AỊZAYA
1 Ọhụụ Aịzaya*+ nwa Emọz hụrụ gbasara Juda na Jeruselem n’oge Ọzaya,+ Jotam,+ Ehaz,+ na Hezekaya,+ na-achị ndị Juda:+
3 Ehi na-ama onye zụrụ ya,
Jakị na-amakwa ihe onye nwe ya ji etinyere ya nri.
Ndị m anaghị akpa àgwà ka ndị ma ihe.”
4 Unu ga-ata ahụhụ, unu mba na-eme mmehie,+
Ndị mmehie na-anyịgbu,
Ndị na-eme ihe ọjọọ, ndị rụkwara arụ.
Unu hapụrụ Jehova.+
Unu akparịala Onye Nsọ Izrel,
Gbakụtakwa ya azụ.
5 Olee ebe fọrọ n’ahụ́ unu a na-etibeghị ihe? Gịnị mere unu ka ji na-enupụ isi?+
E merụrụ unu ahụ́ n’isi unu niile.
Unu na-arịakwa ọrịa obi.+
6 O nweghị ebe dị mma n’ahụ́ unu, malite n’ụkwụ unu ruo n’isi unu.
Unu merụrụ ahụ́, ahụ́ unu echihịachaa bụrụ ọnyá ọnyá.
E meghị ha ọgwụ. E kechighị ha ihe. E teghịkwa ha mmanụ.+
7 Ala unu atọgbọrọla chakoo.
A gbaala obodo unu dị iche iche ọkụ.
Ndị mba ọzọ nọ n’ihu unu na-eri ihe ala unu mepụtara,+
Ebe niile atọgbọrọ chakoo ka ebe ndị iro bibiri.+
8 A hapụla Zayọn ka ọ dị ka ụlọ ndò dị n’ubi vaịn,
Ka ọ dị ka obere ụlọ dị n’ubi kukumba,
Nakwa ka obodo a nọchibidoro anọchibido.+
9 A sị na Jehova nke ụsụụ ndị agha emeghị ka mmadụ ole na ole n’ime anyị fọdụ,
Anyị gaara adị nnọọ ka Sọdọm,
Anyị gakwaara adị ka Gọmọra.+
10 Unu ndị ọchịchị aka ike na-achị Sọdọm,+ nụrụnụ okwu Jehova.
Unu ndị Gọmọra,+ geenụ ntị n’iwu* Chineke anyị.
11 Jehova kwuru, sị: “Olee uru ọtụtụ àjà unu na-achụ baara m?+
Àjà a na-esu ọkụ unu ji ebule achụrụ m+ nakwa nke unu ji abụba anụmanụ ndị ọzọ kacha mma achụrụ m+ agbụla m.
Ọbara+ oké ehi+ na nke nwa atụrụ na nke ewu+ anaghịkwa atọ m ụtọ.
13 Kwụsịnụ ịchụrụ m àjà na-abaghị uru unu ji ọka* achụ.
Insens* unu na-amụnye bụkwa arụ n’anya m.+
Unu na-eme ememme ụbọchị ọnwa ọhụrụ,+ na-edebe ụbọchị izu ike,+ na-agbakọkwa ime ememme dị iche iche.+
Agaghị m anabata ememme ndị a unu na-eme, ebe ọ bụ na unu na-eme anwansi.*+
14 M* kpọrọ ememme ụbọchị ọnwa ọhụrụ unu na-eme na ememme ndị ọzọ unu na-eme asị.
Ha bụụrụ m ibu arọ.
Ike ibu ha agwụkwala m.
Aka unu bụ ọbara ọbara.+
16 Saanụ ahụ́. Dowenụ onwe unu ọcha.+
Kwụsịnụ omume ọjọọ unu nọ n’ihu m eme.
Kwụsịnụ ime ihe ọjọọ.+
17 Mụtanụ ime ihe ọma. Na-ekpenụ ikpe ziri ezi.+
Gwanụ onye na-emegbu mmadụ ka ọ gbanwee.
Gbachiterenụ nwa na-enweghị nna.*
Kpechitekwanụ ọnụ nwaanyị isi mkpe.”+
18 Jehova kwuru, sị: “Bịanụ ka anyị kpezie.+
Ọ bụrụgodị na mmehie unu na-acha uhie uhie,
M ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.+
Ọ bụrụgodị na ọ na-acha ọbara ọbara ka ákwà uhie,
Ọ ga-adị ka ajị ọcha.
21 Obodo na-erubeburu Chineke isi+ na-agbazi akwụna.+
A na-ekpebu ikpe ziri ezi na gị.+
Ezi omume bibu ebi n’ime gị.+
Ma ugbu a, ọ bụ ndị na-egbu mmadụ* bizi n’ime gị.+
22 Ọlaọcha dị na gị ataala nchara.+
E jirila mmiri gwagbuo mmanya ọka wit gị.
23 Ndị isi nọ na gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+
Ịna aka azụ* na-amasị onye ọ bụla n’ime ha. Ha na-achọkwa ka e nye ha onyinye.+
Ha anaghị ekpere nwa na-enweghị nna* ikpe ziri ezi,
Nwaanyị isi mkpe nwee okwu, ha anaghị eleba ya anya.+
24 N’ihi ya, ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,
Dike ndị Izrel, kwuru, sị:
“M ga-eme ka ndị iro m kwụsị inye m nsogbu.
M ga-atakwa ha ahụhụ.+
25 M ga-emesi gị ike.
M ga-anụcha gị otú e si anụcha ọla, gị adị ọcha ka ihe e ji ncha saa.
M ga-asapụkwa unyi niile dị gị n’ahụ́.+
26 M ga-eme ka i nwee ndị ikpe otú i nweburu.
M ga-emekwa ka i nwee ndị ndụmọdụ otú i nwere na mbụ.+
Mgbe ahụzi ka a ga-akpọwa gị Obodo Na-eme Ezi Omume nakwa Obodo Na-erubere Chineke Isi.+
28 A ga-ebibi ndị nnupụisi na ndị mmehie n’otu mgbe.+
Ndị hapụrụ Jehova ga-alakwa n’iyi.+
29 N’ihi na oké osisi ndị na-agụ unu agụụ ga-eme ha ihere.+
Ihere ga-emekwa unu n’ihi ubi* ndị unu họọrọ.+
31 Onye siri ike ga-aghọ ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ihe ndị ọ na-eme ga-aghọkwa icheku ọkụ.
Ha abụọ ga na-ere ọkụ otu mgbe.
E nweghịkwa onye ga-emenyụ ha.”
2 Ihe a ka Aịzaya nwa Emọz hụrụ n’ọhụụ gbasara Juda na Jeruselem:+
A ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile.
Mba niile ga-enurukwa na-agbago na ya.+
3 Ọtụtụ ndị ga-ejekwa, sị:
“Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova,
Gbagookwa n’ụlọ Chineke Jekọb.+
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya.
Anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”+
4 Ọ ga-ekpere mba dị iche iche ikpe,
Doziekwara ọtụtụ ndị okwu ha.
Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,
Kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.+
Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha.
Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.+
6 Chineke, ị hapụla ndị gị, bụ́ ndị ezinụlọ Jekọb,+
N’ihi na ha emewela ọtụtụ ihe a na-eme n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.
Ha na-eme anwansi*+ ka ndị Filistia.
Ha na ụmụ ndị ala ọzọ bikwa.
7 Ọlaọcha na ọlaedo juru eju n’obodo ha.
Akụ̀ ha anaghịkwa agwụ agwụ.
Ịnyịnya juru eju n’obodo ha.
Ụgbọ ịnyịnya ha bụkwa agụta agụta.+
8 Chi dị iche iche na-abaghị uru juru n’obodo ha.+
Ihe ha na-akpọrọ isiala bụ ihe ha ji aka ha rụọ,
Ya bụ, ihe mkpịsị aka ha rụrụ.
9 Otú a ka ha si eweda onwe ha ala, na-emenyekwa onwe ha ihere.
Ị gaghịkwa agbaghara ha.
10 Banyenụ n’ọgba nkume, zookwanụ n’ájá
N’ihi na ike Jehova na-emenye ụjọ.
Ọ dị ebube, bụrụkwa onye ukwu.+
11 A ga-eme ka ndị dị mpako dị ala.
A ga-ewedakwa ndị dị elu ala.
Ọ bụ naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ.
12 N’ihi na ọ bụ ụbọchị Jehova nke ụsụụ ndị agha.+
Ọ ga-abịa n’ihi ndị niile dị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu.
Ọ ga-abịakwa n’ihi mmadụ niile, ma onye ukwu ma onye nta.+
13 Ọ ga-abịa n’ihi osisi sida niile dị na Lebanọn, ma ndị nke dị elu ma ndị nke e buliri elu.
Ọ ga-abịakwa n’ihi osisi ook niile dị na Beshan.
14 Ụbọchị ahụ ga-abịakwa n’ihi ugwu ukwu niile dị elu
Na ugwu nta niile dị elu.
15 Ọ ga-abịakwa n’ihi ụlọ nche niile dị elu, nakwa n’ihi mgbidi niile a rụsiri ike.
16 Ọ ga-abịakwa n’ihi ụgbọ mmiri niile na-aga Tashish+
Nakwa n’ihi ụgbọ epeepe niile mara ezigbo mma.
17 A ga-eme ka ndị dị mpako dị ala.
A ga-ewedakwa ndị dị elu ala.
Ọ bụ naanị Jehova ka a ga-ebuli elu n’ụbọchị ahụ.
18 A gaghị ahụkwa chi dị iche iche na-abaghị uru.+
19 Mgbe Jehova ga-ebili mee ka ụwa maa jijiji,
Ndị mmadụ ga-abanye n’ọgba nkume,
Banyekwa n’ime ọnụ ndị dị n’ala,+
N’ihi na ike ya na-emenye ụjọ.
Ọ dị ebube, bụrụkwa onye ukwu.+
20 N’ụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-atụfusị chi ha dị iche iche na-abaghị uru, ma ndị e ji ọlaọcha mee ma ndị e ji ọlaedo mee,
Ndị ha meere onwe ha ka ha na-akpọrọ isiala.
Ha ga-atụpụrụ ha nkapị na ụsụ,+
21 Ka ha nwee ike banye n’oghere ndị dị n’oké nkume
Nakwa n’ebe ndị gbawara agbawa ná nnukwu nkume,
Mgbe Jehova ga-ebili mee ka ụwa maa jijiji,
N’ihi na ike ya na-emenye ụjọ.
Ọ dị ebube, bụrụkwa onye ukwu.
Gịnị mere a ga-eji jiri ya kpọrọ ihe?
3 Ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,
Na-anapụ Jeruselem na Juda ihe niile ha tụkwasịrị obi na ihe ndị dị ha mkpa,
Ma nri ma mmiri,+
2 Ma dike ma onye agha,
Ma onyeikpe ma onye amụma,+ ma onye na-agba afa ma okenye,
3 Ma onyeisi ndị agha iri ise+ ma onye a na-akwanyere ùgwù ma onye ndụmọdụ
Ma onye bụ́ aka ochie n’ime anwansi, ma onye ma otú e si arata agwọ.+
4 M ga-eme ka ụmụntakịrị nwoke bụrụ ndị isi ha.
Ndị na-anaghị akwụ otu ebe ga na-achịkwa ha.
5 Ha ga na-emekpa ibe ha ahụ́.
Onye nke ọ bụla ga na-emekpa ibe ya ahụ́.+
Nwatakịrị nwoke ga na-akparị agadi nwoke.
Onye na-enweghị ihe ọ bụ ga na-akparịkwa onye a na-akwanyere ùgwù.+
6 Onye nke ọ bụla ga-ejide nwanne ya n’ụlọ nna ya, sị:
“Ebe ọ bụ na i nwere ákwà mgbokwasị, chịwa anyị.
Lekọtawakwa ebe a a kwaturu, ya aghọọ ikpo nkume.”
7 Ma ọ gaghị ekwe. Ọ ga-ekwu n’ụbọchị ahụ, sị:
“Agaghị m abụ onye na-ekechi ọnyá unu.*
Nri ma ọ bụ uwe adịghịkwa n’ụlọ m.
Unu emela m onye ga na-achị ndị mmadụ.”
Ha na-enupụ isi n’ihu onye dị ebube.+
9 Otú ihu ha dị na-egosi ihe ha mere.
Ha na-ekwurịtakwa gbasara mmehie ha ka ndị Sọdọm.+
Ha anaghị ezo ya ezo.
Ha* ga-ata ahụhụ, n’ihi na ha na-akpatara onwe ha ọdachi.
10 Gwanụ ndị ezi omume na ihe ga-agaziri ha.
A ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha na-eme.+
11 Onye ajọ omume ga-ata ahụhụ.
Ọdachi ga-adakwasị ya,
N’ihi na a ga-eme ya ihe o mere ndị ọzọ.
12 Ndị na-agwa ndị m ihe ha na-arụ na-emesi ha ike.
Ọ bụkwa ụmụ nwaanyị na-achị ha.
Unu ndị m, ndị ndú unu edufuola unu.
Ha emeekwala ka ụzọ unu kwesịrị iso gbagwojuo unu anya.+
13 Jehova na-akwadebe ikpe ikpe,
O guzokwa ọtọ ikwu ihe ọ ga-eme mba dị iche iche.
14 Jehova ga-ekpe ndị okenye na ndị isi ndị ya ikpe.
“Unu agbaala ubi vaịn ọkụ.
Ihe unu zuru na nke ndị ogbenye dịkwa n’ụlọ unu.+
15 Gịnị mere unu ji na-emesi ndị m ike,
Na-echikwa ụmụ ogbenye ọnụ n’ala?”+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru ihe ndị a.
16 Jehova kwukwara, sị: “Ụmụ nwaanyị Zayọn dị mpako.
Ọ na-abụ, ha na-aga n’ụzọ, ha ana-ele anya n’elu,*
Jiri anya ha na-achụ nwoke, na-aga ije nganga,
Na-emekwa ka ọla ha gba n’ụkwụ na-eme mkpọtụ.
17 N’ihi ya, Jehova ga-eme ka akpụkpa ghaa ụmụ nwaanyị Zayọn n’isi.
Jehova ga-emekwa ka isi kwọchaa ha.+
18 N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-ewepụ ihe niile ha ji achọ onwe ha mma, ma ọla ụkwụ ha,
Ma ihe ha na-eke n’isi, ma ihe yiri ọnwa ha ji achọ mma,+
19 Ma iyeri ntị, ma ọla ha na-agba n’aka, ma ákwà ha ji ekpuchi ihu ha,
20 Ma ákwà isi, ma ọla ha na-agba n’ụkwụ, ma ákwà ha na-eke n’obi,
Ma mkpọ̀ sent, ma ọtụmọkpọ ha,
21 Ma mgbaaka ha, ma ọla ha na-agba n’imi,
22 Ma uwe ha na-eyi n’ememme, ma uwe elu ha, ma ákwà mgbokwasị ha, ma obere akpa ego ha,
23 Ma enyo ha na-eji n’aka,+ ma uwe ha ndị e ji linin kpaa,*
Ma ákwà ha na-eke n’isi, ma ákwà ndị ha ji ekpuchi ihu ha.
24 A ga na-anụ ísì ihe rere ere n’ahụ́ ha kama ịnụ ísì mmanụ balsam.+
Ha ga-eke eriri kama ike ájị̀.
Ha ga-enwe isi nkwọcha+ kama inwe ntutu isi mara mma.
Ha ga-eyi ákwà iru uju+ kama iyi ákwà dị oké ọnụ.
Kama ịchọ ha mma, a ga-akacha ha ihe n’ahụ́.
25 Zayọn, a ga-eji mma agha gbuo ụmụ nwoke nọ n’ime gị.
A ga-egbukwa ndị dike nọ n’ime gị n’agha.+
26 Ndị mmadụ ga-anọ n’ọnụ ụzọ gị niile na-eru uju, na-ebekwa ákwá.+
Ị ga-anọkwa ọdụ n’ala na-ebe ákwá.”+
4 Ụmụ nwaanyị asaa ga-ejide otu nwoke aka n’ụbọchị ahụ,+ sị:
“Anyị ga na-akpa afọ anyị,
Na-azụkwara onwe anyị ákwà.
2 N’ụbọchị ahụ, Jehova ga-eme ka ome mara mma, nke na-enweghịkwa ntụpọ, pulite. Ndị fọrọ n’ala Izrel ga na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ala ha mepụtara, jirikwa ya na-eme ọnụ.+ 3 Onye ọ bụla fọrọ na Zayọn, onye a hapụkwara na Jeruselem, ga-abụ onye dị nsọ n’anya ya, ya bụ, onye ọ bụla nọ na Jeruselem e dere aha ya na ọ ga-adịrị ndụ na-aga.+
4 Jehova ga-egosi Jeruselem na ezigbo iwe na-ewe ya, ọ ga-ekpekwa ya ikpe, si otú ahụ sachapụ ọbara metọrọ ya, sachapụkwa unyi* tere Zayọn.+ 5 N’ehihie, Jehova ga-eme ka ígwé ojii na anwụrụ ọkụ kpuchie ebe niile n’Ugwu Zayọn, kpuchiekwa ebe ndị mmadụ na-agbakọ na ya. N’abalị, ọ ga-emekwa ka ìhè ọkụ na-enwu enwu kpuchie ha.+ Ndò ga-adịkwa ebe ahụ niile dị ebube. 6 Ụlọ ndò nke ga na-egbochi okpomọkụ n’ehihie ga-adịkwa ebe ahụ.+ Ọ ga-abụkwa ebe ndị mmadụ ga-agbaba zere oké ifufe na mmiri ozuzo.+
5 Biko, ka m bụọrọ onye m hụrụ n’anya abụ.
Ọ bụ abụ banyere onye m hụrụ n’anya na ubi vaịn ya.+
Onye m hụrụ n’anya nwere ubi vaịn n’akụkụ ugwu na-eme nri.
2 Ọ kọrọ ala, wepụchaakwa nkume dị na ya.
Ọ kụrụ ezigbo mkpụrụ vaịn uhie n’ala ahụ,
Rụọ ụlọ nche n’etiti ya,
Gwuokwa ebe a na-azọchapụta mmanya na ya.+
Ọ tụwaziri anya ka ọ mịa ezi mkpụrụ vaịn,
Ma ọ mịrị naanị mkpụrụ vaịn ọhịa.+
Gịnị mere m ji na-atụ anya ka ọ mịa ezigbo mkpụrụ vaịn,
Ya amịa mkpụrụ vaịn ọhịa?
5 Ugbu a, biko ka m gwa unu
Ihe m ga-eme ubi vaịn m:
M ga-efopụsị osisi ndị m ji gbaa ya ogige,
Gbaakwa ha ọkụ.+
M ga-akwatu mgbidi ya m ji nkume rụọ.
A ga-azọkwa ya ụkwụ.
6 M ga-eme ka ọ dị ka ala na-abaghị uru.+
A gaghị akwacha alaka vaịn ya akwacha. A gaghịkwa abọ ubi ahụ ahịhịa.
Ogwu na ahịhịa ga-epuchi na ya.+
M ga-agwakwa ígwé ojii ka ọ ghara ikwe ka mmiri zoo na ya.+
7 N’ihi na ndị Izrel bụ ubi vaịn Jehova nke ụsụụ ndị agha.+
Ndị Juda bụkwa ubi na-eme ya obi ụtọ.
Ọ nọ na-atụ anya ka ndị mmadụ na-ekpe ikpe ziri ezi,+
Ma, ha nọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi.
Ọ nọkwa na-atụ anya ka ndị mmadụ na-eme ezi omume,
Ma, ọ nọ na-anụ ákwá ndị a na-echi ọnụ n’ala.”+
8 Unu ga-ata ahụhụ, unu ndị na-enwetakwu ụlọ gbakwụnye na nke unu nwere enwe+
Nakwa unu ndị na-enwetakwu ubi gbakwụnye na nke unu nwere enwe.+
Unu na-enwetagide ihe ndị a ruo mgbe a na-enweghị onye ọzọ nwerenụ,
Naanị unu ebirizie n’obodo.
9 M nụrụ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ṅụrụ iyi
Na n’agbanyeghị na ọtụtụ ụlọ buru ibu, maakwa mma,
A ga-ala ha n’iyi.
E nweghịkwa onye ga-ebi na ha.+
10 Nnukwu ubi vaịn dị eka iri ga-emepụta naanị ihe ga-eju otu bat.*
Mkpụrụ juru otu homa* ga-amịta naanị otu efa.*+
11 Ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ka ha ṅụọ mmanya na-egbu egbu ga-ata ahụhụ.+
Ha na-aṅụgide mmanya chi ejie, mmanya ana-egbukwa ha.
12 Mgbe ọ bụla ha na-eme oriri,
Une, ụbọ akwara, ịgbà, ọjà, na mmanya na-adị na ya.
Ma, ha anaghị echebara ihe Jehova na-eme echiche.
Ha anaghịkwa ahụ ihe o ji aka ya rụọ.
Agụụ ga-agụgbu ndị ha na-akwanyere ùgwù.+
Akpịrị ga-akpọkwa ndị nkịtị nkụ.
14 N’ihi ya, ili* asaala mbara n’onwe ya.
O megheekwala ọnụ ya ka ọ ghara inwe nsọtụ.+
Ndị a ma ama n’obodo a na ìgwè ndị na-eme mkpọtụ na ya, nakwa ndị nọ na ya na-eme mkpọtụ mgbe ha na-eri oriri,
Ga-abanyecha n’ime ya.
15 A ga-eweda mmadụ ala.
A ga-emenye mmadụ ihere.
A ga-ewedakwa ndị dị mpako ala.
16 Ikpe ziri ezi Jehova nke ụsụụ ndị agha na-ekpe ga-eme ka e too ya.
Ezi Chineke, bụ́ Onye Nsọ,+ ga-eji ezi omume ọ na-eme gosi na ọ dị nsọ.+
17 Ụmụ atụrụ ga-atakwa ahịhịa ebe ahụ ka à ga-asị na ọ bụ ebe anụmanụ na-ata ahịhịa.
Ndị mbịarambịa ga-eri ihe n’ebe dị iche iche tọgbọ chakoo anụ ndị ahụ́ dị mma na-anọbu.
18 Ndị na-aghọ aghụghọ ga-ata ahụhụ.
E kegidere ihe ọjọọ ha na-eme na mmehie ha na-eme n’ahụ́ ha. Ha dị ka anụmanụ nke na-adọkpụgharị ụgbọala e kegidere n’ahụ́ ya.
19 E nwere ndị na-asị: “Ya rụọ ọrụ ya ngwa ngwa.
Ya bịa ọsọ ọsọ, ka anyị hụ ya.
20 Ndị na-asị na ihe ọma bụ ihe ọjọọ nakwa na ihe ọjọọ bụ ihe ọma ga-ata ahụhụ,+
Ha na ndị na-eji ọchịchịrị mere ìhè, jiri ìhè mere ọchịchịrị,
Nakwa ndị na-ewere ihe na-elu ilu ka ihe na-atọ ụtọ, werekwa ihe na-atọ ụtọ ka ihe na-elu ilu.
23 Ndị ọ na-abụ, ha nara aka azụ, ha asị na aka onye ajọ omume dị ọcha+
Nakwa ndị na-ekpe onye ezi omume ikpe arụrụala ga-ata ahụhụ.+
24 N’ihi ya, a ga-ala ha n’iyi otú ahụ ọkụ si erepịa ahịhịa ọka,
Otú ahụ ọkụ sikwa erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ.
Mgbọrọgwụ ha ga-erekasịkwa.
Ifuru ha ga-efesasị ka ntụ,
N’ihi na ha jụrụ iwu* Jehova nke ụsụụ ndị agha.
Ha ledakwara okwu Onye Nsọ Izrel anya.+
25 Ọ bụ ya mere Jehova ji ewere ndị ya ezigbo iwe.
Ọ ga-ewelitekwa aka ya taa ha ahụhụ.+
Ugwu dị iche iche ga-ama jijiji.
Ozu ha ga-adị ka ihe e kpofuru ekpofu n’okporo ámá dị iche iche.+
N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị.
Kama, ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.
26 O dowela ihe mba dị ebe dị anya ga-ahụ gbakọọ.+
Ọ fụọlara ha opi ka ha si n’ebe ụwa sọtụrụ bịa.+
Ha jikwa oké ọsọ na-abịa.+
27 O nweghị onye n’ime ha ike gwụrụ ma ọ bụ onye na-ada ada.
O nweghị onye na-ero ụra ma ọ bụ onye na-ehi ụra.
Ájị̀ ha kere n’úkwù atọpụghị.
Eriri akpụkpọ ụkwụ ha adọbighịkwa.
Ụkwụ ịnyịnya ha dị ka nkume siri ike.
Ụkwụ ụgbọala ha na-efekwa ọsọ ka oké ifufe.+
29 Otú ha si agbọ ụja yiri nke ọdụm.
Ha na-agbọkwa ụja ka nwa ọdụm.+
Ha baa mba, ha anwụde anụ ha ga-eri,
Buru ya pụọ. E nweghịkwa onye ga-anapụta ha ya.
Onye ọ bụla lere ala a anya ga-ahụ na e nwere ọchịchịrị na nsogbu.
Ìhè ga-aghọdị ọchịchịrị n’ihi ígwé ojii.+
6 N’afọ Eze Ọzaya nwụrụ,+ ahụrụ m ka Jehova nọ n’ocheeze dị elu.+ Uwe mwụda o yi sachikwara ebe niile n’ụlọ nsọ ya. 2 Ndị seraf guzo gburugburu ya. Seraf nke ọ bụla nwere nku isii. Nke ọ bụla na-eji nku abụọ ekpuchi ihu ya, na-eji abụọ ekpuchi ụkwụ ya, na-ejikwa abụọ efegharị.
3 Ha jikwa olu dara ụda na-agwa ibe ha, sị:
“Nsọ, nsọ, nsọ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha dị.+
Ụwa niile na-egosi ebube ya.”
4 Mkpu a ha na-eti* mere ka ibo ụzọ ụlọ ha nọ malite ịma jijiji, anwụrụ ọkụ ejukwa n’ụlọ ahụ.+
5 M kwuziri, sị: “Efuola m!
Onye nwụrụ anwụ ka m bụzi,*
N’ihi na anya m ahụla Eze bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha.
Okwu na-esi m n’ọnụ apụta adịghị ọcha.
Ọ bụkwa ndị okwu na-adịghị ọcha na-esi n’ọnụ apụta ka mụ na ha bi.”+
6 Otu n’ime ndị seraf wee fere bịa ebe m nọ. O jikwa icheku ọkụ+ nke o ji ihe yiri mkpà gụta n’ebe ịchụàjà.+ 7 O metụkwara m ya n’ọnụ, sị:
“Emetụla m icheku ọkụ a n’egbugbere ọnụ gị.
E hichapụla mmehie gị.
Chineke agbagharala gị mmehie gị.”
8 M nụziri olu Jehova ka ọ na-asị: “Ònye ka m ga-eziga? Ònyekwa ga-agara anyị?”+ Mụ asị: “Lee m, ziga m.”+
9 Ya asị: “Gaa gwa ndị a, sị:
‘Unu ga-anụ ihe ugboro ugboro,
Ma unu agaghị aghọta ya.
Unu ga-ahụkwa ihe ugboro ugboro,
Ma unu agaghị amata ihe ọ bụla.’+
Mee ka ntị ha kpọchie,
Ka ha gharakwa iji ntị ha nụ ihe.
11 Mụ asị: “Jehova, ruo ole mgbe?” Ya asị:
“Ruo mgbe obodo niile bụzi ebe e bibiri ebibi n’enweghị onye bi na ha,
Ruo mgbe ụlọ niile na-enweghị mmadụ nọ na ha,
Ruo mgbe e bibiri ala a, mee ka ọ tọgbọrọ nkịtị,+
12 Ruokwa mgbe Jehova kpọgara ndị mmadụ n’ebe dị anya,+
Ọtụtụ ebe n’ala a atọgbọrọkwa nkịtị.
13 Ma, e kee ndị Izrel ụzọ iri, otu ụzọ ka ga-anọ n’ala ha, ma, a ga-agba otu ụzọ a ọkụ ọzọ. Ndị Izrel dị ka nnukwu osisi, dịkwa ka osisi ook úkwù ha na-afọdụ ma e gbutuo ha. Ome* dị nsọ ga-epulite n’úkwù ha.”
7 N’oge Ehaz+ nwa Jotam nwa Ọzaya na-achị Juda, Rizin eze Siria na Pika+ nwa Remalaya eze Izrel bịara ịlụso ndị bi na Jeruselem agha, ma ha* emerilighị ha.+ 2 N’oge ahụ, a kọọrọ ezinụlọ Devid, sị: “Ndị agha Siria na ndị nke Ifrem agbakọọla aka.”
Obi wee malite ịma Ehaz na ndị ya jijiji, otú osisi dị n’ọhịa si ama jijiji ma ifufe fewe.
3 Jehova wee sị Aịzaya: “Biko, gị na Shia-jeshọb* nwa gị nwoke+ gaa hụ Ehaz n’isi isi okpo mmiri nke ọdọ mmiri dị n’ebe mgbago,+ nke dị n’ụzọ e si aga ebe ndị ọsụ ákwà na-anọ asụ ákwà. 4 Sị ya, ‘Echegbula onwe gị. Atụla egwu, ka obi gharakwa ịmapụ gị maka ezigbo iwe Rizin eze Siria na nwa Remalaya na-ewe.+ Ha yiri mkpirisi nkụ abụọ refọrọ erefọ ndị na-akwụ anwụrụ. 5 Ndị Siria na ndị Ifrem na nwa Remalaya akpaala nkata ihe ha ga-eme gị. Ha na-asị: 6 “Ka anyị gaa lụso Juda agha, merie ya* ma bibie ya.* Ka anyị chiekwa nwa Tabiel eze ka ọ chịwa Juda.”+
7 “‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“Ọ gaghị enwe isi.
Ọ gaghịkwa eme.
8 N’ihi na isi obodo Siria bụ Damaskọs.
Onyeisi Damaskọs bụkwa Rizin.
Tupu afọ iri isii na ise agaa,
A ga-akụrisị Ifrem ka ọ gharazie ịbụ mba.+
9 Isi obodo Ifrem bụ Sameria.+
Onyeisi Sameria bụ nwa Remalaya.+
Ọ bụrụ na okwukwe unu esighị ike,
Alaeze unu agaghị esi ike.”’”
10 Jehova gwakwara Ehaz, sị: 11 “Rịọ mụnwa bụ́ Jehova bụ́ Chineke gị ka m meere gị ihe ga-egosi na ihe ndị a ga-eme.+ Ọ bụrụgodị na ị chọrọ ka o mee n’ebe miri emi ka ili,* ma ọ bụ n’ebe dị elu ka mbara igwe, m ga-emere gị ya.” 12 Ma Ehaz sịrị: “Agaghị m arịọ ihe a. Agaghịkwa m anwa Jehova ọnwụnwa.”
13 Aịzaya wee sị: “Ndị ezinụlọ Devid, biko geenụ ntị. Ọ̀ bụ na o zubeghịrị unu na unu na-akpasu mmadụ iwe? Gịnị mere unu ji na-akpasukwu Chineke iwe?+ 14 N’ihi ya, lekwanụ ihe Jehova ga-eme ga-egosi unu na ihe ndị a ga-eme: Nwa agbọghọ ga-adị ime, mụọ nwa nwoke,+ gụọ ya Ịmanuel.*+ 15 Tupu nwa ahụ etoruo mgbe ọ ga-ama otú ọ ga-esi jụ ihe ọjọọ mewe ihe ọma, ọ gaghị ahụ ihe ọzọ ọ ga-eri ma e wezụga bọta na mmanụ aṅụ. 16 N’ihi na tupu nwa ahụ etoruo ịmata otú ọ ga-esi jụ ihe ọjọọ mewe ihe ọma, obodo ndị eze abụọ ahụ unu na-atụ ụjọ ga-atọgbọrọ chakoo.+ 17 Ehaz, Jehova ga-eme ka gị na ndị gị na ezinụlọ nna gị nọrọ ndụ n’oge ihe ga-esi ike otú ọ na-esitụbeghị kemgbe ndị Ifrem hapụrụ ndị Juda nọọrọ onwe ha.+ Ọ ga-ezite eze Asiria.+
18 “N’oge ahụ, Jehova ga-afụrụ ijiji ndị nọ n’ebe dị anya n’iyi niile na-asọnye n’osimiri Naịl Ijipt mkpọrọhịhị, fụọkwara aṅụ ndị nọ n’ala Asiria mkpọrọhịhị ka ha bịa. 19 Ha niile ga-abịakwa biri na ndagwurugwu nakwa n’ọgba nkume nakwa n’elu osisi ogwu niile nakwa n’elu ebe niile anụmanụ na-aṅụ mmiri.
20 “N’oge ahụ, Jehova ga-eji eze Asiria,+ bụ́ agụba a gbazitere agbazite, nke dị ná mpaghara Osimiri Yufretis, kpụọ gị isi na ajị ụkwụ. Ọ ga-akpụkwa afụ ọnụ gị.
21 “N’oge ahụ, mmadụ ga-azọ nwa ehi si n’ìgwè ehi ndụ, zọọkwa atụrụ abụọ ndụ. 22 Ebe ọ bụ na mmiri ara ehi ga-ehi nne, mmadụ ga na-eri bọta, n’ihi na onye ọ bụla fọrọ n’ala ahụ agaghị ahụ ihe ọzọ ọ ga-eri ma e wezụga bọta na mmanụ aṅụ.
23 “N’oge ahụ, naanị osisi ogwu na ahịhịa ga na-adị ebe ọ bụla a na-enwebu otu puku (1,000) osisi vaịn, ndị ọnụ ahịa ha bụ otu puku (1,000) mkpụrụ ego ọlaọcha. 24 Ndị mmadụ ga-ejikwa akụ́ na ụta gaa ebe ahụ, n’ihi na osisi ogwu na ahịhịa ga-ejupụta n’ala ahụ niile. 25 Mmadụ agaghị eru nso n’ugwu niile a na-ejibu ọ́gụ̀ abọ ahịhịa n’ihi egwu ọ na-atụ osisi ogwu na ahịhịa ndị dị ebe ndị ahụ. Ugwu ndị ahụ ga-aghọkwa ebe ehi na atụrụ na-ata ahịhịa.”
8 Jehova gwara m, sị: “Were mbadamba osisi buru ibu,+ jiri mkpịsị akwụkwọ nkịtị* dee ‘Meha-shalal-hash-baz’* n’elu ya. 2 Achọrọ m ka ndị a tụkwasịrị obi, ya bụ, Yuraya+ onye nchụàjà na Zekaraya nwa Jeberekaya, dee* na ha hụrụ mgbe e dere ya.”
3 Mụ na nwunye m, bụ́ onye amụma nwaanyị, wee nwee mmekọahụ,* ya adịrị ime, mechaakwa mụọ nwa nwoke.+ Jehova wee sị m: “Gụọ ya Meha-shalal-hash-baz, 4 n’ihi na tupu nwata ahụ amata otú e si akpọ ‘Papa’ na ‘Mama,’ a ga-ebugara eze Asiria akụ̀ Damaskọs na ihe a kwatara na Sameria.”+
5 Jehova gwakwara m, sị:
6 “Ebe ọ bụ na ndị a ajụla mmiri Shaịloa* nke na-asọ nwayọọ nwayọọ,+
Na-achịkwa Rizin na nwa Remalaya ọchị,+
7 Jehova ga-ezite
Eze Asiria+ na ebube ya niile ka ọ lụso ha agha.
Eze a na ndị agha ya ga-abịa ngwa ngwa
Otú nnukwu mmiri bụ́ Osimiri Yufretis si eto,
Tochie ebe niile, sọrọ pụta n’elu ala,
8 Sọrọkwa gafee Juda.
Ọ ga-etoju ebe niile na Juda, na-eru mmadụ n’olu, sọrọkwa na-aga.+
9 Merụọnụ ha ahụ́, unu ndị dị iche iche, ma a ga-etipịa unu.
Geenụ ntị, unu ndị niile nọ n’ebe ndị dị anya n’ụwa!
Jikerenụ agha,* ma a ga-etipịa unu!+
Jikerenụ agha, ma a ga-etipịa unu!
10 Meenụ atụmatụ, ma a ga-akụghasị ya!
11 Mgbe Jehova na-agwa m okwu, ọ tụkwasịrị m aka ya siri ike, gwakwa m ka m ghara ịkpa àgwà ka ndị a. Ọ gwara m, sị:
12 “E nwee ihe ọ bụla ndị a kpọrọ mgba okpuru, unu esola ha akpọ ihe ahụ mgba okpuru.
Unu atụkwala egwu ihe ha na-atụ egwu.
Unu amakwala jijiji n’ihi ya.
13 Chetanụ na ọ bụ naanị Jehova nke ụsụụ ndị agha dị nsọ.+
Ọ bụ ya ka unu kwesịrị ịna-atụ egwu,
Ọ bụ ya kwesịrị ime ka unu na-ama jijiji.”+
14 Ọ ga-adị ka ụlọ nsọ,
Ma ọ ga-aghọrọ alaeze abụọ dị n’Izrel
Nkume na-akpọbi mmadụ ụkwụ+
Na oké nkume na-akwada mmadụ.
Ọ ga-aghọkwara ndị bi na Jeruselem
Igbudu na ọnyà.
15 Ọtụtụ n’ime ha ga-azọhie ụkwụ daa, merụọkwa ahụ́.
A ga-amata ha n’ọnyà, jidekwa ha.
Zoo iwu* ahụ e nyere ndị na-eso ụzọ m.
17 M ga na-atụ anya Jehova,+ onye kpuchiri ihu ya ka ezinụlọ Jekọb ghara ịhụ ya.+ M ga-enwe olileanya na ya.
18 Leenụ mụ na ụmụ Jehova nyere m.+ Anyị bụ ọrụ ebube, bụrụkwa ihe na-egosi ndị Izrel ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, onye bi n’Ugwu Zayọn, zubeere ha.+
19 Ọ bụrụ na ha asị unu: “Jụọnụ ndị na-agba afa ma ọ bụ ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu ase, bụ́ ndị na-ebe ubé ka nnụnụ, na-ekwukwa okwu n’olu dị ala,” ùnu kwesịrị ime ihe ha kwuru? Ọ́ bụghị Chi ndị obodo ọ bụla ka ndị obodo ahụ kwesịrị ịna-ajụ ase? Ùnu kwesịrị ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase gbasara ndị dị ndụ?+ 20 Mba, kama unu kwesịrị isi n’iwu Chineke nakwa n’ihe ndị ọzọ o kwuru* mata ihe unu chọrọ ịmata.
Ọ bụrụ na ihe ha na-ekwu abụghị ihe Chineke kwuru, ha enweghị ihe na-enye ha ìhè.+ 21 Ihe ga-esiri onye ọ bụla na-agafe n’obodo a ike. Agụụ ga na-agụkwa ya.+ N’ihi iwe juru ya obi maka agụụ na-agụ ya, ọ ga-eleli anya elu kparịa ma eze ya ma Chineke ya. 22 Ọ ga-elekwa anya n’ụwa, ma naanị ihe ọ ga-ahụ bụ nsogbu na ọchịchịrị, ihe na-emenye mmadụ ụjọ na ihe isi ike, ihe mgbu na itiri.
9 Ma, ọchịchịrị ahụ agaghị agbachi otú ọ gbachiri n’oge mbụ mgbe a kparịrị Zebulọn na Naftalaị, taakwa ha ahụhụ.+ Kama, ka oge na-aga, Chineke ga-eme ka e bido ịsọpụrụ ebe ndị a na-akparịbu. Ebe ndị ahụ dị na Galili ndị mba ọzọ bi, n’ụzọ e si aga n’oké osimiri, ná mpaghara Osimiri Jọdan.
2 Ndị nọbu na-agagharị n’ọchịchịrị
Ahụla ezigbo ìhè.
Ìhè nwukwaara
Ndị bi n’obodo gbara oké ọchịchịrị.+
3 I meela ka mba a mụbaa.
I meela ka ha na-aṅụrị sọ ọṅụ.
Ha na-aṅụrị ọṅụ n’ihu gị
Otú ndị mmadụ si aṅụrị ọṅụ n’oge a na-ewe ihe ubi
Nakwa otú ndị mmadụ si aṅụrị ọṅụ ma ha na-eke ihe ha kwatara n’agha.
4 N’ihi na ị kụjisiela osisi ha ji ebu ibu,
Kụjisiekwa mkpara na-adị ha n’ubu, ya bụ, mkpara onyeisi ha,
Otú i mere ndị Midian n’ụbọchị e meriri ha.+
5 Akpụkpọ ụkwụ ọ bụla ndị agha na-azọ n’ala, nke na-eme ka ala maa jijiji,
Nakwa uwe ọ bụla ha tụrụrụ n’ọbara,
Ga-ere ọkụ.
A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chi Bụ́ Dike,+ Nna Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi, Onyeisi Udo.
7 Ọchịchị ya ga-eru ebe niile.
A ga-eme ka alaeze ya sie ike+ ma dịgide
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi,
Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mee ihe a.
8 Jehova kwuru ihe ga-eme Jekọb.
Ihe ahụ o kwuru mekwara Izrel.+
9 Mmadụ niile ga-amakwa gbasara ya,
Ma ndị Ifrem ma ndị bi na Sameria.
Ebe ọ bụ na ha dị mpako, ha ji nganga na-ekwu, sị:
10 “Ụlọ brik adaala.
Ma, anyị ga-eji nkume a wara awa rụọ ụlọ.+
E gbutusịala osisi sịkamọ,
Ma, anyị ga-eji osisi sida dochie ha.”
11 Jehova ga-agba nkịtị ka ndị iro Rizin lụso Ifrem agha.
Ọ ga-emekwa ka ndị iro ya mesie ya ike.
12 Ndị Siria ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa, ndị Filistia esi n’ebe ọdịda anyanwụ* bịa.+
Ha ga-emeghe ọnụ ripịa ndị Izrel.+
N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị,
Kama ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.+
13 N’ihi na ha alaghachikwurughị Chineke, onye na-eti ha ihe.
Ha achọwaghịkwa Jehova nke ụsụụ ndị agha.+
15 Ndị agadi na ndị a na-akwanyere ezigbo ùgwù bụ isi.
Ndị amụma, ndị na-ekwu ka e mee ihe na-adịghị mma, bụ ọdụ.+
16 Ndị na-edu ndị a na-edufu ha.
E tigharịakwala ndị e du edu anya.
