OZI ỌMA MATIU DERE
1 Akwụkwọ kọrọ akụkọ* banyere Jizọs Kraịst,* nwa Devid,+ nwa Ebreham:+
3 Juda mụrụ Pirez na Zira.+ Tema bụ nne ha.
5 Salmọn mụrụ Boaz, onye Rehab mụụrụ ya.+
Boaz mụrụ Obed, onye Rut mụụrụ ya.+
Obed mụrụ Jesi.+
Devid mụrụ Solomọn,+ onye nwunye Yuraya mụụrụ ya.
11 Josaya+ mụrụ Jekonaya+ na ụmụnne ya ndị nwoke mgbe a dọọrọ ndị Juu n’agha laa Babịlọn.+
16 Jekọb mụrụ Josef di Meri, onye mụrụ Jizọs,+ onye a na-akpọ Kraịst.+
17 Ọgbọ ahụ niile, malite n’Ebreham ruo na Devid, dị ọgbọ iri na anọ. Malitekwa na Devid ruo mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn, dị ọgbọ iri na anọ. Malitekwa mgbe a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn ruo na Kraịst, dị ọgbọ iri na anọ.
18 Ma, otú a ka e si mụọ Jizọs Kraịst. N’oge Josef kwere Meri nne Jizọs nkwa na ọ ga-alụ ya, tupu ha alụọ, a hụrụ na Meri dị ime n’ike mmụọ nsọ.+ 19 Ma, Josef di ya bu n’obi ịgba ya alụkwaghịm na nzuzo n’ihi na ọ bụ onye ezi omume, ọ chọghịkwa ibupụta ya n’ihu ọha.+ 20 Ma mgbe o chebachaara ihe ndị a echiche, mmụọ ozi Jehova* bịakwutere ya ná nrọ, sị ya: “Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri nwunye gị laa, n’ihi na ime ahụ ọ dị si n’ike mmụọ nsọ.+ 21 Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Jizọs,*+ n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.”+ 22 Ihe a niile mere ka ihe Jehova* si n’ọnụ onye amụma ya kwuo mezuo. Ọ sịrị: 23 “Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-adị ime, mụọ nwa nwoke. A ga-agụ ya Ịmanuel,”+ nke pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.”+
24 Josef wee teta n’ụra, mee ihe mmụọ ozi Jehova* gwara ya ma kpọrọ nwunye ya laa. 25 Ma ya na ya enweghị mmekọahụ ruo mgbe ọ mụrụ nwa nwoke,+ o wee gụọ ya Jizọs.+
2 Mgbe a mụrụ Jizọs na Betlehem+ nke Judia n’oge Herọd*+ na-achị, ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ bịa Jeruselem. 2 Ha sịrị: “Olee ebe nwa ọhụrụ ahụ ga-abụ eze ndị Juu nọ?+ N’ihi na anyị hụrụ kpakpando ya mgbe anyị nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Anyị bịara ịkpọrọ ya isiala.” 3 Mgbe Eze Herọd na ndị niile nọ na Jeruselem nụrụ ihe a, ahụ́ erughịzi ha ala. 4 Ọ kpọkọtaziri ndị isi nchụàjà niile na ndị odeakwụkwọ niile nke ndị Juu, jụọ ha ebe a ga-amụ Kraịst.* 5 Ha sịrị ya: “Ọ bụ na Betlehem+ nke Judia, n’ihi na otú a ka onye amụma si dee ya: 6 ‘Ma gịnwa, Betlehem nke dị na Juda, ndị ọzọ niile na-achị Juda ekwesịghị iwere na ị bụ obodo kacha obere, n’ihi na onye na-achị achị ga-esi n’ime gị pụta, onye ga-azụ ndị m, bụ́ Izrel, dị ka atụrụ.’”+
7 Herọd wee kpọọ ndị ahụ ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ma jụta ha nke ọma na nzuzo mgbe kpakpando ahụ pụtara. 8 Mgbe ọ na-eziga ha Betlehem, ọ sịrị: “Gaanụ chọọ nwatakịrị ahụ nke ọma. Unu chọta ya, bịanụ kọọrọ m ka mụnwa gaakwa kpọọrọ ya isiala.” 9 Mgbe eze gwachara ha ihe a, ha gawara, ma, kpakpando ahụ ha hụrụ mgbe ha nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ+ nọ na-aga ha n’ihu ruo mgbe ọ kwụsịrị n’elu ebe nwatakịrị ahụ nọ. 10 Mgbe ha hụrụ ka kpakpando ahụ kwụsịrị, aṅụrị juru ha obi. 11 Mgbe ha banyere n’ụlọ nwatakịrị ahụ na Meri nne ya nọ, ha hụrụ ha, ma daa n’ala kpọọrọ nwa ahụ isiala. Ha meghekwara igbe akụ̀ ha wee nye ya ọlaedo na frankinsens na mea. 12 Ma, ebe ọ bụ na Chineke dọrọ ha aka ná ntị ná nrọ+ ka ha ghara ịlaghachi na nke Herọd, ha si ụzọ ọzọ laa n’ala ha.
13 Mgbe ha lawara, mmụọ ozi Jehova* bịakwutere Josef ná nrọ,+ sị ya: “Bilie, kpọrọ nwatakịrị a na nne ya gbaga Ijipt, nọrọkwa ebe ahụ ruo mgbe m ga-agwa gị ka ị laghachi, n’ihi na Herọd ga-achọ nwatakịrị a ka o gbuo ya.” 14 Josef wee bilie n’abalị kpọrọ nwatakịrị ahụ na nne ya gawa Ijipt. 15 Ọ nọ ebe ahụ ruo mgbe Herọd nwụrụ. Ihe a mezuru ihe Jehova* si n’ọnụ onye amụma ya kwuo. Ọ sịrị: “N’Ijipt ka m si kpọpụta nwa m.”+
16 Mgbe Herọd hụrụ na ndị ahụ ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu aghọgbuola ya, o were ezigbo iwe. O wee dunye ndị gara Betlehem na ógbè niile gbara ya gburugburu gbuo ụmụaka ndị nwoke niile, malite ná ndị gbara afọ abụọ gbadaa, nke dabara n’oge ahụ ọ jụtara ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ 17 E si otú a mezuo amụma Jeremaya onye amụma buru. Ọ sịrị: 18 “A nụrụ olu onye na-ebe ákwá na onye na-eti mkpu arịrị na Rema. Ọ bụ Rechel+ na-ebe ákwá maka ụmụ ya, o kweghịkwa ka a kasie ya obi, n’ihi na ha anọghịzi.”+
19 Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Jehova* bịakwutere Josef ná nrọ+ n’Ijipt 20 wee sị ya: “Bilie, kpọrọ nwatakịrị a na nne ya lawa Izrel, n’ihi na ndị na-achọ ndụ* nwatakịrị a anwụọla.” 21 O wee bilie kpọrọ nwatakịrị ahụ na nne ya lọta n’Izrel. 22 Ma mgbe ọ nụrụ na Akeleyọs nọchiri Herọd nna ya wee na-achị Judia, ọ tụrụ egwu ịgawa ebe ahụ. Ebe ọ bụkwa na Chineke dọrọ ya aka ná ntị ná nrọ,+ ọ banyere na Galili.+ 23 O wee biri n’obodo a na-akpọ Nazaret,+ ka ihe ndị amụma kwuru wee mezuo. Ha sịrị: “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”*+
3 E mechaa, Jọn+ Onye Na-eme Baptizim bịara na-ekwusa ozi ọma+ n’ala ịkpa Judia. 2 Ọ nọ na-asị: “Chegharịanụ, n’ihi na Alaeze eluigwe adịla nso.”+ 3 N’eziokwu, onye a bụ onye ahụ e si n’ọnụ Aịzaya onye amụma+ kwuo banyere ya, sị: “E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị: ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova!* Meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.’”+ 4 Jọn na-eyi uwe e ji ajị kamel mee, na-ekekwa ájị̀ e ji akpụkpọ anụ mee n’úkwù.+ Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ.+ 5 N’oge ahụ, ndị nọ na Jeruselem na Judia niile na obodo niile dị gburugburu Osimiri Jọdan na-agakwuru ya.+ 6 O wee na-eme ha baptizim* n’Osimiri Jọdan,+ ha ana-ekwupụta mmehie ha n’ihu ọha.
7 Mgbe ọ hụrụ ọtụtụ n’ime ndị Farisii na ndị Sadusii+ ka ha na-abịa n’ebe ọ nọ na-eme baptizim, ọ sịrị ha: “Unu ụmụ ajụala,+ ònye gwara unu ka unu gbanahụ iwe Chineke na-abịanụ?+ 8 Burunụ ụzọ mịa mkpụrụ na-egosi na unu echegharịala. 9 Unu agwakwala onwe unu, sị, ‘Ebreham bụ nna anyị.’+ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike isi na nkume ndị a mee ka Ebreham nweta ụmụ. 10 E dowelarị anyụike na mgbọrọgwụ osisi. N’ihi ya, a ga-egbutu osisi ọ bụla na-anaghị amị ezigbo mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.+ 11 Mụnwa ji mmiri na-eme unu baptizim n’ihi na unu echegharịala.+ Ma onye ka m ike na-abịa n’azụ m, onye m na-erughị eru iyipụ akpụkpọ ụkwụ ya.+ Onye ahụ ga-eji mmụọ nsọ+ na ọkụ mee unu baptizim.+ 12 O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka, ọ ga-edowekwa ebe ọ na-azọcha ọka ezigbo ọcha. Ọ ga-ekpokọtakwa ọka wit ya n’ime ụlọ a na-akwasa ihe, ma ọ ga-eji ọkụ a na-enweghị ike imenyụ emenyụ gbaa mkpo ya ọkụ.”+
13 Jizọs wee si Galili bịakwute Jọn n’Osimiri Jọdan, ka o mee ya baptizim.+ 14 Ma Jọn nwara ka o gbochie ya. Ọ sịrị Jizọs: “Ọ bụ gịnwa kwesịrị ime m baptizim. Gịnịzi mere i ji bịakwute m?” 15 Jizọs sịrị ya: “Ka ọ dị otú a n’oge a, n’ihi na o kwesịrị ekwesị ka anyị si otú a mee ihe niile bụ́ ezi omume.” Ọ kwụsịziri igbochi ya. 16 Mgbe e mechara Jizọs baptizim, o si na mmiri ahụ bilie ozugbo. Ma, eluigwe meghere,+ o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata n’ụdị nduru wee bekwasị ya.+ 17 Otu olu sikwa n’eluigwe+ kwuo, sị: “Onye a bụ Ọkpara m,+ onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.”+
4 Mmụọ nsọ wee duru Jizọs banye n’ala ịkpa ka Ekwensu+ nwaa ya ọnwụnwa.+ 2 Mgbe o buchara ọnụ ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị, agụụ gụwara ya. 3 Onye Ọnwụnwa+ ahụ bịakwara sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” 4 Ma ọ sịrị: “E dere, sị: ‘Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova* pụta.’”+
5 Ekwensu wee kpọrọ ya banye n’obodo nsọ+ ma mee ka o guzoro n’elu ihe a rụbichiri n’elu ụlọ nsọ+ 6 wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si ebe a wụda, n’ihi na e dere, sị: ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-eji aka ha ghọrọ gị, ka ị ghara ịkpọ ụkwụ na nkume.’”+ 7 Jizọs wee sị ya: “E dekwara, sị: ‘Anwala Jehova* bụ́ Chineke gị ọnwụnwa.’”+
8 Ekwensu kpọkwaara ya gaa n’ugwu dị oké elu ma gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.+ 9 O wee sị ya: “Ihe a niile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.”* 10 Jizọs wee sị ya: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị: ‘Ọ bụ Jehova* bụ́ Chineke gị ka i kwesịrị ife ofufe,+ ọ bụkwa naanị ya ka i kwesịrị ijere ozi dị nsọ.’”+ 11 Ekwensu wee hapụ ya.+ Ma, ndị mmụọ ozi bịara malite ijere ya ozi.+
12 Ma mgbe Jizọs nụrụ na e jidela Jọn,+ ọ hapụrụ ebe ahụ gawa Galili.+ 13 Mgbe ọ hapụkwara Nazaret, ọ gara biri na Kapaniọm+ n’akụkụ oké osimiri dị n’ógbè Zebulọn na Naftalaị, 14 ka amụma Aịzaya onye amụma buru wee mezuo. Ọ sịrị: 15 “Zebulọn na Naftalaị, ndị dị na Galili ndị mba ọzọ bi, n’ụzọ e si aga n’oké osimiri, n’ofe Osimiri Jọdan: 16 Ndị nọ n’ọchịchịrị hụrụ ezigbo ìhè, ìhè+ nwukwaara ndị nọ n’ebe ọnwụ dị ka ọchịchịrị nke kpuchiri ndị mmadụ.”+ 17 Malite n’oge ahụ, Jizọs bidoro ikwusa, sị: “Chegharịanụ, n’ihi na Alaeze eluigwe adịla nso.”+
18 Ka ọ na-aga n’akụkụ Oké Osimiri Galili,* ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saịmọn onye a na-akpọ Pita,+ na Andru nwanne ya, ka ha na-awụnye ụgbụ n’oké osimiri, n’ihi na ha bụ ndị na-akụ azụ̀.+ 19 O wee sị ha: “Soronụ m. M ga-eme ka unu bụrụ ndị na-akụta mmadụ.”+ 20 Ha hapụrụ ụgbụ ha ozugbo soro ya.+ 21 Mgbe o si ebe ahụ gakwuo n’ihu, ọ hụrụ mmadụ abụọ ọzọ bụ́ ụmụnne, Jems nwa Zebedi na Jọn nwanne ya.+ Ha na Zebedi nna ha nọ n’ụgbọ mmiri na-edozi ụgbụ ha, o wee kpọọ ha.+ 22 Ha hapụrụ ụgbọ mmiri ahụ na nna ha wee soro ya ozugbo.
23 O wee gazuo Galili niile,+ na-akụzi ihe n’ụlọ nzukọ ha,+ na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke, na-agwọkwa ndị mmadụ ụdị ọrịa ọ bụla ha na-arịa.+ 24 Akụkọ banyere ya gazuru Siria niile. Ha wee kpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa na ndị niile ihe dị iche iche na-emekpa ahụ́,+ ndị mmụọ ọjọọ ji,+ ndị akwụkwụ+ na ndị ahụ́ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, o wee gwọọ ha. 25 N’ihi ya, oké ìgwè mmadụ si na Galili na Dikapọlis* na Jeruselem na Judia na ofe Osimiri Jọdan soro ya.
5 Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ọ rịgooro n’elu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. 2 O wee meghee ọnụ ya malite izi ha ihe, sị:
3 “Ndị ma na ọ bụ Chineke kwesịrị ịna-eduzi ha* na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na Alaeze eluigwe bụ nke ha.
4 “Ndị na-eru uju na-enwe obi ụtọ, n’ihi na a ga-akasi ha obi.+
5 “Ndị dị nwayọọ n’obi na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na ha ga-eketa ụwa.+
6 “Ndị agụụ ezi omume na-agụ na ndị akpịrị ya na-akpọ nkụ+ na-enwe obi ụtọ, n’ihi na a ga-eme ka afọ ju ha.+
7 “Ndị na-eme ebere na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na a ga-emere ha ebere.
8 “Ndị obi ha dị ọcha na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na ha ga-ahụ Chineke.
9 “Ndị na-eme udo na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.
10 “Ndị a kpagburu n’ihi ezi omume na-enwe obi ụtọ,+ n’ihi na Alaeze eluigwe bụ nke ha.
11 “Unu na-enwe obi ụtọ mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu+ ma na-akpagbu unu,+ na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile na-abụghị eziokwu banyere unu n’ihi m.+ 12 Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ ezigbo obi ụtọ,+ n’ihi na ụgwọ ọrụ unu+ dị ukwuu n’eluigwe, n’ihi na otú a ka ha si kpagbuo ndị amụma bu unu ụzọ.+
13 “Unu bụ nnu+ nke ụwa. Ma ọ bụrụ na nnu anaghịzi atọ ka nnu, olee otú a ga-esi mee ka ọ tọwakwa ka nnu? E nweghịkwa ike iji ya mee ihe ọ bụla ma ọ́ bụghị ịwụfu ya n’èzí+ ka ndị mmadụ zọọ ya ụkwụ.
14 “Unu bụ ìhè nke ụwa.+ E nweghị ike izo obodo ezo ma ọ bụrụ na ọ dị n’elu ugwu. 15 Ndị mmadụ na-amụnye ọkụ* ma dọsa ya n’elu ihe e ji adọsa ọkụ, ọ bụghị n’okpuru nkata. Ọ na-enwukwara ndị niile nọ n’ime ụlọ.+ 16 Ununwa kwa, meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ,+ ka ha hụ ọrụ ọma unu+ wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.+
17 “Unu echekwala na m bịara ịkagbu Iwu Mosis ma ọ bụ ihe dị n’Akwụkwọ Ndị Amụma. M bịara imezu ha,+ ọ bụghị ịkagbu ha. 18 N’eziokwu, ana m asị unu na ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịla n’iyi karịa ihichapụ otu mkpụrụ akwụkwọ kacha nta ma ọ bụ otu kpọm dị ná mkpụrụ akwụkwọ nke dị n’Iwu, ihe niile e dere n’ime ya agharakwa imezu.+ 19 N’ihi ya, onye ọ bụla nke na-emebi otu n’ime ihe ndị a kacha nta e nyere n’iwu ma na-akụziri ndị ọzọ ka ha na-eme otú ahụ, a ga-akpọ ya onye kacha nta n’ihe banyere Alaeze* eluigwe. Ma onye ọ bụla nke na-eme ha ma na-akụzi ha, a ga-akpọ ya onye ukwu n’ihe banyere Alaeze* eluigwe. 20 Ọ bụ ya mere m ji asị unu na ọ bụrụ na ezi omume unu akarịghị nke ndị odeakwụkwọ na nke ndị Farisii,+ o nweghị ihe ga-eme ka unu baa n’Alaeze eluigwe.+
21 “Unu nụrụ na a gwara ndị oge ochie, sị: ‘Egbula mmadụ,*+ ma onye ọ bụla nke gburu mmadụ ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe.’+ 22 Ma, ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ewesa nwanne ya iwe+ ga-aza ajụjụ n’ụlọikpe. Onye ọ bụla nke na-agwakwa nwanne ya okwu mkparị jọgburu onwe ya ga-aza ajụjụ n’Ụlọikpe Kacha Elu. Onye ọ bụla nke na-asịkwa, ‘Gị onye nzuzu na-abaghị uru!’ a ga-atụba ya na Gehena,* bụ́ ebe ọkụ na-ere.+
23 “N’ihi ya, ọ bụrụ na i ji onyinye gị gaa n’ebe ịchụàjà,+ i wee nọrọ ebe ahụ cheta na nwanne gị na-ewere gị iwe, 24 hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà. Buru ụzọ gaa ka gị na nwanne gị kpezie, gaghachizie, nye onyinye gị.+
25 “Mee ka gị na onye gbara gị akwụkwọ dozie okwu ọsọ ọsọ, mgbe gị na ya ka so na-aga n’ụlọikpe, ka onye ahụ gbara gị akwụkwọ ghara inyefe gị n’aka ọkàikpe, ọkàikpe enyefee gị n’aka onye nche ụlọikpe, e wee tụba gị n’ụlọ mkpọrọ.+ 26 N’eziokwu, ana m asị gị, ị gaghị esi ebe ahụ pụta ruo mgbe ị kwụrụ obere mkpụrụ ego ikpeazụ* i nwere.
27 “Unu nụrụ na a sịrị: ‘Akwala iko.’+ 28 Ma, ana m asị unu na onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya,+ o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasola ya iko n’obi ya.+ 29 Ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i mehie,* ghụpụ ya tụfuo.+ N’ihi na ọ kaara gị mma ka otu anya gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị niile na Gehena.*+ 30 Ọ bụrụkwa na aka nri gị na-eme ka i mehie,* gbupụ ya tụfuo.+ N’ihi na ọ kaara gị mma ka otu aka gị laa n’iyi karịa na a tụbara ahụ́ gị niile na Gehena.*+
31 “A sịkwara: ‘Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ya nye ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm.’+ 32 Ma, ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko,* na-edowe ya n’ọnọdụ nwere ike ime ka ọ kwaa iko. Onye ọ bụla nke lụkwara nwaanyị a gbara alụkwaghịm* na-akwa iko.+
33 “Unu nụkwara na a gwara ndị oge ochie, sị: ‘Ahapụla ime ihe ị ṅụrụ n’iyi,+ kama mezuo nkwa i kwere Jehova.’*+ 34 Ma, ana m asị unu: Aṅụla iyi ọ bụla.+ Ejikwala eluigwe aṅụ iyi, maka na ọ bụ ocheeze Chineke. 35 Ejikwala ụwa aṅụ iyi, maka na ọ bụ ihe o ji agbakwasị ụkwụ ya.+ Ejikwala Jeruselem aṅụ iyi, maka na ọ bụ obodo Eze ukwu.+ 36 Ejila isi gị aṅụ iyi, ebe ọ bụ na i nweghị ike ime ka otu ntutu chaa ọcha ma ọ bụ jie oji. 37 Naanị ka ‘Ee’ unu kwuru bụrụ ee, ka ‘Ee e’ unu kwuru bụrụ ee e,+ n’ihi na ihe gafere ihe ndị a si n’aka ajọ onye ahụ.+
38 “Unu nụrụ na a sịrị: ‘Onye kụkpọrọ mmadụ anya, a ga-akụkpọ ya anya. Onye kụpụrụ mmadụ ezé, a ga-akụpụ ya ezé.’+ 39 Ma, ana m asị unu: Emegwarala ajọ mmadụ ihe o mere gị, kama onye ọ bụla nke mara gị ụra na ntì aka nri, tụgharịkwaara ya nke ọzọ.+ 40 Ọ bụrụkwa na mmadụ achọọ ịkpụga gị ụlọikpe ka o wee nara gị uwe ime gị, hapụkwuoro ya uwe elu gị.+ 41 Ọ bụrụkwa na onye nwere ikike amanye gị ịga otu maịl,* soro ya gaa maịl abụọ. 42 Mmadụ rịọ gị ihe, nye ya. Agbakụtakwala onye chọrọ ibiri gị ego* azụ.+
43 “Unu nụrụ na a sịrị: ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya+ ma kpọọ onye iro gị asị.’ 44 Ma, ana m asị unu: Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya,+ na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu,+ 45 ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nọ n’eluigwe,+ n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya waara ndị ọjọọ na ndị ọma. Ọ na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.+ 46 N’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, gịnị ga-abụ ụgwọ ọrụ unu?+ Ọ̀ bụ na ndị ọnaụtụ anaghị eme otu ihe ahụ? 47 Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị ụmụnne unu ka unu na-ekele, olee oké ihe unu na-eme? Ọ̀ bụ na ndị mba ọzọ anaghị emekwa otu ihe ahụ? 48 N’ihi ya, unu kwesịrị izu okè otú Nna unu nke eluigwe zuru okè.+
6 “Lezienụ anya ka unu ghara ịna-eme ezi omume unu n’ihu ndị mmadụ ka ha wee hụ unu,+ ma ọ́ bụghị ya, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ n’aka Nna unu nke nọ n’eluigwe. 2 N’ihi ya, mgbe ị na-enye onyinye ebere,* afụla opi na-aga, dị ka ndị ihu abụọ na-eme n’ụlọ nzukọ na n’okporo ámá, ka ndị mmadụ wee too ha. N’eziokwu, ana m asị unu, ha enwetazuola ụgwọ ọrụ ha. 3 Ma, i nyewe onyinye ebere, ekwela ka aka ekpe gị mara ihe aka nri gị na-eme, 4 ka onyinye ebere gị wee bụrụ na nzuzo. Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụkwa gị ụgwọ.+
5 “Mgbe unu na-ekpekwa ekpere, unu adịla ka ndị ihu abụọ,+ n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo n’ụlọ nzukọ, na ebe ụzọ gbara mkpị na-ekpe ekpere ka ndị mmadụ wee na-ahụ ha.+ N’eziokwu, ana m asị unu, ha enwetazuola ụgwọ ọrụ ha. 6 Ma, ị chọọ ikpe ekpere, banye n’ọnụ ụlọ gị. Mgbe i mechiri ụzọ gị, kpeere Nna gị nke nọ na nzuzo ekpere.+ Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụ gị ụgwọ. 7 Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. 8 N’ihi ya, unu emela ka ha, n’ihi na Nna unu ma ihe na-akpa unu+ tupu unu arịọ ya.
“‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị+ nsọ.+ 10 Ka Alaeze gị+ bịa. Ka uche gị+ meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.*+ 11 Nye anyị nri taa maka ụbọchị taa.+ 12 Gbaghara anyị ụgwọ anyị ji, dị ka anyị gbaghakwaara ndị ji anyị ụgwọ.+ 13 Ekwela ka a nwata anyị,*+ kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.’+
14 “N’ihi na ọ bụrụ na unu na-agbaghara ndị mehiere unu, Nna unu nke eluigwe ga na-agbagharakwa unu.+ 15 Ma ọ bụrụ na unu anaghị agbaghara ndị mehiere unu, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu mmehie unu.+
16 “Mgbe unu na-ebu ọnụ,+ kwụsịnụ ịgbarụ ihu dị ka ndị ihu abụọ, n’ihi na ha na-emebi ihu ha* ka ndị mmadụ wee hụ na ha na-ebu ọnụ.+ N’eziokwu, ana m asị unu, ha enwetazuola ụgwọ ọrụ ha. 17 Ma, mgbe ị na-ebu ọnụ, tee mmanụ n’isi gị, saakwa ihu gị, 18 ka i wee bụrụ onye na-ebu ọnụ n’anya Nna gị nke nọ na nzuzo, ọ bụghị n’anya mmadụ. Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-akwụkwa gị ụgwọ.
19 “Kwụsịnụ ịkpakọtara onwe unu akụ̀ n’ụwa,+ ebe ọ ga-ata nchara, egu* erichapụkwa ya, ebe ndị ohi na-abanye zuo ohi. 20 Kama, na-akpakọtaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe,+ ebe ọ na-agaghị ata nchara, egu agaghịkwa eri ya,+ ebe ndị ohi na-anaghịkwa abanye zuo ohi. 21 N’ihi na n’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.
22 “Anya dị ka ihe na-enye ahụ́ ìhè.+ N’ihi ya, ọ bụrụ na anya gị na-elegide otu ebe,* ahụ́ gị niile ga-abụ ìhè ìhè.* 23 Ma ọ bụrụ na ihe anya gị na-ahụ na-eme ka ị bụrụ onye anyaụfụ,*+ ahụ́ gị niile ga-agba ọchịchịrị. Ọ bụrụ n’eziokwu na ìhè dị n’ime gị bụ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ agaghị enwe atụ.
24 “O nweghị onye ga-abụli ohu nna ukwu abụọ. N’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya,+ ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu agaghị abụli ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.+
25 “N’ihi ya, ana m asị unu: Kwụsịnụ ichegbu onwe unu+ banyere ndụ* unu maka ihe unu ga-eri ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụ maka ihe unu ga-eyi n’ahụ́.+ Ọ̀ bụ na ndụ* adịghị mkpa karịa ihe oriri? Ahụ́ ọ́ dịghịkwa mkpa karịa uwe?+ 26 Leruonụ nnụnụ anya.+ Ha anaghị akụ mkpụrụ. Ha anaghị aghọrọ mkpụrụ, ha anaghịkwa ekpokọta mkpụrụ n’ụlọ a na-akwasa ihe. Ma, Nna unu nke eluigwe na-enye ha nri. Ọ̀ bụ na unu abaghị uru karịa ha? 27 Ònye n’ime unu ga-agbakwụnyeli otu kubit* n’afọ ndụ ya maka na ọ na-echegbu onwe ya?+ 28 Gịnị mere unu ji na-echegbu onwe unu banyere uwe? Mụtanụ ihe n’otú okooko lili dị n’ọhịa si eto. Ha anaghị arụgbu onwe ha n’ọrụ, ha anaghịkwa akpa ogho. 29 Ma ana m asị unu na Solomọn+ eyighị uwe mara mma ka otu n’ime ha n’agbanyeghị ebube ya niile. 30 Ọ bụrụ na Chineke si otú a yiwe ahịhịa ndụ dị n’ọhịa uwe, nke dị ebe a taa, ma echi, a tụba ya n’ọkụ, ọ̀ bụ na ọ gaghị eyiwe unu uwe karịa, unu ndị okwukwe nta? 31 N’ihi ya, unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla,+ sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyi?’+ 32 N’ihi na ihe ndị a niile bụ ihe ndị mba ọzọ na-achụsi ike. Nna unu nke eluigwe ma na ihe ndị a niile dị unu mkpa.
33 “N’ihi ya, burunụ ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.+ 34 N’ihi ya, unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi,+ n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuorola ya.
7 “Kwụsịnụ ikpe ikpe,+ ka a ghara ikpe unu ikpe. 2 N’ihi na otú unu si ekpe ikpe ka a ga-esi kpee unu ikpe,+ ihe unu jikwa atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.+ 3 Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa dị n’anya nwanna gị, ma ị hụghị ogologo osisi dị n’anya gị?+ 4 Ma ọ bụ, gịnị mere ị ga-eji asị nwanna gị, ‘Chere ka m wepụ irighiri ahịhịa n’anya gị,’ ebe ogologo osisi dị n’anya nke gị? 5 Onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ ogologo osisi dị n’anya gị, ka i nwee ike ịhụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa n’anya nwanna gị.
6 “Unu enyela nkịta ihe dị nsọ, unu atụpụkwarala ézì nkume pel unu,+ ka ha wee ghara ịzọ ha ụkwụ ma tụgharịa dọrie unu.
7 “Na-arịọnụ, a ga-enye unu.+ Na-achọnụ, unu ga-achọta. Na-akụnụ aka n’ụzọ, a ga-emeghere unu ya.+ 8 N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta,+ onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, onye ọ bụla nke na-akụkwa aka n’ụzọ ka a ga-emeghere ụzọ. 9 N’eziokwu, ònye n’ime unu ka nwa ya ga-arịọ achịcha, ya enye ya nkume? 10 Ma ọ bụ, ya rịọ ya azụ̀, ọ̀ ga-enye ya agwọ? 11 N’ihi ya, ọ bụrụ na unu ma otú e si enye ụmụ unu ezigbo onyinye, ọ bụ eziokwu na unu bụ ndị ajọ omume, ọ̀ bụ na Nna unu nke nọ n’eluigwe agaghị enye ndị na-arịọ ya ihe ọma+ ha na-arịọ ya?+
12 “N’ihi ya, unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.+ N’eziokwu, ọ bụ ya ka Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma* na-akụzi.+
13 “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye,+ n’ihi na ọnụ ụzọ ámá sara mbara na okporo ụzọ dị obosara na-eduba ná mbibi, ndị na-esikwa n’ọnụ ụzọ ámá ahụ abanye dị ọtụtụ. 14 Ma, ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.+
15 “Lezienụ anya maka ndị amụma ụgha,+ ndị na-abịakwute unu ka à ga-asị na ha bụ atụrụ,+ ma ha bụ anụ ọhịa wolf agụụ ji.+ 16 Unu ga-eji mkpụrụ ha mata ha. Ndị mmadụ anaghị aghọrọ mkpụrụ vaịn n’ogwu ma ọ bụ mkpụrụ fig n’uke.+ 17 O doro anya na osisi ọma ọ bụla na-amị ezigbo mkpụrụ, ma osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ na-abaghị uru.+ 18 Osisi ọma enweghị ike ịmị mkpụrụ na-abaghị uru, osisi rere ure enweghịkwa ike ịmị ezigbo mkpụrụ.+ 19 A na-egbutu osisi ọ bụla na-anaghị amị ezigbo mkpụrụ ma tụba ya n’ọkụ.+ 20 N’eziokwu, unu ga-eji mkpụrụ ha mata ha.+
21 “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’Alaeze eluigwe. Kama ọ bụ naanị onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.+ 22 Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ: ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,+ ọ̀ bụ na anyị ebughị amụma n’aha gị, chụpụ ndị mmụọ ọjọọ n’aha gị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ ebube n’aha gị?’+ 23 Ma, m ga-agwa ha mgbe ahụ, sị: ‘Amaghị m ndị unu bụ. Sinụ n’ebe m nọ pụọ. Unu bụ ndị na-emebi iwu.’+
24 “N’ihi ya, onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a ma na-eme ha ga-adị ka nwoke nwere uche, onye rụrụ ụlọ ya n’elu oké nkume.+ 25 Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ, ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu oké nkume. 26 Onye ọ bụla nke na-anụkwa okwu m ndị a ma ọ naghị eme ha ga-adị ka nwoke nzuzu, onye rụrụ ụlọ ya n’elu ájá.+ 27 Mmiri wee zosie ike, idei mmiri abịakwa, ifufe efekwasịkwa ụlọ ahụ,+ o wee daa, dakasịa.”
28 Mgbe Jizọs kwuchara okwu ndị a, otú o si ezi ihe juru ìgwè mmadụ ahụ anya,+ 29 n’ihi na ọ na-ezi ha ihe dị ka onye nwere ikike,+ ọ bụghị dị ka ndị odeakwụkwọ ha.
8 Mgbe o si n’ugwu ahụ rịdata, oké ìgwè mmadụ sooro ya. 2 Ma, otu onye ekpenta bịara kpọọrọ ya isiala, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-emeli ka m dị ọcha.”+ 3 O wee matịa aka bitụ ya aka, sị: “Achọrọ m. Dị ọcha.”+ Ozugbo ahụ, a gwọrọ ya ekpenta ya.+ 4 Jizọs wee sị ya: “Ya enwekwala onye ị ga-akọrọ ya,+ kama gaa gosi onye nchụàjà onwe gị,+ nyekwa onyinye Mosis kwuru ka a na-enye,+ ka e wee mara na a gwọọla gị.”
5 Mgbe ọ banyere Kapaniọm, otu onyeisi ndị agha bịakwutere ya, na-arịọ ya,+ 6 sị: “Nna anyị ukwu, onye na-ejere m ozi dina n’ụlọ. Ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ na-atakwa ezigbo ahụhụ.” 7 Ọ sịrị ya: “M rute ebe ahụ, m ga-agwọ ya.” 8 Onyeisi ndị agha ahụ asị ya: “Nna anyị ukwu, ekwesịghị m ka ị bata n’ụlọ m, kama kwuo naanị okwu, ahụ́ ga-adị onye na-ejere m ozi mma. 9 N’ihi na n’agbanyeghị na m nọ n’okpuru ndị ọzọ, e nwekwara ndị agha nọ n’okpuru m. M na-asị onye agha nke a, ‘Gawa!’ ya agawa. M na-asịkwa onye nke ọzọ, ‘Bịa!’ ya abịa. M na-asịkwa ohu m, ‘Mee nke a!’ ya emee ya.” 10 Mgbe Jizọs nụrụ ihe a, o juru ya anya, ya asị ndị so ya: “Ana m agwa unu eziokwu, ahụtụbeghị m onye okwukwe ya siri ike otú a n’Izrel.+ 11 Ma ana m asị unu na ọtụtụ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ ga-abịa soro Ebreham na Aịzik na Jekọb nọdụ na-eri ihe na tebụl n’Alaeze eluigwe,+ 12 ma, a ga-achụpụ ụmụ Alaeze n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ha ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé.”+ 13 Jizọs wee sị onyeisi ndị agha ahụ: “Lawa. Ka e meere gị ihe ị rịọrọ n’ihi na i nwere okwukwe.”+ E wee gwọọ onye ahụ na-ejere ya ozi mgbe ahụ.+
14 Mgbe Jizọs batara n’ụlọ Pita, ọ hụrụ nne nwunye Pita+ ka o dina ala n’ihi na ahụ́ ọkụ ji ya.+ 15 O wee bitụ ya aka n’aka,+ ahụ́ ọkụ ahụ akwụsị. Nwaanyị ahụ bilikwara jewere ya ozi. 16 Ma mgbe o ruru ná mgbede, ndị mmadụ kpọtaara ya ọtụtụ ndị ndị mmụọ ọjọọ ji. O wee gwa ndị mmụọ ọjọọ ahụ okwu, ha ahapụ ndị ahụ ha ji. Ọ gwọkwara ndị niile ahụ́ na-adịghị mma, 17 ka ihe Chineke si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo wee mezuo. Ọ sịrị: “O buuru ọrịa anyị niile, burukwa nrịanrịa anyị.”+
18 Mgbe Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ gburugburu ya, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na ya banye n’ụgbọ mmiri gaa n’ofe nke ọzọ.+ 19 Otu onye odeakwụkwọ bịara sị ya: “Onye Ozizi, m ga-eso gị jee ebe ọ bụla ị na-eje.”+ 20 Ma Jizọs sịrị ya: “Nkịta ọhịa nwere ọgba, nnụnụ nwekwara akwụ́, ma Nwa nke mmadụ enweghị ebe ọ na-atọgbọ isi ya.”+ 21 Onye ọzọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya wee sị ya: “Onyenwe anyị, hapụ m ka m buru ụzọ gaa lie nna m.”+ 22 Ma, Jizọs sịrị ya: “Na-eso m. Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị ha nwụrụ anwụ.”+
23 Mgbe ọ banyere n’ụgbọ mmiri, ndị na-eso ụzọ ya sooro ya.+ 24 Ma, oké ifufe malitere ife n’oké osimiri ahụ, nke mere ka ebili mmiri na-ekpuchi ụgbọ ahụ, ma, ọ na-ehi ụra.+ 25 Ha wee bịa kpọtee ya, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta anyị, mmiri na-achọ iri anyị!” 26 Ma ọ sịrị ha: “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu,* unu ndị okwukwe nta?”+ O wee bilie baara ifufe ahụ na oké osimiri ahụ mba, ebe niile wee daa jụụ.+ 27 O wee ju ha anya, ha asị: “Olee ụdị mmadụ onye a bụ? Ifufe na oké osimiri na-erubedịrị ya isi.”
28 Mgbe o ruru n’ofe nke ọzọ, n’obodo ndị Gadara, ya na mmadụ abụọ mmụọ ọjọọ ji, ndị si n’ebe a na-eli ozu na-apụta,+ zuru n’ụzọ. Ha na-akpa ajọ ike, nke na ọ dịghị onye egwu na-ekwe ịgafe n’ụzọ ahụ. 29 Ma, ha tiri mkpu, sị: “Ọkpara Chineke,+ gịnị jikọrọ anyị na gị? Ị̀ bịara ebe a imekpa anyị ahụ́+ tupu oge a kara aka eruo?”+ 30 Ma ìgwè ézì nọ na-ata ahịhịa n’ebe dị anya n’ebe ha nọ.+ 31 Ndị mmụọ ọjọọ ahụ wee malite ịrịọ ya, sị: “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, hapụ anyị ka anyị banye n’ime ìgwè ézì ndị ahụ.”+ 32 O wee sị ha: “Banyenụ!” Ha wee pụta banye n’ime ézì ndị ahụ. Ìgwè ézì ahụ niile nuuru daba n’oké osimiri ma nwụọ n’ime mmiri. 33 Ma ndị na-azụ ézì ndị ahụ gbara ọsọ. Mgbe ha banyere n’obodo, ha kọrọ ihe niile mere, kọọkwa gbasara ndị ahụ mmụọ ọjọọ ji. 34 Obodo ahụ niile wee pụta ka ha hụ Jizọs. Mgbe ha hụrụ ya, ha rịọrọ ya ka o si n’ógbè ha pụọ.+
9 O wee banye n’ụgbọ mmiri gafee n’ofe nke ọzọ ma banye n’obodo ya.+ 2 Ma, ndị mmadụ buteere ya otu onye ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, nke dina n’àkwà.* Mgbe Jizọs hụrụ na ha nwere okwukwe, ọ sịrị onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ: “Obi sie gị ike, nwa m. A gbagharala gị mmehie gị.”+ 3 Ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ wee na-eche n’obi ha, sị: “Onye a na-ekwulu Chineke.” 4 Ma ebe Jizọs ma ihe ha na-eche, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-eche ihe ọjọọ n’obi unu?+ 5 Olee nke ka mfe, ọ̀ bụ ịsị, ‘A gbagharala gị mmehie gị,’ ka ọ̀ bụ ịsị, ‘Bilie gawa ije’?+ 6 Ma, ka unu wee mara na Nwa nke mmadụ nwere ikike n’ụwa ịgbaghara mmehie—” ọ gwara onye ahụ ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie, buru àkwà gị lawa n’ụlọ gị.”+ 7 O wee bilie laa n’ụlọ ya. 8 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ ihe a, egwu jidere ha, ha wee too Chineke, onye nyere ụmụ mmadụ ụdị ikike ahụ.
9 Mgbe Jizọs si ebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Matiu ka ọ nọ ọdụ n’ebe a na-anakọta ụtụ. O wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.” O wee bilie, soro ya.+ 10 E mechaa, mgbe Jizọs nọ na-eri ihe n’ime ụlọ, ọtụtụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie bịara soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri ihe.+ 11 Ma mgbe ndị Farisii hụrụ ihe a, ha sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie eri ihe?”+ 12 Mgbe ọ nụrụ ihe ha kwuru, ọ sịrị: “Ndị ahụ́ dị anaghị achọ onye ga-agwọ ha, kama ọ bụ ndị ahụ́ na-adịghị na-achọ ya.+ 13 N’ihi ya, gaanụ mata ihe ihe a pụtara: ‘Achọrọ m ebere, ọ bụghị àjà.’+ N’ihi na ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie.”
14 Ndị na-eso ụzọ Jọn wee bịakwute ya, jụọ ya, sị: “Gịnị mere anyị na ndị Farisii ji ebu ọnụ, ma ndị na-eso ụzọ gị anaghị ebu ọnụ?”+ 15 Jizọs wee sị ha: “Ndị enyi nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ enweghị ihe mere ha ga-eji ruo uju mgbe ha na nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ+ nọ. Ma oge na-abịa mgbe a ga-akpọpụ nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ n’ebe ha nọ.+ Ha ga-ebuzi ọnụ mgbe ahụ. 16 E nweghị onye na-eji ibé ákwà ọhụrụ adụchi uwe ochie dọkara adọka, n’ihi na ibé ákwà ọhụrụ ahụ na-eme ka nke ochie ahụ dọkaa. Ọ na-adọka karịa otú ọ dọkaburu.+ 17 Ndị mmadụ anaghịkwa agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ochie. Ọ bụrụ na ha emee otú ahụ, karama akpụkpọ ahụ ga-agbawa, mmanya ahụ ga-awụfukwa, karama akpụkpọ ahụ emebiekwa. Kama, ndị mmadụ na-agbanye mmanya ọhụrụ n’ime karama akpụkpọ ọhụrụ, o nweghịkwa ihe ga-eme ha abụọ.”
18 Mgbe ọ na-agwa ha ihe ndị a, otu onye na-achị achị bịakwutere ya, kpọọrọ ya isiala, sị: “Ọ ga-abụ na nwa m nwaanyị anwụọla ugbu a, ma bịa bikwasị ya aka, ọ ga-adịkwa ndụ.”+
19 Jizọs wee bilie soro ya, ndị na-eso ụzọ ya esorokwa ya. 20 Ma, otu nwaanyị na-arịa ọrịa oruru ọbara kemgbe afọ iri na abụọ+ bịara ya n’azụ wee bitụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka,+ 21 n’ihi na ọ nọ na-agwa onwe ya, sị: “Ọ bụrụ na m bitụ naanị uwe elu ya aka, m ga-agbake.” 22 Jizọs tụgharịrị, hụ ya wee sị: “Obi sie gị ike, nwa m nwaanyị. Okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma.”+ Malite n’oge ahụ, nwaanyị ahụ gbakere.+
23 Mgbe Jizọs batara n’ụlọ onye ahụ na-achị achị ma hụ ndị na-egbu ọjà nakwa ìgwè mmadụ na-atụ ụzụ,+ 24 ọ sịrị: “Sinụ ebe a pụọ, n’ihi na nwata nwaanyị a anwụghị anwụ, kama ọ na-ehi ụra.”+ Ha wee malite ịchị ya ọchị, na-akwa ya emo. 25 Ozugbo a chụpụrụ ìgwè mmadụ ahụ n’èzí, ọ banyere sere nwata nwaanyị ahụ n’aka,+ o wee bilie.+ 26 N’eziokwu, ihe a Jizọs mere gbasara n’ógbè ahụ niile.
27 Mgbe Jizọs si ebe ahụ na-apụ, ndị ìsì abụọ+ sooro ya, na-eti mkpu, sị: “Nwa Devid, meere anyị ebere.” 28 Mgbe Jizọs banyere n’ime ụlọ, ndị ìsì ahụ bịakwutere ya, o wee jụọ ha, sị: “Ùnu nwere okwukwe na m ga-emeli ihe a?”+ Ha asị ya: “Ee, Onyenwe anyị.” 29 O wee bitụ ha aka n’anya,+ sị: “Ka e meere unu ihe unu rịọrọ n’ihi na unu nwere okwukwe.” 30 Anya ha wee meghee. Jizọs gwasikwara ha ike, sị: “Ya enwekwala onye unu ga-akọrọ ya.”+ 31 Ma mgbe ha pụrụ n’èzí, ha kọsara ya n’ógbè ahụ niile.
32 Mgbe ha na-apụ, ndị mmadụ kpọtaara ya otu onye ogbi mmụọ ọjọọ ji.+ 33 Mgbe ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ malitere ikwu okwu.+ O wee ju ìgwè mmadụ ahụ anya, ha asị: “A hụtụbeghị ụdị ihe a n’Izrel.”+ 34 Ma ndị Farisii nọ na-asị: “Ọ bụ onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ nyere ya ike o ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+
35 Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla.+ 36 Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o meteere ha ebere,+ n’ihi na a gbara ha akpụkpọ,* na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ 37 Mgbe ahụ, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “N’eziokwu, ihe a ga-ewe n’ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.+ 38 N’ihi ya, na-arịọnụ onye nwe ubi ahụ ka o zite ndị ọrụ n’ubi ya.”+
10 N’ihi ya, ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya ma nye ha ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ*+ na ịgwọ ụdị ọrịa ọ bụla.
2 Aha ndịozi iri na abụọ ahụ bụ:+ Saịmọn, onye a na-akpọ Pita,+ na Andru+ nwanne ya, Jems nwa Zebedi na Jọn+ nwanne ya, 3 Filip na Batolomiu,+ Tọmọs+ na Matiu+ onye ọnaụtụ, Jems nwa Alfiọs, na Tadiọs, 4 Saịmọn, onye na-anụ ọkụ n’obi, na Judas Iskarịọt, onye mechara rara ya nye.+
5 Jizọs zipụrụ mmadụ iri na abụọ a ma sị ha:+ “Unu abanyela n’okporo ụzọ ndị mba ọzọ, unu abanyekwala n’obodo ndị Sameria.+ 6 Kama, na-agakwurunụ atụrụ furu efu bụ́ mba Izrel.+ 7 Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe adịla nso.’+ 8 Gwọọnụ ndị ọrịa,+ kpọlitenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ndị ekpenta dị ọcha, chụpụnụ ndị mmụọ ọjọọ. Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu. 9 Unu ewerela ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ ọla kọpa unu ga-etinye n’obere akpa ego unu na-eke n’úkwù.+ 10 Unu ewerela obere akpa nri maka njem unu, unu achịrịla uwe abụọ,* ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, unu ewerekwala mkpara,+ n’ihi na e kwesịrị inye onye ọrụ nri.+
11 “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu banyere, chọpụtanụ ndị kwesịrị ekwesị, nọrọkwanụ ebe ahụ ruo mgbe unu ga-apụ.+ 12 N’ụlọ ọ bụla unu bara, keleenụ* ndị ezinụlọ ahụ. 13 Ọ bụrụkwa na ha anabata unu, ha ga-enwe udo unu sị ka ha nwee.+ Ma ọ bụrụ na ha anabataghị unu, udo unu ga-alọghachikwute unu. 14 N’ebe ọ bụla a na-enweghị onye nabatara unu ma ọ bụ onye gere unu ntị, unu pụwa n’ụlọ ahụ ma ọ bụ n’obodo ahụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu.+ 15 N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-adịrị Sọdọm na Gọmọra+ mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa obodo ahụ.
