paịlet wee gwa ndị isi nchụàjà na ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere.”+ 5 Ma ha kwusiri ike, sị: “Ihe ọ na-ezi ndị mmadụ na Judia niile, malite na Galili ruo ebe a, na-eme ka ndị mmadụ na-enupụ isi.” 6 Mgbe Paịlet nụrụ ihe a, ọ jụrụ ma ọ̀ bụ onye Galili. 7 Mgbe ọ chọpụtara na o si n’ógbè Herọd+ na-achị, o zigaara ya Herọd, onye nọkwa na Jeruselem n’oge ahụ.

8 Mgbe Herọd hụrụ Jizọs, obi tọrọ ya ezigbo ụtọ n’ihi na ọ dịla anya ọ nọ na-achọ ịhụ ya. Ọ nụla ọtụtụ ihe gbasara ya,+ ọ nọkwa na-atụ anya ịhụ ọrụ ebube ụfọdụ ọ ga-arụ. 9 O wee malite ịjụ ya ọtụtụ ajụjụ, ma ọ tụpụrụghị ya ọnụ.+ 10 Ma, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nọ na-ebili, jiri iwe na-ebo ya ebubo. 11 Herọd na ndị agha ya kparịrị ya,+ yiwekwa ya uwe mara mma iji kwaa ya emo,+ mechazie kpụghachiri ya Paịlet. 12 Herọd na Paịlet ghọrọ enyi n’ụbọchị ahụ, n’ihi na tupu ụbọchị ahụ, ha nọ n’iro.

13 Paịlet kpọkọtaziri ndị isi nchụàjà na ndị na-achị achị na ìgwè mmadụ ahụ 14 wee sị ha: “Unu kpọtaara m nwoke a, sị na ọ na-eme ka ndị mmadụ na-enupụ isi. Ma, ajụrụ m ya ajụjụ n’ihu unu gbasara ihe unu sị na o mere. Ahụghịkwa m ihe ọjọọ ọ bụla o mere.+ 15 N’eziokwu, o nweghịkwa ihe Herọd hụrụ o mere, n’ihi na o zighachiteere anyị ya. O nweghị ihe o mere e kwesịrị iji gbuo ya. 16 N’ihi ya, m ga-apịa ya ihe+ ma hapụ ya.” 17* —— 18 Ma ìgwè mmadụ ahụ niile tiri mkpu, sị: “Gbuo nwoke a* ma hapụrụ anyị Barabas!”+ 19 (Ihe mere e ji tụọ Barabas mkpọrọ bụ maka na o mere ka ndị mmadụ na-agba ndị ọchịchị obodo mgba okpuru, nakwa maka na o gburu mmadụ.) 20 Paịlet gwakwara ha okwu ọzọ, n’ihi na ọ chọrọ ịhapụ Jizọs.+ 21 Ha wee malite iti mkpu, na-asị: “Kwụwa ya n’osisi! Kwụwa ya n’osisi!”*+ 22 Na nke ugbo atọ ya, ọ sịrị ha: “Maka gịnị? Olee ihe ọjọọ nwoke a mere? Ahụghị m ihe ọ bụla o mere e kwesịrị iji gbuo ya. N’ihi ya, m ga-apịa ya ihe ma hapụ ya.” 23 Ha wee jiri oké olu na-ekwusi ike ka a kwụwa ya n’osisi. Olu ha nọ na-ala elu+ nke na 24 ike gwụrụ Paịlet, ya ekpebie ka e mee ihe ha chọrọ. 25 Ọ hapụrụ nwoke ahụ ha chọrọ, onye a tụrụ mkpọrọ maka na o gburu mmadụ, na-agbakwa ọchịchị mgba okpuru. Ma, o nyefere Jizọs n’aka ha ka ha mee ya ihe ha chọrọ.