17 Ọ bụ ya mere na ihe ụmụ okorobịa obodo a agaghị amasị Jehova.
Ọ gaghịkwa emere ụmụ na-enweghị nna* na ụmụ nwaanyị isi mkpe obodo a ebere,
N’ihi na ha niile akwụsịla ife Chineke, mewe ihe ọjọọ.+
Ha niile na-ekwukwa okwu nzuzu.
N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị,
Kama ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.+
18 N’ihi na ihe ọjọọ agbasaala ebe niile
Otú ọkụ si agbasa repịa osisi ogwu na ahịhịa.
Ọkụ a gbawa obere osisi ndị dị n’oké ọhịa,
Irighiri ihe ndị si n’ọkụ a ga-eso anwụrụ ọkụ na-akwụgo elu.
19 A mụnyere obodo a ọkụ
N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha eweela iwe.
Ọkụ ga-eregbukwa ndị bi n’obodo a.
E nweghị onye ga-emetere ibe ya ebere, ya sọkwa ya ya bụrụ nwanne ya.
20 Mmadụ ga-egbutu ihe dị n’aka nri rie,
Ma agụụ ka ga na-agụ ya.
Mmadụ ga-erikwa ihe dị n’aka ekpe,
Ma afọ agaghị eju ya.
Ha ga-agbakọ aka rie Juda.+
N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị,
Kama ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.+
10 Ndị na-eti iwu ndị na-enye ndị ọzọ nsogbu
Nakwa ndị na-ede iwu ha ji emegbu ndị ọzọ ga-ata ahụhụ.+
2 Ha na-eme ihe ndị a iji mee ka ndị ogbenye ghara inweta ihe ruuru ha,
Na iji kpee ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha so ná ndị m ikpe mkpegbu,+
Nakwa iji weghara ihe ụmụ nwaanyị isi mkpe,
Ònye ka unu ga-agbakwuru ka o nyere unu aka?+
Ònyekwa ka unu ga-ahapụrụ akụ̀* unu?
4 Ụfọdụ n’ime unu ga-eso ndị mkpọrọ hulata ala.
A ga-egbukwa ndị fọrọnụ.
N’ihi isi ha na-enupụ, iwe ya adajụbeghị,
Kama ọ ka welitere aka ka ọ taa ha ahụhụ.+
M ga-ejikwa mkpara o ji n’aka taa ndị mmadụ ahụhụ.
M ga-agwakwa ya ka ọ kwata ọtụtụ ihe, bukọrọ ọtụtụ ihe,
Zọtọọkwa ebe ahụ, ya adị ka apịtị dị n’okporo ámá.+
7 Ma, ọ gaghị achọ ime ihe a,
Obi ya agaghịkwa abụ ime ya,
N’ihi na ihe dị ya n’obi bụ ịla ihe n’iyi
Nakwa ibibi ọtụtụ mba, ọ bụghị mba ole na ole.
9 Ọ̀ kwa Kalno+ dị ka Kakemish?+
Ọ̀ kwa Sameria+ dị ka Damaskọs?+
10 M meriela alaeze ndị na-efe chi dị iche iche na-abaghị uru,
Alaeze ndị arụsị a pịrị apị ha na-efe dị ọtụtụ karịa nke dị na Jeruselem na Sameria.+
11 Gịnị ga-egbochi m ime Jeruselem na arụsị ndị dị na ya
Ihe m mere Sameria na chi dị iche iche na-abaghị uru dị na ya?’+
12 “Jehova rụchaa ọrụ niile ọ na-arụ n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem, ọ ga-ata eze Asiria ahụhụ maka na ọ dị mpako, onwe ya na-ebukwa ya isi.+ 13 Ọ sịkwara,
‘Ọ bụ ike m
Na amamihe m ka m ga-eji eme ihe a, n’ihi na ama m ihe.
M ga-emeri ndị bi na ha otú dike na-esi emeri obodo.+
14 M ga-ebukọrọ akụ̀ ndị dị iche iche n’egbughị oge,
Otú ahụ mmadụ na-ewere ihe dị n’akwụ́ nnụnụ n’egbughị oge.
M ga-achịkọrọ ihe niile dị n’ụwa,
Otú mmadụ si achịrị àkwá a hapụrụ ahapụ.
E nweghị nnụnụ ga na-efegharị nku ya. E nweghịkwa nke ga-emeghe ọnụ ya ma ọ bụ bee ubé.’”
15 Anyụike ọ̀ ga-anyara onye ji ya na-egbutu ihe isi?
Mma e ji akwọ osisi ọ̀ ga-eche na ya ka onye ji ya akwọ osisi?
Mkpara+ ò nwere ike ịna-efegharị onye ji ya?
Ka ụtarị ò nwere ike ibuli onye ji ya elu?
16 N’ihi ya, ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,
Ndị Asiria agaghịzi adị ebube. Ha ga-adị ka ihe ọkụ repịara.+
17 Ìhè na-enwu n’Izrel+ ga-aghọ ọkụ.+
Onye Nsọ Izrel ga-aghọkwa ire ọkụ.
Ọkụ a ga-enwusi ike ma repịa ahịhịa na ogwu n’ala ndị Asiria n’otu ụbọchị.
18 Chineke ga-ebibikwa ọmarịcha oké ọhịa ha na ebe ha kụrụ mkpụrụ osisi dị iche iche.
Ọ ga-adị ka mgbe ọrịa mere mmadụ ọdị ndụ ọnwụ ka mma.+
19 Osisi ndị fọrọ n’oké ọhịa ha
Ga-adịzi ole na ole nke na nwatakịrị ga-agụtali ole ha dị.
20 N’ụbọchị ahụ, ndị fọrọ n’Izrel
Na ndị ezinụlọ Jekọb aka na-akpaghị
Agaghịzi atụkwasị mba ndị na-alụso ha ọgụ obi.+
Kama, ha ga-atụkwasị Jehova,
Bụ́ Onye Nsọ Izrel, obi, na-erubekwara ya isi.
22 Ndị Izrel, ọ bụ eziokwu na unu dị ọtụtụ
Ka ájá dị n’oké osimiri,
Naanị ndị fọrọ n’ime unu ga-alọta.+
Chineke ekpebiela na ọ ga-ebibi unu.+
Ihe a o kpebiri ime unu* zikwara ezi.+
23 Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ga-ebibi unu
Otú o kpebiri ime n’obodo unu niile.+
24 Ọ bụ ya mere Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ji kwuo, sị: “Ndị m, ndị bi na Zayọn, unu atụla egwu onye Asiria ahụ na-apịabu unu ụtarị, onye na-ewelikwa mkpara ya elu ka o jiri ya taa unu ahụhụ+ otú ndị Ijipt mere unu.+ 25 N’oge na-adịghị anya, m ga-akwụsị iwesa unu iwe. M ga-ewesawazi ndị Asiria iwe, laakwa ha n’iyi.+ 26 Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-ewere ụtarị pịa ha,+ otú o mere mgbe o meriri ndị Midian n’akụkụ oké nkume Oreb.+ Ọ ga-agbatị mkpara ya n’elu oké osimiri, weliekwa ya elu otú o mere ndị Ijipt.+
27 “N’ụbọchị ahụ, a ga-ebutu ibu eze Asiria bukwasịrị n’ubu unu.+
A ga-ewepụkwa yok ya dị n’olu unu.+
A ga-agbajikwa yok ahụ+ n’ihi mmanụ.”*
O sila na Migrọn gafee.
O busakwala ibu ya na Mikmash.+
29 O sila n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri gafee.
Ọ rahụrụ na Giba.+
Ndị Rema na-ama jijiji. Ndị Gibia,+ bụ́ ndị obodo Sọl, agbaakwala ọsọ.+
30 Ndị Galịm, tisienụ mkpu ike.
Ndị Leisha, geenụ ntị.
Ndị Anatọt, unu ga-atagbu onwe unu n’ahụhụ.+
31 Ndị Madmina agbaala ọsọ.
Ndị Gibịm agala zoo.
Ọ na-echere ugwu Zayọn,
Ya bụ, ugwu Jeruselem, aka mgba.
Ọ na-egbutukwa osisi ndị kacha too ogologo,
Na-emekwa ka ndị dị elu dị ala.
34 O ji anyụike* na-egbutu obere osisi ndị dị n’oké ọhịa.
Onye dị ike ga-emekwa ka osisi ndị dị na Lebanọn daa.
11 Úkwù osisi Jesi+ ga-epu ome.+
Ome+ nke si na mgbọrọgwụ ya pulite ga-amịkwa mkpụrụ.
2 Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya.*+
Ọ bụ ya mere ọ ga-eji mara ihe,+ na-aghọtakwa ihe nke ọma,
Na-enye ezigbo ndụmọdụ, dịkwa ike,+
Mara ọtụtụ ihe gbasara Jehova, na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù.
3 Ịkwanyere Jehova ezigbo ùgwù ga na-atọ ya ụtọ.+
Ọ gaghị eji naanị ihe anya ya hụrụ ekpe ikpe.
Ọ gaghịkwa eji naanị ihe ọ nụrụ adọ mmadụ aka ná ntị.+
4 Ọ ga na-ekpere ndị ogbenye ikpe ziri ezi.
Ọ ga-eji maka ndị dị umeala n’obi n’ụwa dọọ ndị mmadụ aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị.
5 Ezi omume ga-adị ka ájị̀ ọ na-eke n’úkwù.
Irubere Chineke isi ga-adịkwa ka ájị̀ ọ na-eke n’ume.+
6 Anụ ọhịa wolf* na nwa atụrụ ga-anọkọ n’udo.+
Agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa.
Nwa ehi na ọdụm na anụ gbara agba ga-anọkọkwa.*+
Nwatakịrị ga na-edukwa ha.
7 Nne ehi na anụ ọhịa bea ga-atakọ ahịhịa.
Ụmụ ha ga-amakpukọkwa.
Ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka ehi.+
8 Nwa na-aṅụ ara ga-egwuri egwu n’ọnụ agwọ ubí nọ,
Nwatakịrị a kwụsịrị ara ga-atụkwasịkwa aka ya n’ọnụ agwọ ọjọọ nọ.
9 Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+
Ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m niile,+
N’ihi na amamihe gbasara Jehova ga-ejupụta ụwa
Otú mmiri si ejupụta oké osimiri.+
10 N’oge ahụ, mgbọrọgwụ Jesi+ ga-eguzo ọtọ bụrụ ihe na-agbara ndị dị iche iche àmà.+
Mba dị iche iche ga-agakwuru ya ka o duzie ha.*+
Ebe ọ na-anọ ezu ike ga-adịkwa ebube.
11 N’oge ahụ, Jehova ga-eji aka ya kpọkọta ndị ya nke ugboro abụọ, ya bụ, ndị ya fọrọ n’Asiria,+ n’Ijipt,+ na Patrọs,+ na Kush,*+ n’Ịlam,+ na Shaịna,* na Hemat, nakwa n’agwaetiti oké osimiri.+ 12 Ọ ga-edowe ihe ga-agbara mba niile àmà, kpọkọta ndị Izrel a chụsara achụsa,+ sikwa n’ebe niile n’ụwa* kpọkọta ndị Juda a chụsara achụsa.+
13 Ifrem ga-akwụsị anyaụfụ ọ na-eme.+
A ga-ebibikwa ndị na-ewesa Juda iwe.
Ifrem agaghị na-emere Juda anyaụfụ.
Juda agaghịkwa na-ewesa Ifrem iwe.+
14 Ha ga-eji ọsọ gaa ná mkpọda obodo ndị Filistia n’ebe ọdịda anyanwụ.
Ha ga-agbakọ aka bukọrọ ihe ndị Ọwụwa Anyanwụ.
Ha ga-emeri ndị Ịdọm+ na ndị Moab.+
Ha ga na-achịkwa ndị Amọn.+
15 Jehova ga-ekewa oké osimiri Ijipt.*+
Ọ ga-atụkwa Osimiri Yufretis aka.+
Ọ ga-ejikwa ume* ya na-ekpo ọkụ mee ka iyi asaa ndị na-asọnye n’osimiri ahụ taa.
Ọ ga-emekwa ka ndị mmadụ yiri akpụkpọ ụkwụ ha gafee ya.
16 Ọ ga-emekwa ka e nwee ụzọ+ ndị ya fọrọ ga-esi si n’Asiria pụta,+
Otú o mere ka ndị Izrel nwee ụzọ n’ụbọchị ha si n’Ijipt pụta.
12 Ị ga-asị n’ụbọchị ahụ:
“Jehova, m na-ekele gị,
N’ihi na ọ bụ eziokwu na ị na-ewesabu m iwe,
Iwe gị adajụọla, ị kasiekwala m obi.+
M ga-atụkwasị ya obi. M gaghịkwa atụ ụjọ.+
N’ihi na Jaa* Jehova bụ ike m na ume m.
Ọ bụ ya na-azọpụta m.”+
4 Unu ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ:
“Keleenụ Jehova. Kpọkuonụ aha ya.
Kọọrọnụ mba dị iche iche ihe ndị ọ na-eme.+
Kpọsaanụ na aha ya dị ebube.+
5 Bụkuonụ Jehova abụ otuto,+ n’ihi na o meela nnukwu ihe dị iche iche.+
Meenụ ka a mara ihe a n’ụwa niile.
6 Ndị bi na Zayọn, tisienụ mkpu ike, tiekwanụ mkpu ọṅụ,
N’ihi na Onye Nsọ Izrel, onye unu na ya nọ, bụ onye ukwu.”
13 Ihe Chineke kpebiri ime Babịlọn,+ nke Aịzaya+ nwa Emọz nụrụ mgbe ọ hụrụ ọhụụ:
2 “Gwunyenụ ihe ga-agbara ndị mmadụ àmà+ n’ugwu bụ́ nkume nkume, nke na-enweghị ihe kpuchiri ya.
Kpọọnụ ha. Feerenụ ha aka,
Ka ha bata n’ọnụ ụzọ nke ndị a ma ama.
3 Enyela m ndị m họpụtara* iwu.+
Akpọkọọla m ndị agha m, ndị ji nganga na-enwe aṅụrị,
Ka m si n’aka ha gosi na iwe ji m.
4 Geenụ ntị! E nwere ndị nọ n’ugwu.
Ha na-eme mkpọtụ ka ndị dị ọtụtụ.
Geenụ ntị! Alaeze dị iche iche na-eme mkpọtụ.
Mba ndị a kpọkọtara na-emekwa mkpọtụ.+
Jehova nke ụsụụ ndị agha na-akpọkọta ndị agha ka ha gaa agha.+
O si na nsọtụ eluigwe na-abịa
Ibibi ụwa niile.+
6 Besienụ ákwá ike, n’ihi na ụbọchị Jehova dị nso.
N’ụbọchị ahụ, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ga-ebibi ihe niile dị n’ala unu.+
Ihe ọdụdọ na-adọ ha. Ahụ́ na-egbukwa ha mgbu
Ka nwaanyị na-amụ nwa.
Ha kporopụrụ anya na-ele ibe ha.
Ihu ha achagharịakwala n’ihi nhụsianya.
9 Ụbọchị Jehova na-abịa,
Ọ ga-adị egwu n’ihi na ọ ga-eji iwe na ọnụma bịa.
Ihe a ga-eme ala a n’ụbọchị ahụ ga-eju ndị mmadụ anya.+
A ga-ebibikwa ndị mmehie nọ n’ala a.
10 Kpakpando ndị dị n’eluigwe, ma ndị nke a na-akpọ ìgwè kpakpando Kisịl,*+
Agaghị enye ìhè ha na-enye.
Anyanwụ ga-agbakwa ọchịchịrị mgbe ọ na-awa,
Ọnwa agaghịkwa enye ìhè ọ na-enye.
M ga-eme ka ndị mpako kwụsị ịkpa nganga,
M ga-ewedakwa ndị mpako na-achị n’aka ike ala.+
13 N’ụbọchị mụnwa, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ga-ewe ezigbo iwe,
M ga-eme ka eluigwe maa jijiji,+
Meekwa ka ụwa mee mkpatụ, si na ntọala ya pụọ.
14 Onye ọ bụla ga-agbakwuru ndị nke ya,
Onye ọ bụla ga-agbala n’ala ya,+
Dị ka nne mgbada a na-achụ ọsọ, nakwa dị ka ìgwè atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.
16 A ga-anọ n’ihu ha kụgbuo ụmụ ha.+
A ga-akwakọrọ ihe niile dị n’ụlọ ha.
A ga-edinakwa ndị nwunye ha n’ike.
17 M ga-eme ka ndị Midia lụso ha agha.+
Ndị Midia ejighị ọlaọcha kpọrọ ihe.
Ha enweghịkwa mmasị ọ bụla n’ọlaedo.
18 Ha ga-eji ụta ha gbajaa ụmụ okorobịa.*+
Ha agaghị emere ụmụ ndị Babịlọn ebere.
Ha agaghịkwa emewe ụmụ ha ihe lee anya n’azụ.
19 Babịlọn, nke bụ́ alaeze kacha dị ebube,*+
Ọmarịcha obodo ndị Kaldia* ji akpa nganga,+
Ga-adị otú Sọdọm na Gọmọra dị mgbe Chineke bibiri ha.+
20 O nweghị ihe ga-eme ka mmadụ biri na ya ọzọ.
Ọ gaghịkwa abụ ebe a ga-ebi ebi n’ọgbọ niile.+
E nweghị onye Arab ga-ama ụlọikwuu ya ebe ahụ.
E nweghịkwa onye na-azụ atụrụ ga-ahapụ atụrụ ya ka ha nọrọ ebe ahụ zuo ike.
21 Anụ ọhịa ndị na-ebi n’ọzara ga-amakpu ebe ahụ.
Ikwiikwii ga-ejupụta n’ụlọ ha.
22 Anụ dị iche iche ga-anọ n’ụlọ elu ndị dị na ya na-eti mkpu.
Nkịta ọhịa ga na-anọkwa n’ọmarịcha obí eze ndị dị na ya.
Oge ihe ndị a ga-eme ya dị nso, a gaghịkwa agbatịkwuru ya ụbọchị.”+
14 Jehova ga-emere Jekọb ebere,+ họrọkwa Izrel ọzọ.+ Ọ ga-eme ka ha biri* n’ala ha.+ Ndị mbịarambịa ga-agakwurukwa ndị ezinụlọ Jekọb, ha na ha ebiri.+ 2 Ndị obodo dị iche iche ga-edulata ha n’obodo ha. Ndị ezinụlọ Izrel ga-akpọrọkwa ha ka ha bụrụ ndị nwoke na ndị nwaanyị ga na-eje ozi+ n’ala Jehova. Ndị ha na-agbaburu ohu ga na-agbaziri ha ohu, ndị na-amanyebu ha ịrụ ọrụ ga-anọzi n’okpuru ha.
3 Mgbe Jehova ga-eme ka nsogbu unu na ihe na-egbu unu mgbu kwụsị, meekwa ka unu kwụsị ịgba ohu,+ 4 unu ga-amalite ịma eze Babịlọn njakịrị, sị:
“Ehee, nke onye na-amanye ndị ọzọ ịrụ ọrụ agwụla.
Mmegbu alaala.+
6 O bibiela onye na-eji ezigbo iwe eti ndị dị iche iche ihe n’akwụsịghị akwụsị,+
Onye ji iwe na-echi mba dị iche iche ọnụ n’ala n’eleghị anya n’azụ.+
7 Ugbu a, ụwa niile ezurula ike, daakwa jụụ.
Ndị mmadụ na-etikwa mkpu ọṅụ.+
8 Osisi junipa na osisi sida ndị dị na Lebanọn
Sodị na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe mere gị.
Ha na-asị, ‘Kemgbe ị dara,
O nweghị onye na-egbutu osisi nke na-abịa egbutu anyị.’
Ọ bụ gị mere o ji kpọtee ndị nwụrụ anwụ,
Ya bụ, ndị niile ji aka ike chịa ụwa.*
O mekwara ka ndị eze niile na-achị mba dị iche iche bilie n’ocheeze ha.
10 Ha niile malitere ịsị gị,
‘Ike ọ̀ gwụla gị otú ọ gwụrụ anyị?
Ị̀ dịzi ka anyị?
11 Nganga gị ebiela.
A naghịzi anụ ụda ụbọ akwara gị.*+
A gbasaala ikpuru n’okpuru gị ka i dinara n’elu ya.
Ikpuru ekpuchiekwala gị.’
12 Nwa chi ọbụbọ, onye na-enwu ka kpakpando,
Ị̀ hụla ka i si si n’eluigwe daa?
Onye meriri mba niile,
Ị̀ hụla ka i si daruo ala?+
13 I kwuru n’obi gị, sị: ‘M ga-agbago n’eluigwe.+
M ga-ebuli ocheeze m ka ọ dị elu karịa kpakpando Chineke.+
M ga-anọdụ ala n’ugwu nzukọ,
N’ime ime ebe ugwu.+
14 M ga-agafe ígwé ojii, gbagoo n’eluigwe.
M ga-eme onwe m ka m yie Onye Kacha Elu.’
16 Ndị na-ahụ gị ga-ekporopụ anya na-ele gị.
Ha ga-eleru gị anya ma sị,
‘Ọ̀ bụ onye a bụ onye ahụ nọ na-eme ka ụwa maa jijiji,
Onye nọkwa na-emenye alaeze dị iche iche ụjọ?+
17 Ọ̀ bụ ya bụ onye mere ka ụwa niile dị ka ala ịkpa,
Meriekwa obodo ndị dị na ya,+
Onye na-anaghịkwa ekwe ahapụ ndị o ji eji ka ha laa?’+
18 A kwanyeere ndị eze niile ọzọ chịrị mba dị iche iche ùgwù
Mgbe a na-eli ha.
N’eziokwu, a kwanyeere onye nke ọ bụla n’ime ha ùgwù.
19 Ma, e lighị gịnwa eli.
A tụfuru gị ka ome* na-abaghị uru.
Ndị e ji mma agha magbuo, ndị a tụbara n’olulu bụ́ okwute okwute
Kpuchiri gị ka ákwà.
Ị dị ka ozu a na-azọ ụkwụ.
20 E liri ndị eze ndị ahụ eli, ma, a gaghị eli gịnwa eli,
N’ihi na i bibiri ala gị,
Gbuokwa ndị nke gị.
O nweghị mgbe ọzọ a ga-echeta aha ụmụ ndị na-eme ihe ọjọọ.
21 Rụọnụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya
Maka ihe ọjọọ ndị nna nna ha mere.
Igbu ha ga-eme ka ha ghara ibili weghara ụwa,
Ebe niile n’ụwa abụrụzie obodo ha.”
22 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “M ga-emesi ha ike.”+
Jehova kwukwara, sị: “M ga-ehichapụ aha Babịlọn, bibiekwa ndị ya fọrọnụ, ma ụmụ ha ma ụmụ ụmụ ha.”+
23 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “M ga-eme ka ọ bụrụ ebe ebi ogwu ga-ebi, meekwa ka ọ bụrụ ọdọ mmiri ahịhịa juru. M ga-ebibikwa ya kpamkpam.”*+
24 Jehova nke ụsụụ ndị agha ṅụrụ iyi, sị:
“Ọ bụ ihe m zubere ga-eme.
Ọ bụkwa ihe m kpebiri ga-eme.
M ga-ewepụ yok ọ nyawara ndị m,
Butuokwa ibu o bukwasịrị n’ubu ha.”+
26 Ihe a ka e kpebiri ime ụwa niile.
Ihe a bụkwa aka a gbatịrị iji mee mba niile ihe.
Ọ gbatịakwala aka ya.
Ònyekwa ga-emeli ka o weghachi ya?+
28 N’afọ Eze Ehaz nwụrụ,+ Chineke kwuru ihe a:
29 “Ndị Filistia, ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịṅụrị ọṅụ
N’agbanyeghị na a gbajiela mkpara onye na-apịa unu ihe.
30 Ụmụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ga-eriju afọ.
Ndị ogbenye ga-edinakwa ala, obi eruo ha ala,
Ma, m ga-eji ụnwụ gbuo ndị gị.
A ga-egbukwa ndị gị fọrọnụ.+
31 Ọnụ ụzọ ámá, besie ákwá ike. Obodo, beekwa ákwá.
Ndị Filistia, obi ga-awụnye unu niile n’afọ.
N’ihi na ndị agha si n’ebe ugwu na-abịa ka anwụrụ ọkụ.
E nweghịkwa onye ọ bụla n’ime ha na-aga nọrọ iche.”
32 Gịnị ka ha ga-agwa ndị ozi mba ahụ zitere?
Ha ga-agwa ha na Jehova atọọla ntọala Zayọn,+
Nakwa na ndị ya ọ na-enweghị ka ọ hà ha ga-agbaba n’ime ya.
15 Ihe Chineke kpebiri ime Moab:+
Aa,+ bụ́ obodo dị na Moab, adaala jụụ,
N’ihi na e bibiela ya n’otu abalị.
Kia,+ bụ́ obodo dị na Moab, adaakwala jụụ,
N’ihi na e bibiela ya n’otu abalị.
Moab na-ebesi ákwá ike n’ihi ihe mere Nibo+ na Medeba.+
Isi ndị niile nọ n’ime ya kwọchara akwọcha.+ A kpụrụ afụ ọnụ ọ bụla akpụ.+
3 Ha yi ákwà iru uju nọrọ n’okporo ámá ndị dị n’obodo ha.
Ha nọ n’ámá obodo ha nakwa n’elu ụlọ ndị dị n’obodo ha na-eti mkpu ákwá.
Ha begidere ákwá tụbọọ.+
4 Heshbọn na Iliele+ na-ebesi ákwá ike.
Ndị nọ na Jehaz na-anụchadị olu ha.+
Ọ bụ ya mere ndị agha Moab ji na-eti mkpu.
Ha* na-ama jijiji.
5 Obi agbawaala m n’ihi ihe mere Moab.
Ndị si na Moab gbapụ gbaruchara Zoa+ na Eglat-shelaịshiya.+
Ha beere ákwá na-agbago Luhit.
Ha na-ebesi ákwá ike maka ọdachi ahụ ka ha na-aga Họroneyim.+
6 Mmiri Nimrim ataala.
Ahịhịa ndụ akpọnwụọla,
Ahịhịa adịghịzi. E nweghịzi ihe na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ.
7 Ọ bụ ya mere ha ji na-eburu akụnụba ha na ihe fọrọ n’ebe ha na-akwasa ihe.
Ha na-agafe ndagwurugwu osisi pọpla juru.
8 Ndị nọ n’obodo niile dị na Moab na-anụ mkpu ákwá a na-eti na ya.+
Ndị nọ n’Egleyim na-anụ mkpu ákwá a.
Ndị nọ na Bia-ilim na-anụkwa mkpu ákwá a.
9 Mmiri Daịmọn bụzi ọbara ọbara.
Ihe ọzọ so n’ihe Chineke ga-eme ndị Daịmọn bụ
Na ọdụm ga-adọri ma ndị Moab gbapụrụ agbapụ
Ma ndị fọdụrụ n’ala ha.+
16 Sinụ Sila kpụtara onye na-achị ala a ebule.
Kpụtanụ ya n’ugwu Zayọn.
Sinụ n’ụzọ ala ịkpa kpụta ya.
2 Otú ahụ ọ na-adị nnụnụ a chụpụrụ n’akwụ́ ya+
Ka ọ ga-adị ndị Moab n’ebe a na-eji ụkwụ agafe mmiri Anọn.+
3 “Kwuo ihe a ga-eme. Mee ihe e kwuru na a ga-eme.
Mee ka ndò gị nke dị ka ọchịchịrị gbara n’abalị kpuchie ndị mmadụ n’etiti ehihie.
Zoo ndị a chụsara achụsa. Enyefekwala ndị na-agba ọsọ n’aka ndị na-achụ ha.
4 Moab, ka ndị m a chụsara achụsa biri na gị.
Bụrụ ebe ha ga-agbaba zoo n’ihi onye na-ebibi ihe.+
Onye na-emegbu ndị mmadụ ga-ala n’iyi.
A ga-akwụsị ibibi ihe.
A ga-ebibi ndị na-azọgbu ndị ọzọ, ha agharazie ịnọ n’ụwa.
5 Otu eze nke si n’ezinụlọ Devid ga-anọdụ n’ocheze. O nweghịkwa aka ga-akpa ọchịchị ya.
Ọ ga na-erube isi, jirikwa ịhụnanya na-achị.+
Ọ ga na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ihe dị mma n’egbughị oge.”+
6 Anyị anụla gbasara nganga ndị Moab na-akpa. Ha dị ezigbo mpako.+
Anyị anụkwala gbasara mpako ha na nganga ha na ezigbo iwe ha na-ewe.+
Ma, ọnụ ha na-etu bụ na nkịtị.
7 Ndị Moab ga-eti mkpu ákwá n’ihi ihe ga-eme ha.
Ha niile ga-eti mkpu ákwá.+
Ndị e tiri ihe ga-ebe ákwá n’ihi keeki mkpụrụ vaịn kpọrọ nkụ si Kia-hareset.+
8 Ubi vaịn ndị dị na Heshbọn+ akpọnwụọla.
Osisi vaịn dị na Sibma akpọnwụọkwala.+
Ndị na-achị mba dị iche iche azọjiela alaka ya ndị nwere ọmarịcha mkpụrụ vaịn.
Alaka ndị ahụ gbasara ruo Jeza.+
Ha gbasara ruo n’ala ịkpa.
Ha gbasara ruodị n’oké osimiri.
9 Ọ bụ ya mere m ga-eji beere osisi vaịn dị na Sibma ákwá otú m beere Jeza.
M ga-eji anya mmiri m dee unu, Heshbọn na Iliele,+
N’ihi na unu akwụsịla mkpu unu na-eti n’oge mkpụrụ osisi mịịrị unu n’ọkọchị nakwa n’oge unu na-ewe ihe ubi.*
10 Ndị nọ ebe a kụrụ mkpụrụ osisi ga-akwụsị inwe obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ.
O nweghị onye na-abụ abụ ma ọ bụ na-eti mkpu ọṅụ n’ubi vaịn.+
O nweghị onye na-azọcha mkpụrụ vaịn ka mmanya gbapụta n’ebe a na-azọcha ya.
N’ihi na emeela m ka a kwụsị iti mkpu.+
Obi na-akụkwa m kpum kpum n’ihi Kia-hareset.+
12 Ọ bụrụgodị na ndị Moab na-aga efe chi ha n’ebe dị elu ruo mgbe ike gwụrụ ha, na-agakwa ekpe ekpere n’ụlọ arụsị ha, o nweghị uru ọ ga-abara ha.+
13 Ihe a ka Jehova kwuburu gbasara Moab. 14 Ma ugbu a, Jehova kwuru, sị: “Moab dị ebube, ma a ga-eji ọgba aghara na-enweghị atụ menye ya ihere tupu afọ atọ agafee. A ga-agụ afọ atọ a otú onye e goro ọrụ si agụ oge.* Ọ bụkwa mmadụ ole na ole na-adịghị ike ga-afọ na Moab.”+
17 Ihe Chineke kpebiri ime Damaskọs:+
“Damaskọs agaghịzi abụ obodo.
Ọ ga-abụzi ebe e bibiri ebibi.+
2 Ndị niile bi n’obodo ndị dị n’Aroa+ ga-agbapụcha.
Ebe ndị ahụ ka ìgwè anụ ga na-amakpuzi.
E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ.
3 Obodo ndị a rụsiri ike agaghịzi adị n’Ifrem.+
Alaeze dị na Damaskọs agaghịkwa adị.+
Ndị Siria fọrọnụ
Ga-adị ebube otú ndị Izrel dị.” Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru ihe a.
4 “N’oge ahụ, a ga-eme ka Jekọb ghara ịdịcha ebube.
A ga-emekwa ka ọ taa ahụ́.
5 Ọ ga-adị ka mgbe onye na-ewe ihe ubi na-achịkọta ọka* kwụ ọtọ,
Mgbe o jikwa aka ya na-ewekọta ụyọkọ ọka.
Ọ ga-adịkwa ka mgbe mmadụ na-atụtụkọta ọka ndị a hapụrụ n’ubi dị na Ndagwurugwu Refeyim.+
6 Naanị ihe ga-afọ bụ ihe ndị a hapụrụ n’ubi,
Dị ka mgbe a kụtuchara mkpụrụ dị n’osisi oliv:
Naanị mkpụrụ oliv abụọ ma ọ bụ atọ chara acha afọdụ n’alaka ya nke dị n’elu elu,
Naanị mkpụrụ anọ ma ọ bụ ise afọdụ n’alaka ya ndị na-amị mkpụrụ.”+ Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru ihe a.
7 N’ụbọchị ahụ, mmadụ ga-atụkwasị Onye kere ya obi, na-atụkwa anya ka Onye Nsọ Izrel nyere ya aka. 8 Ọ gaghị atụkwasị ebe ịchụàjà o ji aka ya rụọ obi.+ Ọ gaghịkwa atụ anya ka ihe mkpịsị aka ya mere nyere ya aka, ma ogwe osisi arụsị* ma ihe ndị e ji adọsa insens.
9 N’oge ahụ, obodo ya ndị a rụsiri ike ga-adị ka ụlọ ndị a hapụrụ n’oké ọhịa.+
Ha ga-adịkwa ka alaka a hapụrụ n’ihi ndị Izrel.
Ala ya agaghịzi na-eme nri.
10 N’ihi na o chefuola Chineke+ zọpụtara ya.
O chetaghị Oké Nkume,+ bụ́ ebe ya a rụsiri ike.
Ọ bụ ya mere o ji kụọ osisi mara mma n’ubi,
Kụọkwa osisi ndị mba ọzọ* na ya.
11 N’ehihie, ọ gbara ubi ya ogige nke ọma.
N’ụtụtụ, o mere ka mkpụrụ ọ kụrụ puo.
Ma, o nweghị ihe a ga-eweta n’ubi ahụ mgbe ọ na-arịa ezigbo ọrịa nakwa mgbe ya na ihe mgbu na-enweghị ngwọta na-alụ.+
12 Geenụ ntị! Ọtụtụ ndị na-agba aghara.
Ha na-agba aghara ka ebe oké osimiri na-amali elu.
Mba dị iche iche na-emekwa mkpọtụ.
Ha na-eme mkpọtụ ka ebili mmiri.
13 Mba dị iche iche ga-eme mkpọtụ ka ebili mmiri.
Chineke ga-abara ha mba, ha agbaga ebe dị anya.
A ga-achụkwa ha ọsọ otú ifufe si ebupụ mkpo ọka dị n’ugwu
Nakwa otú oké ifufe si eme ka ahịhịa ogwu na-agba gburugburu.
14 Mgbe chi jiri, a ga-enwe ọdachi.
Tupu chi abọọ, ndị iro agaghịzi adị.
Ihe a ka a ga-eme ndị meriri anyị
Nakwa ndị na-ebukọrọ ihe anyị.
18 Ala ihe juru na ya bụ ụkpara ndị na-eme ụzụ ga-ata ahụhụ,
Ya bụ, ala dị nso n’osimiri ndị dị n’Etiopia.+
2 Ọ bụ ya na-ezi ndị mmadụ ka ha si n’oké osimiri
Jiri ụgbọ mmiri ndị e ji ahịhịa papaịrọs rụọ gaa ebe ọ gwara ha.
Ọ gwara ha, sị: “Unu ndị ozi nwere ụkwụ ọsọ,
Gakwurunụ mba e nwere ndị toro ogologo na ndị ahụ́ ha na-akwọ mụrụmụrụ,
Ndị a na-atụ egwu n’ebe niile,+
Mba siri ezigbo ike, nke na-emerikwa ndị ọzọ,
Ndị osimiri buuru ala ha.”
3 Unu niile ndị bi n’elu ala na unu ndị bi n’ụwa.
Unu ga-ahụ ihe yiri ihe na-agba àmà e gwunyere n’elu ugwu.
Unu ga-anụkwa ụda nke na-ada ka mgbe a na-afụ opi.
4 Jehova gwara m, sị:
“M ga-anọ jụụ na-ele ebe m bi anya.*
Ọ ga-adị ka oké okpomọkụ nke na-adị ma anwụ chawa.
Ọ ga-adịkwa ka igirigi nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi n’ọkọchị.
5 N’ihi na mgbe okooko osisi tozuru okè, mkpụrụ vaịn ebido chawa,
Tupu e wewe ihe ubi,
Mmadụ ga-ejikwa mma e ji akwa osisi gbupụ ntakịrị alaka ya,
Gbupụkwa ome ya, chịfuo ha.
6 A ga-ahapụ ozu ha ka nnụnụ na-eri anụ rie ha,
Hapụkwa ha ka anụ ọhịa ndị dị n’ụwa rie ha.
Nnụnụ na-eri anụ ga-anọ n’elu ha n’ọkọchị,
Anụ ọhịa niile dị n’ụwa ga-anọkwa n’elu ha n’oge a na-ewe ihe ubi.
7 N’oge ahụ, a ga-ewetara Jehova nke ụsụụ ndị agha onyinye.
Ndị ga-eweta ya bụ mba e nwere ndị toro ogologo na ndị ahụ́ ha na-akwọ mụrụmụrụ,
Ndị a na-atụ egwu n’ebe niile,
Mba siri ezigbo ike, nke na-emerikwa ndị ọzọ,
Ndị osimiri buuru ala ha.
Ha ga-eweta onyinye ahụ n’Ugwu Zayọn, ebe a na-anọ eto aha Jehova nke ụsụụ ndị agha.”+
19 Ihe Chineke kpebiri ime Ijipt:+
Jehova nọ n’elu ígwé ojii nke ji ọsọ na-agbadata n’Ijipt.
Chi na-abaghị uru ndị Ijipt na-efe ga-ama jijiji n’ihi ya.+
Obi ga-awụnyekwa ndị Ijipt n’afọ n’obodo ha.
2 “M ga-eme ka ndị Ijipt lụso ndị Ijipt agha.
Ha ga-alụso ibe ha agha.
Nwanne ga-alụso nwanne ya agha. Mmadụ ga-alụsokwa onye agbata obi ya agha,
Obodo ga-alụso obodo ibe ya agha. Eze ga-alụsokwa eze ibe ya agha.
Ha ga-agakwuru chi ndị na-abaghị uru,
Ndị na-eme anwansi, ndị na-agba afa, na ndị na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.+
4 M ga-enyefe ndị Ijipt n’aka nna ukwu dị obi ọjọọ.
Eze dị aka ike ga na-achịkwa ha.”+ Ọ bụ ezi Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru ihe a.
5 Oké osimiri ga-ata.
Osimiri ga-atakwa, ala ya akpọọ nkụ.+
6 Osimiri dị iche iche ga na-esi ísì.
Ọwa mmiri niile ndị na-asọnye n’osimiri Naịl dị n’Ijipt ga-ata, ala ha akpọọ nkụ.
Ahịhịa amị na achara ga-erekasịkwa.+
7 Ihe ndị a kụrụ n’akụkụ Osimiri Naịl nakwa n’ọnụ ya ga-akpọnwụ.
Ala niile a kụrụ mkpụrụ n’akụkụ Osimiri Naịl+ ga-akpọkwa nkụ.+
Ifufe ga-efesasị ihe a kụrụ na ha, ha agaghịzi adị.
8 Ndị ọkụ azụ̀ ga-eru uju.
Ndị niile na-atụnye nko azụ̀ n’Osimiri Naịl ga-eru uju.
Ndị na-agbasakwa ụgbụ azụ̀ n’elu ya ga-adịzi ole na ole.
9 Ihere ga-eme ndị na-eji ogho ekwe ákwà.+
Ihere ga-emekwa ndị na-ekwe ákwà ọcha.
10 Obi ga-agbawa ndị ya na-akpa ákwà.
Obi agaghịkwa adị ndị ọrụ niile e goro ego mma.
Ndụmọdụ nke ndị kacha mara ihe n’ime ndị ndụmọdụ Fero anaghị enwe isi na ọdụ.+
Olee otú onye ọ bụla n’ime unu ga-esi asị Fero:
“Abụ m nwa ndị ma ihe,
Nwa ndị eze oge ochie”?
12 Fero, oleezi ebe ndị gị ma ihe nọ?+
Ka ha kọọrọ gị ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kpebiri ime Ijipt ma ọ bụrụ na ha ma.
13 Ndị isi Zoan ezuzuola nzuzu.
Ndị isi ndị Ijipt eduhiela ndị Ijipt.
14 Jehova etigharịala ha anya.+
Ndị isi ahụ eduhiela ndị Ijipt n’ihe ọ bụla ha na-eme,
Otú ahụ onye mmanya na-egbu si adagharị na-azọ ụkwụ n’agbọ ọ gbọrọ.
15 E nweghị ihe ndị Ijipt ga-emeli,
Ma onyeisi ma onye ọdụ, ma alaka osisi ma achara.
16 N’oge ahụ, ndị Ijipt ga-adị ka ụmụ nwaanyị. Ha ga na-ama jijiji, ụjọ ana-atụkwa ha n’ihi aka Jehova nke ụsụụ ndị agha na-atụ ha iji menye ha egwu.+ 17 Ala Juda ga-emenye ndị Ijipt ụjọ. Ụjọ ga-ejide ha ma a kọọrọ ha ya, ebe ọ bụ na ha ma ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kpebiri ime ha.+
18 N’oge ahụ, obodo ise dị n’Ijipt ga na-asụ asụsụ ndị Kenan,+ ṅụọkwara Jehova nke ụsụụ ndị agha iyi na ha ga na-efe naanị ya. A ga-akpọ otu n’ime ha Obodo Ntida.
19 N’oge ahụ, a ga-arụrụ Jehova ebe ịchụàjà n’etiti ala ndị Ijipt, rụọkwara Jehova ogidi n’ókè Ijipt. 20 Ha ga-abụ ihe ga-eme ka ndị mmadụ na-echeta Jehova nke ụsụụ ndị agha n’Ijipt. Ha ga-arịọkwa Jehova ka ọ napụta ha n’aka ndị na-emegbu ha. Ọ ga-ezigakwara ha onye nzọpụta, bụ́ onye ukwu, onye ga-anapụta ha. 21 N’oge ahụ, Jehova ga-eme ka ndị Ijipt mara ya. Ndị Ijipt ga-amarakwa Jehova. Ha ga-achụrụ ya àjà, nyekwa ya onyinye. Ha ga-ekwe Jehova nkwa, mezuokwa ya. 22 Jehova ga-ata ndị Ijipt ahụhụ.+ Ọ ga-eti ha ihe, gwọọkwa ha. Ha ga-alọghachikwute Jehova. Ọ ga-anabata arịrịọ ha, gwọọkwa ha.