16 “M na-eziga unu dị ka atụrụ ka unu gakwuru anụ ọhịa wolf. N’ihi ya, dịrịnụ akọ ka agwọ, bụrụkwanụ ndị na-adịghị aghụghọ otú ahụ nduru na-adịghị.+ 17 Lezienụ anya, n’ihi na ndị mmadụ ga-akpụpụ unu n’ụlọikpe obodo,+ ha ga-apịakwa unu ihe+ n’ụlọ nzukọ ha.+ 18 A ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze+ n’ihi m, ka unu si otú ahụ gbaara ha na ndị mba ọzọ àmà.+ 19 Ma, ha kpụta unu n’ihu ha, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu, n’ihi na a ga-agwa unu ihe unu ga-ekwu n’oge ahụ.+ 20 N’ihi na ọ bụghị ununwa na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.+ 21 Ihe ọzọ bụ na nwanne ga-enyefe nwanne ya ka e gbuo ya, nna ga-enyefekwa nwa ya, ụmụ ga-emegide nne na nna ha, meekwa ka e gbuo ha.+ 22 Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.+ Ma, ọ bụ onye tachiri obi* ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.+ 23 Ha kpagbuwe unu n’otu obodo, gbaganụ n’obodo ọzọ,+ n’ihi na n’eziokwu, ana m asị unu, unu agaghị agazuli obodo ndị dị n’Izrel ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute.
24 “Nwa akwụkwọ anaghị aka onye nkụzi ya, ohu anaghịkwa aka nna ya ukwu.+ 25 Ọ ga-ezuru nwa akwụkwọ ma ọ dịrị ka onye nkụzi ya, ọ ga-ezukwara ohu ma ọ dịrị ka nna ya ukwu.+ Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-akpọ onyeisi ezinụlọ Bielzebọb,*+ ọ̀ bụ na ha agaghị aka akpọ ya ndị ezinụlọ ya? 26 N’ihi ya, unu atụla ha egwu, n’ihi na e nweghị ihe ọ bụla e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe, e nweghịkwa ihe nzuzo a na-agaghị amata.+ 27 Ihe m gwara unu n’ọchịchịrị, kwuonụ ya n’ìhè. Ihe unu nụkwara a takwunyere atakwunye, sinụ n’elu ụlọ kwusaa ya.+ 28 Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́ ma ha agaghị egbuli mkpụrụ obi.*+ Kama na-atụnụ egwu onye ga-ebibili ma mkpụrụ obi ma ahụ́ n’ime Gehena.*+ 29 Ọ̀ bụ na a naghị ere nza abụọ otu mkpụrụ ego* nke ga-azụta ntakịrị ihe? Ma o nweghị otu n’ime ha ga-ada n’ala, Nna unu aghara ịma.+ 30 Ọ madị ole ntutu niile dị n’isi unu dị. 31 N’ihi ya, unu atụla egwu. Unu bara uru karịa ọtụtụ nza.+
32 “Onye ọ bụla nke na-agwa ndị mmadụ na ya ma m,+ m ga-agwakwa Nna m nke nọ n’eluigwe na m ma onye ahụ.+ 33 Ma onye ọ bụla nke na-agọnahụ m n’ihu ndị mmadụ, m ga-agọnahụkwa ya n’ihu Nna m nke nọ n’eluigwe.+ 34 Unu echela na m bịara ime ka udo dịrị n’ụwa. Abịara m iweta mma agha, ọ bụghị udo.+ 35 N’ihi na m bịara ikewa ezinụlọ. Nwoke ga na-emegide nna ya, nwa nwaanyị ana-emegide nne ya, nwunye nwa ana-emegidekwa nne di ya.+ 36 N’eziokwu, ndị ezinụlọ mmadụ ga-abụ ndị iro ya. 37 Onye hụrụ nne ya ma ọ bụ nna ya n’anya karịa m erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m. Onye hụkwara nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’anya karịa m erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m.+ 38 Onye ọ bụla nke na-achọghị iburu osisi ịta ahụhụ* ya sowe m n’azụ erughị eru ịbụ onye na-eso ụzọ m.+ 39 Onye ọ bụla na-achọ ịzọ ndụ* ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla nke tụfuru ndụ ya n’ihi m ga-adị ndụ ọzọ.+
40 “Onye na-anabata unu na-anabatakwa m. Onye na-anabata m na-anabatakwa Onye zitere m.+ 41 Onye na-anabata onye amụma n’ihi na ọ bụ onye amụma ga-enweta ụgwọ ọrụ onye amụma.+ Onye na-anabatakwa onye ezi omume n’ihi na ọ bụ onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ onye ezi omume. 42 Onye ọ bụla nke nyere otu n’ime ndị a dị nta naanị otu iko mmiri jụrụ oyi ka ọ ṅụọ n’ihi na ọ bụ onye na-eso ụzọ m, n’eziokwu, ana m asị unu, a ga-akwụrịrị ya ụgwọ ọrụ ya.”+
11 Mgbe Jizọs gwachara mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya ihe ha kwesịrị ime, o si ebe ahụ gawa izi ihe na ikwusa ozi ọma n’obodo ndị ọzọ.+
2 Ma mgbe Jọn nọ n’ụlọ mkpọrọ nụ+ banyere ọrụ dị iche iche Kraịst na-arụ, o ziri ndị na-eso ụzọ ya+ 3 ka ha gaa sị ya: “Ọ̀ bụ gị bụ Onye anyị na-atụ anya ya kemgbe, ka è nwere onye ọzọ ga-abịa?”+ 4 Jizọs sịrị ha: “Gaanụ kọọrọ Jọn ihe unu na-anụ na ihe unu na-ahụ:+ 5 Ndị ìsì na-ahụzi ụzọ,+ ndị ngwọrọ na-ejekwa ije. A na-eme ka ndị ekpenta+ dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe. A na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, a na-ezikwa ndị ogbenye ozi ọma.+ 6 Onye ihe gbasara m na-anaghị eme obi abụọ* na-enwe obi ụtọ.”+
7 Mgbe ha lawara, Jizọs malitere ịgwa ìgwè mmadụ ahụ banyere Jọn, sị: “Gịnị ka unu gara ịhụ n’ala ịkpa?+ Ọ̀ bụ ahịhịa amị nke ifufe na-ebugharị?+ 8 Gịnịzi ka unu gara ịhụ? Ọ̀ bụ onye yi uwe mara mma?* N’eziokwu, ndị yi uwe mara mma nọ n’ụlọ ndị eze. 9 Gịnịkwanụ mere unu ji gaa? Ọ̀ bụ ịhụ onye amụma? N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụ onye karịrị onye amụma.+ 10 Onye a bụ onye ahụ e dere banyere ya, sị: ‘Lee, m na-ezipụ onye ozi m ga-ebu gị ụzọ,* ọ ga-edozikwa ụzọ ị ga-esi bịa.’+ 11 N’eziokwu, ana m asị unu, n’ime ndị niile ụmụ nwaanyị mụrụ, o nwebeghị onye ka Jọn Onye Na-eme Baptizim ukwuu, ma onye dị ala n’Alaeze eluigwe ka ya ukwuu.+ 12 Malite n’ụbọchị Jọn Onye Na-eme Baptizim ruo ugbu a, ndị mmadụ na-agbalịsi ike ịbanye n’Alaeze eluigwe, ndị na-agbalịsikwa ike na-abanye na ya.+ 13 N’ihi na tupu oge Jọn, Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma* niile kwuru ihe ga-eme n’ọdịnihu.+ 14 Ma ùnu kwere ma unu ekweghị, Jọn bụ ‘Ịlaịja ahụ ndị amụma kwuru na ọ ga-abịa.’+ 15 Onye nwere ntị, ya nụ.
16 “Ole ndị ka m ga-eji ọgbọ a tụnyere?+ O yiri ụmụaka ndị nọ ọdụ n’ọma ahịa, na-agwa ndị ha na ha na-egwukọ egwu, 17 sị: ‘Anyị gbuuru unu ọjà, ma unu agbaghị egwú. Anyị bere ezigbo ákwá, ma unu erughị uju.’* 18 Jọn bịara, na-ebu ọnụ, ọ naghịkwa aṅụ mmanya, ma ndị mmadụ na-asị, ‘Mmụọ ọjọọ ji ya.’ 19 Nwa nke mmadụ bịara na-eri ihe, na-aṅụkwa mmanya,+ ma ndị mmadụ na-asị, ‘Ọ na-eri oké nri, na-aṅụkwa oké mmanya. Ọ bụ enyi ndị ọnaụtụ na ndị mmehie.’+ Ma, ihe na-egosi na mmadụ ma ihe bụ ihe ndị dị mma ọ na-eme.”+
20 Ọ maliteziri ịkọcha obodo ndị ọ kacha rụọ ọrụ ebube na ha, n’ihi na ha echegharịghị. 21 Ọ sịrị: “Korezin na Betsaịda, unu ga-ata ahụhụ, n’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ na Taya na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube ndị a rụrụ n’ime unu, ha gaara echegharị kemgbe, yiri ákwà iru uju nọdụ ọdụ ná ntụ.+ 22 Ma ana m asị unu, ọ ga-adịrị Taya na Saịdọn mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa unu.+ 23 Gịnwa kwa, Kapaniọm,+ à ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Ị ga-agbadaru n’ili,*+ n’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ na Sọdọm ka a rụrụ ọrụ ebube ndị a rụrụ n’ime gị, ọ gaara adị ruo taa. 24 Ma ana m asị unu, ọ ga-adịrị Sọdọm mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa gị.”+
25 N’oge ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m eto gị n’ihu ọha n’ihi na i zochiiri ndị ma ihe na ndị ọkachamara ihe ndị a ma mee ka ụmụaka mara ha.+ 26 Nna, ọ bụ otú ị chọrọ ya.” 27 Jizọs sịkwara: “Nna m enyefeela m ihe niile.+ O nweghị onye ma m* nke ọma ma e wezụga Nna m.+ O nweghịkwa onye ma Nna m nke ọma ma e wezụga mụnwa na onye ọ bụla m chọrọ ịkụziri gbasara ya.+ 28 Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-arụgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bokwara ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. 29 Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi,+ unu* ga-enwetakwa ume. 30 N’ihi na yok m anaghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”
12 N’oge ahụ, Jizọs si n’ubi ọka wit na-agafe n’Ụbọchị Izu Ike. Agụụ gụwara ndị na-eso ụzọ ya. Ha wee malite ịghọrọ ụyọkọ ọka wit na-ata.+ 2 Mgbe ndị Farisii hụrụ ihe a, ha sịrị ya: “Ndị na-eso ụzọ gị na-eme ihe iwu kwuru ka a ghara ime n’Ụbọchị Izu Ike.”+ 3 O wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụbeghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya?+ 4 Ọ banyere n’ụlọ Chineke, were achịcha a na-enye Chineke,+ ya na ndị so ya ataa. Ma, iwu kwuru na o nweghị onye kwesịrị ịta ya ma e wezụga ndị nchụàjà.+ 5 Ka ọ̀ bụ na unu agụbeghị n’Iwu ahụ* na ndị nchụàjà nọ n’ụlọ nsọ na-arụ ọrụ n’Ụbọchị Izu Ike, ma a naghị asị na ha dara iwu?+ 6 Ma ana m asị unu na onye ka ụlọ nsọ ahụ nọ ebe a.+ 7 Ma, a sị na unu ghọtara ihe okwu a pụtara, ‘Achọrọ m ebere,+ ọ bụghị àjà,’+ unu agaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe. 8 N’ihi na Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izu Ike.”+
9 Mgbe o si ebe ahụ pụọ, ọ banyere n’ụlọ nzukọ ha. 10 Ma, e nwere otu nwoke otu aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ.+ Ụfọdụ ndị wee jụọ Jizọs ajụjụ iji nweta ebubo ha ga-ebo ya.+ Ha jụrụ ya, sị, “È kwesịrị ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike?” 11 O wee sị ha: “Ọ bụrụ na otu onye n’ime unu nwere otu atụrụ, atụrụ ahụ adaba n’olulu n’Ụbọchị Izu Ike, ọ́ gaghị aga dọpụta ya?+ 12 O doro anya na mmadụ bara uru karịa atụrụ. N’ihi ya, iwu kwuru ka a na-eme ihe dị mma n’Ụbọchị Izu Ike.” 13 Ọ gwaziri nwoke ahụ, sị: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa ya, ya adị mma ka aka nke ọzọ. 14 Ma ndị Farisii pụrụ wee gbaa izu otú ha ga-esi gbuo ya. 15 Ebe Jizọs ma nke a, o si ebe ahụ pụọ. Ọtụtụ ndị sokwaara ya,+ o wee gwọọ ndị niile ahụ́ na-adịghị. 16 Ma, ọ gwasiri ha ike ka ha ghara ime ka a mata onye ọ bụ,+ 17 ka ihe e si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo wee mezuo. Ọ sịrị:
18 “Leenụ ohu m+ nke m họọrọ, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.*+ M ga-enye ya mmụọ m,+ ọ ga-emekwa ka ikpe ziri ezi doo mba niile anya. 19 Ọ gaghị ese okwu.+ Ọ gaghị etisi mkpu ike, e nweghịkwa onye ga-anụ olu ya n’okporo ámá. 20 Ọ gaghị azọgbu ahịhịa amị fọrọ obere ka ọ kpọnwụọ, ọ gaghịkwa emenyụ owu mpanaka* ọ bụla na-achọ ịnyụ anyụ,+ ruo mgbe o mere ka e kpee ikpe ziri ezi. 21 N’eziokwu, mba niile ga-enwe olileanya n’aha ya.”+
22 Ha wee kpọtara ya nwoke mmụọ ọjọọ ji, onye kpuru ìsì ma daa ogbi, o wee gwọọ ya, nwoke ogbi ahụ amalite ikwu okwu na ịhụ ụzọ. 23 Ihe a juru ìgwè mmadụ ahụ anya, ha amalite ịsị: “Ọ̀ bụ na onye a abụghị Nwa Devid?” 24 Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe a, ha sịrị: “Ọ bụ ike Bielzebọb,* onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ, ka onye a ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ.”+ 25 Ebe ọ ma ihe ha na-eche n’echiche, ọ sịrị ha: “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya ga-ada. Obodo ọ bụla ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya agaghị adịgide. 26 Ọ bụrụkwa na Setan achụpụ Setan, o kewaala na-emegide onwe ya. Oleezi otú alaeze ya ga-esi kwụrụ? 27 Ọ bụrụkwa na m ji ike Bielzebọb na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ ike onye ka ụmụ unu ji na-achụpụ ha? Ọ bụ ya mere ha ga-eji bụrụ ndị ga-ekpe unu ikpe. 28 Ma ọ bụrụ na ọ bụ mmụọ Chineke ka m ji na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, n’eziokwu, Alaeze Chineke akwaala unu.+ 29 Ma ọ bụ, olee otú mmadụ ọ bụla ga-esi banye n’ụlọ nwoke dị ike ma buru ngwongwo ya, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kee nwoke ahụ dị ike agbụ? Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka ọ ga-enwe ike ibukọrọ ihe ndị dị n’ụlọ ya. 30 Onye na-anọghị n’akụkụ m na-emegide m. Onye na-esoghịkwa m na-ekpokọta ekpokọta na-ekposa ekposa.+
31 “Ọ bụ ya mere m ji asị unu na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ ụdị mmehie na nkwulu ọ bụla, ma a gaghị agbaghara nkwulu e kwuluru mmụọ nsọ.+ 32 Dị ka ihe atụ, onye ọ bụla nke kwuluru Nwa nke mmadụ, a ga-agbaghara ya.+ Ma, onye ọ bụla nke kwuluru mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya, ma n’oge a* ma n’ọdịnihu.+
33 “Ọ bụrụ na unu elezie osisi anya, ọ ga-amị mkpụrụ dị mma. Ma, ọ bụrụ na unu elezighị osisi anya, mkpụrụ ya agaghị adị mma. A na-eji mkpụrụ osisi amata osisi ọ bụla.+ 34 Ụmụ ajụala,+ olee otú unu ga-esi kwuo ihe dị mma, ebe unu bụ ndị ajọ omume? N’ihi na ihe juru mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.+ 35 Ezigbo mmadụ na-esi n’ezigbo akụ̀ ya ewepụta ihe ọma, ma, ajọ mmadụ na-esi n’akụ̀ ọjọọ ya ewepụta ihe ọjọọ.+ 36 Ana m asị unu na ụmụ mmadụ ga-aza ajụjụ+ n’Ụbọchị Ikpe banyere okwu ọ bụla na-abaghị uru ha kwuru. 37 N’ihi na a ga-eji ihe i kwuru kpọọ gị onye ezi omume, a ga-ejikwa ihe i kwuru ma gị ikpe.”
38 Ụfọdụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii wee sị ya: “Onye Ozizi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe àmà.”+ 39 Ọ sịrị ha: “Ọgbọ ọjọọ nke hapụrụ Chineke* na-achọ ihe àmà, ma o nweghị ihe àmà a ga-egosi ya ma ọ́ bụghị ọrụ ebube ahụ a rụụrụ Jona onye amụma.+ 40 N’ihi na otú ahụ Jona nọrọ n’afọ nnukwu azụ̀ ụbọchị atọ, ehihie na abalị,+ ka Nwa nke mmadụ ga-anọkwa n’ime ala ụbọchị atọ, ehihie na abalị.+ 41 Ndị Ninive na ọgbọ a ga-ebili n’Ụbọchị Ikpe. Ndị Ninive ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na ha chegharịrị mgbe ha nụrụ ihe Jona kwusara.+ Ma, onye ka Jona nọ ebe a.+ 42 A ga-akpọlite eze nwaanyị ndịda na ọgbọ a n’Ụbọchị Ikpe. Ọ ga-amakwa ọgbọ a ikpe, n’ihi na o si na nsọtụ ụwa bịa ịnụ okwu Solomọn onye amamihe na-ekwu.+ Ma, onye ka Solomọn nọ ebe a.+
43 “Mgbe mmụọ ọjọọ* si n’ime mmadụ pụọ, ọ na-aga ebe mmiri na-adịghị ka ọ chọta ebe ọ ga-ezu ike, o nweghịkwa ebe ọ na-achọta.+ 44 Mgbe ahụ, ọ na-asị, ‘M ga-alaghachi n’ụlọ m ebe m si pụọ.’ Ọ bịarutekwa, ọ na-ahụ na ụlọ ahụ tọgbọ nkịtị, na a zachara ya nke ọma, chọọkwa ya mma. 45 Ọ na-agazi kpọrọ mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya. Mgbe ha banyere, ha na-ebirikwa ebe ahụ. Ọnọdụ ikpeazụ nke onye ahụ na-akazi nke mbụ njọ.+ Otú ahụkwa ka ọ ga-adị ọgbọ ọjọọ a.”
46 Mgbe ọ ka nọ na-agwa ìgwè mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya ndị nwoke+ bịara. Ha guzo n’èzí na-achọ ịgwa ya okwu.+ 47 N’ihi ya, otu onye sịrị ya: “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke guzo n’èzí. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.” 48 Ọ sịrị onye ahụ gwara ya ihe a: “Ònye bụ nne m, ole ndị bụkwa ụmụnne m ndị nwoke?” 49 Ọ tụrụ ndị na-eso ụzọ ya aka ma sị: “Ndị a bụ nne m na ụmụnne m ndị nwoke.+ 50 N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme uche Nna m nke bi n’eluigwe, onye ahụ bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwaanyị na nne m.”+
13 Mgbe Jizọs si n’ụlọ pụọ n’ụbọchị ahụ, ọ gara n’akụkụ oké osimiri nọdụ ala. 2 Ìgwè mmadụ gbakọkwara n’ebe ọ nọ, nke mere na ọ banyere n’ụgbọ mmiri ma nọdụ ala, ìgwè mmadụ ahụ niile guzokwa n’akụkụ osimiri ahụ.+ 3 O wee meere ha ọtụtụ ihe atụ.+ Ọ sịrị: “Ọgha mkpụrụ gawara ịgha mkpụrụ.+ 4 Ka ọ nọ na-agha mkpụrụ, mkpụrụ ụfọdụ dara n’akụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ abịa tụrụchaa ha.+ 5 Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ala nkume ma pulite ozugbo n’ihi na ájá dị ebe ahụ emighị emi.+ 6 Ma mgbe anwụ chawara, ha chanwụrụ, kpọnwụọkwa n’ihi na ha enweghị mgbọrọgwụ. 7 Mkpụrụ ụfọdụ dara n’ebe ogwu juru. Ogwu ndị ahụ tolitere ma kpagbuo ha.+ 8 Ma ndị ọzọ dara n’ala dị mma, wee malite ịmị mkpụrụ. Ụfọdụ mịrị okpukpu otu narị (100), ụfọdụ amịa okpukpu iri isii, ndị ọzọ amịa okpukpu iri atọ.+ 9 Onye nwere ntị, ya nụ.”+
10 Ndị na-eso ụzọ ya bịara wee sị ya: “Gịnị mere i ji jiri ihe atụ na-agwa ha okwu?”+ 11 O wee sị ha: “Ọ bụ unu ka Chineke mere ka unu ghọta ihe nzuzo ndị dị nsọ+ nke Alaeze eluigwe, ma o meghị ka ha ghọta ya. 12 N’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe, a ga-enyekwu ya, meekwa ka o nwehie ya nne. Ma onye ọ bụla na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o nwere.+ 13 Ọ bụ ya mere m ji eji ihe atụ agwa ha okwu, n’ihi na ha na-ele anya, ma ha anaghị ahụ ihe ọ bụla. Ha na-ege ntị, ma ha anaghị anụ ihe, ha anaghịkwa aghọta ihe ọ bụla.+ 14 Amụma Aịzaya na-emezu n’isi ha. Ọ sịrị: ‘Unu ga-anụ ihe, ma unu agaghị aghọta ihe ọ bụla. Unu ga-ele anya, ma unu agaghị ahụ ihe ọ bụla.+ 15 N’ihi na obi ndị a anaghịzi anabata ihe, ha ejirikwala ntị ha nụ ihe ma ha emeghị ihe ọ bụla. Ha emechiekwala anya ha ka ha ghara ịhụ ihe ọ bụla, mechie ntị ha ka ha ghara ịnụ ihe ọ bụla, kpọchiekwa obi ha ka ha ghara ịghọta ihe ọ bụla, gharakwa ịgbanwe, mụ agwọọ ha.’+
16 “Ma, unu na-enwe obi ụtọ n’ihi na unu na-ahụ ihe ndị a, na-anụkwa ha.+ 17 N’ihi na n’eziokwu, ana m asị unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume chọrọ ịhụ ihe ndị unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha,+ ha chọkwara ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.