26 Ma ka ha kpụ ya na-apụ, ha kwụsịrị Saịmọn, onye Saịrini, mgbe o si n’ime obodo na-abịa. Ha manyere ya ka o buru osisi ịta ahụhụ* ahụ soro Jizọs n’azụ.+ 27 E nwekwara ìgwè mmadụ na ụmụ nwaanyị ndị na-eso Jizọs n’azụ. Ụmụ nwaanyị ndị ahụ nọ na-eti aka n’obi ma na-ebere ya ákwá arịrị. 28 Jizọs tụgharịrị lee ụmụ nwaanyị ahụ anya, sị: “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, kwụsịnụ ibere m ákwá. Bewerenụ onwe unu na ụmụ unu.+ 29 Ụbọchị na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-asị, ‘Ụmụ nwaanyị aga, na ụmụ nwaanyị na-amụghị nwa, na ụmụ nwaanyị na-enyeghị nwa ara na-enwe obi ụtọ.’+ 30 Mgbe ahụ, ha ga-amalite ịsị ugwu ukwu, ‘Dakwasị anyị!’ sịkwa ugwu nta, ‘Kpuchie anyị!’+ 31 Ọ bụrụ na ihe ndị a na-eme mgbe osisi dị ndụ, gịnị ga-eme mgbe ọ kpọnwụrụ akpọnwụ?”

32 E dukwa ụmụ nwoke abụọ ọzọ, bụ́ ndị omekome, na-aga ka e gbuo ha na ya.+ 33 Mgbe ha rukwara ebe a na-akpọ Okpokoro Isi,+ ha kpọgidere ya na ndị omekome ahụ n’osisi, otu onye n’aka nri ya, otu onye n’aka ekpe ya.+ 34 Ma Jizọs nọ na-asị: “Nna, gbaghara ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.” Ha fekwaara uwe ya nza ka ha mara onye ga-achịrị nke ọ ga-achịrị.+ 35 Ìgwè mmadụ guzo na-ekiri ihe na-emenụ. Ma ndị na-achị achị nọ na-akwa ya emo, sị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ. Ya zọpụtanụ onwe ya, ma ọ bụrụ na ọ bụ Kraịst, Onye Chineke Họọrọ.”+ 36 Ndị agha kwakwara ya emo, bịakwa nye ya mmanya gbara ụka,+ 37 sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ Eze ndị Juu, zọpụta onwe gị.” 38 E dekwara ihe n’elu osisi a kpọgidere ya, sị: “Onye a bụ Eze ndị Juu.”+

39 Otu n’ime ndị omekome ahụ a kwụwara n’elu osisi malitekwara ịkparị ya,+ sị: “Ọ̀ kwa ị sị na ị bụ Kraịst? Zọpụtanụ onwe gị, zọpụtakwa anyị.” 40 Onye nke ọzọ wee baara onye nke ahụ mba, sị ya: “Ọ̀ bụ na ị naghị atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na ahụhụ a tara gị ka a tara nwoke a? 41 Anyị na-ata ahụhụ ihe anyị metara. Ma, nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọ bụla.” 42 O kwuziri, sị: “Jizọs, cheta m ma ị banye n’Alaeze gị.”+ 43 Jizọs asị ya: “N’eziokwu, ana m asị gị taa, mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”+

44 Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ ihe dị ka n’awa nke isii,* ma ọchịchịrị gbara n’ala ahụ niile ruo n’awa nke itoolu,*+ 45 n’ihi na ìhè anyanwụ apụtaghị. Ákwà mgbochi nke dị n’ụlọ nsọ+ dọwakwara ụzọ abụọ.+ 46 Jizọs wee tie mkpu n’oké olu, sị: “Nna, m na-enyefe mmụọ m n’aka gị.”+ Mgbe o kwuchara ihe a, o kubiri ume.+ 47 Mgbe onyeisi ndị agha ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ malitere ito Chineke, sị: “N’eziokwu, nwoke a bụ onye ezi omume.”+ 48 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ zukọtara ebe ahụ hụrụ ihe niile merenụ, ha tiiri aka n’obi na-ala n’ụlọ ha. 49 Ndị niile ya na ha ma guzokwa n’ebe dịtụ anya. Ụmụ nwaanyị ndị si na Galili soro ya nọkwa ebe ahụ, ha hụkwara ihe ndị a.+

50 Ma, e nwere otu nwoke aha ya bụ Josef, onye so ná ndị na-ekpe ikpe n’ụlọikpe kacha elu nke ndị Juu.* Ọ bụkwa ezigbo mmadụ na onye ezi omume.+ 51 (Nwoke a akwadoghị nkata ha kpara na ihe ha mere.) Ọ bụ onye Arimatia, bụ́ obodo ndị Judia. Ọ na-echekwa ka Alaeze Chineke bịa. 52 Nwoke a gakwuuru Paịlet rịọ ya ka e bunye ya ozu Jizọs. 53 O wee budata ya+ ma fụchie ya ezigbo ákwà linin, liekwa ya n’ili* e gwuru n’oké nkume,+ nke ọ na-adịbeghị onye e liri na ya. 54 Ma, ọ bụ ụbọchị e ji akwadebe maka Ụbọchị Izu Ike,*+ ọ fọkwara obere ka Ụbọchị Izu Ike+ ruo. 55 Ma ụmụ nwaanyị ndị ahụ, ndị si na Galili soro Jizọs, so gaa kirie ili* ahụ ma hụ otú e si lie ozu ya.+ 56 Ha laghachikwara ka ha kwadebe ihe na-esi ísì ọma na mmanụ na-esi ísì ọma. Ma, ha zuru ike n’Ụbọchị Izu Ike+ otú iwu kwuru.