23 N’oge ahụ, a ga-enwe okporo ụzọ+ ga-esi Ijipt gaa Asiria. Ndị Asiria ga-abata n’Ijipt, ndị Ijipt abatakwa n’Asiria. Ndị Ijipt na ndị Asiria ga na-efe Chineke. 24 N’oge ahụ, ndị Izrel ga-emezu ndị Ijipt na ndị Asiria atọ.+ A ga-ejikwa ha gọzie ụwa, 25 n’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-agọzi ha, sị: “Agọziela m ndị Ijipt, bụ́ ndị m, gọzie ndị Asiria, bụ́ ọrụ aka m, gọziekwa ndị Izrel, bụ́ ndị nke m.”+
20 N’afọ Sagọn eze Asiria ziri Tatan* ka ọ gaa lụso ndị Ashdọd agha,+ Tatan gara merie ha.+ 2 N’oge ahụ, Jehova gwara Aịzaya+ nwa Emọz, sị: “Gaa tọpụ ákwà iru uju i kere n’úkwù, yipụkwa akpụkpọ ụkwụ i yi n’ụkwụ.” Aịzaya mekwara otú ahụ, gbara ahụ́ ọtọ* na ụkwụ efu na-agagharị.
3 Jehova kwuziri, sị: “Ahụ́ ọtọ a na ụkwụ efu a Aịzaya ohu m gba na-agagharị ruo afọ atọ bụ ihe na-egosi ihe ga-eme+ Ijipt+ na Etiopia.+ 4 Eze Asiria ga-eduru ndị Ijipt+ na ndị Etiopia a dọọrọ n’agha laa, ma ụmụaka ma ndị agadi. Ha ga-agbacha ụkwụ efu, gbarakwa ahụ́ ọtọ, a na-ahụ ikè ha anya. N’eziokwu, a ga-emenye ndị Ijipt ihere.* 5 Ndị tụkwasịrị Etiopia obi, jirikwa Ijipt na-eme ọnụ,* ga na-atụ ụjọ, ihere ana-emekwa ha. 6 N’oge ahụ, ndị bi n’obodo a dị n’akụkụ osimiri ga-asị, ‘Legodị ihe mere ndị anyị tụkwasịrị obi, ndị anyị gbakwuuru ka ha nyere anyị aka ma napụta anyị n’aka eze Asiria. Ọ̀ bụzi anyịnwa ka aka na-agaghị akpa?’”
21 Ihe Chineke kpebiri ime ala ịkpa nke dị ka oké osimiri:*+
E nwere ọdachi si n’ala ịkpa nakwa n’ala na-atụ ụjọ na-abịa
Otú oké ifufe nke na-efe n’ebe ndịda si aga.+
2 E nwere ọhụụ na-emenye ụjọ e mere ka m hụ:
Onye aghụghọ ka na-aghọ aghụghọ.
Onye na-ebibi ihe ka na-ebibi ihe.
Ịlam, gaa agha! Midia, nọchibido obodo!+
M ga-eme ka ude niile o* mere ka ndị mmadụ na-asụ kwụsị.+
3 Ọhụụ a emeela ka m hụsie anya.*+
Ahụ́ niile na-egbu m mgbu
Otú o si egbu nwaanyị mgbe ọ na-amụ nwa.
Anaghịzi m anụ ihe maka na obi erughị m ala.
Anaghịzi m ahụ ụzọ maka na isi na-agba m ghara ghara.
4 Obi anaghịzi ezu m ike. M na-amakwa jijiji n’ihi ụjọ.
Chi ojiji nke na-amasịbu m na-emezi ka m na-ama jijiji.
5 Doonụ tebụl n’usoro, haziekwanụ oche.
Na-erinụ ihe, na-aṅụkwanụ mmanya.+
Ndị isi, bilienụ tee ọta mmanụ.
6 N’ihi na Jehova gwara m, sị:
“Gaa, dowe onye nche ka ọ na-ekwu ihe ọ na-ahụ.”
7 Onye nche ahụ hụkwara ndị nọ n’ụgbọ agha nke ịnyịnya abụọ na-adọkpụ,
Hụkwa ụgbọ agha nke jakị na-adọkpụ,
Na ụgbọ agha nke kamel na-adọkpụ.
O leruru anya ala, geekwa ntị nke ọma.
8 O tiziri mkpu ka ọdụm, sị:
“Jehova, m na-eguzo n’ụlọ nche mgbe niile n’ehihie,
Na-eguzokwa n’ebe m na-anọ eche nche n’abalị ọ bụla.+
9 Legodị ndị na-abịa:
Ha nọ n’ụgbọ ịnyịnya agha nke ịnyịnya abụọ na-adọkpụ na-abịa.”+
O kwukwara, sị:
“Babịlọn adaala! Ọ daala!+
A kụọla arụsị ya niile a pịrị apị, ndị bụ́ chi ya, righirighi, ha awụsara n’ala!”+
10 Unu ndị m a na-azọ ụkwụ ka à na-azọcha ọka,
Ndị dịkwa ka ọka* si n’ebe m na-azọcha ọka,+
Akọọrọla m unu ihe m nụrụ n’ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel.
11 Ihe Chineke kpebiri ime Duma:*
E nwere onye nọ na Sia na-ajụ m,+ sị:
“Onye nche, chi ọ̀ bọwala?
Onye nche, chi ọ̀ bọwala?”
12 Onye nche asị:
“Chi abọwala, chi ga-ejikwa.
Ọ bụrụ na unu chọrọ ịjụ ajụjụ, jụwanụ.
Bịanụ ọzọ.”
13 Ihe Chineke kpebiri ime ọzara:
Ndị Didan, ndị ji kamel ha na-aga njem,
Unu ga-arahụ n’oké ọhịa dị n’ọzara.+
Kuterenụ onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri,
Wetakwaranụ onye na-agba ọsọ ndụ nri ka o rie.
15 Ha gbara ọsọ n’ihi mma agha, n’ihi mma agha a mịpụtara amịpụta,
N’ihi ụta e kwere ekwe nakwa n’ihi otú agha si kpụrụ ọkụ n’ọnụ.
16 Jehova gwara m, sị: “Tupu otu afọ agafee, ihe niile mere ka Kida dịrị ebube+ ga-ala n’iyi. A ga-agụ otu afọ a otú onye e goro ọrụ si agụ oge.* 17 Ndị na-agba ụta n’ime ndị agha Kida ga-afọzi ole na ole, n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke Izrel, ekwuola ya.”
22 Ihe Chineke kpebiri ime Ndagwurugwu Ọhụụ:*+
Gịnị bụ nsogbu gị, nke mere ndị gị niile ji gbagoo n’elu ụlọ?
2 Ebe niile n’obodo gị ga na-agba aghara.
A ga na-eme mkpọtụ, na-enwekwa aṅụrị na ya.
Ọ bụghị mma agha ka a ga-eji gbuo ndị gị a ga-egbu egbu.
Ha agaghịkwa anwụ n’agha.+
3 Ndị niile na-achị gị n’aka ike ga-agba ọsọ otu mgbe.+
A ga-akpụrụ ha n’ejighị ụta.
Ha gbagagodị ebe dị ezigbo anya,
A ga-akpụrụ ndị niile e jidere, tụọ ha mkpọrọ.+
4 Ọ bụ ya mere m ji sị: “Kwụsịnụ ile m anya.
M ga-ebe ezigbo ákwá+
Maka mbibi e bibiri ndị m.
Unu enyela onwe unu nsogbu ịkasi m obi.+
5 N’oge ahụ, Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,
Ga-eme ka ọgba aghara dị, meekwa ka e nwee ndị e meriri na ndị chị obi n’aka+
Na Ndagwurugwu Ọhụụ.
A ga-akwada mgbidi.+
Ndị mmadụ ga na-etikwa mkpu, a na-anụ olu ha n’ugwu.
Kia+ ewepụkwala ihe e ji kpuchie ọta.
7 Ụgbọ ịnyịnya agha ga-ejupụta na
Ndagwurugwu gị ndị kacha mma.
Ịnyịnya agha dị iche iche* ga-anọkwa n’ọnụ ụzọ ámá.
8 A ga-ewepụkwa ihe e ji kpuchie Juda.
“N’oge ahụ, unu lee anya n’ebe a na-edowe ngwá agha n’ụlọ a na-akpọ Ụlọ Oké Ọhịa,+ 9 unu ga-ahụ ọtụtụ ebe gbawara agbawa ná mgbidi Obodo Devid.+ Unu ga-emekwa ka mmiri nke si n’ọdọ mmiri ndịda na-asọba n’otu ebe.+ 10 Unu ga-agụ ụlọ dị na Jeruselem ọnụ, kwatuokwa ụfọdụ n’ime ha iji mee ka mgbidi ahụ sikwuo ike. 11 Unu ga-egwukwa ebe mmiri nke si n’ọdọ mmiri ochie ga na-asọba n’agbata mgbidi abụọ dị n’obodo ahụ. Ma, unu agaghị atụkwasị Onye Ukwu kere ya obi. Unu agaghịkwa ahụ onye ahụ haziri ya kemgbe ụwa.
12 N’oge ahụ, Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha,
Ga-agwa unu ka unu bee ákwá, ruokwa uju.+
Ọ ga-agwakwa unu ka unu kpụchaa isi unu, yirikwa ákwà iru uju.
13 Ma, unu agaghị ekwe, kama, unu ga na-ekpori ndụ, na-aṅụrị ọṅụ,
Na-egbu ehi, na-egbu atụrụ,
Na-eri anụ, na-aṅụkwa mmanya.+
Unu ga-asịkwa: ‘Ka anyị na-eri, na-aṅụ n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.’”+
14 M nụziri ka Jehova nke ụsụụ ndị agha na-ekwu, sị: “‘A gaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo mgbe unu nwụrụ.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru ihe a.”
15 Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị: “Gakwuru Shebna,+ bụ́ onyeisi na-elekọta ụlọ* eze, sị ya, 16 ‘Olee ihe gbasara gị ebe a, oleekwa onye i nwere ebe a, nke mere i ji gwuoro onwe gị ili ebe a?’ Shebna na-egwu ebe a ga-eli ya n’ebe dị elu. Ọ na-awapụtara onwe ya ebe ọ ga-anọ na-ezu ike* n’otu nnukwu nkume. 17 ‘Jehova ga-ejide gị, jirikwa ike tụọ gị n’ala. 18 Ọ ga-afụkọtasi gị ike, tụpụ gị n’ala sara mbara otú e si atụpụ bọl. N’ebe ahụ ka ị ga-anwụ, n’ebe ahụkwa ka ụgbọ ịnyịnya gị dị ebube ga-adị. Ihe a ga-emenye ezinụlọ nna gị ukwu ihere. 19 M ga-achụpụ gị n’isi ị nọ, chụtuokwa gị n’ọkwá.
20 “‘N’oge ahụ, m ga-akpọ onye na-ejere m ozi, bụ́ Elayakim+ nwa Hilkaya, 21 yiwe ya uwe mwụda gị, were ákwà ị na-eke n’úkwù kesie ya ike,+ nyefeekwa ya ọchịchị* gị. Ọ ga-aghọkwara ndị bi na Jeruselem na ezinụlọ Juda nna. 22 M ga-atụkwasị mkpịsị ugodi ụlọ Devid+ n’ubu ya. O nweghị onye ga-emechi ụzọ o meghere. O nweghịkwa onye ga-emeghe ụzọ o mechiri. 23 M ga-eme ka o sie ike ka ntu a kụbara n’ahụ́ ụlọ siri ike. Ọ ga-abụkwara ezinụlọ nna ya ocheeze dị ebube. 24 Ha ga-ekokwasị ya ebube niile ezinụlọ nna ya nwere, ma ụmụ ma ụmụ ụmụ* ma arịa niile dị ntakịrị ma efere ma nnukwu ite niile.
25 “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘N’oge ahụ, a ga-efopụ ntu ahụ a kụbara n’ahụ́ ụlọ siri ike.+ Ọ ga-ada laa n’iyi. Ihe e kokwasịrị n’elu ya ga-adakwa laa n’iyi, n’ihi na Jehova ekwuola ya.’”
23 Ihe Chineke kpebiri ime Taya:+
Unu ụgbọ mmiri si Tashish, tienụ mkpu ákwá,+
N’ihi na e bibiela ọdụ ụgbọ mmiri. A gaghịzi abanye ya abanye.
Na Kitim+ ka a nọ gwa ha ya.
2 Ndị bi n’ala dị n’ụsọ osimiri, nọrọnụ nwayọọ.
Ndị ahịa si Saịdọn,+ ndị na-agafe oké osimiri, ejula n’ime gị.
3 Ihe a ga-akwụ Taya nọ n’elu ọtụtụ mmiri.
4 Saịdọn, bụ́ obodo a rụsiri ike, nke dị n’oké osimiri, ihere mee gị,
N’ihi na oké osimiri kwuru, sị:
5 Obi ga-agbawa ndị mmadụ mgbe ha ga-anụ akụkọ ihe mere Taya,+
Otú ọ gbawara ndị mmadụ mgbe ha nụrụ akụkọ ihe mere Ijipt.+
6 Gafetanụ na Tashish.
Ndị bi n’ala dị n’ụsọ osimiri, tienụ mkpu ákwá.
7 Ihe a ọ̀ bụ obodo unu nke na-akpọtụ akpọtụ kemgbe ọ dịwara?
Ndị bi na ya na-ejibu ụkwụ ha jee ebe dị anya biri.
8 Ònye kpebiri ka e mee Taya ihe a?
Obodo a na-ahọpụta ndị eze.
Ndị ya na-azụ ahịa bụ ndị isi.
Ndị ya na-ere ahịa bụ ndị a na-asọpụrụ n’ụwa niile.+
9 Jehova nke ụsụụ ndị agha ekpebiela
Ịkwụsị nganga ọ na-akpa n’ihi mma niile ọ mara,
Kpebiekwa imenye ndị niile a na-asọpụrụ n’ụwa ihere.+
10 Tashish,* gbasaa gafere ala gị otú Osimiri Naịl na-eme.
E nweghịzi ebe a na-arụ ụgbọ mmiri.*+
11 Chineke agbatịala aka ya n’elu oké osimiri.
O meela ka alaeze dị iche iche maa jijiji.
Jehova enyela iwu ka e bibie ebe ndị a rụsiri ike na Finishia.+
Bilienụ gafee na Kitim.+
Unu gagodị ebe ahụ, ahụ́ agaghị eru unu ala.”
Ọ bụ ndị Kaldia mere ka Taya bụrụ ebe anụ ọhịa ndị na-ebi n’ọzara ga-ebi,
Ọ bụghị ndị Asiria.+
Ha arụọla ụlọ elu ha ji nọchibido ha.
Ha ebukọrọla ihe niile dị n’ụlọ elu ha ndị a rụsiri ike,+
Taya abụrụzie ebe e bibiri ebibi.
15 N’oge ahụ, a ga-echefu Taya ruo afọ iri asaa,+ bụ́ afọ ole otu eze na-adịru ndụ. Afọ iri asaa gachaa, ihe ga-eme Taya ga-adị ka ihe a bụrụ n’abụ banyere nwaanyị akwụna, sị:
16 “Nwaanyị akwụna e chefuru echefu, were ụbọ akwara gazuo obodo.
Kpọọ ụbọ akwara ka onye bụ́ aka ochie.
Gụọ ọtụtụ egwú,
Ka ha wee cheta gị.”
17 Mgbe afọ iri asaa gachara, Jehova ga-echeta Taya. Taya ga-amaliteghachi ịnata ego, ya na alaeze niile nọ n’ụwa ana-akwakwa iko. 18 Ma, uru ọ na-erite na ego a na-akwụ ya ga-abụ ihe dị nsọ n’anya Jehova. A gaghị edowe ha otu ebe, a gaghịkwa ezo ha ezo, n’ihi na ego a ga-akwụ ya ga-abụ nke ndị Jehova. Ha ga-eji ya na-eriju afọ, na-azụrụkwa uwe mara mma.+
24 Jehova ga-eme ka ala* a tọgbọrọ nkịtị, meekwa ka ọ bụrụ ebe e bibiri ebibi.+
Ọ ga-atụgharị ya,+ chụsasịakwa ndị bi na ya.+
2 Otú ihe ga-adịrị otu onye ka ọ ga-adịrị ibe ya:
Ma ndị nkịtị ma onye nchụàjà,
Ma onye na-eje ozi ma nna ya ukwu,
Ma nwaanyị na-eje ozi ma nne ya ukwu,
Ma onye na-azụ ihe ma onye na-ere ere,
Ma onye na-agbazinye ihe ma onye na-agbaziri agbaziri,
Ma onye e ji ụgwọ ma onye ji ụgwọ.+
3 A ga-eme ka ala a tọgbọrọ nkịtị.
A ga-ebukọrọ ihe dị na ya,+
N’ihi na Jehova ekwuola ya.
4 Ala a na-eru uju.*+ O nweghịzi uru ọ bara.
Elu ala akpọọla nkụ. Ike agwụla ya.
Ndị ukwu nọ n’ala a ataala ahụ́.
6 Ọ bụ ya mere e ji bụọ ala a ọnụ, ya alaa n’iyi.+
Ikpe makwara ndị bi na ya.
Ọ bụ ya mere ndị bi na ya ji belata,
Mmadụ ole na ole afọdụzie na ya.+
7 Mmanya ọhụrụ na-eru uju.* Osisi vaịn akpọnwụọla.+
Ndị niile obi na-atọbu ụtọ na-asụzi ude.+
8 Aṅụrị a na-enwe ma a kụwa obere ịgbà akwụsịla.
Mkpọtụ nke ndị na-eme oriri akwụsịla.
Aṅụrị a na-enwe ma a kpọwa ụbọ akwara akwụsịla.+
9 Ha anaghịzi agụ egwú mgbe ha na-aṅụ mmanya.
Mmanya na-eluzi ndị na-aṅụ ya ilu.
10 E meela ka obodo na-enweghịzi ndị bi na ya ghasaa.+
E mechiela ụlọ niile ka mmadụ ghara ịbanye na ha.
11 Ha na-eti mkpu ákwá n’okporo ámá n’ihi ụkọ mmanya.
Aṅụrị niile a na-enwe akwụsịla.
Aṅụrị a na-enwe n’ala a akwụsịla.+
12 E meela ka obodo a ghọọ ikpo nkume.
A kụọla ọnụ ụzọ ámá ya righirighi, ya aghọọ ikpo nkume.+
13 N’ihi na otú a ka ọ ga-adị ná mba ndị ọzọ n’ụwa a:
Ọ ga-adị ka mgbe a kụtuchara mkpụrụ dị n’osisi oliv,+
Ọ ga-adịkwa ka mkpụrụ ole na ole fọrọ n’osisi vaịn mgbe a ghọchara mkpụrụ ya.+
14 Ndị mmadụ ga-eti mkpu ọṅụ
N’olu dara ụda.
Ha ga-esi n’oké osimiri* kọsaa na Jehova dị ebube.+
15 Ha ga-esi n’ebe ọwụwa anyanwụ+ too Jehova.
Ha ga-esikwa n’agwaetiti oké osimiri too aha Jehova, bụ́ Chineke Izrel.+
16 Anyị na-anụ egwú a nọ ebe ụwa sọtụrụ na-agụ:
“Ka E Too Onye Ezi Omume!”+
Ma m sịrị: “Nke m na-eme agwụla. Nke m na-eme agwụla!
Efuola m! Ndị aghụghọ aghọọla aghụghọ.
Ndị aghụghọ aghọọla aghụghọ.”+
17 Ndị bi n’ala a, unu ga-atụ ụjọ, daba n’olulu, maakwa n’ọnyà.+
18 Onye ọ bụla nke na-agba ọsọ n’ihi mkpu na-emenye ụjọ a na-eti ga-adaba n’olulu.
Ọnyà ga-amakwa onye ọ bụla nke si n’olulu ahụ na-apụta,+
N’ihi na a ga-emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke dị n’elu.
Ntọala niile nke ala a ga-amakwa jijiji.
19 Ala a agbabiela.
A yọgharịala ya.
Ọ na-amazi jijiji.+
20 Ala na-adagharị ka onye mmanya na-egbu.
Ọ na-ete kweke kweke ka obere ụlọ ifufe na-ebugharị.
Mmehie ya na-anyịgbukwa ya.+
Ọ ga-ada. Ọ gaghịkwa ebilite ọzọ.
21 N’oge ahụ, Jehova ga-elebara ndị agha nọ n’elu anya,
Lebakwara ndị eze nọ n’ụwa anya.
22 A ga-achịkọta ha
Otú e si achịkọta ndị mkpọrọ n’olulu.
A ga-akpọchikwa ha n’ụlọ mkpọrọ.
A ga-elebara ha anya ma ọtụtụ ụbọchị gachaa.
23 Jehova nke ụsụụ ndị agha abụrụla Eze+ n’Ugwu Zayọn+ nakwa na Jeruselem.
Ọchịchị ya ga-adị ebube n’anya ndị okenye ndị ya.*+
N’ihi otú ọchịchị ya si dị ebube, ọnwa gbazuru agbazu ga-agba ọchịchịrị.
Anyanwụ na-achasi ike ga-agbakwa itiri.+
25 Jehova, ị bụ Chineke m.
Ana m eto gị, na-etokwa aha gị,
N’ihi na i meela ihe ndị dị ebube,+
Ihe ndị i bu n’obi ime kemgbe oge ochie.+
I meela ihe i kwuru,+ gosikwa na e kwesịrị ịtụkwasị gị obi.
2 I meela ka otu obodo bụrụ ikpo nkume,
Mee ka obodo a rụsiri ike bụrụ ebe e bibiri ebibi,
Meekwa ka ụlọ elu ndị mba ọzọ bi gharazie ịdị adị.
O nweghị ihe ga-eme ka a rụghachi obodo ahụ.
3 N’ihi ya, ndị siri ike ga-eto gị.
Obodo ndị obi tara mmiri ga-atụ egwu gị.+
4 N’ihi na ị bụụrụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebe a rụsiri ike,
Bụụrụ ogbenye ebe a rụsiri ike n’oge ọ na-ata ahụhụ.+
Ị bụ ebe ha na-agbaba zere nnukwu mmiri ozuzo
Na ndò ha na-agbaba zere anwụ.+
Mgbe ndị aka ike wesara ha iwe, ya adị ka mgbe nnukwu mmiri na-ezo n’elu mgbidi, ị na-echebe ha.
5 Otú ahụ ndò ígwé ojii na-eme ka
Okpomọkụ nke dị n’ala kpọrọ nkụ kwụsị,
Ka ị na-akwụsị mkpọtụ ndị ala ọzọ na-eme,
Na-akwụsịkwa egwú ndị aka ike na-agụ.
6 N’ugwu a+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emere mmadụ niile
Nnukwu oriri nke ha ga-eri nri na-edozi ahụ́+
Na nnukwu oriri ha ga-aṅụ mmanya dị mma.*
Ọ ga-enyekwa ha nri ụmị anụ juru na ya,
Nyekwa ha ezigbo mmanya a zara aza.
8 Ọ ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị* ruo mgbe ebighị ebi.+
Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri dị n’ihu mmadụ niile.+
Ọ ga-emekwa ka a kwụsị imenye ndị ya ihere n’ụwa niile.
Ihe a ga-eme maka na Jehova ekwuola ya.
9 N’oge ahụ, ha ga na-ekwu, sị:
“Onye a bụ Chineke anyị.+
Anyị tụkwasịrị ya obi.+
Ọ ga-azọpụtakwa anyị.+
Onye a bụ Jehova.
Anyị tụkwasịrị ya obi.
Ka anyị ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọọkwa anyị ụtọ n’ihi na ọ zọpụtala anyị.”+
A ga-azọdakwa Moab ebe ọ dị+
Otú e si azọda okporo ọka n’ebe a na-awụfu nsị anụ.
11 Ọ ga-agbatị aka ya tie Moab ihe
Otú onye na-egwu mmiri si eti aka ya na mmiri.
Ọ ga-edozi aka ya tie ya ihe
Otú ga-eme ka ọ kwụsị ịdị mpako.+
12 Ọ ga-akwatukwa obodo a rụsiri ike,
Ya na mgbidi ndị dị elu e ji gbaa ya ogige.
Ọ ga-eme ka ọ daruo ala, nọrọ n’ájá.
26 N’oge ahụ, a ga-abụ abụ a+ na Juda:+
“Anyị nwere obodo siri ike.+
Chineke na-azọpụta mmadụ otú mgbidi siri ezigbo ike si echebe obodo.+
3 Ị ga-echebe ndị ji obi ha niile tụkwasị gị obi.*
4 Tụkwasịnụ Jehova obi ruo mgbe ebighị ebi,+
N’ihi na Jaa* Jehova bụ Oké Nkume na-adịru mgbe ebighị ebi.+
5 O wetuola ndị dị mpako ala, ya bụ, obodo na-akpa nganga.*
Ọ na-eme ka obodo ahụ daa.
Ọ na-eme ka ọ daruo ala.
Ọ na-eme ka ọ nọrọ n’ájá.
6 Ụkwụ ndị nọ n’ahụhụ
Na ụkwụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ga-azọda ya.”
7 Onye ezi omume na-aga n’ụzọ kwụ ọtọ.*
Ị ga-eme ka ụzọ onye ezi omume dị larịị,
N’ihi na ị bụ onye ezi omume.
8 Jehova, anyị tụkwasịrị gị obi
Ka anyị na-eso otú i si ekpe ikpe ziri ezi.
Anyị ji aha gị kpọrọ ihe, anyị na-echekwa gbasara gị.
9 Ọ na-agụsi m* agụụ ike n’abalị ịmata gị.
N’eziokwu, m ji obi m niile na-achọ gị.+
I kpewe ụwa ikpe,
Ndị bi n’ụwa ga-amụta ime ezi omume.+
Ya nọrọgodị n’ala ndị ezi omume, ọ ga na-eme ihe ọjọọ.+
Ọ gaghịkwa ahụ na Jehova dị ebube.+
11 Jehova, i weliri aka gị elu, ma ha anaghị ahụ ya.+
Ihere ga-eme ha ma ha hụ otú i si echebe ndị gị maka na ị hụrụ ha n’anya.
Ọkụ gị ga-erepịa ndị iro gị.
13 Jehova bụ́ Chineke anyị, e wezụga gị, ndị ọzọ bụ́ ndị nna ukwu achịala anyị,+
Ma, ọ bụ aha naanị gị ka anyị na-eto.+
14 Ha anwụọla. Ha agaghị adị ndụ.
Ha adịghị ndụ, ha agaghịkwa ebili.+
N’ihi na ị chọrọ ilebara ha anya,
Laa ha n’iyi, ka a ghara ịnụ aha ha ọzọ.
15 Jehova, i meela ka mba a hikwuo nne.
I meela ka mba a hikwuo nne.
I meela ihe e ji maka ya na-eto gị.+
I meela ka mba a nwetakwuo ala gbaa gburugburu.+
16 Jehova, n’oge ha na-ata ahụhụ, ha chọwara gị.
Ha kpere ekpere n’olu dị ala mgbe ị dọrọ ha aka ná ntị.+
17 Jehova, i meela ka ọnọdụ anyị yie ọnọdụ nwaanyị dị ime,
Nke oge o ji amụ nwa ruru, ime ana-eme ya,
Ya ana-eti mkpu n’ihi otú o si egbu ya mgbu.
18 Anyị bịara dị ime, ime emewe anyị.
Ma, ọ dị ka à ga-asị na anyị mụrụ ifufe.
Anyị azọpụtaghị ala a.
Anyị amụtaghịkwa ndị ga-ebi n’ala a.
19 “Ndị gị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ.
Unu ndị bi n’ájá,+
Tetanụ tie mkpu ọṅụ,
N’ihi na igirigi na-adasa gị dị ka igirigi na-ada n’ụtụtụ,*
Ala ga-emekwa ka ndị na-adịghị ndụ dịrị ndụ.*
Zoonụ nwa mgbe nta,
Ruo mgbe Chineke wechara iwe.+
21 Mụnwa bụ́ Jehova si ebe m bi na-abịa
Ime ka ndị bi n’ala a zaa ajụjụ maka mmehie ha.
Ala a ga-emekwa ka a mara ndị e gburu egbu* na ya,
Ọ gaghịzi ezochi ndị ya e gburu egbu.”
27 N’oge ahụ, Jehova ga-eji nnukwu mma agha ya dị ezigbo nkọ+
Lebara nnukwu anụ mmiri,* bụ́ agwọ na-amịgharị amịgharị, anya,
Ya bụ, nnukwu anụ mmiri, bụ́ agwọ gbagọrọ agbagọ.
Ọ ga-egbukwa nnukwu anụ a nọ n’oké osimiri.
2 Bụọrọnụ ya* abụ n’oge ahụ, sị:
“Ubi vaịn nke mmanya vaịn ya na-agbọ ụfụfụ!+
3 Mụnwa, bụ́ Jehova, na-echebe ya.+
M na-agba ya mmiri mgbe niile.+
M na-echebe ya ehihie na abalị,
Ka a ghara inwe onye ga-eme ya ihe ọ bụla.+
Mmadụ jiri osisi ogwu na ahịhịa bịa ịlụso m agha,
M ga-azọ ha ụkwụ, suo ha ọkụ otu mgbe, lụsokwa onye ahụ agha.
5 Ma ọ bụrụ na ọ chọghị ya otú ahụ, ya bịa n’ebe m a rụsiri ike ka e chebe ya.
Ya bịa ka mụ na ya mee udo.
Ya chọta m ka mụ na ya mee udo.”
6 N’ọdịnihu, Jekọb ga-agbanye mgbọrọgwụ.
Ndị Izrel ga-ama ifuru, waakwa alaka.+
Mkpụrụ ha ga-amị ga-ejupụtakwa n’ala ha.+
7 Gịnị mere e ji tikasịa ha ahụ́ otú a?
Gịnịkwa mere e ji si otú a gbuo ha?
8 Ka ị na-alụso ha ọgụ mgbe ị na-achụpụ ha, ị ga na-eti mkpu otú na-emenye ụjọ.
N’ụbọchị ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ na-efe, ị ga-eji ifufe gị nke na-efesi ike chụpụ ha.+
9 Otú a ka a ga-esi kpuchiere Jekọb mmehie ya.+
E wepụchaa mmehie ya, lekwa ihe ga-emezi:
Chineke ga-eme ka nkume niile e ji rụọ ebe ịchụàjà
Dịrị ka nzu e gwere egwe.
O nweghịkwa ogwe osisi arụsị* ma ọ bụ ihe ndị e ji adọsa insens ga-adị ebe ahụ.+
10 N’ihi na ndị mmadụ ga-esi n’obodo a rụsiri ike gbapụsịa.
Ha ga-ahapụ ala anụmanụ na-ata ahịhịa, ya adị ka ala ịkpa.+
Ebe ahụ ka nwa ehi ga na-ata ahịhịa, na-amakpukwa.
Ọ ga-atachapụkwa alaka osisi dị iche iche.+
11 Mgbe ntakịrị alaka osisi dị iche iche kpọnwụrụ,
Ụmụ nwaanyị ga-abịa nyakapụta ha,
Were ha mere nkụ.
N’ihi na ndị a anaghị aghọta ihe.+
Ọ bụ ya mere na Onye kere ha agaghị emere ha ebere,
Onye kpụrụ ha agaghịkwa emere ha amara.+
12 N’oge ahụ, Jehova ga-akpọkọta ndị Izrel nọ ebe dị iche iche malite n’Osimiri Yufretis ruo na Ndagwurugwu* Ijipt.+ Ọ ga-achịkọta ha otú ahụ mmadụ si elezi anya tụtụkọta mkpụrụ osisi ọ kụtusịrị.+ 13 N’oge ahụ, a ga-afụ opi ike,+ ndị nọ n’ọnụ ọnwụ n’Asiria+ na ndị a chụsara achụsa nọ n’Ijipt+ ga-abịakwa kpọọrọ Jehova isiala n’ugwu dị nsọ nke dị na Jeruselem.+
28 Ndị aṅụrụma, bụ́ ndị Ifrem,+ ga-ata ahụhụ. Ha na-ewere obodo ha* ka okpueze na-egbuke egbuke,*
Ka ọmarịcha okooko osisi nke dị n’isi ndagwurugwu na-eme nri.
Ma, mmanya na-egbu ndị nọ ebe ahụ, ọmarịcha okooko osisi ha ga-akpọnwụkwa.
2 Jehova ga-ezite onye siri ike, nke bụ́kwa dimkpa.
Ọ ga-eji ike tụda okpueze ahụ n’ala
Otú akụ́ mmiri ígwé si ada mgbe égbè eluigwe na-agba nakwa otú oké ifufe si ebibi ihe.
Ọ ga-atụdakwa ya otú idei mmiri si asọsi ike mgbe mmiri na-ezosi ike, égbè eluigwe ana-agbakwa.
4 Okooko osisi na-achanwụ achanwụ e ji chọọ ya mma,
Nke dị n’isi ndagwurugwu nke na-eme nri,
Ga-adị ka mkpụrụ fig mbụ mịrị tupu oge ọkọchị.
Ọ na-abụ mmadụ hụ ya, ya aghọrọ ya taa ozugbo.
5 N’oge ahụ, Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-aghọrọ ndị ya fọrọ afọ+ okpueze dị ebube na okpu mara mma. 6 Ọ ga-enyere ndị na-ekpe ikpe aka ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ ga-enyekwa ndị na-anọ n’ọnụ ụzọ ámá ike ha ga-eji na-achụghachi ndị iro bịara ịlụso ha agha.+
7 Ndị nchụàjà na ndị amụma akpafuola n’ihi mmanya.
Ha na-adagharị n’ihi mmanya na-egbu ha.
Mmanya na-egbu ha emeela ka ha kpafuo.
Mmanya na-emegharị ha anya,
Ha na-adagharịkwa n’ihi mmanya na-egbu ha.
Ọhụụ ha hụrụ emeela ka ha kpafuo.
Mmanya ekweghịzi ha mara ihe ha na-ekpe n’ikpe.+
8 Ihe dịcha na tebụl ha niile bụ agbọ na-asọ oyi.
O nweghị ebe ha na-agbọsaghị ya.
9 Ha na-ekwu, sị: “Ònye ka a ga-akụziri ihe?
Ònyekwa ka a ga-akọwara ihe e kwuru?
Ọ̀ bụ ndị a kwụsịrị ara?
Ọ̀ bụ ndị a napụrụ ara?
10 Ọ na-asị, “E nye iwu, e nyeghachi iwu. E nye iwu, e nyeghachi iwu,
N’ahịrị n’ahịrị, n’ahịrị n’ahịrị,*+
Ntakịrị n’ebe a, ntakịrị n’ebe ahụ.”*
11 N’ihi ya, ọ ga-eji ndị na-asụ nsụ gwa ndị a okwu, jirikwa asụsụ ndị mba ọzọ gwa ha okwu.+ 12 E nwere mgbe ọ gwara ha, sị: “Ebe a bụ ebe a na-ezu ike. Ka onye ike gwụrụ zuru ike. Ebe a bụkwa ebe mmadụ na-anọ nweta onwe ya.” Ma, ha achọghị ige ntị.+ 13 N’ihi ya, okwu Jehova ga-adị ha ka:
“E nye iwu, e nyeghachi iwu. E nye iwu, e nyeghachi iwu,
N’ahịrị n’ahịrị, n’ahịrị n’ahịrị,*+
Ntakịrị n’ebe a, ntakịrị n’ebe ahụ.”*
14 N’ihi ya, ndị na-etu ọnụ na ndị na-achị ndị a nọ na Jeruselem,
Nụrụnụ ihe Jehova kwuru,
15 N’ihi na unu sịrị:
“Anyị na Ọnwụ agbaala ndụ.+
E nwekwara ihe anyị na ili* kwekọrịtara.
Ọ bụrụ na oké idei mmiri nke na-achị ọkụ asọfewe,
Ọ gaghị erute ebe anyị nọ,
N’ihi na anyị emeela ụgha ebe mgbaba anyị.
Anyị ejirila ụgha kpuchie onwe anyị.”+
16 Ihe a emeela ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuo, sị:
“Ana m adọnye otu nkume na Zayọn ka ọ bụrụ ntọala. Nkume a anaghị agharịpụ agharịpụ.+
Ọ bụ nkume dị oké ọnụ*+ nke ga-eme ka ntọala ụlọ sie ezigbo ike.+
Ụjọ agaghịkwa atụ onye nwere okwukwe na ya.+
17 M ga-eme ka ikpe ziri ezi bụrụ eriri e ji atụ̀ ihe,+
Meekwa ka ezi omume bụrụ ihe e ji atụ̀ ihe iji mata ma ihe ọ̀ dị larịị.+
Akụ́ mmiri ígwé ga-ekpochapụ ebe na-enweghị isi ha gbabara.
Mmiri ga-ebupụkwa ebe ahụ ha zoro.
18 A ga-emebi ndụ ahụ unu na Ọnwụ gbara.
Ihe ahụ unu na ili* kwekọrịtara agaghịkwa enwe isi.+
Ọ bụrụ na oké idei mmiri nke na-achị ọkụ asọfewe,
Ọ ga-ebibi unu.
Ọ ga na-asọfe n’ụtụtụ ọ bụla,
N’ehihie nakwa n’abalị.
Naanị ụjọ ga-eme ka ha ghọta ihe e kwuru.”*
20 Mmadụ agaghị agbatịli onwe ya n’elu àkwà* n’ihi na àkwà ahụ adịghị ogologo.
Mmadụ agaghịkwa ejili ákwà a kpara akpa kpuchie onwe ya n’ihi na ákwà ahụ dị warara.
21 N’ihi na Jehova ga-ebili otú o biliri n’Ugwu Perezim.
Ọ ga-ewe iwe otú o were na ndagwurugwu dị nso na Gibiọn.+
Ọ ga-eme ihe ọ na-eme, ihe dị ịtụnanya.
Ọ ga-arụkwa ọrụ ya, ọrụ na-eju anya.+
N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, gwara m
23 Ṅaanụ ntị nụrụ olu m.
Geenụ ntị nụrụ ihe m na-ekwu.
24 Onye na-akọ ugbo ọ̀ ga-akọgide ala si n’ụtụtụ ruo n’abalị tupu ya akụọ mkpụrụ?
Ọ̀ ga-anọgide na-egburi ala, na-etirikwa ya?+
25 Ọ̀ bụ na ọ naghị agha mkpụrụ kọmin ojii, kụọkwa mkpụrụ kọmin nkịtị
Ma ọ kọchaa ala ahụ?
Ọ̀ bụ na ọ naghị akụ ọka wit, ọka milet, na ọka bali ebe ndị o kwesịrị ịkụ ha?
Ọ̀ bụ na ọ naghị akụ ọka spelt+ gburugburu ala ahụ?
26 Chineke na-agwa mmadụ* ka ọ na-eme ihe ziri ezi.
Ọ na-akụzikwara ya ihe.+
27 A naghị eji ihe e ji eticha ọka etichapụta mkpụrụ kọmin ojii.+
A naghịkwa eji ụkwụ ụgbọala arị mkpụrụ kọmin nkịtị elu.
Kama, a na-eji okporo osisi etichapụta mkpụrụ kọmin ojii.
A na-ejikwa mkpara etichapụta mkpụrụ kọmin nkịtị.
28 N’oge mmadụ na-eticha ọka, ọ̀ na-egweri ya ya aghọọ ntụ ọka a ga-eji eme achịcha?
Mba, ọ naghị egweri ya.+
Ya nyawakwa ụgbọala ya ịnyịnya na-adọkpụ, ụkwụ ụgbọala ya na-arị ọka ahụ elu,
Ma ọ naghị egweri ya.+
29 “Ariel* ga-ata ahụhụ. Ọ bụ obodo Devid mara ụlọikwuu.+
Na-emenụ ememme ndị unu na-eme kwa afọ.+
Na-emenụ ha n’afọ ọ bụla.
2 Ma, m ga-eme ka ihe siere Ariel ike.+
Ndị bi na ya ga-eru uju, beekwa ákwá arịrị.+
Ọ ga-aghọkwara mụnwa bụ́ Chineke ekwú ebe ịchụàjà.+
3 M ga-ama ụlọikwuu gburugburu gị iji lụso gị agha.
M ga-ejikwa osisi pịrị ọnụ gbaa ogige gburugburu gị.
M ga-arụkwa ihe m ga-eji nọchibido gị.+
4 Ị ga-ada nọrọzie n’ala.
Ị ga-esi n’ime ala na-ekwu okwu.
Ụda olu gị ga-adịkwa ala.
Olu gị ga-esi n’ala na-adapụta+
Ka olu onye na-agba afa.
Ihe ị na-ekwu ga na-ada ka ihe a nọ n’ime ala na-atakwunyere mmadụ.
5 Ìgwè ndị iro gị* ga-adị ka ntụ.+
Ìgwè ndị na-achị n’aka ike ga-adịkwa ka mkpo ọka ifufe bufuru.+
Ihe a ga-emekwa n’otu ntabi anya, mgbe a na-atụghị anya ya.+
6 Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-anapụta gị.
N’oge ahụ, égbè eluigwe ga na-agba, ala ana-ama jijiji, oké mkpọtụ ana-eme,
Oké ifufe ana-efe, oké ifufe mmiri ana-efe, ọkụ ana-erepịakwa ihe.”+
7 Ìgwè mmadụ ndị si ná mba niile alụso Ariel agha,+
Ya bụ, ndị niile na-alụso ya agha,
Ga-adị ka nrọ a rọrọ n’abalị,
Ma ndị rụrụ ụlọ elu ha ga-eji nọchibido ya
Ma ndị na-eme ka ihe siere ya ike.