18 “Gezienụ ntị n’ihe ihe atụ gbasara nwoke ahụ ghara mkpụrụ pụtara.+ 19 Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ okwu banyere Alaeze Chineke ma ọ ghọtaghị ihe ọ pụtara, ajọ onye ahụ+ na-abịa pụnara ya ihe a ghara n’obi ya. Ọ bụ ya bụ nke a ghara n’akụkụ ụzọ.+ 20 Ma nke ahụ a ghara n’ala nkume bụ onye nụrụ okwu ahụ ma jiri ọṅụ nabata ya ozugbo.+ 21 Ma, okwu ahụ agbanyeghị mgbọrọgwụ n’obi ya, kama ọ nọrọ obere oge, ozugbo nsogbu ma ọ bụ mkpagbu bịaara ya n’ihi okwu ahụ, ọ na-akwụsị ikwere okwu ahụ. 22 Ma nke ahụ a ghara n’ebe ogwu juru bụ onye na-anụ okwu ahụ, ma nchegbu nke oge a*+ na akụnụba nke na-aghọgbu ndị mmadụ na-akpagbu okwu ahụ, okwu ahụ aghara ịmị mkpụrụ.+ 23 Ma nke ahụ a ghara n’ala dị mma bụ onye na-anụ okwu ahụ ma na-aghọta ihe ọ pụtara, na-amịkwa mkpụrụ ma na-emepụta ihe. Ọ na-amị mkpụrụ okpukpu otu narị (100), mịa ụfọdụ okpukpu iri isii, mịakwa ndị ọzọ okpukpu iri atọ.”+
24 O meere ha ihe atụ ọzọ, sị: “Alaeze eluigwe dị ka nwoke ghara ezigbo mkpụrụ n’ubi ya. 25 Mgbe ndị mmadụ nọ na-ehi ụra, onye iro ya bịara kụọ ata n’etiti ọka wit ahụ pụọ. 26 Mgbe o pulitere mịa mkpụrụ, ata ndị ahụ pulitekwara. 27 N’ihi ya, ndị ohu nwoke ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ́ bụghị ezigbo mkpụrụ ka ị ghara n’ubi gị? Oleezi otú ata si na-eto na ya?’ 28 O wee sị ha, ‘Ọ bụ onye iro mere ihe a.’+ Ndị ohu ya wee sị ya, ‘Ị̀ chọrọ ka anyị gaa fopụsịa ha?’ 29 O wee sị, ‘Mba, ka unu ghara ifopụkọta ata ndị ahụ na ọka wit ndị ahụ. 30 Hapụnụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi. N’oge owuwe ihe ubi, m ga-agwa ndị na-ewe ihe ubi, sị: Burunụ ụzọ chịkọta ata ndị ahụ, kee ha n’ùkwù n’ùkwù ka e suo ha ọkụ. E mechaa, unu achịkọta ọka wit ndị ahụ chịba n’ụlọ m na-akwakọba ihe.’”+
31 O meere ha ihe atụ ọzọ, sị: “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ osisi mọstad, nke mmadụ weere kụọ n’ubi ya.+ 32 N’eziokwu, ọ bụ mkpụrụ kacha nta, ma mgbe o toro, ọ na-ebu ezigbo ibu ma ghọọ osisi, nke mere na nnụnụ na-abịa biri n’alaka ya.”
33 O meere ha ihe atụ ọzọ, sị: “Alaeze eluigwe dị ka ihe iko achịcha nke nwaanyị weere tinye ná ntụ ọka juru arịa atọ buru ibu, ruo mgbe ntụ ọka ahụ niile koro.”+
34 Ihe atụ a niile ka Jizọs meere ìgwè mmadụ ahụ. N’eziokwu, ọ naghị agwa ha okwu n’emereghị ha ihe atụ,+ 35 ka ihe e si n’ọnụ onye amụma kwuo wee mezuo. Ọ sịrị: “M ga-emeghe ọnụ m jiri ihe atụ kụzie ihe. M ga-ekwusa ihe ndị zoro ezo kemgbe a tọrọ ntọala.”*+
36 Mgbe ọ gwachara ìgwè mmadụ ahụ ka ha laa, ọ banyere n’ụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya wee sị: “Kọwaara anyị ihe atụ ahụ i ji ata dị n’ubi mee.” 37 Ọ gwara ha, sị: “Onye ghara ezigbo mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke mmadụ. 38 Ubi ahụ bụ ụwa.+ Ezigbo mkpụrụ ahụ bụ ụmụ Alaeze, ma ata ahụ bụ ụmụ ajọ onye ahụ.+ 39 Onye iro nke kụrụ ha bụ Ekwensu. Owuwe ihe ubi ahụ bụ ọgwụgwụ oge a.* Ndị ahụ na-ewe ihe ubi bụ ndị mmụọ ozi. 40 N’ihi ya, otú ahụ a na-achịkọta ata suo ha ọkụ, otú ahụkwa ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ oge a.*+ 41 Nwa nke mmadụ ga-eziga ndị mmụọ ozi ya, ha ga-esikwa n’Alaeze ya chịkọta ndị niile na-eme ka ndị ọzọ mee mmehie nakwa ụmụ mmadụ ndị na-emebi iwu. 42 Ha ga-atụbakwa ha n’oké ọkụ.+ N’ebe ahụ ka ha ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé. 43 N’oge ahụ, ndị ezi omume ga-enwu gbaa dị ka anyanwụ+ n’Alaeze Nna ha. Onye nwere ntị, ya nụ.
44 “Alaeze eluigwe dị ka akụ̀ e zoro n’ala, nke otu nwoke hụrụ wee zoo ya. Ọ gara ree ihe ndị o nwere wee zụọ ala ahụ n’ihi na ọṅụ juru ya obi.+
45 “Alaeze eluigwe dịkwa ka onye ahịa na-achọ nkume pel mara mma. 46 Mgbe ọ hụrụ otu nkume pel dị oké ọnụ, ọ lara ree ihe niile o nwere ozugbo wee zụọ ya.+
47 “Alaeze eluigwe dịkwa ka ụgbụ a wụnyere n’oké osimiri nke na-ekpokọta ụdị azụ̀ niile. 48 Mgbe o juru, ha dọgotere ya n’ikpere osimiri, nọdụ ala, chịkọta ndị dị mma+ wụnye n’arịa dị iche iche, ma ha tụfuru ndị na-adịghị mma.+ 49 Otú ahụ ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ oge a.* Ndị mmụọ ozi ga-aga si n’ebe ndị ezi omume nọ kpọpụta ndị ajọ omume, 50 ha ga-atụbakwa ha n’oké ọkụ. N’ebe ahụ ka ha ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé.
51 “Ùnu ghọtara ihe ihe ndị a niile pụtara?” Ha asị ya: “Ee.” 52 Ọ sịziri ha: “Ọ bụrụ otú ahụ, onye ọ bụla nke na-akụzi ihe, bụ́ onye a kụziiri banyere Alaeze eluigwe, yiri nwoke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye na-esi n’ụlọ akụ̀ ya ewepụta ihe ndị dị ọhụrụ na ndị mere ochie.”
53 Mgbe Jizọs mechara ihe atụ ndị a, o si ebe ahụ gawa ebe ọzọ. 54 Mgbe ọ banyere n’obodo ya,+ ọ malitere izi ha ihe n’ụlọ nzukọ ha, nke mere na o juru ha anya, ha asị: “Olee ebe nwoke a si nweta amamihe a? Ònye nyekwara ya ike o ji arụ ọrụ ebube ndị a?+ 55 Onye a ọ́ bụghị nwa ọkwá nkà?+ Ọ́ bụghị nne ya ka a na-akpọ Meri? Ọ̀ bụkwa na ụmụnne ya ndị nwoke abụghị Jems na Josef na Saịmọn na Judas?+ 56 Ọ̀ bụ na anyị na ụmụnne ya ndị nwaanyị niile anọghị? Oleezi ebe o si nweta ihe ndị a niile?”+ 57 N’ihi ya, ha anabataghị ya.+ Ma Jizọs sịrị ha: “A na-asọpụrụ onye amụma ma e wezụga n’obodo ya nakwa n’ụlọ ya.”+ 58 Ọ rụghịkwa ọtụtụ ọrụ ebube ebe ahụ n’ihi na ha enweghị okwukwe.
14 N’oge ahụ, Herọd, onye na-achị ógbè ahụ, nụrụ akụkọ banyere Jizọs+ 2 wee gwa ndị na-ejere ya ozi, sị: “Onye a bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim. A kpọlitela ya n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ebube ndị a.”+ 3 Herọd* jidere Jọn, kee ya agbụ, tụọ ya mkpọrọ n’ihi Herodias nwunye Filip nwanne ya.+ 4 N’ihi na Jọn nọ na-asị ya: “Ọ dịghị mma na ị kpọọrọ ya lụwa.”+ 5 Ma, ọ bụ eziokwu na ọ chọrọ igbu ya, ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, n’ihi na ha weere na Jọn bụ onye amụma.+ 6 Ma mgbe a na-eme ememme ụbọchị ọmụmụ Herọd,+ ada Herodias gbara egwú n’ememme ahụ, wee mee Herọd ezigbo obi ụtọ+ 7 nke na ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-enye ya ihe ọ bụla ọ rịọrọ. 8 Nwa agbọghọ ahụ kwuziri ihe mama ya sị ya kwuo. Ọ sịrị: “Bunye m isi Jọn Onye Na-eme Baptizim n’efere mbadamba.”+ 9 Ọ bụ eziokwu na ihe a ọ rịọrọ wutere eze, o nyere iwu ka e bunye ya isi Jọn, n’ihi iyi ahụ ọ ṅụrụ n’ihu ndị ha na ya nọ na-eri ihe. 10 O wee ziga ndị gara n’ụlọ mkpọrọ gbupụ Jọn isi. 11 E butere isi ya n’efere mbadamba bunye nwa agbọghọ ahụ, o wee butere ya nne ya. 12 E mechaa, ndị na-eso ụzọ Jọn bịara buru ozu ya gaa lie, bịakwa kọọrọ Jizọs. 13 Mgbe Jizọs nụrụ ihe a, o ji ụgbọ mmiri si ebe ahụ pụọ gaa n’ebe ndị mmadụ na-anaghị anọkarị, ka ọ nọrọ naanị ya. Ma mgbe ìgwè mmadụ matara, ha si obodo dị iche iche jiri ụkwụ sochie ya azụ.+
14 Mgbe o si n’ụgbọ mmiri pụta, ọ hụrụ ìgwè mmadụ wee metere ha ebere,+ gwọọkwa ndị nke na-arịa ọrịa.+ 15 Ma mgbe o ruru uhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya wee sị: “Ebe a dịpụrụ adịpụ, chi ejiwekwala. Gwa ìgwè mmadụ a ka ha lawa gaa n’obodo ndị dị nso zụrụ nri ha ga-eri.”+ 16 Ma, Jizọs sịrị ha: “Ha ekwesịghị ịla. Nyenụ ha nri ka ha rie.” 17 Ha asị ya: “Ọ dịghị ihe anyị nwere ebe a, ma e wezụga ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ.” 18 Ya asị ha: “Wetaranụ m ha ebe a.” 19 O wee gwa ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala n’ahịhịa. Ya ewerezie ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe kpee ekpere.*+ Mgbe ọ nyawachara achịcha ndị ahụ, o nyere ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya enyewezie ha ìgwè mmadụ ahụ. 20 Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nkata iri na abụọ.+ 21 Ma ndị riri ya dị ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise (5,000), ma e wezụga ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị.+ 22 Ọ gwaziri ndị na-eso ụzọ ya ozugbo ka ha banye n’ụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee osimiri ahụ. Ma, ọ gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa.+
23 Mgbe ọ gwachara ìgwè mmadụ ahụ ka ha lawa, naanị ya gbagoro n’elu ugwu ikpe ekpere.+ Ọ nọkwa ebe ahụ naanị ya ruo mgbede. 24 Ka ọ dịgodị, ụgbọ mmiri ahụ esila n’akụkụ osimiri ahụ gaa ọtụtụ narị mita,* ebili mmiri mekwara ka o sie ike ịkwọ ya, n’ihi na ifufe na-efesi ike. 25 Ma n’oge nche nke anọ nke abalị,* o jeere ije n’elu oké osimiri ahụ na-abịakwute ha. 26 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri ahụ, obi mapụrụ ha, ha asị: “Ọ bụ mmụọ!” Ha wee tie mkpu n’ihi egwu ha na-atụ. 27 Ma, Jizọs gwara ha ozugbo, sị: “Nweenụ obi ike. Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”+ 28 Pita gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri.” 29 O wee sị: “Bịa.” Pita esizie n’ụgbọ ahụ pụta, jere ije n’elu mmiri ahụ gakwuruwe Jizọs. 30 Ma mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya. Mgbe ọ malitekwara imikpu, o tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta m!” 31 Jizọs matịrị aka ozugbo, jide ya wee sị ya: “Onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”+ 32 Mgbe ha banyere n’ụgbọ ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị. 33 N’ihi ya, ndị nọ n’ụgbọ ahụ kpọọrọ ya isiala, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’eziokwu.” 34 Ha gafere osimiri ahụ pụta n’elu ala na Genesaret.+
35 Mgbe ndị ebe ahụ matara na ọ bụ Jizọs, ha gwara ndị bi gburugburu obodo ahụ na ọ bịala. Ndị mmadụ wee kpọtara ya ndị niile na-arịa ọrịa. 36 Ha wee na-arịọ ya ka ha bitụ naanị ọnụ ọnụ uwe elu ya aka.+ E mekwara ka ahụ́ dịchaa ndị niile bitụrụ ya aka mma.
15 Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ+ wee si Jeruselem bịakwute Jizọs, sị ya: 2 “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị ji emebi ọdịnala ndị oge gboo? Dị ka ihe atụ, ha anaghị akwọ aka* mgbe ha chọrọ iri nri.”+
3 Ọ sịrị ha: “Gịnị mere ununwa ji emebi iwu Chineke n’ihi ọdịnala unu?+ 4 Dị ka ihe atụ, Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị.’+ Ọ sịkwara, ‘A ga-egbu onye kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi.’*+ 5 Ma unu na-asị, ‘Onye ọ bụla nke na-asị nne ya ma ọ bụ nna ya: “Ihe ọ bụla m nwere nke m gaara eji nyere gị aka bụ onyinye m kwere Chineke ná nkwa,”+ 6 iwu ejighịzi ya inyere nna ya aka.’ Unu ejirila ọdịnala unu mee ka okwu Chineke bụrụ ihe efu.+ 7 Unu ndị ihu abụọ, ihe Aịzaya buru n’amụma banyere unu dabara adaba. Ọ sịrị:+ 8 ‘Ndị a na-asị na ha na-asọpụrụ m, ma obi ha adịghị n’ebe m nọ. 9 Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m, n’ihi na ihe ha na-akụzi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.’”+ 10 Ọ gwaziri ìgwè mmadụ ahụ ka ha bịa nso. Mgbe ha bịara, ya asị ha: “Geenụ ntị ma ghọta ihe okwu a pụtara:+ 11 Ọ bụghị ihe na-abanye n’ọnụ mmadụ na-emerụ ya, kama ọ bụ ihe na-esi n’ọnụ mmadụ apụta na-emerụ ya.”+
12 Ndị na-eso ụzọ ya bịara wee sị ya: “Ị̀ ma na iwe were ndị Farisii mgbe ha nụrụ ihe ahụ i kwuru?”+ 13 Ọ gwara ha, sị: “A ga-efopụ ihe ọ bụla Nna m nke eluigwe na-akụghị. 14 Hapụnụ ha. Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ọ bụrụkwa na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”+ 15 Pita asị ya: “Mee ka ihe atụ a doo anyị anya.” 16 O wee sị: “Ọ̀ bụ na ununwa kwa aghọtaghị?+ 17 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ihe ọ bụla nke na-abanye n’ọnụ na-agafe banye n’afọ, e mechaa, a nyụpụ ya? 18 Ma, ihe ọ bụla si n’ọnụ pụta si n’obi, ọ bụkwa ihe ndị ahụ na-emerụ mmadụ.+ 19 Dị ka ihe atụ, echiche ọjọọ nke na-akpata igbu mmadụ,* ịkwa iko,* izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, na-esicha n’obi apụta.+ 20 Ọ bụ ihe ndị a na-emerụ mmadụ, ma iji aka a na-akwọghị akwọ* eri nri anaghị emerụ mmadụ.”
21 Mgbe Jizọs si ebe ahụ pụọ, ọ gawara Taya na Saịdọn.+ 22 Ma, otu nwaanyị Finishia nke si n’ógbè ahụ bịakwutere ya wee tie mkpu, sị: “Meere m ebere, Onyenwe anyị, Nwa Devid. Mmụọ ọjọọ ji nwa m nwaanyị aka ọjọọ.”+ 23 Ma ọ tụpụrụghị nwaanyị ahụ ọnụ. N’ihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara malite ịgwa ya, sị: “Sị ya lawa, n’ihi na ọ na-ebe ákwá na-esogharị anyị.” 24 O wee, sị: “E zitere m maka atụrụ furu efu, bụ́ mba Izrel, ọ bụghị maka ndị ọ bụla ọzọ.”+ 25 Ma nwaanyị ahụ bịara, kpọọrọ ya isiala, sị: “Onyenwe anyị, nyere m aka.” 26 Ya asị ya: “E kwesịghị iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.” 27 O wee sị: “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị. Ma, ụmụ nkịta na-eri iberibe ihe si na tebụl nna ha ukwu na-adapụsị.”+ 28 Jizọs gwaziri ya, sị: “Nwaanyị, i nwere ezigbo okwukwe. Ka e meere gị ihe ị rịọrọ.” E wee gwọọ nwa ya nwaanyị n’oge ahụ.
29 Mgbe Jizọs si ebe ahụ pụọ, ọ gara ebe dị nso n’Oké Osimiri Galili.+ Mgbe ọ gbagoro n’elu ugwu, ọ nọdụrụ ala n’ebe ahụ. 30 Oké ìgwè mmadụ wee kpọta ndị ngwọrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, ndị ogbi, na ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa ndị ọzọ, tọgbọ ha n’ụkwụ ya, o wee gwọọ ha.+ 31 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ hụrụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu na ndị ngwọrọ ka ha na-eje ije na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ nakwa ka ahụ́ dị ndị nwere nkwarụ mma, o juru ha anya, ha wee too Chineke Izrel.+
32 Ma Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya. O wee sị: “Ana m emetere ìgwè mmadụ a ebere+ n’ihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri. Achọghịkwa m ka ha buru ọnụ lawa. Ha nwere ike ịtụbọ n’ụzọ.”+ 33 Ma, ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “N’ebe a ndị mmadụ na-anaghị anọkarị, ebee ka anyị ga-enweta achịcha ga-eju ìgwè mmadụ há otú a afọ?”+ 34 Jizọs wee sị ha: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya: “Asaa, na obere azụ̀ ole na ole.” 35 N’ihi ya, mgbe ọ gwachara ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala, 36 o buuru ogbe achịcha asaa ahụ na azụ̀ ndị ahụ. Mgbe o kelechara Chineke, ọ nyawara ha wee malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya enyezie ha ìgwè mmadụ ahụ.+ 37 Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nnukwu nkata asaa.+ 38 Ndị riri ya dị puku ụmụ nwoke anọ (4,000), ma e wezụga ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị. 39 N’ikpeazụ, mgbe ọ sịrị ìgwè mmadụ ahụ lawa, ọ banyere n’ụgbọ mmiri wee bata Magadan.+
16 Ndị Farisii na ndị Sadusii wee bịakwute ya ka ha nwaa ya. Ha gwara ya ka o gosi ha ihe àmà si n’eluigwe.+ 2 O wee sị ha: “N’uhuruchi, unu na-asị, ‘Ihu ígwé ga-adị mma, n’ihi na ọ na-acha ọbara ọbara.’ 3 N’ụtụtụ, unu na-asịkwa, ‘Mmiri ga-ezo taa, oyi ga-atụkwa, n’ihi na eluigwe na-acha ọbara ọbara ma gbaa ọchịchịrị.’ Unu ma otú e si akọwa ihu ígwé, ma unu enweghị ike ịkọwa ihe àmà nke oge a. 4 Ọgbọ ọjọọ nke hapụrụ Chineke* na-achọ ihe àmà, ma a gaghị egosi ya ihe àmà ọ bụla+ ma ọ́ bụghị ọrụ ebube ahụ a rụụrụ Jona.”+ O wee hapụ ha pụọ.
5 Ma ndị na-eso ụzọ ya gafere n’ofe nke ọzọ ma chefuo iwere achịcha.+ 6 Jizọs sịrị ha: “Lezienụ anya, kpacharakwanụ anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”+ 7 N’ihi ya, ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “Anyị chefuru iweta achịcha.” 8 Ebe Jizọs ma ihe ha na-ekwu, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-agwa ibe unu na unu ejighị achịcha, unu ndị okwukwe nta? 9 Ọ̀ bụ na unu aghọtabeghị ihe m na-ekwu, ka ọ̀ bụ na unu echetaghị ogbe achịcha ise ahụ e nyere puku mmadụ ise (5,000) nakwa nkata ole unu tụtụjuru nke ha tafọrọ?+ 10 Ka ọ̀ bụ na unu echetaghị ogbe achịcha asaa ahụ e nyere puku mmadụ anọ (4,000) nakwa nnukwu nkata ole unu tụtụjuru nke ha tafọrọ?+ 11 Gịnị mere na unu aghọtaghị na ọ bụghị achịcha ka m na-ekwu gbasara ya? Ihe m na-ekwu bụ ka unu lezie anya maka ihe iko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”+ 12 Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-ekwu bụ ka ha lezie anya maka ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii, ọ bụghị maka ihe iko achịcha nkịtị.