24 Ma, n’ụbọchị mbụ n’izu,* ụmụ nwaanyị ahụ ji ihe na-esi ísì ọma ha kwadebere+ gaa n’ili* ahụ n’isi isi ụtụtụ. 2 Ma ha hụrụ na a kwapụla nkume e ji mechie ili* ahụ.+ 3 Mgbe ha banyere, ha ahụghị ozu Onyenwe anyị Jizọs.+ 4 Ka ihe a nọ na-eju ha anya, ụmụ nwoke abụọ ndị yi uwe na-enwu gbaa bịara guzo n’akụkụ ha. 5 Ụjọ jidere ụmụ nwaanyị ahụ, ha ekpudo ihu n’ala. Ụmụ nwoke ahụ asị ha: “Gịnị mere unu ji gaa n’ili na-achọ onye dị ndụ?+ 6 Ọ nọghị ebe a, kama a kpọlitela ya. Chetanụ ihe ọ gwara unu mgbe ọ ka nọ na Galili. 7 O kwuru na a ga-enyefe Nwa nke mmadụ n’aka ndị mmehie, nakwa na a ga-egbu ya n’elu osisi. Ma ọ ga-ebili n’ụbọchị nke atọ.”+ 8 Ha wee cheta ihe ndị o kwuru,+ 9 si n’ili* ahụ laghachi ma kọọrọ ndịozi iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a niile.+ 10 Ụmụ nwaanyị ndị ahụ bụ Meri Magdalin, Joana, na Meri nne Jems. Ụmụ nwaanyị ndị ọzọ ndị so ha nọkwa na-akọrọ ndịozi ihe ndị a. 11 Ma, ha ekwetaghị ihe ụmụ nwaanyị ahụ kwuru. Ọ dara ha ka okwu na-enweghị isi.

12 Ma Pita biliri, gbara ọsọ gaa n’ili* ahụ. Mgbe o hulatara lee anya, ọ hụrụ naanị ákwà e ji kechie ozu Jizọs. N’ihi ya, ọ pụwara, na-atụgharị uche n’ihe ahụ merenụ.

13 Ma n’ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-aga otu obodo a na-akpọ Emeọs, nke dị ihe dị ka kilomita iri na otu* ma e si Jeruselem gawa ya. 14 Ha nọ na-ekwurịta banyere ihe ndị a niile merenụ.

15 Ma ka ha na-akparịta ihe ndị a, Jizọs bịara ha nso wee soro ha na-aga. 16 Ma, ha amataghị onye ọ bụ.+ 17 O wee sị ha: “Gịnị ka unu na-akpa gbasara ya?” Ha wee kwụsị, gbarụọ ihu. 18 Onye nke aha ya bụ Kliopas asị ya: “Ị̀ bụ onye ọbịa na Jeruselem nke mere na ị maghị ihe ndị mere na ya n’oge a?”* 19 Ya ajụọ ha, sị: “Ihe ndị dị ka gịnị?” Ha asị ya: “Ihe ndị gbasara Jizọs onye Nazaret.+ Ọ bụ onye amụma. Okwu ya na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ masịkwara Chineke na mmadụ niile.+ 20 Ndị isi nchụàjà na ndị na-achị anyị nyefere ya ka e gbuo ya.+ Ha kpọgidekwara ya n’osisi. 21 Ma anyị nọ na-atụ anya na nwoke a ga-anapụta Izrel.+ E wezụgakwa ihe ndị a, nke a bụ ụbọchị nke atọ kemgbe ihe ndị a mere. 22 Ihe ụmụ nwaanyị ụfọdụ, bụ́kwa ndị na-eso ụzọ Jizọs, kọọrọ anyị juru anyị anya, n’ihi na ha gara n’ili* ya n’isi ụtụtụ,+ 23 ma ha ahụghị ozu ya. Ha bịakwara na-ekwu na ha hụrụ ihe dị ebube, ya bụ, ndị mmụọ ozi, ndị sịrị na ọ dị ndụ. 24 Ụfọdụ n’ime ndị anyị na ha nọ gakwara n’ili* ahụ,+ hụkwa na ọ tọgbọ chakoo otú ụmụ nwaanyị ahụ kwuru. Ha ahụghị ozu Jizọs.”