8 N’eziokwu, ọ ga-adị ka mgbe onye agụụ na-agụ rọrọ nrọ ebe ọ na-eri nri
Ma teta, agụụ ka na-agụ ya.*
Ọ ga-adịkwa ka mgbe onye mmiri na-agụ rọrọ nrọ ebe ọ na-aṅụ mmiri
Ma teta, ike ka gwụrụ ya, mmiri ka na-agụkwa ya.*
Otú ahụ ka ọ ga-adị ìgwè mmadụ si ná mba niile,
Bụ́ ndị na-alụso Ugwu Zayọn agha.+
9 Ihe a ga-eri unu ọnụ, jukwa unu anya.+
Nyachienụ anya unu, ka unu ghara ịhụ ụzọ.+
Ha na-eme ka ndị mmanya na-egbu, ma ha aṅụghị mmanya.
Ha na-adagharị, ma ọ bụghị mmanya na-egbu ha.
10 Jehova emeela ka unu na-ehi oké ụra.+
O mechiela anya unu. Ọ bụ ndị amụma bụ anya unu.+
O kpuchiela isi unu. Ọ bụ ndị na-ahụ ọhụụ bụ isi unu.+
11 Ọhụụ ọ bụla mmadụ hụrụ na-adị unu ka ihe e dere n’akwụkwọ a fụchiri afụchi.+ Ọ bụrụ na e nye ya onye ma agụ ihe, sị ya: “Biko, gụpụta ihe a,” ọ ga-asị: “Agaghị m agụli ya, n’ihi na a fụchiri ya afụchi.” 12 E werekwa akwụkwọ ahụ nye onye na-amaghị agụ ihe, sị ya: “Biko, gụpụta ihe a,” ọ ga-asị: “Amaghị m agụ ihe.”
13 Jehova sịrị: “Ndị a na-asị na ha na-efe m,
Na-asịkwa na ha na-asọpụrụ m,+
Ma obi ha adịghị n’ebe m nọ.
Otú ha si efe m bụ iso ihe mmadụ nyere n’iwu.+
14 N’ihi ya, m ga-eme ha ihe dị ịtụnanya ọzọ.+
Ọ ga-atụ ha n’anya. N’eziokwu, ọ ga-atụ ha n’anya.
Amamihe nke ndị ha ma ihe ga-ala n’iyi.+
Ndị ha nwere uche agaghịzi na-aghọta ihe.”
15 Ndị na-eme ike ha niile ka Jehova ghara ịma atụmatụ* ha ga-ata ahụhụ.+
N’ebe gbara ọchịchịrị ka ha na-eme ihe ndị ha na-eme.
Ha na-asịkwa: “Ònye na-ahụ anyị?
Ònye ma ihe anyị na-eme?”+
16 Unu na-agbagọ ihe dị iche iche.*
È kwesịrị ile ọkpụite anya otú e si ele ụrọ anya?+
Ihe a rụrụ arụ ò kwesịrị ikwu gbasara onye rụrụ ya, sị:
“Ọ bụghị ya rụrụ m”?+
Ihe a kpụrụ akpụ ọ̀ na-ekwu gbasara onye kpụrụ ya, sị:
“Ọ maghị ihe”?+
17 N’oge na-adịghị anya, a ga-eme ka Lebanọn bụrụ ubi a kụrụ mkpụrụ osisi.+
A ga-ewerekwa ubi a a kụrụ mkpụrụ osisi ka oké ọhịa.+
18 N’oge ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe e dere n’akwụkwọ.
Ndị ìsì ga-ahụkwa ụzọ n’itiri nakwa n’ọchịchịrị.+
19 Ndị dị umeala n’obi ga-aṅụrị ezigbo ọṅụ n’ihi Jehova.
Ndị ogbenye ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi Onye Nsọ Izrel.+
20 N’ihi na onye na-achị n’aka ike ga-anwụ.
Onye na-etu ọnụ ga-ala n’iyi.
A ga-ebibikwa ndị niile mkpa ha bụ ime ihe ọjọọ.+
21 A ga-ebibi ma ndị na-ebo ndị ọzọ ihe ha na-emeghị
Ma ndị na-esiri onye na-azara ọnụ ya* ọnyà n’ọnụ ụzọ ámá+
Ma ndị na-ebo onye ezi omume ebubo na-enweghị isi iji kpegbuo ya.+
22 N’ihi ya, Jehova, onye gbapụtara Ebreham,+ gwara ndị si n’ezinụlọ Jekọb, sị:
“Ihere agaghị eme Jekọb ọzọ.
Ihu ya agaghịkwa agbarụ agbarụ ọzọ.*+
23 N’ihi na mgbe ọ hụrụ ụmụ ya,
Ndị bụ́ ọrụ aka m, ka ha gbara ya gburugburu,+
Ha na ya ga-edo aha m nsọ.
Ha ga-edokwa Onye Nsọ nke Jekọb nsọ,
Ha ga-atụ egwu Chineke Izrel.+
24 Ndị kpafuru akpafu ga-amata ihe.
Ndị na-eme mkpesa ga-emekwa ihe a gwara ha mee.”
30 Jehova kwuru, sị: “Ụmụ dị isi ike ga-ata ahụhụ.+
Ha na-eme uche ha, ọ bụghị nke m.+
Ha na ibe ha na-agbakọ aka eme ihe,* ma ọ bụghị mmụọ m na-edu ha.
Ha si otú a na-eme mmehie n’elu nke ha mere eme.
2 Ha na-aga Ijipt+ n’ajụghị m ase.+
Ha na-aga ebe ahụ ka Fero chebe ha*
Nakwa ka ndị Ijipt chebe ha.
3 Ma, nchebe Fero ga-echebe ha ga-eme ka ihere mee ha.
A ga-emechukwa ha ihu n’ihi nchebe ndị Ijipt ga-echebe ha.+
5 Ndị ga-emenye ha niile ihere
Bụ ndị na-abaraghị ha uru ọ bụla,
Ndị na-anaghị enyere mmadụ aka, ndị na-anaghị abara mmadụ uru,
Ndị ihe ha na-eme bụ naanị imenye ndị ọzọ ihere na ịkparị ha.”+
6 Ihe Chineke kpebiri ime anụ ọhịa ndị na-aga n’ebe ndịda:
Ha na-ebu akụ̀ ha n’elu jakị,
Na-ebukwa ngwongwo ha n’azụ kamel.
Ha na-ebu ha agafe ala ahụhụ na ihe isi ike dị,
Ala ọdụm ndị na-agbọ ụja juru
Nakwa ala ajụala na agwọ na-acha ọkụ ọkụ nke na-efe efe* juru.
Ma, ihe ndị ahụ ha bu agaghị abara ndị mmadụ uru.
7 O nweghị uru ọ bụla aka ndị Ijipt na-enyere unu bara.+
N’ihi ya, m gụrụ ha: “Rehab,+ onye na-anọ ọdụ otu ebe n’enweghị ihe ọ na-arụ.”
8 “Ugbu a, gaa nọrọ n’ihu ha dee ya ná mbadamba ihe,
Deekwa ya n’akwụkwọ,+
Ka ọ dịrị maka ọdịnihu,
Ka ọ bụrụ ihe akaebe ga-adịgide adịgide.+
10 Ha na-asị ndị na-ahụ ọhụụ, ‘Unu ahụzila ọhụụ,’
Na-asịkwa ndị amụma, ‘Unu ebuzirila anyị ihe bụ́ eziokwu n’amụma.+
Na-agwanụ anyị ihe ga-atọ anyị ụtọ ịnụ. Na-agwanụ anyị ihe dị mma ná ntị n’agbanyeghị na ọ bụghị ihe unu hụrụ n’ọhụụ.+
11 Hapụnụ ụzọ unu na-aga. Tinyenụ isi n’ụzọ ọzọ.
Kwụsịnụ ịgwa anyị gbasara Onye Nsọ Izrel.’”+
12 N’ihi ya, Onye Nsọ Izrel kwuru, sị:
“Ebe ọ bụ na unu jụrụ okwu m,+
Ebe ọ bụkwa na unu ji ịgha ụgha na ịghọ aghụghọ hiwe isi,
Unu jikwa ha nwee olileanya,+
13 Unu ga-adị ka mgbidi gbawara agbawa,
Dịkwa ka mgbidi dị elu nke huuru ehuru ma na-achọ ịda.
Ọ ga-ada na mberede, n’otu ntabi anya.
14 A ga-etiwa ya ka ebe e tiwara nnukwu ite ọkpụite kpụrụ.
A ga-akụ ya righirighi nke na a gaghịzi ahụ iberibe ya ọ bụla
A ga-eji agụta ọkụ n’ekwú
Ma ọ bụ nke a ga-eji kuru mmiri n’ebe apịtị dị.”*
15 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel, kwuru, sị:
“A ga-azọpụta unu ma unu lọghachikwute m, nọrọ nwayọọ ma tụkwasị m obi.
Unu ga-adị ike naanị ma unu nọrọ jii ma tụkwasị m obi.”+
Ma unu achọghị ime ya.+
16 Kama, unu sịrị: “Mba, anyị ga-arịgoro n’elu ịnyịnya gbaa ọsọ.”
N’ihi ya, unu ga-agbarịrị ọsọ.
Unu kwukwara, sị: “Anyị ga-agba ịnyịnya na-efe ọsọ.”+
N’ihi ya, ndị na-achụ unu ga na-efekwa ọsọ.+
17 Otu puku mmadụ ga-ama jijiji n’ihi egwu otu onye yiri ha.+
Unu ga-ejikwa maka egwu mmadụ ise yiri unu gbaa ọsọ.
Unu ga-agbagide ọsọ ruo mgbe ndị fọdụrụ n’ime unu ga-adị ka osisi ákwà ụgbọ mmiri nke dị n’elu ugwu,
Dịkwa ka ihe na-agba àmà e gwunyere n’elu ugwu.+
18 Ma, Jehova na-enwere unu ndidi* ka o meere unu amara.+
Ọ gaghịkwa agba nkịtị. Ọ ga-emere unu ebere.+
Jehova bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi.+
Ndị niile na-atụ anya ya na-enwe obi ụtọ.+
19 Mgbe ndị Zayọn ga-alọghachi Jeruselem,+ o nweghị ihe ga-eme ka unu bee ákwá.+ Chineke* ga-emere unu amara mgbe ọ nụrụ ákwá unu na-ebe ka e nyere unu aka. Ọ ga-enyere unu aka ozugbo ọ nụrụ ya.+ 20 Ọ bụ eziokwu na nri Jehova ga-enye unu bụ ịta unu ahụhụ, mmiri ọ ga-enyekwa unu bụ ime ka ihe siere unu ike,+ ma, Onye Ozizi unu kachanụ agaghịzi ezo onwe ya ezo. Unu ga-ejikwa anya unu hụ Onye Ozizi unu kachanụ.+ 21 Ọ bụrụ na unu efuo ụzọ, tinye isi n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+ unu ga-anụ olu ga-esi n’azụ na-agwa unu, sị: “Lekwanụ ụzọ.+ Na-aganụ na ya.”
22 Unu ga-emerụ ọlaọcha e ji machie arụsị dị iche iche a pịrị apị unu na-efe. Unu ga-emerụkwa ọlaedo e ji machie arụsị dị iche iche a kpụrụ akpụ unu na-efe.+ Unu ga-atụfu ha otú nwaanyị si achịfu ákwà o yi mgbe ọ nọ ná nsọ. Unu ga-asịkwa ihe ndị ahụ: “Nke unu agaala!”*+ 23 Ọ ga-emekwa ka mmiri zoo n’oge unu kụrụ mkpụrụ n’ala.+ Nri ala a ga-emepụta ga-adị mma, hiekwa nne.+ N’oge ahụ, anụ ụlọ unu ga-ata ahịhịa ná nnukwu ala ahịhịa juru.+ 24 Ehi na jakị ndị e ji akọ ubi ga-ata ahịhịa dị mma, nke e ji shọvel na fọk wepụsịa ihe ndị na-adịghị mma na ya. 25 N’ụbọchị a ga-egbu ọtụtụ ndị mgbe ụlọ nche dị iche iche ga-ada, iyi na olulu mmiri ga-adị ma ná nnukwu ugwu niile ma n’obere ugwu niile.+ 26 N’ụbọchị Jehova ga-ekechi ọkpụkpụ ndị ya gbajiri agbaji,+ gwọọkwa ha ezigbo ahụ́ o merụrụ ha mgbe o tiri ha ihe,+ ìhè ọnwa gbazuru agbazu ga-adị ka ìhè anyanwụ. Anyanwụ ga-enyekwu ìhè okpukpu asaa+ dị ka à ga-asị na o ji otu ụbọchị chaa ihe o kwesịrị iji abalị asaa chaa.
27 Jehova* si ebe dị anya na-abịa.
Ezigbo iwe ji ya. Ígwé ojii na-enweghị atụ kpuchikwara ya.
Egbugbere ọnụ ya na-egosi na ezigbo iwe ji ya.
Ire ya dịkwa ka nnukwu ọkụ.+
28 Mmụọ* ya dị ka iyi toro eto nke na-eru mmadụ n’olu.
Ọ ga-eji myọ yọchapụta mba dị iche iche ka ihe a ga-ebibi ebibi.*
Ọ ga-ekenyekwa eriri n’agba ha+ dufuo ha.
Obi ga-abụkwa unu sọ aṅụrị
Otú obi na-abụ onye na-egbu ọjà sọ aṅụrị
Ka ọ na-aga n’ugwu Jehova, ka ọ gakwuru Oké Nkume Izrel.+
30 Jehova ga-eme ka a nụ olu ya dị ebube.+
Ọ ga-emekwa ka a hụ mgbe ọ ga-eji ezigbo iwe jiri aka ya+ taa ndị iro ya ahụhụ.+
Ihe ndị ọ ga-eji mee ya bụ ire ọkụ nke nnukwu ọkụ+
31 Olu Jehova ndị Asiria ga-anụ ga-eme ka ezigbo ụjọ jide ha.+
Ọ ga-apịakwa ha ụtarị.+
32 Ugboro ole ọ bụla
Jehova ga-apịa ndị Asiria ụtarị
Ga-abụ ugboro ole a ga-eji obere ịgbà na ụbọ akwara kụọ egwú.+
A ga na-akụ ya ka Chineke ji aka ya na-alụso ha agha.+
33 N’ihi na a kwadebechaala Tofet*+ ha.
A kwadebekwaara ya eze ha.+
Chineke* akwakọtala nkụ n’ebe miri emi.
Nnukwu ọkụ na nkụ hiri nne dịkwa ebe ahụ.
Ume Jehova, nke dị ka sọlfọ nke na-asọ ka mmiri,
Ga-esunye ya ọkụ.
31 Ndị na-agakwuru ndị Ijipt ka ha nyere ha aka ga-ata ahụhụ.+
Ha na-atụ anya na ịnyịnya ga-enyere ha aka.+
Obi siri ha ike na ụgbọ ịnyịnya agha dị ọtụtụ ga-enyere ha aka.
Obi sikwara ha ike na ịnyịnya agha* ga-enyere ha aka maka na ha siri ike.
Ma, ha anaghị atụ anya ka Onye Nsọ Izrel nyere ha aka.
Ha achọghịkwa Jehova.
2 Ma, Chineke ma ihe. Ọ ga-emekwa ka ọdachi dakwasị ha.
Ọ gaghị ahapụ imezu ihe o kwuru.
Ọ ga-ata ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.
Ọ ga-atakwa ndị na-enyere ndị na-eme ihe ọjọọ aka ahụhụ.+
3 Ndị Ijipt bụ ụmụ mmadụ nkịtị. Ha abụghị Chineke.
Ịnyịnya ha bụ anụ ahụ́. Ha abụghị mmụọ.+
Mgbe Jehova ga-agbatị aka ya,
Ndị a na-enyere aka ga-ada.
Ndị na-enyere ha aka ga-adakwa.
Ha niile ga-ala n’iyi otu mgbe.
4 Jehova gwara m, sị:
“Ọ na-abụ ọdụm siri ezigbo ike nọrọ n’elu anụ o jidere na-agbọ ụja,
A kpọkọgodị ndị niile na-azụ atụrụ ka ha chụpụ ya,
Mkpu ha na-eti anaghị emenye ya ụjọ.
Mkpọtụ ha na-eme anaghịkwa eme ka ọ gbaa ọsọ.
Otú ahụkwa ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-esi gbadata ka ọ lụọ agha
N’ihi Ugwu Zayọn nakwa n’ihi ugwu nta dị na ya.
5 Otú ahụ nnụnụ si eji ọsọ fere bịa ka o chebe ụmụ ya ka Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-esi bịa chebe Jeruselem.+
Ọ ga-echebe ya, zọpụtakwa ya.
Ọ ga-emere ya ebere, gbatara ya ọsọ enyemaka.”
6 “Ndị Izrel, lọghachikwutenụ Chineke, onye unu kpachaara anya nupụrụ isi.+ 7 N’ihi na n’ụbọchị ahụ, onye ọ bụla n’ime unu ga-ajụ chi ya na-abaghị uru, ndị e ji ọlaọcha mee, na chi ya na-abaghị uru, ndị e ji ọlaedo mee. Unu ji aka unu mee ha. Ọ bụkwa mmehie.
8 A ga-eji mma agha na-abụghị mma agha mmadụ gbuo ndị Asiria.
A ga-ejikwa mma agha na-abụghị mma agha mmadụ memilaa ha.+
Ha ga-agba ọsọ n’ihi mma agha.
A ga-amanyekwa ụmụ okorobịa ha ịrụ ọrụ.
9 Onye ha weere ka nnukwu nkume ga-anwụ n’ihi ụjọ.
Ndị isi ha ga-atụkwa ụjọ n’ihi ihe ahụ na-agba àmà.” Ọ bụ Jehova,
Onye ìhè* ya dị na Zayọn, onye ekwú ya dịkwa na Jeruselem, kwuru ihe a.
32 A ga-enwe eze+ ọ ga-abụ, ya chịwa, onye ọ bụla ana-eme ezi omume,+
A ga-enwekwa ndị isi ga na-ekpe ikpe ziri ezi ma ha chịwa.
2 Onye ọ bụla n’ime ha ga-adị ka ebe mmadụ na-agbaba ka o zere ifufe
Nakwa ebe mmadụ na-agbaba ka o zere nnukwu mmiri ozuzo.
Onye ọ bụla n’ime ha ga-adịkwa ka iyi na-asọ n’ala mmiri na-adịghị+
Nakwa ka ndò nkume dị elu na-enye n’ala kpọrọ nkụ.
3 A gaghịzi anyachi anya ndị na-ahụ ụzọ.
Ndị na-anụ ihe ga-egekwa ntị.
4 Ndị na-eme ihe ọkụ ọkụ ga-echebara otú ha ga-esi amatakwu ihe echiche.
Ndị nsụ* ga na-ekwu ihe doro anya, okwu ana-agakwa ha were were n’ọnụ.+
5 A gaghịzi asị na onye nzuzu na-amaghị Chineke bụ ezigbo mmadụ.*
A gaghịkwa asị na onye arụrụala bụ ezigbo mmadụ.
6 Onye nzuzu ga na-ekwu okwu nzuzu.
Ọ na-eche ihe ọjọọ n’obi ya+ n’ihi na
Ọ chọrọ ịkwụsị ife Chineke, fewe chi ọzọ,* chọọ ịna-ekwu ihe na-adịghị mma gbasara Jehova,
Chọọ ime ka onye* agụụ ji ghara ịhụ ihe rie,
Chọọkwa ime ka onye mmiri na-agụ ghara ịṅụ mmiri.
7 Otú onye arụrụala si eme ihe ndị ọ na-eme dị njọ.+
Ọ na-eme ka ndị ọzọ na-eme omume na-eme ihere,
Na-aghagidekwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ụgha ka o mesie ha ike,+
Ọ bụrụgodị na ha kwuru otú ihe si mee.
8 Ma, ezigbo mmadụ na-ebu ezigbo ihe n’obi.
Naanị ihe ọ na-eme bụ ihe dị mma.*
9 “Ụmụ nwaanyị ndị weere na ihe a na-eme agbasaghị ha, bilienụ ọtọ gee ntị n’ihe m na-ekwu.
Ụmụ nwaanyị na-ejighị ihe ọ bụla kpọrọ ihe,+ nụrụnụ ihe m na-ekwu.
10 Otu afọ na abalị ole na ole gachaa, ununwa, bụ́ ndị na-ejighị ihe ọ bụla kpọrọ ihe, ga-ama jijiji,
N’ihi na oge ịghọ mkpụrụ vaịn ga-agacha, ma o nwebeghị nke a ghọtara.+
11 Ụmụ nwaanyị ndị weere na ihe a na-eme agbasaghị ha, maanụ jijiji.
Ndị na-ejighị ihe ọ bụla kpọrọ ihe, maanụ jijiji.
Yipụnụ uwe unu gbara ọtọ,
Keekwanụ ákwà iru uju n’úkwù.+
12 Tienụ aka n’obi, beekwanụ ákwá
Maka ihe mere ala dị iche iche na-eme nri na osisi vaịn nke na-amị mkpụrụ.
13 N’ihi na ihe ga-eju ebe niile n’ala ndị m bụ osisi bụ́ ogwu ogwu.
Ọ ga-ekpuchi ụlọ niile a na-anọ enwe aṅụrị,
Ya bụ, ụlọ ndị dị n’obodo a na-enwe ezigbo obi ụtọ.+
14 N’ihi na ndị bi n’ụlọ elu a rụsiri ike agbapụchaala.
Ndị mmadụ agbapụchaala n’obodo a na-eme mkpọtụ.+
Ofel+ na ụlọ nche tọgbọzi nkịtị.
Ha bụzi ebe jakị ọhịa na-enwe aṅụrị
Na ebe ìgwè ewu na atụrụ na-ata ahịhịa.+ Ha ga-adịgidekwa otú ahụ
15 Ruo mgbe Chineke ga-esi n’eluigwe wụkwasị anyị mmụọ ya,+
Mgbe ala ịkpa ga-aghọ ubi a kụrụ mkpụrụ osisi,
E werekwa ubi a kụrụ mkpụrụ osisi ka oké ọhịa.+
16 N’oge ahụ, a ga na-ekpe ikpe ziri ezi n’ala ịkpa.
A ga na-emekwa ezi omume n’ubi a kụrụ mkpụrụ osisi.+
17 Ezi omume a ga na-eme ga-eme ka udo dị,+
Meekwa ka ebe niile dị jụụ, obi eruokwa onye ọ bụla ala ruo mgbe ebighị ebi.+
18 Udo ga-adị ebe ndị m ga-ebi.
Obi ga-erukwa ha ala ebe ahụ. Ebe ha ga na-ezu ike ga-adakwa jii.+
19 Ma, akụ́ mmiri ígwé ga-ebibi oké ọhịa.
A ga-asụkwa obodo a akwụ.
20 Ndị na-akụ mkpụrụ n’akụkụ mmiri niile
Na ndị na-atọpụ ehi na jakị eriri ka ha na-akpagharị na-enwe obi ụtọ.”+
33 Gị,* onye na-ebibi ihe ndị mmadụ, ma e bibighị nke gị, ị ga-ata ahụhụ.+
Ị na-aghọgbu ndị ọzọ, ma a ghọgbughị gị.
I bibichaa ihe ndị mmadụ, a ga-ebibi gị.+
Ị ghọgbuchaa ndị ọzọ, a ga-aghọgbu gị.
2 Jehova, biko, meere anyị amara.+
Ọ bụ gị ka anyị tụkwasịrị obi.
3 Ndị mmadụ nụ mkpọtụ a na-eme n’oge ọgba aghara, ha agbaa ọsọ.
I bilie ọtọ, mba dị iche iche agbasasịa.+
4 Otú ahụ igurube si erichapụ ihe ọ bụla ọ hụrụ ka a ga-esi akwakọrọcha ihe unu* kwatara n’agha.
Ndị mmadụ ga-ejikwa ọsọ bịa ịkwakọrọ ihe ndị ahụ otú ahụ ìgwè igurube si eji ọsọ abịa ịtapịa ihe.
5 A ga-eto Jehova karịa otú e si eto ya,
N’ihi na o bi n’ebe dị elu.
Ọ ga-eme ka a na-ekpe ikpe ziri ezi ebe niile na Zayọn, onye ọ bụla ana-emekwa ezi omume na ya.
6 Ọ bụ ya na-echebe unu.
Ọ na-azọpụta mmadụ otú na-enweghị atụ,+ na-eme ka mmadụ mara ihe, na-akụziri mmadụ ihe, na-emekwa ka a na-atụ egwu yanwa bụ́ Jehova.+
Ihe ndị a bụ akụ̀ ya.
7 Ndị dike ha na-ebesi ákwá ike n’okporo ámá.
Ndị ozi udo na-ebesikwa ákwá ike.
8 Okporo ụzọ tọgbọzi chakoo.
E nweghịzi onye na-aga n’ụzọ.
O mebiela* ọgbụgba ndụ.
Ọ jụla obodo dị iche iche.
O nweghịkwa ihe o ji mmadụ nkịtị kpọrọ.+
9 Ala a na-eru uju.* Ọ kpọọkwala nkụ.
E menyela Lebanọn ihere.+ O rekasịakwala.
Sharọn dịzi ka ọzara.
Beshan na Kamel na-agbụsịkwa akwụkwọ.+
10 Jehova kwuru, sị: “Ugbu a, m ga-eme ihe.
Ugbu a, m ga-egosi ike m.+
Ugbu a, m ga-egosi na m bụ onye ukwu.
11 Unu na-atụrụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, mụọkwa okporo ọka.
Àgwà ọjọọ unu ga-egbu unu otú ọkụ si erepịa ihe.+
12 Ndị mmadụ ga-adị ka ntụ a na-enweta ma a kpọọ ụrọ ọkụ.
A ga-akpọ ha ọkụ,+ ha adị ka osisi ogwu e gbuturu egbutu.
13 Ndị nọ ebe dị anya, nụrụnụ ihe m ga-eme.
Ndị nọ nso, kwetanụ na m dị ike.
14 Ụjọ na-atụ ndị mmehie nọ na Zayọn.+
Ahụ́ na-ama ndị kwụsịrị ife Chineke jijiji, ha ana-asị:
‘Ònye n’ime anyị ga-enwe ike ibi ebe a kwanyere nnukwu ọkụ?+
Ònye n’ime anyị ga-enwe ike ibi ebe ọkụ na-anaghị akwụsị akwụsị na-agba?’
15 Ọ bụrụ na mmadụ na-eme ihe ziri ezi mgbe niile,+
Na-ekwu eziokwu,+
Na-akwụwa aka ọtọ, ghara igwu wayo,
Ghara ịna aka azụ,+
Na-emechi ntị ya ma a kpawa nkata igbu mmadụ,*
Na-emechikwa anya ya ka ọ ghara ịhụ ihe ọjọọ,
16 Ọ ga-ebi n’ebe dị elu.
Ọ bụ na nkume siri ezigbo ike ka ọ ga-agbaba.
Nri agaghị akọ ya.
Mmiri ya agaghịkwa agwụ agwụ.”+
17 Unu ga-eji anya unu hụ eze dị ebube,
Hụkwa ala dị ebe dị anya.
18 Mgbe unu chetara ihe* na-emenye ụjọ, unu ga-asị n’obi unu:
“Olee ebe odeakwụkwọ nọ?
Olee ebe onye anyị si n’aka ya atụ ụtụ nọ?+
Olee ebe onye na-agụ ụlọ elu ọnụ nọ?”
19 Unu agaghịzi ahụ ndị na-akparị mmadụ,
Ya bụ, ndị asụsụ ha na-anatụdịghị ekwe nghọta,
Ndị na-asụ asụsụ unu na-enweghị ike ịghọta.+
20 Legodịnụ Zayọn, bụ́ obodo anyị na-anọ eme ememme.+
Unu ga-eji anya unu hụ na Jeruselem bụ ebe unu ga-ebi ahụ́ eruo unu ala
Nakwa na ọ bụ ụlọikwuu a na-agaghị ebupụ ebupụ.+
O nweghị mgbe a ga-efopụ mkpọ́ ndị e ji jide ụlọikwuu a.
A gaghịkwa adọbi eriri ndị e ji rụọ ya.
21 Ma, Jehova, Onye Dị Ebube,
Ga-echebe anyị ebe ahụ otú osimiri ma ọ bụ ọwa mmiri sara mbara si echebe obodo.
Ìgwè ụgbọ epeepe agaghị agafe n’ọwa mmiri ahụ.
Ụgbọ mmiri ndị dị ebube agaghịkwa agafe na ya.
22 N’ihi na Jehova bụ Onyeikpe anyị.+
Jehova bụ Onye na-enye anyị iwu.+
Jehova bụ Eze anyị.+
Ọ bụ ya ga-azọpụta anyị.+
23 Eriri ji ụgbọ mmiri ndị iro unu ga-atọghe.
Ha agaghị ekesili osisi ákwà ụgbọ mmiri ha ike. Ha agaghịkwa agbasali ákwà ụgbọ mmiri ha.
N’oge ahụ, a ga-eke ọtụtụ ihe a kwatara n’agha.
Ndị ngwọrọ ga-akwatadị ọtụtụ ihe.+
24 O nweghị onye bi n’ala a ga-asị: “Ahụ́ adịghị m.”*+
A ga-agbaghara ndị bi na ya mmehie ha.+
34 Mba dị iche iche, bịanụ nso ka unu nụ ihe m ga-ekwu.
Mmadụ niile, geenụ ntị.
Ụwa na ihe niile dị na ya,
Elu ala na ndị niile bi na ya, geenụ ntị.
2 Jehova na-ewesa mba niile iwe.+
Ọ na-ewesa ndị agha ha niile iwe.+
Ọ ga-ebibi ha.
Ọ ga-egbu ha.+
3 A gaghị eli ndị ha e gburu egbu eli.
Ozu ha ga na-esi ísì.+
4 Ihe niile dị n’eluigwe ga-erekasị.
A ga-apịakọta eluigwe otú e si apịakọta akwụkwọ mpịakọta.
Ihe niile dị na ya ga-akpọnwụ,
Otú akwụkwọ osisi vaịn si akpọnwụ ma dapụ
Nakwa otú mkpụrụ osisi fig si ahịkpọ ma dapụ.
5 “N’ihi na ọbara ga-ekpuchi mma agha m n’eluigwe.+
M ga-ekpe ndị Ịdọm ikpe, jiri mma agha m sụọ ha akwụ,+
N’ihi na ekpebiela m ibibi ha.
6 Mụnwa bụ́ Jehova nwere mma agha. Ọ ga-abụ ọbara ọbara.
N’ihi na Jehova ga-achụ àjà na Bọzra,
Ọ ga-asụkwa ndị mmadụ akwụ n’Ịdọm.+
7 A ga-egbu atụ́ otú e gburu anụ ndị ọzọ,
Gbuokwa ma obere oké ehi ma nnukwu oké ehi.
Ọbara ga-ede ala ndị Ịdọm,
Ájá dị n’ala ha ga-abụkwa abụba abụba.”
8 N’ihi na Jehova ahọrọla ụbọchị ọ ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ.+
Ọ họrọkwala afọ ọ ga-akwụ ndị mere Zayọn ihe ọjọọ ụgwọ ihe ha mere.+
Otú ọkụ si agba korota ka ala ya ga-esi na-agba ọkụ.
10 A gaghị emenyụ ya emenyụ ma n’ehihie ma n’abalị.
Anwụrụ ọkụ ya ga na-akwụgo elu ruo mgbe ebighị ebi.
Otú ọ dị mgbe e bibiri ya ka ọ ga-adịgide si n’otu ọgbọ ruokwa n’ọgbọ ọzọ.
O nweghị onye ga-esi na ya gafee ruo mgbe niile ebighị ebi.+
11 Okwolo na ebi ogwu ga-ebichi ya.
Ikwiikwii* na ugoloọma ga-ebikwa na ya.
Chineke ga-eji eriri e ji atụ̀ ihe na nke e ji ama ma ihe ọ̀ kwụ ọtọ* tụọ ala a
Iji gosi na a ga-ebibi ya ya atọgbọrọ nkịtị.
12 E nweghị onye ọ bụla n’ime ndị ya a ma ama a ga-echi eze.
Ndị isi ya niile agaghịzi adị.
13 Ogwu ga-eto n’ụlọ elu ndị dị n’ime ya,
Ahịhịa akụwa na ahịhịa ogwu ga-etokwa n’ebe ya ndị a rụsiri ike.
Ọ ga-aghọkwa ụlọ nkịta ọhịa+
Na ogige enyí nnụnụ.
14 Anụ ọhịa ndị bi n’ọzara ga-ezute anụ ndị na-agbọ ụja.
Ewu ọhịa* ga-akpọkwa ibe ya òkù.
N’eziokwu, nnụnụ na-efe n’abalị* ga-atụsara ahụ́ ebe ahụ, hụkwa ebe ọ ga-ezu ike.
15 Agwọ ga-akpa akwụ́, yiekwa àkwá ebe ahụ.
Ọ ga-abụ àkwá ndị ahụ, chịkọtakwa ụmụ ya n’okpuru ya.
N’eziokwu, égbé ga-ezukọtakwa ebe ahụ, oké na nne, oké na nne.
16 Chọọnụ n’akwụkwọ Jehova ma gụpụta ya.
E nweghị otu n’ime ha a ga-achọ achọ.
O nweghịkwa nke na-agaghị enwe oké na nne,
N’ihi na ọ bụ Jehova ji ọnụ ya nye iwu ka ọ dịrị otú ahụ.
Ọ bụkwa mmụọ ya chịkọtara ha.
17 Ọ bụ ya feere ha nza.
Ọ bụkwa ya na-ekwu ebe nke ọ bụla n’ime ha ga-anọ.*
Ha ga-ebichi ebe ndị ahụ ruo mgbe ebighị ebi.
Ha ga-ebikwa na ha n’ọgbọ niile.
35 Ala ịkpa na ala kpọrọ nkụ ga-enwe aṅụrị.+
Ọzara ga-aṅụrịkwa ọṅụ, okooko osisi ga-ejukwa eju na ya.+
2 Okooko osisi ga-ejurịrị na ya.+
Ọzara ga-aṅụrị ọṅụ, tiekwa mkpu ọṅụ.
Ndị mmadụ ga-ahụ ebube Jehova, ya bụ, otú Chineke anyị si maa mma dị ebube.
4 Sịnụ ndị na-echegbu onwe ha:
“Obi sie unu ike. Unu atụla egwu.
Chineke unu ga-abịa ịkwụ ndị iro unu ụgwọ.
Chineke ga-abịa ịta ha ahụhụ.+
Ọ ga-abịa zọpụta unu.”+
6 Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu ka mgbada.+
Onye ogbi* ga-etikwa mkpu ọṅụ.+
Mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa.
Iyi ga na-asọkwa n’ọzara.
7 Ala kpọrọ nkụ ga-adị ka ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru.
Ala mmiri na-adịghị ga-adịkwa ka isi mmiri.+
Ahịhịa ndụ na ahịhịa amị na ahịhịa papaịrọs
Ga-adị n’ebe nkịta ọhịa na-ebi, n’ebe ha na-anọkwa ezu ike.+
Ọ bụ ụzọ a na-akpọ Ụzọ Dị Nsọ.
Onye rụrụ arụ agaghị akpa ụkwụ na ya.+
Ọ bụ naanị ndị kwesịrị ịga n’ụzọ ahụ ga na-aga na ya.
E nweghị onye nzuzu ọ bụla ga-azọ ụkwụ na ya.
9 Ọdụm agaghị anọ ebe ahụ.
O nweghịkwa anụ ọhịa ọjọọ ga-abịa na ya.
O nweghị nke a ga-ahụ ebe ahụ.+
Naanị ndị ga na-aga n’ụzọ ahụ bụ ndị a gbapụtara ebe e ji ha eji.+
10 Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta,+ tirikwa mkpu ọṅụ bata na Zayọn.+
Ha agaghị akwụsị ịna-enwe aṅụrị.+
Ha ga na-enwe obi ụtọ, na-enwekwa aṅụrị.
Iru uju na ịsụ ude ga-alakwa kpamkpam.+
36 N’afọ nke iri na anọ n’ọchịchị Hezekaya, Senakerib eze Asiria+ bịara ịlụso obodo niile a rụsiri ike na Juda agha ka o weghara ha.+ 2 Eze Asiria wee si na Lekish+ zie Rabshake*+ na ọtụtụ ndị agha ka ha gaa Jeruselem hụ Eze Hezekaya. Mgbe ha rutere Jeruselem, ha gara guzoro n’akụkụ okpo mmiri nke ọdọ mmiri dị n’ebe mgbago.+ Ọdọ mmiri ahụ dị n’ụzọ e si aga ebe ndị ọsụ ákwà na-anọ asụ ákwà.+ 3 Elayakim+ nwa Hilkaya, bụ́ onye na-elekọta ezinụlọ* eze, Shebna+ bụ́ odeakwụkwọ, na Joa nwa Esaf, bụ́ onye na-edekọ ihe, gakwuuru Rabshake.
4 Rabshake wee sị ha: “Biko, gwanụ Hezekaya, sị, ‘Eze ukwu, bụ́ eze Asiria, sịrị: “Gịnị kara gị obi?+ 5 Ị na-asị, ‘M nwere ndị agha ga-alụ agha a. M haziekwala otú m ga-esi alụ ya.’ Ma, ihe ị na-agba bụ égbè ọnụ. Ònye ka ị tụkwasịrị obi, mere obi ji kaa gị gị enupụrụ m isi?+ 6 Ndị ị tụkwasịrị obi na ha ga-enyere gị aka bụ ndị Ijipt, ndị dị ka ahịhịa amị huuru ehuru, nke ọ na-abụ mmadụ jide aka, ya agbajie, dụpuo onye ahụ aka. Otú ahụ ka Fero eze Ijipt na-eme ndị niile tụkwasịrị ya obi.+ 7 Ọ bụrụkwanụ na unu asị m na unu tụkwasịrị Jehova bụ́ Chineke unu obi, ọ́ bụghị ya bụ onye Hezekaya wepụrụ ebe ndị dị elu a rụụrụ ya nakwa ebe ịchụàjà ya,+ ma gwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem, sị, ‘N’ihu ebe ịchụàjà nke a dị na Jeruselem ka unu ga na-akpọ isiala’?”’+ 8 Biko, gị na onyenwe m bụ́ eze Asiria+ tie n’aka, ka m nye gị puku ịnyịnya abụọ (2,000) lee ma mmadụ ole i nwere na-agba ịnyịnya hà ga-ezu ịgba ha. 9 Ebe ị tụkwasịrị ndị Ijipt obi na ha ga-enye gị ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya, oleezi otú ị ga-esi nwee ike ịchụghachi otu gọvanọ azụ, ọ bụrụgodị otu n’ime ndị gọvanọ a na-anaghị anụ aha ha na-ejere onyenwe m ozi? 10 Ọ́ bụghị Jehova nyere m ikike ịbịa lụso obodo a agha ma bibie ya? Ọ bụ Jehova sịrị m, ‘Gaa lụso obodo a agha, bibiekwa ya.’”
11 Elayakim na Shebna+ nakwa Joa gwaziri Rabshake,+ sị: “Biko, gwawa ndị ohu gị okwu n’asụsụ Arameik,*+ n’ihi na anyị na-anụ ya. Agwala anyị okwu n’asụsụ ndị Juu n’ihi na ndị a nọ n’elu mgbidi na-anụ ya.”+ 12 Ma Rabshake sịrị ha: “Ọ̀ bụ naanị unu na onyenwe unu ka onyenwe m ziri m ka m gwa ihe ndị a? Ndị a nọ ọdụ n’elu mgbidi sokwa. Unu na ha ga-eri nsị unu, ṅụọkwa mamịrị unu.”
13 Rabshake wee kwụrụ na-ekwu okwu n’oké olu n’asụsụ ndị Juu,+ sị: “Nụrụnụ ihe eze ukwu, bụ́ eze Asiria, kwuru.+ 14 Eze kwuru, sị: ‘Unu ekwela ka Hezekaya duhie unu, n’ihi na ọ gaghị anapụtali unu.+ 15 Unu ekwekwala ka Hezekaya mee ka unu tụkwasị Jehova obi+ mgbe ọ na-agwa unu, sị: “Jehova ga-anapụtarịrị anyị. A gaghịkwa enyefe obodo a n’aka eze Asiria.” 16 Unu egela Hezekaya ntị, n’ihi na eze Asiria kwuru, sị: “Chịlierenụ m aka elu ka mụ na unu mee udo, onye ọ bụla n’ime unu ga na-erikwa ihe si n’osisi vaịn ya na ihe si n’osisi fig ya, na-aṅụkwa mmiri si n’olulu mmiri ya, 17 ruo mgbe m ga-abịa kpọrọ unu laa n’ala dị ka ala unu.+ Ọka,* mmanya ọhụrụ, achịcha, na ubi vaịn juru n’ala ahụ. 18 Unu egekwala Hezekaya ntị, n’ihi na ọ na-arafu unu, na-asị, ‘Jehova ga-anapụta anyị.’ Ò nweela chi ọ bụla n’ime chi mba dị iche iche napụtara ala ya n’aka eze Asiria?+ 19 Olee ebe chi niile ndị Hemat na ndị Apad+ na-efe nọ? Olee ebe chi niile ndị Sefaveyim+ na-efe nọ? Hà napụtara Sameria n’aka m?+ 20 Ole nke n’ime chi niile obodo ndị a na-efe napụtara obodo ha n’aka m, nke mere Jehova ga-eji napụta Jeruselem n’aka m?”’”+
21 Ma ha gbachiri nkịtị. Ha agwaghịkwa ya ihe ọ bụla, n’ihi na eze gwara ha, sị: “Unu atụpụrụla ya ọnụ.”+ 22 Ma Elayakim nwa Hilkaya, onye na-elekọta ezinụlọ* eze, Shebna+ bụ́ odeakwụkwọ, na Joa nwa Esaf, bụ́ onye na-edekọ ihe, dọwara uwe ha ma bịakwute Hezekaya, gwa ya ihe Rabshake kwuru.