13 Mgbe Jizọs banyere n’ógbè Sizaria Filipaị, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke mmadụ bụ?”+ 14 Ha wee sị: “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim,+ ndị ọzọ na-asị na ị bụ Ịlaịja,+ ndị ọzọkwa na-asị na ị bụ Jeremaya ma ọ bụ otu n’ime ndị amụma.” 15 O wee sị ha: “Ònye ka ununwa chere na m bụ?” 16 Saịmọn Pita zara, sị: “Ị bụ Kraịst,+ Ọkpara Chineke dị ndụ.”+ 17 Jizọs wee sị ya: “Saịmọn nwa Jona, ka obi na-atọ gị ụtọ n’ihi na ọ bụghị anụ ahụ́ na ọbara* mere ka ị mata ihe a, kama ọ bụ Nna m nke nọ n’eluigwe.+ 18 Ana m asịkwa gị: Ị bụ Pita,+ ọ bụkwa n’elu oké nkume a+ ka m ga-arụ ọgbakọ m, ọnụ ụzọ ámá nke ili* agaghịkwa aka ya ike. 19 M ga-enye gị mkpịsị ugodi Alaeze eluigwe, ihe ọ bụla ị ga-eke agbụ n’ụwa bụ ihe e kere agbụ n’eluigwe, ihe ọ bụla ị ga-atọpụ n’ụwa bụkwa ihe a tọpụrụ n’eluigwe.” 20 Ọ gwasiziri ndị na-eso ụzọ ya ike ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla na ya bụ Kraịst.+
21 Malite n’oge ahụ gawa, Jizọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya na ya ga-aga Jeruselem nakwa na ndị okenye na ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ ga-ata ya ezigbo ahụhụ ebe ahụ. A ga-egbukwa ya, ma, n’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya n’ọnwụ.+ 22 Pita wee kpọpụ ya n’akụkụ bido ịbara ya mba, sị: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị. Ihe a agaghị eme gị.”+ 23 Ma ọ gbanyeere Pita azụ, sị ya: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị na-achọ imegharị m anya, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama ọ bụ nke mmadụ.”+
24 Jizọs gwaziri ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya ma buru osisi ịta ahụhụ* ya na-eso m mgbe niile.+ 25 N’ihi na onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta ndụ* ya ga-atụfu ya. Ma onye ọ bụla nke tụfuru ndụ ya n’ihi m ga-adị ndụ ọzọ.+ 26 N’eziokwu, olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ* ya?+ Ma ọ bụ, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ* ya?+ 27 N’ihi na Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ ihe o mere.+ 28 N’eziokwu, ana m asị unu na e nwere ụfọdụ n’ime ndị guzo ebe a na-agaghị anwụ ruo mgbe ha bu ụzọ hụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’Alaeze ya.”+
17 Mgbe ụbọchị isii gachara, Jizọs kpọọrọ Pita na Jems na Jọn nwanne ya gbagoo n’ugwu dị oké elu.+ 2 O wee nwoghaa n’ihu ha, ihu ya achawa ka anyanwụ, uwe elu ya ana-enwukwa gbaa* dị ka ìhè.+ 3 Ma, Mosis na Ịlaịja pụtara n’ihu ha, ha na ya ana-akparịta ụka. 4 Pita wee sị Jizọs: “Onyenwe anyị, ọ dị mma na anyị nọ ebe a. Ị chọọ, m ga-ama ụlọikwuu atọ ebe a, otu maka gị, otu maka Mosis, otu maka Ịlaịja.” 5 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ígwé ojii na-enwu gbaa kpuchiri ha, otu olu esikwa n’ígwé ojii ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe ya masịrị m.+ Geenụ ya ntị.”+ 6 Mgbe ha nụrụ ihe a, ndị na-eso ụzọ ya gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, ezigbo ụjọ wee jide ha. 7 Jizọs wee bịa, bitụ ha aka, sị: “Bilienụ. Unu atụla egwu.” 8 Mgbe ha leliri anya, e nweghịzi onye ha hụrụ ma e wepụ Jizọs. 9 Mgbe ha si n’ugwu ahụ na-agbadata, Jizọs gwara ha, sị: “Unu akọrọla onye ọ bụla ọhụụ a ruo mgbe a kpọlitere Nwa nke mmadụ n’ọnwụ.”+
10 Ma, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Gịnịzi mere ndị odeakwụkwọ ji ekwu na Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa?”+ 11 Ọ gwara ha, sị: “N’eziokwu, Ịlaịja na-abịa. Ọ ga-emekwa ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ.+ 12 Ma, ana m agwa unu na Ịlaịja abịala n’eziokwu, ma ha amataghị ya, kama ha mere ya ihe masịrị ha.+ Otú a kwa ka ha ga-esi taa Nwa nke mmadụ ahụhụ.”+ 13 Mgbe ahụ ka ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ na-agwa ha banyere Jọn Onye Na-eme Baptizim.
14 Mgbe ha bịara ebe ìgwè mmadụ nọ,+ otu nwoke bịakwutere ya, gbuoro ya ikpere n’ala, sị ya: 15 “Onyenwe anyị, meere nwa m nwoke ebere, n’ihi na ọ bụ onye akwụkwụ, ọnọdụ ya dịkwa njọ. Ọ na-adabakarị n’ọkụ, na-adabakwa na mmiri ọtụtụ mgbe.+ 16 M kpọtaara ya ndị na-eso ụzọ gị, ma ha enweghị ike ịgwọ ya.” 17 Jizọs wee sị: “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke rụkwara arụ,+ ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ tupu unu enwee okwukwe? Ruo ole mgbe ka m ga na-edi ihe unu na-eme? Kpọtara m ya ebe a.” 18 Jizọs wee baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, ya esi n’ime nwatakịrị nwoke ahụ pụta. E wee gwọọ ya n’oge ahụ.+ 19 Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee bịakwute ya mgbe naanị ya nọ, sị: “Gịnị mere na anyị achụpụlighị ya?” 20 O wee sị ha: “Ọ bụ n’ihi na okwukwe unu dị ntakịrị. N’ihi na n’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe há ka mkpụrụ osisi mọstad, unu ga-asị ugwu a, ‘Si ebe a gafee ebe nke ọzọ,’ ọ ga-agafe, ọ dịghịkwa ihe na-agaghị ekwe unu omume.”+ 21* ——
22 Ọ bụ mgbe ha zukọtara na Galili ka Jizọs sịrị ha: “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmadụ.+ 23 Ha ga-egbu ya, a ga-akpọlitekwa ya n’ụbọchị nke atọ.”+ Ihe a wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu.
24 Mgbe ha bịarutere Kapaniọm, ụmụ nwoke ndị na-anakọta ụtụ mkpụrụ ego drakma abụọ* bịakwutere Pita, sị ya: “Onye ozizi unu ọ̀ na-atụ ụtụ isi?”+ 25 O wee sị: “Ee, ọ na-atụ.” Ma, mgbe ọ banyere n’ime ụlọ, Jizọs bu ụzọ sị ya: “Saịmọn, gịnị ka i chere? N’aka ole ndị ka ndị eze ụwa na-anata ụtụ ahịa ma ọ bụ ụtụ isi? Ọ̀ bụ n’aka ụmụ ha, ka ọ̀ bụ n’aka ndị bịara abịa?” 26 Mgbe ọ sịrị: “Ọ bụ n’aka ndị bịara abịa,” Jizọs asị ya: “Ọ bụrụ otú ahụ, ụmụ ha ekwesịghị ịtụ ụtụ. 27 Ma ka ha ghara ilewe anyị anya ọjọọ,+ gaa n’oké osimiri, tụnye nko azụ̀, werekwa azụ̀ mbụ i gbutere. Mgbe i meghere ọnụ ya, ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego ọlaọcha.* Were ya nye ha maka mụ na gị.”
18 N’oge ahụ, ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere ya, sị ya: “Ònye n’eziokwu bụ onye kacha ukwuu n’Alaeze eluigwe?”+ 2 O wee kpọrọ otu nwatakịrị, gwa ya ka o guzo n’etiti ha. 3 O wee sị: “N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu agbanweghị dịrị ka ụmụntakịrị,+ o nweghị ihe ga-eme ka unu baa n’Alaeze eluigwe.+ 4 N’ihi ya, onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya ala dị ka nwatakịrị a bụ onye kacha n’Alaeze eluigwe.+ 5 Onye ọ bụla nke na-anabata nwatakịrị dị otú a n’aha m na-anabatakwa m. 6 Ma onye ọ bụla nke mere ka otu n’ime ndị a dị nta bụ́ ndị nwere okwukwe na m mehie, ọ ga-akara ya mma na e weere nkume e ji egwe nri nke jakị na-akwagharị konye ya n’olu ma tụba ya n’oké osimiri.+
7 “Ndị na-eme ka ndị ọzọ dapụ n’okwukwe ga-ata ahụhụ. N’eziokwu, a ga-enwerịrị ụdị ndị a, ma ha ga-ata ahụhụ maka ime ka ndị ọzọ dapụ n’okwukwe. 8 N’ihi ya, ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* gbupụ ya tụfuo.+ Ọ kaara gị mma ibu nkwarụ ma ọ bụ inwe otu ụkwụ nweta ndụ kama inwe aka abụọ ma ọ bụ ụkwụ abụọ, a tụba gị n’ọkụ ebighị ebi.*+ 9 Ọ bụrụkwa na anya gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* ghụpụ ya tụfuo. Ọ kaara gị mma ibu otu anya nweta ndụ kama inwe anya abụọ a tụba gị na Gehena* bụ́ ebe ọkụ na-ere.+ 10 Ya enwekwala ihe ga-eme ka unu ledaa otu n’ime ndị a dị nta anya, n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi ha nọ n’eluigwe na-anọ n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.+ 11* ——
12 “Gịnị ka unu chere? Ọ bụrụ na otu nwoke nwere otu narị (100) atụrụ, ma otu n’ime ha akpafuo,+ ọ́ gaghị ahapụ iri itoolu na itoolu fọrọ afọ n’elu ugwu gaa chọwa nke ahụ kpafuru akpafu?+ 13 Ọ bụrụ na ọ chọta ya, n’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ya karịa otú ọ na-aṅụrị n’ihi iri itoolu na itoolu ahụ na-akpafughị akpafu. 14 Otú ahụ kwa ka ọ na-adịghị Nna m* nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.+
15 “Ọ bụrụkwa na nwanna gị emejọọ gị, gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ mgbe naanị gị na ya nọ.+ Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritela nwanna gị n’uru.+ 16 Ma ọ bụrụ na o geghị ntị, kpọrọ otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ gaa, ka e si n’àmà* ndị akaebe abụọ ma ọ bụ atọ gbara mara na okwu ọ bụla bụ eziokwu.+ 17 Ọ bụrụ na o geghị ha ntị, gwa ọgbakọ. Ọ bụrụ na o geghịkwa ọgbakọ ntị, were ya ka onye mba ọzọ+ na onye ọnaụtụ.+
18 “N’eziokwu, ana m asị unu, ihe ọ bụla unu kere agbụ n’ụwa bụ ihe e kere agbụ n’eluigwe, ihe ọ bụla unu tọpụkwara n’ụwa bụ ihe a tọpụrụ n’eluigwe. 19 N’eziokwu, ana m asịkwa unu, ọ bụrụ na mmadụ abụọ n’ime unu anọrọ n’ụwa kwekọrịta n’ihe ọ bụla dị mkpa ha chọrọ ịrịọ, Nna m nke bi n’eluigwe ga-emere ha ya.+ 20 N’ihi na ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara n’aha m,+ anọ m ebe ahụ.”
21 Pita wee bịa, sị ya: “Onyenwe anyị, ugboro ole ka nwanna m ga-emehie m, mụ agbaghara ya? Ọ̀ bụ ugboro asaa?” 22 Jizọs sịrị ya: “Mba, ọ bụghị ugboro asaa, kama, ugboro iri asaa na asaa.+
23 “Ọ bụ ya mere na e nwere ike iji Alaeze eluigwe tụnyere otu eze, nke chọrọ ka ya na ndị ohu ya mee mpịazi. 24 Mgbe ha na ya malitere ime mpịazi, a kpọbatara otu nwoke ji ya puku mkpụrụ ego talent iri (10,000).* 25 Ma ebe ọ bụ na o nweghị otú ọ ga-esi akwụ ya, nna ya ukwu nyere iwu ka e ree ya na nwunye ya na ụmụ ya na ihe niile o nwere ka e wee kwụọ ụgwọ ahụ.+ 26 N’ihi ya, ohu ahụ dara n’ala kpọọrọ ya isiala, sị, ‘Nweere m ndidi, m ga-akwụ gị ụgwọ niile m ji gị.’ 27 Nna ukwu nke ohu ahụ wee metere ya ebere, hapụ ya ma kagbuo ụgwọ o ji ya.+ 28 Ma ohu ahụ pụrụ wee hụ otu n’ime ndị ohu ibe ya ji ya otu narị (100) mkpụrụ ego dinarịọs,* nwụchie ya, tọgidekwa ya n’akpịrị, sị, ‘Kwụọ m ụgwọ niile i ji m.’ 29 N’ihi ya, ohu ibe ya dara n’ala malite ịrịọ ya, sị, ‘Nweere m ndidi. M ga-akwụ gị ya.’ 30 Ma o kweghị, kama ọ pụrụ wee mee ka a tụba ya n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe ọ ga-akwụ ụgwọ o ji. 31 Mgbe ndị ohu ibe ya hụrụ ihe merenụ, o wutere ha nke ukwuu, ha agaa kọọrọ nna ha ukwu ihe niile merenụ. 32 Nna ya ukwu wee kpọọ ya, sị ya: ‘Ajọ ohu, mgbe ị rịọrọ m arịrịọ, m kagburu ụgwọ niile i ji m. 33 Ọ̀ bụ na gịnwa ekwesịghị imere ohu ibe gị ebere, otú ahụ m meere gị?’+ 34 Nna ya ukwu weziri iwe, nyefee ya n’aka ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ, ruo mgbe ọ ga-akwụ ụgwọ niile o ji. 35 Otú ahụ ka Nna m nke eluigwe ga-emesokwa unu+ ma ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu anaghị eji obi ya niile agbaghara nwanna ya.”+
19 Mgbe Jizọs kwuchara ihe ndị a, o si na Galili pụọ bịa n’ókè Judia, n’ofe Osimiri Jọdan.+ 2 Oké ìgwè mmadụ sokwa ya, o wee gwọọ ha n’ebe ahụ.
3 Ndị Farisii wee bịakwute ya ka ha nwaa ya. Ha sịrị ya: “Ọ̀ dị mma ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla?”+ 4 Ọ sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha ná mmalite kere ha nwoke na nwaanyị+ 5 wee sị: ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nne ya na nna ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ́’?+ 6 Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu anụ ahụ́. N’ihi ya, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”+ 7 Ha sịrị ya: “Gịnịzi mere Mosis ji kwuo na nwoke nwere ike inye nwunye ya akwụkwọ ọ ga-eji chụpụ ya ma gbaa ya alụkwaghịm?”+ 8 O wee sị ha: “Mosis kwetara ka unu na-agba nwunye unu alụkwaghịm n’ihi na obi kpọrọ unu nkụ.+ Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị ná mmalite.+ 9 Ana m asị unu na onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, wee lụọ nwaanyị ọzọ, ma ọ́ bụghị maka na nwunye ya ahụ kwara iko,* na-akwa iko.”+
10 Ndị na-eso ụzọ ya wee sị ya: “Ọ bụrụ otú a ka alụmdi na nwunye dị, ọ ka mma ka mmadụ ghara ịlụ nwaanyị.” 11 Ọ sịrị ha: “Ọ bụghị mmadụ niile ga-emeli ya, kama ọ bụ naanị ndị nwere onyinye ya.+ 12 N’ihi na e nwere ndị ọnaozi a mụrụ ka ha bụrụ ndị ọnaozi, e nwekwara ndị ụmụ mmadụ mere ka ha bụrụ ndị ọnaozi, nweekwa ndị mere onwe ha ndị ọnaozi n’ihi Alaeze eluigwe. Onye ọ bụla nke ga-emeli ya, ya mee ya.”+
13 Mgbe ahụ, a kpọtaara ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka ma kpeere ha ekpere. Ma, ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.+ 14 Ma, Jizọs sịrị ha: “Hapụnụ ụmụntakịrị ahụ. Unu egbochila ha ịbịakwute m, n’ihi na Alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otú a.”+ 15 O wee gọzie ha* ma si ebe ahụ pụọ.
16 Ma, otu onye bịakwutere ya wee sị ya: “Onye Ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m nweta ndụ ebighị ebi?”+ 17 O wee sị ya: “Gịnị mere i ji ajụ m ihe bụ́ ezi ihe? Naanị otu onye bụ ezi onye.+ Ma ọ bụrụ na ị chọrọ inweta ndụ ebighị ebi, na-edebe ihe ndị e nyere n’iwu.”+ 18 Ọ sịrị ya: “Olee ndị ọ bụ?” Jizọs wee sị ya: “Egbula mmadụ,*+ akwala iko,+ ezula ohi,+ agbala akaebe ụgha,+ 19 sọpụrụ nne gị na nna gị,+ na hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”+ 20 Nwa okorobịa ahụ wee sị ya: “M na-edebe iwu a niile. Gịnị ọzọ ka m kwesịrị ime?” 21 Jizọs sịrị ya: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ka i zuo okè, gaa ree ihe i nwere, nye ndị ogbenye ihe i retara, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe.+ Bịazie bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 22 Mgbe nwa okorobịa ahụ nụrụ ihe a, o wutere ya, ya alawa, n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe.+ 23 Jizọs gwaziri ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na ọ ga-esiri onye bara ọgaranya ike ịba n’Alaeze eluigwe.+ 24 Ana m asịkwa unu, ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga gafere karịa ọgaranya ịba n’Alaeze Chineke.”+
25 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ ihe a, o juru ha ezigbo anya, ha asị: “Ònyezi ka a ga-azọpụta?”+ 26 Jizọs legidere ha anya, sị ha: “N’anya ụmụ mmadụ, ihe a agaghị ekwe omume. Ma, ihe niile kwere Chineke omume.”+
27 Pita wee sị ya: “Ma anyị ahapụla ihe niile soro gị. Gịnịkwanụ ka anyị ga-enweta?”+ 28 Jizọs sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, mgbe a ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọdụ n’ocheeze ya dị ebube, ununwa ndị na-eso m ga-anọdụkwa n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.+ 29 Onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị nwoke ma ọ bụ ụmụnne ndị nwaanyị ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ala n’ihi aha m ga-enweta ihe karịrị ya okpukpu otu narị (100), nwetakwa ndụ ebighị ebi.+
30 “Ma ọtụtụ ndị mbụ ga-abụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị mbụ.+
20 “N’ihi na Alaeze eluigwe dị ka onyeisi ezinụlọ, onye pụrụ n’isi ụtụtụ ịga goo ndị ga-arụrụ ya ọrụ n’ubi vaịn ya.+ 2 Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwekọrịtara na ọ ga-akwụ ha otu mkpụrụ ego dinarịọs* maka otu ụbọchị, o zigara ha n’ubi vaịn ya. 3 Mgbe ọ pụkwara n’ihe dị ka n’awa nke atọ,* ọ hụrụ ndị ọzọ ka ha guzo n’ọma ahịa n’enweghị ihe ha na-arụ. 4 O wee sị ha, ‘Gaanụ n’ubi vaịn m. M ga-enye unu ihe ọ bụla kwesịrị ekwesị.’ 5 Ha wee gawa. Ọ pụrụ ọzọ n’ihe dị ka n’awa nke isii* nakwa n’awa nke itoolu* wee mee otu ihe ahụ. 6 N’ikpeazụ, ọ pụrụ n’ihe dị ka n’awa nke iri na otu* hụ ka ndị ọzọ guzo, wee sị ha, ‘Gịnị mere unu ji guzo ebe a ụbọchị niile n’enweghị ihe unu na-arụ?’ 7 Ha sịrị ya, ‘N’ihi na ọ dịghị onye goro anyị ọrụ.’ O wee sị ha, ‘Gaanụ n’ubi vaịn m.’
8 “Mgbe o ruru uhuruchi, onye nwe ubi vaịn ahụ gwara onye na-elekọtara ya ọrụ, sị, ‘Kpọọ ndị ọrụ ahụ, kwụọ ha ụgwọ ọrụ ha,+ malite n’onye ikpeazụ ruo n’onye mbụ.’ 9 Mgbe ndị awa nke iri na otu bịara, onye ọ bụla n’ime ha natara otu mkpụrụ ego dinarịọs.* 10 N’ihi ya, mgbe ndị mbụ bịara, ha chere na ha ga-anata nke ka ukwuu. Ma a kwụkwara ha otu mkpụrụ ego dinarịọs.* 11 Mgbe ha natara ya, ha malitere ịkatọ onyeisi ezinụlọ ahụ 12 wee sị ya, ‘Ndị ikpeazụ a rụrụ ọrụ otu awa. Ma, ị kwụrụ anyị ihe ị kwụrụ ha n’agbanyeghị na anyị nọ n’anwụ na-arụgbu onwe anyị n’ọrụ kemgbe ụtụtụ.’ 13 Ma ọ gwara otu n’ime ha, sị, ‘Enyi, ọ dịghị ihe ọjọọ m mere gị. Ihe mụ na gị kwekọrịtara ọ́ bụghị na m ga-akwụ gị otu mkpụrụ ego dinarịọs?*+ 14 Were ego gị lawa. Otu ihe ahụ m nyere gị ka m chọrọ inye onye ikpeazụ a. 15 Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị iji ihe m mee ihe masịrị m? Ka ị̀ na-emere m anyaụfụ* maka na m bụ ezigbo mmadụ?’*+ 16 Otú a ka ndị ikpeazụ ga-esi bụrụ ndị mbụ, ndị mbụ abụrụkwa ndị ikpeazụ.”+
17 Mgbe Jizọs na-agbago Jeruselem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya iche, wee gwa ha n’okporo ụzọ,+ sị: 18 “Lee, anyị na-agbago Jeruselem, a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ n’aka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ n’ebe ahụ. Ha ga-amakwa ya ikpe ọnwụ.+ 19 Ha ga-enyefekwa ya n’aka ndị mba ọzọ ka ha were ya mee ihe ọchị, pịakwa ya ihe ma kpọgide ya n’osisi.+ N’ụbọchị nke atọ, a ga-akpọlite ya.”+
20 Nne ụmụ Zebedi+ wee bịakwute ya, ya na ụmụ ya ndị nwoke, kpọọrọ ya isiala. Ọ bịara ịrịọ ya ka o meere ya ihe.+ 21 Jizọs sịrị ya: “Gịnị ka ị chọrọ?” Nwaanyị ahụ wee sị ya: “Kwuo ka ụmụ m ndị nwoke abụọ a soro gị nọdụ ala n’Alaeze gị, otu onye n’aka nri gị, otu onye n’aka ekpe gị.”+ 22 Jizọs wee sị: “Unu amaghị ihe unu na-arịọ. Ùnu ga-aṅụli ihe dị n’iko m na-aga ịṅụ?”+ Ha asị ya: “Anyị ga-aṅụli ya.” 23 O wee sị ha: “Unu ga-aṅụ ihe dị n’iko m na-aga ịṅụ,+ ma ọ bụghị m na-ekpebi onye ga-anọ n’aka nri m ma ọ bụ n’aka ekpe m, kama ọ dịịrị ndị Nna m kwadebeere ya.”+
24 Mgbe mmadụ iri ndị nke ọzọ nụrụ ihe a, ha wesoro ụmụnne abụọ ahụ iwe.+ 25 Ma Jizọs kpọrọ ha ka ha bịakwute ya. Ọ sịrị ha: “Unu ma na ndị na-achị ndị mba ọzọ na-eme ha ka ọ̀ bụ ha nwe ha, ndị isi ha na-ejikwa aka ike achị ha.+ 26 O kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe unu nọ.+ Kama onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ onye ukwu n’ime unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 27 Onye ọ bụla nke chọkwara ịbụ onye mbụ n’ime unu ga-abụ ohu unu.+ 28 Otú ahụ ka Nwa nke mmadụ mere. Ọ bịaghị ka e jeere ya ozi, kama ọ bịara ka o jee ozi+ ma nye ndụ* ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta maka ọtụtụ mmadụ.”+
29 Mgbe ha si Jeriko na-apụ, ìgwè mmadụ sooro ya. 30 Ma, mgbe ndị ìsì abụọ ndị nọ ọdụ n’akụkụ ụzọ nụrụ na Jizọs na-agafe, ha tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!”+ 31 Ma ìgwè mmadụ ahụ baara ha mba ka ha mechie ọnụ. Ma ha tisikwuru mkpu ike, sị: “Onyenwe anyị, Nwa Devid, meere anyị ebere!” 32 Jizọs wee kwụsị, kpọọ ha, sị: “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?” 33 Ha sịrị ya: “Onyenwe anyị, mee ka anyị hụwa ụzọ.” 34 Jizọs meteere ha ebere, bitụ ha aka n’anya,+ ha ahụwa ụzọ ozugbo wee soro ya.
21 Mgbe ha ruru Jeruselem nso, ha kwụsịrị na Betfeji, n’Ugwu Oliv. Jizọs wee zipụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya,+ 2 sị ha: “Gaanụ n’obodo a unu na-ahụ. Ozugbo unu banyere n’ime ya, unu ga-ahụ jakị e liwere eliwe na nwa jakị ya na ya nọ. Tọpụnụ ha, kpụtara m ha. 3 Ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa unu ihe ọ bụla, sịnụ ya, ‘Onyenwe anyị chọrọ ka anyị kpụta ha.’ Ọ ga-ahapụkwa ha ka unu kpụrụ ha.”