25 N’ihi ya, ọ sịrị ha: “Unu ndị na-amaghị ihe, ndị obi ha kpọchikwara akpọchi, gịnị mere unu ekwereghị ihe niile ndị amụma kwuru? 26 Ọ̀ bụ na ihe ndị a ekwesịghị ime Kraịst,+ ka e nwee ike ime ka ọ dị ebube?”+ 27 Ọ kọwaara ha ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ gbasara onwe ya, malite n’ihe Mosis dere ruo n’Akwụkwọ Ndị Amụma niile.+

28 N’ikpeazụ, ha rutere nso n’obodo ahụ ha na-aga, o wee mee ka à ga-asị na ọ ka na-agakwu n’ihu. 29 Ma ha gwasiri ya ike ka ọ nọrọ. Ha sịrị ya: “Ka anyị na gị nọrọ, n’ihi na chi ejiwela.” O wee banye n’ụlọ ha ka ya na ha nọrọ. 30 Mgbe ya na ha nọ na-eri nri, o weere ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, ma malite inye ha ya.+ 31 Mgbe ahụ ka ha matara onye ọ bụ. Ma, ọ pụrụ n’anya ha ozugbo.+ 32 Ha agwa ibe ha, sị: “Ka a sịkwa ihe mere okwu ya ji ruo anyị nnọọ n’obi mgbe ọ nọ na-agwa anyị okwu n’ụzọ, na-akọwakwara anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma.” 33 Ha biliri mgbe ahụ ma laghachi Jeruselem. Ha hụkwara ndịozi iri na otu ahụ na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs ha na ha zukọrọ. 34 Ndị ahụ wee sị ha: “N’eziokwu, a kpọlitela Onyenwe anyị, ọ pụtakwara n’ihu Saịmọn.”+ 35 Hanwa kọkwara ihe ahụ mere n’ụzọ na otú ha si mata onye Jizọs bụ mgbe ọ nyawara ogbe achịcha.+

36 Ka ha nọ na-ekwu ihe ndị a, Jizọs bịara guzoro ebe ha nọ, sị ha: “Udo dịrị unu.”+ 37 Ma obi mapụrụ ha, ezigbo ụjọ tụkwara ha n’ihi na ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha na-ahụ. 38 O wee sị ha: “Gịnị mere unu ji na-atụ ụjọ? Gịnịkwa mere unu ji na-enwe obi abụọ? 39 Ọ bụ m. Leenụ aka m na ụkwụ m. Metụnụ m aka ka unu chọpụta, n’ihi na mmụọ anaghị enwe anụ ahụ́ na ọkpụkpụ dị ka unu na-ahụ na m nwere.” 40 Mgbe o kwuru ihe a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. 41 Ma ha ekwetaghị n’ihi ọṅụ juru ha obi na otú ihe a si ju ha anya. Ọ sịziri ha: “Ùnu nwere ihe oriri ebe a?” 42 Ha wee nye ya otu ntakịrị azụ̀ a mịrị amị. 43 O wee nara ya, nọrọkwa n’ihu ha taa ya.

44 Ọ gwaziri ha, sị: “Ihe ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu ka nọ,+ na ihe niile e dere gbasara m n’Iwu Mosis, n’Akwụkwọ Ndị Amụma, nakwa n’Abụ Ọma ga-emezurịrị.”+ 45 O nyeziiri ha aka ha aghọta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke ọma.+ 46 Ọ sịkwara ha, “Akwụkwọ Nsọ sịrị: na Kraịst ga-ata ahụhụ ma si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ,+ 47 malitekwa na Jeruselem+ ruo ná mba niile,+ a ga-eji aha ya kwusaara ndị mmadụ na ha kwesịrị ichegharị ka a gbaghara ha mmehie ha.+ 48 Unu ga-agba àmà gbasara ihe ndị a.+ 49 M ga-ezitere unu ihe Nna m kwere ná nkwa. Ma, nọrọnụ n’obodo a ruo mgbe unu ga-enweta ike si n’elu.”+

50 O duuru ha garuo Betani, chịlie aka ya elu ma gọzie ha. 51 Mgbe ọ gọzichara ha, ọ hapụrụ ha, Chineke akpọrọ ya laa eluigwe.+ 52 Ha wee kpọọrọ ya isiala ma ṅụrụ ezigbo ọṅụ laghachi Jeruselem.+ 53 Ha na-anọkwa n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị na-eto Chineke.+

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “iji mee ka obi ndị nna chigharịkwuru ụmụ ha.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “hụrụ ọhụụ.”