37 Ozugbo Eze Hezekaya nụrụ ihe a, ọ dọwara uwe ya, chịrị ákwà iru uju kpuchie onwe ya ma banye n’ụlọ Jehova.+ 2 Ọ gwaziri Elayakim, bụ́ onye na-elekọta ezinụlọ* ya, Shebna bụ́ odeakwụkwọ, na ndị okenye bụ́ ndị nchụàjà, ka ha gakwuru Aịzaya onye amụma+ bụ́ nwa Emọz. Ha niile ji ákwà iru uju kpuchie onwe ha. 3 Mgbe ha garuru, ha sịrị ya: “Hezekaya sịrị anyị gwa gị, sị, ‘Taa bụ ụbọchị nsogbu na nke ịba mba* nakwa nke imenye ihere, n’ihi na anyị dị ka nwaanyị ime na-eme, nke ike ịmụpụta nwa na-adịghị.+ 4 O nwere ike bụrụ na Jehova bụ́ Chineke gị nụrụ ihe niile Rabshake kwuru, onye eze Asiria onyenwe ya ziri ka ọ bịa kwaa Chineke dị ndụ emo.+ Jehova bụ́ Chineke gị ga-atakwa ya ahụhụ maka ihe ndị ahụ ọ nụrụ. N’ihi ya, kpeere anyịnwa fọrọ n’obodo a ekpere.’”+
5 Mgbe ndị na-ejere Eze Hezekaya ozi zichara Aịzaya ozi a,+ 6 Aịzaya sịrị ha: “Gwanụ onyenwe unu, sị, ‘Jehova kwuru, sị: “Atụla egwu+ maka nkwulu a ị nụrụ ndị na-ejere eze Asiria ozi+ kwuluru m. 7 M ga-eme ka otu ihe gbata ya n’obi.* Ọ ga-anụkwa otu akụkọ ga-eme ka ọ laghachi n’obodo ya.+ M ga-eme ka e jiri mma agha gbuo ya ebe ahụ.”’”+
8 Mgbe Rabshake nụrụ na eze Asiria esila na Lekish pụọ, ọ laghachiri ma hụ ka ọ na-alụso ndị Libna agha.+ 9 Mgbe eze Asiria nụrụ na Teheka eze Etiopia abịala ịlụso ya agha, o ziri ndị mmadụ ka ha gaa ọzọ na nke Hezekaya.+ Ọ sịrị ha: 10 “Gwanụ Hezekaya eze Juda, sị, ‘Ekwela ka Chineke gị, onye ị tụkwasịrị obi, duhie gị, na-asị: “A gaghị enyefe Jeruselem n’aka eze Asiria.”+ 11 Ọ̀ kwa ị nụla otú ndị eze Asiria si bibie obodo niile?+ Ọ̀ bụzi gị ka a ga-anapụta? 12 Chi mba dị iche iche nna nna m hà bibiri, hà napụtara ha?+ Olee ebe ndị Gozan, ndị Heran,+ ndị Rizef, na ndị Iden, bụ́ ndị biri na Tel-asa, nọ? 13 Ebee ka eze ndị Hemat, eze ndị Apad, eze obodo ndị dị na Sefaveyim,+ eze ndị Hina, na eze ndị Iva nọ?’”
14 Hezekaya wee nata ndị ahụ bịara izi ya ozi akwụkwọ ozi ndị ha ji bịa, gụọkwa ha. Ọ gaziri n’ụlọ Jehova gbasaara ha* Jehova.+ 15 Hezekaya malitekwara ikpe ekpere gwa Jehova,+ sị: 16 “Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ Chineke Izrel, onye nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob, naanị gị bụ ezi Chineke nke alaeze niile dị n’ụwa. Ọ bụ gị kere eluigwe na ụwa. 17 Jehova, biko, tọọ ntị n’ala nụrụ ihe a.+ Jehova, biko, meghee anya gị hụrụ ihe a,+ nụrụkwa ihe niile Senakerib ziri ndị mmadụ ka ha kwuo iji kwaa Chineke dị ndụ emo.+ 18 Jehova, nke bụ́ eziokwu bụ na ndị eze Asiria alaala mba niile n’iyi,+ ma mba nke ha. 19 Ha agbaakwala chi mba ndị ahụ ọkụ+ n’ihi na ha abụghị ezigbo chi, kama ha bụ osisi na nkume, ọrụ aka mmadụ.+ Ọ bụ ya mere ha ji nwee ike ibibi ha. 20 Ma ugbu a, Jehova bụ́ Chineke anyị, biko, napụta anyị n’aka ya, ka alaeze niile dị n’ụwa mara na ọ bụ naanị gị, Jehova, bụ Chineke.”+
21 Aịzaya nwa Emọz wee zie ozi ka a gwa Hezekaya, sị: “Jehova, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Ebe ọ bụ na ị rịọrọ m arịrịọ gbasara ihe Senakerib eze Asiria chọrọ ime,+ 22 mụnwa bụ́ Jehova ekwuola gbasara ya, sị:
“Ndị bi na Zayọn* na-eleda gị anya, na-akwa gị emo.
Ndị bi na Jeruselem* na-efufere gị isi.
23 Ònye ka ị kwara emo+ ma kwuluo?
Ònye ka ị baara mba,+
Na-elekwa anya ọjọọ?
Ọ bụ Onye Nsọ Izrel.+
24 I si n’ọnụ ndị i ziri ozi kwaa Jehova emo,+ sịkwa,
‘M ga-eji ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya agha m
Gbagoo n’ọnụ ọnụ ugwu,+
N’ebe ndị dị n’ime ime Lebanọn.
M ruo, m ga-egbutu osisi sida ndị toro ezigbo ogologo na osisi junipa ndị kacha mma.
M ga-abanye ebe dị n’ime ime na ebe kacha bụrụ oké ọhịa.
25 M ga-egwu olulu mmiri, ṅụọkwa mmiri ya.
M ga-ejikwa ọbụ ụkwụ m mee ka iyi ndị dị n’Ijipt taa.’*
26 Ọ̀ bụ na ị nụbeghị ya? Ọ dịla ezigbo anya m kpebiri ime* ihe a.
O teela m zubere ime ya.+
Ugbu a, m ga-eme ya.+
Ị ga-ebibi obodo ndị a rụsiri ike, bibichaa ha ha aghọọ ikpo nkume.+
27 Ndị bi na ha agaghị enyeliri onwe ha aka.
Ụjọ ga na-atụ ha, ihere ana-emekwa ha.
Ha ga-adị ka ihe a kụrụ n’ubi na ahịhịa ndụ.
Ha ga-adịkwa ka ahịhịa dị n’elu ụlọ, nke ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ mere ka ọ kpọnwụọ.
28 Ma ama m mgbe ị nọ ọdụ, mgbe ị na-apụ apụ, mgbe ị na-abata abata,+
Nakwa mgbe ị na-ewesa m iwe,+
29 N’ihi na amatala m na ị na-ewesa m iwe.+ Anụkwala m mbigbọ ị na-ebigbọ.+
N’ihi ya, m ga-etinye nko m n’imi gị, keekwa gị eriri m ji edu ịnyịnya+ n’agbata egbugbere ọnụ gị abụọ,
M ga-eduru gị gị esi n’ụzọ i si bịa laghachi.”
30 “‘Lekwa ihe ị* ga-eji ama na ihe ndị a ga-emerịrị: N’afọ a, unu ga-eri ọka wit ndị puuru onwe ha.* N’afọ nke abụọ, unu ga-erikwa ọka wit ndị puuru onwe ha. Ma n’afọ nke atọ, unu ga-akụ ọka wit, ghọrọkwa mkpụrụ ya, kọọ ubi vaịn, riekwa ihe si na ya.+ 31 Ndị fọrọ ndụ+ ná ndị Juda ga-agbanye mgbọrọgwụ n’ala ka osisi, mịakwa mkpụrụ. 32 N’ihi na ndị fọdụrụ ga-esi na Jeruselem pụta. Ndị fọrọ ndụ ga-esikwa n’Ugwu Zayọn pụta.+ Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-eji ịnụ ọkụ n’obi mee ihe a.+
33 “‘N’ihi ya, Jehova kwuru gbasara eze Asiria,+ sị:
“Ọ gaghị abata n’obodo a.+
Ọ gaghịkwa agba otu akụ́ n’ime ya.
Ọ gaghị eji ọta bịa lụso ya agha.
Ọ gaghịkwa eji ájá rụọ mgbidi ga-agba obodo a gburugburu iji lụso ya agha.”’+
34 ‘Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi,
Ọ gaghịkwa abata n’obodo a.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
36 Mmụọ ozi Jehova gara n’ebe ndị Asiria mara ụlọikwuu gbuo otu narị puku mmadụ na puku iri asatọ na puku ise (185,000). Mgbe ndị mmadụ biliri n’isi ụtụtụ, ha hụrụ ozu ndị ahụ niile e gburu.+ 37 Mgbe ihe a mechara, Senakerib eze Asiria laghachiri Ninive,+ nọrọkwa ebe ahụ.+ 38 Ka ọ nọ na-akpọ isiala n’ụlọ chi ya bụ́ Nisrọk, ụmụ ya, bụ́ Adramelek na Shariza, weere mma agha gbuo ya+ ma gbaga Ararat.+ Isa-hadọn+ nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.
38 N’oge ahụ, Hezekaya rịawara ọrịa, nọrọkwa n’ọnụ ọnwụ.+ Aịzaya onye amụma+ bụ́ nwa Emọz wee bịa gwa ya, sị: “Jehova sịrị, ‘Gwa ndị ezinụlọ gị ihe ha ga-eme ma ị nwụọ, n’ihi na ị gaghị agbake. Ị ga-anwụ.’”+ 2 N’ihi ya, Hezekaya chere ihu n’ahụ́ ụlọ, bido ịrịọ Jehova, sị: 3 “Jehova, biko, ana m arịọ gị ka i cheta+ otú m si jiri obi m niile na-eso gị mgbe niile,+ na otú m si mee ihe dị mma n’anya gị.” Hezekaya bewere ákwá, na-ebesi ya ike.
4 Jehova gwaziri Aịzaya, sị: 5 “Laghachi, gwa Hezekaya,+ sị, ‘Jehova, bụ́ Chineke Devid nna nna gị, sịrị: “Anụla m ekpere gị.+ Ahụla m anya mmiri gị.+ M ga-eme ka ị dịkwuo ndụ afọ iri na ise.+ 6 M ga-anapụta ma gị ma obodo a n’aka eze Asiria. M ga-echebekwa obodo a.”+ 7 Jehova ga-eme ihe ga-egosi gị na ọ ga-eme ihe o kwuru. Jehova kwuru,+ sị: 8 “M ga-eme ka onyinyo dị n’elu ebe e si arịgo n’ụlọ* Ehaz laa azụ nzọụkwụ iri.”’”+ Onyinyo ahụ dị ebe ahụ lakwara azụ nzọụkwụ iri.
9 Hezekaya eze Juda dere ihe a mgbe ọ rịara ọrịa nke o mechara gbakee.
10 M sịrị: “M ga-abanye n’ọnụ ụzọ ámá ili*
Mgbe m na-emebeghị agadi.
A ga-anapụ m afọ ndị ọzọ m kwesịrị ịdịkwu ndụ.”
11 M sịrị: “Agaghị m ahụ amara Jaa.* Agaghị m ahụ amara Jaa n’ala ndị dị ndụ.+
Agaghị m ahụ ụmụ mmadụ anya ọzọ,
N’ihi na m ga-anọ ebe ndị nwụrụ anwụ nọ.
Afụkọtala m ndụ m otú onye na-ekwe ákwà si afụkọta ákwà o kwechara.
O meela ka m dị ka ákwà e si n’ígwè e ji ekwe ákwà chabie.
Si n’ụtụtụ ruo n’abalị, ị na-eme ka ihe siere m ike.+
13 M na-agbalị ka m nweta onwe m tupu chi abọọ.
Ma, ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile otú ọdụm si eme.
Si n’ụtụtụ ruo n’abalị, ị na-eme ka ihe siere m ike.+
14 M na-ebe ákwá otú elekentịọba ma ọ bụ nza* si ebe ubé.+
M na-ebe ákwá otú nduru si ebe ubé.+
Elekatala m anya n’elu, ike agwụ m,+ mụ asị:
‘Jehova, anọ m n’ezigbo nsogbu.
Biko, nyere m aka.’+
15 Olee otú m ga-esi kelee ya?
O kwere m nkwa, mezuokwa ya.
Ná ndụ m niile, m ga-eweda onwe m ala
Ka m na-echeta ezigbo nsogbu m nọbu na ya.*
16 M sịrị: ‘Jehova, ọ bụ gị* mere ka ndị mmadụ dịrị ndụ.
Ọ bụkwa gị mere ka m dịrị ndụ.
Ị ga-eme ka m gbakee. Ị ga-edowekwa m ndụ.+
17 Obi nọ na-ajọ m njọ kama obi iru m ala.
Ị naghịzi echeta mmehie m niile.*+
Ọnwụ enweghịkwa ike ịja gị mma.+
Ndị na-agbada n’olulu enweghị ike ịtụkwasị gị obi na ị na-eme ihe i kwuru.+
19 Naanị onye dị ndụ nwere ike ito gị,
Dị ka m nwere ike ito gị taa.
Nwoke nwere ike ịgwa ụmụ ya na ị na-eme ihe i kwuru.+
20 Jehova, biko, bịa zọpụta m.
21 Aịzaya wee sị: “Wetanụ mkpụrụ fig kpọrọ nkụ a kpụrụ akpụ ma tụkwasị ya n’etuto toro ya. Ọ bụ ya ga-eme ka ọ gbakee.”+ 22 Hezekaya jụburu Aịzaya, sị: “Olee ihe ga-egosi na m ga-aga n’ụlọ Jehova?”+
39 N’oge ahụ, eze Babịlọn, bụ́ Merodak-baladan nwa Baladan, ziteere Hezekaya akwụkwọ ozi na onyinye+ maka na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa ma gbakee.+ 2 Hezekaya nabatara ndị wetara ihe ndị ahụ nke ọma.* O gosikwara ha ụlọ e dowere akụ̀ ya niile,+ ma ọlaọcha ma ọlaedo ma mmanụ balsam ma mmanụ ndị ọzọ dị oké ọnụ ma ngwá agha ya niile nakwa ihe niile dị ebe a na-edowe akụ̀ ya. O nweghị ihe Hezekaya na-egosighị ha n’ụlọ* ya nakwa n’ebe niile ọ na-achị.
3 Mgbe e mechara, Aịzaya onye amụma bịakwutere Eze Hezekaya ma jụọ ya, sị: “Gịnị ka ndị a bịaranụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịa?” Hezekaya asị: “Ha si ebe dị anya bịa, ha si Babịlọn.”+ 4 Aịzaya jụziri ya, sị: “Gịnị ka ha hụrụ n’ụlọ* gị?” Hezekaya asị: “Ha hụrụ ihe niile dị n’ụlọ m. O nweghị ihe ọ bụla dị n’ebe m na-edowe akụ̀ nke m na-egosighị ha.”
5 Aịzaya asị Hezekaya: “Nụrụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, 6 ‘Oge na-abịa mgbe a ga-abịa buru ihe niile dị n’ụlọ* gị nakwa ihe niile nna nna gị hà kpakọtara ruo taa laa Babịlọn. O nweghị ihe ga-afọdụ.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.+ 7 ‘A ga-akpọrọkwa ụfọdụ n’ime ụmụ ndị nwoke ị ga-amụ, ha aghọọ ndị na-eje ozi n’obí eze Babịlọn.’”+
8 Hezekaya asị Aịzaya: “Ihe Jehova kwuru, nke ị gwara m, dị mma.” Ọ sịkwara: “Ọ dị mma ma ọ bụrụ na udo ga-adị, obi eruokwa onye ọ bụla ala* n’oge niile m dị ndụ.”*+
40 Chineke unu kwuru, sị: “Kasienụ ndị m obi. Kasienụ ha obi.”+
2 “Gwanụ ndị bi na Jeruselem okwu ga-eru ha n’obi.*
Gwanụ ha na oge ha ga-akwụsị ịta ahụhụ eruola
Nakwa na a kwụchaala ụgwọ mmehie ha.+
N’ihi na Jehova ataala ha ahụhụ niile ha kwesịrị ịta maka mmehie ha niile.”+
3 E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị:
“Dozienụ ụzọ Jehova!+
Sinụ n’ọzara waara Chineke anyị okporo ụzọ kwụ ọtọ.+
4 Meenụ ka ndagwurugwu niile dị elu,
Meekwanụ ka ugwu ukwu niile na ugwu nta niile dị larịị.
Ala dị ndakoro ndakoro ga-adị larịị.
Ala na-adịghị larịị ga-adịkwa larịị.+
5 A ga-eme ka a mara na Jehova dị ebube.+
6 Gee ntị! E nwere onye sị: “Maa ọkwa!”
Onye ọzọ ajụọ ya, sị: “Gịnị ka m ga-ama n’ọkwa?”
“Mmadụ* niile bụ ahịhịa ndụ.
Ịhụnanya ha niile dị ka ifuru ahịhịa.+
N’eziokwu, ndị mmadụ bụ ahịhịa ndụ.
8 Ahịhịa ndụ na-akpọnwụ akpọnwụ,
Okooko ya na-achanwụkwa achanwụ,
Ma, okwu Chineke anyị na-adịru mgbe ebighị ebi.”+
Nwaanyị nke na-ezi Jeruselem ozi ọma,
Jiri ike gị tie mkpu.
Tie mkpu. Atụla egwu.
Gwa obodo ndị dị na Juda, sị: “Leenụ Chineke unu.”+
10 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-abịa gosi ike ya.
Aka ya ka ọ ga-eji na-achị.+
Ọ dị njikere ịkwụ ndị ya ụgwọ ọrụ.
Ihe ọ ga-akwụ ha dịkwa n’ihu ya.+
11 Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya otú onye na-azụ atụrụ si azụ atụrụ.+
Ọ ga-eji aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya.
Ọ ga-ekuru ha n’obi ya.
Ọ ga-eji nwayọọ na-edu ndị nke ka na-enye ụmụ ha ara.+
12 Ònye ka ọbụ aka ya nwere ike ịba mmiri niile dị n’oké osimiri?+
Ònyekwa ji ọbụ aka* ya tụọ eluigwe?
Ònye wụnyere ájá dị n’ala n’ihe e ji atụ̀ ihe+
Ma ọ bụ jiri ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ugwu ukwu,
Jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ugwu nta?
13 Ònye tụrụ mmụọ Jehova ka ọ mata otú ọ hà?*
Ònyekwa ga-adụli Chineke ọdụ, kụziekwara ya ihe?+
14 Ònye ka ọ gakwuuru ka ọ ghọta ihe?
Ònye na-akụziri ya otú e si ekpe ikpe ziri ezi?
Ònye na-akụziri ya ihe?
Ònye na-agwa ya otú e si aghọta ihe nke ọma?+
15 Ọ na-ewere mba niile ka mmiri si na bọket tapụ.
Ọ na-ewerekwa ha ka uzuzu dị n’elu ihe e ji atụ̀ ihe.+
Ọ na-abọli agwaetiti elu ka uzuzu.
16 Ọ bụrụgodị na mmadụ egbutuo osisi niile dị na Lebanọn, dowe ha n’elu ebe ịchụàjà ka o tinye ha ọkụ,
Onye ahụ ejirikwa anụ ọhịa niile dị ebe ahụ chụọ àjà a na-esu ọkụ, ihe o kwesịrị inye Chineke ezubeghị.
17 Mba niile dị ka ihe na-adịghị adị n’anya ya.+
Ọ na-ewere ha ka ihe na-enweghị ihe ha bụ na ihe efu.+
18 Ònye ka unu ga-eji tụnyere Chineke?+
Oleekwa ihe unu ga-asị na o yiri?+
19 Omenkà na-akpụ arụsị.
Onye na-eji ígwè akpụ ihe na-ejikwa ọlaedo machie ya,+
Jirikwa ọlaọcha kpụọ ihe a ga-eji chọọ ya mma.
20 Mmadụ na-ahọrọ otu osisi ọ ga-eji pịa arụsị.+
Ọ na-ahọrọ osisi na-agaghị ere ure.
Ọ na-achọta omenkà bụ́ aka ochie
Ka ọ pịara ya arụsị na-agaghị na-ete kweke kweke.+
21 Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe a?
Ọ̀ bụ na unu anụbeghị ihe a?
Ọ̀ bụ na a kọbereghị unu ya kemgbe ụwa?
Ọ̀ bụ na unu aghọtaghị ihe a n’agbanyeghị na o doro anya kemgbe a tọrọ ntọala ụwa?+
Ọ na-agbasa eluigwe ka ákwà dị fere fere,
Na-agbasakwa ya ka ụlọikwuu a ga-ebi ebi.+
24 Ha dị ka mkpụrụ a ka kụrụ akụ.
Ha dịkwa ka mkpụrụ a ka ghara agha.
Úkwù ha agbanyebeghị mgbọrọgwụ n’ala.
Ikuku fee ha, ha akpọnwụọ,
Ifufe na-ebufukwa ha ka ahịhịa ọka.+
25 Onye Nsọ kwuru, sị: “Ònye ka unu ga-eji tụnyere m? Ònye ka mụ na ya hà?”
26 “Leenụ anya n’eluigwe hụ ihe ndị a.
Ònye kere ha?+
Ọ bụ Chineke, onye na-edu ha n’ìgwè, na-agụkwa ha ọnụ.
Ọ na-akpọ ha niile aha n’otu n’otu.+
O nweghị otu n’ime ha ọ na-achọ achọ,
N’ihi na ike ya dị egwu, ume ya enweghịkwa atụ.+
27 Jekọb, gịnị mere i ji ekwu ihe a? Izrel, gịnị mere i ji na-asị,
‘Jehova anaghị ahụ otú ihe si dịrị m,
Chineke leghaara mmegbu a na-emegbu m anya’?+
28 Ị́ matabeghị ihe a? Ị́ nụbeghị ihe a?
Jehova, onye kere ihe niile dị n’ụwa, bụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi.*+
Ọ naghị ada mbà, ike anaghịkwa agwụ ya.+
O nweghị onye ga-amatali otú ọ na-aghọtaru ihe.+
29 Ọ na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike.
Ọ na-emekwa ka ume ju onye na-enweghị ume obi.+
30 Ụmụaka ndị nwoke ga-ada mbà. Ike ga-agwụkwa ha.
Ụmụ okorobịa ga na-adajọgharị, na-adarukwa ala.
31 Ma, ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike.
Ha ga-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo.+
Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha.
Ha ga-eje ije, ma ha agaghị ada mbà.”+
41 “Ndị bi n’agwaetiti, nọrọnụ jii gee m ntị.*
Mba dị iche iche, nwetaghachinụ ike.
Bịanụ m nso kwuo okwu.+
Ka anyị nọrọ ihu na ihu ka m kpee unu ikpe.
2 Ònye nyere onye si ebe ọwụwa anyanwụ ike?+
Ònye kpọrọ ya ka ọ bịa kpee ikpe ziri ezi,
Ka e nyefee mba dị iche iche n’aka ya,
Meekwa ka o merie ndị eze dị iche iche?+
Ònye ji mma agha ya gbuo ha, ha aghọọ uzuzu?
Ònye jikwa ụta ya gbajasịa ha, ha adị ka ahịhịa ọka nke ifufe na-ebugharị?
3 Ọ na-achụ ha ọsọ.
Ọ na-eji ụkwụ si ụzọ ọ na-agatụbeghị mbụ chụọ ha ọsọ. E nweghịkwa ihe na-anọchiri ya ụzọ.
4 Olee onye na-arụ ọrụ kemgbe nke mere ihe a?
Oleekwa onye mere ka ọgbọ dị iche iche dịrị kemgbe ụwa?
“Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Onye Mbụ.+
M ga-abụkwa otu onye ahụ ruo mgbe ọgbọ ikpeazụ ga-aga.”+
5 Ndị bi n’agwaetiti dị iche iche hụrụ ihe na-eme, tụwa ụjọ.
Ndị bi ná nsọtụ niile nke ụwa malitere ịma jijiji.
Ha gbakọrọ ma na-abịa nso.
6 Onye ọ bụla na-enyere ibe ya aka,
Otu onye ana-asịkwa nwanne ya: “Dị ike.”
7 Omenkà na-agba onye na-eji ígwè akpụ ihe ume.+
Onye na-eji hama e ji akpụ ụ́zụ́ akụsa ígwè
Na-agba onye ọzọ na-akụkọta ígwè na ígwè ume.
Ọ na-asị na otú e si kụkọta ígwè ndị ahụ dị mma.
N’ikpeazụ, mmadụ na-eji ntu kụgide arụsị ahụ n’ihe ka ọ ghara ite kweke kweke.
Jekọb, ọ bụ gị ka m họọrọ.+
Ị bụ nwa* Ebreham bụ́ enyi m.+
9 Esi m n’ebe ụwa sọtụrụ kpọrọ gị.+
Esi m n’ebe kacha anya n’ụwa kpọrọ gị.
M sịrị gị, ‘Ị bụ ohu m.+
Ahọrọla m gị. Ajụghị m gị ajụ.+
10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+
Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị.+
M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka.+
M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.’
11 Ihere ga-eme ndị niile na-ewesa gị iwe. A ga-emechukwa ha ihu.+
M ga-ala ndị na-alụso gị agha n’iyi. Ha agaghịzi adị.+
12 Ị ga-achọ ndị na-alụso gị agha, ma ị gaghị ahụ ha.
Ndị na-alụso gị agha ga-adị ka ihe na-adịghị adị na ihe efu.+
13 N’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị.
Ọ bụ m na-asị gị, ‘Atụla egwu. M ga-enyere gị aka.’”+
14 Jehova, Onye Mgbapụta gị,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel, sịrị, “Gịnwa bụ́ Jekọb, onye dị ka idide e kwesịrị imetere ebere, atụla egwu,+
Ndị Izrel, m ga-enyere unu aka.
15 Emeela m ka unu bụrụ ihe e ji eticha ọka,+
Ya bụ, ngwá ọrụ ọhụrụ nke nwere ezé n’akụkụ ya abụọ, nke e ji eticha ọka.
Unu ga-azọda ugwu ukwu dị iche iche, zọriekwa ha.
Unu ga-emekwa ka ugwu nta dị iche iche dị ka mkpo ọka.
16 Unu ga-afụcha ha.
Ifufe ga-ebufukwa ha.
Oké ifufe ga-efesasị ha.
Unu ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi Jehova.+
Unu ga-ejikwa Onye Nsọ Izrel na-eme ọnụ.”+
17 “Ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na ndị ogbenye na-achọ mmiri, ma mmiri adịghị.
Mmiri agụkatala ha ire ha akpọọ nkụ.+
Mụnwa, bụ́ Jehova, ga-enyere ha aka.+
Mụnwa, bụ́ Chineke Izrel, agaghị ahapụ ha.+
18 M ga-eme ka osimiri na-asọ n’elu ugwu ahịhịa na-adịghị,+
Meekwa ka ndagwurugwu bụrụ ebe mmiri si agbapụta.+
M ga-eme ka ala ịkpa bụrụ ọdọ mmiri ahịhịa amị juru,
Meekwa ka ala mmiri na-adịghị bụrụ isi iyi.+
M ga-akụkwa osisi junipa na osisi ash
Nakwa osisi saịpres n’ọzara.+
20 Ihe a ga-eme ka ndị mmadụ hụ, mata,
Gee ntị ma ghọta
Na ọ bụ aka Jehova mere ihe a,
Nakwa na ọ bụ Onye Nsọ Izrel mere ya.”+
21 Jehova kwuru, sị, “Zaranụ ọnụ unu.”
Eze na-achị Jekọb kwuru, sị, “Kwuonụ otú o si bụrụ na aka unu dị ọcha.
22 Arụsị dị iche iche, kọọrọnụ anyị ihe ndị gaje ime, kwuokwanụ otú unu si jide n’aka na ha ga-eme.
Ma ọ bụ, gwanụ anyị ihe ndị na-aga ime.+
Meenụ ihe ga-eju anyị anya ma anyị hụ ya,
Ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.+
24 Unu abaghị uru ọ bụla.
O nweghị ihe ọ bụla unu na-arụpụta.+
Onye ọ bụla kpebiri ife unu rụrụ arụ.+
25 Enyela m onye si n’ebe ugwu ike. Ọ ga-abịakwa.+
Onye a nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ+ ga-eto aha m.
Ọ ga-azọ ndị na-achị achị* ụkwụ ka à ga-asị na ha bụ ụrọ.+
Ọ ga-azọ ha ụkwụ otú ahụ ọkpụite si azọ ụrọ.
26 Ònye kwuru gbasara ihe a ná mmalite, ka anyị wee mara,
Ma ọ bụ, ònye gwara anyị ya n’oge gara aga, ka anyị nwee ike ịsị, ‘O kwuru eziokwu’?+
N’eziokwu, o nweghị onye mara ọkwa ya.
O nweghị onye kwusara ya.
O nweghị onye nụrụ olu unu.”+
27 Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, sị: “Lekwa ihe na-aga ime.”+
E nwere onye m ga-agwa ka ọ gaa zie ozi ọma na Jeruselem.+
28 M nọ na-ele anya, ma o nweghị onye m hụrụ.
O nweghị onye ọ bụla n’ime ha na-enye ndụmọdụ.
M nọ na-ajụ ha ajụjụ, ma ha azaghị m.
29 Ha niile abaghị uru ọ bụla.*
O nweghị ihe ha ga-emeli.
Arụsị ha a kpụrụ akpụ enweghị isi na ọdụ.+
Enyela m ya mmụọ m.+
Ọ ga-eme ka a na-ekpe ikpe ziri ezi ná mba niile.+
2 Ọ gaghị eti mkpu. Ọ gaghị eme ka olu ya na-ala elu.
Ọ gaghịkwa eme ka a nụ olu ya n’okporo ámá.+
3 Ọ gaghị agbaji ahịhịa amị huuru ehuru.
Ọ gaghịkwa emenyụ owu mpanaka* ọ bụla na-achọ ịnyụ anyụ.+
Ọ ga-ahụrịrị na e kpere ikpe ziri ezi.+
4 Ike agaghị agwụ ya. Ọ gaghịkwa ada mbà ruo mgbe o mere ka a na-ekpe ikpe ziri ezi n’ụwa.+
Ndị bi n’agwaetiti dị iche iche ga na-echere iwu* ya.
Ọ bụ ya kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya.+
6 “Mụnwa, bụ́ Jehova, akpọọla gị n’ihi na m na-eme ezi omume.
M serela gị n’aka.
M ga-echebe gị, meekwa ka ọ bụrụ gị ka mụ na ndị mmadụ ga-eji gbaa ndụ.+
M ga-emekwa ka ị bụrụ ìhè mba niile ji ahụ ụzọ,+
Meekwa ka ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị si n’ụlọ mkpọrọ pụta.+
8 Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.
Anaghị m enye onye ọzọ ùgwù ruuru m.
Anaghịkwa m enye arụsị a pịrị apị otuto e kwesịrị inye m.+
9 Ihe ndị m kwuru n’oge gara aga emezuola.
Ọ bụzi ihe ndị ọhụrụ ka m na-akpọsa.
Tupu ha emewe, m na-agwa unu gbasara ha.”+
10 Ndị si n’oké osimiri aga njem na ihe niile dị n’oké osimiri,
Agwaetiti dị iche iche na ndị bi na ha,+
Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+
Jirinụ abụ too ya n’ụwa niile.+
Ka ndị bi ná nnukwu nkume tie mkpu ọṅụ.
Ka ha nọrọ n’elu ugwu dị iche iche tisie mkpu ike.
Ọ ga-adị ka onye agha na-anụ ọkụ n’obi ịga agha.+
Ọ ga-eti mkpu. Ọ ga-eti mkpu agha.
Ọ ga-egosi na ya ka ndị iro ya ike.+
14 “Agbachiri m nkịtị kemgbe.
Ekwughị m ihe ọ bụla. M jidere onwe m.
M ga-asụ ude, kusie ume ike, kuokwa ume ọkụ ọkụ n’otu mgbe ahụ
Otú nwaanyị na-amụ nwa na-eme.
15 M ga-ala ugwu ukwu na ugwu nta n’iyi,
M ga-emekwa ka ahịhịa ndụ niile dị na ha kpọọ nkụ.
M ga-eme ka osimiri ghọọ agwaetiti.
M ga-emekwa ka ọdọ mmiri ndị ahịhịa amị juru takọọ.+
16 M ga-eduru ndị ìsì gaa n’ụzọ ha na-amaghị.+
M ga-emekwa ka ha jee ije n’okporo ụzọ ha na-amaghị.+
Ọ bụ ihe ndị a ka m ga-emere ha. M gaghịkwa ahapụ ha.”
17 Ihere ga-emegbu ndị tụkwasịrị arụsị a pịrị apị obi,
Ndị na-asịkwa arụsị ndị a kpụrụ akpụ: “Unu bụ chi anyị.”+
A ga-emekwa ka ha laghachi azụ.
18 Ndị ntị chiri, geenụ ntị.
Ndị ìsì, leenụ anya ka unu hụ ụzọ.+
19 È nwere onye ọzọ kpuru ìsì ma e wezụga ohu m?
Ònyekwa ka ntị chiri ka onye na-agara m ozi?
Ònye kpuru ìsì ka onye m kwụrụ ụgwọ?
Ònye kpuru ìsì ka ohu Jehova?+
20 Ị na-ahụ ọtụtụ ihe, ma ị naghị echebara ha echiche.
Ị na-eghewe ntị gị oghe, ma ị naghị ege ntị.+
22 Ma, ndị a bụ ndị e bukọọrọ ihe ha, kwakọrọkwa ihe ha.+
A kpọchiri ha niile n’ime olulu. E zokwara ha n’ụlọ mkpọrọ.+
A kpụrụla ha. E nweghịkwa onye ga-anapụta ha.+
A kpọọrọ ha n’ike. E nweghịkwa onye na-asị: “Kpọghachite ha!”
23 Ònye n’ime unu ga-anụ ihe a?
Ònye ga-atọ ntị n’ala, geekwa ntị maka ọdịnihu?
24 Ònye nyefere Jekọb n’aka ndị kwakọọrọ ihe ya,
Nyefeekwa Izrel n’aka ndị na-ebukọrọ ihe mmadụ?
Ọ́ bụghị Jehova, onye anyị mehiere?
Ha jụrụ ije ije n’ụzọ ya.
O nweghị otú ọ na-esighị wesa ha iwe, ma ha achọghị ịma.+
Ọ nọ na-ewere ha ezigbo iwe, ma o metụghị ha n’obi.+
“Unu atụla egwu, n’ihi na agbapụtala m unu.+
Akpọrọ m unu aha unu.
Unu bụ ndị nke m.
2 Ọ bụrụ na unu agafewe mmiri, m ga-anọnyere unu.+
Ọ bụrụkwa na unu agafewe osimiri, ọ gaghị eri unu.+
Ọ bụrụ na unu agafewe ebe ọkụ dị, ọ gaghị ere unu,
Ire ọkụ agaghịkwa ere unu.
3 N’ihi na abụ m Jehova Chineke unu,
Onye Nsọ Izrel na Onye Nzọpụta unu.
Ejirila m Ijipt, Etiopia, na Siba
Kwụọ ụgwọ ka a gbapụta unu.
4 N’ihi na ejighị m unu egwu egwu.+
Agụrụ m unu ná ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù. M hụkwara unu n’anya.+
M ga-eji ndị mmadụ gbanweta unu,
Jirikwa mba dị iche iche gbanweta ndụ* unu.
5 Unu atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere unu.+
6 M ga-asị ebe ugwu, ‘Hapụ ha!’+
M ga-asịkwa ebe ndịda, ‘Ejichila ha.
Sinụ n’ebe dị anya kpọlata ụmụ m ndị nwoke, sikwanụ ná nsọtụ ụwa kpọlata ụmụ m ndị nwaanyị.+
9 Ka mba niile zukọọ otu ebe.
Ka mmadụ niile zukọtakwa.+
È nwere chi ga-ekwuli ihe a?
Ma ọ bụ hà ga-emeli ka anyị nụ ihe mbụ ga-emenụ?+
Ka ha kwuo otú o si bụrụ na ihe ha mere ziri ezi, ka ha kpọpụtakwa ndị àmà ha,
Ka ha nụ ya, kwuokwa, sị, ‘Ọ bụ eziokwu!’”+
10 Jehova kwuru, sị: “Unu bụ ndị àmà m.+
N’eziokwu, unu bụ ndị ohu m* m họọrọ,+
Ka unu mara m, nweekwa okwukwe n’ebe m nọ,*
Ka unu ghọtakwa na anaghị m agbanwe agbanwe.+
Ọ dịghị Chi dị tupu mụnwa,
E wezụgakwa m, e nweghị chi ọzọ dị.+
11 Abụ m Jehova.+ E nweghịkwa onye nzọpụta ọzọ ma e wezụga m.”+
12 Jehova kwuru, sị: “Mgbe chi ọzọ na-adịghị n’ala unu,+
Ọ bụ m kwuru ihe ga-eme, zọpụta unu, meekwa ka a nụ ya.
N’ihi ya, unu bụ ndị àmà m. Abụkwa m Chineke.+
13 Anaghịkwa m agbanwe agbanwe.+
O nweghị onye ga-anapụtali m ihe m ji n’aka.+
M mewe ihe m chọrọ ime, ònye ga-egbochili m ime ya?”+
14 Jehova, Onye Mgbapụta unu,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru, sị:
“M ga-eji maka unu zie ndị agha ka ha gaa Babịlọn ma wepụchaa ihe e ji tụchie ọnụ ụzọ ámá,+
Meriekwa ndị Kaldia nọ n’ụgbọ mmiri, ha ana-eti mkpu n’ihi ahụhụ ha na-ata.+
15 Abụ m Jehova, Onye Nsọ unu,+ Eze unu,+ na Onye kere Izrel.”+
17 Ọ bụ ya na-akpụpụta ụgbọ ịnyịnya agha na ịnyịnya,+
Na-akpọpụtakwa ndị agha na ndị bụ́ dike n’agha. Ọ sịrị:
“Ha ga-edina ala. Ha agaghị ebili.+
A ga-egbu ha n’egbughị oge otú ahụ e si afụnyụ ọkụ dị n’owu mpanaka* n’egbughị oge.”
18 “Unu echetakwala ihe ndị gara aga.
Unu echegbukwala onwe unu gbasara ihe ndị gara aga.
Emewedịla m ya.
Ọ̀ bụ na unu amaghị gbasara ya?
20 Anụ ọhịa ga-akwanyere m ùgwù,
Ma nkịta ọhịa ma enyí nnụnụ,
Maka na emeela m ka mmiri dị n’ala ịkpa,
Meekwa ka osimiri dị n’ọzara,+
Ka ndị m, bụ́ ndị m họọrọ,+ ṅụọ mmiri.
23 Unu akpụtaraghị m atụrụ mgbe unu bịara ịchụ àjà a na-esucha ọkụ,
Unu achụghịkwa àjà dị iche iche iji too m.
Amanyeghị m unu ka unu wetara m onyinye.
Emeghịkwa m ka ike gwụ unu n’ihi na asịghị m unu wetara m frankinsens.+
24 Unu ejighị ego unu zụtara m okpete na-esi ísì ọma.
Unu ejighịkwa abụba si n’àjà ndị unu chụrụ mee ka afọ ju m.+
Kama, mmehie unu dị m ka ibu arọ.
Unu ejirikwala ajọ omume unu mee ka ike gwụ m.+
25 Ọ bụ m bụ Onye na-ehichapụ mmehie unu*+ n’ihi aha m.+
Agaghịkwa m echeta mmehie unu.+
26 E nwee ihe m chefuru, chetaranụ m. Ka anyị leba okwu mụ na unu anya.
Kwuonụ ihe gosiri na aka unu dị ọcha.
27 Onye mbụ bụ́ nna unu mehiere.
Ndị na-ekwuchite ọnụ* unu enupụrụla m isi.+
28 N’ihi ya, m ga-ewere ndị isi nke ebe nsọ ka ndị rụrụ arụ.
M ga-eme ka e bibie Jekọb,
Meekwa ka a kparịa ndị Izrel.+
44 “Jekọb ohu m, gee ntị.
Izrel, onye m họọrọ, geekwa ntị.+
2 Jehova bụ Onye kere gị na Onye mere ka ị dịrị ndụ,+
Onye na-enyere gị aka malite n’oge ị nọ n’afọ.*
Ọ bụ ya kwuru, sị:
‘Jekọb ohu m, atụla egwu.+
Jeshurọn,*+ onye m họọrọ, atụla ụjọ.
5 Otu onye ga-asị: “Abụ m nke Jehova.”+
Onye nke ọzọ ga-akụrụ aha Jekọb.
Ihe onye ọzọ ga-ede n’aka ya bụ: “Abụ m nke Jehova.”
Ọ ga-azawazi aha Izrel.’
‘Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.+
Ọ dịghị Chineke ọzọ dị ma e wezụga m.+
Ya kwuo okwu ma gosi m ihe o ji dị ka m.+
Malite n’oge m mere ka ndị oge ochie bido ịdị ndụ,
Ka ha kwuo ihe ndị ga-eme n’oge na-adịghị anya
Na ndị nke ga-eme n’ọdịnihu.
8 Ndị m, unu atụla ụjọ.
Unu atụkwala egwu.+
Ọ̀ bụ na mụ adịghị mbụ gwa ya onye ọ bụla n’ime unu?
Unu bụ ndị àmà m.+
Ọ̀ dị Chineke ọzọ dị ma e wezụga m?
Mba, ọ dịghị Oké Nkume ọzọ dị.+ Ọ dịghị ọzọ m ma.’”
9 Ndị niile na-apị arụsị enweghị ihe ha bụ.
Ihe ndị ahụ ha hụrụ n’anya agaghịkwa aba uru ọ bụla.+
Arụsị ndị ahụ bụ ndị àmà ha. Ma, ha anaghị ahụ ihe ọ bụla. Ha amaghịkwa ihe ọ bụla.+
N’ihi ya, ihere ga-eme ndị pịrị ha.+
11 Ihere ga-eme ndị òtù ya niile.+
Ndị omenkà ya bụ ụmụ mmadụ nkịtị.
Ha niile ga-ezukọta, guzoro otu ebe.
Ụjọ ga-ejide ha, ihere emeekwa ha.
12 Onye na-akpụ ụ́zụ́ na-etinye ígwè n’ọkụ, mechaa were ihe o ji akpụ ụ́zụ́ jiri ígwè ahụ kpụọ ihe.
Ọ na-akụ ya hama,
Jirikwa aka ya dị ike na-akụ ya.+
Agụụ na-emecha gụwa ya, ike agwụkwa ya.