4 N’eziokwu, ihe a mere ka e wee mezuo ihe e si n’ọnụ onye amụma kwuo, sị: 5 “Sịnụ Zayọn*: ‘Eze gị na-abịakwute gị,+ onye dị nwayọọ n’obi.+ Ọ nọkwa n’elu jakị, bụ́ nwa jakị, nwa anụ na-ebu ibu.’”+
6 Ndị na-eso ụzọ ya ahụ wee gaa mee ihe Jizọs gwara ha.+ 7 Ha kpụtara jakị ahụ na nwa ya, wụsa uwe elu ha n’elu ha, o wee nọrọ n’elu nwa jakị ahụ.+ 8 Ọtụtụ n’ime ìgwè mmadụ ahụ gbasara uwe elu ha n’okporo ụzọ,+ ndị ọzọ egbute alaka osisi tụsa n’okporo ụzọ. 9 Ìgwè mmadụ ahụ, ma ndị na-aga ya n’ihu ma ndị na-eso ya n’azụ, nọ na-eti mkpu, sị: “Biko, zọpụta Nwa Devid!+ Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova* bụ onye a gọziri agọzi!+ Biko, zọpụta ya, gị onye nọ ebe kacha elu!”+
10 Mgbe ọ banyere Jeruselem, obodo ahụ niile malitere ịgba aghara, ha ana-asị: “Ònye bụ onye a?” 11 Ìgwè mmadụ ahụ nọ na-asị, “Onye a bụ Jizọs onye amụma,+ onye Nazaret dị na Galili.”
12 Jizọs wee baa n’ụlọ nsọ chụpụ ndị niile na-ere ihe na ndị niile na-azụ ihe n’ụlọ nsọ ahụ. O kpuru tebụl ndị na-agbanwe ego na oche ndị na-ere nduru ihu n’ala.+ 13 O wee sị ha: “E dere, sị, ‘A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere,’+ ma unu na-eme ya ọgba ndị ohi.”+ 14 Ndị ìsì na ndị ngwọrọ bịakwutekwara ya n’ụlọ nsọ ahụ, ya agwọọ ha.
15 Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ hụrụ ihe ịtụnanya ndị o mere nakwa ụmụntakịrị ndị nwoke na-eti mkpu n’ụlọ nsọ, sị, “Chineke biko, zọpụta Nwa Devid!”+ iwe were ha.+ 16 Ha wee sị ya: “Ị̀ na-anụ ihe ndị a na-ekwu?” Jizọs asị ha: “Ee. Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe e dere, sị, ‘I meela ka ọnụ ụmụaka na ụmụ ọhụrụ too gị’?”+ 17 Mgbe ọ hapụrụ ha, ọ pụrụ n’obodo ahụ gaa Betani, rahụkwa ebe ahụ.+
18 Mgbe ọ na-alaghachi n’obodo ahụ n’isi ụtụtụ, agụụ gụwara ya.+ 19 O wee hụ otu osisi fig n’akụkụ ụzọ wee jee na ya, ma e nweghị ihe ọ hụrụ n’elu ya ma e wezụga akwụkwọ ndụ.+ O wee sị osisi ahụ: “Amịla mkpụrụ ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.”+ Osisi fig ahụ wee kpọnwụọ ozugbo. 20 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, o juru ha anya. Ha wee sị: “Olee otú osisi fig a si kpọnwụọ ozugbo?”+ 21 Jizọs asị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụrụ na unu nwere okwukwe ma ghara inwe obi abụọ, ọ bụghị naanị na unu ga-eme ihe m mere osisi fig a, kama, ọ bụrụ na unu asị ugwu a, ‘Si ebe a pụọ daba n’oké osimiri,’ ọ ga-eme.+ 22 Unu ga-enweta ihe niile unu ji okwukwe rịọ.”+
23 Mgbe ọ banyere n’ime ụlọ nsọ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya ka ọ na-ezi ihe wee sị ya: “Ebee ka i si nweta ikike i ji eme ihe ndị a? Ònye nyekwara gị ikike ime ihe ndị a?”+ 24 Jizọs asị ha: “M ga-ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa m ya, m ga-agwazi unu ebe ikike m ji na-eme ihe ndị a si. 25 Baptizim Jọn mere ndị mmadụ, ebee ka o si? Ò si n’eluigwe, ka ò si n’aka mmadụ?” Ma ha malitere ịgwa ibe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnịzi mere na unu ekwetaghị ihe o kwuru?’+ 26 Ma, ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’aka mmadụ,’ anyị na-atụ egwu ihe ìgwè mmadụ a ga-eme anyị, n’ihi na ha niile kweere na Jọn bụ onye amụma.” 27 Ha gwaziri Jizọs, sị: “Anyị amaghị.” Ya asị ha: “M gaghịkwa agwa unu ebe ikike m ji eme ihe ndị a si.
28 “Gịnị ka unu chere? Otu nwoke mụtara ụmụ abụọ. Mgbe ọ gakwuuru onye nke mbụ, ọ sịrị ya, ‘Nwa m, gaa rụọ ọrụ taa n’ubi vaịn m.’ 29 Onye nke a asị, ‘Agaghị m aga,’ ma o mechara kwaa ụta gaa. 30 Ọ bịakwutere onye nke abụọ, gwa ya otu ihe ahụ. Onye nke a asị, ‘Nna m, m ga-aga,’ ma ọ gaghị. 31 Ònye n’ime ha abụọ mere uche nna ya?” Ha wee sị ya: “Onye nke mbụ.” Jizọs asị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu na ndị ọnaụtụ na ndị akwụna bu unu ụzọ na-abanye n’Alaeze Chineke. 32 N’ihi na Jọn bịakwutere unu, na-egosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekwereghị ya. Ma, ndị ọnaụtụ na ndị akwụna kweere ya.+ Ọ bụ eziokwu na unu hụrụ ihe a, unu akwaghị ụta n’ikpeazụ ka unu wee kwere ya.
33 “Nụrụnụ ihe atụ ọzọ: E nwere otu nwoke nwere ala, kọọ ubi vaịn na ya,+ gbaakwa ya ogige ma gwuo ebe a na-azọchapụta mmanya na ya, rụọkwa ụlọ elu na ya.+ O nyefeziri ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gaa mba ọzọ.+ 34 Mgbe oge e ji aghọ mkpụrụ vaịn ruru, o ziri ndị ohu ya ka ha gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ weta mkpụrụ ya. 35 Ma, ndị ọrụ ubi ahụ jidere ndị ohu ya, tikasịa otu ahụ́, gbuo onye nke ọzọ, tụọkwa onye nke ọzọ nkume.+ 36 O zikwara ndị ohu ọzọ, ndị dị ọtụtụ karịa ndị nke mbụ, ka ha gakwuru ha. Ma, ha mere ha otu ihe ahụ.+ 37 N’ikpeazụ, o zigaara ha ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’ 38 Mgbe ndị ọrụ ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gwara ibe ha, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-eketa ubi a.+ Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe ọ ga-eketa bụrụzie nke anyị.’ 39 Ha wee jide ya, kpọpụ ya n’ubi vaịn ahụ, gbuo ya.+ 40 N’ihi ya, mgbe onye nwe ubi vaịn ahụ bịara, gịnị ka ọ ga-eme ndị ọrụ ubi ahụ?” 41 Ha asị ya: “Ebe ọ bụ na ha bụ ndị ọjọọ, ọ ga-abịa laa ha n’iyi, nyefeekwa ubi vaịn ahụ n’aka ndị ọrụ ubi ọzọ, ndị ga-enye ya mkpụrụ ya mgbe oge ya ruru.”
42 Jizọs wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ, sị, ‘Nkume ndị na-arụ ụlọ jụrụ aghọọla nkume ji ụlọ.+ Ihe a si n’aka Jehova,* ọ dịkwa ebube n’anya anyị’?+ 43 Ọ bụ ya mere m ji asị unu, a ga-anapụ unu Alaeze Chineke, werekwa ya nye ndị na-eme uche Chineke.* 44 Onye dakwara n’elu nkume a ga-akụri.+ Nkume a ga-egwerikwa onye ọ bụla ọ dakwasịrị.”+
45 Mgbe ndị isi nchụàjà na ndị Farisii nụrụ ihe atụ a o mere, ha matara na ọ na-ekwu banyere ha.+ 46 Ọ bụ eziokwu na ha chọrọ ijide ya, ha tụrụ egwu ihe ìgwè mmadụ ahụ ga-eme ha, n’ihi na ha kweere na ọ bụ onye amụma.+
22 Jizọs meere ha ihe atụ ọzọ, sị: 2 “E nwere ike iji Alaeze eluigwe tụnyere otu eze nke meere nwa ya nwoke oriri agbamakwụkwọ.+ 3 O wee zie ndị ohu ya ka ha gaa kpọọ ndị ọ kpọrọ òkù ịbịa oriri agbamakwụkwọ ahụ, ma ha ekweghị abịa.+ 4 O zikwara ndị ohu ya ndị ọzọ, sị ha, ‘Gwanụ ndị ahụ a kpọrọ òkù, sị: “Akwadebela m nri. E gbuola oké ehi na anụ ndị gbara agba. A kwadebekwala ihe niile. Bịanụ oriri agbamakwụkwọ a.”’ 5 Ma ha leghaara ya anya wee gawa mkpa ha, otu onye n’ubi ya, onye ọzọ n’ahịa ya.+ 6 Ma ndị fọdụrụ jidere ndị ohu ya, mee ha ihe ihere ma gbuo ha.
7 “Ma eze ahụ were iwe, ziga ndị agha ya, ha egbuo ndị ahụ gburu ndị ohu ya, gbaakwa obodo ha ọkụ.+ 8 O wee sị ndị ohu ya, ‘A kwadebela oriri agbamakwụkwọ a. Ma, ndị a kpọrọ òkù erughị eru ịbịa ya.+ 9 N’ihi ya, gaanụ n’okporo ụzọ ndị e si apụ n’obodo, kpọọkwanụ onye ọ bụla unu hụrụ ka ọ bịa oriri agbamakwụkwọ a.’+ 10 N’ihi ya, ndị ohu ahụ gara n’okporo ụzọ wee kpọkọọ ndị niile ha hụrụ, ma ndị ọjọọ ma ndị ọma. Ọnụ ụlọ a nọ na-eme ememme agbamakwụkwọ ahụ wee jupụta ná ndị nọ na-eri ihe.
11 “Mgbe eze ahụ batara inyocha ndị ọbịa ahụ, ọ hụrụ otu nwoke na-eyighị uwe agbamakwụkwọ. 12 O wee sị ya, ‘Enyi, olee otú i si bata ebe a n’eyighị uwe agbamakwụkwọ?’ Ma, okwu ekweghị ya okwukwu. 13 Eze ahụ gwaziri ndị na-ejere ya ozi, sị, ‘Keenụ ya agbụ ụkwụ na aka ma tụpụ ya n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ọ ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé.’
14 “N’ihi na ndị a kpọrọ òkù dị ọtụtụ, ma ole na ole ka a họọrọ.”
15 Ndị Farisii gaziri gbaa izu ka ha jiri ihe ọ ga-ekwu mata ya n’ọnyà.+ 16 Ha wee zigara ya ndị na-eso ụzọ ha, tinyere ndị òtù Herọd,+ wee sị ya: “Onye Ozizi, anyị ma na ị na-ekwu eziokwu. Ihe ị na-akụzi banyere Chineke bụkwa eziokwu. Ị naghịkwa asọ onye ọ bụla anya n’ihi na ị naghị ele mmadụ anya n’ihu. 17 Gwazie anyị, gịnị ka i chere? È kwesịrị ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na e kwesịghị?” 18 Ma ebe Jizọs ma nkata ọjọọ ha na-akpa, ọ sịrị ha: “Ndị ihu abụọ, gịnị mere unu ji anwa m? 19 Gosinụ m mkpụrụ ego e ji atụ ụtụ isi.” Ha wee wetara ya otu mkpụrụ ego dinarịọs.* 20 O wee sị ha: “Isi ònye na aha ònye dị n’ego a?” 21 Ha asị ya: “Ọ bụ nke Siza.” Ya asịzie ha: “N’ihi ya, kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”+ 22 Mgbe ha nụrụ ya, ọ tụrụ ha n’anya, ha ahapụ ya pụọ.
23 N’ụbọchị ahụ, ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite n’ọnwụ adịghị,+ bịara jụọ ya, sị:+ 24 “Onye Ozizi, Mosis sịrị: ‘Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’amụtaghị ụmụ, nwanne ya nwoke ga-alụwa nwunye ya wee mụtara nwanne ya nwoke nwa.’+ 25 Ma, e nwere ụmụnne asaa. Nke mbụ lụrụ nwaanyị ma nwụọ n’amụtaghị nwa, nwanne ya nwoke alụwazie nwunye ya. 26 Otu ihe ahụ mere onye nke abụọ, meekwa onye nke atọ, ruo mgbe o mechara mmadụ asaa ahụ niile. 27 N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ nwụkwara. 28 N’ihi ya, a kpọlite ha n’ọnwụ, ònye n’ime mmadụ asaa ahụ ka ọ ga-abụ nwunye ya, ebe ọ bụ na ha niile lụchara ya?”
29 Jizọs wee sị ha: “Unu furu ụzọ, n’ihi na unu amaghị Akwụkwọ Nsọ, unu amaghịkwa otú ike Chineke si arụ ọrụ.+ 30 N’ihi na mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ụmụ nwoke agaghị alụ nwaanyị, a gaghịkwa eke ụmụ nwaanyị di, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe.+ 31 Ọ̀ bụ na unu agụbeghị ihe Chineke gwara unu gbasara ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ? Ọ sịrị: 32 ‘Abụ m Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’+ Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ.”+ 33 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ nụrụ ya, otú o si ezi ihe eju ha anya.+
34 Mgbe ndị Farisii nụrụ na o mechiela ndị Sadusii ọnụ, ha niile bịakwutere ya. 35 Otu n’ime ha ma Iwu* nke ọma jụrụ ya ajụjụ iji nwaa ya. Ọ jụrụ ya, sị: 36 “Onye Ozizi, olee iwu kacha iwu niile n’Iwu Mosis?”+ 37 O wee sị ya: “‘Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile na uche gị niile hụ Jehova* bụ́ Chineke gị n’anya.’+ 38 Ọ bụ ya bụ iwu kacha iwu niile, bụrụkwa nke mbụ. 39 Nke abụọ, dị ka ya, bụ: ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.’+ 40 Ọ bụ n’iwu abụọ a ka Iwu ahụ niile na Akwụkwọ Ndị Amụma hiwere isi.”+
41 Mgbe ndị Farisii zukọtara, Jizọs jụrụ ha, sị:+ 42 “Gịnị ka unu chere banyere Kraịst? Nwa ònye ka ọ bụ?” Ha asị ya: “Nwa Devid.”+ 43 Ọ jụziri ha, sị: “Oleezi otú o si bụrụ na Devid si n’ike mmụọ nsọ+ kpọọ ya Onyenwe m, sị, 44 ‘Jehova* gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-eme ka ndị iro gị nọrọ n’okpuru ụkwụ gị”’?+ 45 Ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya Onyenwe m, oleezi otú o si bụrụ nwa ya?”+ 46 Ọ dịghị onye nwere ike ịza ya ihe ọ bụla. Malitekwa n’ụbọchị ahụ gawa, ọ dịghị onye nwara ịjụ ya ajụjụ ọzọ.
23 Jizọs gwaziri ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya, sị: 2 “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii agaala nọrọ n’oche Mosis. 3 N’ihi ya, ihe niile ha na-agwa unu, meenụ ha. Ma unu emela ihe ha na-eme, n’ihi na ha na-ekwu ma ha anaghị eme ihe ha na-ekwu.+ 4 Ha na-ekekọta ibu dị arọ dọkwasị n’ubu ndị mmadụ,+ ma hanwa anaghị achọ ịrụtụ ha mkpịsị aka ha.+ 5 Ha na-achọ ka ndị mmadụ hụ ihe niile ha na-eme,+ n’ihi na ha na-eme ka mkpọ̀* ha na-ekekwasị n’egedege ihu ha na n’aka ekpe ha+ bukwuo ibu, na-emekwa ka ọnụ ọnụ uwe ha dịkwuo ogologo.+ 6 Ọ na-atọ ha ụtọ ịnọ n’isi oche ná nri anyasị nakwa n’oche ihu* n’ụlọ nzukọ+ 7 nakwa ka a na-ekele ha n’ọma ahịa, ka ndị mmadụ na-akpọkwa ha Onye Ozizi.* 8 Ma unu ekwela ka a na-akpọ unu Onye Ozizi,*+ n’ihi na otu onye bụ Onye Ozizi unu, ma unu niile bụ ụmụnna. 9 Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu,+ Onye bi n’eluigwe. 10 Unu ekwekwala ka a na-akpọ unu ndị ndú, n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst. 11 Ma onye kacha ukwuu n’etiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.+ 12 Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala.+ Onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.+
13 “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ, unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-emechi ụzọ Alaeze eluigwe n’ihu ndị mmadụ. Unu anaghị abanye, unu anaghịkwa ekwe ka ndị chọrọ ịbanye banye.+ 14* ——
15 “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ,+ unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-agafe oké osimiri, na-agakwa ebe niile iji tọghata otu onye. Mgbe unu tọghatara ya, unu na-eme ka ọ bụrụ onye a ga-atụba na Gehena* okpukpu abụọ karịa unu.
16 “Ndị ndú kpuru ìsì,+ unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-asị, ‘Onye ọ bụla nke ji ụlọ nsọ ṅụọ iyi emeghị ihe ọjọọ, ma onye ọ bụla nke ji ọlaedo dị n’ụlọ nsọ ṅụọ iyi adaala iwu.’+ 17 Ndị nzuzu na ndị ìsì! Oleedị nke ka ibe ya? Ọ̀ bụ ọlaedo, ka ọ̀ bụ ụlọ nsọ nke mere ka ọlaedo ahụ dị nsọ? 18 Unu na-asịkwa, ‘Onye ọ bụla nke ji ebe ịchụàjà ṅụọ iyi emeghị ihe ọjọọ, ma onye ọ bụla nke ji onyinye dị n’elu ya ṅụọ iyi adaala iwu.’ 19 Ndị ìsì! Oleedị nke ka ibe ya? Ọ̀ bụ onyinye, ka ọ̀ bụ ebe ịchụàjà nke mere ka onyinye ahụ dị nsọ? 20 N’ihi ya, onye ọ bụla ji ebe ịchụàjà ṅụọ iyi ji ya na ihe niile dị n’elu ya ṅụọ iyi. 21 Onye ọ bụla ji ụlọ nsọ ṅụọ iyi jikwa Onye bi na ya ṅụọ iyi.+ 22 Onye jikwa eluigwe ṅụọ iyi ji ocheeze Chineke na Onye nọ na ya ṅụọ iyi.
23 “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu bụ ndị ihu abụọ. Unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke mkpá akwụkwọ mint nakwa mkpá akwụkwọ dil nakwa mkpụrụ kọmin,+ ma unu na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu* anya, ya bụ, ikpe ziri ezi+ na ebere+ na ikwesị ntụkwasị obi. Unu kwesịrị ịna-enye otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ndị ahụ, ma unu ekwesịghị ileghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu anya.+ 24 Ndị ndú kpuru ìsì,+ unu na-azapụ anwụnta+ ma na-eloda kamel.+
25 “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu bụ ndị ihu abụọ. Unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu dị ka iko na efere azụ ha dị ọcha,+ ma ime ha ruru unyi. Ihe juru unu n’obi bụ anyaukwu+ na ime ihe na-amasị unu.+ 26 Ndị Farisii kpuru ìsì, burunụ ụzọ mee ka ime iko na ime efere dị ọcha, ka azụ ha wee dịkwa ọcha.
27 “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu bụ ndị ihu abụọ.+ Unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu yiri ili e tere nzu,+ nke na-eyi ihe mara mma n’elu ma ime ya ejupụta n’ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ nakwa n’ụdị adịghị ọcha ọ bụla. 28 Otú ahụkwa ka unu na-eyi ndị ezi omume n’anya ndị mmadụ, ma ihe juru n’ime unu bụ ihu abụọ na mmebi iwu.+
29 “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu bụ ndị ihu abụọ.+ Unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu na-arụ ili ndị amụma ma na-achọ ili* ndị ezi omume mma.+ 30 Unu na-asịkwa, ‘Ọ bụrụ na anyị nọ n’oge nna nna anyị hà, anyị agaraghị eso ha gbuo* ndị amụma.’ 31 N’ihi ya, unu na-agba akaebe na unu bụ ụmụ ndị gburu ndị amụma.+ 32 Ebe ọ dị otú ahụ, rụchaanụ ọrụ nna nna unu hà bidoro.*
33 “Unu agwọ, ụmụ ajụala,+ olee otú unu ga-esi ghara iso ná ndị a ga-ekpe ikpe tụba na Gehena?*+ 34 N’ihi ya, m na-ezitere unu ndị amụma+ na ndị ma ihe na ndị na-ezi ihe n’ihu ọha.+ Unu ga-egbu ụfọdụ n’ime ha,+ kpọgidekwa ha n’osisi, unu ga-apịakwa ụfọdụ n’ime ha ihe+ n’ụlọ nzukọ unu, kpagbuokwa ha+ si n’obodo ruo n’obodo, 35 ka ọbara ndị ezi omume niile e gburu* n’ụwa wee dị n’isi unu, malite n’ọbara Ebel onye ezi omume+ ruo n’ọbara Zekaraya nwa Barakaya, onye unu gburu n’agbata ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà.+ 36 N’eziokwu, ana m asị unu, a ga-ata ọgbọ a ahụhụ maka ihe ndị a niile.
37 “Jeruselem, Jeruselem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-atụkwa ndị e ziteere ya nkume,+ achọọla m ịchịkọta ụmụ gị ọtụtụ ugboro dị ka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya, ma ị chọghị ya.+ 38 A hapụrụla unu ụlọ unu.*+ 39 N’ihi na ana m asị unu, unu agaghị ahụ m malite ugbu a ruo mgbe unu ga-asị, ‘Onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova* bụ onye a gọziri agọzi.”’+
24 Ka Jizọs si n’ụlọ nsọ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya ka ha gosi ya ihe niile a rụrụ n’ụlọ nsọ ahụ. 2 O wee sị ha: “Ùnu na-ahụ ihe ndị a niile? N’eziokwu, ana m asị unu na a ga-akwatucha nkume ndị a. E nweghị otu a ga-ahapụ n’elu ibe ya.”+
3 Mgbe ọ nọ ọdụ n’Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya naanị ha, sị ya: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-eme? Gịnị ga-abụkwa ihe àmà nke ọnụnọ*+ gị na nke ọgwụgwụ oge a?”*+
4 Jizọs zara ha, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu.+ 5 N’ihi na ọtụtụ ndị ga-abịa n’aha m, sị, ‘Abụ m Kraịst.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị.+ 6 Unu ga-anụ mkpọtụ agha na akụkọ agha. Unu atụla ụjọ, n’ihi na ihe ndị a ga-emerịrị. Ma ọgwụgwụ erubeghị.+
7 “N’ihi na mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha.+ A ga-enwekwa ụkọ nri+ na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche.+ 8 Ihe ndị a niile bụ mmalite ihe mgbu.*
9 “Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-enyefe unu n’aka ndị ga-akpagbu unu,+ ha ga-egbukwa unu.+ Mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.+ 10 Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị ga-akwụsị ife Chineke, rara ibe ha nye, kpọọkwa ibe ha asị. 11 A ga-enwe ọtụtụ ndị amụma ụgha, ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị.+ 12 Ịhụnanya ọtụtụ ndị ga-ajụkwa oyi n’ihi otú mmebi iwu si ju ebe niile. 13 Ma, ọ bụ onye tachiri obi* ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.+ 14 A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà,+ mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.