Ma ọ bụ “ejere ọhaneze ozi.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “M.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A5.

Na Grik, “mkpụrụ.”

Gụọ A5.

Ya bụ, obere bọọdụ.

Gụọ A5.

Na Grik, “aka Jehova dịnyeere ya.”

Gụọ A5.

Na Grik, “ka mpi nzọpụta bilie.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Mpi.”

Gụọ A5.

Na Grik, “gbasiekwa ike n’ime mmụọ.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ndị ihe ha masịrị Chineke.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Na Grik, “nwa nwoke ọ bụla meghere akpa nwa.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ná mkpụrụ obi gị.”

Na Grik, “malite n’oge ọ na-amaghị nwoke.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “na-erubere ha isi.”

Ya bụ, Herọd Antipas. Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A5.

Na Grik, “Anụ ahụ́.”

Ma ọ bụ “ụgwọ ọnwa unu.”

Ma ọ bụ “i fee m otu ugboro.”

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Na Grik, “ndị mmụọ na-adịghị ọcha.”

Ma ọ bụ “ịchọgharị.”

Ya bụ, Oké Osimiri Galili.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Grik, “ndị mmụọ na-adịghị ọcha.”

Ya bụ, n’anaghị ọmụrụ nwa.

Ma ọ bụ “Na-atọhapụnụ.”

Ma ọ bụ “a ga-atọhapụkwa.”

Ma ọ bụ “Onye na-eso ụzọ.”

Ma ọ bụ “Onye na-enweghị ihe mere ọ ga-eji hapụ inwe okwukwe na m.”

Ma ọ bụ “uwe dị yọrịị.”

Na Grik, “n’ihu gị.”

Ma ọ bụ “ntụziaka.”

Gụọ B14.

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Na Grik, “mmụọ ahụ na-adịghị ọcha.”

O nwere ike ịbụ, “Ọ dịla anya mmụọ ahụ jisiri ya ike.”

Ma ọ bụ “n’olulu na-enweghị nsọtụ.”

Na Grik, “a ga-azọpụta ya.”

Na Grik, “Mmụọ ya wee lọghachi.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Mmụọ.”

Na Grik, “ọlaọcha.”

Ma ọ bụ “uwe ọzọ.”

Ya bụ, Herọd Antipas. Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “gọzie ha.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Na Grik, “lee nwa m nwoke anya.”

Na Grik, “mmụọ ahụ na-adịghị ọcha.”

Ma ọ bụ “amakụkwala onye ọ bụla mgbe unu na-ekele ya.”

Ma ọ bụ “na Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “Ọkpara ahụ.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A5.

Gụọ B14.

Na Grik, “onye ọ bụla nke ji anyị ụgwọ.”

Na Grik, “Ewebala anyị n’ọnwụnwa.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Bielzebọb bụ aha a na-akpọ Setan.

Na Grik, “mkpịsị aka Chineke.”

Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”

Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”

Ma ọ bụ “anya doro gị.”

Na Grik, “anya gị dị njọ.”

Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”

Ya bụ, ịkwọ aka otú ọdịnala ndị Juu si kwuo.

Ma ọ bụ “nye ndị ogbenye onyinye.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “n’ebe kacha mma.”

Na Grik, “ili ncheta.”

Ma ọ bụ “ili ndị a na-ahụwaghị ama.”

Ma ọ bụ “ili ncheta.”

Na Grik, “unu wepụrụ mkpịsị ugodi e ji amata Chineke. Unu abanyeghị, unu na-egbochikwa ndị chọrọ ịbanye.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “mkpụrụ ego asariọn abụọ.” Gụọ B14.

Ma ọ bụ “na-eleghara anya.”

O nwere ike ịbụ, “n’ụlọ nzukọ.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”

Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi, i.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Gụọ B14.