Ọ naghị aṅụ mmiri. Ike na-agwụkwa ya.
13 Onye na-eji osisi apị ihe chọọ ịpị ihe, ya agbatịa eriri e ji atụ̀ ihe n’elu osisi, jiri nzu uhie see otú ihe ahụ ọ chọrọ ịpị ga-adị.
Ọ na-eji mkpịsị ígwè ese otú ọ ga-adị, jirikwa ihe e ji akpụcha osisi kpụchaa ya.
Ọ na-apịgide ya ya eyie mmadụ.+
14 E nwere onye ọrụ ya bụ igbutu osisi sida.
A bịakwa n’osisi ndị ọzọ dị n’oké ọhịa,
O nwere ike ịhọrọ osisi ook, hapụ ya ka ọ kaa akaa.+
O nwekwara ike ịkụ osisi lọrel, mmiri ozuzo emee ka o too.
15 Mmadụ na-eji osisi ahụ mere nkụ.
Ọ na-egbute nke ọ ga-eji nyaa ọkụ.
Ọ na-akwanye ọkụ, jiri ya mee achịcha.
Ma, ọ na-ejikwa osisi ahụ apị chi, na-efekwa ya.
Ọ na-eji osisi ahụ apị arụsị, na-akpọkwara ya isiala.+
16 Ọ na-etinye ọkara ya ọkụ.
Ọ na-eji ya ahụ anụ ọ ga-ata. Ya tachaa, afọ eju ya.
Ọ na-anyakwa ọkụ, sị:
“Ehee! Ahụ́ ekporola m ọkụ ka m na-ele ọkụ a.”
17 Ma, ọ na-eji nke fọrọ afọ pịa chi, ya abụrụ arụsị a pịrị apị.
Ọ na-akpọrọ ya isiala, na-efekwa ya.
Ọ na-arịọ ya, sị:
“Zọpụta m, n’ihi na ị bụ chi m.”+
18 Ndị na-eme ihe a amaghị ihe ọ bụla. Ha anaghịkwa aghọta ihe ọ bụla,+
N’ihi na a nyachiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ.
Ha* anaghịkwa aghọta ihe.
19 E nweghị onye na-eche echiche.
E nweghịkwa onye ma ihe ma ọ bụ onye na-aghọta ihe, nke na-asị:
“Etinyere m ọkara osisi ahụ ọkụ,
Jiri icheku ọkụ ya mee achịcha, jirikwa ya hụọ anụ m tara.
M̀ kwesịrị iji nke fọrọ afọ pịa ihe rụrụ arụ?+
M̀ kwesịrị ife mkpirisi osisi?”
20 Ọ dị ka onye na-aracha ntụ.
Obi ya duhiere ya maka na a ghọgburu ya.
O nweghị ike ịzọpụta onwe ya.* Ọ naghịkwanụ asị:
“Arụsị a m ji n’aka abaghị uru ọ bụla.”
21 “Jekọb, cheta ihe ndị a, Izrel, chetakwa ihe ndị a,
N’ihi na ị bụ ohu m.
Ọ bụ m kpụrụ gị. Ị bụkwa ohu m.+
Izrel, agaghị m echefu gị.+
22 M ga-ekpuchi ajọ omume gị ka à ga-asị na e ji ígwé ojii kpuchie ya,+
Kpuchiekwa mmehie gị ka à ga-asị na e ji ígwé ojii kpuchie ya.
Lọghachikwute m, n’ihi na m ga-agbapụta gị.+
23 Eluigwe, tie mkpu ọṅụ,
N’ihi na Jehova emeela ihe o zubere.
Ebe ndị kacha ala n’ụwa, tienụ mkpu ọṅụ.
Ugwu niile, nwewenụ aṅụrị.+
Oké ọhịa na unu osisi niile dị na ya, nwewenụ aṅụrị.
N’ihi na Jehova agbapụtala Jekọb.
O jirila Izrel gosi na ya dị ebube.”+
“Abụ m Jehova, onye mere ihe niile.
Ò nwere onye nyeere m aka?
25 M na-eme ka ihe àmà nke ndị na-ekwu okwu na-abaghị uru* bụrụ ihe na-enweghị isi.
Ọ bụkwa m na-eme ka ndị na-agba afa na-eme ka ndị nzuzu.+
Ọ bụ m na-emekwa ka ndị ma ihe ghara ịma ihe ha na-eme,
Na-emekwa ka ha bụrụ ndị nzuzu kama ịbụ ndị ma ihe.+
Ọ bụ m na-ekwu gbasara Jeruselem, sị, ‘A ga-ebi na ya,’+
Kwuokwa gbasara obodo ndị dị na Juda, sị, ‘A ga-arụghachi ha.+
M ga-arụghachi ebe ya niile e bibiri ebibi.’+
27 Ọ bụ m na-asị mmiri miri emi, ‘Takọọ.
M ga-emekwa ka osimiri gị niile taa.’+
28 Ọ bụ m na-ekwu gbasara Saịrọs,+ sị, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m.
Ọ ga-emekwa ihe niile bụ́ uche m.’+
Ọ bụ m na-ekwu gbasara Jeruselem, sị, ‘A ga-arụghachi ya,’
Kwuokwa gbasara ụlọ nsọ dị na ya, sị, ‘A ga-atọ ntọala ya.’”+
45 E nwere ihe mụnwa bụ́ Jehova na-agwa Saịrọs, bụ́ onye m tere mmanụ.+
M seere ya n’aka nri ya,+
Ka m jiri ya weda mba dị iche iche ala,+
Jiri ya napụ ndị eze ihe ha ji akpa ike,*
Jirikwa ya meghee ọnụ ụzọ nwere ibo abụọ,
Ka a ghara imechi ọnụ ụzọ ámá ya emechi. M gwara ya, sị:
M ga-akụri ibo ụzọ ndị e ji ọla kọpa rụọ.
M ga-agbajikwa ígwè e ji atụchi ha.+
Ihe a ga-eme ka ị mara na m bụ Jehova,
Bụ́ Chineke Izrel, onye na-akpọ gị aha gị.+
4 M na-akpọ gị aha
N’ihi ohu m Jekọb nakwa n’ihi Izrel bụ́ onye m họọrọ.
M ga-eme ka aha gị na-ede ude n’agbanyeghị na ị maghị m.
5 Abụ m Jehova. E nweghị onye ọzọ.
E wezụga m, e nweghị Chineke ọzọ dịnụ.+
M ga-enye gị ike* n’agbanyeghị na ị maghị m.
6 Ihe a ga-eme ka ndị mmadụ mara
Na e nweghị onye ọzọ ma e wezụga m,+
Malite n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda ya.
Abụ m Jehova. E nweghịkwa onye ọzọ.+
7 M na-eke ìhè,+ na-ekekwa ọchịchịrị.+
M na-eme ka e nwee udo,+ na-emekwa ka e nwee ọdachi.+
Mụnwa, bụ́ Jehova, na-eme ihe a niile.
Ka ezi omume si n’ígwé ojii zoo ka mmiri.
Ka ala meghee, mịakwa nzọpụta ka mkpụrụ,
Ka o meekwa ka ezi omume pulite n’otu mgbe ahụ.+
Ọ bụ mụnwa bụ́ Jehova mere ka ọ dị otú ahụ.”
9 Onye na-esesa Onye kere* ya okwu ga-ata ahụhụ,
Maka na ọ dị ka mpekere ite ụrọ wụsa n’ala
Otú mpekere ite ụrọ ndị ọzọ wụsa.
Ụrọ ò kwesịrị ịsị Ọkpụite:* “Gịnị ka ị na-akpụ?”+
Ka ihe ị rụrụ ò kwesịrị ịsị na i nweghị aka?*
10 Onye na-asị nna ya: “Gịnị mere i ji mụọ m?” ga-ata ahụhụ.
Onye na-asịkwa nne ya: “Olee ụdị nwa ị mụrụ ihe a?”* ga-ata ahụhụ.
11 Jehova, bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ Onye kpụrụ ya, kwuru, sị:
“Ọ̀ na-eme unu obi abụọ ma ihe m kwuru ọ̀ ga-eme?
Ùnu ga-enye m iwu gbasara ụmụ m+ na ọrụ aka m?
12 Ọ bụ m kere ụwa,+ keekwa ndị mmadụ bi na ya.+
Ọ bụ m ji aka m gbasaa eluigwe.+
M na-enyekwa kpakpando na ihe niile dị n’eluigwe iwu.”+
13 “Emeela m ka otu onye pụta maka na m na-eme ezi omume.+
M ga-emekwa ka ihe ọ bụla ghara ịnọchiri ya ụzọ.
Ọ bụ ya ga-arụ obodo m.+
Ọ ga-ahapụkwa ndị m a dọọrọ n’agha ka ha laa.+ Ọ gaghị asị ka a kwụọ ya ụgwọ. Ọ gaghịkwa anara aka azụ.”+ Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru ihe a.
14 Jehova kwukwara, sị:
“Uru* ndị Ijipt na ngwá ahịa* ndị Etiopia nakwa ndị Siba, bụ́ ndị toro ogologo,
Ga-abịakwute gị. Ha ga-aghọkwa ndị gị.
Ha ga-ebu ịga a tụrụ ha na-eso gị n’azụ.
Ha ga-abịa kpọọrọ gị isiala.+
Ha ga-agwa gị, sị, ‘N’eziokwu, Chineke nọnyeere gị.+
E nweghịkwa onye ọzọ. Chineke ọzọ adịghị.’”
15 Chineke Izrel, bụ́ Onye Nzọpụta,+
N’eziokwu, ị bụ Chineke. Ọ bụghị mgbe niile ka ị na-eme ka a mara ihe ị na-eme.
16 Ihere ga-eme ndị na-apị arụsị. A ga-emenyekwa ha niile ihere.
Ha niile ga na-agagharị, ihere eju ha ihu.+
17 Ma, Jehova ga-azọpụta unu, bụ́ ndị Izrel, ruo mgbe ebighị ebi.*+
E nweghị mgbe ihere ga-eme unu. E nweghịkwa mgbe a ga-emenye unu ihere.+
18 Jehova, Onye kere eluigwe,+ Onye bụ́ ezi Chineke,
Onye kere ụwa, kesie ya ike,+
O keghị ya na nkịtị,*
Kama o kere ya ka ndị mmadụ biri na ya.+
Ọ sịrị: “Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ.
19 Anọghị m ebe zoro ezo kwuo okwu,+ ya bụ, ebe gbara ọchịchịrị.
Agwaghịkwa m ụmụ* Jekọb, sị,
‘Chọọnụ m na nkịtị.’
Abụ m Jehova, onye na-ekwu ihe bụ́ ezi omume, na-emekwa ka a mara ihe ziri ezi.+
Ndị na-ebugharị arụsị a pịrị apị
Ma na-arịọ chi na-enweghị ike ịzọpụta ha arịrịọ amaghị ihe ọ bụla.+
21 Kwuwenụ ihe unu chọrọ ikwu. Zaranụ ọnụ unu.
Nweenụ otu olu n’izu unu gbara.
Ònye kwuru kemgbe ụwa na ihe a ga-eme?
Ònye kpọsara ya kemgbe oge ochie?
Ọ́ bụghị mụnwa, bụ́ Jehova?
E nweghị Chineke ọzọ dị ma e wepụ m.
E nweghị Chineke ọzọ bụ́ onye ezi omume na Onye Nzọpụta+ ma e wepụ m?+
22 Ndị niile nọ na nsọtụ ụwa, bịakwutenụ m ka m zọpụta unu,+
N’ihi na abụ m Chineke. E nweghịkwa Chineke ọzọ dị.+
23 Ejirila m onwe m ṅụọ iyi,
Okwu ahụ m ji ọnụ m kwuo bụ eziokwu.
E nweghịkwa ihe ga-eme ka ọ ghara imezu.+
Ikpere niile ga-egburu m n’ala.
Ire niile ga-aṅụkwa iyi na ha ga na-akwado m.+
24 Ha ga-asị, ‘N’eziokwu, Jehova na-eme ihe ziri ezi mgbe niile. Ọ dịkwa ike.
Ndị niile na-ewesa ya iwe ga-eji ihere bịa n’ihu ya.
25 Ụmụ* Izrel niile ga-ahụ na ọ dị mma na ha na-efe Jehova.+
Ha ga-ejikwa ihe ndị ọ na-emere ha na-eme ọnụ.’”
46 Bel hulatara ala,+ Nibo huuru ehuru.
E bukwasịrị ha n’elu anụmanụ, n’elu anụ ndị na-ebu ibu.+
Ha dị ka ibu na-anyịgbu anụmanụ ndị ike gwụrụ.
2 Anụmanụ ndị ahụ na-ehulata otu mgbe.
Bel na Nibo agaghịkwa anapụtali onwe ha n’aka ha.
Kama ịnapụta onwe ha, a ga-adọrọkwu hanwa* n’agha.
3 “Ndị ezinụlọ Jekọb na unu niile fọrọ ná ndị Izrel,+ geenụ m ntị.
M nọ na-enyere unu aka kemgbe a mụrụ unu, na-elekọtakwa unu malite mgbe unu nọ n’afọ.+
4 Unu megodị agadi, agaghị m agbanwe.+
Isi unu chagodị awọ́, m ka ga na-elekọta unu.
Dị ka m na-eme kemgbe, m ga na-enyere unu aka, na-elekọta unu, na-anapụtakwa unu.+
5 Ònye ka unu ga-eji tụnyere m ma ọ bụ mee ka mụ na ya hara?+
Ònye ka unu ga-asị na ọ dị ka m ka à ga-asị na mụ na ya yiri?+
6 E nwere ndị na-anaghị eji ọlaedo dị n’akpa ha eme ihe bara uru.
Ha na-eji ihe e ji atụ̀ ihe atụ ọlaọcha.
Ha na-ego onye na-eji ígwè akpụ ihe, ya ejiri ọlaọcha ahụ kpụọrọ ha chi,+
Ha akpọwaziere ya isiala, fewekwa ya.+
Ha na-eburu ya busa ebe ọ ga na-adị, ya akwụrụ ebe ahụ.
Ọ naghị esi ebe ahụ apụ.+
Ndị mmadụ na-eti mkpu, na-arịọ ya arịrịọ, ma ọ naghị atụpụrụ ha ọnụ.
O nweghị ike ịnapụta onye na-ata ahụhụ.+
8 Ndị mmebi iwu, chetanụ ihe ndị a.
Obi sie unu ike, burukwanụ ha n’obi.
Abụ m Chineke. E nweghịkwa onye dị ka m.+
10 Ọtụtụ afọ tupu ihe ga-eme emee, m na-ekwu na ọ ga-eme.
Ọtụtụ afọ tupu e mee ihe a na-emebeghị, m na-ekwu na a ga-eme ya.+
11 M na-akpọ nnụnụ na-eri anụ ka o si n’ebe ọwụwa anyanwụ bịa.+
M na-akpọkwa onye ga-emezu ihe m kpebiri* ka o si n’obodo dị anya bịa.+
Ekwuola m ya. M ga-emekwa ya.
Ezubela m ime ya. M ga-emekwa ya.+
12 Ndị obi ha kpọchiri akpọchi,
Ndị na-anatụdịghị eme ezi omume, geenụ m ntị.
13 Oge m ga-egosi otú m si bụrụ onye ezi omume dị nso.
Ọ dịghị anya.
M gaghị egbu oge ịzọpụta ndị m ga-azọpụta.+
M ga-azọpụta ndị bi na Zayọn, meekwa ka ndị Izrel dị ebube.”+
Ndị Kaldia,*
Nọdụnụ n’ala nkịtị n’ebe ocheeze na-adịghị,+
N’ihi na ndị mmadụ agaghịzi na-asị na unu agbasighị ike ma ọ bụ na a zụtọrọ unu azụtọ.
2 Were nkume e ji egwe nri gwee ọka ka ọ bụrụ ntụ ọka.
Kpupụ ákwà i ji kpuchie ihu gị.
Chịlie uwe gị elu. Kpughee ụkwụ gị.
Gafee osimiri.
3 A ga-agba gị ọtọ.
A ga-ahụ ka ị gba ọtọ.
M ga-akwụ gị ụgwọ ihe i mere.+ O nweghịkwa mmadụ ọ bụla ga-egbochili m ime ya.*
4 “Onye na-agbapụta anyị
Bụ Onye Nsọ Izrel.
Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.”+
Ndị mmadụ agaghịzi na-akpọ unu Eze Nwaanyị na-achị Alaeze dị iche iche.+
M gbara nkịtị ka i merụọ ndị m.+
I bodịrị ndị agadi ibu na-anyị ezigbo arọ.+
7 Ị sịrị: “M ga-abụgịde Eze Nwaanyị ruo mgbe ebighị ebi.”+
I cheghị gbasara ihe ị nọ na-eme.
I chebaraghị ihe ga-emecha mee echiche.
8 Onye mkpa ya bụ ịtụrụ ndụ, nụrụ ihe a.+
Obi ruru gị ala ebe ị nọ ọdụ. Ị na-asịkwa n’obi gị:
“Abụ m onye ukwu. E nweghị onye ka m.+
Agaghị m abụ nwaanyị isi mkpe.
O nweghị ihe ga-eme ka m gbara aka ụmụ.”+
9 Ma ihe abụọ a ga-eme gị na mberede n’otu ụbọchị:+
Ị ga-agbara aka ụmụ, di gị anwụọkwa.
10 Ị nọ na-eme ihe ọjọọ, ma chee na o nweghị ihe ga-eme gị.
Ị sịrị: “E nweghị onye na-ahụ m.”
Ọ bụ amamihe gị na ihe ị ma dufuru gị.
Ị nọkwa na-asị n’obi gị: “Abụ m onye ukwu. E nweghị onye ka m.”
Ị ga-ata ahụhụ. Ị gaghịkwa enwe ike ịkwụsị ya.
A ga-esi otú ị na-atụtụdịghị anya ya bibie gị na mberede.+
Ha nwere ike ịbara gị uru.
I nwere ike iji ha menye ndị mmadụ ụjọ.
13 Ike ìgwè ndị na-adụ gị ọdụ agwụla gị.
Ka ha bịa ugbu a zọpụta gị.
Ha na-efe ihe ndị dị n’eluigwe,* na-elekwa kpakpando.+
Mgbe ọnwa ọhụrụ pụtara,
Ha na-akọ ihe ga-eme gị.
14 Ha dị ka ahịhịa ọka.
Ọkụ ga-erechapụ ha.
Ha agaghị anapụtali onwe ha* n’ọkụ a.
Ọkụ a adịghị ka nke a na-anya anya.
Ọ bụghịkwa nke a ga-anọdụ ala n’ihu ya.
15 Ihe a ga-eme ndị na-agwọrọ gị ọgwụ,
Ndị gị na ha nọ na-arụgbu onwe unu n’ọrụ kemgbe ị bụ nwata.
Ha ga-awagharị, onye ọ bụla n’ime ha etinye isi ebe masịrị ya.*
E nweghị onye ga-azọpụta gị.+
48 Nụrụnụ ihe a, ndị ezinụlọ Jekọb,
Ndị na-aza aha Izrel,+
Ndị si n’ezinụlọ Juda,*
Ndị na-eji aha Jehova aṅụ iyi,+
Ndị na-eto Chineke Izrel,
Ma o sighị ha n’obi. Ha anaghịkwa eme ezi omume.+
2 Ha na-asị na ha si n’obodo nsọ.+
Ha na-achọkwa ka Chineke Izrel,
Onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, nyere ha aka.+
3 “O teela m gwara unu ihe ndị gara aga.*
M ji ọnụ m gwa unu ha.
M kwuru ha ka a nụ ha.+
Na mberede ka m mere ihe m kwuru na m ga-eme.+
4 N’ihi na m ma na unu bụ ekwe ekwe.
Unu kpọchiri obi unu,* na-akpọkwa ekwo nkụ.*+
5 O teela m gwara unu ihe ndị a.
Tupu ha emee, m mere ka unu nụ ha,
Ka unu ghara ịsị, ‘Ọ bụ arụsị anyị mere ihe a.
Ọ bụ arụsị anyị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ kwuru ka ihe a mee.’
6 Unu anụla ihe niile, hụkwa ha.
Ọ̀ bụ na unu agaghị akọsa ha?+
Si ugbu a gawa, m ga na-akọziri unu ihe ọhụrụ,+
Ihe ndị e zoro nke ọma unu na-amaghị.
7 Ugbu a ka ha na-eme.* O tebeghị aka,
Ha bụ ihe unu na-anụtụbeghị tupu taa,
Ka unu ghara ịsị, ‘Anyị dị mbụ mara ha.’
8 N’eziokwu, o nwebeghị mgbe unu chọrọ ịnụ ya.+ Unu aghọtaghịkwa ya,
O teekwala ntị unu kpọchiri akpọchi.
Ama m na unu na-aghọ ncha n’aghụghọ.+
Unu bụkwa ndị mmehie kemgbe a mụrụ unu.+
9 Ma n’ihi aha m, m ga-akwụsị iwe m na-ewe.+
M ga-ejide onwe m ka e wee nye m otuto.
M gaghịkwa ebibi unu.+
10 Anụchaala m gị, ma ọ bụghị dị ka e si anụcha ọlaọcha.+
Ahapụrụ m gị ka ị taa ahụhụ, si otú ahụ nụchaa* gị otú e si eji oké ọkụ agbaze ihe.+
11 N’eziokwu, m na-eme ihe a n’ihi aha m.+
Olee otú m ga-esi kwe ka e mebie aha m?+
Anaghị m enye onye ọzọ otuto e kwesịrị inye m.
12 Jekọb, gee m ntị. Izrel, bụ́ onye m họọrọ, geekwa m ntị.
Anaghị m agbanwe agbanwe.+ Abụ m onye mbụ, bụrụkwa onye ikpeazụ.+
M na-akpọ ha ka ha pụtakọta ọnụ.
14 Unu niile, zukọtanụ ma gee ntị.
Ò nwere chi ọ bụla n’ime ha kwuru gbasara ihe ndị a?
Ọ ga-ejikwa aka ya dị ike mesie ndị Kaldia ike.+
15 Ekwuola m ihe m kwuru, akpọọkwala m ya.+
Akpọbatala m ya. M ga-emekwa ka ihe gaziere ya.+
16 Bịanụ m nso, nụrụ ihe a.
Malite ná mbido, m na-ekwu ihe m na-ekwu n’ihu ọha, ọ bụghị na nzuzo.+
Mgbe ihe e kwuru na ọ ga-eme mere, anọ m ya.”
Ma ugbu a, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ezipụla m, nyekwa m* mmụọ ya.
17 Jehova, Onye Mgbapụta gị na Onye Nsọ Izrel, kwuru,+ sị:
“Mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Chineke gị.
18 Biko, na-eme ihe m nyere n’iwu.+
Ọ bụrụ na ị na-eme ya, udo ị ga-enwe ga-aha ka osimiri,+
Ị gaghịkwa akwụsị ime ezi omume otú ahụ ebili mmiri na-anaghị akwụsị akwụsị n’oké osimiri.+
E nweghịkwa ihe ga-eme ka e hichapụ aha ha.”
Sinụ n’obodo ndị Kaldia gbapụ.
Na-enwenụ aṅụrị ka unu na-akọsa ya. Kọsaanụ ya.+
Kwuonụ gbasara ya n’ebe ụwa sọtụrụ.+
Kwuonụ, sị: “Jehova agbapụtala Jekọb ohu ya.+
21 Akpịrị akpọghị ha nkụ mgbe o du ha gafee ọzara.+
O mere ka mmiri si n’oké nkume gbapụtara ha.
Ọ gbawara oké nkume, mmiri agbapụtawa.”+
22 Jehova kwuru, sị: “Udo agaghị adịrị ndị ajọ omume.”+
49 Ndị bi n’agwaetiti, geenụ m ntị.
Mba ndị dị n’ebe dị anya, ṅaakwanụ ntị.+
Jehova ahọrọla m tupu a mụọ m.*+
Ọ gụrụ m aha mgbe m ka nọ n’afọ nne m.
2 O meela ka ọnụ m dị ka mma agha dị nkọ.
O jirila aka ya chebe m.+
O meela ka m dị ka akụ́ a pịrị apị.
O zoro m n’ime akpa akụ́ ya.
3 Ọ sịrị m: “Izrel, ị bụ ohu m.+
M ga-esi n’aka gị gosi na m dị ebube.”+
4 Ma, m sịrị: “Mbọ niile m gbara bụ na nkịtị.
Mbọ niile m gbara enweghị isi, ọ baghị uru.
Ma, ọ bụ Jehova ga-eleba okwu m anya,*
Ọ bụkwa Chineke m ga-akwụ m ụgwọ.”+
5 Ma ugbu a, Jehova, bụ́ Onye kpụrụ m kemgbe m nọ n’afọ ka m bụrụ ohu ya,
Agwala m ka m kpọghachitere ya Jekọb,
Ka m kpọkọtara ya ndị Izrel.+
A ga-eto m n’anya Jehova.
Chineke m ga-abụkwa ike m.
6 Ọ sịrị: “Ọ bụghị naanị na ị ga-abụ ohu m
Nke ga-eme ka ebo niile si n’ezinụlọ Jekọb kwụsie ike,
Nke ga-akpọghachitekwa ndị Izrel aka na-akpaghị.
7 O nwere ihe Jehova, bụ́ Onye Mgbapụta Izrel na Onye Nsọ ya,+ gwara onye e ledara anya,+ onye otu mba kpọrọ asị, onye na-ejere ndị na-achị achị ozi. Ọ sịrị ya:
“N’ihi ihe ndị eze ga-ahụ, ha ga-ebili ọtọ,
N’ihi ihe ndị isi ga-ahụ, ha ga-akpọkwa isiala.
Ha ga-esi otú a sọpụrụ Jehova, bụ́ onye họọrọ gị,+
Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi,+ Onye Nsọ Izrel.”
8 Jehova kwukwara, sị:
“N’oge m na-emere ndị mmadụ amara ka m mere ihe ị rịọrọ m.+
N’ụbọchị m na-azọpụta ndị mmadụ ka m nyeere gị aka.+
M nọ na-echebe gị, ka ọ bụrụ gị ka mụ na ndị mmadụ ga-eji gbaa ndụ,+
Ka i wee mee ka ala a dịghachi otú ọ dịbu,
Meekwa ka ndị m birighachi n’ala ha ketara nke tọgbọ nkịtị.+
9 A ga-asị ndị mkpọrọ, ‘Pụtanụ!’+
A ga-asịkwa ndị nọ n’ọchịchịrị,+ ‘Pụtanụ ka a hụ unu!’
Ha ga na-ata ahịhịa n’akụkụ ụzọ ka atụrụ.
N’ụzọ niile ọtụtụ ndị ji ụkwụ aga* ka ha ga na-ata ahịhịa.
10 Agụụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghịkwa akpọ ha nkụ.+
Oké okpomọkụ agaghị adị ebe ha nọ, anwụ agaghịkwa acha ha.+
12 E nwere ndị si ebe dị anya bịa,+
Nwee ndị nke si n’ebe ugwu nakwa n’ebe ọdịda anyanwụ bịa,
Nweekwa ndị nke si Saịnim bịa.”+
13 Eluigwe, ṅụsiwe ọṅụ ike. Ụwa, ṅụrịwa ọṅụ.+
Ka ugwu niile ṅụsiwe ọṅụ ike.+
14 Ma Zayọn nọ na-asị:
“Jehova ahapụla m,+ Jehova echefuokwala m.”+
15 Nwaanyị ọ̀ ga-echefuli nwa ya ka na-aṅụ ara
Ma ọ bụ ghara imere nwa ọ mụrụ ebere?
Ọ bụrụgodị na nwaanyị echefuo, emekataghị m chefuo gị.+
16 Akanyela m aha gị n’ọbụ aka m.
Mgbidi gị niile dịkwa n’ihu m mgbe niile.
17 Ụmụ gị emeela ngwa ngwa lọghachi.
Ndị mesiri gị ike, bibiekwa gị, ga-ahapụ gị.
18 Welite ihu gị ma legharịa anya.
Ha niile agbakọtawala.+
Ha na-abịakwute gị.
Jehova kwuru, sị, “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ,
Ha ga-adị ka ihe e ji achọ mma i ji chọọ onwe gị mma,
Ha ga-adịkwa ka ihe ị ga-eyiri otú nwaanyị a na-alụ ọhụrụ si eyiri ihe olu.
19 Ọ bụ eziokwu na a lara ebe i bi n’iyi, bibie ya, obodo gị atọgbọrọkwa nkịtị,+
Ma, ọ gaghị aba ndị bi na ya ugbu a.+
Ndị bibiri gị+ ga-anọkwa ebe dị anya.+
20 Ụmụ a mụrụ mgbe ị gba aka ụmụ ga-agwa gị, sị,
‘Ebe a anaghịzi aba anyị.
Nyekwuo anyị ebe anyị ga-ebi.’+
21 Ị ga-asịkwa n’obi gị,
‘Ebe ọ bụ na m gbarala aka ụmụ, bụrụkwa nwaanyị aga
Na onye a dọọrọ n’agha tụọ mkpọrọ,
Ònyezi bụ nna ụmụ ndị a?
Ònyekwa zụlitere ha?+
22 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“M ga-eweli aka m elu ka mba dị iche iche hụ ya.
M ga-egwunyekwara mba dị iche iche ihe ga-agbara ha àmà.+
Ada ndị eze ga-abụkwa ụmụ nwaanyị na-ejere gị ozi.
Ha ga-ehulata ala kpọọrọ gị isiala.+
Ha ga-edo onwe ha n’okpuru gị.*+
Ị ga-amarakwa na abụ m Jehova.
A gaghị emenye ndị tụkwasịrị m obi ihere.”+
24 À ga-anapụtali dike ndị o ji eji?
Ka à ga-anapụtali onye ọchịchị aka ike ndị ọ dọọrọ n’agha?
25 Ma, Jehova kwuru, sị:
M ga-alụso onye ọ bụla na-alụso gị ọgụ ọgụ.+
M ga-azọpụtakwa ụmụ gị.
26 M ga-eme ka ndị na-emegbu gị rie anụ onwe ha.
Ọbara ha ga na-egbu ha ka mmanya dị ụtọ.
Mmadụ* niile ga-amarakwa na abụ m Jehova,+
Onye Nzọpụta gị,+ Onye Mgbapụta gị+
Nakwa Dike na-enyere Jekọb aka.”+
50 Jehova kwuru, sị:
“Ènyere m nne unu akwụkwọ m ji gbaa ya alụkwaghịm+ mgbe m chụpụrụ ya?
Ka m̀ kpọọrọ unu resị onye m ji ụgwọ?
Ọ bụ mmehie unu+ mere e ji ree unu.
Ọ bụkwa ajọ omume unu mere e ji chụpụ nne unu.+
2 Gịnịzi mere na o nweghị onye nọ ebe a mgbe m batara?
Gịnị mere na o nweghị onye zara mgbe m kpọrọ òkù?+
Ịgbapụta unu ọ̀ nyịrị m?*
Ka ọ̀ bụ na mụ adịghị ike ịnapụta unu?+
M na-aba mba, oké osimiri ataa.+
M na-eme ka osimiri ghọọ ọzara.+
Azụ̀ dị na ha na-esi ísì n’ihi na mmiri adịghị.
Ha na-anwụkwa maka na ha ahụghị mmiri ha ga-aṅụ.
3 M na-eyiwe eluigwe ọchịchịrị dị ka uwe.+
M na-ejikwa ákwà ojii ekpuchi ya.”
Ọ na-akpọte m kwa ụtụtụ.
Ọ na-emeghe* ntị m ka m nwee ike ige ntị ka onye a na-akụziri ihe.+
5 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova emegheela ntị m.
Enupụghịkwa m isi.+
Emeghị m ihe masịrị m.+
6 M cheere ndị na-eti m ihe azụ m,
Cheekwara ndị na-efopụ ajị ntì m.
Ewepụghị m ihu m ka a ghara ịkparị m na ịgbụ m asọ mmiri.+
7 Ma, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-enyere m aka.+
N’ihi ya, ihere agaghị eme m.
Amakwa m na ihere agaghị eme m.
8 Onye gụrụ m n’onye ezi omume nọ nso.
Ya bịa ka mụ na ya guzoro ka e leba okwu anyị anya.*
Ònye ga-asị na o nwere ihe m mere ya?
Ya bịaruo m nso.
9 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-enyere m aka.
Ònye ga-asị na m mere ihe ọjọọ?
Ha niile ga-aka nká ka uwe.
Egu* ga-erichapụ ha.
Ònye jerela ije n’ọchịchịrị n’ahụghị ìhè ọ bụla?
Ka aha Jehova mee ka obi sie ya ike. Ya rịọkwa Chineke ka o nyere ya aka.
11 Ọ sịkwara: “Unu niile ndị na-amụnye ọkụ,
Ndị na-abọlite ikerike ọkụ,
Jirinụ ìhè ọkụ unu mụnyere
Na ìhè ikerike ọkụ unu bọlitere na-eje ebe unu na-eje.
Ahụhụ m ga-ata unu bụ:
Unu ga-atọgbọrọ n’ala n’ihi ezigbote ihe mgbu.
51 “Unu ndị chọrọ ịna-eme ezi omume,
Ndị na-achọkwa Jehova, geenụ m ntị.
Chebaranụ oké nkume unu si na ya pụta echiche.
Chebarakwanụ olulu e si na ya gwupụta unu echiche.
2 Lekwasịnụ Ebreham nna unu anya.
Lekwasịkwanụ Sera,+ onye mụrụ unu,* anya.
M kpọrọ Ebreham mgbe ọ ka nọ naanị ya.+
M gọziri ya, meekwa ka ụmụ ya mụbaa.+
Ọ ga-eme ka ebe ya niile e bibiri ebibi dịghachi mma.*+
Ndị bi na ya ga na-enwe obi ụtọ, na-enwekwa aṅụrị.
A ga na-anụkwa olu ndị na-ekele Chineke na olu ndị na-abụ abụ n’ime ya.+
4 Ndị m, ṅaanụ m ntị.
M ga-emekwa ka ikpe ziri ezi m na-ekpe ghọọrọ mba dị iche iche ìhè.+
5 Oge m ga-egosi otú m si bụrụ onye ezi omume dị nso.+
Agwaetiti niile ga-eji m nwee olileanya.+
Ha ga-echerekwa ka m jiri ike* m mee ihe m chọrọ ime.
6 Leenụ anya n’eluigwe,
Leekwanụ anya n’ụwa dị n’okpuru ya.
A ga-eme ka eluigwe gbarie ma kupụsịa ka anwụrụ ọkụ.
Ụwa ga-aka nká ka uwe,
Ndị bi na ya ga-anwụkwa ka anwụnta.
Unu atụla egwu emo ụmụ mmadụ efu na-akwa unu.
Unu atụkwala ụjọ maka mkparị ha na-akparị unu.
8 N’ihi na egu* ga-erichapụ ha dị ka uwe.
Egu* nke na-atakasị ákwà ga-erichapụ ha ka à ga-asị na ha bụ ajị anụ.+
Ma, m ga na-eme ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
M ga na-azọpụtakwa ndị mmadụ n’ọgbọ niile.”+
9 Ka Jehova jiri aka ya kpaa ike.
Ka o jirikwa aka ya gosi ike ya.+
Ka ọ kpaa ike otú ọ kpara n’oge ochie.
10 Ọ́ bụghị gị mere ka oké osimiri takọọ, ya bụ, mmiri dị n’oké osimiri?+
Ọ́ bụghị gị mere ka oké osimiri ghọọrọ ndị ị gbapụtara agbapụta ụzọ ha ga-esi gafere?+
11 Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta.+
Ha ga-etiri mkpu ọṅụ bata na Zayọn.+
Ha agaghịkwa akwụsị ịṅụrị ọṅụ.+
Ha ga na-enwe obi ụtọ, na-enwekwa aṅụrị.
Ha ga-akwụsị iru uju, kwụsịkwa ịsụ ude.+
12 “Ọ bụ mụnwa bụ Onye na-akasi unu obi.+
Gịnị mere unu ga-eji na-atụ mmadụ efu nke ga-anwụ anwụ egwu,+
Na-atụkwa nwa nke mmadụ egwu, bụ́ onye ga-akpọnwụ ka ahịhịa ndụ?
13 Gịnị mere unu ji chefuo Jehova bụ́ Onye kere unu,+
Onye gbasara eluigwe ka ákwà,+ onye tọkwara ntọala ụwa?
Unu nọkwa na-atụ ụjọ mgbe niile n’ihi iwe ndị na-emegbu unu na-ewe,
Dị ka à ga-asị na ha ga-ebibili unu.
Ugbu a, ndị na-emegbu unu, hà ka na-ewesa unu iwe?
14 N’oge na-adịghị anya, a ga-atọhapụ onye e kere agbụ ígwè.+
Ọ gaghị anwụ, nke e ji eli ya eli.
Ihe oriri agaghịkwa akọ ya.
15 Ma, abụ m Jehova, bụ́ Chineke gị,
Onye na-eme ka oké osimiri na-eme mkpọtụ, na-emekwa ka ọ na-amali elu.+
Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha m.+
16 M ga-eme ka i kwuo ihe m chọrọ ikwu.
M ga-asịkwa ndị bi na Zayọn, ‘Unu bụ ndị m.’+
17 Jeruselem, teta, teta. Bilie ọtọ.+
Ị ṅụọla ihe dị n’iko Jehova ji n’aka, ya bụ, iko na-egosi na iwe ji ya.
Ị ṅụọla ihe dị n’iko ahụ.
Ị ṅụchaala ihe dị n’iko ahụ nke na-eme ka mmadụ na-adagbugharị.+
18 A bịa n’ụmụ niile ị mụrụ, e nweghị nke na-edu gị.
A bịakwa n’ụmụ niile ị zụrụ ha etoo, e nweghị nke na-ejide gị aka.
19 Ihe abụọ ndị a emeela gị.
Ònye ga-asị gị ndo?
A ga-ebibi gị, laa gị n’iyi. Agụụ ga-agụgbu gị. A ga-ejikwa mma agha mee gị ihe.+
Ònye ga-akasi gị obi?+
Ha dina n’ebe niile ụzọ gbara mkpị,
Dị ka anụmanụ ọnyà mara.
Jehova ewesala ha ezigbo iwe. Chineke gị abaarala ha ezigbo mba.”
21 N’ihi ya, gịnwa, bụ́ onye nọ n’ahụhụ, onye na-emekwa ka onye mmanya na-egbu, ma ọ bụghị mmanya na-egbu gị,
Biko, gee ntị n’ihe a.
22 Onyenwe gị, Jehova, bụ́ Chineke gị, onye na-alụrụ ndị ya ọgụ, kwuru, sị:
“M ga-anara gị iko ahụ i ji nke na-eme ka ị na-adagbugharị,+
Iko ahụ, bụ́ iko na-egosi na iwe ji m.
O nweghịkwa ihe ga-eme ka ị ṅụọ ihe dị na ya ọzọ.+
Ọ bụ ya mere i ji mee ka azụ gị dị ka ala nkịtị,
Meekwa ka ọ dị ka okporo ámá ha na-esi agafe.”
52 Zayọn,+ teta! Teta! Mee onwe gị ka ị dị ike.*+
Jeruselem, bụ́ obodo nsọ, yiri uwe gị mara mma.+
N’ihi na onye a na-ebighị úgwù na onye na-adịghị ọcha agaghị abata n’ime gị ọzọ.+
2 Jeruselem, bilie, tichapụ onwe gị ájá ma nọrọ n’oche.
Zayọn a dọọrọ n’agha, tọpụ agbụ e kere gị n’olu.+
3 N’ihi na Jehova kwuru, sị:
4 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“Na nke mbụ, ndị m gara biri n’Ijipt, bụrụ ndị mbịarambịa.+
Ndị Asiria mechakwara mesie ha ike n’agbanyeghị na o nweghị ihe ha mere ha.”
5 Jehova kwuru, sị: “Gịnịzi ka m ga-eme ebe a?
N’ihi na a kpọọrọ ndị m n’akwụghị ihe ọ bụla.”
Jehova kwukwara, sị: “Ndị na-achị ha nọ na-eti mkpu ọṅụ na ha emeriela.+
Ha nọkwa na-emebi aha m mgbe niile.+
6 N’ihi ya, ndị m ga-amara aha m.+
Ọ bụ ya mere ha ga-eji mara n’ụbọchị ahụ na ọ bụ mụnwa na-ekwu.
Ọ bụ mụnwa na-ekwu ihe a.”
7 Ụkwụ onye si n’elu ugwu ziri ozi ọma na-abịa mara ezigbo mma.+
Onye ahụ na-ekwu na udo adịla.+
Ọ na-ekwu na ihe ka mma abịala.
Ọ na-ekwu na a zọpụtala ndị mmadụ.
Ọ na-asị ndị bi na Zayọn: “Chineke unu aghọọla Eze!”+
8 Geenụ ntị! Ndị nche unu na-eti mkpu.
Ha ji otu olu na-eti mkpu ọṅụ.
N’ihi na ha ga-eji anya ha hụ mgbe Jehova ga-akpọlata ndị bi na Zayọn.
9 Ebe ndị dakpọsịrị adakpọsị na Jeruselem,+ na-enwenụ obi ụtọ, jirikwanụ otu olu na-eti mkpu ọṅụ,
N’ihi na Jehova akasiela ndị ya obi.+ Ọ gbapụtala Jeruselem.+
10 Jehova emeela ka mba niile hụ aka ya dị nsọ.+
Ndị niile nọ n’ụwa ga-ahụ ihe Chineke anyị mere iji zọpụta ndị ya.+
11 Pụọnụ, pụọnụ, sinụ ebe ahụ pụọ.+ Unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka!+
12 Unu agaghị eji ụjọ pụọ.
Unu agaghịkwa eji ọsọ gbapụ,
N’ihi na Jehova ga-ebutere unu ụzọ.+
Chineke Izrel ga na-anọkwa unu n’azụ na-echebe unu.+
13 Ohu m+ ga-egosi na ọ ma ihe n’ihe ọ bụla ọ na-eme.
M ga-eme ka ọ nọrọ n’ọkwá ukwu.
M ga-ebuli ya elu. A ga na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù.+
14 E mere ya ihe otú ndị ma ya na-agaghịzi amata ya.
Ihe a e mere ya kpara mma ya aka ọjọọ. O nwetụbeghịkwa onye e mere ihe e mere ya.
Ọ tụrụ ọtụtụ ndị n’anya, ha ekporopụ anya na-ele ya.
15 Otú ahụkwa ka ọ ga-esi tụọ ọtụtụ mba n’anya.+
Ọnụ ga-emechi ndị eze n’ihi ya,+
N’ihi na ha ga-ahụ ihe ọ na-enwetụbeghị onye kọrọ gbasara ya.
Ha ga-atụgharịkwa uche n’ihe ha na-anụtụbeghị.+
53 Ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ n’ọnụ anyị?*+
Ònyekwa ka Jehova mere ka ọ mara ike* ya?+
2 Ọ ga-epulite dị ka ome+ n’ihu ya.* Ọ ga-adịkwa ka mgbọrọgwụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị.
Ọ dịghị ka onye ukwu. Ọ dịghịkwa ebube.+
Mgbe anyị ga-ahụ ya, anyị agaghị ahụ mma pụrụ iche ọ mara nke ga-eme ka anyị bịawa ya nso.
3 Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya.+
Ọ ma gbasara ihe mgbu, marakwa ihe ọrịa bụ.
Ọ dị ka à ga-asị na e zoro ihu ya ezo ka anyị ghara ịhụ ya.*
E ledara ya anya. Anyị ejighịkwa ya kpọrọ ihe.+
Ma anyị weere ya ka onye Chineke tara ahụhụ, onye o mesiri ike, na onye o mekpara ahụ́.
5 A mara ya ube+ n’ihi mmehie anyị.+
E chiri ya ọnụ n’ala n’ihi ihe anyị mejọrọ.+
Ahụhụ a tara ya mere ka anyị nwee udo.+
Ahụ́ e merụrụ ya mekwara ka a gwọọ anyị.+
6 Anyị niile akpafuola ka atụrụ.+
Onye ọ bụla n’ime anyị gawara n’ụzọ nke ya.
Ma, Jehova emeela ka onye ahụ buru mmehie anyị niile.+
7 E mesiri onye ahụ ike.+ O kwere ka e mekpaa ya ahụ́.+
O kwughịkwa ihe ọ bụla.
A kpụụrụ ya ka atụrụ a gaje igbu egbu.+
Ọ dị ka nne atụrụ gbara nkịtị ka a na-akpacha ya ajị.
O kwughịkwa ihe ọ bụla.+
8 A kpụụrụ ya pụọ mgbe e kpechara ya ikpe mkpegbu.
Ònyekwa ga-echegbu onwe ya banyere ihe niile gbasara ezinụlọ o si?*
N’ihi na e gburu ya ya agharazie iso ná ndị dị ndụ.+
E tiri ya ihe* n’ihi na ndị m mere ihe ọjọọ.+
9 N’agbanyeghị na o meghị ihe ọjọọ ọ bụla,*
Nakwa na o kwughị ihe ga-eduhie onye ọ bụla,+
Mgbe ọ nwụrụ, ebe e kenyere ya a ga-eli ya dị ebe nke ndị ajọ omume dị.+
E likwara ya ebe e liri ndị ọgaranya.*+
10 Ma, ọ bụ uche* Jehova ka a taa ya ezigbo ahụhụ. O kwekwara ka ọ rịa ọrịa.
A ga-esi n’aka ya mee ka uche* Jehova mezuo.+
11 N’ihi ahụhụ niile ọ* tara, ọ ga-ahụ uru ihe o mere bara. Ọ ga-ejukwa ya afọ.
Ọ ga-eburukwa mmehie ha.+
12 N’ihi ya, m ga-ekenye ya na ọtụtụ ndị òkè.
A gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu.+
54 Jehova kwuru, sị: “Nwaanyị aga,+ tie mkpu ọṅụ.
2 Mee ka ụlọikwuu gị bukwuo ibu.+
Mee ka ákwà ụlọikwuu gị nke dị ebube sakwuo mbara.
Akparala ya ókè. Mee ka ụdọ ụlọikwuu gị dị ogologo,
Meekwa ka mkpọ́ ụlọikwuu gị sie ike,+
3 N’ihi na ị ga-enwetakwu ala n’aka nri nakwa n’aka ekpe.
Ụmụ gị ga-achị mba dị iche iche,
Bichiekwa n’obodo dị iche iche e bibiri ebibi.+
4 Atụla egwu,+ n’ihi na a gaghị emenye gị ihere.+
Ihere emela gị, n’ihi na a gaghị emechu gị ihu.
N’ihi na ị ga-echefu ihere mere gị mgbe ị bụ nwata.
Ị gaghịkwa echeta ihere e menyere gị n’oge niile ị bụ nwaanyị isi mkpe.”
5 “N’ihi na Onye Ukwu nke kere gị+ dị ka di* gị.+
Jehova nke ụsụụ ndị agha bụ aha ya.
Onye Nsọ Izrel bụ Onye Mgbapụta gị.+
A ga-akpọ ya Chineke ụwa niile.+
6 N’ihi na Jehova kpọrọ gị ka à ga-asị na ị bụ nwaanyị di ya hapụrụ, onye obi gbawara.*+
Ọ kpọkwara gị ka à ga-asị na ị bụ nwaanyị a lụtara n’agbọghọ, e mechaa jụ ya.” Ọ bụ Chineke gị kwuru ihe a.
8 Ezigbo iwe ka m ji wepụtụ ihu m ka ị ghara ịhụ m.+
Ma, m ga-emere gị ebere maka na m ga-ahụ gị n’anya* ruo mgbe ebighị ebi.”+ Ọ bụ Jehova, Onye Mgbapụta gị,+ kwuru ihe a.
Dị ka m ṅụrụ iyi n’oge ahụ na mmiri agaghị ekpuchi ụwa ọzọ,+
Otú ahụkwa ka m ṅụrụ iyi na m gaghị eweso gị iwe, m gaghịkwa abara gị mba.+
10 N’ihi na e nwere ike ime ka ugwu ukwu gharazie ịdị,
Ugwu nta nwekwara ike ịma jijiji,
Ma, m gaghị akwụsị ịhụ gị n’anya,*+
Ọgbụgba ndụ udo mụ na gị gbara ga-adịgidekwa.”+ Ọ bụ Jehova, Onye na-emere gị ebere,+ kwuru ihe a.
11 “Nwaanyị nke nọ n’ahụhụ,+ onye oké ifufe na-ebugharị, onye a na-akasighịkwa obi,+
M ga-eji ụrọ pụrụ iche doo nkume gị niile.
M ga-ejikwa nkume safaya tọọ ntọala gị.+
12 M ga-eji nkume rubi rụbichie ihe n’elu ụlọ gị niile.
M ga-eji nkume na-egbuke egbuke* rụọ ọnụ ụzọ ámá gị niile.
M ga-ejikwa nkume dị oké ọnụ* kpaa ókè n’ala gị niile.
13 Jehova ga na-akụziri ụmụ gị niile ihe.+
Ụmụ gị ga-anọkwa nnọọ n’udo.+
14 A ga-eme ka ị bụrụ a kwaa a kwụrụ n’ime ezi omume.+
Ị ga-anọ ebe dị ezigbo anya n’ebe ndị na-emegbu mmadụ nọ.+
Ị gaghị atụ egwu ihe ọ bụla, ụjọ agaghịkwa atụ gị,
N’ihi na e nweghị ihe na-emenye ụjọ ga-abịa gị nso.+
15 Ọ bụrụ na onye ọ bụla alụso gị ọgụ,
Ọ bụghị m gwara ya mee otú ahụ.
Ị ga-emeri onye ọ bụla bịara lụso gị ọgụ.”+
Ọ bụkwa mụnwa kere onye na-ebibi ihe, ya ana-ebibi ihe.+
17 N’ihi ya, ngwá ọgụ ọ bụla a kpụrụ ka e jiri lụso gị ọgụ agaghị enwe isi.+
Ị ga-amakwa ire ọ bụla ga-ebo gị ebubo ikpe.
Ihe ọma ndị a ka ndị ohu Jehova ketara.
Ha bụ ndị ezi omume n’anya m.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.+
55 Ndị niile akpịrị na-akpọ nkụ,+ bịanụ ṅụọ mmiri.+
Ndị na-enweghị ego, bịanụ zụrụ ihe rie,
Bịakwanụ zụrụ mmanya na mmiri ara ehi+ n’ejighị ego, n’akwụghịkwa ụgwọ.+
2 Gịnị mere unu ji na-emefu ego maka ihe na-abụghị nri?
Gịnịkwa mere unu ji jiri ego unu kpatara* na-azụ ihe na-agaghị eju unu afọ?
Geenụ m ntị nke ọma ma rie ihe dị mma.+
Mgbe ahụ ka nri na-edozi ahụ́ ga-atọ unu* ezigbo ụtọ.+
3 Tọọnụ ntị n’ala bịakwute m.+
Unu* ga-adị ndụ ma unu gee ntị.
Mụ na unu ga-agbakwa ndụ ga-adịru mgbe ebighị ebi+
Otú ahụ m kwere Devid nkwa na m gaghị akwụsị ịhụ ya n’anya.* E kwesịrị ịtụkwasị m obi na m ga-emezu nkwa a.+
4 Ahọpụtala m ya ka ọ na-agbara mba niile àmà,+
Ka ọ bụrụkwa onye ga na-edu+ mba niile na onye ga na-achị+ ha.
5 Ị ga-akpọ mba ị na-amaghị.
Ndị sikwa ná mba na-amaghị gị ga-agbakwute gị
N’ihi Jehova Chineke gị,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel.
Ha ga-agbakwute gị maka na Chineke ga-eme ka ị dị ebube.+
6 Chọọnụ Jehova ugbu a unu ga-achọtali ya.+
Kpọkuonụ ya ugbu a ọ nọ nso.+
7 Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ọjọọ ọ na-eso.+
Ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ.
Ya lọghachikwute Jehova, onye ga-emere ya ebere.+
Ya lọghachikwute Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya kpamkpam.+
8 Jehova kwuru, sị: “Otú m si eche echiche dị iche n’otú unu si eche echiche,+
Ụzọ m dịkwa iche n’ụzọ unu.
9 N’ihi na dị ka eluigwe dị elu karịa ụwa,
Otú ahụ ka ụzọ m dị elu karịa ụzọ unu,
Otú ahụkwa ka otú m si eche echiche si karịa otú unu si eche echiche.+
10 N’ihi na dị ka mmiri si esi n’eluigwe ezo, snoo esikwa n’eluigwe daa,
Ma, ha anaghị alaghachi ebe ahụ ruo mgbe ha dere ala, mee ka ihe a kụrụ na ya puo, meekwa ka ọ mịa mkpụrụ,
Onye chọrọ ịgha mkpụrụ enwee mkpụrụ ọ ga-agha, onye chọrọ iri ihe enweekwa ihe ọ ga-eri,
Ihe m kwuru ga-emezurịrị otú ahụ m si kwuo ya.
A ga-akpọlata unu n’udo.+
Ugwu ukwu na ugwu nta ga-eti mkpu ọṅụ ma unu lọta.+
Osisi niile dị n’ọhịa ga-akụkwa aka.+
13 Osisi junipa ga-anọchi osisi ogwu.+
Osisi metụl ga-anọchikwa ahịhịa akụwa.
Ọ ga-aghọ ihe ga-eme ka aha Jehova na-ede ude.+
Ọ ga-abụkwa ihe àmà ga-adịru mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị ala n’iyi.”
56 Jehova kwuru, sị:
“Na-emenụ ihe ziri ezi,+ na-emekwanụ ezi omume,
N’ihi na oge m ga-abịa zọpụta ndị mmadụ dị nso.
M ga-emekwa ka a mara na m bụ onye ezi omume.+
2 Onye na-eme ihe a na-enwe obi ụtọ.
Onye na-edebe iwu m,
Nke na-edebe Ụbọchị Izu Ike, gharakwa imerụ ya,+
Onye na-anaghịkwa ekwe ka aka ya dịrị n’ụdị ihe ọjọọ ọ bụla, na-enwe obi ụtọ.
Ọnaozi ekwesịghịkwa ịsị, ‘Abụ m osisi kpọrọ nkụ.’”
4 N’ihi na e nwere ihe Jehova gwara ndị ọnaozi ndị na-edebe ụbọchị izu ike ya, ndị họọrọ ime ihe na-amasị ya, ndị jikwa ọgbụgba ndụ ya kpọrọ ihe. Ọ sịrị ha:
5 “M ga-enye unu ebe unu ga-anọ n’ụlọ m, rụọkwa ihe m ga-eji na-echeta unu n’ogige ụlọ m. M ga-echetakwa aha unu.
Ihe ndị a ka ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwaanyị mma.
M ga-eme ka e dee aha unu n’akwụkwọ, ya adịrị ruo mgbe ebighị ebi.
A gaghịkwa ehicha ya ehicha.
6 Ndị mba ọzọ, ndị bịara ka ha soro na-efe Jehova,
Ka ha hụ Jehova n’anya, jiri aha ya kpọrọ ihe,+
Bụrụkwa ndị ohu ya,
Ndị niile na-edebe Ụbọchị Izu Ike, ndị na-anaghịkwa emerụ ya,
Ndị na-ahapụghịkwa ọgbụgba ndụ m,
7 M ga-akpọrọ ha bịa n’ugwu nsọ m,+
Meekwa ka ha ṅụrịa ọṅụ n’ụlọ ekpere m.
M ga-anabata àjà a na-esucha ọkụ na àjà ndị ọzọ ha ga-achụ n’elu ebe ịchụàjà m.
N’ihi na a ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere maka mba niile.”+
8 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, onye na-akpọkọta ndị Izrel a chụsara achụsa,+ kwuru, sị:
“M ga-akpọkọtara ha ndị ọzọ ma e wezụga ndị nke a kpọkọtara akpọkọta.”+
10 Ndị nche kpuru ìsì.+ E nweghịkwa onye n’ime ha ma ihe na-emenụ.+
Ha niile bụ nkịta dara ogbi, nke na-anaghị agbọli ụja.+
Ha na-eku ume ọkụ ọkụ, makpurukwa ala. Ịrahụ ụra na-atọgbu ha atọgbu.
11 Ha bụ nkịta nwere oké akpịrị.
Afọ anaghị eju ha eju.
Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-anaghị aghọta ihe.+
Ha niile echeela ihu n’ụzọ nke ha.
Onye ọ bụla n’ime ha na-eji aghụghọ achọ ihe ga-abara naanị ya uru, na-asị:
Echi ga-adịkwa ka taa. Ọ ga-akadị taa mma.”
57 Onye ezi omume alaala n’iyi,
Ma, o nweghị onye ọ na-emetụ n’obi.
Ndị jisiri Chineke aka ike na-anwụ.+
Ma, o nweghị onye na-aghọta na ihe mere onye ezi omume ji nwụọ
Bụ ka ọdachi ghara ịdakwasị ya.*
2 Ọ na-anọ n’udo.
Ndị niile na-anaghị ahapụ ụzọ ha kwesịrị iso na-ezuru ike n’ili.*
3 “Ma ununwa, bụ́ ụmụ nke nwaanyị na-akọ ọdịnihu
Na ụmụ nke nwoke na-akwa iko na nwaanyị akwụna,
Bịanụ nso:
4 Ònye ka unu ji eme ihe ọchị?
Ònye ka unu na-akwa emo? Ònyekwa ka unu na-akparị?
Ọ̀ bụ na unu abụghị ụmụ na-emebi iwu
Na ụmụ na-aghọ aghụghọ,+
5 Ndị mmekọahụ na-agụsi ike n’ebe osisi ukwu dị iche iche dị,+
Nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko,+
Ndị na-egbu ụmụaka na ndagwurugwu dị iche iche,+
N’ebe ndị gbawara agbawa ná nnukwu nkume?
6 Ị họọrọ nkume na-akwọ mụrụmụrụ ndị si na ndagwurugwu.
Ọ bụ ha bụ òkè gị.+
Ọ bụkwa ha ka ị na-achụrụ àjà mmanya, na-enyekwa onyinye.+
Ihe ndị a hà ga-eme ka obi dị mụ mma?*
7 I dowere àkwà* gị n’elu ugwu dị oké elu.+
Ị gakwara ịchụ àjà ebe ahụ.+
8 I dowere ihe a ga-eji na-echeta gị n’azụ ibo ụzọ nakwa n’awara ụzọ.
Ị hapụrụ m, gbara ọtọ.
Ị gara ebe ahụ mee ka àkwà* gị saa mbara.
Gị na ndị gị na ha na-eme enyi gbara ndụ.
Ọ na-atọgbukwa gị atọgbu ka gị na ha dinaa.+
Ị nọkwa na-ele ihe ha ji bụrụ nwoke.*
I jikwa nnukwu sent gakwuru ya.
I zigakwara ndị ozi gị ebe dị anya,
Si otú ahụ weda onwe gị ala ruo n’ili.*
10 Ọtụtụ ebe i tinyere isi emeela ka ị rụgbuo onwe gị n’ọrụ.
Ma, ị sịghị, ‘Ọ baghị uru ọ bụla!’
I nwetaghachiri ike.
Ọ bụ ya mere na ị naghị ada mbà.*
I chetaghị m.+
Ọ dịghị ihe i chebaara echiche.+
12 M ga-akọsa ihe ị sị na ọ bụ ezi omume+ ị na-eme na ọrụ niile ị na-arụ.+
Ha agaghịkwa abara gị uru.+
Ifufe ga-ebufu ha niile.
Ume nkịtị mmadụ kupụrụ ga-eburu ha.
Ma, onye ji m mere ebe mgbaba ga-eketa ala a,
Nwetakwa ugwu nsọ m.+
14 A ga-asịkwa, ‘Rụọnụ ụzọ, rụọnụ ụzọ! Rụọnụ ya ka ọ dị mma.+
Wepụnụ ihe ọ bụla nọchiiri ndị m ụzọ.’”
“Ebi m ebe dị elu na ebe dị nsọ,+
Ma, mụ na ndị obi gbawara na ndị dara mbà n’obi nọkwa,
Iji gbaa ndị dara mbà n’obi ume,
Meekwa ka obi sie ndị obi gbawara ike.+
16 N’ihi na agaghị m na-alụso ha ọgụ ruo mgbe ebighị ebi.
Agaghịkwa m na-ewe iwe mgbe niile.+
M ga-eme ka ike gwụ ndị mmadụ.+
M ga-emekwa ka ike gwụ ihe dị iche iche na-eku ume m kere.
17 Iwe were m n’ihi otú uru e ji aghụghọ erite si agụsi ya ike.+
Ọ bụ ya mere m ji taa ya ahụhụ, zoo ihu m, na-ewekwara ya iwe.
Ma, ọ nọ na-enupụ isi,+ na-eme ihe ọ bụla obi ya gwara ya.
18 Ahụla m otú o si eme.
Ma, m ga-agwọ ya,+ duziekwa ya.+
M ga-akasikwa ya na ndị so ya na-eru uju obi.”+
19 Jehova kwuru, sị: “M ga-eme ka ha na-eto m.
Udo ga-adịrị onye nọ ebe dị anya na onye nọ nso mgbe niile.+
M ga-agwọkwa ha.”
20 “Ma ndị ajọ omume yiri oké osimiri nke na-amali elu, nke na-enweghị ike ịdajụ,
Nke mmiri ya na-abọlitekwa apịtị na ahịhịa ndị dị na ya.
21 Udo agaghị adịrị ndị ajọ omume.”+ Ọ bụ Chineke m kwuru ihe a.
58 Ọ gwara m, sị: “Tie ezigbo mkpu. Emechila ọnụ.
Mee ka olu gị dasie ụda ike dị ka opi.
Gwa ndị m otú ha si nupụ isi,+
Gwakwa ezinụlọ Jekọb mmehie ha.
2 Ha na-achọ ka m na-eduzi ha kwa ụbọchị.
Ha na-ekwukwa na ịmara ụzọ m dị ha mma,
Ka à ga-asị na ha bụ mba nke na-eme ezi omume,
Nke na-ahapụghịkwa iwu Chineke ha.+
Ha na-arịọ m ka m kpeere ha ikpe ziri ezi,
Ka à ga-asị na ịbịaru Chineke nso dị ha mma.+
3 Ma ugbu a, unu na-asị: ‘Gịnị mere na ị hụghị anyị mgbe anyị na-ebu ọnụ?+
Gịnịkwa mere na ị maghị mgbe anyị na-emekpa onwe* anyị ahụ́?’+
Ihe m ga-aza unu bụ, ọ bụ maka na unu na-achụ ihe ga-abara naanị onwe unu uru n’ụbọchị unu na-ebu ọnụ.
Unu na-emegbukwa ndị na-arụrụ unu ọrụ.+
4 Ọnụ unu na-ebu na-akpata esemokwu na ọgụ,
Unu na-akụkwa ọkpọ ka ndị obi fere azụ.
Ọ bụrụ na unu ana-ebu ọnụ otú a unu na-ebu taa, a gaghị anụ olu unu n’eluigwe.
5 Ụbọchị unu na-ebu ọnụ dị ka ụbọchị mmadụ na-emekpa onwe* ya ahụ́,
Ụbọchị mmadụ na-ehulata isi ya dị ka ahịhịa amị,
Gbasaa ákwà iru uju, kposaakwa ntụ ka o dinara na ya.
Ọ̀ bụ otú a ka m chọrọ ka unu si na-ebu ọnụ?
Ọ̀ bụ ụdị ibu ọnụ a na ụdị ụbọchị a ka unu na-asị dị Jehova mma?
6 Mbanụ. Ụdị ibu ọnụ m chọrọ bụ:
Ka unu tọpụ agbụ e ji obi ọjọọ kee,
Ka unu tọpụ eriri e ji kegide osisi yok,+
Ka unu hapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha nwere onwe ha,+
Nakwa ka unu gbajie osisi yok niile.
7 M chọkwara ka unu nye ndị agụụ na-agụ ihe oriri,+
Ka unu kpọbatakwa ndị ogbenye na ndị na-enweghị ebe ha ga-ebi n’ụlọ unu.
Ọ bụrụ na unu ahụ ndị na-enweghị uwe, m chọrọ ka unu yiwe ha uwe,+
Ka unu gharakwa ịgbakụta ndị ikwu unu azụ.
8 Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe ndị a, ìhè unu ga-enwu ka chi ọbụbọ.+
Unu ga-agbakekwa ngwa ngwa.
Ezi omume unu ga-ebutere unu ụzọ,
Ebube Jehova ana-echebekwa unu n’azụ.+
9 Unu ga-akpọku Jehova, ọ ga-azakwa unu.
Unu ga-arịọ ya ka o nyere unu aka. Ọ ga-asịkwa, ‘M ga-enyere unu aka.’
Ọ bụrụ na unu ewepụ osisi yok e ji echi ndị mmadụ ọnụ n’ala,
Kwụsịkwa ịtụ ndị ọzọ aka* na ịgwa ha okwu ọjọọ,+
10 Ọ bụrụkwa na unu enye ndị agụụ na-agụ ihe na-amasị unu,*+
Nyejuokwa ndị* nọ n’ahụhụ afọ,
Ìhè unu ga na-enwudị n’ọchịchịrị.
Itiri ga-adịkwara unu ka etiti ehihie.+
Ọ ga-emekwa ka unu sie ike.*
Unu ga-adị ka ubi nke mmiri na-ede nke ọma.+
Unu ga-adịkwa ka isi mmiri nke mmiri ya na-anaghị ata ata.
12 Ọ bụ maka unu ka a ga-eji arụghachi ebe ndị e bibiri ebibi n’oge ochie.+
Unu ga-atọghachikwa ntọala ndị e mebiri n’oge ochie.+
A ga-akpọkwa unu ndị na-arụzi ebe e tidara etida ná mgbidi+
Na ndị na-arụzi okporo ụzọ ka ndị mmadụ rụọ ụlọ n’akụkụ ya.
13 Ọ bụrụ na unu ejiri maka Ụbọchị Izu Ike kwụsị* ime ihe masịrị unu* n’ụbọchị m nke dị nsọ,+
Ọ bụrụkwa na unu ewere Ụbọchị Izu Ike ka ụbọchị na-eme unu ezigbo obi ụtọ, ụbọchị Jehova nke dị nsọ, nke unu kwesịrị iji kpọrọ ihe,+
Ọ bụrụkwa na unu ejiri ya kpọrọ ihe kama imewe ihe na-amasị unu na ikwuwe ihe na-enweghị isi,
14 Mụnwa bụ́ Jehova ga-eme ka unu na-enwe ezigbo obi ụtọ,
Meekwa ka unu na-achị n’ebe ndị dị elu n’ụwa.+
M ga-eme ka unu rie ihe si n’ihe Jekọb nna nna unu ketara.+
Ọ bụ Jehova ji ọnụ ya kwuo ihe a.”
2 N’eziokwu, ọ bụ ajọ omume unu na-ekewa unu na Chineke unu.+
Ọ bụ mmehie unu mere o ji zooro unu ihu ya.
Ọ bụkwa ya mere ka ọ ghara ige unu ntị.+
3 N’ihi na ọbụ aka unu bụ ọbara ọbara.+
Mkpịsị aka unu bụkwa mmehie mmehie.
Unu ji egbugbere ọnụ unu agha ụgha,+ jirikwa ọnụ* unu na-ekwu ihe na-adịghị mma.
4 Ọ dịghị onye na-ekwusi okwu ike ka a na-eme ezi omume.+
Ọ dịghịkwa onye na-ekwu eziokwu n’ụlọikpe.
Ha na-atụkwasị obi n’ihe na-enweghị ihe ọ bụ,+ na-ekwukwa ihe na-abaghị uru ọ bụla.
Ha atụrụla ime nsogbu, mụọkwa ihe ọjọọ.+
5 Ha na-abụ àkwá agwọ ọjọọ.
Ha na-akpakwa ọnyà ududo.+
Onye ọ bụla nke riri àkwá agwọ ọjọọ ahụ ga-anwụ.
Ajụala ga-esikwa n’àkwá ya kụwara akụwa pụta.
6 Ọnyà ududo ha agaghị abụrụ ha uwe.
Ha agaghịkwa eji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha.+
Ọrụ ha bụ ọrụ ọjọọ.
E jikwa tigbuo zọgbuo mara ha.+
7 Ha* na-agba ọsọ aga ime ihe ọjọọ.
Ha na-emekwa ngwa ngwa ka ha gbuo ndị aka ha dị ọcha.+
Ihe niile ha na-eche bụ echiche ọjọọ.
Ha na-emebisị ihe ndị mmadụ ma na-echi ha ọnụ n’ala.+
8 Ha amaghị otú ha na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo.
Ha anaghị ekpe ikpe ziri ezi.+
Ha na-eme ka okporo ụzọ ha niile gbagọọ agbagọ.
Udo agaghị adịrị onye ọ bụla na-eje ije na ha.+
9 Ọ bụ ya mere ikpe ziri ezi ji dị anya n’ebe anyị nọ,
Ezi omume anaghịkwa erute n’ebe anyị nọ.
Anyị na-ele anya ìhè, ma, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ.
Anyị na-ele anya ka ebe niile nwuo gbaa, ma, anyị na-ejegharị n’ọchịchịrị.+
10 Anyị na-asọgharị ìsì ná mgbidi ka ndị ìsì.
Anyị na-asọgharịkwa ìsì ka ndị na-enweghị anya.+
Anyị na-akpọ ụkwụ n’ihe n’etiti ehihie dị ka à ga-asị na chi ejiela.
Anyị na-adị ka ndị nwụrụ anwụ ma anyị nọrọ ebe ndị siri ike nọ.
11 Anyị niile na-asụ ude ka anụ ọhịa bea.
Anyị na-eru uju, na-ebe ubé ka nduru.
Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma, ọ bụ n’efu.
Anyị na-elekwa anya ka a zọpụta anyị, ma a zọpụtaghị anyị.
12 N’ihi na anyị enupụrụla gị isi ọtụtụ mgbe.+
Mmehie ọ bụla anyị mere na-agba akaebe na ikpe mara anyị.+
Anyị ma ihe anyị mejọrọ.
Anyị makwa mmehie anyị nke ọma.+
13 Anyị emebiela iwu, gọnahụkwa Jehova.
Anyị agbakụtala Chineke anyị azụ.
Anyị akpaala nkata imegbu ibe anyị na inupụ isi.+
Anyị echeela echiche ịgha ụgha, ghaakwa ya n’obi anyị.+
Eziokwu* adịghị n’ámá anyị.
Ihe dị mma anaghịkwa abatali na ya.
A na-akwakọrọkwa ihe onye ọ bụla na-esoghị na-eme ihe ọjọọ.
16 Ọ hụrụ na e nweghị onye na-enyere ha aka.
O jukwara ya anya na e nweghị onye na-agbachitere ha.
N’ihi ya, o ji aka ya zọpụta ha.*
Ezi omume ya nyekwaara ya aka.
18 Ọ ga-akwụ ndị mmadụ ụgwọ ihe ha mere.+
Ọ ga-ewesa ndị na-emegide ya iwe, kwụọkwa ndị iro ya ụgwọ.+
Ọ ga-akwụ ndị bi n’agwaetiti ụgwọ kwesịịrị ha.
19 Ndị nọ n’ebe ọdịda anyanwụ ga-ebido ịtụ egwu aha Jehova.
Ndị nọkwa n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-ebido ịtụ ebube ya egwu.
N’ihi na Jehova ga-abịa ka osimiri na-asọsi ike,
Nke mmụọ ya mere ka ọ na-asọ.
20 Jehova kwuru, sị, “Onye Mgbapụta+ ga-abịa na Zayọn.+
Ọ ga-abịakwute ndị ezinụlọ Jekọb ndị na-anaghịzi emebi iwu.”+
21 Jehova kwuru, sị, “Ihe a bụ ndụ mụ na ha gbara.+ Mmụọ m nke dị n’ime gị nakwa okwu m nke m tinyere n’ọnụ gị agaghị apụ n’ọnụ gị, n’ọnụ ụmụ* gị, ma ọ bụ n’ọnụ ụmụ ụmụ gị,* malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
60 “Jeruselem,* bilie,+ mee ka ìhè nwuo, n’ihi na i nweela ìhè.
Ebube Jehova na-enwu ka ìhè n’ahụ́ gị.+
2 Ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa.
Oké ọchịchịrị ga-ekpuchikwa mba dị iche iche.
Ma, Jehova ga-eme ka ìhè na-enwuru gị,
Meekwa ka a hụ ebube ya n’ahụ́ gị.
3 Mba dị iche iche ga-aga ebe ìhè gị na-enwu.+
Ndị eze+ ga-agakwa ebe ìhè gị dị ebube na-enwu.+
4 Legharịa anya gburugburu gị.
A kpọkọtala ha niile, ha ana-abịakwute gị.
5 N’oge ahụ, ị ga-ahụ ihe a, ihu gị ga na-egbukekwa egbuke.+
Obi ga-atọ gị ụtọ, aṅụrị eju gị obi,
N’ihi na akụ̀ dị n’oké osimiri ga-abịara gị.
Akụ̀ mba dị iche iche ga-abịara gị.+
Ndị niile si Shiba ga-abịa.
Ha ga-ebu ọlaedo na frankinsens bịa.
Ha ga-eto Jehova n’ihu ọha.+
7 A ga-achịkọta ìgwè atụrụ niile dị na Kida,+ kpụtara gị ha.
Ebule ndị si Nebeyọt+ ga na-ejere gị ozi.
Ha ga-abịa n’elu ebe ịchụàjà m. A ga-anabatakwa ha.+
M ga-achọkwa ụlọ m dị ebube* mma.+
9 Agwaetiti niile ga-eji m nwee olileanya.+
Ụgbọ mmiri ndị na-aga Tashish ga-anọ n’ihu
Ma e bulatawa ma ụmụ gị ndị nọ ebe dị anya+
Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha,
N’ihi aha Jehova bụ́ Chineke gị na Onye Nsọ Izrel,
10 Ndị mba ọzọ ga-arụ mgbidi gị.
Ndị eze ha ga na-ejekwara gị ozi.+
M ji iwe tie gị ihe.
Ma, m ga-emere gị ebere n’ihi amara m.+
11 A ga-eghewe ọnụ ụzọ ámá gị niile oghe mgbe niile.+
A gaghị emechi ha emechi, ma n’ehihie ma n’abalị,
Ka e wee na-ebutere gị akụ̀ mba dị iche iche,
Ndị eze ha ga-ebutekwa ụzọ.+
12 Mba ọ bụla na alaeze ọ bụla na-agaghị ejere gị ozi ga-ala n’iyi.
A ga-alakwa mba ndị ahụ n’iyi kpamkpam.+
13 A ga-ebutere gị ihe ndị mere ka Lebanọn dị ebube,+
Ya bụ, osisi junipa, osisi ash, na osisi saịpres. A ga-ebutere gị ha otu mgbe+
Ka e jiri ha chọọ ụlọ nsọ m mma.
M ga-emekwa ka ebe m gbakwasịrị ụkwụ dị ebube.+
14 Ụmụ ndị na-emekpa gị ahụ́ ga-abịakwute gị, kpọọrọ gị isiala.
Ndị niile na-elelị gị ga-ehulata ala n’ọbụ ụkwụ gị.
Ha ga-akpọkwa gị obodo Jehova,
Zayọn nke Onye Nsọ Izrel.+
15 Ọ bụ eziokwu na m hapụrụ gị, ndị mmadụ akpọọ gị asị, e nweghịkwa onye na-esi na gị agafe,+
Ma, m ga-eme ka ị bụrụ ihe e ji anya isi ruo mgbe ebighị ebi,
Meekwa ka ị bụrụ ihe e ji maka ya aṅụrị ọṅụ n’ọgbọ niile.+
16 Ị ga-aṅụ ara mba dị iche iche.+
Ị ga-aṅụkwa ara ndị eze.+
Ị ga-ama na mụnwa, bụ́ Jehova, bụ Onye Nzọpụta gị,
Nakwa na Dike na-enyere Jekọb aka bụ Onye Mgbapụta gị.+
17 M ga-eweta ọlaedo jiri ya dochie ọla kọpa.
M ga-ewetakwa ọlaọcha jiri ya dochie ígwè.
M ga-eji ọla kọpa dochie osisi,
Jirikwa ígwè dochie nkume.
M ga-eme ka udo bụrụ onye nlekọta gị,
Meekwa ka ezi omume bụrụ onye na-ekenye gị ọrụ.+
18 A gaghịzi anụ gbasara tigbuo zọgbuo n’ala gị.
E nweghịzikwa ebe a ga-anụ gbasara imebisị ihe ndị mmadụ na ibibi ihe ndị mmadụ n’ala gị.+
Ị ga-akpọ mgbidi gị Nzọpụta,+ kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị Otuto.
19 N’ihi na anyanwụ agaghịzi abụrụ gị ìhè n’ehihie.
Ọnwa na-eti gbaa agaghịkwa enye gị ìhè n’abalị.
Jehova ga-aghọrọ gị ìhè na-adịru mgbe ebighị ebi.+
Chineke gị ga-achọkwa gị mma.+
20 Anyanwụ gị agaghịzi ada ada.
Ọnwa gị agaghịzi ala ala,
N’ihi na Jehova ga-aghọrọ gị ìhè na-adịru mgbe ebighị ebi.+
Ị ga-akwụsịkwa iru uju.+
21 Ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume.
Ha ga-enweta ala a ruo mgbe ebighị ebi.
22 Onye dị ntakịrị ga-aghọ otu puku mmadụ.
Onye dị obere ga-aghọkwa mba dị ike.
Mụnwa, bụ́ Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.”
61 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova nyere m mmụọ ya,+
N’ihi na Jehova tere m mmanụ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.+
O zitere m ka m kechie ọnyá ndị obi gbawara,
Ka m gwa ndị e ji eji na a hapụla ha,
Ka m meghee anya ndị mkpọrọ,+
2 Ka m kwusaa afọ Jehova na-emere ndị mmadụ amara*
Na ụbọchị Chineke anyị ga-akwụ ndị iro ya ụgwọ,+
Ka m kasie ndị niile na-eru uju obi,+
3 Ka m lekọta ndị na-eruru Zayọn uju,
Ka m nye ha ákwà isi ha ga-eji dochie ntụ,
Ka m nye ha mmanụ ka ha na-enwe aṅụrị kama iru uju,
Ka m nye ha ákwà ha ga-eyiri na-eto m kama ịda mbà n’obi.
4 Ha ga-arụghachi ebe ndị e bibiri ebibi dịwara kemgbe ụwa.
Ha ga-arụ ebe ndị tọgbọ nkịtị n’oge ochie.+
Ha ga-eme ka obodo ndị e bibiri ebibi dị ọhụrụ,+
Ya bụ, obodo ndị tọgbọ nkịtị malite n’otu ọgbọ ruo n’ọgbọ ọzọ.+
5 “Ndị ala ọzọ ga-abịa na-azụ ìgwè ewu na atụrụ unu.
Ndị mba ọzọ+ ga na-akọrọ unu ubi unu, na-elekọtakwa ubi vaịn unu.+
6 Ma, ha ga-akpọ unu ndị nchụàjà Jehova.+
Ha ga-asịkwa na unu bụ ndị ozi Chineke anyị.
Unu ga-eri akụ̀ mba dị iche iche.+
Unu ga-ejikwa ebube* ha na-eme ọnụ.
7 E menyere unu ihere. Ma ugbu a, unu ga-enweta ngọzi okpukpu abụọ.
A gaghịzi emenye ndị m ihere, kama, ha ga na-eti mkpu ọṅụ n’ihi na a gọziela ha.
N’eziokwu, ha ga-enweta ngọzi okpukpu abụọ n’ala ha.+
Ha ga na-aṅụrị ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+
8 N’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova, hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.+
M kpọrọ izu ohi na ajọ omume asị.+
M ga na-akwụ ndị m ụgwọ ọrụ ha.
Mụ na ha ga-agbakwa ndụ ga-adịru mgbe ebighị ebi.+
9 Ụmụ* ha ga-abụ ndị a ma ama ná mba dị iche iche.+
Ndị si n’ezinụlọ ha ga-abụkwa ndị a ma ama n’obodo niile.
10 M ga-aṅụrị ezigbo ọṅụ n’ihi Jehova.
Obi ga-abụ m* sọ aṅụrị n’ihi Chineke m.+
N’ihi na o yikwasịla m nzọpụta ka uwe.+
O yikwasịla m ezi omume ka uwe,
Otú nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ si eke ákwà n’isi ka onye nchụàjà,+
Nakwa otú nwaanyị a na-alụ ọhụrụ si eji ihe ndị o ji achọ mma chọọ onwe ya mma.
Ọ ga-eme ihe ndị a otú ahụ ala si eme ka mkpụrụ puo
Nakwa otú ahụ ubi si eme ka ihe a kụrụ na ya puo.
62 Agaghị m agbachi nkịtị n’ihi Zayọn.+
Agaghịkwa m anọ jii n’ihi Jeruselem,
Ruo mgbe ezi omume ya malitere inwu ka ìhè,+
Nzọpụta ya ana-enwukwa ka ọwa a mụnyere ọkụ.+
2 “Jeruselem,* mba dị iche iche ga-ahụ ezi omume gị.+
Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị.+
A ga na-akpọ gị aha ọhụrụ.+
Ọ bụ Jehova ga-eji ọnụ ya gụọ gị aha ahụ.
3 Ị ga-aghọ okpueze mara mma n’aka Jehova,
Ghọọkwa ákwà eze na-eke n’isi n’ọbụ aka Chineke gị.
4 A gaghịzi akpọ gị nwaanyị a hapụrụ ahapụ.+
A gaghịzi asị na ala gị tọgbọ nkịtị.+
Kama a ga-akpọ gị Onye Ihe Ya Masịrị M,+
Kpọọkwa ala gị Nwaanyị A Lụ Alụ.
N’ihi na ihe gị ga-amasị Jehova,
Ala gị ga-adịkwa ka nwaanyị a lụ alụ.
5 N’ihi na ụmụ gị ndị nwoke ga-alụrụ gị
Dị ka nwa okorobịa si alụrụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke.
Chineke gị ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi gị+
Otú nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ si aṅụrị ọṅụ n’ihi nwaanyị ọ na-alụ ọhụrụ.
6 Jeruselem, enyela m ndị nche ọrụ ka ha na-anọ n’elu mgbidi gị niile.
Ha ekwesịghị ịgbachi nkịtị mgbe ọ bụla, ma n’ehihie ma n’abalị.
Ndị na-ekwu gbasara Jehova,
Unu ezula ike.
7 Na-arịọnụ ya ka ọ na-enyere unu aka ruo mgbe o mere ka Jeruselem sie ezigbo ike,
Ruokwa mgbe o mere ka a na-eto Jeruselem n’ụwa.”+
8 Jehova eweliela aka nri ya na aka ya dị ike elu, ṅụọ iyi, sị:
“Agaghịzi m enye ndị iro gị ọka* gị ka ha taa.
Ndị mba ọzọ agaghịzikwa aṅụ mmanya ọhụrụ gị, nke ị tara ahụhụ mepụta.+
9 Kama ọ bụ ndị chịkọtara ọka ahụ ga-ata ya. Ha ga-etokwa Jehova.
Ọ bụkwa ndị mepụtara mmanya ahụ ga-aṅụ ya n’ogige m dị nsọ.”+
10 Pụọnụ, sinụ n’ọnụ ụzọ ámá pụọ.
Wepụnụ ihe nọchiiri ndị m ụzọ.+
Rụọnụ ụzọ. Rụọnụ okporo ụzọ.
Wepụsịanụ nkume ndị dị na ya.+
Gwunyenụ ihe ga na-agbara mba dị iche iche àmà.+
11 Jehova gwara ndị nọ ebe ụwa sọtụrụ, sị:
Chineke dị njikere ịkwụ ndị ya ụgwọ ọrụ.
Ihe ọ ga-akwụ ha dịkwa n’ihu ya.’”+
12 Ndị mmadụ ga-akpọ ha ndị dị nsọ, ndị Jehova gbapụtara.+
A ga-akpọkwa Jeruselem Obodo Chineke Chọtara, Obodo Chineke Na-ahapụghị.+
63 Ònye bụ onye a si Ịdọm na-abịa,+
Onye si Bọzra+ yiri uwe tụrụ àgwà* nke na-egbuke egbuke na-abịa,
Onye yikwa uwe dị ebube,
Jiri ike ya dị ukwuu zọrọ ije na-abịa?
“Ọ bụ m, bụ́ onye* na-ekwu ihe ziri ezi,
Onye nwere ike dị ukwuu ọ ga-eji zọpụta ndị mmadụ.”
2 Gịnị mere ákwà gị ji na-acha uhie uhie?*
Gịnịkwa mere uwe gị ji dị ka nke onye na-azọcha mkpụrụ vaịn n’ebe a na-azọchapụta mmanya?+
3 “Naanị m zọchara mkpụrụ vaịn dị n’ebe a na-azọchapụta mmanya.
E nweghị onye ọ bụla so m.
Eji m iwe na-azọcha ndị iro m,
Ejikwa m ezigbo iwe na-azọpịa ha.+
Ọbara ha nọ na-agbasa m n’uwe,
Metọchaakwa uwe m niile.
5 Anọ m na-ele anya, ma e nweghị onye na-enyere m aka.
O wutere m na o nweghị onye chọrọ ịkwado m.
Ọ bụzi aka m ka m ji zọpụta ha.*+
Ezigbo iwe ji m bụ ihe nyeere m aka.
6 M ji iwe na-azọda mba dị iche iche n’ala.
M mere ka ezigbo iwe ji m na-egbu ha ka mmanya,+
Meekwa ka ọbara ha na-awụsa n’ala.”
7 M ga-ekwu ihe niile Jehova mere nke na-egosi na ọ hụrụ ndị ya n’anya.
M ga-ekwu ihe niile Jehova mere nke e kwesịrị iji na-eto ya.
M ga-ekwu ihe niile Jehova meere anyị,+
Ya bụ, ọtụtụ ihe ọma o meere ndị Izrel.
O mere ihe ndị a maka na ọ na-eme ebere, hụkwa ndị ya n’anya nke ukwuu.
8 O kwuru, sị: “N’eziokwu, ha bụ ndị m na ụmụ na-agaghị enupụrụ m isi.”+
Ọ bụ ya mere o ji bụrụ Onye Nzọpụta ha.+
9 N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.+
Ọ gbapụtara ha maka na ọ hụrụ ha n’anya, na-emetekwara ha ebere.+
N’oge ahụ niile, o buliri ha elu, lekọtakwa ha ụbọchị niile.+
10 Ma, ha nupụụrụ ya isi,+ meekwa ihe wutere mmụọ nsọ ya.+
11 Ha malitere icheta oge gara aga,
Oge Mosis ohu ya dị ndụ. Ha sịrị:
“Olee ebe Onye ahụ si n’oké osimiri kpọpụta ha+ na ndị na-azụ atụrụ ya nọ?+
Olee ebe Onye ahụ nyere Mosis* mmụọ nsọ ya nọ?+
12 Ọ bụ Onye ahụ ji ike ya dị ebube* nyere Mosis aka.+
13 Ọ bụkwa ya mere ka ha were ụkwụ gafee mmiri na-ekwo ekwo.*
Ha gafere n’adaghị ada,
Dị ka ịnyịnya nke na-aga n’ọzara.*
15 Si n’eluigwe lee anya.
Si n’ebe i bi, bụ́ ebe dị nsọ, nke dị ebube,* hụrụ.
Olee ihe mere na ị naghịzi atụpụrụ anyị ọnụ, ị naghịkwa enyere anyị aka?
Olee ihe mere na ihe gbasara anyị anaghịzi emetụ gị n’obi,+ ị naghịkwa emere anyị ebere?+
E nweghịzi nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ị na-emere anyị.
Ọ bụrụgodị na Ebreham amaghị anyị,
Ọ bụrụkwa na Izrel amaghị anyị,
Gịnwa, bụ́ Jehova, bụ Nna anyị.
Ị bụ Onye Mgbapụta anyị kemgbe ụwa.+
17 Jehova, gịnị mere i ji kwe* ka anyị si n’ụzọ gị kpafuo?
Gịnị mere i ji kwe* ka obi anyị kpọọ nkụ, nke na anyị anaghịzi atụ egwu gị?+
Jiri maka ndị ohu gị,
Bụ́ ndị nke gị,+ meere anyị amara ọzọ.
18 Ndị gị dị nsọ bitụrụ n’ala a.
Ma, ndị iro anyị azọdala ụlọ nsọ gị.+
19 O teela anyị dị ka ndị ị na-achịtụbeghị.
O teekwala anyị dị ka ndị na-azatụbeghị aha gị.
64 A sị nnọọ na ị dọwara eluigwe gbadata,
Ka ugwu niile wee maa jijiji n’ihi gị,
2 Dị ka mgbe ọkụ na-ere irighiri nkụ,
Ọkụ ahụ emeekwa ka mmiri na-agbọ,
Ọ gaara eme ka ndị iro gị mara aha gị,
Mba niile amaakwa jijiji n’ihi gị.
3 Mgbe i mere ihe ndị dị egwu anyị na-atụghị anya ha,+
Ị gbadatara, ugwu niile amaakwa jijiji n’ihi gị.+
4 Kemgbe oge ochie, e nwetụbeghị onye nụrụ gbasara Chineke ọzọ. E nwetụbeghịkwa onye gere chi ọzọ ntị.
E nwetụbeghịkwa onye hụrụ Chineke ọzọ.
Ọ bụ naanị gị na-enyere ndị na-atụ anya* gị aka.+
Iwe were gị maka na anyị nọ na-emehie.+
O teekwala anyị nọ na-emehie gị.
È kwesịrị ịzọpụta anyị?
6 Anyị niile dịzi ka onye na-adịghị ọcha.
Ezi omume anyị niile dịkwa ka uwe nwaanyị nọ ná nsọ ya yi.+
Anyị niile ga-akpọnwụ ka mkpá akwụkwọ.
Mmehie anyị ga-ebufukwa anyị otú ifufe si ebufu ihe.
7 E nweghị onye na-akpọku aha gị,
E nweghịkwa onye obi ya na-agwa ka o jidesie gị aka ike,
N’ihi na i zoola ihu gị ka anyị ghara ịhụ ya.+
I meekwala ka mmehie anyị laa anyị n’iyi.*
Anyị bụ ụrọ. Ọ bụkwa gị kpụrụ anyị.+
Anyị niile bụ ọrụ aka gị.
9 Jehova, biko, ewefela iwe ókè.+
Echetakwala mmehie anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Biko, leenụ anyị. Anyị niile bụ ndị gị.
10 Obodo nsọ gị niile aghọọla ala ịkpa.
Zayọn aghọọla ala ịkpa.
Jeruselem aghọọkwala ala na-abaghị uru.+
Ọ bụ ebe nna nna anyị hà nọ too gị.
A laala ihe niile anyị ji eme ọnụ n’iyi.
12 Jehova, biko, ị̀ ka ga-ajụ inyere anyị aka mgbe ihe ndị a na-eme?
Ị̀ ga-agba nkịtị kwe ka a na-echi anyị ọnụ n’ala?+
65 “Emeela m ka ndị na-ajụghị ajụjụ m chọta m.
Emeela m ka ndị na-achọghị m chọta m.+
Agwara m mba na-anaghị akpọku aha m, sị, ‘Lekwanụ m, lekwanụ m!’+
2 Ana m agbasara ndị dị isi ike aka m mgbe niile.+
Ha na-eri anụ ézì.+
Ofe e ji ihe rụrụ arụ* sie dịkwa n’ite ha.+
Ha na-akpasu m iwe mgbe niile.* Ha dịkwa ka ọkụ na-ere malite n’ụtụtụ ruo n’abalị.
6 A nọ n’ihu m dee ihe ndị a.
Agaghị m agbachi nkịtị,
Kama m ga-ata ha ahụhụ.+
M ga-ata ha ahụhụ maka ihe ọjọọ niile ha mere.*
7 M ga-ata ha ahụhụ a n’ihi mmehie ha nakwa n’ihi mmehie ndị nna nna ha mere.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
“M ga-ebu ụzọ taa ha ahụhụ maka ihe ọjọọ niile ha mere,*
N’ihi na ha na-esu àjà ọkụ n’elu ugwu ukwu dị iche iche,+
Na-akọchakwa m n’elu ugwu nta dị iche iche.”
8 Jehova kwuru, sị:
“Ọ na-abụ mmadụ hụ ụyọkọ mkpụrụ vaịn nke ga-agbapụta mmanya ọhụrụ,
Ya asị, ‘Emebila ya, n’ihi na ihe dị mma* dị n’ime ya.’
Otú ahụkwa ka m ga-emere ndị ohu m.
M gaghị ebibi ha niile.+
Ndị m họọrọ ga-enweta ya.
Ndị ohu m ga-ebikwa ebe ahụ.+
10 M ga-eji maka ndị m, bụ́ ndị ga-achọ m,
Mee ka Sharọn+ ghọọ ebe atụrụ ga na-ata ahịhịa,
Meekwa ka Ndagwurugwu Ekọ+ ghọọ ebe ehi ga na-ezu ike.
Na-echefu ugwu nsọ m,+
Na-edozi tebụl maka chi Ihu Ọma,
Na-agbajukwara chi Akara Aka mmanya a gwara agwa.
12 M ga-enyefe unu n’aka mma agha.+
Unu niile ga-ehulatakwa ala ka e gbuo unu,+
N’ihi na m kpọrọ unu òkù, ma unu azaghị.
Agwara m unu okwu, ma unu egeghị ntị.+
Unu nọ na-eme ihe dị njọ n’anya m.
Unu họkwaara ịna-eme ihe na-adịghị mụ mma.”+
13 N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“Ndị ohu m ga na-eri ihe, ma agụụ ga na-agụ unu.+
Ndị ohu m ga-ahụ ihe ha ga na-aṅụ,+ ma akpịrị ga na-akpọ unu nkụ.
Ndị ohu m ga na-aṅụrị ọṅụ,+ ma ihere ga na-eme unu.+
14 Ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi na obi dị ha mma,
Ma unu ga-eti mkpu ákwá n’ihi na obi na-agbawa unu.
Unu ga-ebekwa ákwá n’ihi na ike ụwa agwụla unu.
15 Aha ọjọọ unu ga-enwe ka ndị m họọrọ ga-eji na-abụ mmadụ ọnụ.
Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-egbukwa unu n’otu n’otu.
Ma, ọ ga-agụ ndị ohu ya aha ọzọ.+
16 Ihe a ga-eme ka onye ọ bụla nke chọrọ ka a gọzie ya n’ụwa
Rịọ Chineke, onye na-ekwu eziokwu,* ka ọ gọzie ya.
N’ihi na ha ga-echefu ahụhụ niile ha tara.*
M gaghị eji anya m ahụ ahụhụ ndị ahụ ọzọ.+
17 N’ihi na m na-eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.+
A gaghịzi echeta ihe niile mere na mbụ.
Ha agaghị abatakwa n’obi.+
18 N’ihi ya, ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi dịkwa unu ụtọ ruo mgbe ebighị ebi maka ihe m na-eke.
N’ihi na m na-eke Jeruselem ka e jiri maka ya na-aṅụrị ọṅụ.
M na-ekekwa ndị bi na ya ka e jiri maka ha na-enwe obi ụtọ.+
19 M ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi Jeruselem. Obi ga-adịkwa m ụtọ n’ihi ndị m.+
A gaghịzi na-anụ ụda ákwá ma ọ bụ ụda ákwá arịrị na Jeruselem.”+
20 “A gaghịzi enwe nwa ọhụrụ ga-anọ naanị ụbọchị ole na ole nwụọ n’ebe ahụ.
A gaghịkwa enwe agadi nke na-akaghị ezigbo nká nwụọ.
N’ihi na onye nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ ka bụ nwata.
Ọ bụrụgodị na onye mmehie dị otu narị afọ, ọ ga-anwụ n’ihi ọnụ a bụrụ ya.*
21 Ha ga-arụ ụlọ, birikwa na ha.+
Ha ga-akọ ubi vaịn, rie ihe si na ya.+
22 Ha agaghị arụ ụlọ, onye ọzọ ebichie ya,
Ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ihe si na ya.
N’ihi na ndị m ga-anọ ogologo ndụ otú osisi si anọ.+
Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.
24 Tupudị ha akpọkuo m, m ga-aza ha.
Mgbe ha ka kpụ okwu n’ọnụ, m ga-eme ihe ha na-arịọ.
25 Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga na-atakọ ahịhịa.
Ọdụm ga na-ata okporo ọka dị ka ehi.+
Ájá ga-abụ nri agwọ.
Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́. Ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m niile.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
66 Jehova kwuru, sị:
“Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ihe m ji gbakwasị ụkwụ m.+
Oleezi ụdị ụlọ unu ga-arụrụ m?+
Oleekwa ebe unu ga-arụrụ m ụlọ m ga-ebi?”+
Ma, ụdị onye m ga-achọ bụ onye dị umeala n’obi
3 Onye na-egbu oké ehi dị m ka onye na-egbu mmadụ.+
Onye ji atụrụ na-achụ àjà dị m ka onye na-agbaji nkịta olu.+
Onye na-enye onyinye dị m ka onye ji ọbara ézì achụ àjà.+
Onye na-eji frankinsens achụ àjà ka e nwee ihe a ga-eji ya na-echeta+ dị m ka onye ji okwu ndị na-eme anwansi* na-agọzi mmadụ.*+
Ha ahọrọla otú ha ga na-esi akpa àgwà.
Ihe a na-asọ oyi na-amasịkwa ha.*
4 N’ihi ya, m ga-ahọrọ otú m ga-esi taa ha ahụhụ.+
M ga-emekwa ka ihe ha na-atụ ụjọ ya mee ha.
N’ihi na mgbe m kpọrọ òkù, e nweghị onye zara.
Mgbe m kwuru okwu, e nweghị onye gere ntị.+
Ha nọ na-eme ihe dị njọ n’anya m,
Ha họkwaara ịna-eme ihe na-adịghị mụ mma.”+
5 Ndị na-ama jijiji n’ihi* okwu Jehova, nụrụnụ ihe o kwuru:
“Ụmụnne unu, bụ́ ndị kpọrọ unu asị, ndị na-agụpụkwa unu n’ihi aha m, na-eme ihu abụọ, na-asị, ‘Ka otuto dịrị Jehova!’+
Ma, Chineke ga-apụta ma mee ka unu ṅụrịa ọṅụ.
Ọ bụkwa hanwa ka ihere ga-eme.”+
6 E nwere mkpọtụ na-eme n’obodo, mkpọtụ nke na-eme n’ụlọ nsọ.
Ọ bụ mkpọtụ nke na-eme mgbe Jehova na-ata ndị iro ya ahụhụ e kwesịrị ịta ha.
7 Tupu ime amalite ime Zayọn, ọ mụrụ nwa.+
Tupu ime emewe ya, ọ mụrụ nwa nwoke.
8 Ònye nụtụrụla ụdị ihe a?
Ònye hụtụrụla ụdị ihe ndị a?
À ga-amụ ala n’otu ụbọchị?
Ka à ga-amụ mba n’otu mgbe?
Ma, ozugbo ime mere Zayọn, ọ mụrụ ụmụ ya ndị nwoke.
9 Jehova kwuru, sị, “M̀ ga-eme ka akpa nwa meghee ma ghara ime ka a mụpụta nwa?”
Chineke gị kwukwara, sị, “M̀ ga-eme ka e bido ịmụ nwa ma mechie akpa nwa?”
10 Ndị niile hụrụ Jeruselem n’anya,+ soronụ ya ṅụrịa ọṅụ, sorokwanụ ya na-enwe aṅụrị.+
Ndị niile na-eruru ya uju, soronụ ya na-enwe ezigbo obi ụtọ,
11 N’ihi na otú ahụ nwaanyị si enye nwa ya ara, nyejuo ya afọ, ka Jeruselem ga-esi lekọta unu.
N’eziokwu, afọ ga-eju unu, obi ga-abụkwa unu sọ aṅụrị maka na e meela ka Jeruselem dị ebube.
12 N’ihi na Jehova kwuru, sị:
“M ga-eme ka udo ga-adị na ya hie nne ka osimiri,+
Jirikwa akụ̀ mba niile mee ka ọ dị ebube ka iyi toro eto.+
A ga-elekọta unu, kuru unu n’akụkụ.
A ga-ekukwasịkwa unu n’ikpere, na-atụli unu elu, na-aghọrọ.
M ga-akasikwa unu obi n’ihi Jeruselem.+
14 Unu ga-ahụ ihe a, obi ga-atọkwa unu ụtọ.
Ọkpụkpụ unu ga-agbasi ike, dị mma n’anya ka ahịhịa na-epulite ọhụrụ.
A ga-emekwa ka ndị ohu Jehova hụ otú aka ya si akpa ike.
Chineke ga-amakwa ndị iro ya ikpe.”+
Ụgbọ ịnyịnya ya yiri ifufe mmiri.+
Ọ ga-eji iwe bịa kwụọ ha ụgwọ ihe ha mere.
Ọ ga-eji ire ọkụ baara ha mba.+
16 N’ihi na Jehova ga-eji ọkụ kpee ikpe.
Ọ ga-ejikwa mma agha ya kpee mmadụ* niile ikpe.
Jehova ga-egbukwa ọtụtụ ndị.
17 “Ndị na-edo onwe ha nsọ, ndị na-asachakwa onwe ha iji banye n’ubi*+ ndị dị n’azụ ubi nke dị n’etiti, ndị na-eri anụ ézì+ na ihe ndị a na-asọ oyi nakwa òké,+ ha niile ga-ala n’iyi.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. 18 “Ebe ọ bụ na m ma ọrụ ha na ihe ha na-eche n’echiche, m na-abịa ịkpọkọta mba niile na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha ga-abịakwa hụ ebube m.”
19 “M ga-edowere ha ihe àmà. M ga-ezikwa ụfọdụ n’ime ndị na-enweghị ihe mere ha ka ha gaa mba dị iche iche, ebe e nwere ndị bụ́ ọkà n’ịgba ụta, ya bụ, ndị Tashish,+ ndị Pul, na ndị Lọd.+ M ga-ezikwa ha ka ha gakwuru ndị Tubal na ndị Jevan,+ nakwa ndị bi n’agwaetiti ndị dị anya, ndị na-anụbeghị akụkọ gbasara m, ndị na-ahụbeghịkwa ebube m. Ha ga-akọkwara mba niile akụkọ ebube m.+ 20 Ha ga-esi ná mba niile jiri ịnyịnya, ụgbọ ịnyịnya, ụgbọala ndị e mechiri elu ha emechi, jakị, na kamel ndị na-awụ ọsọ bute ụmụnne unu niile+ n’ugwu nsọ m, bụ́ Jeruselem, ka ha bụrụ onyinye a ga-enye Jehova, otú ahụ ndị Izrel na-eji arịa dị ọcha ebubata onyinye n’ụlọ Jehova.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
21 Jehova kwukwara, sị, “M ga-akpọrọkwa ụfọdụ n’ime ha ka ha bụrụ ndị nchụàjà na ndị Livaị.”
22 Jehova kwuru, sị, “Dị ka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ+ m na-eke ga-adịgide n’ihu m, otú ahụ ka ụmụ* unu na aha unu ga-adịgidekwa.”+
23 Jehova kwukwara, sị, “Malite n’ọnwa ọhụrụ ruo n’ọnwa ọhụrụ, malitekwa n’ụbọchị izu ike ruo n’ụbọchị izu ike,
24 “Ha ga-agakwa na-ele ozu nke ndị ahụ nọ na-enupụrụ m isi.
N’ihi na ikpuru gbara ha agaghị anwụ anwụ,
Ọkụ na-ere ha agaghịkwa anyụ anyụ.+
Ha ga na-asọkwa mmadụ* niile oyi.”
Aịzaya pụtara “Nzọpụta Jehova.”
Ma ọ bụ “onyenwe ha.”
Ma ọ bụ “ná ntụziaka.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “majik.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Ma ọ bụ “na-egbu ọchụ.”
Ma ọ bụ “Iri ngarị.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
O nwere ike ịbụ na osisi na ubi a na-ekwu gbasara ha ebe a bụ ndị a na-anọ ekpere arụsị.
Ma ọ bụ “kwuo ihe a ga-eme.”
Ma ọ bụ “majik.”
Ma ọ bụ “Onye na-eji imi ya eku ume.”
Ma ọ bụ “onye na-agwọ unu.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “ana-agbatị olu ha.”
Ma ọ bụ “uwe ime ha.”
Ya bụ, ka a ghara ịna-akọ ha ọnụ maka na ha alụghị di, nakwa na ha amụghị nwa.
Na Hibru, “nsị.”
Bat bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.
Homa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “kpebiri.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “Ha dịkwa njikere ịgba ụta ha.”
Na Hibru, “Ụda olu onye na-akpọ òkù.”
Na Hibru, “E meela ka m dere duu.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”
O nwere ike ịbụ, “o.”
Shia-jeshọb pụtara “Naanị Ndị Fọdụrụ Ga-alọta.”
Ma ọ bụ “kụtuo mgbidi ya.”
O nwere ike ịbụ, “yie ya egwu.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ịmanuel pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.”
Na Hibru, “mkpịsị akwụkwọ mmadụ.”
O nwere ike ịbụ na Meha-shalal-hash-baz pụtara “Ịgbaga Ngwa Ngwa n’Ebe A Ga-akwata Ihe, Ịbịa Ngwa Ngwa n’Ebe A Ga-akwakọrọ Ihe.”
Ma ọ bụ “gbaa akaebe.”
Na Hibru, “M wee garuo onye amụma nwaanyị nso.”
Shaịloa bụ okpo mmiri.
Gụọ Aịza. 7:14.
Ma ọ bụ “Keenụ ájị̀ n’ume.”
Okwu Hibru bụ́ Ịmanuel pụtara “Chineke nọnyeere anyị.” Gụọ Aịza. 7:14; 8:8.
Ma ọ bụ “ihe akaebe ahụ.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “n’ihe akaebe ahụ.”
Ma ọ bụ “Ọchịchị nwa eze.”
Na Hibru, “ga-adị n’ubu ya.”
Na Hibru, “n’azụ.”
O nwere ike ịbụ, “igu nkwụ na ahịhịa amị.”
Ma ọ bụ “ụmụ na-enweghị nne na nna.”
Ma ọ bụ “ụmụ na-enweghị nne na nna.”
Ma ọ bụ “a ga-ata unu ahụhụ.”
Ma ọ bụ “ebube.”
Ya bụ, ndị Asiria.
Ma ọ bụ “Ahụhụ a o kpebiri ịta unu.”
Mmanụ a nwere ike ịbụ ụdị nke e ji ete ndị eze mmanụ ma ọ bụkwanụ ụdị nke a na-agbanye na mpanaka.
Ma ọ bụ “ngwá ọrụ e ji ígwè kpụọ.”
Ya bụ, ome a kpọrọ aha n’amaokwu nke mbụ.
Wolf bụ anụ ọhịa na-eri anụ ndị ọzọ. O yiri nkịta ọhịa, ma ọ na-aka ya ibu.
O nwere ike ịbụ, “Nwa ehi na ọdụm ga-erikọ nri ọnụ.”
Ma ọ bụ “Mba niile ga na-achọ ya.”
Ma ọ bụ “n’Etiopia.”
Ya bụ, Babịlonia.
Ma ọ bụ “n’akụkụ anọ nke ụwa.”
O nwere ike ịbụ, “ga-eme ka oké osimiri Ijipt taa.”
Ma ọ bụ “mmụọ.”
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Na Hibru, “ndị m doro nsọ.”
O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Ọrayọn nakwa ndị ọzọ gbara ya gburugburu.
Ma ọ bụ “ọlaedo Ofa.”
Ya bụ, ụmụ okorobịa Babịlọn.
Ma ọ bụ “ihe e ji chọọ alaeze niile mma.”
Ndị Kaldia bụ ndị Babịlọn.
O nwere ike ịbụ, “Ndị mmụọ ọjọọ yiri ewu.”
Ma ọ bụ “zuru ike.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “ndị dị ka mkpi chịrị ụwa.”
Ma ọ bụ “Nganga gị na ụda ụbọ akwara gị dịzi n’ili.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “alaka.”
Na Hibru, “M ga-ejikwa ázị́zà e ji ala ihe n’iyi zaa ya.”
Ma ọ bụ “agwọ ọjọọ nke na-efe ọsọ.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ha.”
O nwere ike ịbụ, “N’ihi na a na-etizi mkpu agha maka mkpụrụ osisi mịịrị unu n’oge ọkọchị nakwa n’ihi na unu na-ewe ihe ubi.”
Ma ọ bụ “A ga-agụ afọ atọ a otú onye e goro ọrụ si asa anya na mmiri agụ oge”; ya bụ, ọ ga-abụrịrị afọ atọ ahụ.
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Dowekwa chi ndị mba ọzọ.”
O nwere ike ịbụ, “M ga-anọ jụụ nọrọ ebe m bi na-ele anya.”
Ma ọ bụ “Memfis.”
Ma ọ bụ “ọchịagha ya.”
Ya bụ, “e nweghị ezigbo ihe o yi.”
Na Hibru, “a ga-agba Ijipt ọtọ.”
Ma ọ bụ “na-ajakwa Ijipt mma maka otú o si maa mma.”
O nwere ike ịbụ na Babịlonia oge ochie.
O nwere ike ịbụ Babịlọn.
Na Hibru, “ka úkwù na-egbu m ezigbo mgbu.”
Na Hibru, “nwa.”
Duma pụtara “Idere Duu.”
Ma ọ bụ “A ga-agụ otu afọ a otú onye e goro ọrụ si asa anya na mmiri agụ oge”; ya bụ, ọ ga-abụrịrị otu afọ ahụ.
O nwere ike ịbụ Jeruselem.
Ma ọ bụ “Ndị na-agba ịnyịnya.”
Ma ọ bụ “obí.”
Na Hibru, “ebe ọ ga-ebi.”
Ma ọ bụ “ikike.”
Ma ọ bụ “alaka.”
Ya bụ, otu n’ime iyi ndị na-asọba n’Osimiri Naịl.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Na-ewebatakwa uru mba dị iche iche na-erite.”
Na Hibru, “ụmụ nwaanyị na-amaghị nwoke.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Tashish.”
O nwere ike ịbụ, “ọdụ ụgbọ mmiri.”
Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Saịdọn.”
Ma ọ bụ “ụwa.”
O nwere ike ịbụ, “akpọọla nkụ.”
Ma ọ bụ “ọgbụgba ndụ oge ochie.”
O nwere ike ịbụ, “ataala.”
Ma ọ bụ “n’ebe ọdịda anyanwụ.”
Na Hibru, “n’anya ndị okenye ya.”
Ma ọ bụ “mmanya doro edo.”
Na Hibru, “ọ ga-elo.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-elo ọnwụ.”
O nwere ike ịbụ, “ndị obi kara ime ihe ha chọrọ ime.”
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Na Hibru, “ndị bi n’ebe dị elu, bụ́ obodo dị elu.”
Ma ọ bụ “n’ụzọ dị larịị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Ozu m.”
O nwere ike ịbụ, “igirigi na-ada n’ahịhịa (malo).”
Ma ọ bụ “ga-amụpụtakwa ndị na-adịghị ndụ.”
Na Hibru, “ọbara ndị a wụfuru.”
Na Hibru, “Levayatan.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ Izrel, e jikwa ya tụnyere ubi vaịn.
Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ Sameria bụ́ isi obodo ha ka a na-ekwu gbasara ya.
Ma ọ bụ “dị mpako; na-akpa nganga.”
Ma ọ bụ “dị mpako; na-akpa nganga.”
Ma ọ bụ “Eriri e ji atụ̀ ihe n’elu eriri e ji atụ̀ ihe, eriri e ji atụ̀ ihe n’elu eriri e ji atụ̀ ihe.”
Ndị isi okpukpe weere na ozi Aịzaya na-ezi ndị mmadụ na-ada ka otu ihe a na-ekwughachi ugboro ugboro, na-adakwa ka ihe ụmụaka.
Ma ọ bụ “Eriri e ji atụ̀ ihe n’elu eriri e ji atụ̀ ihe, eriri e ji atụ̀ ihe n’elu eriri e ji atụ̀ ihe.”
Ndị isi okpukpe weere na ozi Aịzaya na-ezi ndị mmadụ na-ada ka otu ihe a na-ekwughachi ugboro ugboro, na-adakwa ka ihe ụmụaka.
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ, “Ha ghọta ihe e kwuru, ezigbo ụjọ ga-ejide ha.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ụwa niile.”
Ma ọ bụ “na-adọ mmadụ aka ná ntị.”
Ma ọ bụ “nzube.”
Ma ọ bụ “Onye amamihe ya na-enweghị atụ.”
O nwere ike ịbụ na Ariel pụtara “Ebe A Na-anọ Achụrụ Chineke Àjà.” O nwere ike ịbụ na Jeruselem.
Na Hibru, “ndị ị na-amaghị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “ndụmọdụ.”
Ma ọ bụ “Unu rụrụ arụ.”
Na Hibru, “onye na-adọ mmadụ aka ná ntị.”
Ya bụ, ihu ya agaghịkwa agbarụ n’ihi ihere e menyere ya na n’ihi ihu e mechuru ya.
Na Hibru, “na-achụ àjà e ji mmanya achụ.” O nwere ike ịbụ iji gosi na e nweela otu olu.
Na Hibru, “ka ha gbaba ebe Fero rụsiri ike.”
Ma ọ bụ “agwọ ọjọọ nke na-efe ọsọ.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
O nwere ike ịbụ, “n’olulu mmiri.”
Ma ọ bụ “ọ na-agụ Jehova agụụ.”
Na Hibru, “Ọ.”
O nwere ike ịbụ, “Unu ruru unyi.”
Na Hibru, “Aha Jehova.”
Ma ọ bụ “Ume.”
Na Hibru, “ka ihe na-abaghị uru ọ bụla.”
Ma ọ bụ “na-edo onwe unu nsọ maka.”
E ji “Tofet” tụnyere ebe ọkụ na-ere, nke e ji ama atụ mbibi.
Na Hibru, “Ọ.”
Ma ọ bụ “ndị na-agba ịnyịnya.”
Ma ọ bụ “ọkụ.”
Na Hibru, “Ire ndị nsụ.”
Ma ọ bụ “na-emesapụ aka.”
Ma ọ bụ “kwụsị ịsọpụrụ Chineke, sọpụwara chi ọzọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “imesapụ aka.”
Ya bụ, “ndị Asiria.”
Ma ọ bụ “ike.”
Ya bụ, “ndị Asiria.”
Ya bụ, onye iro emebiela.
O nwere ike ịbụ, “akpọọla nkụ.”
Na Hibru, “ịwụfu ọbara.”
Ma ọ bụ “ga-atụgharị uche n’ihe.”
Ma ọ bụ “Ana m arịa ọrịa.”
Ma ọ bụ “ga na-asọ asọ n’ugwu.”
O nwere ike ịbụ Bọzra, bụ́ isi obodo Ịdọm.
Ma ọ bụ “Ikwiikwii nwere ntị ogologo.”
Na Hibru, “Chineke ga-eji eriri e ji atụ̀ ihe nakwa nkume.”
O nwere ike ịbụ, “Mmụọ ọjọọ yiri ewu.”
Ya bụ, nnụnụ yiri ikwiikwii.
Na Hibru, “na-eji eriri e ji atụ̀ ihe ekere ha ya.”
Na Hibru, “Ire onye ogbi.”
Ma ọ bụ “onyeisi ndị na-ebutere eze ihe ọ na-aṅụ.”
Ma ọ bụ “obí.”
Ma ọ bụ “ndị Siria.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “obí.”
Ma ọ bụ “obí.”
Ma ọ bụ “mkparị.”
Na Hibru, “E nwere mmụọ m ga-etinye n’ime ya.”
Na Hibru, “ya.”
O nwere ike ịbụ, “n’etiti.”
Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Zayọn.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Jeruselem.”
Ma ọ bụ “ọwa mmiri niile nke Osimiri Naịl Ijipt taa.”
Na Hibru, “m mere.”
Ya bụ, Hezekaya.
Ma ọ bụ “ihe ọka wit ndị dapụrụ adapụ mịrị.”
O nwere ike ịbụ na a na-eji ebe e si arịgo n’ụlọ agụ oge, otú e si eji onyinyo agụ oge ma anwụ chawa.
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
“Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
O nwere ike ịbụ, “okwolo.”
Ma ọ bụ “ezigbo nsogbu mkpụrụ obi m nọbu na ya.”
Ma ọ bụ “okwu gị na ihe ndị i mere.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “I wepụrụ mmehie m niile n’ihu gị.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “so ndị ahụ wetara ihe ndị ahụ ṅụrịa ọṅụ.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “n’obí.”
Ma ọ bụ “ma ọ bụrụ na udo na eziokwu ga-adị.”
Na Hibru, “n’ụbọchị m.”
Ma ọ bụ “Na-agụgụnụ ndị bi na Jeruselem obi.”
Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
Ya bụ, malite ná mkpịsị aka ukwu ruo na nke nta ma a gbasaa aka. Gụọ B14.
O nwere ike ịbụ, “Ònye ghọtara otú mmụọ Jehova si arụ ọrụ.”
Ma ọ bụ “ndị ọchịchị.”
Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
Ma ọ bụ “nọrọnụ jii n’ihu m.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “ihe mbụ niile.”
Ma ọ bụ “Ka obi anyị dịrị na ha.”
Ma ọ bụ “ndị osote onye na-achị achị.”
Ma ọ bụ “adịghị adị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
Ma ọ bụ “ná ntụziaka.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “unu bụ ohu m.”
Ma ọ bụ “tụkwasịkwa m obi.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “isi unu na-enupụ.”
O nwere ike ịbụ ndị na-akụziri ha Iwu Chineke.
Ma ọ bụ “kemgbe a mụrụ gị.”
Jeshurọn pụtara “Onye Ezi Omume.” Ihe a bụ aha a na-etu Izrel iji kwanyere ya ùgwù.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “n’ihu arụsị.”
Na Hibru, “Obi ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “ndị amụma ụgha.”
Na Hibru, “tọpụ ndị eze ihe ha kere n’úkwù.”
Na Hibru, “M ga-eke gị ihe n’úkwù.”
Ma ọ bụ “Onye kpụrụ.”
Ma ọ bụ “Onye kpụrụ ya.”
O nwere ike ịbụ, “Ka ụrọ ò kwesịrị ịsị: ‘Ihe ị kpụrụ enweghị aka’?”
Ma ọ bụ “Ọ̀ bụ ime gịnị na-eme gị?”
O nwere ike ịbụ, “Ndị ọrụ.”
O nwere ike ịbụ, “ndị ahịa.”
Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”
O nwere ike ịbụ, “ka ọ tọgbọrọ nkịtị.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “ihe mbụ.”
Ma ọ bụ “m zubere.”
Ma ọ bụ “m zubere.”
Na Hibru, “Ada na-amaghị nwoke bụ́ Babịlọn.”
Na Hibru, “Ada bụ́ ndị Kaldia.”
O nwere ike ịbụ, “M gaghịkwa emere mmadụ ọ bụla ebere.”
Na Hibru, “Ada bụ́ ndị Kaldia.”
O nwere ike ịbụ, “N’agbanyeghị.”
Ma ọ bụ “Ị gaghịkwa ama otú ị ga-esi jiri anwansi gbochie ya.”
O nwere ike ịbụ, “Ha na-ekewasị eluigwe; Ndị ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Na Hibru, “n’ebe nke ya.”
Na Hibru, “Ndị si na mmiri Juda pụta.”
Na Hibru, “ihe ndị mbụ.”
Na Hibru, “Olu unu bụ akwara ígwè.”
Na Hibru, “egedege ihu unu bụkwa ọla kọpa.”
Na Hibru, “ka e kere ha.”
Ma ọ bụ “nyochaa.” O nwere ike ịbụ, “họrọ.”
Ya bụ, Saịrọs.
Ma ọ bụ “ezipụla mụ na.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”
Na Hibru, “malite mgbe m nọ n’afọ.”
Ma ọ bụ “Jehova ga-ekpere m ikpe ziri ezi.”
O nwere ike ịbụ, “N’ugwu ahịhịa na-adịghị.”
Na Hibru, “n’obi.”
Na Hibru, “Ha ga-aracha ájá dị n’ụkwụ gị.”
Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
Na Hibru, “Aka m ọ̀ dị mkpụmkpụ nke na ọ gaghị agbapụtali unu?”
Na Hibru, “enyela m ire nke ndị a kụziiri ihe, ka m wee mara.”
O nwere ike ịbụ, “okwu ga-agba ya ume.”
Na Hibru, “na-akpọte.”
Na Hibru, “Emeela m ka ihu m sie ike ka nkume siri ike.”
Ma ọ bụ “ga-alụso m ọgụ.”
Ma ọ bụ “ka mụ na ya nọrọ ihu na ihu.”
N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.
Ma ọ bụ “onye ime mesiri ike ya amụọ unu.”
Na Hibru, “ga-akasi ebe niile e bibiri ebibi obi.”
Ma ọ bụ “aka.”
Ma ọ bụ “aka.”
Ma ọ bụ “ntụziaka.”
N’Izrel, ụdị egu a na-atakasị ákwà. Ọ na-emecha nwee nku anọ, yizie urukurubụba.
O nwere ike ịbụ, “Ọtị.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “Yiri ike gị dị ka uwe.”
O nwere ike ịbụ, “n’ihe anyị nụrụ?”
Na Hibru, “aka.”
“Ya” nwere ike ịbụ onye nọ mgbe ihe a na-eme. “Ya” nwekwara ike ịbụ Chineke.
O nwere ike ịbụ, “O yiri onye ndị mmadụ na-anaghị ekwe ele anya n’ihu.”
Ma ọ bụ “gbasara ndụ onye ahụ?”
Ma ọ bụ “E tigburu ya.”
Ma ọ bụ “o nweghị onye o tiri ihe.”
Na Hibru, “onye ọgaranya.”
Ma ọ bụ “Ma, ọ masịrị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “ihe masịrị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “onyenwe.”
Ma ọ bụ “onyenwe.”
Na Hibru, “onye ihe wutere na mmụọ.”
Ma ọ bụ “m ga-egosi gị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “akwụsị igosi gị ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “na-enwu ọkụ.”
Ma ọ bụ “nkume pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ego unu tara ahụhụ kpata.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “akwụsị igosi ya ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ihe bụ́ uche m.”
O nwere ike ịbụ, “na-aghọta na ọ bụ ọdachi gburu onye ezi omume.”
Na Hibru, “n’àkwà ha.”
Ma ọ bụ “hà ga-akasi m obi?”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
Ma ọ bụ “ihe ndina.”
O nwere ike ịbụ otú e si ekpere arụsị.
O nwere ike ịbụ, “eze.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “ike anaghị agwụ gị.”
Ma ọ bụ “ma zochie ihe i mere.”
Ma ọ bụ “Onye na-ebi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
O nwere ike ịbụ ịkwa ndị ọzọ emo ma ọ bụ ibo ha ebubo.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ndị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Na Hibru, “ọkpụkpụ unu dị ike.”
Na Hibru, “mee ka ụkwụ unu laghachi azụ.”
Ma ọ bụ “ihe na-atọ unu ụtọ.”
Na Hibru, “Aka Jehova adịghị mkpụmkpụ nke na ọ gaghị azọpụtali unu.”
Na Hibru, “ire.”
Na Hibru, “Ụkwụ ha.”
Ma ọ bụ “Ịkwụwa aka ọtọ.”
Ma ọ bụ “Ịkwụwa aka ọtọ.”
Na Hibru, “ya adị njọ n’anya ya.”
Ma ọ bụ “o ji aka ya merie.”
Ma ọ bụ “uwe elu na-enweghị aka.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ nke mkpụrụ gị.”
Na Hibru, “Nwaanyị.”
Ma ọ bụ “ụlọ m mara mma.”
Ma ọ bụ “n’oghere ụlọ ha.”
Ma ọ bụ “ga-achọ gị mma.”
Ma ọ bụ “na-egosi ndị mmadụ ihu ọma ya.”
Ma ọ bụ “iji chọọ onwe ya mma.”
Ma ọ bụ “akụnụba.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Nwaanyị.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “ada bụ́ Zayọn.”
O nwere ike ịbụ, “uwe na-acha ọbara ọbara.”
Ya bụ, Chineke.
Ma ọ bụ “ọbara ọbara.”
Ma ọ bụ “m ji merie.”
Ma ọ bụ “Mmụọ ozi nọ n’ihu ya.”
Na Hibru, “ya.”
Ma ọ bụ “aka ya mara mma.”
Ma ọ bụ “mmiri miri emi.”
Ma ọ bụ “n’ala ịkpa.”
Ma ọ bụ “meere onwe gị aha mara mma.”
Ma ọ bụ “nke mara mma.”
Ma ọ bụ “mee.”
Na Hibru, “mee.”
Ma ọ bụ “ndị nwere ndidi ma chere.”
Na Hibru, “gbazee anyị.”
Ma ọ bụ “Mara mma.”
O nwere ike ịbụ, “n’obere ụlọ ndị ha na-anọ eche nche.”
Ma ọ bụ “ihe na-adịghị ọcha.”
O nwere ike ịbụ, “N’ihi na m ga-eme ka ị dị nsọ otú m dị.”
Na Hibru, “Ha bụ anwụrụ ọkụ bara m n’oghere imi.”
Na Hibru, “M ga-awụnye ụgwọ ọrụ ha n’obi ha.”
Na Hibru, “wụnye ụgwọ ọrụ ha n’obi uwe ha.”
Na Hibru, “ngọzi.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “na-eme ihe o kwuru.” Na Hibru, “Amen.”
Ma ọ bụ “na-eme ihe o kwuru.” Na Hibru, “Amen.”
Ma ọ bụ “nsogbu ha niile.”
O nwere ike ịbụ, “A ga-asị na mmadụ bụ onye a bụrụ ọnụ ma ọ bụrụ na ọ nọrughị otu narị afọ nwụọ.”
Ma ọ bụ “arụgbu onwe ha n’ọrụ n’efu.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “ya ana-echekwa gbasara.”
Ma ọ bụ “majik.”
O nwere ike ịbụ, “dị m ka onye na-eto arụsị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
Ma ọ bụ “Ndị na-eche gbasara.”
Na Hibru, “anụ ahụ́.”
Ya bụ, ubi ndị pụrụ iche a na-anọ ekpere arụsị.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
Ma ọ bụ “ka ha fee m.”
Na Hibru, “anụ ahụ́.”