15 “N’ihi ya, mgbe unu hụrụ ihe arụ nke na-akpata mbibi, nke Daniel onye amụma kwuru banyere ya, ka o guzo n’ebe nsọ,+ (onye na-agụ ya, ya gbalịa ghọta ya nke ọma), 16 ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu.+ 17 Ka onye nọ n’elu ụlọ ghara ịrịdata ka o buru ngwongwo n’ụlọ ya. 18 Onye nọ n’ubi, ya alaghachikwala n’ụlọ ka ọ chịrị uwe elu ya. 19 Ụmụ nwaanyị dị ime na ndị ji nwa n’aka n’oge ahụ ga-ata ahụhụ. 20 Na-ekpenụ ekpere ka oge unu ga-agbapụ ghara ịbụ n’oge oyi ma ọ bụ n’Ụbọchị Izu Ike. 21 N’ihi na mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu+ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, a gaghịkwa enwe ya ọzọ.+ 22 N’eziokwu, ọ bụrụ na e meghị ka oge ahụ dị mkpirikpi, e nweghị onye a ga-azọpụta. Ma n’ihi ndị a họọrọ, a ga-eme ka oge ahụ dị mkpirikpi.+
23 “Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ n’ebe a,’+ ma ọ bụ, ‘Ọ nọ n’ebe ahụ,’ unu ekwela.+ 24 N’ihi na a ga-enwe Kraịst ụgha dị iche iche na ndị amụma ụgha.+ Ha ga na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube ma na-eme ihe ịtụnanya dị iche iche iji duhie ndị Chineke họọrọ,+ ma o kwe ha omume. 25 Chetanụ na mụ ebula ụzọ dọọ unu aka ná ntị. 26 N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị mmadụ asị unu, ‘Ọ nọ n’ala ịkpa,’ unu agala ebe ahụ. Ha sịkwa, ‘Ọ nọ n’ọnụ ụlọ dị n’ime,’ unu ekwela.+ 27 N’ihi na dị ka àmụ̀mà na-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ apụta ma gbuo ruo n’ebe ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka ọnụnọ* Nwa nke mmadụ ga-adị.+ 28 Ebe ọ bụla ozu dị, ebe ahụ ka ugo ga-ezukọta.+
29 “Ozugbo mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ gachara, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,+ ọnwa ga-akwụsịkwa ịgba. Kpakpando ga-esi n’eluigwe daa, a ga-emekwa ka ihe* ndị dị n’eluigwe maa jijiji.+ 30 Mgbe ahụ, ihe àmà Nwa nke mmadụ ga-apụta n’eluigwe, ebo niile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ruo uju.+ Ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ+ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu.+ 31 Ọ ga-ejikwa ụda opi na-adasi ike zipụ ndị mmụọ ozi ya. Ha ga-esikwa n’akụkụ anọ nke ụwa* chịkọta ndị ọ họọrọ, si n’otu nsọtụ eluigwe ruo na nsọtụ ya nke ọzọ.+
32 “Sinụ n’osisi fig mụta ihe: Ozugbo alaka ọhụrụ ya dịwara nro ma pupụtawa akwụkwọ, unu na-ama na oge osisi ji amị mkpụrụ eruwela.+ 33 Ma ununwa, mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a niile na-eme, maranụ na Nwa nke mmadụ nọ nso n’ọnụ ụzọ.+ 34 N’eziokwu, ana m asị unu na e nweghị ihe ga-eme ka ọgbọ a nwụchaa ruo mgbe ihe ndị a niile mere. 35 Eluigwe na ụwa ga-ala n’iyi.* Ma, e nweghị ihe ga-eme ka okwu m laa n’iyi.*+
36 “E nweghị onye ma ụbọchị na awa ọ ga-abụ.+ Ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe amaghị, Ọkpara ahụ amaghịkwa, kama naanị Nna m ma.+ 37 N’ihi na otú ihe dị n’oge Noa+ ka ọ ga-adị n’ọnụnọ* Nwa nke mmadụ.+ 38 N’ihi na dị ka ha nọ n’oge ahụ tupu Iju Mmiri, na-eri, na-aṅụ, ndị nwoke ana-alụ nwaanyị, a na-ekekwa ụmụ nwaanyị di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ,+ 39 ha amaghịkwa ruo mgbe Iju Mmiri ahụ bịara kpochapụ ha niile,+ otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị. 40 Mgbe ahụ, ụmụ nwoke abụọ ga-anọ n’ubi. A ga-akpọrọ otu onye, hapụ onye nke ọzọ. 41 Ụmụ nwaanyị abụọ ga na-egwe nri na nkume e ji egwe nri. A ga-akpọrọ otu onye, hapụ onye nke ọzọ.+ 42 N’ihi ya, na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.+
43 “Ma maranụ otu ihe a: A sị na onyeisi ezinụlọ ma oge nche onye ohi ga-eji abịa,*+ ọ gaara amụrụ anya ma ghara ikwe ka ọ bata n’ụlọ ya.+ 44 N’ihi ya, dịrịnụ njikere,+ n’ihi na Nwa nke mmadụ ga-abịa n’oge unu na-echeghị na ọ ga-abụ.
45 “Ònye n’eziokwu bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,* onye nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?+ 46 Ohu ahụ ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ.+ 47 N’eziokwu, ana m asị unu, ọ ga-eme ya onye na-elekọta ihe niile o nwere.
48 “Ma ọ bụrụ na ajọ ohu ekwuo n’obi ya, sị, ‘Nna m ukwu na-egbu oge,’+ 49 wee malite iti ndị ohu ibe ya ihe, sorokwa ndị aṅụrụma a ma ama na-eri, na-aṅụkwa, 50 nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya nakwa n’oge ọ na-amaghị.+ 51 Ọ ga-atakwa ya ezigbo ahụhụ ma tụba ya n’ebe ndị ihu abụọ nọ. N’ebe ahụ ka ọ ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé.+
25 “E nwere ike iji Alaeze eluigwe tụnyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke, ndị buuru mpanaka* ha+ gaa izute nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ.+ 2 Ise n’ime ha dị nzuzu, ma ise nwere uche.*+ 3 Ndị nzuzu ahụ buuru mpanaka ha, ma ha ejighị mmanụ ọ bụla. 4 Ma ndị ahụ nwere uche ji mmanụ ha gbanyere n’ihe ha ji agbanye mmanụ, jirikwa mpanaka ha. 5 Mgbe nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ nọ na-egbu oge, ha niile hulatara isi malite ihi ụra. 6 N’etiti abalị, e tiri mkpu, sị, ‘Nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ abịawala! Pụtanụ ka unu zute ya.’ 7 Mgbe ahụ, ụmụ agbọghọ ahụ niile na-amaghị nwoke biliri kwadebe mpanaka ha.+ 8 Ndị nzuzu ahụ gwara ndị ahụ nwere uche, sị, ‘Gbanyetụnụ anyị mmanụ unu, n’ihi na ọkụ anyị agawala ịnyụ.’ 9 Ndị ahụ nwere uche sịrị ha: ‘O nwere ike ọ gaghị ezuru anyị na unu. Gakwurunụ ndị na-ere mmanụ, zụrụ nke unu.’ 10 Mgbe ha na-aga ịzụta mmanụ, nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere. Ụmụ agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke, ndị dị njikere, sooro ya banye n’oriri agbamakwụkwọ ahụ,+ e wee mechie ụzọ. 11 N’ikpeazụ, ụmụ agbọghọ ise ndị nke ọzọ na-amaghị nwoke bịakwara, sị, ‘Nna anyị ukwu, Nna anyị ukwu, megheere anyị ụzọ!’+ 12 O wee sị ha, ‘Ana m agwa unu eziokwu, amaghị m ndị unu bụ.’
13 “N’ihi ya, na-echenụ nche,+ maka na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge ọ ga-abụ.+
14 “N’ihi na ọ dị ka nwoke na-achọ ije mba ọzọ wee kpọkọta ndị ohu ya ma nyefee ha ihe ndị o nwere.+ 15 O nyere otu onye talent* ise, nye onye nke ọzọ abụọ, nyekwa onye nke ọzọ otu. O nyere onye nke ọ bụla dị ka ike ya hà, wee jewe mba ọzọ. 16 Ozugbo ahụ, onye natara talent ise gara jiri ya zụọ ahịa ma rite ise ọzọ n’uru. 17 Onye natakwara abụọ ritere abụọ ọzọ n’uru. 18 Ma ohu nke natara naanị otu gara gwuo ala zoo ego* nna ya ukwu.
19 “Mgbe ogologo oge gachara, nna ukwu ndị ohu ahụ lọtara, ya na ha emee mpịazi.+ 20 N’ihi ya, onye natara talent ise bịara weta talent ise ọzọ, sị, ‘Nna m ukwu, i nyere m talent ise, ma, eritere m talent ise ọzọ n’uru.’+ 21 Nna ya ukwu wee sị ya: ‘I mere nke ọma, ezigbo ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe.+ Soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’+ 22 E mechaa, onye natara talent abụọ bịara, sị, ‘Nna m ukwu, i nyere m talent abụọ, ma, eritere m talent abụọ ọzọ n’uru.’+ 23 Nna ya ukwu sịrị ya: ‘I mere nke ọma, ezigbo ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe. Soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’
24 “N’ikpeazụ, ohu nke natara otu talent bịara, sị: ‘Nna m ukwu, ama m na ị bụ onye aka ike, nke na-aghọrọ mkpụrụ ebe ọ na-akụghị mkpụrụ, onye na-ekpokọtakwa mkpụrụ ebe ọ na-afụchaghị mkpụrụ.+ 25 N’ihi ya, atụrụ m egwu wee gaa zoo talent gị n’ala. Wekwara ihe gị.’ 26 Nna ya ukwu asị ya: ‘Ajọ ohu nke dị umengwụ, ị̀ na-ekwu na ị ma na m na-aghọrọ mkpụrụ ebe m na-akụghị mkpụrụ, na-ekpokọtakwa mkpụrụ ebe m na-afụchaghị mkpụrụ? 27 Ebe ị ma otú ahụ, ị gaara etinye ego* m n’ụlọ akụ̀. Mgbe m bịara, m gaara anata ya na ọmụrụ nwa ya.
28 “‘N’ihi ya, natanụ ya talent ahụ nye onye ahụ nke nwere talent iri.+ 29 N’ihi na onye ọ bụla nke nwere ihe, a ga-enyekwu ya, ọ ga-enwekwa ihe n’uju. Ma onye na-enweghị, a ga-anapụdị ya nke o nwere enwe.+ 30 Chụpụkwanụ ohu a na-abaghị uru ọ bụla n’ọchịchịrị dị n’èzí. N’ebe ahụ ka ọ ga-anọ na-ebe ákwá, na-atakwa ikikere ezé.’
31 “Mgbe Nwa nke mmadụ+ ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile,+ ọ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya dị ebube. 32 A ga-emekwa ka mba niile zukọta n’ihu ya. Ọ ga-eke ndị mmadụ ụzọ abụọ, otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ si esi n’ebe ewu nọ họpụta atụrụ iche. 33 Ọ ga-eme ka atụrụ+ nọrọ n’aka nri ya, meekwa ka ewu nọrọ n’aka ekpe ya.+
34 “Mgbe ahụ, Eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri ya: ‘Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi. Ketanụ Alaeze a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa. 35 N’ihi na agụụ gụrụ m, unu enye m nri ka m rie. Mmiri gụrụ m, unu ekunye m mmiri ka m ṅụọ. Abụ m ọbịa, unu anabata m nke ọma.+ 36 Agba m ọtọ, unu eyiwe m uwe.+ Arịara m ọrịa, unu elekọta m. Anọ m n’ụlọ mkpọrọ, unu abịa leta m.’+ 37 Mgbe ahụ, ndị ezi omume ga-asị ya: ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agụ gị nye gị nri, ma ọ bụ ka mmiri na-agụ gị kunye gị mmiri ka ị ṅụọ?+ 38 Olee mgbe anyị hụrụ gị ka ị bụ ọbịa wee nabata gị nke ọma, ma ọ bụ ka ị gba ọtọ wee yiwe gị uwe? 39 Olee mgbe anyị hụrụ gị ka ị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ ka ị nọ n’ụlọ mkpọrọ wee leta gị?’ 40 Eze ahụ ga-asị ha, ‘N’eziokwu, ana m asị unu, ọ bụ m ka unu meere ihe ọ bụla unu meere otu n’ime ndị kacha nta n’ime ụmụnna m ndị a.’+
41 “Mgbe ahụ, ọ ga-asị ndị nọ n’aka ekpe ya: ‘Sinụ ebe m nọ pụọ,+ unu ndị a bụrụ ọnụ. Banyenụ n’ọkụ ebighị ebi*+ a kwadebeere Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.+ 42 N’ihi na agụụ gụrụ m, ma ọ dịghị nri unu nyere m ka m rie. Mmiri gụrụ m, ma ọ dịghị mmiri unu kunyere m ka m ṅụọ. 43 Abụ m ọbịa, ma unu anabataghị m nke ọma. Agba m ọtọ, ma unu eyiweghị m uwe. Arịara m ọrịa, nọrọkwa n’ụlọ mkpọrọ, ma unu elekọtaghị m.’ 44 Mgbe ahụ, ha ga-asị ya: ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka mmiri na-agụ gị, ma ọ bụ ka ị bụ ọbịa, ma ọ bụ ka ị gba ọtọ, ma ọ bụ ka ị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ ka ị nọ n’ụlọ mkpọrọ ma ghara ijere gị ozi?’ 45 Mgbe ahụ, ọ ga-asị ha: ‘N’eziokwu, ana m asị unu, ebe unu na-emereghị ya otu n’ime ndị a kacha nta, unu emereghị m ya.’+ 46 Ndị a ga-anwụ ruo mgbe ebighị ebi,*+ ma ndị ezi omume ga-enweta ndụ ebighị ebi.”+
26 Mgbe Jizọs kwuchara ihe a niile, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: 2 “Unu ma na ọ fọrọ abalị abụọ ka e mee Ememme Ngabiga,+ a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ ka e gbuo ya n’elu osisi.”+
3 Ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu wee zukọta na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Kayafas+ 4 ma gbaa izu+ otú ha ga-esi jiri aghụghọ jide Jizọs, gbuokwa ya. 5 Ma, ha nọ na-asị: “Ọ bụghị n’oge ememme a, ka ndị mmadụ ghara ịgbawa aghara.”
6 Mgbe Jizọs nọ na Betani, n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta,+ 7 otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta,* nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya, bịakwute ya. Mmanụ ahụ dịkwa oké ọnụ. Nwaanyị ahụ wee malite ịwụkwasị ya n’isi ya ka ọ nọ na-eri ihe. 8 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, ha were iwe, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a n’iyi? 9 N’ihi na a gaara ereta ya ezigbo ego ma nye ya ndị ogbenye.” 10 Ebe Jizọs ma ihe ha na-ekwu, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-enye nwaanyị a nsogbu? O meere m ihe ọma. 11 N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.+ 12 Nwaanyị a tere m mmanụ a na-esi ísì ọma ka ọ kwadebe m maka olili.+ 13 N’eziokwu, ana m asị unu na n’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile, a ga na-akọ ihe nwaanyị a mere, jiri ya na-echeta ya.”+
14 Otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt,+ gakwuuru ndị isi nchụàjà+ 15 wee sị ha: “Gịnị ka unu ga-enye m ka m rara ya nye n’aka unu?”+ Ha wee kwekọrịta inye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.+ 16 N’ihi ya, malite mgbe ahụ gawa, ọ nọ na-achọ oge ga-adaba adaba ọ ga-eji rara ya nye.
17 N’ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere ya, sị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị kwadebere gị ka ị nọrọ rie nri Ememme Ngabiga?”+ 18 O wee sị ha: “Banyenụ n’ime obodo, n’ụlọ onye dị otú a. Sịnụ ya, ‘Onye Ozizi sịrị: “Oge m a kara aka dị nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eme Ememme Ngabiga n’ụlọ gị.”’” 19 Ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe ọ gwara ha, kwadebekwa maka Ememme Ngabiga ahụ.
20 Mgbe o ruru ná mgbede,+ ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọ na-eri ihe na tebụl.+ 21 Mgbe ha nọ na-eri ihe, ọ sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, otu onye n’ime unu ga-arara m nye.”+ 22 Ihe a wutere ha nke ukwuu. Ha niile n’otu n’otu amalite ịsị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m?” 23 O wee sị ha: “Ọ bụ onye mụ na ya ga-amanyekọ aka n’efere ga-arara m nye.+ 24 N’eziokwu, Nwa nke mmadụ na-ahapụ unu, otú e dere banyere ya. Ma, onye ga-arara Nwa nke mmadụ nye+ ga-ata ahụhụ.+ Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”+ 25 Judas, onye na-aga ịrara ya nye, wee sị ya: “Onye Ozizi,* ọ̀ bụ m?” Jizọs asị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.”*
26 Mgbe ha nọ na-eri ihe, Jizọs weere otu ogbe achịcha. Mgbe ọ gọzichara ya, ọ nyawara ya,+ nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị ha: “Naranụ, taa. Nke a pụtara ahụ́ m.”+ 27 O bukwaara iko, kelee Chineke, bunyekwa ha ya, sị: “Unu niile, ṅụọnụ ihe dị na ya,+ 28 n’ihi na nke a pụtara ọbara m,+ bụ́ ‘ọbara ọgbụgba ndụ’+ nke a ga-awụpụ ka e wee gbaghara ọtụtụ ndị+ mmehie ha.+ 29 Ma ana m asị unu na agaghị m aṅụ mmanya si ná mkpụrụ vaịn ọzọ ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ nke ọhụrụ n’Alaeze Nna m.”+ 30 N’ikpeazụ, mgbe ha bụchara abụ otuto,* ha gawara n’Ugwu Oliv.+
31 Jizọs gwaziri ha, sị: “Unu niile ga-ahapụ m n’abalị a, n’ihi na e dere, sị: ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ, ìgwè atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’+ 32 Ma, a kpọlitechaa m n’ọnwụ, m ga-ebu unu ụzọ gaa Galili.”+ 33 Ma Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị, o nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị.”+ 34 Jizọs wee sị ya: “N’eziokwu, ana m asị gị, n’abalị a, tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ 35 Pita asị ya: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, e nweghị ihe ga-eme ka m gọnahụ gị.”+ Ndị ọzọ niile na-eso ụzọ ya kwukwara otu ihe ahụ.
36 Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya bịaziri ebe a na-akpọ Getsemeni.+ O wee sị ha: “Nọdụnụ ala ebe a ka m gaa ebe nke ọzọ kpee ekpere.”+ 37 Ọ kpọọrọ Pita na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitekwara ichegbu onwe ya nke ukwuu.+ 38 O wee sị ha: “Ọ na-ewutesi m ike.* Nọrọnụ ebe a, sorokwanụ m na-eche nche.”+ 39 Mgbe ọ gatụrụ n’ihu, o gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpee ekpere, sị:+ “Nna m, ọ bụrụ na o kwe mee, ka m ghara ịṅụ ihe dị n’iko a.+ Ma, ọ bụghị ka e mee ihe m chọrọ, kama ka ihe ị chọrọ mee.”+
40 Ọ bịaghachiri n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ ma hụ ka ha na-ehi ụra. O wee sị Pita: “Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iso m chee nche ọ bụrụgodị otu awa?+ 41 Na-echenụ nche,+ na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile,+ ka a ghara ịnwata unu.+ N’eziokwu, ọ na-agụ mmadụ ime ihe dị mma,* ma anụ ahụ́ ya adịghị ike.”+ 42 Ọ gara ọzọ kpee ekpere nke ugboro abụọ, sị: “Nna m, ọ bụrụ na ọ gaghị ekwe omume ka m ghara ịṅụ ihe dị n’iko a, ka uche gị mee.”+ 43 Ọ bịaghachikwara hụ ka ha na-ehi ụra, n’ihi na ụra ji ha aka ọjọọ. 44 Ọ hapụrụ ha ọzọ pụọ gaa kpee ekpere nke ugbo atọ, kwughachi otu ihe ahụ. 45 Ọ bịaghachiri ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, sị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezukwa ike. Oge eruola ka a rara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie. 46 Bilienụ ka anyị pụọ. Lee, onye ga-arara m nye abịala nso.” 47 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas, otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, bịara, ya na ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na okpiri. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu dunyere ha.+
48 Onye ga-arara ya nye nyere ha ihe àmà, sị: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya. Jidenụ ya.” 49 O wee gakwuru Jizọs, sị: “Onye Ozizi,* ndeewo.” O wee jiri nwayọọ susuo ya ọnụ. 50 Ma Jizọs sịrị ya: “Enyi, gịnị mere i ji bịa ebe a?”+ Ha wee bịa jide Jizọs, kpụrụ ya. 51 Ma, otu n’ime ndị so Jizọs mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà, bepụ ya ntị.+ 52 Jizọs wee sị ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya,+ n’ihi na ndị niile na-egbu ndị ọzọ mma agha ga-esi ná mma agha laa n’iyi.+ 53 Ka ì chere na mụ agaghị arịọli Nna m ka o zitere m ọtụtụ puku* ndị mmụọ ozi ugbu a?+ 54 Ya dị otú ahụ, oleezi otú Akwụkwọ Nsọ, nke kwuru na ihe ga-esi otú a mee, ga-esi mezuo?” 55 Jizọs gwaziri ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m ka à ga-asị na unu bịara ijide onye ohi? M na-anọdụ ala kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ, na-ezi ihe,+ ma unu ejideghị m.+ 56 Ma ihe a niile mere ka ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.”+ Ndị na-eso ụzọ ya niile wee hapụ ya gbaa ọsọ.+
57 Ndị jidere Jizọs duuru ya gakwuru Kayafas,+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà, ebe ndị odeakwụkwọ na ndị okenye zukọtara.+ 58 Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ya n’azụ, ruo na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà ahụ. Mgbe ọ banyere n’ime, o so ndị na-eje ozi n’ụlọ nọrọ ọdụ ka ọ hụ ihe ga-emecha mee.+
59 N’oge ahụ, ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ so ná ndị Sanhedrin* nọ na-achọgharị ebubo ha ga-ebo Jizọs ka ha wee gbuo ya.+ 60 Ma ha achọtaghị, ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara.+ E mechaa, mmadụ abụọ pụtara 61 wee sị: “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọ nsọ Chineke ma jiri ụbọchị atọ rụghachi ya.’”+ 62 Nnukwu onye nchụàjà wee bilie ọtọ, sị ya: “Ị̀ gbara nkịtị? Ị́ nụghị ebubo ndị a na-ebo gị?”+ 63 Ma Jizọs gbachiri nkịtị.+ N’ihi ya, nnukwu onye nchụàjà ahụ sịrị ya: “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi na ị ga-agwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.”+ 64 Jizọs asị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.* Ma ana m asị unu: Si ugbu a gawa, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri Chineke dị ike*+ ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+ 65 Nnukwu onye nchụàjà wee dọwaa uwe elu ya, sị: “O kwuluola Chineke! Ànyị ka kwesịrị ịchọwa ndị akaebe? Unu anụlanụ na o kwuluola Chineke. 66 Gịnị ka unu chere?” Ha asị: “O kwesịrị ịnwụ.”+ 67 Ha gbụrụ ya asọ mmiri n’ihu+ ma suo ya ọkpọ.+ Ndị ọzọ mara ya ụra n’ihu,+ 68 sị ya: “Kraịst, buoro anyị amụma. Ònye tiri gị ihe?”
69 Pita nọkwa ọdụ na mbara èzí ahụ. Otu nwa agbọghọ na-eje ozi ebe ahụ wee bịakwute ya, sị: “Gị na Jizọs onye Galili na-anọ.”+ 70 Ma ọ gọrọ agọ n’ihu ha niile, sị: “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” 71 Mgbe ọ gara n’ọnụ ụzọ ámá, nwa agbọghọ ọzọ matara na ọ bụ ya wee gwa ndị nọ ebe ahụ, sị: “Nwoke a na Jizọs onye Nazaret na-anọ.”+ 72 Ọ gọkwara agọ, ṅụọ iyi, sị: “Amaghị m nwoke ahụ.” 73 Mgbe obere oge gachara, ndị guzo gburugburu bịara sị Pita: “O doro anya na ị bụ otu n’ime ha, n’ihi na n’eziokwu, asụsụ gị agbaala gị àmà.” 74 Ọ maliteziri ịbụ onwe ya ọnụ na ịṅụ iyi, na-asị: “Amaghị m nwoke ahụ.” Ozugbo ahụ, oké ọkpa akwaa. 75 Pita wee cheta na Jizọs sịrị: “Tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ O wee pụọ n’èzí bee ezigbo ákwá.
27 Mgbe o ruru n’ụtụtụ, ndị isi nchụàjà na ndị okenye niile nke ndị Juu gbara izu ka e gbuo Jizọs.+ 2 Mgbe ha kechara ya agbụ, ha kpụụrụ ya pụọ, nyefee ya n’aka Paịlet, bụ́ gọvanọ.+
3 Mgbe Judas, onye raara ya nye, hụrụ na a maala Jizọs ikpe ọnwụ, ọ kwara mmakwaara ma chịghachiri ndị isi nchụàjà na ndị okenye mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ,+ 4 sị: “Emehiere m mgbe m nyefere unu onye aka ya dị ọcha ka unu gbuo.” Ha wee sị: “Nke ahụ gbasara gị. Ọ gbasaghị anyị.” 5 O wee wụsa mkpụrụ ego ọlaọcha ndị ahụ n’ụlọ nsọ, pụọ gaa kwụgbuo onwe ya.+ 6 Ma ndị isi nchụàjà chịịrị mkpụrụ ego ọlaọcha ahụ, sị: “Ọ dịghị mma ịwụnye ha n’ebe dị nsọ a na-edebe ego, n’ihi na ọ bụ ego ọbara.” 7 Mgbe ha gbachara izu, ha ji ego ahụ zụọ ala onye ọkpụite, ebe ha ga na-eli ndị bịara abịa. 8 Ọ bụ ya mere e ji akpọ ala ahụ Ala Ọbara+ ruo taa. 9 Mgbe ahụ, ihe e si n’ọnụ Jeremaya* onye amụma kwuo mezuru. Ọ sịrị: “Ha wee chịrị mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ahụ, bụ́ ego ole a kwụrụ n’isi onye e rere ere, onye ụfọdụ ndị Izrel kwuru ego ole a ga-ere ya. 10 Ha ji ya zụta ala onye ọkpụite, dị ka Jehova* nyere m n’iwu.”+
11 Mgbe Jizọs guzo n’ihu gọvanọ, gọvanọ jụrụ ya, sị: “Ị̀ bụ Eze ndị Juu?” Jizọs asị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.”*+ 12 Ma mgbe ndị isi nchụàjà na ndị okenye na-ebo ya ebubo, o kwughị ihe ọ bụla.+ 13 Paịlet wee sị ya: “Ị́ naghị anụ ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị?” 14 Ma ọ tụpụrụghị ya ọnụ, nke mere na o juru gọvanọ ahụ anya nke ukwuu.
15 Mgbe ọ bụla a na-eme Ememme Ngabiga, gọvanọ ahụ na-ahapụrụ ìgwè mmadụ ahụ otu onye mkpọrọ ha chọrọ.+ 16 N’oge ahụ, e nwere otu onye omekome a tụrụ mkpọrọ. Aha ya bụ Barabas. 17 N’ihi ya, mgbe ha zukọtara, Paịlet sịrị ha: “Olee onye nke unu chọrọ ka m hapụrụ unu? Ọ̀ bụ Barabas ka ọ̀ bụ Jizọs, onye a sị na ọ bụ Kraịst?” 18 N’ihi na Paịlet ma na ọ bụ anyaụfụ mere ha ji nyefee ya n’aka ya. 19 Mgbe ọ nọkwa ọdụ n’oche ikpe, nwunye ya ziteere ya ozi, sị: “Ya enwekwala ihe ị ga-eme onye ezi omume ahụ, maka na ahụsiri m anya taa ná nrọ n’ihi ya.” 20 Ma, ndị isi nchụàjà na ndị okenye gwara ìgwè mmadụ ahụ ka ha kwuo ka e gbuo Jizọs,+ hapụrụ ha Barabas.+ 21 Gọvanọ ahụ jụrụ ha, sị: “Ònye n’ime ha abụọ ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu?” Ha asị: “Barabas.” 22 Paịlet wee sị ha: “Gịnịzi ka m ga-eme Jizọs, onye a sị na ọ bụ Kraịst?” Ha niile asị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+ 23 O wee sị: “Maka gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha nọ na-etikwu mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”+
24 Mgbe Paịlet hụrụ na mbọ niile ọ na-agba enweghị isi, kama nke ahụ, ụzụ na-arị ibe ya elu, o ji mmiri kwọọ aka n’ihu ìgwè mmadụ ahụ ma sị ha: “Aka m adịghịkwa n’ọbara nwoke a. Ihe gbasara ya dịzi unu n’aka.” 25 Ìgwè mmadụ ahụ niile asị ya: “Ka ọbara ya dị n’isi anyị, dịkwa n’isi ụmụ anyị.”+ 26 O wee hapụrụ ha Barabas, ma nyefee Jizọs n’aka ndị agha ka ha pịa ya ụtarị,+ gbuokwa ya n’elu osisi.+
27 Mgbe ahụ, ndị agha gọvanọ kpọọrọ Jizọs banye n’ụlọ gọvanọ ma mee ka ndị agha gbaa ya gburugburu.+ 28 Ha yipụrụ ya ákwà, gbokwasị ya ákwà na-acha uhie uhie.*+ 29 Ha ji ogwu kpaa okpueze, kpuwe ya n’isi, nyekwa ya okporo ahịhịa amị n’aka nri ya. Ha gbuuru ya ikpere n’ala, na-akwa ya emo, sị: “Eze ndị Juu, ndeewo.” 30 Ha gbụrụ ya asọ mmiri,+ werekwa okporo ahịhịa amị ahụ na-eti ya n’isi. 31 N’ikpeazụ, mgbe ha kwachara ya emo, ha yipụrụ ya ákwà mgbokwasị ahụ ma yiwe ya uwe elu ya, kpụrụkwa ya pụọ ịga kpọgide ya n’osisi.+
32 Mgbe ha na-apụ, ha hụrụ otu nwoke onye Saịrini aha ya bụ Saịmọn. Ha manyere ya ka o buru osisi ịta ahụhụ* Jizọs.+ 33 Mgbe ha bịarutere ebe a na-akpọ Gọlgọta, ya bụ, Ebe Okpokoro Isi,+ 34 ha nyere Jizọs mmanya a gwara ihe na-elu ilu ka ọ ṅụọ.+ Ma, mgbe o detụrụ ya ọnụ, o kweghị aṅụ ya. 35 Mgbe ha kpọgidere ya n’osisi, ha fere nza kee uwe elu ya.+ 36 Ha nọdụrụ ala ebe ahụ na-eche ya nche. 37 Ha debekwara ihe e dere ebubo e boro ya n’elu osisi a kpọgidere ya. Ihe e dere na ya bụ: “Onye a bụ Jizọs, Eze ndị Juu.”+
38 N’ụbọchị ahụ, e nwere ndị ohi abụọ a kpọgidekwara n’osisi n’akụkụ ya, otu n’aka nri ya, otu n’aka ekpe ya.+ 39 Ndị na-agafe agafe nọ na-akparị ya,+ na-efufe isi ha,+ 40 na-asị: “Gị onye ga-akwatu ụlọ nsọ ma rụghachi ya n’ụbọchị atọ,+ zọpụtanụ onwe gị. Ọ bụrụ na ị bụ ọkpara Chineke, si n’osisi ịta ahụhụ* ahụ rịdata.”+ 41 Otú ahụkwa ka ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye si na-akwa ya emo, na-asị:+ 42 “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ọ bụ Eze Izrel.+ Ya si n’osisi ịta ahụhụ* rịdata, anyị ga-ekwerekwa na ya. 43 Ọ tụkwasịrị Chineke obi. Ya napụta ya ugbu a ma ọ bụrụ na ihe ya masịrị ya,+ n’ihi na ọ sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke.’”+ 44 Otú ahụkwa ka ndị ohi ahụ a kpọgidere n’osisi n’akụkụ ya si na-akparị ya.+
45 Ọchịchịrị gbara n’ala ahụ niile malite n’awa nke isii* ruo n’awa nke itoolu.*+ 46 N’ihe dị ka n’awa nke itoolu, Jizọs tiri mkpu n’oké olu, sị: “Eli, Eli, lama sabaktani?” ya bụ, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?”+ 47 Mgbe ụfọdụ n’ime ndị guzo ebe ahụ nụrụ ihe a, ha malitere ịsị: “Nwoke a na-akpọ Ịlaịja.”+ 48 Ozugbo ahụ, otu onye n’ime ha gbaara ọsọ were ogbo,* mikpuo ya n’ime mmanya gbara ụka, dokwasị ya n’okporo amị, nyekwa ya ka ọ ṅụọ.+ 49 Ma ndị ọzọ sịrị: “Hapụnụ ya. Ka anyị hụ ma Ịlaịja ọ̀ ga-abịa zọpụta ya.” 50 Jizọs tiri mkpu ọzọ n’oké olu, wee kubie ume.+
51 Ma, ákwà mgbochi nke dị n’ụlọ nsọ+ dọwara ụzọ abụọ+ si n’elu ruo n’ala.+ Ala wee maa jijiji, oké nkume agbawasịakwa. 52 Ili* dị iche iche meghere, ọtụtụ ozu ndị nsọ nwụrụ anwụ adapụta, 53 ọtụtụ ndị hụkwara ha. (Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ụfọdụ ndị gara ebe ahụ a na-eli ozu pụtara banye n’obodo nsọ.) 54 Ma mgbe onyeisi ndị agha na ndị ha na ya na-eche Jizọs nche hụrụ ala ọma jijiji ahụ na ihe ndị ọzọ na-emenụ, ezigbo ụjọ tụrụ ha, ha asị: “N’eziokwu, onye a bụ Ọkpara Chineke.”+
55 Ọtụtụ ụmụ nwaanyị nọkwa ebe dị anya na-ele anya. Ha so Jizọs mgbe o si na Galili pụta ka ha wee na-ejere ya ozi.+ 56 Ụfọdụ n’ime ha bụ Meri Magdalin, na Meri nne Jems na Josis, na nne ụmụ Zebedi.+
57 Ma mgbe o ruru mgbede, otu nwoke bara ọgaranya bịara. Ọ bụ onye Arimatia. Aha ya bụ Josef, ọ bụkwa onye na-eso ụzọ Jizọs.+ 58 Nwoke a gakwuuru Paịlet rịọ ya ka e bunye ya ozu Jizọs.+ Paịlet wee gwa ndị agha ahụ ka ha bunye ya ozu ahụ.+ 59 Josef buuru ozu ahụ, fụchie ya ezigbo ákwà linin dị ọcha,+ 60 liekwa ya n’ili* ọhụrụ+ o gwuru n’oké nkume. Ọ kwaara nnukwu nkume kwachie ọnụ ụzọ ili* ahụ lawa. 61 Ma Meri Magdalin na Meri nke ọzọ nọgidere ebe ahụ, nọdụ ala n’ihu ili ahụ.+
62 Ihe ndị a mere n’ụbọchị e ji akwadebe maka Ụbọchị Izu Ike.+ N’echi ya, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii gakwuuru Paịlet, 63 sị ya: “Nna anyị ukwu, anyị chetara na onye nduhie ahụ kwuru mgbe ọ ka nọ ndụ, sị, ‘Mgbe ụbọchị atọ gachara, a ga-akpọlite m.’+ 64 N’ihi ya, kwuo ka a na-eche ili ahụ nche ruo n’ụbọchị nke atọ, ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịbịa zuru ya+ ma gwa ndị mmadụ, sị, ‘A kpọlitela ya n’ọnwụ.’ Nduhie nke ikpeazụ a ga-akakwa nke mbụ njọ.” 65 Paịlet asị ha: “Unu nwere ndị nche. Gaanụ chee ya nche otú ọ bụla unu ma unu ga-esi chee ya.” 66 Ha wee gaa jiri nkume mechisie ili ahụ ike, dowekwa ndị nche na ya.
28 Mgbe Ụbọchị Izu Ike gachara, n’isi ụtụtụ ụbọchị mbụ n’izu,* Meri Magdalin na Meri nke ọzọ bịara ile ili ahụ.+
2 Ma, oké ala ọma jijiji mere, n’ihi na mmụọ ozi Jehova* si n’eluigwe gbadata kwapụ nkume ahụ, nọdụkwa n’elu ya.+ 3 Mmụọ ozi ahụ na-egbuke ka àmụ̀mà, uwe ya na-achakwa ọcha ka snoo.+ 4 Ndị nche ahụ mara jijiji, dịkwa ka ndị nwụrụ anwụ n’ihi egwu ha tụrụ ya.
5 Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwaanyị ahụ, sị: “Unu atụla egwu, n’ihi na ama m na unu na-achọ Jizọs, onye e gburu n’elu osisi.+ 6 Ọ nọghị ebe a, n’ihi na a kpọlitere ya, dị ka o kwuru.+ Bịanụ lee ebe ọ tọgbọbu. 7 Gaakwanụ ọsọ ọsọ kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya na a kpọlitela ya n’ọnwụ, n’ihi na o burula unu ụzọ gawa Galili.+ Unu ga-ahụ ya ebe ahụ. Chetakwanụ ihe m gwara unu.”+
8 N’ihi ya, ha ji egwu na ezigbo aṅụrị hapụ ili* ahụ ọsọ ọsọ, gbara ọsọ gaa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya.+ 9 Ma, Jizọs zutere ha wee sị: “Ndeewonụ.” Ha abịa jide ya n’ụkwụ, kpọọrọ ya isiala. 10 Jizọs wee sị ha: “Ụjọ atụla unu. Gaanụ kọọrọ ụmụnna m ka ha gaa Galili. Ebe ahụ ka ha ga-ahụ m.”
11 Mgbe ha nọ n’ụzọ, ụfọdụ n’ime ndị nche ahụ+ banyere n’ime obodo kọọrọ ndị isi nchụàjà ihe niile mere. 12 Mgbe ha na ndị okenye zukọrọ ma gbaa izu, ha nyere ndị agha ahụ ọkpụrụkpụ ego* 13 wee sị: “Kwuonụ, sị, ‘Ndị na-eso ụzọ ya bịara n’abalị zuru ya mgbe anyị na-ehi ụra.’+ 14 Unu echegbula onwe unu. Ọ bụrụ na okwu a eruo gọvanọ ntị, anyị ga-akọrọ ya ihe mere.”* 15 N’ihi ya, ha naara ego* ahụ, mee ihe a gwara ha. A gbasakwara okwu a ebe niile n’etiti ndị Juu ruo taa.
16 Ma, mmadụ iri na otu ahụ na-eso ụzọ Jizọs banyere Galili+ gaa n’ugwu ebe Jizọs gwara ha ka ha zukọọ.+ 17 Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọọrọ ya isiala. Ma ụfọdụ ekwetaghị na ọ bụ ya. 18 Jizọs wee bịakwute ha, sị ha: “E nyela m ike niile n’eluigwe na n’elu ụwa.+ 19 N’ihi ya, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.+ Na-eme ha baptizim+ n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. 20 Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.+ M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.”*+
Ma ọ bụ “Akwụkwọ usoro ọmụmụ.”
Ma ọ bụ “Mezaya; Onye E Tere Mmanụ.”
Na Baịbụl a, aha Chineke bụ́ Jehova gbara ugboro 237 n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Nke a bụ nke mbụ ya. Gụọ A5.
Jizọs na aha Hibru bụ́ Jeshụa, ma ọ bụ Joshụa, pụtara otu ihe. Ọ pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Mezaya; Onye E Tere Mmanụ.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ọ ga-abụ na e si n’okwu Hibru a sụgharịrị “ome” nweta okwu bụ́ “onye Nazaret.”
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “na-emikpu ha.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “fee m otu ugboro.”
Gụọ A5.
Ọ bụ ọdọ mmiri. Baịbụl kpọkwara ya Ọdọ Mmiri Genesaret na Oké Osimiri Taịbirias.
Ma ọ bụ “Obodo Nwere Obodo Nta Iri.”
Ma ọ bụ “ndị na-arịọ ka e nye ha mmụọ nsọ.”
Ma ọ bụ “mpanaka; oriọna.”
Ya bụ, “onye na-erughị eru ịbanye n’Alaeze.”
Ya bụ, “onye ruru eru ịbanye n’Alaeze.”
Ma ọ bụ “Egbula ọchụ.”
Gehena bụ ebe a na-akpọ ihe ndị e kpofuru ekpofu ọkụ n’azụ mgbidi Jeruselem. Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “mkpụrụ ego kwọdrans ikpeazụ.” Gụọ B14.
Na Grik, “na-eme ka ị daa.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “na-eme ka ị daa.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, nwaanyị a gbara alụkwaghịm, ma, ọ bụghị n’ihi na ọ kwara iko.
Gụọ A5.
Gụọ B14.
Ya bụ, ibiri gị ego n’akwụghị ọmụrụ nwa.
Ma ọ bụ “na-enye ndị ogbenye onyinye.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Ka uche gị mee ma n’eluigwe ma n’ụwa.”
Na Grik, “Ewebala anyị n’ọnwụnwa.”
Ma ọ bụ “ha na-adị nkịrịka nkịrịka.”
N’ala Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.
Ma ọ bụ “anya gị na-ahụ ụzọ nke ọma.”
Ma ọ bụ “ga na-enwu gbaa.”
Na Grik, “Ma ọ bụrụ na anya gị dị njọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Gụọ B14.
“Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma” pụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.
Ma ọ bụ “obi ji na-amapụ unu.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “a na-emegbu ha.”
Na Grik, “ndị mmụọ na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “uwe ọzọ.”
Ihe ndị Juu na-ekele ibe ha bụ, “udo dịrị gị.”
Ma ọ bụ “onye na-atachi obi.”
Bielzebọb bụ aha a na-akpọ Setan, bụ́ onyeisi ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ onye na-achị ha.
Ma ọ bụ “ha agaghị egbochili mmadụ inwe olileanya ịdị ndụ ọzọ.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “otu mkpụrụ ego asariọn.” Gụọ B14.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “Onye na-enweghị ihe mere ọ ga-eji hapụ inwe okwukwe na m.”
Ma ọ bụ “uwe dị yọrịị.”
Na Grik, “na-ezipụ onye ozi m n’ihu gị.”
“Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma” pụtara Akwụkwọ Nsọ Hibru niile.
Ma ọ bụ “unu etighị aka n’obi n’iru uju.”
Ma ọ bụ “na Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “Ọkpara ahụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Bielzebọb bụ aha a na-akpọ Setan.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Oge a.”
Na Grik, “nke na-akwa iko.”
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “kemgbe a tọrọ ntọala ụwa.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ọ bụ Herọd Antipas. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “gọzie ha.”
Na Grik, “ọtụtụ stediọm.” Otu stediọm bụ mita 185 (amaụkwụ 606.95). Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.
Ya bụ, malite n’ihe dị ka elekere atọ n’ime abalị ruo n’ihe dị ka elekere isii nke ụtụtụ.
Ya bụ, ịkwọ aka otú ọdịnala ndị Juu si kwuo.
Ma ọ bụ “onye kparịrị nne ya ma ọ bụ nna ya.”
Ma ọ bụ “igbu ọchụ.”
Grik, por·nei′a. Di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko sokwa na ya. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, akwọghị aka otú ọdịnala ndị Juu si kwuo.
Na Grik, “nke na-akwa iko.”
Ma ọ bụ “n’ihi na ọ bụghị mmadụ.”
Ma ọ bụ “Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ana-achakwa ọcha.”
Gụọ A3.
Gụọ B14.
Na Grik, “mkpụrụ ego steta.” Ọ ga-abụ na ọ bụ ya bụ tetradrakma. Gụọ B14.
Na Grik, “na-eme ka ị daa.”
Ọ pụtara mbibi ebighị ebi. Gụọ Nkọwa Okwu, “Ọdọ ọkụ.”
Na Grik, “na-eme ka ị daa.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A3.
O nwere ike ịbụ, “Nna unu.”
Na Grik, “n’ọnụ.”
Mkpụrụ ego talent ọlaọcha 10,000 bụ dinarịọs 60,000,000. Gụọ B14.
Gụọ B14.
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Na Grik, “bikwasị ha aka n’isi.”
Ma ọ bụ “Egbula ọchụ.”
Gụọ B14.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere ise nke mgbede.
Gụọ B14.
Gụọ B14.
Gụọ B14.
Na Grik, “anya gị ọ̀ dị njọ.”
Ma ọ bụ “m na-emesapụ aka.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Grik, “ada bụ́ Zayọn.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “mba nke na-amị mkpụrụ ya.”
Gụọ B14.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A5.
Gụọ A5.
A na-etinye amaokwu Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ ná mkpọ̀ a. Ndị Juu na-eji ya emere ọtụmọkpọ na-echebe ha.
Ma ọ bụ “n’ebe kacha mma.”
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A3.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, Iwu Mosis.
Ma ọ bụ “ili ncheta.”
Na Grik, “wụfuo ọbara.”
Na Grik, “meenụ ka ihe nna nna unu hà ji atụ̀ ihe ju eju.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “a wụfuru.”
O nwere ike ịbụ, “A hapụrụla unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ nkịtị.”
Gụọ A5.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, ụdị ihe mgbu nwaanyị na-enwe ma ọ mụwa nwa.
Ma ọ bụ “onye na-atachi obi.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “ike.”
Na Grik, “n’ifufe anọ.”
O nwere ike ịbụ ndị na-achị achị na ndị ha na-achị n’ụwa ọjọọ a ka a na-ekwu maka ha.
Ma ọ bụ “ghara imezu.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “oge onye ohi ga-eji abịa n’abalị.”
Ma ọ bụ “ma ihe.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “ma ihe.”
Otu talent ndị Grik bụ kilogram 20.4. Gụọ B14.
Na Grik, “ọlaọcha.”
Na Grik, “ọlaọcha.”
Ọ pụtara mbibi ebighị ebi. Gụọ Nkọwa Okwu, “Ọdọ ọkụ.”
Na Grik, “A ga-egbupụ ha ruo mgbe ebighị ebi,” otú ahụ e si egbupụ alaka osisi.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.
Ma ọ bụ “abụ ọma.”
Na Grik, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ.”
Na Grik, “mmụọ dị njikere.”
Na Grik, “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “ụsụụ iri na abụọ.” Otu ụsụụ ndị agha ndị Rom n’oge ochie na-adị malite n’ihe dị ka puku anọ ruo puku isii. Na Baịbụl, “ụsụụ” nwere ike ịbụ ihe a na-agaghị agụtali ọnụ.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.
Na Grik, “n’aka nri nke ike.”
Amụma a dị na Zekaraya 11:12, 13. N’oge Matiu, Jeremaya bụ akwụkwọ mbụ n’akwụkwọ ndị amụma niile. Ọ ga-abụkwa na ọ bụ “Jeremaya” ka a na-akpọ ha niile, tinyere Zekaraya. Gụọ Luk 24:44.
Gụọ A5.
Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.
Ma ọ bụ “Gbuo ya n’elu osisi!”
Ma ọ bụ “na-acha ọbara ọbara.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere iri na abụọ nke ehihie.
Ya bụ, ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.
Ma ọ bụ “sapo.”
Ma ọ bụ “Ili ncheta.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ma ọ bụ “ili ncheta.”
Ihe a na-akpọ ụbọchị a ugbu a bụ Sọnde. Ọ bụ ya bụ ụbọchị mbụ n’izu ndị Juu.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “ili ncheta.”
Na Grik, “mkpụrụ ego ọlaọcha hiri nne.”
Na Grik, “anyị ga-arịọ ya arịrịọ.”
Na Grik, “mkpụrụ ego ọlaọcha.”
Gụọ Nkọwa Okwu.