Ma ọ bụ “nye ndị ogbenye onyinye.” Gụọ Nkọwa Okwu.

N’ala Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.

Na Grik, “Keenụ ájị̀ n’úkwù.”

Ma ọ bụ “oriọna.”

Malite n’ihe dị ka elekere itoolu nke abalị ruo etiti abalị.

Malite n’etiti abalị ruo n’ihe dị ka elekere atọ n’ime abalị.

Ma ọ bụ “nke ma ihe.”

Na Grik, “mkpụrụ ego leptọn ikpeazụ i nwere.” Gụọ B14.

Ma ọ bụ “mere ka o nwee nkwarụ.”

Na Grik, “sia.” Otu sia bụ lita 7.33. Gụọ B14.

Gụọ A5.

Na Grik, “ga-ata achịcha.”

Na Grik, “ma ọ kpọghị nne ya na nna ya na nwunye ya na ụmụ ya na ụmụnne ya ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwaanyị nakwa mkpụrụ obi ya asị.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ B14.

Gụọ B14.

Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”

Ma ọ bụ “ndị enyi ya nwaanyị.”

Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ndụ ịla n’iyi; ndụ nzuzu.”

Ma ọ bụ “ụgbụgbọ mkpụrụ osisi karọb.”

Na Grik, “dakwasị ya n’olu.”

Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.

Ma ọ bụ “ahụ́ siri ya ike mgbe ọ lọtara.”

Na Grik, “lara ihe gị n’iyi.”

Na Grik, “otu narị bat mmanụ oliv.” Bat bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu bat bụ lita 22 (galọn 5.81). Gụọ B14.

Ma ọ bụ “otu narị kọọ ọka wit.” Kọọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu kọọ bụ lita 220. Gụọ B14.

Gụọ Nkọwa Okwu.

“Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma” pụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.

Ya bụ, onye gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma, ọ bụghị n’ihi na ọ kwara iko.

Ya bụ, nwaanyị a gbara alụkwaghịm, ma, ọ bụghị n’ihi na ọ kwara iko.

Na Grik, “busa n’obi.”

Ma ọ bụ “na Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Na Grik, “n’obi ya.”

Sọlfọ a na-ekwu gbasara ya bụ nkume dị ọkụ.

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Gụọ A3.

Na Grik, “okwukwe ahụ.”

Ma ọ bụ “egbula ọchụ.”

Ma ọ bụ “n’oge na-abịa abịa.” Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”

Ma ọ bụ “n’osisi fig ọhịa.”

Ma ọ bụ “m ji aghụghọ nara mmadụ.”

Maịna ndị Grik bụ gram 340. Otu maina bụ 100 drakma. Gụọ B14.

Na Grik, “ọlaọcha.”

Na Grik, “ọlaọcha m.”

Gụọ A5.

Na Grik, “nyochaa gị.”

Na Grik, “n’ikike gọvanọ.”

Gụọ B14.

Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A5.

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “n’ebe kacha mma.”

Na Grik, “Ha na-eripịa ụlọ ụmụ nwaanyị isi mkpe.”

Na Grik, “mkpụrụ ego leptọn abụọ.” Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ọ dara ụkpa.”

Ma ọ bụ “ga-enweta mkpụrụ obi unu.”

Ma ọ bụ “Ndị Jentaịl.”

Na Grik, “ike.”

O nwere ike ịbụ ndị na-achị achị na ndị ha na-achị n’ụwa ọjọọ a ka a na-ekwu maka ha.

Ma ọ bụ “ghara imezu.”

Ma ọ bụ “onye na-ejere ya ozi.”

Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.

Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.

Gụọ A3.

Na Grik, “Kpọrọ onye a pụọ.”

Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi! Gbuo ya n’elu osisi!”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.

Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.

Ma ọ bụ “na Sanhedrin.”

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Ya bụ, Fraịdee.

Ma ọ bụ “ili ncheta.”

Ihe a na-akpọ ụbọchị a ugbu a bụ Sọnde. Ọ bụ ya bụ ụbọchị mbụ n’izu ndị Juu.

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Ma ọ bụ “ili ncheta.”

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Ihe dị ka maịl 7. Na Grik, “stediọm 60.” Otu stediọm bụ mita 185 (amaụkwụ 606.95). Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.

O nwere ike ịbụ, “Ọ̀ bụ naanị gị bụ onye ọbịa na Jeruselem nke mere na ị maghị ihe ndị mere na ya n’oge a?”

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya