ỌNỤ ỌGỤGỤ
1 Jehova gwakwara Mosis okwu n’ala ịkpa Saịnaị,+ n’ụlọikwuu nzute,+ n’abalị mbụ n’ọnwa nke abụọ, n’afọ nke abụọ ha pụtachara n’Ijipt.+ Ọ sịrị: 2 “Gụọnụ nzukọ Izrel niile ọnụ+ n’otu n’otu, ndị nke ọ bụla n’ezinụlọ ha, n’ọnụmara nke ha. Unu ga-agụ ụmụ nwoke niile ọnụ n’aha n’aha. 3 Gị na Erọn ga-edeba aha ndị dị afọ iri abụọ gbagowe n’akwụkwọ,+ bụ́ ndị nwere ike iso gaa agha n’Izrel. Unu ga-edeba aha ha n’akwụkwọ n’ìgwè ha n’ìgwè ha.
4 “Kpọrọnụ otu nwoke n’ebo nke ọ bụla. Onye ọ bụla n’ime ha ga-abụ onyeisi n’ọnụmara o si.+ 5 Ihe a bụ aha ụmụ nwoke ndị ga-enyere unu aka: n’ebo Ruben, Elaịzọ+ nwa Shedeọ; 6 n’ebo Simiọn, Shelumiel+ nwa Zurishadaị; 7 n’ebo Juda, Nashọn+ nwa Aminadab; 8 n’ebo Ịsaka, Netanel+ nwa Zua; 9 n’ebo Zebulọn, Elayab+ nwa Hilọn; 10 n’ime ụmụ Josef: n’ebo Ifrem,+ Elishama nwa Amaịhọd; n’ebo Manase, Gameliel nwa Pedazọ; 11 n’ebo Benjamin, Abidan+ nwa Gidionaị; 12 n’ebo Dan, Ahayiza+ nwa Amishadaị; 13 n’ebo Asha, Pegiel+ nwa Ọkran; 14 n’ebo Gad, Elayasaf+ nwa Duel; 15 n’ebo Naftalaị, Ahaịra+ nwa Inan. 16 Ọ bụ ndị a ka e si ná nzukọ Izrel kpọpụta. Ha bụ ndị isi+ n’ebo ndị nna ha, ndị isi nke puku kwuru puku ndị Izrel.”+
17 Mosis na Erọn wee kpọrọ ụmụ nwoke ndị a a kpọrọ aha. 18 Ha kpọkọtara nzukọ Izrel niile n’abalị mbụ n’ọnwa nke abụọ, ka ha deba aha ndị dị afọ iri abụọ gbagowe n’akwụkwọ n’otu n’otu, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara,+ 19 otú Jehova nyere Mosis n’iwu. O wee deba aha ha n’akwụkwọ n’ala ịkpa Saịnaị.+
20 E debara aha ụmụ Ruben, bụ́ ọkpara Izrel,+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ n’otu n’otu, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 21 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Ruben dị puku iri anọ na isii na narị ise (46,500).
22 E debara aha ụmụ Simiọn+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ n’otu n’otu, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 23 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Simiọn dị puku iri ise na itoolu na narị atọ (59,300).
24 E debara aha ụmụ Gad+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 25 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Gad dị puku iri anọ na ise, narị isii na iri ise (45,650).
26 E debara aha ụmụ Juda+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 27 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Juda dị puku iri asaa na anọ na narị isii (74,600).
28 E debara aha ụmụ Ịsaka+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 29 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Ịsaka dị puku iri ise na anọ na narị anọ (54,400).
30 E debara aha ụmụ Zebulọn+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 31 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Zebulọn dị puku iri ise na asaa na narị anọ (57,400).
32 E debara aha ụmụ Josef, bụ́ ndị Ifrem mụrụ,+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 33 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Ifrem dị puku iri anọ na narị ise (40,500).
34 E debara aha ụmụ Manase+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 35 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Manase dị puku iri atọ na abụọ na narị abụọ (32,200).
36 E debara aha ụmụ Benjamin+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 37 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Benjamin dị puku iri atọ na ise na narị anọ (35,400).
38 E debara aha ụmụ Dan+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 39 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Dan dị puku iri isii na abụọ na narị asaa (62,700).
40 E debara aha ụmụ Asha+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 41 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Asha dị puku iri anọ na otu na narị ise (41,500).
42 E debara aha ụmụ Naftalaị+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. A gụrụ ụmụ nwoke niile ndị dị afọ iri abụọ gbagowe ọnụ, bụ́ ndị nwere ike ịga agha. 43 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Naftalaị dị puku iri ise na atọ na narị anọ (53,400).
44 Ọ bụ ndị a ka Mosis na Erọn na mmadụ iri na abụọ bụ́ ndị isi Izrel debara aha ha n’akwụkwọ. Onye nke ọ bụla ná ndị isi a nọchiri anya ọnụmara o si. 45 E debara aha ndị Izrel niile dị afọ iri abụọ gbagowe, bụ́ ndị nwere ike ịga agha n’Izrel, n’akwụkwọ. E debara aha ha n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara. 46 Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+
47 Ma, e debaghị aha ndị Livaị+ n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara mgbe e dere aha ndị Izrel ndị ọzọ.+ 48 Jehova gwara Mosis, sị: 49 “Ọ bụ naanị ebo Livaị ka ị na-agaghị edeba aha ha n’akwụkwọ. Agụnyekọtala ha ná ndị Izrel ndị ọzọ.+ 50 Ị ga-ahọpụta ndị Livaị ka ha na-elekọta ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya*+ na arịa ya niile na ihe niile a rụrụ maka ya.+ Ha ga na-ebu ụlọikwuu ahụ na arịa ya niile,+ ha ga na-ejekwa ozi na ya.+ Ha ga-ebi n’ụlọikwuu ha ndị ha ga-ama gburugburu ụlọikwuu ahụ.+ 51 Mgbe ọ bụla a ga-eburu ụlọikwuu ahụ gaa n’ebe ọzọ, ọ bụ ndị Livaị ga-atọtu ya.+ Mgbe ọ bụla a ga-akwụwa ụlọikwuu ahụ, ọ bụ ndị Livaị ga-akwụwa ya. Onye ọ bụla na-abụghị onye Livaị* bịara nso, a ga-egbu ya.+
52 “Onye Izrel ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe e kenyere ya. Nwoke ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe ìgwè ebo atọ nke ebo ya so na ya mara ụlọikwuu,+ n’ìgwè ha n’ìgwè ha. 53 Ndị Livaị ga-ebi n’ụlọikwuu ndị ha ga-ama gburugburu ụlọikwuu ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị na ya,* ka a ghara iwesa nzukọ Izrel iwe.+ Ọ bụkwa ndị Livaị ga na-elekọta ụlọikwuu ahụ igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.”+
54 Ndị Izrel mere ihe niile Jehova nyere Mosis n’iwu. Ha mere nnọọ otú ahụ.
2 Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 2 “Ndị Izrel ga-ama ụlọikwuu ha n’ebe ìgwè ebo atọ+ nke ebo ha so na ya mara ụlọikwuu. Nwoke ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe dị nso n’ebe e nwere ihe àmà na-egosi ọnụmara o si. Ha ga-ama ụlọikwuu ha gburugburu ụlọikwuu nzute, cheekwa ya ihu.
3 “Ndị ga-ama ụlọikwuu n’ebe ọwụwa anyanwụ n’ìgwè ha n’ìgwè ha bụ ìgwè ebo atọ nke Juda. Onyeisi ụmụ Juda bụ Nashọn+ nwa Aminadab. 4 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri asaa na anọ na narị isii (74,600).+ 5 Ndị ga-ama ụlọikwuu n’otu akụkụ ebo Juda bụ ebo Ịsaka. Onyeisi ụmụ Ịsaka bụ Netanel+ nwa Zua. 6 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri ise na anọ na narị anọ (54,400).+ 7 Ebo ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ nke ọzọ nke ebo Juda bụ ebo Zebulọn. Onyeisi ụmụ Zebulọn bụ Elayab+ nwa Hilọn. 8 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri ise na asaa na narị anọ (57,400).+
9 “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ná ndị agha nọ n’ìgwè Juda dị otu narị puku, iri puku asatọ na isii na narị anọ (186,400). Ọ bụ ha ga na-ebu ụzọ akwali.+
10 “Ndị ga-ama ụlọikwuu n’ebe ndịda n’ìgwè ha n’ìgwè ha bụ ìgwè ebo atọ nke Ruben.+ Onyeisi ụmụ Ruben bụ Elaịzọ+ nwa Shedeọ. 11 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri anọ na isii na narị ise (46,500).+ 12 Ndị ga-ama ụlọikwuu n’otu akụkụ ebo Ruben bụ ebo Simiọn. Onyeisi ụmụ Simiọn bụ Shelumiel+ nwa Zurishadaị. 13 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri ise na itoolu na narị atọ (59,300).+ 14 Ebo ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ nke ọzọ nke ebo Ruben bụ ebo Gad. Onyeisi ụmụ Gad bụ Elayasaf+ nwa Ruel. 15 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri anọ na ise, narị isii na iri ise (45,650).+
16 “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ná ndị agha nọ n’ìgwè Ruben dị otu narị puku, iri puku ise na otu, narị anọ na iri ise (151,450). Ọ bụ ha bụ ndị nke abụọ ga na-akwali.+
17 “Mgbe a ga-eburu ụlọikwuu nzute gaa n’ebe ọzọ,+ ụlọikwuu ndị Livaị ga-adị n’etiti ebe ndị ọzọ mara ụlọikwuu.
“Ọ bụ otú ha si maa ụlọikwuu ka ha ga na-esi aga mgbe ha na-aga ebe ọzọ.+ Onye nke ọ bụla ga-anọ n’ebe o kwesịrị ịnọ, n’ebe ìgwè ebo atọ nke ebo o so na ya nọ.
18 “Ndị ga-ama ụlọikwuu n’ebe ọdịda anyanwụ n’ìgwè ha n’ìgwè ha bụ ìgwè ebo atọ nke Ifrem. Onyeisi ụmụ Ifrem bụ Elishama+ nwa Amaịhọd. 19 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri anọ na narị ise (40,500).+ 20 Ebo Manase+ ga-ama ụlọikwuu n’otu akụkụ ebo Ifrem. Onyeisi ụmụ Manase bụ Gameliel+ nwa Pedazọ. 21 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri atọ na abụọ na narị abụọ (32,200).+ 22 Ebo ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ nke ọzọ nke ebo Ifrem bụ ebo Benjamin. Onyeisi ụmụ Benjamin bụ Abidan+ nwa Gidionaị. 23 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri atọ na ise na narị anọ (35,400).+
24 “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ná ndị agha nọ n’ìgwè Ifrem dị otu narị puku, puku asatọ na otu narị (108,100). Ọ bụ ha bụ ndị nke atọ ga na-akwali.+
25 “Ndị ga-ama ụlọikwuu n’ebe ugwu n’ìgwè ha n’ìgwè ha bụ ìgwè ebo atọ nke Dan. Onyeisi ụmụ Dan bụ Ahayiza+ nwa Amishadaị. 26 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri isii na abụọ na narị asaa (62,700).+ 27 Ndị ga-ama ụlọikwuu n’otu akụkụ ebo Dan bụ ebo Asha. Onyeisi ụmụ Asha bụ Pegiel+ nwa Ọkran. 28 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri anọ na otu na narị ise (41,500).+ 29 Ebo ga-ama ụlọikwuu n’akụkụ nke ọzọ nke ebo Dan bụ ebo Naftalaị. Onyeisi ụmụ Naftalaị bụ Ahaịra+ nwa Inan. 30 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ya na-aga agha dị puku iri ise na atọ na narị anọ (53,400).+
31 “Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ka ha soro ná ndị agha nọ n’ìgwè Dan dị otu narị puku, iri puku ise na asaa na narị isii (157,600). Ọ bụ ha bụ ndị ikpeazụ ga na-akwali+ n’ìgwè ebo atọ ebo atọ e nwere n’Izrel.”
32 Ọ bụ ndị a bụ ndị Izrel e debara aha ha n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara ha. Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ ná ndị bi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, bụ́ ndị nwere ike ịga agha, dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise (603,550).+ 33 Ma e debaghị aha ndị Livaị n’akwụkwọ+ mgbe e dere aha ndị Izrel ndị ọzọ,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 34 Ndị Izrel mere ihe niile Jehova nyere Mosis n’iwu. Ọ bụ otú ahụ ka ha si maa ụlọikwuu ha n’ìgwè ebo atọ ebo atọ ha.+ Ọ bụkwa otú ahụ ka ha si akwali,+ ndị nke ọ bụla n’ezinụlọ ha nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara.
3 Ndị a bụ ndị ezinụlọ* Erọn na Mosis mgbe Jehova gwara Mosis okwu n’Ugwu Saịnaị.+ 2 Ihe a bụ aha ụmụ Erọn ndị nwoke: Nedab bụ́ ọkpara, na Abaịhu,+ Elieza,+ na Ịtama.+ 3 Ihe a bụ aha ụmụ Erọn ndị nwoke. Ọ bụ ha bụ ndị nchụàjà e tere mmanụ, ndị a họpụtara ka ha bụrụ ndị nchụàjà.+ 4 Ma, Nedab na Abaịhu nwụrụ n’ihu Jehova mgbe ha chụrụ àjà* iwu na-akwadoghị n’ihu Jehova+ n’ala ịkpa Saịnaị. E nweghị onye n’ime ha mụtara nwa. Ma Elieza+ na Ịtama+ nọ na-arụ ọrụ nchụàjà, ha na Erọn nna ha.
5 Jehova gwaziri Mosis, sị: 6 “Kpọta ndị si n’ebo Livaị,+ meekwa ka ha guzo n’ihu Erọn onye nchụàjà. Ha ga na-ejere ya ozi.+ 7 Ha ga na-arụrụ Erọn ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ya, na-arụkwara nzukọ Izrel niile ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ha n’ihu ụlọikwuu nzute. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eje ozi dị iche iche gbasara ụlọikwuu. 8 Ha ga na-elekọta arịa niile+ e ji eje ozi n’ụlọikwuu nzute, na-arụkwara ndị Izrel ọrụ ha kwesịrị ịrụrụ ha. Otú ha ga-esi eme ya bụ ịna-eje ozi dị iche iche gbasara ụlọikwuu ahụ.+ 9 Ị ga-akpọrọ ndị Livaị kpọnye Erọn na ụmụ ya ndị nwoke. Ha bụ ndị e si ná ndị Izrel nye ya.+ 10 Ị ga-ahọpụta Erọn na ụmụ ya ndị nwoke. Ha ga na-arụ ọrụ nchụàjà ha.+ Onye ọ bụla na-abụghị onye nchụàjà* bịara nso, a ga-egbu ya.”+
11 Jehova gwakwara Mosis, sị: 12 “M si ná ndị Izrel na-akpọrọ ndị Livaị ka ha nọchie anya nwa ọ bụla ndị Izrel bu ụzọ mụọ.*+ Ndị Livaị ga-abụ nke m. 13 N’ihi na ọ bụ m nwe nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ.+ Ọ bụ n’ụbọchị m gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt+ ka m mere ka nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Izrel dịrị m nsọ, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ.+ Ha ga-abụ nke m. Abụ m Jehova.”
14 Jehova gwakwuru Mosis okwu n’ala ịkpa Saịnaị,+ sị: 15 “Deba aha ụmụ Livaị ndị nwoke n’akwụkwọ n’ọnụmara n’ọnụmara nakwa n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ị ga-edeba aha nwoke ọ bụla dị otu ọnwa gbagowe n’akwụkwọ.”+ 16 Mosis wee deba aha ha n’akwụkwọ otú Jehova nyere ya n’iwu. 17 Ihe a bụ aha ụmụ Livaị ndị nwoke: Geshọn, Kohat, na Meraraị.+
18 Ihe a bụ aha ụmụ Geshọn ndị nwoke n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Libnaị na Shimiaị.+
19 Ụmụ Kohat ndị nwoke n’ezinụlọ n’ezinụlọ bụ Amram, Izha, Hebrọn, na Ọziel.+
20 Ụmụ Meraraị ndị nwoke n’ezinụlọ n’ezinụlọ bụ Malaị+ na Mushaị.+
Ọ bụ ezinụlọ ndị a bụ ezinụlọ ndị Livaị, n’ọnụmara n’ọnụmara.
21 Ezinụlọ ụmụ Libnaị na ezinụlọ ụmụ Shimiaị si n’ezinụlọ Geshọn.+ Ọ bụ ha bụ ndị ezinụlọ ụmụ Geshọn. 22 Ụmụ nwoke ha niile ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe, dị puku asaa na narị ise (7,500).+ 23 Ndị ezinụlọ ụmụ Geshọn mara ụlọikwuu ha n’azụ ụlọikwuu ahụ,+ n’ebe ọdịda anyanwụ. 24 Onyeisi ọnụmara ụmụ Geshọn bụ Elayasaf nwa Leyel. 25 Ọrụ ụmụ Geshọn+ n’ụlọikwuu nzute bụ ilekọta ụlọikwuu ahụ na ákwà ya,+ ihe e ji kpuchie ya,+ ákwà ngebichi*+ dị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu nzute, 26 ákwà mgbochi+ ndị dị n’ogige ya, ákwà ngebichi*+ dị n’ọnụ ụzọ ogige ya nke gbara ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà gburugburu, ụdọ ndị e ji ejide ákwà ụlọikwuu ya, na ọrụ niile gbasara ihe ndị a.
27 Ezinụlọ ụmụ Amram, ezinụlọ ụmụ Izha, ezinụlọ ụmụ Hebrọn, na ezinụlọ ụmụ Ọziel si n’ezinụlọ Kohat. Ọ bụ ha bụ ndị ezinụlọ ụmụ Kohat.+ 28 Ụmụ nwoke ha niile ndị dị otu ọnwa gbagowe dị puku asatọ na narị isii (8,600). Ọrụ ha bụ ilekọta ebe nsọ.+ 29 Ndị ezinụlọ ụmụ Kohat mara ụlọikwuu ha n’ebe ndịda ụlọikwuu ahụ.+ 30 Onyeisi ọnụmara ezinụlọ ụmụ Kohat niile bụ Elizefan nwa Ọziel.+ 31 Ọrụ ha bụ ilekọta Igbe ahụ,+ tebụl,+ ihe e ji adọsa ọkụ,*+ ebe ịchụàjà+ ndị ahụ, arịa+ ndị e ji eje ozi n’ebe nsọ, ákwà ngebichi,*+ nakwa ọrụ niile gbasara ihe ndị a.+
32 Ọ bụ Elieza nwa Erọn onye nchụàjà bụ onyeisi ndị isi+ ụmụ Livaị niile. Ọ bụ ya na-elekọta ndị na-arụ ọrụ dị iche iche n’ebe nsọ.
33 Ezinụlọ ụmụ Malaị na ezinụlọ ụmụ Mushaị si n’ezinụlọ Meraraị. Ọ bụ ha bụ ndị ezinụlọ Meraraị.+ 34 Ụmụ nwoke ha niile ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe, dị puku isii na narị abụọ (6,200).+ 35 Onyeisi ọnụmara ezinụlọ Meraraị bụ Zuriel nwa Abihel. Ha mara ụlọikwuu ha n’ebe ugwu ụlọikwuu ahụ.+ 36 Ọrụ ụmụ Meraraị bụ ilekọta frem+ ụlọikwuu, okporo osisi ya,+ ogidi ya,+ ntọala ya ndị nwere oghere, arịa ya niile,+ na ọrụ niile gbasara ihe ndị a,+ 37 nakwa ogidi niile gbara ogige ya gburugburu na ntọala ha ndị nwere oghere,+ mkpọ́ ndị e ji ejide ákwà ogige ụlọikwuu, na ụdọ ndị e ji ejide ákwà ogige ya.
38 Ọ bụ Mosis na Erọn na ụmụ ya ndị nwoke mara ụlọikwuu ha n’ihu ụlọikwuu ahụ, n’ebe ọwụwa anyanwụ, n’ihu ụlọikwuu nzute. Ọ bụ ha na-elekọta ebe nsọ ahụ. Ọ bụ ọrụ ha na-arụrụ ndị Izrel. Onye ọ bụla na-abụghị onye Livaị* bịara nso, a ga-egbu ya.+
39 Ụmụ nwoke ndị Livaị niile Mosis na Erọn debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ otú Jehova nyere n’iwu, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe, dị puku iri abụọ na puku abụọ (22,000).
40 Jehova sịziri Mosis: “Deba aha ụmụ nwoke niile ndị Izrel bu ụzọ mụọ n’akwụkwọ, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe.+ Gụọ ha ọnụ ma dee aha ha. 41 Kpọpụta ndị Livaị ka ha bụrụ nke m, ka ha nọchie anya nwa ọ bụla ndị Izrel bu ụzọ mụọ.+ Kpụrụkwa anụ ụlọ ndị Livaị ka ha nọchie anya anụ niile anụ ụlọ ndị Izrel bu ụzọ mụọ.+ Abụ m Jehova.” 42 Mosis wee deba aha ụmụ niile ndị Izrel bu ụzọ mụọ n’akwụkwọ otú Jehova nyere ya n’iwu. 43 Ụmụ nwoke niile e bu ụzọ mụọ e debara aha ha n’akwụkwọ, bụ́ ndị dị otu ọnwa gbagowe, dị puku iri abụọ na abụọ, narị abụọ na iri asaa na atọ (22,273).
44 Jehova gwakwara Mosis, sị: 45 “Kpọrọ ndị Livaị ka ha nọchie anya ụmụ niile ndị Izrel bu ụzọ mụọ, kpụrụkwa anụ ụlọ ndị Livaị ka ha nọchie anya anụ ụlọ ha. Ndị Livaị ga-abụ nke m. Abụ m Jehova. 46 Iji gbara+ narị mmadụ abụọ na iri asaa na atọ (273) ndị Izrel bu ụzọ mụọ, bụ́ mmadụ ole ụmụ nwoke Izrel ji karịa ndị nke Livaị,+ 47 nata shekel* ise maka otu onye.+ Ọ bụ shekel dị n’ebe nsọ* ka ị ga-eji tụọ ya. Otu shekel bụ gira* iri abụọ.+ 48 Ị ga-enye Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ego ahụ ka ọ bụrụ ego e ji gbara mmadụ ole ndị Izrel ji karịa ha.” 49 Mosis wee nata ego ole e ji gbara mmadụ ole ahụ ndị Izrel ji karịa ndị Livaị. 50 Ọ natara ego ahụ e ji gbara ndị Izrel e bu ụzọ mụọ, ya bụ, otu puku shekel, narị atọ na iri isii na ise (1,365), ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ tụọ ya. 51 Mosis nyeziri Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ego ahụ e ji gbara ndị ahụ otú Jehova kwuru, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
4 Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 2 “A ga-agụ ụmụ Kohat ndị nwoke ọnụ+ n’ime ụmụ Livaị ndị nwoke, n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara, 3 malite ná ndị niile dị afọ iri atọ+ ruo afọ iri ise+ bụ́ ndị so n’ìgwè e kenyere ọrụ n’ụlọikwuu nzute.+
4 “Ihe a bụ ozi ụmụ Kohat ndị nwoke ga na-eje n’ụlọikwuu nzute.+ Ọ bụ ihe kacha nsọ: 5 Mgbe ndị Izrel na-akwaga ebe ọzọ, Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-abata tọtuo ákwà mgbochi+ dị nso n’igbe ọgbụgba ndụ ma were ya kpuchie igbe ọgbụgba ndụ ahụ.*+ 6 Ha ga-ewere ihe e ji akpụkpọ anụ sil mee kpuchie ya, werekwa ákwà na-acha anụnụ anụnụ sachie ya ma tinye okporo osisi ndị e ji ebu ya.+
7 “Ha ga-ewerekwa ákwà na-acha anụnụ anụnụ sachie tebụl a na-edosa achịcha a na-enye Chineke.+ Ha ga-edokwasịkwa n’elu ya efere, iko, ọkwá, na ihe mmiri ndị e ji awụsa àjà mmanya.+ Achịcha dị nsọ+ ga na-adị na tebụl ahụ mgbe niile. 8 Ha ga-ewere ákwà na-acha uhie uhie sachie ha, werekwa ihe e ji akpụkpọ anụ sil mee kpuchie ya ma tinye okporo osisi+ ndị e ji ebu ya. 9 Ha ga-ewerezi ákwà na-acha anụnụ anụnụ kpuchie ihe e ji adọsa ọkụ*+ na ọkụ* ya,+ mkpà ndị e ji ejide owu ya, ihe ndị e ji agụnye owu ya a mụrụ amụ,+ na ihe niile e ji agbanye mmanụ ọkụ ya ka ọkụ na-enwu na ya. 10 Ha ga-ewere ihe e ji akpụkpọ anụ sil mee fụchie ya na arịa ya niile ma dọkwasị ya n’okporo osisi a ga-eji ebu ya. 11 Ha ga-ewere ákwà na-acha anụnụ anụnụ sachie ebe ịchụàjà e ji ọlaedo mee,+ were ihe e ji akpụkpọ anụ sil mee kpuchie ya, tinyekwa okporo osisi ndị e ji ebu ya.+ 12 Ha ga-achịrịzi arịa niile+ ha ji eje ozi mgbe niile n’ebe nsọ chịkwasa n’ákwà na-acha anụnụ anụnụ ma were ihe e ji akpụkpọ anụ sil mee kpuchie ha, dọkwasịkwa ha n’okporo osisi a ga-eji ebu ha.
13 “Ha ga-ekpopụ ntụ* dị n’ebe ịchụàjà+ ahụ ma were ákwà e ji ajị anụ na-acha pọpụl kpaa sachie ebe ịchụàjà ahụ. 14 Ha ga-edokwasị arịa niile ha ji eje ozi n’ebe ịchụàjà ahụ n’elu ya: ihe ndị e ji agụnye ọkụ, ndụdụ ya, shọvel ya, na efere ya, ya bụ, arịa niile e ji eje ozi n’ebe ịchụàjà ahụ.+ Ha ga-ewere ihe e ji akpụkpọ anụ sil mee sachie ya ma tinye okporo osisi ndị e ji ebu ya.+
15 “Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-eji ihe sachichaa ebe nsọ ahụ+ na arịa niile e ji eje ozi n’ebe nsọ mgbe ndị Izrel na-akwaga ebe ọzọ. Ụmụ Kohat ndị nwoke ga-abatazi ka ha buru ha.+ Ma ha agaghị emetụ ebe nsọ ahụ aka ka ha ghara ịnwụ.+ Ihe ndị a bụ ọrụ ụmụ Kohat ndị nwoke ga na-arụ n’ụlọikwuu nzute.
16 “Elieza+ nwa Erọn onye nchụàjà ga na-ahụ maka mmanụ e ji amụ ọkụ,+ insens na-esi ísì ọma,+ àjà ọka a na-achụ mgbe niile, na mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ.+ Ọ bụ ya ga na-elekọta ụlọikwuu ahụ niile na ihe niile dị n’ime ya, ma ebe nsọ ahụ ma arịa ya niile.”
17 Jehova gwakwara Mosis na Erọn, sị: 18 “Unu ekwela ka e bibie ezinụlọ ụmụ Kohat+ ná ndị Livaị. 19 Kama, meerenụ ha ihe a ka ha dịrị ndụ ma ghara ịnwụ mgbe ha bịara n’ebe ihe ndị kacha nsọ dị.+ Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga-abata kenye onye ọ bụla n’ime ha ọrụ ọ ga-arụ na ihe ọ ga-ebu. 20 Ụmụ Kohat agaghị abata hụ ihe ndị dị nsọ, ha agaghịdị ahụpere ya ahụpere. Ọ bụrụ na ha abata hụ ha, ha ga-anwụ.”+
21 Jehova gwaziri Mosis, sị: 22 “A ga-agụ ụmụ Geshọn ndị nwoke ọnụ+ n’ọnụmara n’ọnụmara nakwa n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 23 Ị ga-edeba aha ndị niile dị malite n’afọ iri atọ ruo afọ iri ise n’akwụkwọ, bụ́ ndị so n’ìgwè e kenyere ije ozi n’ụlọikwuu nzute. 24 Ihe a bụ ọrụ e kenyere ezinụlọ ụmụ Geshọn ka ha na-arụ na ibu e kenyere ha ka ha na-ebu.+ 25 Ha ga na-ebu ákwà ụlọikwuu ahụ,+ ụlọikwuu nzute, ihe e ji kpuchie ya na ihe e ji akpụkpọ anụ sil mee e ji kpuchie ya,+ ákwà ngebichi* nke dị n’ọnụ ụzọ e si abata n’ụlọikwuu nzute,+ 26 na ákwà mgbochi ndị dị n’ogige ya,+ na ákwà ngebichi* dị n’ọnụ ụzọ ogige ahụ+ nke gbara ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà ahụ gburugburu, na ụdọ ndị e ji ejide ákwà ụlọikwuu ya na arịa ha niile na ihe niile e ji arụ ọrụ gbasara ya. Ọ bụ ihe a bụ ọrụ ha. 27 Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ga na-ahụ maka ọrụ niile ụmụ Geshọn+ ga na-arụ na ibu ndị ha ga na-ebu. Unu ga-ekenye ha ibu niile a ka ọ bụrụ ọrụ ha. 28 Ọ bụ ya bụ ọrụ ezinụlọ ụmụ Geshọn ga na-arụ n’ụlọikwuu nzute.+ Ọ bụ Ịtama nwa Erọn onye nchụàjà ga na-ahụ maka ọrụ ha na-arụ.+
29 “Ị ga-edeba aha ụmụ Meraraị+ ndị nwoke n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. 30 Ị ga-edeba aha ha n’akwụkwọ malite ná ndị niile dị afọ iri atọ ruo afọ iri ise, bụ́ ndị so n’ìgwè e kenyere ọrụ n’ụlọikwuu nzute. 31 Ọrụ ha ga na-arụ n’ihe gbasara ụlọikwuu nzute bụ ibu ihe ndị a:+ frem+ ụlọikwuu, okporo osisi ya,+ ogidi ya,+ ntọala ya ndị nwere oghere,+ 32 ogidi+ niile gbara ogige ya gburugburu, ntọala ha ndị nwere oghere,+ mkpọ́ ndị e ji ejide ákwà ogige ụlọikwuu,+ na ụdọ ndị e ji ejide ákwà ogige ya, na ngwongwo ha niile, na ọrụ niile gbasara ihe ndị a. Unu ga-ekenye onye ọ bụla n’ime ha ihe ọ ga na-ebu. 33 Ọ bụ ọrụ a ka ezinụlọ ụmụ Meraraị+ ga na-arụ n’ụlọikwuu nzute. Ọ bụ Ịtama nwa Erọn onye nchụàjà ga na-ahụ maka ọrụ ha na-arụ.”+
34 Mosis na Erọn na ndị isi+ nzukọ ahụ wee deba aha ụmụ Kohat+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara, 35 malite ná ndị niile dị afọ iri atọ ruo afọ iri ise, bụ́ ndị so n’ìgwè e kenyere ọrụ n’ụlọikwuu nzute.+ 36 Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ dị puku abụọ, narị asaa na iri ise (2,750).+ 37 Ọ bụ ndị a bụ ndị si n’ezinụlọ ụmụ Kohat e debara aha ha n’akwụkwọ, ya bụ, ndị niile na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute. Mosis na Erọn debara aha ha n’akwụkwọ otú Jehova si n’ọnụ Mosis nye iwu ka e mee.+
38 E debara aha ụmụ Geshọn+ n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara, 39 malite ná ndị niile dị afọ iri atọ ruo afọ iri ise, bụ́ ndị so n’ìgwè e kenyere ọrụ n’ụlọikwuu nzute. 40 Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara dị puku abụọ, narị isii na iri atọ (2,630).+ 41 Ọ bụ ndị a bụ ndị si n’ezinụlọ ụmụ Geshọn e debara aha ha n’akwụkwọ, ya bụ, ndị niile na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute. Mosis na Erọn debara aha ha n’akwụkwọ otú Jehova kwuru.+
42 E debara aha ụmụ Meraraị n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara, 43 malite ná ndị niile dị afọ iri atọ ruo afọ iri ise, bụ́ ndị so n’ìgwè e kenyere ọrụ n’ụlọikwuu nzute.+ 44 Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha n’ezinụlọ n’ezinụlọ dị puku atọ na narị abụọ (3,200).+ 45 Ọ bụ ndị a bụ ndị si n’ezinụlọ ụmụ Meraraị e debara aha ha n’akwụkwọ, ndị Mosis na Erọn debara aha ha n’akwụkwọ otú Jehova si n’ọnụ Mosis nye iwu ka e mee.+
46 Mosis na Erọn na ndị isi Izrel debara aha ndị Livaị niile a n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ọnụmara n’ọnụmara. 47 Ha dị malite n’afọ iri atọ ruo afọ iri ise. E kenyekwara ha niile ozi ha ga na-eje na ibu ha ga na-ebu n’ihe gbasara ụlọikwuu nzute.+ 48 Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku asatọ, narị ise na iri asatọ (8,580).+ 49 E debara aha ha n’akwụkwọ otú Jehova si n’ọnụ Mosis nye iwu ka e mee, deekwa ozi onye nke ọ bụla ga na-eje na ibu ọ ga na-ebu. E debara aha ha n’akwụkwọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
5 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Nye ndị Izrel iwu ka ha si n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ ndị niile na-arịa ekpenta+ na ndị niile ihe na-agbapụta n’ahụ́+ nakwa ndị niile na-adịghị ọcha maka na ha metụrụ onye nwụrụ anwụ* aka.+ 3 Ma hà bụ ụmụ nwoke ma hà bụ ụmụ nwaanyị, unu ga-akpọpụ ha. Unu ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ ha ka ha ghara imerụ+ ụlọikwuu nke ndị m binyeere.”+ 4 N’ihi ya, ndị Izrel mere otú ahụ wee si n’ebe ha mara ụlọikwuu kpọpụ ha. Ndị Izrel mere nnọọ otú Jehova gwara Mosis.
5 Jehova wee gwa Mosis, sị: 6 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị emee mmehie ọ bụla ndị mmadụ na-eme ma mehie Jehova, ikpe amala onye* ahụ.+ 7 Ọ* ga-ekwupụta+ mmehie o* mere ma kwụchaa ụgwọ o kwesịrị ịkwụ maka ikpe mara ya, kwụọkwa otu ụzọ n’ụzọ ise nke ụgwọ ahụ.+ Ọ ga-enye ya onye o mejọrọ. 8 Ma ọ bụrụ na onye o mejọrọ enweghị onye ikwu ọ ga-akwụ ụgwọ ahụ,* a ga-ewegara ya Jehova. Ọ ga-abụzi nke onye nchụàjà, ya na ebule a ga-eji chụọ àjà ikpuchiri ya mmehie.+
9 “‘Onyinye ọ bụla dị nsọ+ ndị Izrel wetaara onye nchụàjà ga-abụ nke onye nchụàjà.+ 10 Ihe ndị dị nsọ onye nchụàjà natara onye ọ bụla ga-abụ nke ya.* Ihe ọ bụla onye ọ bụla nyere onye nchụàjà, ihe ahụ ga-abụ nke onye nchụàjà ahụ.’”
11 Jehova gwakwara Mosis, sị: 12 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ihe a ka a ga-eme ma ọ bụrụ na nwunye mmadụ emehie wee gbaa n’èzí, 13 ya na nwoke ọzọ enwee mmekọahụ,+ ma di ya amaghị, a chọpụtaghịkwa ihe o mere, o wee merụọ onwe ya, ma e nweghị onye gbara akaebe ihe o mere, e jideghịkwa ya: 14 Ma di ya ọ̀ na-ekwosa ya ekworo, na-enyokwa ya enyo na ọ gbaala n’èzí mgbe nwaanyị ahụ merụrụla onwe ya, ma di ya ọ̀ na-ekwosa ya ekworo, na-enyokwa ya enyo na ọ gbaala n’èzí mgbe nwaanyị ahụ na-emerụbeghị onwe ya, 15 nwoke ahụ ga-akpọrọ nwunye ya kpọtara onye nchụàjà, wetakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka bali ọ ga-enye maka nwunye ya. Ọ gaghị awụsa ya mmanụ ma ọ bụ tụkwasị ya frankinsens n’ihi na ọ bụ àjà ọka ekworo, àjà ọka nke na-eme ka e cheta onye ikpe mara.
16 “‘Onye nchụàjà ga-akpọta nwaanyị ahụ ma mee ka o guzo n’ihu Jehova.+ 17 Onye nchụàjà ga-eji ite ụrọ kuru mmiri nsọ. Onye nchụàjà ga-ekporo ájá n’ala ụlọikwuu ahụ kponye n’ime mmiri ahụ. 18 Onye nchụàjà ga-eme ka nwaanyị ahụ guzo n’ihu Jehova. Ọ ga-atọsa ntutu isi nwaanyị ahụ ma dọkwasị àjà ọka ahụ e ji echeta onye ikpe mara, ya bụ, àjà ọka ekworo,+ n’ọbụ aka abụọ nwaanyị ahụ. Onye nchụàjà ga-ebu mmiri ahụ na-elu ilu e ji abụ mmadụ ọnụ n’aka nke ya.+
19 “‘Onye nchụàjà ga-eme ka nwaanyị ahụ ṅụọ iyi. Ọ ga-asị nwaanyị ahụ: “Ọ bụrụ na e nweghị nwoke ọzọ gị na ya nwere mmekọahụ kemgbe ị lụrụ di,*+ ọ bụrụkwa na i mehiebeghị wee merụọ onwe gị, ka mmiri a na-elu ilu e ji abụ mmadụ ọnụ ghara ime gị ihe ọ bụla. 20 Ma ọ bụrụ na i mehiela kemgbe ị lụrụ di wee merụọ onwe gị, gị na nwoke ọzọ enwee mmekọahụ,—”+ 21 Onye nchụàjà ga-eme ka nwaanyị ahụ ṅụọ iyi.* Onye nchụàjà ga-asịkwa nwaanyị ahụ: “Ka Jehova mee ka ị bụrụ onye ndị obodo ha na-abụ ọnụ na onye ha ga-eji na-aṅụ iyi ma Jehova mee ka apata ụkwụ* gị dapụ,* meekwa ka afọ gị zaa. 22 Mmiri a e ji abụ mmadụ ọnụ ga-abanye n’eriri afọ gị ka o mee ka afọ gị zaa, meekwa ka apata ụkwụ* gị dapụ.”* Nwaanyị ahụ ga-asị: “Amen! Amen!”*
23 “‘Onye nchụàjà ga-ede ihe ndị a nwaanyị ahụ ṅụrụ n’iyi n’akwụkwọ ma sabanye ha n’ime mmiri ahụ na-elu ilu. 24 Ọ ga-emezi ka nwaanyị ahụ ṅụọ mmiri ahụ na-elu ilu nke e ji abụ mmadụ ọnụ. Mmiri ahụ e ji abụ mmadụ ọnụ ga-abanye n’afọ ya ma gbuo ya mgbu. 25 Onye nchụàjà ga-eburu àjà ọka ekworo+ ahụ n’aka nwaanyị ahụ ma fegharịa ya n’ihu Jehova. Ọ ga-ewetakwa ya nso n’ebe ịchụàjà. 26 Onye nchụàjà ga-ekporo àjà ọka ga-eju ọbụ aka ya ka ọ bụrụ ihe nọchiri anya àjà e wetara. Ọ ga-esu ya ọkụ ka ọ kwụọ anwụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà.+ Ọ ga-emezi ka nwaanyị ahụ ṅụọ mmiri ahụ. 27 Mgbe o mere ka nwaanyị ahụ ṅụọ mmiri ahụ, ọ bụrụ na nwaanyị ahụ merụrụ onwe ya ma gbaa n’èzí, mmiri ahụ e ji abụ mmadụ ọnụ ga-abanye n’afọ ya ma gbuo ya mgbu. Afọ ya ga-aza, apata ụkwụ* ya ga-adapụkwa.* Nwaanyị ahụ ga-abụzi onye ndị obodo ha ji abụ mmadụ ọnụ. 28 Ma, ọ bụrụ na nwaanyị ahụ emerụghị onwe ya, ya abụrụ na ọ dị ọcha, ihe ndị ahụ agaghị eme ya. Ọ ga-enwe ike ịdị ime, nweekwa ike ịmụ nwa.
29 “‘Ihe a bụ iwu e nyere gbasara ekworo+ ma ọ bụrụ na nwaanyị mehiere wee merụọ onwe ya mgbe ọ nọ na di 30 ma ọ bụ ma ọ bụrụ na nwoke na-ekwosa nwunye ya ekworo, na-enyokwa ya enyo na ọ gbara n’èzí. Nwoke ahụ ga-eme ka nwunye ya guzo n’ihu Jehova. Onye nchụàjà ga-emekwa nwaanyị ahụ ihe niile e kwuru n’iwu a. 31 Nwoke ahụ ga-enwere onwe ya. Ikpe agaghị ama ya. Ma nwunye ya ga-eburu ihe o metara.’”
6 Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ekwe nkwa pụrụ iche na ọ ga-abụ onye Naziraịt*+ nke Jehova, 3 ọ gaghị na-aṅụ mmanya na ihe ọ bụla na-aba n’anya. Ọ gaghị aṅụ mmanya gbara ụka ma ọ bụ ihe na-aba n’anya gbara ụka.+ Ọ gaghị aṅụ ihe ọ bụla a na-aṅụ aṅụ e ji mkpụrụ vaịn mee. Ọ gaghịkwa ata mkpụrụ vaịn, ma nke ndụ ma nke a mịkpọrọ amịkpọ. 4 N’oge niile ọ bụ onye Naziraịt, ọ gaghị eri ihe ọ bụla e ji mkpụrụ vaịn mee, ma mkpụrụ vaịn na-achaghị acha ma mkpo ya.
5 “‘N’oge niile o kwere nkwa na ya ga-abụ onye Naziraịt, agụba agaghị emetụ ya n’isi.+ Ọ ga-adị nsọ. Otú ọ ga-esi dị nsọ bụ na ọ ga-ahapụ ntutu isi ya ka ọ na-eto ruo mgbe oge o nyefere Jehova onwe ya zuru. 6 Ọ gaghị abịa onye nwụrụ anwụ* nso n’oge niile o nyefere Jehova onwe ya. 7 Ọ bụrụgodị na nna ya ma ọ bụ nne ya ma ọ bụ nwanne ya nwoke ma ọ bụ nwanne ya nwaanyị anwụọ, ọ gaghị emerụ onwe ya,+ n’ihi na ihe na-egosi na ọ bụ onye Naziraịt nke Chineke ya dị n’isi ya.
8 “‘Ọ bụụrụ Jehova onye dị nsọ n’oge niile ọ bụ onye Naziraịt. 9 Ma ọ bụrụ na mmadụ nọ n’akụkụ ya nwụọ na mberede, ahụ́ ya emetụ ya,+ o wee merụọ ntutu isi ya nke na-egosi na ọ bụ onye e wepụtara iche maka Chineke,* ọ ga-akpụ isi ya+ n’ụbọchị a ga-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-akpụ ya n’ụbọchị nke asaa. 10 N’ụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewetara onye nchụàjà nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 11 Onye nchụàjà ga-eji otu chụọ àjà mmehie, jiri nke ọzọ chụọ àjà a na-esu ọkụ ka e jiri kpuchiere ya mmehie o mere+ n’ihi onye nwụrụ anwụ.* Ọ ga-eme ka isi ya dị nsọ* n’ụbọchị ahụ. 12 Ọ ga-ewepụta onwe ya ọzọ ka ọ bụrụ onye Naziraịt nke Jehova n’oge niile ọ ga-abụ ya. Ọ ga-akpụta ebule na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà ikpe ọmụma. Ma, a gaghị agụnye oge ndị gara aga n’ihi na o merụrụ onwe ya n’oge ọ bụ onye Naziraịt.
13 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị onye Naziraịt: Mgbe ọ nọzuru oge o ji bụrụ onye Naziraịt,+ a ga-akpọta ya n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 14 N’ebe ahụ ka ọ ga-enye Jehova onyinye ya, ya bụ, ebule ahụ́ dị mma nke na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà a na-esu ọkụ,+ obere nne atụrụ ahụ́ dị mma na-agafebeghị otu afọ ka e jiri ya chụọ àjà mmehie,+ otu ebule ahụ́ dị mma ka e jiri ya chụọ àjà udo,+ 15 otu nkata achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri e ji ntụ ọka e gwere nke ọma mee, nke a gwara mmanụ, achịcha ndị na-ekoghị eko dị fere fere a wụrụ mmanụ, nakwa àjà ọka+ na àjà mmanya+ ha na ha na-agakọ. 16 Onye nchụàjà ga-eche ihe ndị a n’ihu Jehova ma chụọ àjà mmehie na àjà a na-esu ọkụ maka onye ahụ. 17 Ọ ga-eji ebule ahụ chụọrọ Jehova àjà udo, ya na achịcha ndị ahụ na-ekoghị eko dị na nkata. Onye nchụàjà ga-achụkwa àjà ọka+ na àjà mmanya ha na ha na-agakọ.
18 “‘Onye Naziraịt ahụ ga-akpụ ntutu isi ya*+ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. Ọ ga-ekporo ntutu isi ya nke toro n’oge ọ bụ onye Naziraịt wụnye n’ọkụ na-ere anụ ahụ e ji chụọ àjà udo. 19 Onye nchụàjà ga-ewere otu ubu ebule ahụ e siri esi,+ si n’ime nkata ahụ were otu achịcha na-ekoghị eko dị okirikiri na otu achịcha na-ekoghị eko dị fere fere. Ọ ga-achịkwasị ha n’ọbụ aka abụọ onye Naziraịt ahụ mgbe ọ kpụcharala isi na-egosi na ọ bụ onye Naziraịt. 20 Onye nchụàjà ga-efegharị ha ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị n’ihu Jehova.+ Ọ bụ ihe dị nsọ a ga-enye onye nchụàjà, ya na okpuru afọ* anụ e ji chụọ àjà e fegharịrị efegharị na ụkwụ anụ ahụ e nyere n’onyinye.+ E mechaa, onye Naziraịt ahụ nwere ike ịṅụ mmanya.
21 “‘Ihe a bụ iwu ga na-achị onye Naziraịt+ nke kwere nkwa: Ọ bụrụ na o kwere nkwa na e nwere ihe ọzọ ọ ga-enye Jehova ma e wepụ ihe ndị onye Naziraịt kwesịrị iweta, ya abụrụkwa na ọ ga-ewetali ya, ọ ga-emezu nkwa ya n’ihi na o ji iwu na-achị ndị Naziraịt kpọrọ ihe.’”
22 Jehova gwaziri Mosis, sị: 23 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke, sị, ‘Otú a ka unu ga-esi na-agọzi+ ndị Izrel. Na-asịnụ ha:
24 “Ka Jehova gọzie unu+ ma chebe unu.
25 Ka Jehova nwee mmasị n’ebe unu nọ,*+ ka o meekwara unu amara.
26 Ka Jehova meere unu ihe ọma, meekwa ka udo dịrị unu.”’+
27 Ha ga-eji aha m gọzie ndị Izrel,+ ka m wee gọzie ha.”+
7 N’ụbọchị Mosis machara ụlọikwuu ahụ,+ o tere ya mmanụ+ ma mee ka ọ dị nsọ, ya na ngwongwo ya niile, ebe ịchụàjà ahụ, na arịa ya niile.+ Mgbe o techara ihe ndị a mmanụ ma mee ka ha dị nsọ,+ 2 ndị isi ndị Izrel,+ bụ́ ndị isi ọnụmara ha niile, nyere onyinye. Ọ bụ ndị a, bụ́ ndị isi ebo dị iche iche, hụrụ maka ideba aha ndị mmadụ n’akwụkwọ. 3 Ha wetara onyinye ha n’ihu Jehova, ya bụ, ụgbọala isii anụmanụ na-adọkpụ ndị e kpuchiri elu ha ekpuchi na oké ehi iri na abụọ. Mmadụ abụọ abụọ n’ime ndị isi ahụ wetara otu ụgbọala, otu onye isi ọ bụla eweta otu oké ehi. Ha wetara ha n’ihu ụlọikwuu ahụ. 4 Jehova gwara Mosis, sị: 5 “Nara ha ihe ndị a n’ihi na a ga-eji ha na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute. Ị ga-ewere ha nye ndị Livaị. Ị ga-esi na ha nye onye nke ọ bụla ihe ọ ga-eji na-arụ ọrụ e nyere ya.”
6 Mosis wee nara ụgbọala ndị ahụ anụmanụ na-adọkpụ na ehi ndị ahụ ma nye ha ndị Livaị. 7 O nyere ụmụ Geshọn ụgbọala abụọ na ehi anọ ha ga-eji na-arụ ọrụ e nyere ha.+ 8 O nyekwara ụmụ Meraraị ụgbọala anọ na ehi asatọ ha ga-eji na-arụ ọrụ e nyere ha. Ọ bụ Ịtama nwa Erọn onye nchụàjà ka o nyefere ha.+ 9 Ma e nweghị nke o nyere ụmụ Kohat n’ihi na ọrụ ha gbasara ebe nsọ.+ Ọ bụkwa n’ubu ha ka ha na-ebu ihe ndị dị nsọ.+
10 Ndị isi ahụ nyere onyinye ọzọ mgbe a na-enyefe+ Chineke ebe ịchụàjà ahụ, ya bụ, n’ụbọchị e tere ya mmanụ. Mgbe ndị isi ahụ wetara onyinye ha n’ihu ebe ịchụàjà, 11 Jehova gwara Mosis, sị: “Onyeisi nke ọ bụla ga-eweta onyinye ọ chọrọ inye maka inyefe Chineke ebe ịchụàjà ahụ, otu onyeisi weta taa, onyeisi ọzọ eweta echi.”
12 Onye nyere onyinye ya n’ụbọchị nke mbụ bụ Nashọn+ nwa Aminadab, onye si n’ebo Juda. 13 Onyinye o nyere bụ otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel* na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ*+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 14 O nyekwara otu iko* ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens* juru n’ime ya; 15 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 16 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 17 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Nashọn nwa Aminadab+ nyere.
18 N’ụbọchị nke abụọ, Netanel+ nwa Zua, onyeisi ebo Ịsaka, nyere onyinye nke ya. 19 Onyinye o nyere bụ otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’ịdị arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 20 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 21 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 22 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 23 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Netanel nwa Zua nyere.
24 N’ụbọchị nke atọ, Elayab+ nwa Hilọn, onyeisi ụmụ Zebulọn, 25 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 26 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 27 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 28 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 29 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Elayab+ nwa Hilọn nyere.
30 N’ụbọchị nke anọ, Elaịzọ+ nwa Shedeọ, onyeisi ụmụ Ruben, 31 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 32 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 33 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 34 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 35 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Elaịzọ+ nwa Shedeọ nyere.
36 N’ụbọchị nke ise, Shelumiel+ nwa Zurishadaị, onyeisi ụmụ Simiọn, 37 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 38 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 39 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 40 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 41 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Shelumiel+ nwa Zurishadaị nyere.
42 N’ụbọchị nke isii, Elayasaf+ nwa Duel, onyeisi ụmụ Gad, 43 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 44 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 45 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 46 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 47 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Elayasaf+ nwa Duel nyere.
48 N’ụbọchị nke asaa, Elishama+ nwa Amaịhọd, onyeisi ụmụ Ifrem, 49 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 50 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 51 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 52 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 53 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Elishama+ nwa Amaịhọd nyere.
54 N’ụbọchị nke asatọ, Gameliel+ nwa Pedazọ, onyeisi ụmụ Manase, 55 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 56 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 57 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 58 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 59 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Gameliel+ nwa Pedazọ nyere.
60 N’ụbọchị nke itoolu, Abidan+ nwa Gidionaị, onyeisi+ ụmụ Benjamin, 61 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 62 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 63 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 64 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 65 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Abidan+ nwa Gidionaị nyere.
66 N’ụbọchị nke iri, Ahayiza+ nwa Amishadaị, onyeisi ụmụ Dan, 67 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 68 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 69 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 70 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 71 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Ahayiza+ nwa Amishadaị nyere.
72 N’ụbọchị nke iri na otu, Pegiel+ nwa Ọkran, onyeisi ụmụ Asha 73 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 74 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 75 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 76 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 77 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Pegiel+ nwa Ọkran nyere.
78 N’ụbọchị nke iri na abụọ, Ahaịra+ nwa Inan, onyeisi ụmụ Naftalaị, 79 nyere onyinye nke ya. O nyere otu efere ọlaọcha nke dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ nakwa otu ọkwá ọlaọcha nke dị shekel iri asaa n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. Ihe juru n’ime ha abụọ bụ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. A ga-eji ha chụọ àjà ọka.+ 80 O nyekwara otu iko ọlaedo nke dị shekel iri n’arọ, nke insens juru n’ime ya; 81 otu oké ehi, otu ebule, na otu nwa ebule na-agafebeghị otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà a na-esu ọkụ;+ 82 otu nwa ewu ka e jiri ya chụọ àjà mmehie.+ 83 O nyekwara ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise, ụmụ ebule ise ndị gbara otu afọ otu afọ, ka e jiri ha chụọ àjà udo.+ Ọ bụ ihe ndị a ka Ahaịra+ nwa Inan nyere.
84 Ihe ndị a bụ onyinye ndị isi ndị Izrel nyere maka inyefe+ Chineke ebe ịchụàjà ahụ mgbe e tere ya mmanụ: efere ọlaọcha iri na abụọ, ọkwá ọlaọcha iri na abụọ, iko ọlaedo iri na abụọ;+ 85 efere ọlaọcha nke ọ bụla dị otu narị shekel na iri atọ (130) n’arọ, ọkwá nke ọ bụla dị shekel iri asaa n’arọ, ọlaọcha niile ahụ dị puku shekel abụọ na narị anọ (2,400), ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ+ tụọ ha. 86 Iko ọlaedo iri na abụọ ndị insens juru n’ime ha dị shekel iri shekel iri n’arọ, ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ tụọ ha. Ọlaedo niile ahụ dị otu narị shekel na iri abụọ (120). 87 Anụ niile a ga-eji chụọ àjà a na-esu ọkụ dị oké ehi iri na abụọ, ebule iri na abụọ, ụmụ ebule iri na abụọ ndị gbara otu afọ otu afọ na àjà ọka ha na ha na-agakọ, nakwa ụmụ ewu iri na abụọ a ga-eji chụọ àjà mmehie. 88 Anụ niile a ga-eji chụọ àjà udo dị oké ehi iri abụọ na anọ, ebule iri isii, mkpi iri isii, na ụmụ ebule iri isii ndị gbara otu afọ otu afọ. Ọ bụ ihe ndị a bụ onyinye e nyere mgbe a na-enyefe+ Chineke ebe ịchụàjà ahụ, mgbe e techara ya mmanụ.+
89 Mgbe ọ bụla Mosis banyere n’ụlọikwuu nzute ka ya na Chineke* kwuo okwu,+ ọ na-anụ olu si n’elu okwuchi+ igbe ọgbụgba ndụ,* n’agbata cherob abụọ ahụ,+ na-akpanyere ya ụka. Chineke na-agwa ya okwu.
8 Jehova gwara Mosis, sị: 2 “Gwa Erọn okwu, sị ya, ‘Mgbe ọ bụla ị mụnyere ọkụ* ndị ahụ, ọkụ asaa ahụ ga na-enye ìhè n’ihu ebe a dọsara ihe e ji adọsa ha.’”+ 3 Erọn wee mee ihe a: Ọ mụnyere ọkụ* ndị ahụ ka ha na-enwu n’ihu ebe a dọsara ihe e ji adọsa ha,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 4 Otú a ka e si rụọ ihe ahụ e ji adọsa ọkụ:* Ọ bụ ọlaedo ka e ji rụọ ya. E ji hama kụọ ya malite n’okporo ya ruo n’ifuru ya.+ A rụrụ ihe ahụ e ji adọsa ọkụ otú Jehova gosiri Mosis n’ọhụụ.+
5 Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị: 6 “Si ná ndị Izrel kpọrọ ndị Livaị, meekwa ka ha dị ọcha.+ 7 Otú a ka ị ga-esi mee ka ha dị ọcha: Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Ha ga-eji agụba kpụchaa ajị niile dị ha n’ahụ́, sụọ uwe ha, ma mee onwe ha ka ha dị ọcha.+ 8 Ha ga-akpụrụ oké ehi,+ werekwa àjà ọka ya+ na ya na-agakọ, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma a gwara mmanụ. Ị ga-akpụrụkwa oké ehi ọzọ a ga-eji chụọ àjà mmehie.+ 9 Ị ga-akpọta ndị Livaị n’ihu ụlọikwuu nzute ma kpọkọta nzukọ Izrel niile.+ 10 Mgbe ị ga-akpọta ndị Livaị n’ihu Jehova, ndị Izrel ga-ebikwasị aka ha n’isi ndị Livaị.+ 11 Erọn ga-eche* ndị Livaị n’ihu Jehova ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị+ si n’aka ndị Izrel. Ha ga na-eje ozi Jehova.+
12 “Ndị Livaị ga-ebikwasị aka ha n’isi oké ehi ndị ahụ.+ Ha ga-achụzi otu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, chụọkwa nke ọzọ ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova, ka e wee kpuchiere ndị Livaị mmehie.+ 13 Ị ga-eme ka ndị Livaị guzo n’ihu Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ma chee* ha n’ihu Jehova ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị a chụụrụ ya. 14 Ị ga-esi ná ndị Izrel kpọpụta ndị Livaị. Ndị Livaị ga-abụkwa nke m.+ 15 E mechaa, ndị Livaị ga-abata jewe ozi n’ụlọikwuu nzute. Ọ bụ otú ị ga-esi mee ka ha dị ọcha ma chee* ha n’ihu m ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị. 16 N’ihi na ha bụ ndị e nyere n’onyinye, ndị e si ná ndị Izrel nye m. M ga-akpọrọ ha ka ha nọchie anya nwa ọ bụla ndị Izrel bu ụzọ mụọ.*+ 17 N’ihi na ọ bụ m nwe nwa ọ bụla ndị Izrel bu ụzọ mụọ, ma mmadụ ma anụmanụ.+ M mere ka ha dịrị m nsọ n’ụbọchị m gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt.+ 18 M ga-akpọrọ ndị Livaị ka ha nọchie anya ụmụ niile ndị Izrel bu ụzọ mụọ. 19 M ga-esi ná ndị Izrel kpọrọ ndị Livaị kpọnye Erọn na ụmụ ya ndị nwoke ka ha bụrụ ndị e nyere n’onyinye, ka ha na-ejere ndị Izrel ozi n’ụlọikwuu nzute+ ma na-ekpuchiri ndị Izrel mmehie ha, ka ihe ọjọọ ọ bụla ghara ime ndị Izrel+ maka na ndị Izrel bịara nso n’ebe nsọ.”
20 Mosis na Erọn na nzukọ Izrel niile mere ndị Livaị ihe a e kwuru. Ndị Izrel mere ihe niile e kwuru gbasara ndị Livaị otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 21 Ndị Livaị mere onwe ha ka ha dị ọcha ma saa uwe ha.+ Mgbe ha mechara, Erọn chere* ha n’ihu Jehova ka ha bụrụ àjà a na-efegharị efegharị.+ Erọn wee kpuchiere ha mmehie ha iji mee ka ha dị ọcha.+ 22 Mgbe e mechara, ndị Livaị banyere ka ha jewe ozi ha n’ụlọikwuu nzute n’ihu Erọn na ụmụ ya ndị nwoke. Ha mere nnọọ ihe Jehova nyere Mosis n’iwu gbasara ndị Livaị.
23 Jehova gwaziri Mosis, sị: 24 “Ọ bụ ndị Livaị ka ihe a gbasara: Nwoke ga-esonye n’ìgwè ndị na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute malite mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ise gbagowe. 25 Ma mgbe ọ gafere afọ iri ise, ọ ga-akwụsị iso ìgwè ahụ eje ozi, ọ gaghịkwa na-eje ozi. 26 Ọ ga na-enyere ụmụnne ya ndị na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute aka, ma ọ gaghị anọ n’ebe ahụ na-eje ozi. Ọ bụ ihe a ka ị ga-eme gbasara ndị Livaị na ọrụ ha.”+
9 Jehova gwara Mosis okwu n’ala ịkpa Saịnaị n’ọnwa nke mbụ+ n’afọ nke abụọ ha pụtachara n’Ijipt, sị: 2 “Ndị Izrel ga-akwadebe anụ e ji eme Ememme Ngabiga+ n’oge ya a kara aka.+ 3 N’abalị iri na anọ n’ọnwa a, ná mgbede,* unu ga-akwadebe ya n’oge ya a kara aka. Unu ga-akwadebe ya otú e nyere n’iwu nakwa otú e kwuru ka e si na-akwadebe ya.”+
4 Mosis wee gwa ndị Izrel ka ha kwadebe anụ e ji eme Ememme Ngabiga. 5 Ha kwadebere anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’ala ịkpa Saịnaị n’ọnwa nke mbụ, n’abalị iri na anọ n’ọnwa ahụ, ná mgbede.* Ndị Izrel mere ihe niile Jehova nyere Mosis n’iwu.
6 Ma e nwere ụmụ nwoke na-adịghị ọcha maka na ha metụrụ ozu mmadụ* aka,+ nke mere na ha enweghị ike ịkwadebe anụ e ji eme Ememme Ngabiga n’ụbọchị ahụ. N’ihi ya, ha bịakwutere Mosis na Erọn n’ụbọchị ahụ,+ 7 sị Mosis: “Anyị adịghị ọcha maka na anyị metụrụ ozu mmadụ* aka. Gịnị mere na a gaghị ekwe ka anyị soro chụọrọ Jehova àjà n’oge a kara aka n’Izrel?”+ 8 Mosis wee sị ha: “Cherenụ n’ebe ahụ ka m nụ iwu Jehova ga-enye gbasara unu.”+
9 Jehova gwaziri Mosis, sị: 10 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụgodị na onye ọ bụla n’ime unu ma ọ bụ n’ọgbọ unu ndị na-esote unu adịghị ọcha maka na o metụrụ ozu mmadụ* aka+ ma ọ bụkwanụ na ọ gara ebe dị ezigbo anya, ọ ka ga-akwadebe anụ e ji eme Ememme Ngabiga a na-emere Jehova. 11 Ọ ga-akwadebe ya n’ọnwa nke abụọ,+ n’abalị iri na anọ, ná mgbede.* Ọ ga-erikọta ya na achịcha na-ekoghị eko na akwụkwọ nri ndị na-elu ilu.+ 12 Ọ gaghị ahapụ ihe ọ bụla n’ime ya ruo ụtụtụ.+ Ọ gaghịkwa agbaji ọkpụkpụ ya ọ bụla.+ Ọ ga-akwadebe ya otú e nyere n’iwu ka e si na-akwadebe Ememme Ngabiga. 13 Ma ọ bụrụ na mmadụ dị ọcha, e nweghịkwa ebe ọ gara, ma ya ahapụ ịkwadebe anụ e ji eme Ememme Ngabiga, a ga-egbu onye ahụ*+ n’ihi na o wetaraghị Jehova onyinye ya n’oge a kara aka. Onye ahụ ga-aza ajụjụ maka mmehie ya.
14 “‘Ọ bụrụ na onye mbịarambịa binyeere unu, ọ ga-akwadebekwa anụ e ji eme Ememme Ngabiga a na-emere Jehova.+ Ọ ga-eme ya otú e nyere n’iwu nakwa otú e kwuru ka e si na-eme ya.+ Otu iwu ga na-achị unu, ma onye mbịarambịa ma nwa afọ ala unu.’”+
15 N’ụbọchị a mara ụlọikwuu ahụ,+ ígwé ojii kpuchiri ụlọikwuu ahụ, ya bụ, ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.* Ma ná mgbede, ihe yiri ọkụ kwụ n’elu ụlọikwuu ahụ ruo n’ụtụtụ.+ 16 Ọ bụ ihe nọ na-eme: Ígwé ojii na-ekpuchi ya n’ehihie, ihe yiri ọkụ akwụrụ n’elu ya n’abalị.+ 17 Mgbe ọ bụla ígwé ojii ahụ si n’elu ụlọikwuu ahụ pụọ, ndị Izrel na-akwali ozugbo.+ Ndị Izrel na-amakwa ụlọikwuu n’ebe ígwé ojii ahụ kwụsịrị.+ 18 Ndị Izrel na-akwali ma Jehova nye ha iwu ka ha kwalie. Ha na-amakwa ụlọikwuu ma Jehova nye ha iwu ka ha maa ụlọikwuu.+ Ha na-anọ n’ebe ha mara ụlọikwuu n’oge niile ígwé ojii kwụ n’elu ụlọikwuu ahụ. 19 Ọ bụrụ na ígwé ojii ahụ akwụrụ n’elu ụlọikwuu ahụ ruo ọtụtụ ụbọchị, ndị Izrel na-erubere Jehova isi ghara ịkwali.+ 20 Mgbe ụfọdụ, ígwé ojii ahụ na-akwụrụ n’elu ụlọikwuu ahụ ruo ụbọchị ole na ole. Ha na-anọrọ n’ebe ha mara ụlọikwuu ma Jehova nye ha iwu ka ha nọrọ. Ha na-akwalikwa ma Jehova nye ha iwu ka ha kwalie. 21 Mgbe ụfọdụ, ígwé ojii ahụ na-anọ naanị ná mgbede ruo n’ụtụtụ. Ọ na-abụ ígwé ojii ahụ pụọ n’ụtụtụ, ha akwalie. Ma ígwé ojii ahụ ọ̀ pụrụ n’ehihie ma ọ̀ bụ n’abalị, ha na-akwali.+ 22 Ma ọ̀ bụ ụbọchị abụọ ma ọ bụ otu ọnwa ma ọ bụ karịa ka ígwé ojii ahụ kwụ n’elu ụlọikwuu ahụ, ndị Izrel na-anọ n’ebe ha mara ụlọikwuu, ha anaghị akwali. Ma ọ pụọ, ha na-akwali. 23 Ha na-ama ụlọikwuu ma Jehova nye ha iwu ka ha maa ụlọikwuu. Ha na-akwalikwa ma Jehova nye ha iwu ka ha kwalie. Ha na-erubere Jehova isi ma Jehova si n’ọnụ Mosis gwa ha ihe ha ga-eme.
10 Jehova wee gwa Mosis, sị: 2 “Jiri ọlaọcha rụọrọ onwe gị opi abụọ.+ Ị ga-eji hama kụọ ha. Ị ga-eji ha na-akpọkọta nzukọ Izrel, jirikwa ha na-agwa ha mgbe ha ga-akwali. 3 Ọ bụrụ na a fụọ ha abụọ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta n’ebe ị nọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.+ 4 Ọ bụrụ otu ka a fụrụ, ọ bụ naanị ndị isi, ya bụ, ndị isi puku kwuru puku ndị Izrel, ga-ezukọta n’ebe ị nọ.+
5 “Ọ bụrụ na unu afụọ opi otú ọ ga-abụ ya dasitụ ike ya adalatatụ, ndị mara ụlọikwuu n’ebe ọwụwa anyanwụ+ ga-akwali. 6 Ọ bụrụ na unu afụọ opi nke ugboro abụọ otú ọ ga-abụ ya dasitụ ike ya adalatatụ, ndị mara ụlọikwuu n’ebe ndịda+ ga-akwali. Ọ bụ otú a ka a ga-esi na-afụ opi mgbe ọ bụla otu n’ime ìgwè ndị Izrel na-akwali.
7 “Mgbe unu chọrọ ịkpọkọta ọgbakọ ahụ, unu ga-afụ opi,+ ma unu agaghị afụ ya otú ọ ga-abụ ya dasitụ ike ya adalatatụ. 8 Ọ bụ ụmụ Erọn ndị nwoke, bụ́ ndị nchụàjà, ga na-afụ opi ndị ahụ.+ Unu ga na-afụ ha n’ọgbọ unu niile. Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide unu ga na-edebe.
9 “Ọ bụrụ na unu agaa agha n’ala unu ka unu lụso onye iro nke na-achọ unu okwu agha, unu ga-eji opi ndị ahụ fụọ opi agha.+ Jehova bụ́ Chineke unu ga-echetakwa unu ma zọpụta unu n’aka ndị iro unu.
10 “N’oge dị iche iche unu na-aṅụrị ọṅụ,+ ya bụ, n’oge ememme+ unu nakwa ná mbido ọnwa unu, unu ga-afụ opi mgbe unu na-achụ àjà unu a na-esu ọkụ+ na àjà udo unu.+ Ịfụ opi ndị ahụ ga-eme ka Chineke unu cheta unu. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.”+
11 N’afọ nke abụọ, n’abalị iri abụọ n’ọnwa nke abụọ,+ ígwé ojii ahụ si n’elu ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya* pụọ.+ 12 Ndị Izrel wee malite ịpụ n’ala ịkpa Saịnaị otú e nyere ha iwu ka ha si na-akwali mgbe ha na-akwaga ebe ọzọ.+ Ígwé ojii ahụ kwụsịrị n’ala ịkpa Peran.+ 13 Ihe a bụ nke mbụ ha kwaliri kemgbe Jehova si n’ọnụ Mosis nye ha ntụziaka otú ha ga-esi na-akwali.+
14 Ìgwè ebo atọ nke ụmụ Juda wee buru ụzọ kwalie n’ìgwè ha n’ìgwè ha. Ọ bụ Nashọn+ nwa Aminadab bụ onyeisi ha. 15 Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Ịsaka bụ Netanel+ nwa Zua. 16 Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Zebulọn bụ Elayab+ nwa Hilọn.
17 Mgbe a tọturu ụlọikwuu ahụ,+ ụmụ Geshọn+ na ụmụ Meraraị,+ bụ́ ndị na-ebu ụlọikwuu ahụ, kwaliri.
18 Ìgwè ebo atọ Ruben wee kwalie n’ìgwè ha n’ìgwè ha. Ọ bụ Elaịzọ+ nwa Shedeọ bụ onyeisi ha. 19 Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Simiọn bụ Shelumiel+ nwa Zurishadaị. 20 Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Gad bụ Elayasaf+ nwa Duel.
21 Ụmụ Kohat, bụ́ ndị na-ebu ihe ndị dị n’ebe nsọ,+ kwaliziri. E kwesịrị ịma ụlọikwuu ahụ tupu ha erute.
22 Ìgwè ebo atọ ụmụ Ifrem wee kwalie n’ìgwè ha n’ìgwè ha. Ọ bụ Elishama+ nwa Amaịhọd bụ onyeisi ha. 23 Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Manase bụ Gameliel+ nwa Pedazọ. 24 Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Benjamin bụ Abidan+ nwa Gidionaị.
25 Ìgwè ebo atọ ụmụ Dan wee kwalie n’ìgwè ha n’ìgwè ha. Ha ga-anọ n’azụ na-eche ndị Izrel niile nche. Ọ bụ Ahayiza+ nwa Amishadaị bụ onyeisi ha. 26 Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Asha bụ Pegiel+ nwa Ọkran. 27 Onyeisi ìgwè ebo ụmụ Naftalaị bụ Ahaịra+ nwa Inan. 28 Ọ bụ otú a ka ndị Izrel si na-akwali n’ìgwè ha n’ìgwè ha mgbe ha na-akwaga ebe ọzọ.+
29 Mosis wee gwa Hobab, nwa Ruel*+ onye Midian, bụ́ nna nwunye Mosis, sị: “Anyị na-akwaga n’ebe Jehova gwara anyị gbasara ya, sị, ‘M ga-enye ya unu.’+ Soro anyị gaa,+ anyị ga-emeta gị mma, n’ihi na Jehova ekwela ndị Izrel nkwa na ya ga-emere ha ihe ọma.”+ 30 Ma ọ sịrị ya: “Agaghị m aga. M ga-alaghachi n’obodo m ka m lakwuru ndị ikwu m.” 31 Mosis wee sị: “Biko, ahapụla anyị n’ihi na ị ma ebe anyị kwesịrị ịma ụlọikwuu n’ala ịkpa. Ị ga na-ezi anyị ụzọ.* 32 I soro anyị,+ anyị ga-emere gị ihe ọma ọ bụla Jehova meere anyị.”
33 Ha wee si n’ugwu Jehova pụwa+ gaa ije ụbọchị atọ. E bukwa igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova na-aga n’ihu ha n’ụbọchị atọ ahụ, ka ha chọta ebe ha ga-ezu ike.+ 34 Ígwé ojii+ Jehova nọkwa na-edu ha n’ehihie mgbe ha si n’ebe ha mara ụlọikwuu na-aga ebe ọzọ.
35 Mgbe ọ bụla e bu Igbe ahụ na-apụ, Mosis na-asị: “Jehova, biko, bilie+ chụsasịa ndị iro gị, ka ndị kpọrọ gị asị gbaa ọsọ n’ihi gị.” 36 Mgbe e buturu ya, ọ na-asị: “Jehova, biko, lọghachikwute puku kwuru puku ndị Izrel.”+
11 Ndị Izrel malitere ime mkpesa n’ihu Jehova. Mgbe Jehova nụrụ ya, iwe were ya. Jehova wee zite ọkụ, ya amalite iregbu ụfọdụ ndị ná nsọtụ ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu. 2 Mgbe ha malitere ibesara Mosis ákwá, Mosis rịọsiri Jehova arịrịọ ike,+ ọkụ ahụ anyụọ. 3 A kpọziri ebe ahụ Tabera* maka na ọkụ Jehova zitere rere ha.+
4 Ndị dị iche iche*+ ha na ha so wee nwewe akpịrị ogologo.+ Ndị Izrel malitekwara ibe ákwá, na-asị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa?+ 5 Anyị na-echeta azụ̀ anyị na-ata n’Ijipt n’efu, nakwa kukumba, wọtamelọn, lik, yabaasị, na galik!+ 6 Ma ugbu a, ike na-agwụzi anyị.* E nweghị ihe ọzọ anyị na-ahụ ma ọ́ bụghị mana a.”+
7 Mana+ yiri mkpụrụ kọrịanda,+ ọ na-achakwa ka eso* deliọm. 8 Ndị Izrel na-agagharị kporo ya ma jiri nkume e ji egwe nri gwee ya ma ọ bụ sụọ ya n’ikwe, ha ejirizie ite e ji esi nri sie ya ma ọ bụ jiri ya mee achịcha dị okirikiri.+ Ọ na-atọ ka keeki dị ụtọ a gwara mmanụ. 9 Ọ na-abụ igirigi daa n’abalị n’ebe ha mara ụlọikwuu, mana adaakwa.+
10 Mosis nụrụ ka ndị Izrel na-ebe ákwá n’ezinụlọ n’ezinụlọ, onye nke ọ bụla n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya. Ezigbo iwe were Jehova,+ ihe ahụ wutekwara Mosis. 11 Mosis wee sị Jehova: “Gịnị mere i ji emesi ohu gị ike? Gịnịkwa mere na ihe m amasịghị gị, i wee buru ibu mmadụ niile a bokwasị m?+ 12 Ọ̀ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ̀ bụ m mụrụ ha, nke mere i ji sị m, ‘Kuru ha n’obi gị otú onye na-elekọta nwa si eku nwa na-aṅụ ara,’ ka m wee kuba ha n’ala ị ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ị ga-enye ha?+ 13 Olee ebe m ga-esi nweta anụ m ga-enye ndị a niile? N’ihi na ha na-ebesara m ákwá, sị, ‘Nye anyị anụ ka anyị taa!’ 14 Naanị m agaghị ebuli ibu mmadụ niile a. Ọ karịrị m akarị.+ 15 Ọ bụrụ otú a ka ị ga-esi na-emeso m, biko, gbuo m ozugbo.+ Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, ekwela ka m hụsikwuo anya.”
16 Jehova wee zaa Mosis, sị: “Si ná ndị okenye Izrel kpọkọtara m ụmụ nwoke iri asaa, ndị ị ma na ha bụ ndị okenye na ndị isi ndị Izrel.+ Kpọga ha n’ụlọikwuu nzute, meekwa ka gị na ha guzo n’ebe ahụ. 17 M ga-agbadata+ ma gwa gị okwu n’ebe ahụ.+ M ga-eweretụ mmụọ nsọ m+ dị n’ahụ́ gị nye ha. Ha ga-enyekwara gị aka n’ibu ibu ndị Izrel ka ị ghara ibu ya naanị gị.+ 18 Ị ga-agwa ndị Izrel, sị, ‘Meenụ onwe unu ka unu dị nsọ maka echi+ n’ihi na unu ga-ata anụ, n’ihi na unu ebeela ákwá ná ntị Jehova,+ sị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa? Ihe dịịrị anyị mma n’Ijipt.”+ Jehova ga-enye unu anụ, unu ga-atakwa anụ.+ 19 Ọ bụghị naanị otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ ma ọ bụ ụbọchị ise ma ọ bụ ụbọchị iri ma ọ bụ ụbọchị iri abụọ ka unu ga-ata anụ, 20 kama unu ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu ruo mgbe ọ ga-apụta unu n’imi sọwa unu oyi,+ n’ihi na unu jụrụ Jehova, onye nọnyeere unu. Unu nọkwa na-ebe ákwá n’ihu ya, na-asị: “Gịnị mere anyị ji si n’Ijipt pụta?”’”+
21 Mosis wee sị: “Ndị a mụ na ha nọ dị narị puku ụmụ nwoke isii (600,000)+ ndị ji ụkwụ aga, ma i kwuru, sị, ‘M ga-enye ha anụ. Ha ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu.’ 22 E gbuo ìgwè ewu na atụrụ na ìgwè ehi, ọ̀ ga-ezuru ha? Ma ọ bụ, e gbute azụ̀ niile dị na mmiri, ọ̀ ga-ezuru ha?”
23 Jehova gwara Mosis, sị: “Ihe a ọ̀ nyịrị Jehova?*+ Ugbu a, ị ga-ahụ ma ihe m kwuru ọ̀ ga-emezuru unu ka ọ̀ bụ na ọ gaghị emezu.”
24 Mosis wee pụọ gwa ha ihe Jehova kwuru. Ọ kpọkọtara ụmụ nwoke iri asaa n’ime ndị okenye Izrel wee mee ka ha guzo n’akụkụ ụlọikwuu ahụ.+ 25 Jehova wee gbadata n’ígwé ojii+ gwa ya okwu.+ O weretụụrụ mmụọ nsọ+ dị n’ahụ́ ya nye ndị okenye iri asaa ahụ. Ozugbo ha nwetara mmụọ nsọ ahụ, ha malitere ime ka ndị amụma.*+ Ma, ha emeghị ya ọzọ.
26 E nwere mmadụ abụọ n’ime ụmụ nwoke ahụ ka nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu. Aha ha bụ Eldad na Midad. Ha nwetara mmụọ nsọ maka na ha so ná ndị e dere aha ha n’akwụkwọ. Ma ha agabeghị n’ụlọikwuu.* Ha wee malite ime ka ndị amụma n’ebe ha mara ụlọikwuu. 27 Otu nwa okorobịa gbaara ọsọ gaa gwa Mosis, sị: “Eldad na Midad na-eme ka ndị amụma n’ebe anyị mara ụlọikwuu!” 28 Joshụa+ nwa Nọn, onye na-ejere Mosis ozi kemgbe ọ bụ okorobịa, kwuru, sị: “Onyenwe m Mosis, kwụsị ha ime otú ahụ.”+ 29 Ma Mosis sịrị ya: “Ị̀ na-ekwochitere m ekworo? Emela otú ahụ, n’ihi na ọ dị m ka ya bụrụ na ndị Jehova niile bụ ndị amụma nakwa na Jehova ga-enye ha mmụọ nsọ ya.” 30 Mgbe e mechara, Mosis gaghachiri n’ebe ha mara ụlọikwuu, ya na ndị okenye Izrel.
31 Jehova wee mee ka ifufe fewe. Ifufe ahụ si n’oké osimiri na-ebute nnụnụ kwel ma na-eme ka ha na-efedata n’ebe niile ndị Izrel mara ụlọikwuu.+ Ha fedatara ruo n’ebe ga-ewe otu ụbọchị iji garuo ya ná mpaghara niile, gbaa gburugburu ebe ha mara ụlọikwuu. Ha juru n’ala ruo ihe dị ka kubit* abụọ n’ịdị elu. 32 N’ihi ya, n’ehihie ụbọchị ahụ niile na n’abalị ya niile nakwa n’echi ya niile, ndị Izrel nọ na-anwụrụ nnụnụ kwel. E nweghị onye nwụtara nnụnụ kwel na-agaghị eju homa* iri. Ha nọ na-awụsara onwe ha nnụnụ ahụ gburugburu ebe niile ha mara ụlọikwuu.* 33 Ma mgbe ha ka kpụ anụ ahụ n’ọnụ, tupu ha ataa ya, Jehova wesara ha ezigbo iwe. Jehova wee gbuwe ọtụtụ n’ime ha.+
34 Ha wee kpọọ ebe ahụ Kibrọt-hateeva,*+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha liri ndị ahụ nwere akpịrị ogologo.+ 35 Ndị Izrel si na Kibrọt-hateeva kwaga Hazirọt. Ha wee nọrọ na Hazirọt.+
12 Miriam na Erọn malitere ikwujọ Mosis n’ihi nwaanyị onye Kush ọ lụrụ, maka na nwaanyị ọ lụrụ bụ onye Kush.+ 2 Ha nọ na-asị: “Ọ̀ bụ naanị Mosis ka Jehova sirila n’ọnụ ya kwuo okwu? Ó sibeghịkwa n’ọnụ anyị kwuo okwu?”+ Jehova nọkwa na-ege ntị.+ 3 Nwoke a bụ́ Mosis dị umeala n’obi karịa mmadụ niile+ nọ n’ụwa.
4 Jehova gwara Mosis na Erọn na Miriam na mberede, sị: “Unu atọ, gaanụ n’ụlọikwuu nzute.” Ha atọ wee gaa. 5 Jehova gbadataziri n’ogidi ígwé ojii,+ guzo n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ. O wee kpọọ Erọn na Miriam, ha abụọ agaa nso. 6 O wee sị ha: “Biko, nụrụnụ okwu m. Ọ bụrụ na e nwere onye amụma Jehova n’ime unu, m ga-esi n’ọhụụ mee ka ọ mata m.+ M ga-agwakwa ya okwu ná nrọ.+ 7 Ma, emeghị m otú ahụ n’ebe Mosis ohu m nọ. Ọ bụ ya ka a na-enyefe ụlọ m niile.*+ 8 M na-agwa ya okwu ihu na ihu,*+ otú doro anya. Anaghị m agwa ya okwu n’ilu. Jehova na-apụtakwa n’ihu ya. Gịnịzi mere na egwu atụghị unu ikwujọ Mosis ohu m?”
9 Jehova wee wesa ha ezigbo iwe. Ọ pụkwara n’ebe ha nọ. 10 Ígwé ojii ahụ si n’elu ụlọikwuu ahụ pụọ, ma lee, ekpenta pụtara Miriam n’ahụ́, ahụ́ ya achawa ezigbo ọcha.+ Erọn wee lee Miriam anya, ya ahụ na Miriam bụzi onye ekpenta.+ 11 Erọn gwara Mosis ozugbo, sị: “Onyenwe m, m na-arịọ gị, biko, gbaghara anyị mmehie a. Anyị zuzuru nzuzu n’ihe a anyị mere. 12 Biko, ekwela ka ọ dịrị ka onye nwụrụ anwụ, onye ebe ụfọdụ n’ahụ́ ya richara ericha mgbe a mụrụ ya.” 13 Mosis wee malite ịrịọ Jehova, sị: “Biko, Chineke, gwọọ ya, bikonụ.”+
14 Jehova gwara Mosis, sị: “Ọ bụrụ na nna ya agbụọ ya asọ mmiri n’ihu, ọ̀ bụ na ihere onwe ya agaghị eme ya ruo ụbọchị asaa? Ka e si n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ ya ka ọ nọrọ iche ruo ụbọchị asaa.+ E mechaa, e nwere ike ịkpọbata ya.” 15 E wee si n’ebe ha mara ụlọikwuu kpọpụ Miriam iche ruo ụbọchị asaa.+ Ndị Izrel akwagaghị ebe ọzọ ruo mgbe a kpọbatara Miriam. 16 Ndị Izrel wee si na Hazirọt kwalie.+ Ha malitere ịma ụlọikwuu n’ala ịkpa Peran.+
13 Jehova gwara Mosis, sị: 2 “Zie ụmụ nwoke ka ha gaa nyopụta otú ala Kenan dị, bụ́ ala m ga-enye ndị Izrel. Ị ga-esi n’ebo nke ọ bụla kpọta otu onye ka o soro ná ndị ị ga-eziga. Onye ọ bụla n’ime ha+ ga-abụ onyeisi.”+
3 N’ihi ya, Mosis si n’ala ịkpa Peran+ ziga ha otú Jehova nyere n’iwu. Ụmụ nwoke niile ahụ bụcha ndị isi ndị Izrel. 4 Ihe a bụ aha ha: n’ebo Ruben, Shamua nwa Zakọ; 5 n’ebo Simiọn, Shefat nwa Horaị; 6 n’ebo Juda, Keleb+ nwa Jefune; 7 n’ebo Ịsaka, Aịgal nwa Josef; 8 n’ebo Ifrem, Hoshia+ nwa Nọn; 9 n’ebo Benjamin, Paltaị nwa Refọ; 10 n’ebo Zebulọn, Gadiel nwa Sodaị; 11 n’ebo Josef,+ ya bụ, ebo Manase,+ Gadaị nwa Susaị; 12 n’ebo Dan, Amiel nwa Gemalaị; 13 n’ebo Asha, Sitọ nwa Maịkel; 14 n’ebo Naftalaị, Nabaị nwa Vọfsaị; 15 n’ebo Gad, Guel nwa Mekaị. 16 Ihe a bụ aha ụmụ nwoke Mosis ziri ka ha gaa nyopụta otú ala ahụ dị. Mosis gụrụ Hoshia nwa Nọn Joshụa.*+
17 Mgbe Mosis na-edunye ha ka ha gaa nyopụta otú ala Kenan dị, ọ sịrị ha: “Gaanụ Negeb,* gbagookwanụ n’ebe bụ́ ugwu ugwu.+ 18 Chọpụtanụ otú ala ahụ dị,+ chọpụtakwanụ ma ndị bi na ya hà siri ike ka ọ̀ bụ na ha esighị ike, ma hà dị ọtụtụ ka hà dị ole na ole, 19 ma ala ha ọ̀ dị mma ka ọ̀ bụ na ọ dịghị mma, ma ọ̀ bụ ụlọikwuu ka ha mara n’obodo ndị ha bi ka à rụsiri obodo ha ike. 20 Chọpụtakwanụ ma ala ha ọ̀ na-eme nri ka ọ̀ bụ na ọ naghị eme nri,+ ma osisi ọ̀ dị na ya ka ọ̀ bụ na ọ dịghị. Nweenụ obi ike,+ wetakwanụ ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala ahụ.” Oge ahụ bụ oge mkpụrụ vaịn mbụ na-acha.+
21 Ha wee gaa nyopụta otú ala ahụ dị malite n’ala ịkpa Zin+ ruo Rihọb,+ nke dị nso na Libo-hemat.*+ 22 Mgbe ha garuru Negeb, ha bịarutere Hebrọn,+ bụ́ ebe Ahaịman, Shishaị, na Talmaị,+ bụ́ ndị Anakim,+ bi. Afọ asaa agaala a rụrụ Hebrọn tupu a rụọ Zoan n’Ijipt. 23 Mgbe ha bịarutere na Ndagwurugwu Eshkọl,+ ha gbuturu otu alaka osisi vaịn nke mịrị nnukwu ụyọkọ mkpụrụ vaịn. Mmadụ abụọ n’ime ụmụ nwoke ahụ ji okporo osisi buru ya. Ha butekwara ụfọdụ mkpụrụ pomigranet na ụfọdụ mkpụrụ fig.+ 24 Ha kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl*+ n’ihi ụyọkọ mkpụrụ osisi ahụ ndị Izrel gbutere n’ebe ahụ.
25 Mgbe ụbọchị iri anọ gachara,+ ha si n’ala ahụ ha gara inyopụta otú ọ dị lọta. 26 Ha wee gakwuru Mosis na Erọn na nzukọ Izrel niile n’ala ịkpa Peran, nke dị na Kedesh.+ Ha wee kọọrọ nzukọ ahụ niile otú ha si jee, gosikwa ha mkpụrụ ndị si n’ala ahụ. 27 Ha kọọrọ Mosis, sị: “Anyị banyere n’ala ahụ i dunyere anyị ka anyị gaa. N’eziokwu, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Mkpụrụ ndị a sikwa na ya.+ 28 Ma, ndị bi n’ala ahụ siri ike. A rụsiri obodo ndị dị na ya ezigbo ike. Anyị hụkwara ndị Anakim n’ebe ahụ.+ 29 Ndị Amalek+ bi n’ala Negeb.+ Ndị Het, ndị Jebus,+ na ndị Amọraịt+ bikwa n’ebe bụ́ ugwu ugwu, ndị Kenan+ ebiri n’akụkụ oké osimiri+ nakwa n’akụkụ Osimiri Jọdan.”
30 Ka ndị Izrel kwụ n’ihu Mosis, Keleb gbalịrị ime ka ha kwụsị ịtụ ụjọ. Ọ sịrị: “Ka anyị gawa ozugbo. Anyị ga-eweghara obodo ahụ n’ihi na anyị ga-emerili ya.”+ 31 Ma ụmụ nwoke ahụ ha na ya so gaa sịrị: “Anyị agaghị alụsoli ndị obodo ahụ agha n’ihi na ha ka anyị ike.”+ 32 Ha wee na-akọrọ ndị Izrel akụkọ ọjọọ+ banyere ala ahụ ha gara nyopụta otú ọ dị, na-asị: “Ala ahụ anyị gara inyopụta otú ọ dị bụ ala na-ata isi ndị bi na ya. Ndị niile anyị hụrụ na ya gbara ajọ dimkpa.+ 33 Anyị hụkwara ndị Nefilim n’ebe ahụ, bụ́ ụmụ Anak,+ ndị si n’agbụrụ* ndị Nefilim. Anyị dịkwa ka ụkpara, ma n’anya anyị ma n’anya ha.”
14 Nzukọ ahụ niile wee malite ibe ákwá. Ha nọ na-eti mkpu, na-ebesikwa ákwá ike n’abalị ahụ niile.+ 2 Ndị Izrel niile wee malite ịkatọ* Mosis na Erọn.+ Nzukọ ahụ niile kwukwara okwu ọjọọ banyere ha, sị: “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ n’Ijipt ma ọ bụkwanụ ma a sị na anyị nwụrụ n’ala ịkpa a. 3 Gịnị mere Jehova ji akpọta anyị n’ala a ka e jiri mma agha gbuo anyị?+ A ga-akpọkọrọ ndị nwunye anyị na ụmụ anyị.+ Ọ́ kaghị mma ka anyị laghachi n’Ijipt?”+ 4 Ha nọ na-agwadị ibe ha, sị: “Ka anyị mee otu onye onye ndú anyị ma laghachi n’Ijipt!”+
5 Mosis na Erọn wee gbuo ikpere n’ala ma kpudo ihu n’ala n’ihu nzukọ Izrel niile ndị gbakọrọ n’ebe ahụ. 6 Joshụa+ nwa Nọn na Keleb+ nwa Jefune, bụ́ ndị so gaa nyopụta otú ala ahụ dị, dọwara uwe ha. 7 Ha wee gwa nzukọ Izrel niile, sị: “Ala ahụ anyị gara nyopụta otú ọ dị bụ nnọọ ezigbo ala.+ 8 Ọ bụrụ na ihe anyị dị Jehova mma, ọ ga-akpọba anyị n’ala ahụ ma nye anyị ya. Ọ bụ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ 9 Ma, unu anwala anwa nupụrụ Jehova isi. Unu atụla ndị ala ahụ egwu+ n’ihi na anyị ga-emeri ha.* E wepụla ihe na-echebe ha. Jehova nọnyeere anyị.+ Unu atụla ha egwu.”
10 Ma, nzukọ ahụ niile kwuru ka a tụọ ha nkume.+ Ma, ebube Jehova pụtara n’elu ụlọikwuu nzute n’ihu ndị Izrel niile.+
11 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Olee mgbe ndị a ga-akwụsị ịkparị m?+ Olee mgbe ha ga-amalite inwe okwukwe n’ebe m nọ ebe ọ bụ na ha ahụla ọrụ ebube niile m rụrụ* n’ihu ha?+ 12 Ka m mee ka ha rịawa ọrịa ọjọọ ma chụpụ ha. Ka m mezie ka ị bụrụ nnukwu mba, nke dị ike karịa ha.”+
13 Ma Mosis gwara Jehova, sị: “Ndị Ijipt, bụ́ ndị i ji ike gị kpọpụta ndị a n’aka ha, ga-anụ ya.+ 14 Ha ga-agwakwa ya ndị bi n’ala a. Ndị bi n’ala a anụkwala na gịnwa, bụ́ Jehova, nọnyeere ndị a+ nakwa na ha ahụla gị ihu na ihu.+ Ị bụ Jehova. Ígwé ojii gị dị n’elu isi ha. I ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị.+ 15 Ọ bụrụ na i gbuchapụ ndị a otu mgbe, mba ndị nụrụ ude gị ga-asị: 16 ‘Jehova enweghị ike ịkpọba ndị a n’ala ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-enye ha, ọ bụ ya mere o ji gbuo ha n’ala ịkpa.’+ 17 Ugbu a, Jehova, biko, gosi ike gị dị ukwuu, otú i kwere ná nkwa, sị: 18 ‘Jehova, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya* dị ukwuu,+ onye na-agbaghara ajọ omume na mmebi iwu. Ma ọ gaghị anwa anwa hapụ ịta onye ikpe mara ahụhụ, kama ọ na-ata ụmụ nakwa ọgbọ nke atọ na ọgbọ nke anọ ahụhụ n’ihi mmehie ndị nna ha mere.’+ 19 Biko, n’ihi ịhụnanya gị* dị ukwuu, gbaghara ndị a mmehie ha, otú i si na-agbaghara ha malite n’Ijipt ruo ugbu a.”+
20 Jehova wee sị: “Agbagharala m ha otú i kwuru.+ 21 Ma, ebe ọ bụ na mụnwa bụ́ Jehova na-adị ndụ, ebube m ga-ejupụta ụwa niile.+ 22 Ma e nweghị otu onye n’ime ndị niile hụrụ ebube m nakwa ọrụ ebube+ ndị m rụrụ* n’Ijipt nakwa n’ala ịkpa ma ka na-anwa m ọnwụnwa+ ugboro iri a, gharakwa ige m ntị,+ 23 ga-ahụ ala m ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na m ga-enye ha. N’eziokwu, e nweghị otu onye n’ime ndị na-akparị m ga-ahụ ya.+ 24 Ma ebe ọ bụ na otú Keleb+ ohu m si ele ihe anya dị iche,* ya ejirikwa obi ya niile na-eso m, m ga-eme ka ọ banye n’ala ahụ ọ gara, ụmụ ya ga-enwetakwa ya.+ 25 Tụgharịanụ echi gawa n’ala ịkpa dị n’ụzọ Oké Osimiri Uhie+ ebe ọ bụ na ndị Amalek na ndị Kenan+ bi na ndagwurugwu.”
26 Jehova wee gwa Mosis na Erọn, sị: 27 “Olee mgbe nzukọ ọjọọ a ga-akwụsị nkatọ a ha na-akatọ m?*+ Anụla m nkatọ ndị Izrel na-akatọ m.+ 28 Gwa ha, sị, ‘Jehova kwuru, sị, “Ebe ọ bụ na m na-adị ndụ, m ga-eme unu ihe m nụrụ unu kwuru.+ 29 N’ala ịkpa a ka ozu unu ga-atọgbọrọ,+ ya bụ, unu niile ndị katọrọ m,* bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe.+ 30 E nweghị onye n’ime unu ga-aba n’ala ahụ m ṅụrụ iyi na unu ga-ebi na ya,+ ma e wepụ Keleb nwa Jefune na Joshụa nwa Nọn.+
31 “‘“M ga-akpọrọ ụmụ unu, ndị unu sịrị na a ga-akpọkọrọ,+ kpọba ha n’ala ahụ. Ha ga-ekpori ndụ n’ala ahụ unu jụrụ.+ 32 Ma ozu unu ga-atọgbọrọ n’ala ịkpa a. 33 Ụmụ unu ndị nwoke ga na-azụ atụrụ n’ala ịkpa a ruo afọ iri anọ.+ Ha ga-aza ajụjụ maka na unu hapụrụ m.* Ha ga-aza ya ruo mgbe ozu onye nke ikpeazụ n’ime unu dara n’ala ịkpa a.+ 34 Unu ga-aza ajụjụ maka mmehie unu afọ iri anọ+ ka unu wee mata ihe ịhapụ m pụtara.* Ụbọchị iri anọ unu ji nyopụta otú ala ahụ dị+ nọchiri anya afọ iri anọ, otu ụbọchị nọchiri anya otu afọ, otu ụbọchị nọchiri anya otu afọ.
35 “‘“Mụnwa bụ́ Jehova ekwuola ya. Ihe a ka m ga-eme nzukọ ọjọọ a, bụ́ ndị zukọtara ka ha maa m aka: N’ala ịkpa a ka a ga-ebibi ha. Ọ bụkwa n’ebe a ka ha ga-anwụ.+ 36 Ụmụ nwoke ndị ahụ Mosis zipụrụ ka ha gaa nyopụta otú ala ahụ dị, ndị mekwara ka nzukọ a niile katọwa ya* mgbe ha lọtara kọọ akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ,+ 37 n’eziokwu, a ga-ata ụmụ nwoke ndị ahụ kọrọ akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ ahụhụ. Ha ga-anwụkwa n’ihu Jehova.+ 38 Ma, Joshụa nwa Nọn na Keleb nwa Jefune, bụ́ ndị so gaa nyopụta otú ala ahụ dị, ga-adị ndụ.”’”+
39 Mgbe Mosis gwara ndị Izrel niile ihe ndị a, ha malitere iru uju nke ukwuu. 40 Ha bilikwara n’isi ụtụtụ gbagowe n’elu elu ebe bụ́ ugwu ugwu, na-asị, “Anyị adịla njikere ịgbago n’ebe ahụ Jehova kwuru okwu ya, n’ihi na anyị emehiela.”+ 41 Ma Mosis kwuru, sị: “Gịnị mere unu ji na-ada iwu Jehova? Ihe a agaghị agaziri unu. 42 Unu agbagola n’ihi na Jehova anọnyereghị unu. Ndị iro unu ga-emeri unu.+ 43 Ndị Amalek na ndị Kenan nọ n’ebe ahụ ịlụso unu agha.+ A ga-ejikwa mma agha gbuo unu. Ebe ọ bụ na unu kwụsịrị iso Jehova, Jehova agaghị anọnyere unu.”+
44 Ma, ha gbagoro n’elu elu ebe bụ́ ugwu ugwu maka na ha dị mpako.+ Ma Mosis na igbe ọgbụgba ndụ Jehova esighị n’etiti ebe ha mara ụlọikwuu pụọ.+ 45 Ndị Amalek na ndị Kenan, bụ́ ndị bi n’ugwu ahụ, wee gbadata gbuo ha ma chụsasịa ha ruo Họma.+
15 Jehova gwara Mosis okwu ọzọ, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu mechara bata n’ala m na-enye unu ka unu biri na ya,+ 3 unu achọọ isi n’ìgwè ehi ma ọ bụ n’ìgwè ewu na atụrụ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* unu na-achụrụ Jehova,+ ma ọ̀ bụ àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ̀ bụ àjà mmadụ chọrọ iji mezuo nkwa pụrụ iche o kwere ma ọ̀ bụ onyinye si ya n’obi+ ọ chọrọ inye ma ọ bụ onyinye a na-enye n’oge ememme unu dị iche iche,+ 4 onye na-eweta onyinye ya ga-ewetakwara Jehova àjà ọka, ya bụ, otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma,+ nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ. 5 Unu ga-ejikwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin mmanya chụọ àjà mmanya mgbe unu na-achụ àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ bụ mgbe unu ji nwa ebule ọ bụla na-achụ àjà. 6 Ma ọ bụ, mgbe unu na-achụ ebule n’àjà, unu ga-eji ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin mmanụ chụọ àjà ọka. 7 Unu ga-ewetakwa otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin mmanya ka ọ bụrụ àjà mmanya. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.
8 “‘Ma ọ bụrụ na unu chọrọ iji oké ehi chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ+ ma ọ bụ àjà udo+ ma ọ bụ àjà unu ji emezu nkwa pụrụ iche+ unu kwere, 9 unu ga-ewetakọta oké ehi ahụ na àjà ọka,+ ya bụ, ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara ọkara otu hin mmanụ. 10 Unu ga-ewetakwa ọkara otu hin mmanya ka ọ bụrụ àjà mmanya.+ Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. 11 Ọ bụ ihe a ka a ga-eme mgbe unu na-achụ oké ehi ọ bụla ma ọ bụ ebule ọ bụla ma ọ bụ nwa ebule ọ bụla ma ọ bụ ewu ọ bụla n’àjà. 12 N’agbanyeghị ole unu na-achụ n’àjà, ọ bụ ihe a ka unu ga-eme mgbe unu na-achụ nke ọ bụla n’àjà. 13 Ọ bụ otú a ka nwa afọ Izrel ọ bụla ga-esi na-achụ àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.
14 “‘Ọ bụrụ na onye mbịarambịa nke binyeere unu ma ọ bụ onye bi n’obodo unu kemgbe ọtụtụ afọ chọrọ ịchụ àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova, o kwesịrị ịchụ ya otú unu si achụ ya.+ 15 Ọ bụ otu iwu ga na-achị ununwa ndị so n’ọgbakọ a na onye mbịarambịa binyeere unu. Ọ ga-abụ iwu ga-adịgide adịgide nke ọgbọ unu niile ga na-edebe. Unu na onye mbịarambịa ga-abụ otu n’ihu Jehova.+ 16 Otu iwu na otu ntụziaka ga na-achị unu na onye mbịarambịa binyeere unu.’”
17 Jehova gwakwara Mosis, sị: 18 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu ga-abata n’ala m na-akpọga unu, 19 unu ewee rie nri* ala ahụ mepụtara,+ unu ga-enye Jehova onyinye. 20 Unu ga-eji ntụ ọka* si ná mkpụrụ mbụ+ unu wetara n’ubi mee achịcha ndị dị okirikiri ma jiri ha nye onyinye. Unu ga-enye ha n’onyinye otú unu si enye ihe si n’ebe unu na-azọcha ọka. 21 Unu ga na-enye Jehova ụfọdụ ntụ ọka si ná mkpụrụ mbụ unu wetara n’ubi ka ọ bụrụ onyinye a na-enye ya n’ọgbọ unu niile.
22 “‘Ọ bụrụ na unu emehie ma ghara ime ihe a niile Jehova nyere Mosis n’iwu, 23 ya bụ, ihe niile Jehova si n’ọnụ Mosis nye unu n’iwu, malite n’ụbọchị Jehova nyere ha n’iwu ruo n’ọgbọ unu niile, 24 ọ bụrụ na e mere ihe ahụ n’amaghị ụma, ya abụrụkwa na nzukọ unu amaghị banyere ya, nzukọ unu niile ga-achụ oké ehi n’àjà ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova. Unu ga-achụkwa àjà ọka na àjà mmanya ha na ya na-agakọ otú e nyere iwu ka e si na-achụ ha,+ jirikwa otu nwa ewu chụọ àjà mmehie.+ 25 Onye nchụàjà ga-ekpuchiri nzukọ Izrel niile mmehie ha, a ga-agbagharakwa ha mmehie ha,+ n’ihi na e mere ya n’amaghị ụma, ha wetakwara onyinye ha ka e jiri ha chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, wetakwa àjà mmehie ha n’ihu Jehova n’ihi ihe ha mere n’amaghị ụma. 26 A ga-agbaghara nzukọ Izrel niile na ndị mbịarambịa binyeere ha n’ihi na ha niile mere mmehie ahụ n’amaghị ụma.
27 “‘Ọ bụrụ na onye* ọ bụla emehie n’amaghị ụma, ọ ga-eweta nne ewu na-agafebeghị otu afọ ka ọ bụrụ àjà mmehie.+ 28 Onye nchụàjà ga-ekpuchiri onye* ahụ mehiere n’amaghị ụma mmehie ya nke o mere n’ihu Jehova, ka e wee kpuchie mmehie ahụ. A ga-agbagharakwa ya.+ 29 Otu iwu ga na-achị ụmụ afọ Izrel na onye mbịarambịa binyeere ha ma a bịa n’ihe gbasara mmehie mmadụ mere n’amaghị ụma.+
30 “‘Ma onye* kpachaara anya mehie,+ ma ọ̀ bụ nwa afọ ma ọ̀ bụ onye mbịarambịa, ọ na-ekwulu Jehova. A ga-egbu ya.* 31 A ga-egburịrị onye* ahụ maka na o leghaara okwu Jehova anya, mebiekwa iwu ya.+ Mmehie ya ga-adị ya n’isi.’”+
32 Mgbe ndị Izrel nọ n’ala ịkpa, ha hụrụ otu nwoke ka ọ na-akpa nkụ n’Ụbọchị Izu Ike.+ 33 Ndị hụrụ ka ọ na-akpa nkụ kpọọrọ ya bịakwute Mosis na Erọn na nzukọ ahụ niile. 34 Ha jichiri ya+ n’ihi na e kwubeghị ihe a ga-eme ya.
35 Jehova wee gwa Mosis, sị: “A ga-egburịrị nwoke ahụ.+ Nzukọ ahụ niile ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kpọpụ ya ma tụọ ya nkume.”+ 36 Nzukọ ahụ niile wee si n’ebe ha mara ụlọikwuu kpọpụ ya ma were nkume tụgbuo ya, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
37 Jehova gwaziri Mosis, sị: 38 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha na ha ga na-adụnye ihe dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha n’ọgbọ ha niile. Ha ga-adụnyekwa eriri na-acha anụnụ anụnụ n’elu ebe ahụ a dụnyere ihe ahụ dị yọrị yọrị n’ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ha.+ 39 ‘Unu ga-adụnye ihe ahụ dị yọrị yọrị ka unu na-ahụ ya wee na-echeta ihe niile Jehova nyere n’iwu ma na-eme ha.+ Unu esokwala obi unu na anya unu, bụ́ ihe ndị na-eme ka unu kpaa àgwà ka ndị akwụna hapụ m fewe chi ọzọ.+ 40 Iwu a ga-eme ka unu na-echeta ihe niile m nyere n’iwu. Unu ga-emekwa ha ma bụrụ ndị dị nsọ n’anya Chineke unu.+ 41 Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt iji gosi na m bụ Chineke unu.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.’”+
16 Kora+ nwa Izha,+ nwa Kohat,+ nwa Livaị,+ ya na Detan na Abaịram bụ́ ụmụ Elayab,+ nakwa Ọn nwa Pilet, bụ́ ụmụ Ruben,+ wee zukọta. 2 Ha malitere ịma Mosis aka, ha na narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250) ndị Izrel, bụ́ ndị isi nzukọ ahụ, ndị e si n’ọgbakọ ahụ họrọ, ụmụ nwoke a ma ama. 3 Ha zukọtara na-akatọ+ Mosis na Erọn. Ha sịrị ha: “O zuolara unu! Nzukọ a niile dị nsọ,+ Jehova nọnyekwaara ha.+ Gịnịzi mere unu ga-eji na-ebuli onwe unu elu n’ọgbakọ Jehova?”
4 Mgbe Mosis nụrụ ihe a, o gburu ikpere n’ala ozugbo, kpudo ihu n’ala. 5 O wee gwa Kora na ndị niile na-akwado ya, sị: “N’ụtụtụ, Jehova ga-eme ka a mara onye bụ́ onye nke ya+ na onye dị nsọ na onye ga na-abịa ya nso.+ Ọ bụ onye ọ bụla ọ họọrọ+ ga na-abịa ya nso. 6 Kora, gị na ndị niile na-akwado gị,+ meenụ ihe a: Werenụ ihe ndị e ji amụ insens,+ 7 gụnyenụ ọkụ na ha echi ma tụkwasị insens* na ha n’ihu Jehova. Ọ bụ onye Jehova ga-ahọrọ+ bụ onye dị nsọ. Ụmụ Livaị,+ nsogbu unu akarịala!”
8 Mosis wee gwa Kora, sị: “Biko, geenụ ntị, unu ụmụ Livaị. 9 Ọ̀ bụụrụ unu obere ihe na Chineke Izrel si ná nzukọ Izrel wepụta unu iche+ ma kwe ka unu na-abịa ya nso ka unu wee na-arụ ọrụ gbasara ụlọikwuu Jehova nakwa ka unu na-eguzo n’ihu nzukọ a na-ejere ha ozi?+ 10 Ọ̀ bụkwaara unu obere ihe na ọ kpọtara gị na ụmụnne gị niile, bụ́ ụmụ Livaị, ka unu nọrọ ya nso? Ùnu chọkwuru ka unu bụrụ ndị nchụàjà?+ 11 N’ihi ya, ọ bụ Jehova ka gị na ndị niile na-akwado gị na-ama aka. Ma ònye ka Erọn bụ mere unu ga-eji na-akatọ ya?”*+
12 Mosis mechara zie ozi ka Detan na Abaịram,+ ụmụ Elayab, bịa. Ma ha sịrị: “Anyị agaghị abịa! 13 Ọ̀ bụ obere ihe na i si n’ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya* kpọpụta anyị ka i gbuo anyị n’ala ịkpa a?+ Ugbu a, ị̀ chọkwuru ime onwe gị onyeisi anyị?* 14 Ka ọ dị ugbu a, ị kpọbabeghị anyị n’ala ọ bụla mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ I nyebeghịkwa anyị ala na ubi vaịn. Ị̀ ga-aghụpụta ụmụ nwoke ndị ahụ anya?* Anyị agaghị abịa!”
15 N’ihi ya, ezigbo iwe were Mosis, ya asị Jehova: “Elela àjà ọka ha anya. E nweghị jakị ọ bụla m naara ha, emejọghịkwa m otu onye n’ime ha.”+
16 Mosis wee gwa Kora, sị: “Gị na ndị niile na-akwado gị, bịanụ n’ihu Jehova echi, gị na ha na Erọn. 17 Onye ọ bụla were ihe ọ ga-eji amụ insens ma tụkwasị insens* na ya. Onye ọ bụla n’ime unu ga-eweta ihe ọ ga-eji amụ insens n’ihu Jehova, ya bụ, narị ihe e ji amụ insens abụọ na iri ise (250), ma gịnwa ma Erọn. Onye ọ bụla n’ime unu ga-eji ihe ọ ga-eji amụ insens bịa.” 18 Onye ọ bụla n’ime ha wee were ihe ọ ga-eji mụọ insens, tinye ọkụ na ya, tụkwasịkwa insens* na ya ma guzoro n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ha na Mosis na Erọn. 19 Mgbe Kora kpọkọtara ndị na-akwado ya+ ka ha maa ha aka n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ebube Jehova pụtara n’ihu nzukọ ahụ niile.+
20 Jehova gwaziri Mosis na Erọn, sị: 21 “Sinụ n’ebe ìgwè mmadụ a nọ pụọ ka m wee bibie ha n’otu ntabi anya.”+ 22 Ha wee gbuo ikpere n’ala ma kpudo ihu n’ala, sị: “Biko, Chineke, gị onye na-enye mmadụ niile ndụ,*+ mmehie otu onye mere ọ̀ ga-eme ka i wesa nzukọ a niile iwe?”+
23 Jehova wee sị Mosis: 24 “Gwa nzukọ a okwu, sị ha, ‘Sinụ na gburugburu ebe ụlọikwuu Kora, Detan, na Abaịram dị pụọ!’”+
25 Mosis biliri gakwuru Detan na Abaịram, ndị okenye+ Izrel sokwa ya gaa. 26 Ọ gwara nzukọ ahụ, sị: “Biko, sinụ n’ebe ụlọikwuu ndị ajọ omume a dị pụọ. Unu emetụkwala ihe ọ bụla bụ́ nke ha aka, ka e wee ghara ibibi unu n’ihi mmehie niile ha mere.” 27 Ha si na gburugburu ebe ụlọikwuu Kora, Detan, na Abaịram dị pụọ ozugbo. Detan na Abaịram pụtara guzoro n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ha, ha na ndị nwunye ha, ụmụ ha ndị torola eto, na ụmụntakịrị ha.
28 Mosis wee sị: “Unu ga-eji ihe a mara na ọ bụ Jehova zitere m ka m mee ihe a niile, na ọ bụghị m chepụtara ha: 29 Ọ bụrụ na ndị a anwụọ otú mmadụ niile si anwụ, ọ bụrụkwa na a taa ha ahụhụ otú e si ata mmadụ niile ahụhụ, maranụ na ọ bụghị Jehova zitere m.+ 30 Ma ọ bụrụ na Jehova ga-eme ha ihe pụrụ iche, mee ka ala meghee* loo ha na ihe niile bụ́ nke ha, ha abanye n’ili* ná ndụ, unu ga-amara n’eziokwu na ụmụ nwoke ndị a akparịala Jehova.”
31 Ozugbo o kwuchara ihe a niile, ala ebe ha zọkwasịrị ụkwụ gbawara.+ 32 Ala wee meghee* loo ha na ezinụlọ ha na ndị niile na-akwado Kora+ nakwa ngwongwo ha niile. 33 Ha na ndị niile na-akwado ha banyere n’ili* ná ndụ, ala ekpuchie ha. Ha wee laa n’iyi.*+ 34 Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu wee gbaa ọsọ mgbe ha nụrụ mkpu ha, n’ihi na ha sịrị: “Anyị na-atụ egwu na ala nwere ike ilo anyị!” 35 Jehova wee zite ọkụ,+ ya eregbuo narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250) ahụ, ndị nọ na-achụ insens* n’àjà.+
36 Jehova gwaziri Mosis, sị: 37 “Gwa Elieza nwa Erọn onye nchụàjà ka o si n’ọkụ ahụ wepụtasịa ihe ndị ahụ e ji amụ insens+ n’ihi na ihe ndị ahụ dị nsọ. Gwakwa ya ka ọ wụsasịa ọkụ ahụ n’ebe dịtụ anya. 38 A ga-eji ihe ndị ahụ e ji amụ insens, bụ́ ndị ụmụ nwoke ahụ mere mmehie ma kpatara onwe ha ọnwụ ji mụọ insens, rụọ mbadamba ọla ndị dị fere fere a ga-eji machie ebe ịchụàjà,+ n’ihi na ha wetara ihe ndị ahụ n’ihu Jehova, ihe ndị ahụ ewee dị nsọ. Ha ga-abụrụ ndị Izrel ihe àmà.’”+ 39 Elieza onye nchụàjà weere ihe ndị ahụ e ji amụ insens, bụ́ ndị e ji ọla kọpa mee, ya bụ, ihe ndị ahụ ọkụ regburu wetara, ma kụọ ha ka ha dị mbadamba ka e jiri ha machie ebe ịchụàjà, 40 otú Jehova si n’ọnụ Mosis gwa ya. Ọ bụ ihe na-echetara ndị Izrel na onye na-abụghị onye nchụàjà,* onye na-abụghịkwa nwa Erọn, agaghị abịa nso ka ọ mụọ insens n’ihu Jehova+ nakwa na onye ọ bụla ekwesịghị ịdị ka Kora na ndị kwadoro ya.+
41 N’echi ya, nzukọ Izrel niile malitere ịkatọ* Mosis na Erọn,+ sị: “Unu abụọ egbusịala ndị Jehova.” 42 Mgbe nzukọ ahụ zukọtara na-akatọ Mosis na Erọn, ha tụgharịrị chee ihu n’ụlọikwuu nzute, ígwé ojii wee kpuchie ụlọikwuu ahụ, ebube Jehova malitekwara ịpụta.+
43 Mosis na Erọn gara n’ihu ụlọikwuu nzute ahụ,+ 44 Jehova wee gwa Mosis, sị: 45 “Sinụ n’etiti nzukọ a pụọ ka m bibie ha n’otu ntabi anya.”+ Ha wee gbuo ikpere n’ala ma kpudo ihu n’ala.+ 46 Mosis gwaziri Erọn, sị: “Were ihe e ji amụ insens, gụrụ ọkụ n’ebe ịchụàjà gụnye na ya,+ tụkwasịkwa insens* na ya ma gakwuru nzukọ ahụ ọsọ ọsọ kpuchiere ha mmehie ha,+ n’ihi na iwe eweela Jehova. Ọrịa ọjọọ arịawala ha!” 47 Erọn weere ya ozugbo otú Mosis kwuru, gbara ọsọ gbaba n’etiti ọgbakọ ahụ, ya abụrụ na ọrịa ọjọọ ahụ arịawala ndị Izrel. O wee tụkwasị insens n’ihe ahụ e ji amụ insens malite ikpuchiri ha mmehie ha. 48 Ọ kwụụrụ n’agbata ndị nwụrụ anwụ na ndị dị ndụ. Ọrịa ọjọọ ahụ wee mechaa kwụsị. 49 Ndị ọrịa ọjọọ ahụ gburu dị puku iri na anọ na narị asaa (14,700), ma e wepụ ndị nwụrụ n’ihi Kora. 50 Mgbe Erọn mechara gakwuru Mosis n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, ọrịa ọjọọ ahụ akwụsịla.
17 Jehova gwaziri Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel okwu, natakwa ha otu mkpara maka otu ọnụmara. Onyeisi ọnụmara nke ọ bụla ga-eweta otu mkpara.+ Mkpara niile ị ga-anata ga-adị iri na abụọ. Ị ga-ede aha onyeisi nke ọ bụla na mkpara ya. 3 Ị ga-ede aha Erọn na mkpara ebo Livaị n’ihi na ọ bụ otu mkpara ka a ga-eweta maka onyeisi ọnụmara nke ọ bụla. 4 Chịsa mkpara ndị ahụ n’ụlọikwuu nzute, n’ihu igbe ọgbụgba ndụ,*+ bụ́ ebe m na-apụta n’ihu unu mgbe niile.+ 5 Mkpara onye m ga-ahọrọ+ ga-awa okooko. M ga-emekwa ka ndị Izrel kwụsị ịkatọ m,*+ ka ha kwụsịkwa ịkatọ unu.”+
6 Mosis wee gwa ndị Izrel okwu. Ndị isi ha niile wee nye ya mkpara. Otu mkpara maka onyeisi ọnụmara nke ọ bụla, ya bụ, mkpara iri na abụọ. Mkpara Erọn so na mkpara ndị ahụ. 7 Mosis chịsaziri mkpara ndị ahụ n’ihu Jehova, n’ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.*
8 N’echi ya, mgbe Mosis banyere n’ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya,* mkpara Erọn, nke bụ́ maka ụlọ Livaị, amaala ifuru, gbawaa, malite ịwa okooko, na-amịpụtakwa mkpụrụ almọnd ndị chara acha. 9 Mosis wee si n’ihu Jehova chịpụtara ndị Izrel niile mkpara ahụ niile. Ha lere mkpara ndị ahụ anya, onye ọ bụla ewere nke ya.
10 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Tinyeghachi mkpara Erọn+ n’ihu igbe ọgbụgba ndụ* ka ọ bụụrụ ndị a na-enupụ isi+ ihe àmà,+ ka ha kwụsị ịkatọ m,* ka ha ghara ịnwụ.” 11 Ozugbo ahụ, Mosis mere ihe Jehova nyere ya n’iwu. O mere nnọọ otú ahụ.
12 Ndị Izrel wee sị Mosis: “Ugbu a, anyị ga-anwụ. A ga-ebibi anyị. Anyị niile ga-ala n’iyi. 13 Onye ọ bụla bịadịrị ụlọikwuu Jehova nso ga-anwụ.+ Ọ̀ bụ otú a ka anyị ga-esi nwụchaa?”+
18 Jehova wee gwa Erọn, sị: “Gị na ụmụ gị ndị nwoke na ndị si n’ọnụmara gị ga-aza ajụjụ mgbe ọ bụla e mebiri iwu na-achị ebe nsọ.+ Gị na ụmụ gị ndị nwoke ga-azakwa ajụjụ mgbe ọ bụla e mebiri iwu na-achị ndị nchụàjà.+ 2 Kpọtakwa ụmụnne gị ndị si n’ebo Livaị, bụ́ ebo nna gị, nso, ka ha soro gị na-ejere gị na ụmụ gị ndị nwoke ozi+ n’ihu ụlọikwuu igbe ọgbụgba ndụ dị na ya.*+ 3 Ha ga na-arụ ọrụ i nyere ha na ọrụ niile gbasara ụlọikwuu ahụ.+ Ma, ha agaghị abịa arịa ndị dị n’ebe nsọ ahụ nakwa ebe ịchụàjà ahụ nso, ka hanwa ma ọ bụ ununwa ghara ịnwụ.+ 4 Ha ga-esoro gị na-arụ ọrụ niile gbasara ụlọikwuu nzute, na-ejekwa ozi niile ha kwesịrị ije n’ụlọikwuu. Onye na-abụghị onye nchụàjà* agaghị abịa unu nso.+ 5 Unu ga na-arụ ọrụ unu kwesịrị ịrụ n’ebe nsọ+ nakwa n’ebe ịchụàjà+ ka m ghara iwesa ndị Izrel iwe ọzọ.+ 6 M si ná ndị Izrel kpọrọ ụmụnne unu, bụ́ ndị Livaị, kpọnye unu ka ha bụrụ onyinye m nyere unu.+ Ha bụ ndị e nyere Jehova ka ha na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute.+ 7 Ọ bụ gị na ụmụ gị ndị nwoke ga na-arụ ọrụ nchụàjà n’ebe ịchụàjà nakwa n’ime ebe ahụ e gebichiri ákwà mgbochi.+ Ọ bụ unu ga na-eje ozi a.+ Enyela m unu ọrụ nchụàjà ka ọ bụrụ onyinye m nyere unu. Onye ọ bụla na-abụghị onye nchụàjà* bịara nso, a ga-egbu ya.”+
8 Jehova gwakwara Erọn, sị: “M meela gị onye na-ahụ maka onyinye ndị a na-enye m.+ Enyela m gị na ụmụ gị ndị nwoke ụfọdụ n’ime ihe niile dị nsọ ndị Izrel na-enye n’onyinye ka ha bụrụ òkè a ga na-enye unu mgbe niile.+ 9 Ihe ndị a ga-abụ nke gị n’ime àjà ndị kacha nsọ a na-esu ọkụ: àjà ọ bụla ha na-achụ, ma àjà ọka ha+ ma àjà mmehie ha+ ma àjà ikpe ọmụma ha,+ bụ́ ndị ha na-ewetara m. Ọ ga-abụrụ gị na ụmụ gị ndị nwoke ihe kacha nsọ. 10 Ị ga-anọ n’ebe dị ezigbo nsọ rie ya.+ Onye ọ bụla bụ́ nwoke nwere ike iri ya. Ọ ga-abụrụ gị ihe dị nsọ.+ 11 Ihe ndị a ga-abụkwa nke gị: onyinye ndị ha na-enye+ nakwa àjà niile a na-efegharị efegharị+ ndị Izrel na-eweta. Ewerela m ha nye gị na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị ka ha bụrụ òkè unu mgbe niile.+ Onye ọ bụla dị ọcha nọ n’ụlọ gị nwere ike iri ya.+
12 “M na-enye gị+ mmanụ niile kacha mma na mmanya ọhụrụ niile kacha mma nakwa ọka,* bụ́ mkpụrụ mbụ ha,+ ndị ha na-enye Jehova. 13 Mkpụrụ mbụ kara aka n’ime ihe niile si n’ala ha, bụ́ ndị ha ga na-ewetara Jehova, ga-abụ nke gị.+ Onye ọ bụla dị ọcha nọ n’ụlọ gị nwere ike iri ha.
14 “Ihe ọ bụla e wepụtara iche n’Izrel ka ọ bụrụ nke Chineke* ga-abụ nke gị.+
15 “Nwa mbụ nke ihe niile dị ndụ*+ ha ga-ewetara Jehova, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ, ga-abụ nke gị. Ma, ị ga-agbara nwa mbụ mmadụ mụrụ.+ Ị ga-agbarakwa nwa mbụ anụmanụ na-adịghị ọcha mụrụ.+ 16 Ị ga-eji ego ole e ji agbara ya gbara ya mgbe ọ dị otu ọnwa ma ọ bụ karịa, ya bụ, shekel* ọlaọcha ise e kwuru na ọ bụ ọnụ ahịa ya,+ ma e jiri shekel dị n’ebe nsọ* tụọ ya. Ọ bụ gira* iri abụọ. 17 Ọ bụ naanị oké ehi e bu ụzọ mụọ ma ọ bụ ebule e bu ụzọ mụọ ma ọ bụ ewu e bu ụzọ mụọ ka ị na-agaghị agbara agbara.+ Ha bụ ihe dị nsọ. Ị ga-efesa ọbara ha n’ebe ịchụàjà.+ Ị ga-esukwa abụba ha ọkụ ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. Ha bụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+ 18 Anụ ha ga-abụ nke gị. Ha ga-abụ nke gị otú ahụ okpuru afọ* anụ e ji achụ àjà a na-efegharị efegharị nakwa ụkwụ aka nri ya bụ nke gị.+ 19 Enyela m gị na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị onyinye niile dị nsọ ndị Izrel ga na-enye Jehova+ ka ọ bụrụ òkè unu mgbe niile.+ Ọ ga-abụrụ gị na ụmụ gị ọgbụgba ndụ ga-adịte aka* n’ihu Jehova.”
20 Jehova wee sị Erọn: “Ị gaghị eketa ala n’ala Izrel, e nweghịkwa ala ha ga-abụ nke gị.+ Abụ m òkè gị, bụrụkwa ihe ị ga-eketa n’etiti ndị Izrel.+
21 “Lee, enyela m ụmụ Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ọ bụla+ ndị Izrel rụtara* ka ọ bụrụ ihe ha ketara maka ozi ha na-eje, ya bụ, ozi ha na-eje n’ụlọikwuu nzute. 22 Ndị Izrel agaghịzi na-abịa nso n’ụlọikwuu nzute, ka ha ghara ibutere onwe ha mmehie ma nwụọ. 23 Ọ bụ ndị Livaị ga na-eje ozi ndị gbasara ụlọikwuu nzute, ọ bụkwa ha ga na-aza ajụjụ maka mmehie ndị Izrel.+ Ọ bụ iwu ga-adịgide adịgide n’ọgbọ unu niile na ha agaghị eketa ala ọ bụla n’etiti ndị Izrel.+ 24 N’ihi na enyela m ndị Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri ndị Izrel ga na-eweta, nke ha ga na-enye Jehova, ka ọ bụrụ ihe ha ketara. Ọ bụ ya mere m ji sị ha, ‘Ha agaghị eso ndị Izrel keta ala ọ bụla.’”+
25 Jehova gwaziri Mosis, sị: 26 “Gwa ndị Livaị, sị, ‘Unu ga-anara ndị Izrel otu ụzọ n’ụzọ iri m si n’aka ha nye unu ka ọ bụrụ ihe unu ketara.+ Unu ga-esikwa n’otu ụzọ n’ụzọ iri ahụ nye Jehova otu ụzọ n’ụzọ iri.+ 27 A ga-ewere ya na ọ bụ onyinye unu, ka à ga-asị na ọ bụ ọka* nke si n’ebe unu na-azọcha ọka+ ma ọ bụ mmanya buru ibu nke si n’ebe unu na-azọchapụta mmanya ma ọ bụ mmanụ buru ibu nke si n’ebe unu na-azọchapụta mmanụ. 28 Unu ga-esi otú a si n’otu ụzọ n’ụzọ iri niile unu na-anata ndị Izrel na-enye Jehova onyinye. Unu ga-esikwa na ha na-enye Erọn onye nchụàjà onyinye Jehova. 29 Unu ga-esi n’onyinye niile kacha mma a na-enye unu nye Jehova ụdị onyinye ọ bụla,+ ka ọ bụrụ ihe dị nsọ.
30 “Ị ga-agwakwa ha, sị, ‘Mgbe unu ndị Livaị si na ha nye ihe kacha mma n’onyinye, a ga-ewere ya ka à ga-asị na ọ bụ ọka si n’ebe unu na-azọcha ọka na mmanya si n’ebe unu na-azọchapụta mmanya ma ọ bụ mmanụ si n’ebe unu na-azọchapụta mmanụ. 31 Unu na ndị ezinụlọ unu nwere ike ịnọ n’ebe ọ bụla rie ya n’ihi na ọ bụ ụgwọ ọrụ unu maka ozi unu na-eje n’ụlọikwuu nzute.+ 32 Unu agaghị ebutere onwe unu mmehie n’ihe a ma ọ bụrụhaala na unu na-enye ihe kacha mma n’ime ha n’onyinye. Unu emerụkwala ihe ndị dị nsọ ndị Izrel na-eweta, ka unu ghara ịnwụ.’”+
19 Jehova gwakwara Mosis na Erọn, sị: 2 “Ihe a bụ iwu Jehova nyere: ‘Gwa ndị Izrel ka ha kpụtara gị nne ehi ahụ́ dị mma, nke na-acha ọbara ọbara, nke na-enweghịkwa nkwarụ ọ bụla,+ nke a na-anyakwasịtụbeghị yok. 3 Unu ga-akpụnye ya Elieza onye nchụàjà. Ọ ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kpụpụ ya, a ga-egbukwa ya n’ihu ya. 4 Elieza onye nchụàjà ga-ejizi mkpịsị aka ya rụrụtụ ọbara nne ehi ahụ ma fesa ọbara ya n’ihu ụlọikwuu nzute.+ Ọ ga-eme ya ugboro asaa. 5 A ga-akpọzi nne ehi ahụ ọkụ n’ihu ya. A ga-akpọ akpụkpọ ya na anụ ya na ọbara ya na nsị ya ọkụ.+ 6 Onye nchụàjà ga-ewere osisi sida, ahịhịa hisop,+ na ákwà na-acha uhie uhie ma tụba ha n’ọkụ ahụ na-ere nne ehi ahụ. 7 Onye nchụàjà ga-ejizi mmiri sụọ uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. E mechaa, ọ ga-abata n’ebe unu mara ụlọikwuu. Ma onye nchụàjà ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
8 “‘Onye kpọrọ nne ehi ahụ ọkụ ga-asa uwe ya mmiri, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
9 “‘Nwoke dị ọcha ga-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu kporo ntụ nne ehi ahụ+ pụọ gaa kposa n’ebe dị ọcha. Nzukọ Izrel ga-edosa ya ka e jiri ya na-akwadebe mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha.+ Ọ bụ àjà mmehie. 10 Onye kpokọtara ntụ nne ehi ahụ ga-asa uwe ya. Ọ ga-abụkwa onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.
“‘Ọ ga-abụrụ ndị Izrel na onye mbịarambịa binyeere ha iwu ga-adịgide adịgide.+ 11 Onye ọ bụla nke metụrụ onye ọ bụla nwụrụ anwụ* aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa.+ 12 Onye ahụ ga-eji mmiri ahụ mee onwe ya ka ọ dị ọcha n’ụbọchị nke atọ. Ọ ga-adịkwa ọcha n’ụbọchị nke asaa. Ma ọ bụrụ na o meghị onwe ya ka ọ dị ọcha n’ụbọchị nke atọ, ọ gaghị adị ọcha n’ụbọchị nke asaa. 13 Onye ọ bụla nke metụrụ ozu onye nwụrụ anwụ aka ma ghara ime onwe ya ka ọ dị ọcha emerụọla ụlọikwuu Jehova.+ A ga-egbu ya.*+ Ebe ọ bụ na e fesaghị ya mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha,+ ọ ka ga-abụ onye na-adịghị ọcha.
14 “‘Ihe a bụ iwu a ga-edebe ma ọ bụrụ na mmadụ anwụọ n’ime ụlọikwuu: Onye ọ bụla batara n’ụlọikwuu ahụ na onye ọ bụla nọ n’ụlọikwuu ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa. 15 Arịa ọ bụla ghe oghe, nke a na-ekwuchighị ekwuchi ma jiri eriri kechie ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.+ 16 Onye ọ bụla nke nọ n’èzí metụ onye e ji mma agha gbuo aka ma ọ bụ metụ ozu onye nwụụrụ onwe ya aka ma ọ bụ metụ ọkpụkpụ mmadụ ma ọ bụ ili aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa.+ 17 Ha ga-ekporotụ ntụ anụ ahụ a kpọrọ ọkụ e ji chụọ àjà mmehie ka e jiri ya mee ka onye ahụ na-adịghị ọcha dị ọcha. A ga-ekponyetụ ntụ ahụ n’efere ma wụnye ya mmiri e kutere n’iyi. 18 Nwoke dị ọcha+ ga-ewerezi ahịhịa hisop,+ sụnye ya n’ime mmiri ahụ ma fesa ya n’ụlọikwuu ahụ nakwa n’arịa niile dị n’ime ya, fesakwa ya ndị* nọ n’ebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya onye ahụ metụrụ ọkpụkpụ ma ọ bụ onye e gburu egbu ma ọ bụ ozu onye nwụụrụ onwe ya ma ọ bụ ili aka. 19 Onye ahụ dị ọcha ga-efesa ya n’ahụ́ onye ahụ na-adịghị ọcha n’ụbọchị nke atọ nakwa n’ụbọchị nke asaa. Ọ ga-eme ka ọ dị ọcha* n’ụbọchị nke asaa.+ Onye ahụ na-adịghị ọcha ga-asụzi uwe ya, jirikwa mmiri saa ahụ́. Ọ ga-adịkwa ọcha ná mgbede.
20 “‘Ma onye na-adịghị ọcha, nke na-emeghị onwe ya ka ọ dị ọcha, a ga-egbu ya*+ n’ihi na o merụọla ebe nsọ Jehova. E fesaghị ya mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha. N’ihi ya, ọ dịghị ọcha.
21 “‘Ihe a ga-abụrụ ha iwu ga-adịgide adịgide: Onye na-efesa mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha+ ga-asụ uwe ya. Onye metụkwara mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede. 22 Ihe ọ bụla onye ahụ na-adịghị ọcha metụrụ aka ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. Onye* metụkwara ihe ahụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo mgbede.’”+
20 N’ọnwa nke mbụ, nzukọ Izrel niile batara n’ala ịkpa Zin, ha wee biri na Kedesh.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka Miriam+ nwụrụ, e liekwa ya.
2 Ma e nweghị mmiri nzukọ ahụ ga-aṅụ.+ Ha wee zukọta na-akatọ Mosis na Erọn. 3 Ha nọ na-esesa Mosis okwu,+ sị: “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnne anyị nwụrụ n’ihu Jehova. 4 Gịnị mere unu ji kpọta ọgbakọ Jehova n’ala ịkpa a ka anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ n’ebe a?+ 5 Gịnịkwa mere unu ji duru anyị pụta n’Ijipt ka unu kpọbata anyị n’ebe ọjọọ a?+ Ọ bụghị ebe a na-agha mkpụrụ. Osisi fig na vaịn na pomigranet anaghị eme na ya. Mmiri ọṅụṅụ adịghịkwa.”+ 6 Mosis na Erọn wee si n’ihu ọgbakọ ahụ bịa n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, gbuo ikpere n’ala ma kpudo ihu n’ala, ebube Jehova malitekwara ịpụta n’ihu ha.+
7 Jehova wee gwa Mosis, sị: 8 “Were mkpara a, gị na Erọn nwanne gị kpọkọta nzukọ a. Gwanụ nnukwu nkume a okwu n’ihu ha ka ọ gbapụta mmiri. Ị ga-eme ka mmiri si ná nnukwu nkume a gbapụtara ha. Ị ga-enyekwa nzukọ a na anụ ụlọ ha mmiri ka ha ṅụọ.”+
9 Mosis wee were mkpara ahụ n’ihu Jehova,+ otú o nyere ya n’iwu. 10 Mosis na Erọn kpọkọtaziri ọgbakọ ahụ n’ihu nnukwu nkume ahụ. Mosis wee sị ha: “Unu ndị nnupụisi, geenụ ntị! Ànyị ga-esi ná nnukwu nkume a mee ka mmiri gbapụtara unu?”+ 11 Mosis wee welie aka kụọ mkpara ya ná nnukwu nkume ahụ ugboro abụọ, nnukwu mmiri amalite ịgbapụta. Nzukọ ahụ na anụ ụlọ ha maliteziri ịṅụ mmiri.+
12 Jehova mechara gwa Mosis na Erọn, sị: “Ebe ọ bụ na unu egosighị na unu nwere okwukwe n’ebe m nọ ma mee ka m dị nsọ n’ihu ndị Izrel, unu agaghị akpọrọ ọgbakọ a banye n’ala m ga-enye ha.”+ 13 Mmiri a bụ mmiri Meriba,*+ bụ́ ebe ndị Izrel sesara Jehova okwu, o wee gosi ha na ya dị nsọ.*
14 Mosis wee si na Kedesh zigara eze Ịdọm ndị ozi,+ sị: “Ihe a bụ ihe nwanne gị Izrel+ kwuru, ‘Ị ma nsogbu niile bịaarala anyị. 15 Nna nna anyị hà gara Ijipt,+ anyị wee bie n’Ijipt ọtụtụ afọ.*+ Ndị Ijipt megbukwara anyị na nna nna anyị hà.+ 16 N’ikpeazụ, anyị besaara Jehova ákwá,+ ya anụ olu anyị wee zite otu mmụọ ozi+ ma kpọpụta anyị n’Ijipt. Anyị nọ ugbu a na Kedesh, bụ́ obodo dị n’ókè ala gị. 17 Biko, ka anyị si n’ala gị gafere. Anyị agaghị esi n’ebe ị kụrụ ihe ma ọ bụ n’ubi vaịn gị gafere, anyị agaghịkwa aṅụ mmiri si n’olulu mmiri gị. Ọ bụ n’Okporo Ụzọ Eze* ka anyị ga-esi gafere. Anyị agaghị abanye n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe ruo mgbe anyị gafere ala gị.’”+
18 Ma eze Ịdọm sịrị ya: “Esila n’ala anyị gafere. I si na ya gafere, m ga-apụta jiri mma agha lụso gị agha.” 19 Ndị Izrel wee sị ya: “Anyị ga-esi n’okporo ụzọ awara awara gafee. Ọ bụrụ na anyị na anụ ụlọ anyị aṅụọ mmiri gị, anyị ga-akwụ ụgwọ ya.+ E nweghị ihe ọzọ anyị chọrọ ma ọ́ bụghị ka anyị jiri ụkwụ gafere.”+ 20 Ma ọ sịrị: “Agafela.”+ Eze Ịdọm wee pụta ka ọ lụso ha agha, ya na ọtụtụ ndị nakwa ndị agha siri ike. 21 Eze Ịdọm ekweghị ka Izrel si n’ala ya gafere. N’ihi ya, Izrel tụgharịrị hapụ ya.+
22 Ndị Izrel, ya bụ, nzukọ Izrel niile, si na Kedesh pụọ ma bịarute n’Ugwu Họọ.+ 23 Jehova wee gwa Mosis na Erọn okwu n’Ugwu Họọ, n’akụkụ ókè nke ala Ịdọm, sị: 24 “Erọn ga-anwụ, a ga-elikwa ya otú e liri ndị nna nna ya.+ Ọ gaghị aba n’ala m ga-enye ndị Izrel n’ihi na unu abụọ nupụrụ isi n’iwu m nyere banyere mmiri Meriba.+ 25 Kpọrọ Erọn na Elieza nwa ya, kpọgote ha n’Ugwu Họọ. 26 Yipụ Erọn uwe ya,+ chịrịkwa ha yiwe Elieza+ nwa ya. Erọn ga-anwụ n’ebe ahụ.”
27 Mosis mere nnọọ ihe Jehova nyere n’iwu. Ha wee gbagoro n’Ugwu Họọ n’ihu nzukọ ahụ niile. 28 Mosis yipụrụ Erọn uwe ya ma chịrị ha yiwe Elieza nwa ya. Erọn nwụziri n’ebe ahụ n’elu ugwu ahụ.+ Mosis na Elieza wee si n’ugwu ahụ gbadata. 29 Mgbe nzukọ ahụ niile hụrụ na Erọn anwụọla, ụlọ Izrel niile beere Erọn ákwá ụbọchị iri atọ.+
21 Mgbe onye Kenan, bụ́ eze na-achị Erad,+ onye bi na Negeb,* nụrụ na ndị Izrel esila n’ụzọ Atarim bịa, ọ lụsoro ndị Izrel agha ma dọrọ ụfọdụ n’ime ha n’agha. 2 N’ihi ya, ndị Izrel kwere Jehova nkwa, sị: “Ọ bụrụ na i nyefee ndị a n’aka anyị, anyị ga-ebibi obodo ha niile.” 3 Jehova gere ntị n’olu ndị Izrel ma nyefee ndị Kenan n’aka ha, ha wee bibie ha na obodo ha niile. N’ihi ya, ha kpọrọ ebe ahụ Họma.*+
4 Ka ndị Izrel si n’Ugwu Họọ+ na-aga n’ụzọ Oké Osimiri Uhie ka ha gaa ala Ịdọm akụkụ akụkụ gafere,+ ike ije ahụ gwụwara ha. 5 Ha wee na-ekwujọ Chineke na Mosis,+ sị: “Gịnị mere unu ji kpọpụta anyị n’Ijipt ka anyị nwụọ n’ala ịkpa a? Nri adịghị, mmiri adịghị,+ anyị* akpọọkwala achịcha a na-abaghị uru asị.”+ 6 Jehova wee mee ka agwọ ọjọọ dị iche iche batawa n’ebe ha bi. Agwọ ndị ahụ nọ na-ata ha, ọtụtụ ndị Izrel nwụkwara.+
7 Ha wee bịakwute Mosis, sị: “Anyị emehiela. Anyị kwujọrọ Jehova, kwujọọkwa gị.+ Rịọrọ anyị Jehova arịrịọ ka o wepụrụ anyị agwọ ndị a.” Mosis wee rịọrọ ha arịrịọ.+ 8 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Kpụọ agwọ yiri agwọ ọjọọ ma konye ya n’elu osisi. Ọ bụrụ na agwọ ataa onye ọ bụla, onye ahụ ga-ele ya anya ka ọ ghara ịnwụ.” 9 Mosis ji ọla kọpa kpụọ agwọ+ ozugbo ma konye ya n’elu osisi.+ Mgbe ọ bụla agwọ tara mmadụ, onye ahụ elee agwọ ọla kọpa ahụ anya, onye ahụ anaghị anwụ.+
10 Mgbe e mechara, ndị Izrel pụrụ gaa maa ụlọikwuu n’Obọt.+ 11 Ha sizi n’Obọt pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Aịye-abarim,+ n’ala ịkpa nke chere Moab ihu, n’ebe ọwụwa anyanwụ. 12 Ha si n’ebe ahụ pụọ gaa maa ụlọikwuu n’akụkụ Ndagwurugwu Zired.+ 13 Ha si ebe ahụ pụọ gaa maa ụlọikwuu n’ógbè Anọn,+ nke dị n’ala ịkpa nke malitere n’ókè ndị Amọraịt, n’ihi na Anọn bụ ókè Moab, ya bụ, ókè Moab na ndị Amọraịt. 14 Ọ bụ ya mere akwụkwọ Agha Jehova ji kwuo banyere “Veheb nke dị na Sufa nakwa ndagwurugwu ndị dị n’Anọn, 15 nakwa mkpọda ndagwurugwu ndị ruru n’ógbè Aa, ruokwa n’akụkụ ókè Moab.”
16 Ha sizi ebe ahụ gaa n’ebe a na-akpọ Bia. Ọ bụ n’ebe ahụ ka e nwere olulu mmiri nke Jehova gwara Mosis banyere ya, sị: “Kpọkọta ndị Izrel, ka m nye ha mmiri.”
17 N’oge ahụ, ndị Izrel bụrụ abụ a, sị:
“Gị olulu mmiri, gbapụta mmiri! Bụọrọnụ ya abụ!
18 Olulu mmiri ndị isi gwuru, nke ndị a ma ama n’Izrel gwuru,
Ha ji mkpara onye na-achị achị nakwa mkpara nke ha gwuo ya.”
Ha sizi n’ala ịkpa ahụ gaa Matana. 19 Ha si Matana gaa Nahaliel, sikwa Nahaliel gaa Bemọt.+ 20 Ha si Bemọt gaa na ndagwurugwu nke dị n’ala Moab,+ n’elu Pisga,+ nke chere Jeshaịmọn* ihu.+
21 Ndị Izrel zigaara Saịhọn eze ndị Amọraịt ndị ozi, sị:+ 22 “Ka anyị si n’ala gị gafere. Anyị agaghị abanye n’ebe ị kụrụ ihe ma ọ bụ n’ubi vaịn gị. Anyị agaghị aṅụ mmiri n’olulu mmiri ọ bụla. Ọ bụ n’Okporo Ụzọ Eze* ka anyị ga-aga ruo mgbe anyị gafere ala gị.”+ 23 Ma Saịhọn ekweghị ka ndị Izrel si n’ala ya gafere. Kama Saịhọn kpọkọtara ndị obodo ya niile gawa ịlụso Izrel agha n’ala ịkpa. Ọ bịarutere Jehaz malite ịlụso Izrel agha.+ 24 Ma ndị Izrel ji mma agha merie ya+ ma weghara ala ya+ malite n’Anọn+ ruo Jabọk,+ n’ebe dị ndị Amọn nso, n’ihi na ọ bụ Jeza+ bụ ókè ndị Amọn.+
25 Ndị Izrel wee weghara obodo ndị a niile. Ha wee biri n’obodo ndị Amọraịt niile,+ ya bụ, na Heshbọn na ime obodo niile ndị dị ya nso.* 26 N’ihi na Heshbọn bụ obodo Saịhọn, eze ndị Amọraịt. Ọ bụ ya lụsoro eze Moab agha ma nara ya ala ya niile ruo Anọn. 27 Ọ bụ ya mere e ji atụ ilu a e ji ama njakịrị:
“Bịa na Heshbọn.
Ka a rụọ obodo Saịhọn, ka e meekwa ka ọ kwụsie ike.
28 N’ihi na ọkụ esila na Heshbọn pụta, ire ọkụ esikwala n’obodo Saịhọn pụta.
O repịala Aa nke Moab, repịa ndị nwe ebe ndị dị elu n’Anọn.
29 Moab, ị ga-ata ahụhụ. A ga-ebibi unu, unu ndị Kimọsh.+
Ọ na-eme ka ụmụ ya ndị nwoke gbaa ọsọ, na-emekwa ka Saịhọn, eze ndị Amọraịt, dọrọ ụmụ ya ndị nwaanyị n’agha.
30 Ka anyị gbaa ha ụta.
A ga-ebibi Heshbọn ruo Daịbọn.+
Ka anyị bibie ha ruo Nofa.
Ọkụ ga-agbasa ruo Medeba.”+
31 Ndị Izrel wee biri n’ala ndị Amọraịt. 32 Mosis zipụrụ ụfọdụ ụmụ nwoke ka ha gaa nyopụta otú Jeza dị.+ Ha weghaara ime obodo niile dị ya nso,* chụpụkwa ndị Amọraịt bi n’ebe ahụ. 33 Mgbe e mechara, ha tụgharịrị gbagowe n’Ụzọ E Si Aga Beshan. Ọg+ eze Beshan na ndị agha ya niile wee pụta ịlụso ha agha n’Edraị.+ 34 Jehova sịrị Mosis: “Atụla ya egwu+ n’ihi na m ga-enyefe ya na ndị agha ya niile nakwa ala ya n’aka gị.+ Ị ga-eme ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọraịt, onye bibu na Heshbọn.”+ 35 Ha wee na-egbu ya na ụmụ ya ndị nwoke na ndị obodo ya niile ruo mgbe a na-enweghịzi onye obodo ya fọrọ.+ Ha wee weghara ala ya.+
22 Ndị Izrel wee pụọ gaa maa ụlọikwuu n’ọzara Moab, n’ofe Osimiri Jọdan nke ya na Jeriko chere ihu.+ 2 Belak+ nwa Zipọ hụrụ ihe niile ndị Izrel mere ndị Amọraịt. 3 Ezigbo ụjọ tụwara ndị Moab maka na ndị Izrel dị ọtụtụ. N’eziokwu, oké ụjọ bara ndị Moab ahụ́ n’ihi ndị Izrel.+ 4 Ndị Moab wee gwa ndị okenye Midian,+ sị: “Ìgwè mmadụ a ga-erichapụ ihe niile gbara anyị gburugburu otú ehi si atachapụ ahịhịa dị n’ọhịa.”
N’oge ahụ, ọ bụ Belak nwa Zipọ bụ eze Moab. 5 O zigaara Belam nwa Biọ, onye bi n’ebe a mụrụ ya na Pitọ,+ ndị ozi. Pitọ dị n’akụkụ Osimiri Yufretis.* Ọ gwara Belam ka ọ bịakwute ya, sị: “E nwere ndị si n’Ijipt pụta. Ha ejula ụwa.+ Ha nọkwa ezigbo nso n’ala m. 6 Biko, bịa bụọrọ m ha ọnụ+ n’ihi na ha ka m ike. Ikekwe, m ga-emerili ha ma chụpụ ha n’ala a, n’ihi na o doro m anya na onye ị gọziri bụ onye a gọziri agọzi, onye ị bụrụ ọnụ bụkwa onye a bụrụ ọnụ.”
7 Ndị okenye Moab na ndị okenye Midian wee jiri ego ha ga-akwụ ka a gbaara ha afa gakwuru Belam,+ gwa ya ihe Belak kwuru. 8 O wee sị ha: “Rahụnụ ebe a n’abalị a. M ga-agwa unu ihe ọ bụla Jehova gwara m.” Ndị isi Moab wee soro Belam nọrọ n’ebe ahụ.
9 Chineke wee bịakwute Belam, sị:+ “Ole ndị bụ ndị a gị na ha nọ?” 10 Belam sịrị ezi Chineke: “Belak nwa Zipọ, eze Moab, ziteere m ozi, sị, 11 ‘Ndị si n’Ijipt apụta ejula ụwa. Bịa bụọrọ m ha ọnụ.+ Ikekwe, m ga-alụsoli ha ọgụ ma chụpụ ha.’” 12 Ma Chineke sịrị Belam: “Esola ha gaa. Abụla ndị Izrel ọnụ n’ihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”+
13 Belam biliri n’ụtụtụ gwa ndị Belak mere ndị isi, sị: “Laanụ n’ala unu n’ihi na Jehova ekweghị ka m soro unu gaa.” 14 Ndị isi Moab lawara ma gakwuru Belak, sị: “Belam ekweghị iso anyị bịa.”
15 Ma, Belak zigara ndị isi ọzọ. Ha dị ọtụtụ karịa ndị nke mbụ. A na-akwanyekwara ha ùgwù karịa ndị nke mbụ. 16 Ha bịakwutere Belam, sị ya: “Belak nwa Zipọ kwuru, sị, ‘Biko, ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ịbịakwute m, 17 n’ihi na m ga-akwụ gị ezigbo ụgwọ, m ga-emekwa ihe ọ bụla ị gwara m mee. Biko, bịa bụọrọ m ndị a ọnụ.’” 18 Ma Belam gwara ndị na-ejere Belak ozi, sị: “Ọ bụrụgodị na Belak enye m ụlọ ya ọlaọcha na ọlaedo juru, agaghị m eme ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke m na-agwaghị m mee, ma ọ̀ bụ obere ihe ma ọ̀ bụ nnukwu ihe.+ 19 Ma, biko, nọrọnụ ebe a n’abalị a, ka m mara ihe ọzọ Jehova ga-agwa m.”+
20 Chineke wee bịakwute Belam n’abalị, sị ya: “Ọ bụrụ na ihe ụmụ nwoke a bịara bụ ka ha kpọọ gị, soro ha gawa. Ma, ọ bụ naanị ihe m gwara gị ka ị ga-ekwu.”+ 21 Belam biliri n’ụtụtụ kwadebe jakị* ya ma soro ndị isi Moab gawa.+
22 Ma Chineke were ezigbo iwe maka na ọ gawara. Mmụọ ozi Jehova wee gaa guzo n’ụzọ ka o gbochie ya ịga. Belam nọ n’elu jakị ya na-aga, mmadụ abụọ ná ndị na-ejere ya ozi sokwa ya. 23 Mgbe jakị ahụ hụrụ mmụọ ozi Jehova ka o ji mma agha a mịpụtara amịpụta n’aka guzoro n’ụzọ, ọ gbalịrị ka ọ hapụ ụzọ banye n’ọhịa. Ma Belam malitere ịkụ jakị ahụ ihe ka ọ gaghachi n’ụzọ. 24 Mmụọ ozi Jehova gaziri guzo n’ebe ụzọ dị warara, n’agbata ubi vaịn abụọ, mgbidi e ji nkume rụọ dịkwa n’akụkụ ha abụọ. 25 Mgbe jakị ahụ hụrụ mmụọ ozi Jehova, ọ dagidere ná mgbidi ahụ ma kpagide ụkwụ Belam ná mgbidi ahụ. Belam wee kụwa ya ihe ọzọ.
26 Mmụọ ozi Jehova gafeere ọzọ gaa kwụrụ n’ebe dị warara, n’ebe a na-enweghị otú a ga-esi tụgharịa gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe. 27 Mgbe jakị ahụ hụrụ mmụọ ozi Jehova, o bu Belam makpuru ala. N’ihi ya, Belam were ezigbo iwe, jirikwa mkpara ya na-akụ jakị ahụ. 28 N’ikpeazụ, Jehova mere ka jakị ahụ kwuo okwu.*+ O wee sị Belam: “Gịnị ka m mere gị i ji kụọ m ihe ugboro atọ a?”+ 29 Belam zara jakị ahụ, sị: “Ọ bụ maka na i ji m gwuo egwu. A sị na m ji mma agha n’aka, m gaara egbu gị.” 30 Jakị ahụ sịziri Belam: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị m bụ jakị gị na-ebu gị kemgbe ndụ gị ruo taa? M̀ metụla gị otú a mbụ?” Belam zara, sị: “Mba.” 31 Jehova megheziri anya Belam,+ ya ahụ mmụọ ozi Jehova ka o ji mma agha a mịpụtara amịpụta n’aka kwụrụ n’ụzọ. Belam hulatara ozugbo kpọọ isiala.
32 Mmụọ ozi Jehova wee sị ya: “Gịnị mere i ji kụọ jakị gị ihe ugboro atọ a? Apụtara m ka m gbochie gị ịga n’ihi na ihe a ị na-achọ ime abụghị uche m.+ 33 Jakị a hụrụ m gbalịa ka o si n’ebe m nọ pụọ ugboro atọ a.+ A sị na o sighị n’ebe m nọ pụọ, m gaarala egbu gị ma hapụ ya ndụ.” 34 Belam sịrị mmụọ ozi Jehova: “Emehiela m n’ihi na amaghị m na ọ bụ gị kwụ n’ụzọ ka i zute m. Ugbu a, ọ bụrụ na ihe a m na-aga adịghị gị mma, m ga-alaghachi.” 35 Ma mmụọ ozi Jehova sịrị Belam: “Soro ụmụ nwoke ndị ahụ gawa. Ma ọ bụ naanị ihe m ga-agwa gị ka ị ga-ekwu.” Belam wee soro ndị Belak mere ndị isi gawa.
36 Mgbe Belak nụrụ na Belam abịala, ọ gawara ozugbo ka o zute ya n’obodo Moab, nke dị n’akụkụ mmiri Anọn, n’ókè nke ala Moab. 37 Belak sịrị Belam: “Ọ̀ bụ na ezighị m ozi ka a kpọọ gị? Gịnị mere na ị bịaghị hụ m? Ì chere na enweghị m ike ịkwụ gị ezigbo ụgwọ?”+ 38 Belam zara Belak, sị: “M bịalanụ ịhụ gị. Ma, à ga-ekwenụ ka m kwuo ihe ọ bụla? Naanị ihe m ga-ekwuli bụ ihe Chineke gwara m ka m kwuo.”+
39 Belam sooro Belak gawa. Ha wee bịarute Kiriat-huzọt. 40 Belak gburu ehi na atụrụ* ma zigara Belam na ndị isi ha na ya nọ ụfọdụ n’ime ha. 41 N’ụtụtụ, Belak kpọọrọ Belam wee kpọgote ya na Bemọt-bel. O si ebe ahụ na-ahụ ndị Izrel niile.+
23 Belam wee gwa Belak, sị: “Rụọ ebe ịchụàjà asaa n’ebe a,+ kwadebekwara m oké ehi asaa na ebule asaa.” 2 Belak mere ihe Belam kwuru ozugbo. Belak na Belam wee chụọ otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.+ 3 Belam gwaziri Belak, sị: “Guzo n’akụkụ àjà a i suru ọkụ, ka m gawa. Ikekwe, Jehova ga-abịakwute m. M ga-agwa gị ihe ọ bụla o gosiri m.” O wee gbagoo n’ugwu.
4 Chineke bịakwutere Belam,+ Belam asị ya: “M kwadebere ebe ịchụàjà asaa ndị dị n’ahịrị, m chụkwara otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.” 5 Jehova mere ka Belam mata ihe ọ chọrọ ka o kwuo.+ Ọ sịrị ya: “Gaghachikwuru Belak. Ihe a ka ị ga-ekwu.” 6 O wee gaghachikwuru Belak ma hụ na ya na ndị isi Moab niile kwụ n’akụkụ àjà ahụ o suru ọkụ. 7 O wee kwuo, sị:+
“Belak eze Moab si n’Eram kpọta m.+
O si n’ugwu dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ sịrị:
‘Bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ.
Bịa kọchaa Izrel.’+
8 Olee otú m ga-esi bụọ ndị Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ?
Oleekwa otú m ga-esi kọchaa ndị Jehova na-akọchaghị?+
9 M si n’elu oké nkume hụ ha,
M sikwa n’ugwu hụ ha.
Ha bi naanị ha n’ebe ahụ ka otu ndị.+
Ha ewereghị onwe ha na ha so ná mba ndị ọzọ.+
10 Ònye ga-agụtali ụmụ Jekọb ọnụ bụ́ ndị dị ọtụtụ ka ájá+
Ma ọ bụdị gụtalie otu ụzọ n’ụzọ anọ nke Izrel ọnụ?
Ka m* nwụọ ọnwụ ndị ezi omume,
Ka m nwụọkwa ka ha.”
11 Belak wee sị Belam: “Gịnị bụ ihe a i mere m? M kpọtara gị ebe a ka ị bụọ ndị iro m ọnụ, ma naanị ihe i mere bụ ịgọzi ha.”+ 12 Ọ zara, sị: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe ọ bụla Jehova mere ka m kwuo ka m ga-ekwu?”+
13 Belak sịrị ya: “Biko, soro m gaa ebe ọzọ ị ga-anọ hụ ha. Ị ga-ahụ naanị ụfọdụ n’ime ha. Ị gaghị ahụ ha niile. Si n’ebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”+ 14 O wee kpọrọ ya gaa n’ala Zofim, n’elu Pisga,+ ma rụọ ebe ịchụàjà asaa, chụọkwa otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.+ 15 Belam gwaziri Belak, sị: “Nọrọ n’ebe a n’akụkụ àjà a i suru ọkụ ka m gaa gwa Chineke okwu n’ebe ahụ.” 16 Jehova bịakwutere Belam ma mee ka ọ mata ihe ọ chọrọ ka o kwuo.+ Ọ sịrị: “Gaghachikwuru Belak. Ihe a ka ị ga-ekwu.” 17 Belam wee bịakwute Belak ma hụ na ọ nọ na-eche ya n’akụkụ àjà ahụ o suru ọkụ. Ndị isi Moab sokwa ya nọrọ n’ebe ahụ. Belak jụrụ ya, sị: “Gịnị ka Jehova kwuru?” 18 O wee kwuo, sị:+
“Belak, bilie gee ntị.
Nwa Zipọ, ṅaa m ntị.
19 Chineke abụghị mmadụ nkịtị nke na-agha ụgha.+
Ọ bụghịkwa nwa nke mmadụ nke na-agbanwe obi ya.*+
Ọ bụrụ na o kwuo ihe, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ya?
Ọ bụrụ na o kwuo okwu, ọ̀ bụ na ọ gaghị emezu ya?+
20 Lee, a kpọtara m ka m gọzie ha.
Ọ gọziela ha,+ agaghịkwa m agbanweli ya.+
21 Ọ naghị ekwe ka e nwee onye ga-eji ike anwansi* mee Jekọb ihe ọ bụla.
Ọ naghịkwa ekwe ka nsogbu ọ bụla bịara Izrel.
Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ha.+
Ha na-ekwusikwa ike na ọ bụ eze.
22 Chineke si n’Ijipt na-akpọpụta ha.+
Ọ bụụrụ ha mpi atụ́.+
23 N’ihi na e nweghị ihe ọjọọ ọ bụla a jụtara n’ase nke ga-ere n’isi Jekọb.+
E nweghị afa a ga-agba ga-eme Izrel ihe ọ bụla.+
E nwere ike ikwu ugbu a banyere Jekọb na Izrel, sị,
‘Lee nnukwu ihe Chineke mere!’
Ọ gaghị amakpuru ma ọ bụrụ na o ribeghị anụ o gbutere,
Ṅụọkwa ọbara ndị e gburu egbu.”
25 Belak sịziri Belam: “Ọ bụrụ na i nweghị ike ịbụ ha ọnụ, i kwesịghịnụ ịgọzi ha.” 26 Belam gwara Belak, sị: “Ọ̀ bụ na m gwaghị gị, sị, ‘M ga-eme ihe niile Jehova kwuru’?”+
27 Belak sịrị Belam: “Biko, bịa ka m kpọrọ gị gaa ebe ọzọ. Ikekwe, ọ ga-adị ezi Chineke mma ka ị nọrọ ebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”+ 28 Belak wee kpọrọ Belam gaa n’elu Piọ, nke chere Jeshaịmọn* ihu.+ 29 Belam sịziri Belak: “Rụọ ebe ịchụàjà asaa n’ebe a, kwadebekwara m oké ehi asaa na ebule asaa.”+ 30 Belak mere ihe Belam kwuru. O wee chụọ otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.
24 Mgbe Belam hụrụ na ọ dị Jehova mma ịgọzi Izrel, ọ gawaghị ọzọ ka ọ jụta ase ihe ọjọọ,+ kama o chere ihu n’ala ịkpa. 2 Mgbe Belam lere anya hụ ka Izrel mara ụlọikwuu ha n’ebo n’ebo,+ Chineke wụsara ya mmụọ ya.+ 3 O wee kwuo, sị:+
“Ihe Belam nwa Biọ kwuru,
Ihe nwoke e meghere anya ya emeghe kwuru,
4 Ihe onye na-anụ okwu Chineke kwuru,
Onye hụrụ ọhụụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,
Onye na-emechighị anya ya emechi kpọọ isiala:+
6 O ruru ebe dị anya ka ndagwurugwu,+
Ka ubi ndị dị n’akụkụ osimiri,
Ka ahịhịa alo Jehova kụrụ,
Ka osisi sida ndị dị n’akụkụ mmiri.
7 Mmiri na-esi na bọket ya* abụọ e ji akpụkpọ anụ mee atapụsị.
A na-akụ mkpụrụ ya* n’akụkụ ọtụtụ mmiri.+
8 Chineke si n’Ijipt na-akpọpụta ya.
Ọ bụụrụ ha mpi atụ́.
Ọ ga-ebibi mba dị iche iche, bụ́ ndị na-emegbu ya.+
Ọ ga-atapịa ọkpụkpụ ha, ọ ga-ejikwa akụ́ ya gbarie ha.
9 Ọ makpurula. O dinarala ka ọdụm.
Ebe ọ dị ka ọdụm, ònye ga-anwa anwa chọọ ya okwu?
Ndị na-agọzi gị bụ ndị a gọziri agọzi.
Ndị na-abụ gị ọnụ bụ ndị a bụrụ ọnụ.”+
10 Belak wee wesa Belam ezigbo iwe. Belak kụrụ aka n’iwe sị Belam: “M kpọrọ gị ka ị bụọ ndị iro m ọnụ,+ ma naanị ihe i mere bụ ịgọzi ha ugboro atọ a. 11 Ugbu a, lawa n’ụlọ gị ozugbo. Ebu m n’obi ịkwụ gị ezigbo ụgwọ,+ ma Jehova egbochiela gị inweta ụgwọ m gaara akwụ gị.”
12 Belam sịrị Belak: “Ọ̀ bụ na mụ agwaghị ndị ozi i zitere, sị, 13 ‘Ọ bụrụgodị na Belak enye m ụlọ ya ọlaọcha na ọlaedo juru, agaghị m eji aka m eme ihe ọ bụla Jehova na-agwaghị m mee, ma ọ̀ bụ ihe ọma ma ọ̀ bụ ihe ọjọọ. Naanị ihe m ga-ekwu bụ ihe Jehova gwara m ka m kwuo’?+ 14 Ugbu a, m na-alakwuru ndị obodo m. Bịa ka m gwa gị ihe ndị a ga-eme ndị obodo gị n’ọdịnihu.”* 15 O wee kwuo, sị:+
“Ihe Belam nwa Biọ kwuru,
Ihe nwoke e meghere anya ya emeghe kwuru,+
16 Ihe onye na-anụ okwu Chineke kwuru,
Onye Onye Kacha Elu mere ka ọ mara ihe,
Onye hụrụ ọhụụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile
Mgbe ọ na-akpọ isiala n’emechighị anya ya emechi:
17 M ga-ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a.
M ga-ahụ ya, ma ọ gaghị abụ nso nso a.
Ọ ga-etiwa egedege ihu Moab,+
Tiwaakwa okpokoro isi nke ụmụ mbibi niile.
19 E nwere onye ga-esi na Jekọb na-emeri.+
Ọ ga-ebibikwa onye ọ bụla fọrọ n’obodo ahụ.”
20 Mgbe ọ hụrụ Amalek, o kwukwara, sị:
“Amalek bụ mba mbụ ná mba dị iche iche.+
Ma n’ikpeazụ, ọ ga-ala n’iyi.”+
21 Mgbe ọ hụrụ ndị Kenaịt,+ o kwukwara, sị:
“Ahụ́ ruru gị ala n’ebe i bi, a rụkwara ụlọ gị n’elu nnukwu nkume.
22 Ma mmadụ ga-agba Keyin ọkụ.
Gịnị ka ọ fọrọ ka Asiria dọrọ gị n’agha?”
23 O kwukwara, sị:
“Chaị! Ònye ga-afọ ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe a?
24 Ụgbọ mmiri ga-esi n’ụsọ osimiri Kitim bịa.+
Ha ga-emekpa Asiria ahụ́,+
Ha ga-emekpakwa Iba ahụ́.
Ma yanwa ga-alakwa n’iyi kpamkpam.”
25 Belam+ wee bilie lawa. Belak lawakwara.
25 Mgbe ndị Izrel bi na Shitim,+ ha na ụmụ nwaanyị Moab malitere ịkwa iko.+ 2 Ụmụ nwaanyị ahụ kpọrọ ndị Izrel ka ha soro ha gaa chụọrọ chi ha àjà.+ Ndị Izrel wee malite iri ihe ha ji chụọ àjà ma na-akpọrọ chi ha isiala.+ 3 Ndị Izrel sooro ha fee Bel nke Piọ.+ Jehova wee wesa ndị Izrel ezigbo iwe. 4 Jehova gwara Mosis, sị: “Jide ndị niile bụ́ ndị isi ndị ọjọọ a, gbuo ha ma kwụwa ozu ha n’ihu Jehova ka mmadụ niile hụ ha,* ka nnukwu iwe Jehova na-ewesa ndị Izrel dajụọ.” 5 Mosis wee sị ndị ikpe Izrel:+ “Onye ọ bụla n’ime unu gbuo ụmụ nwoke si n’ebo ya bụ́ ndị so fee Bel nke Piọ.”+
6 Ma n’oge ahụ, otu nwoke Izrel kpọọrọ otu nwaanyị Midian na-abata n’ebe ụmụnne ya nọ,+ n’ihu Mosis nakwa n’ihu nzukọ Izrel niile, mgbe ndị Izrel nọ na-ebe ákwá n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute. 7 Mgbe Finihas+ nwa Elieza nwa Erọn onye nchụàjà hụrụ ya, o si n’ebe ahụ ndị Izrel zukọrọ bilie ozugbo ma were ube. 8 O sochiri nwoke Izrel ahụ azụ ma banye n’ụlọikwuu ha banyere, magbuo ha abụọ. Ọ mabara nwoke Izrel ahụ na nwaanyị ahụ ube n’ahụ́, ube ahụ amaba n’ihe nke nwaanyị ahụ ji bụrụ nwaanyị. Ọrịa ọjọọ nọ na-egbu ndị Izrel wee kwụsị.+ 9 Ndị ọrịa ọjọọ ahụ gburu dị puku mmadụ iri abụọ na puku anọ (24,000).+
10 Jehova gwaziri Mosis, sị: 11 “Finihas+ nwa Elieza, nwa nwa Erọn onye nchụàjà, emeela ka iwe m na-ewesa ndị Izrel dajụọ n’ihi na o kweghị ka ha hapụ m fewe chi ọzọ.+ Ọ bụ ya mere na ebibighị m ndị Izrel n’agbanyeghị na m chọrọ ka ha na-efe naanị m.+ 12 N’ihi ya, kwuo, sị, ‘Mụ na ya ga-agba ọgbụgba ndụ udo. 13 Ọ ga-abụrụ ya na ụmụ ya ndị ga-anọchi ya ọgbụgba ndụ ga-adịte aka nke ga-eme ka ha na-abụ ndị nchụàjà mgbe niile+ maka na o kweghị ka ndị Izrel hapụ Chineke ya fewe chi ọzọ.+ O kpuchikwaara ha mmehie ha.’”
14 Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwaanyị Midian bụ Zimraị nwa Selu. Ọ bụ onyeisi n’ọnụmara ụmụ Simiọn. 15 Aha nwaanyị Midian ahụ e gburu bụ Kọzbaị nwa Zọọ.+ Zọọ bụ onyeisi ọnụmara ndị si n’ụlọ nna ya n’obodo Midian.+
16 Jehova mechara gwa Mosis, sị: 17 “Mesienụ ndị Midian ike, gbuokwanụ ha,+ 18 n’ihi na ha ji aghụghọ na-emesi unu ike, mee ka unu fee Bel nke Piọ,+ nakwa n’ihi ihe Kọzbaị nwanne ha nwaanyị, nwa otu onyeisi ndị Midian, mere. E gburu ya+ n’ụbọchị ahụ unu rịara ọrịa ọjọọ maka na unu fere Bel nke Piọ.”+
26 Mgbe ọrịa ọjọọ ahụ kwụsịrị ịrịa ha,+ Jehova gwara Mosis na Elieza nwa Erọn onye nchụàjà, sị: 2 “Gụọnụ nzukọ Izrel niile ọnụ n’ọnụmara n’ọnụmara, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe. Gụọnụ ndị niile nwere ike ịga agha n’Izrel ọnụ.”+ 3 Mosis na Elieza+ onye nchụàjà wee gwa ha okwu n’ọzara Moab,+ n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko,+ sị: 4 “Gụọnụ ha ọnụ malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.”+
Ndị a bụ ndị Izrel ndị si n’Ijipt pụta: 5 Ruben,+ ọkpara Izrel; ndị a bụ ụmụ Ruben ndị nwoke:+ Henọk mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Henọk; Palu mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Palu; 6 Hezrọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hezrọn; Kamaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Kamaị. 7 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ruben. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri anọ na atọ, narị asaa na iri atọ (43,730).+
8 Nwa Palu bụ Elayab. 9 Ụmụ Elayab ndị nwoke bụ Nemuel, Detan, na Abaịram. Detan na Abaịram a bụ ndị e si ná nzukọ Izrel họrọ, ndị ha na ndị òtù Kora+ mara Mosis+ na Erọn aka, mgbe ha mara Jehova aka.+
10 Ala wee meghee* loo ha. Ma Kora na ndị na-akwado ya nwụrụ mgbe ọkụ regburu narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250).+ Ha wee bụrụ ihe atụ e ji adọ ndị ọzọ aka ná ntị.+ 11 Ma ụmụ Kora anwụghị.+
12 Ndị a bụ ụmụ Simiọn ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Nemuel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Nemuel; Jemin mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jemin; Jekin mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jekin; 13 Zira mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Zira; Sheọl mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Sheọl. 14 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Simiọn: puku mmadụ iri abụọ na abụọ na narị abụọ (22,200).+
15 Ndị a bụ ụmụ Gad ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Zifọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Zifọn; Hagaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hagaị; Shunaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shunaị; 16 Ọznaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ọznaị; Iraị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Iraị; 17 Arọd mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Arọd; Arilaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Arilaị. 18 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Gad. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri anọ na narị ise (40,500).+
19 Ụmụ Juda ndị nwoke+ bụ Ea na Onan.+ Ma, Ea na Onan nwụrụ na Kenan.+ 20 Ndị a bụ ụmụ Juda ndị nwoke, n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Shila+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shila; Pirez+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Pirez; Zira+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Zira. 21 Ndị a bụ ụmụ Pirez ndị nwoke: Hezrọn+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hezrọn; Hemọl+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hemọl. 22 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Juda. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri asaa na isii na narị ise (76,500).+
23 Ndị a bụ ụmụ Ịsaka ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Tola+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Tola; Puva mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Puna; 24 Jeshọb mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jeshọb; Shimrọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shimrọn. 25 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ịsaka. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri isii na anọ na narị atọ (64,300).+
26 Ndị a bụ ụmụ Zebulọn ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Sired mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Sired; Ilọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ịlọn; Jaliel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jaliel. 27 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Zebulọn. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri isii na narị ise (60,500).+
28 Ndị a bụ ụmụ Josef ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Manase na Ifrem.+ 29 Ndị a bụ ụmụ Manase ndị nwoke:+ Mekia+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Mekia. Mekia wee mụọ Gilied.+ Ọ bụ Gilied mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Gilied. 30 Ndị a bụ ụmụ Gilied ndị nwoke: lza mụtara ndị ezinụlọ ụmụ lza; Hilek mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hilek; 31 Asriel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Asriel; Shikem mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shikem; 32 Shemaịda mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shemaịda; Hifa mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hifa. 33 Zelofehad nwa Hifa amụtaghị ụmụ nwoke. Ọ mụrụ naanị ụmụ nwaanyị.+ Aha ụmụ Zelofehad+ bụ Mala, Noa, Họgla, Milka, na Teza. 34 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Manase. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri ise na abụọ na narị asaa (52,700).+
35 Ndị a bụ ụmụ Ifrem ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Shutela+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shutela; Bika mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Bika; Tehan mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Tehan. 36 Ndị a bụ ụmụ Shutela ndị nwoke: Iran mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Iran. 37 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ifrem. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri atọ na abụọ na narị ise (32,500).+ Ọ bụ ha bụ ụmụ Josef ndị nwoke, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
38 Ndị a bụ ụmụ Benjamin ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Bila+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Bila; Ashbel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ashbel; Ahaịram mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ahaịram; 39 Shefufam mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shufam; Hufam mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hufam. 40 Ụmụ nwoke ndị Bila mụrụ bụ Ad na Neeman:+ Ad mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ad; Neeman mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Neeman. 41 Ọ bụ ha bụ ụmụ Benjamin ndị nwoke, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri anọ na ise na narị isii (45,600).+
42 Ndị a bụ ụmụ Dan ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Shuham mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shuham. Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Dan, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 43 Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ ụmụ Shuham niile dị puku iri isii na anọ na narị anọ (64,400).+
44 Ndị a bụ ụmụ Asha ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Imna mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Imna; Ishvaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Ishvaị; Beraya mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Beraya; 45 ndị a bụ ụmụ Beraya ndị nwoke: Hiba mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Hiba; Malkiel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Malkiel. 46 Aha nwa nwaanyị Asha mụrụ bụ Sira. 47 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Asha. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri ise na atọ na narị anọ (53,400).+
48 Ndị a bụ ụmụ Naftalaị ndị nwoke,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Jaziel mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jaziel; Gunaị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Gunaị; 49 Jiza mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Jiza; Shilem mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Shilem. 50 Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Naftalaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku iri anọ na ise na narị anọ (45,400).+
51 Ndị Izrel niile e debara aha ha n’akwụkwọ dị narị puku mmadụ isii na otu, narị mmadụ asaa na iri atọ (601,730).+
52 Jehova gwaziri Mosis, sị: 53 “Ị ga-ekere ndị a ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha. Ị ga-esoro otú e si dee aha ha* keere ha ya.+ 54 Ị ga-ekenye ndị dị ọtụtụ ala buru ibu, kenye ndị na-adịghị ọtụtụ ala na-ebughị ibu.+ Ọ bụ mmadụ ole e debara aha ha n’akwụkwọ ná ndị nke ọ bụla ka a ga-eji ama ala a ga-ekenye ha. 55 Ma a ga-efe nza mgbe a na-eke ala ahụ.+ A ga-ekenye ha ala n’ebe e kenyere ndị nna ha ala n’ebo n’ebo. 56 A ga-efe nza ka a mata ala a ga-ekenye ndị nke ọ bụla, ma ndị nke dị ọtụtụ ma ndị nke na-adịghị ọtụtụ.”
57 Ndị a bụ ndị Livaị e debara aha ha n’akwụkwọ,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Geshọn mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Geshọn; Kohat+ mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Kohat; Meraraị mụtara ndị ezinụlọ ụmụ Meraraị. 58 Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Livaị: ezinụlọ ụmụ Libnaị,+ ezinụlọ ụmụ Hebrọn,+ ezinụlọ ụmụ Malaị,+ ezinụlọ ụmụ Mushaị,+ ezinụlọ ụmụ Kora.+
Kohat wee mụọ Amram.+ 59 Aha nwunye Amram bụ Jokebed,+ nwa Livaị, onye nwunye Livaị mụụrụ Livaị n’Ijipt. Jokebed mụụrụ Amram Erọn na Mosis nakwa Miriam+ nwanne ha nwaanyị. 60 E wee mụọrọ Erọn Nedab, Abaịhu, Elieza, na Ịtama.+ 61 Ma Nedab na Abaịhu nwụrụ n’ihi na ha chụrụ àjà* iwu na-akwadoghị n’ihu Jehova.+
62 Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ malite n’ụmụ nwoke niile ndị dị otu ọnwa gbagowe dị puku iri abụọ na puku atọ (23,000).+ E debaghị aha ha n’akwụkwọ mgbe e debara aha ndị Izrel ndị ọzọ+ maka na a gaghị ekenye ha ala otú a ga-ekenye ndị Izrel ndị ọzọ.+
63 Ọ bụ ndị a ka Mosis na Elieza onye nchụàjà debara aha ha n’akwụkwọ mgbe ha na-edeba aha ndị Izrel n’akwụkwọ n’ọzara Moab, n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko. 64 Ma n’ime ndị a Mosis na Erọn onye nchụàjà debara aha ha n’akwụkwọ, e nweghị onye n’ime ha so ná ndị Izrel e debara aha ha n’akwụkwọ n’ala ịkpa Saịnaị.+ 65 N’ihi na Jehova kwuru banyere ndị ahụ, sị: “Ha ga-anwụrịrị n’ala ịkpa.”+ N’ihi ya, e nweghị nwoke ọ bụla fọrọ n’ime ha ma e wepụ Keleb nwa Jefune na Joshụa nwa Nọn.+
27 Ụmụ nwaanyị Zelofehad+ wee bịa. Zelofehad bụ nwa Hifa, nwa Gilied, nwa Mekia, nwa Manase, onye si n’ezinụlọ ndị si n’ebo Manase nwa Josef. Aha ụmụ nwaanyị ọ mụtara bụ Mala, Noa, Họgla, Milka, na Teza. 2 Ha bịara guzo n’ihu Mosis, Elieza onye nchụàjà, ndị isi,+ nakwa n’ihu nzukọ niile ahụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, sị: 3 “Nna anyị nwụrụ n’ala ịkpa, ma o soghị ná ndị kwadoro Kora,+ bụ́ ndị zukọtara maa Jehova aka. Kama ọ nwụrụ n’ihi mmehie nke ya. Ọ mụtaghị nwa nwoke. 4 Gịnị mere aha nna anyị ga-eji fuo n’ezinụlọ ya maka na ọ mụtaghị nwa nwoke? Kenye anyị ala otú e kenyere ụmụnne nna anyị.” 5 Mosis wee kọsara Jehova ihe ha kwuru.+
6 Jehova gwaziri Mosis, sị: 7 “Ihe ụmụ Zelofehad kwuru bụ eziokwu. Hụ na i kenyere ha ala otú e kenyere ụmụnne nna ha. Ị ga-enyefekwa ha ala nna ha kwesịrị iketa.+ 8 Gwakwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na nwoke anwụọ n’amụtaghị nwa nwoke, unu ga-enyefe nwa ya nwaanyị ala o ketara. 9 Ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa nwaanyị, unu ga-enye ụmụnne ya ndị nwoke ala o ketara. 10 Ọ bụrụ na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, unu ga-enye ụmụnne nna ya ndị nwoke ala o ketara. 11 Ma ọ bụrụ na nna ya enweghị ụmụnne ndị nwoke, unu ga-enye onye ikwu ya, nke ya na ya kacha bụrụ otu ọbara n’ọnụmara ya, ala o ketara, ọ ga-ewerekwa ala ahụ. Ihe a m kpebiri ga-abụrụ ndị Izrel iwu ha ga na-edebe, otú Jehova nyere Mosis n’iwu.’”
12 Jehova gwaziri Mosis, sị: “Gbagoo n’ugwu a dị n’Abarim+ ka ị hụ ala m ga-enye ndị Izrel.+ 13 Ị hụchaa ya, ị ga-anwụ otú Erọn nwanne gị nwụrụ,+ e liekwa gị otú e liri ndị nna nna gị,+ 14 n’ihi na mgbe nzukọ a sesara m okwu n’ala ịkpa Zin, unu nupụrụ isi n’iwu m nyere unu, ghara ido m nsọ n’ihu ha mgbe m nyere ha mmiri.+ Ihe a mere na mmiri Meriba+ nke dị na Kedesh,+ n’ala ịkpa Zin.”+
15 Mosis wee sị Jehova: 16 “Ka Jehova, bụ́ Chineke onye na-enye mmadụ niile ndụ,* họpụta nwoke ga na-edu nzukọ a, 17 onye ga na-apụ ma na-abata n’ihu ha, onye ga na-edu ha apụ ma na-edu ha abata, ka nzukọ Jehova ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” 18 Jehova wee sị Mosis: “Kpọrọ Joshụa nwa Nọn, bụ́ nwoke ruru eru,* ma bikwasị ya aka n’isi.+ 19 Mezie ka o guzo n’ihu Elieza onye nchụàjà nakwa n’ihu nzukọ a niile. Ị ga-anọkwa n’ihu ha mee ya onye ndú.+ 20 Ị ga-enyetụ ya ikike* i nwere,+ ka nzukọ Izrel niile nwee ike ige ya ntị.+ 21 Ọ ga-eguzo n’ihu Elieza onye nchụàjà, bụ́ onye ga-anọ n’ihu Jehova jiri Yurim+ jụtara ya ihe Chineke kpebiri. Ọ bụ ya ga-ekwu mgbe ha ga na-apụ na mgbe ha ga na-abata, ya na ndị Izrel niile na nzukọ a niile.”
22 Mosis wee mee nnọọ otú Jehova nyere ya n’iwu. Ọ kpọọrọ Joshụa mee ka o guzo n’ihu Elieza onye nchụàjà nakwa n’ihu nzukọ ahụ niile. 23 O wee bikwasị ya aka n’isi mee ya onye ndú,+ otú Jehova si n’ọnụ Mosis kwuo.+
28 Jehova gwaziri Mosis, sị: 2 “Nye ndị Izrel iwu, sị ha, ‘Hụnụ na unu na-ewetara m onyinye m, ya bụ, achịcha m. Unu ga na-achụ àjà m ndị a na-esu ọkụ n’oge ha a kara aka ka ha bụrụ àjà na-esi ísì ọma.’*+
3 “Sịkwa ha, ‘Ihe a bụ àjà a na-esu ọkụ unu ga na-achụrụ Jehova: kwa ụbọchị, unu ga na-achụ ụmụ ebule abụọ ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, ka ha bụrụ àjà a na-esu ọkụ mgbe niile.+ 4 Ị ga-achụ otu ebule n’àjà n’ụtụtụ, chụọkwa ebule nke ọzọ n’àjà ná mgbede.*+ 5 Ị ga-eji otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa* ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin* mmanụ oliv, chụọ nke ọ bụla n’ime ha n’àjà ka ọ bụrụ àjà ọka.+ 6 Ọ bụ àjà a na-esu ọkụ mgbe niile,+ nke m kwuru n’Ugwu Saịnaị ka a na-achụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma,* àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova, 7 ya na àjà mmanya ya na ya na-agakọ, ya bụ, otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin maka otu nwa ebule.+ Wụpụrụ Jehova mmanya na-aba n’anya n’ebe nsọ ka ọ bụrụ àjà mmanya. 8 Ị ga-achụ nwa ebule nke ọzọ n’àjà ná mgbede.* Ị ga-eji àjà ọka na àjà mmanya ndị dị ka nke ụtụtụ chụọ ya. Ị ga-achụ ya n’àjà ka ọ bụrụ àjà a na-esu ọkụ, àjà na-esi ísì ọma* a na-achụrụ Jehova.+
9 “‘Ma n’Ụbọchị Izu Ike,+ a ga-eji ụmụ ebule abụọ ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà, ha na ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka, ya na àjà mmanya ya na ya na-agakọ. 10 Ọ bụ ya bụ àjà a na-esu ọkụ a ga na-achụ n’Ụbọchị Izu Ike, ya na àjà a na-esu ọkụ nke a ga na-achụ mgbe niile nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
11 “‘Ná mbido ọnwa ọ bụla,* unu ga-eji oké ehi abụọ, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+ 12 nakwa ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka+ maka oké ehi nke ọ bụla, nakwa ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka maka otu ebule ahụ,+ 13 nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ka ọ bụrụ àjà ọka maka nwa ebule nke ọ bụla. Ọ bụ àjà na-esi ísì ọma*+ a na-esu ọkụ, àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova. 14 Àjà mmanya ha na ha ga-agakọ ga-abụ ọkara otu hin mmanya maka otu oké ehi+ na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke otu hin maka ebule ahụ+ nakwa otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu hin maka otu nwa ebule.+ Ọ bụ ya bụ àjà a na-esu ọkụ a ga na-achụ kwa ọnwa n’afọ. 15 A ga na-achụkwara Jehova otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ma e wepụ àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà mmanya ya na ya na-agakọ.
16 “‘N’abalị iri na anọ n’ọnwa mbụ, a ga-emere Jehova Ememme Ngabiga.+ 17 N’abalị iri na ise n’ọnwa ahụ, a ga-eme ememme. A ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa.+ 18 N’ụbọchị nke mbụ, a ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike. 19 Unu ga-eji oké ehi abụọ, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ. Ọ bụ anụmanụ ndị ahụ́ dị mma ka unu ga-achụ n’àjà.+ 20 Unu ga-achụkọta ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ.+ Ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ga-abụ maka otu oké ehi, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka ebule ahụ. 21 Ị ga-achụ otu ụzọ n’ụzọ iri n’àjà maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ, 22 chụọkwa otu ewu ka ọ bụrụ àjà mmehie a ga-eji kpuchiere unu mmehie. 23 Unu ga-achụ ihe ndị a n’àjà, ha na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ n’ụtụtụ, bụ́ àjà a na-esu ọkụ mgbe niile. 24 Unu ga-esi otú a na-achụ ihe ndị a n’àjà kwa ụbọchị ruo ụbọchị asaa ka ha bụrụ ihe oriri, ya bụ, àjà a na-esu ọkụ na-esi ísì ọma* nke a na-achụrụ Jehova. A ga-achụkọta ya na àjà a na-esu ọkụ mgbe niile na àjà mmanya ya na ya na-agakọ. 25 N’ụbọchị nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+
26 “‘N’ụbọchị ememme mkpụrụ mbụ kara aka,+ mgbe unu na-ewetara Jehova àjà ọka ọhụrụ,+ unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ n’oge ememme izu unu.+ Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+ 27 Unu ga-eji oké ehi abụọ, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma,*+ 28 nakwa àjà ọka ha na ha na-agakọ, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka oké ehi nke ọ bụla, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka otu ebule ahụ, 29 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ. 30 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà a ga-eji kpuchiere unu mmehie.+ 31 Unu ga-achụ ihe ndị a n’àjà, ha na àjà a na-esu ọkụ mgbe niile na àjà ọka na àjà mmanya ha na ha na-agakọ. Anụmanụ ndị ahụ ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+
29 “‘N’abalị mbụ n’ọnwa nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+ Ọ bụ ụbọchị unu ga-afụ opi.+ 2 Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma. 3 Unu ga-achụkọta ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu efa ga-abụ maka oké ehi ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka ebule ahụ, 4 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ. 5 Unu ga-achụkwa otu nwa mkpi n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie a ga-eji kpuchiere unu mmehie. 6 Unu ga-achụ ihe ndị a n’àjà, ha na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ kwa ọnwa na àjà ọka ya na ya na-agakọ,+ chụọkwa àjà a na-esu ọkụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ.+ Unu ga-achụkọta ha na àjà mmanya ha+ otú e nyere iwu ka e si na-achụ ha, ka ha bụrụ àjà na-esi ísì ọma,* àjà a na-esu ọkụ a na-achụrụ Jehova.
7 “‘N’abalị iri n’ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu ga-emekpa onwe* unu ahụ́.* Unu arụla ọrụ ọ bụla.+ 8 Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 9 Unu ga-achụkwa ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka oké ehi ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka ebule ahụ, 10 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ. 11 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà mmehie a ga-eji kpuchiere unu mmehie,+ chụọkwa àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ nakwa àjà mmanya ha na ha na-agakọ.
12 “‘N’abalị iri na ise n’ọnwa nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike. Unu ga-emekwara Jehova ememme ruo ụbọchị asaa.+ 13 Unu ga-eji oké ehi iri na atọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ,+ ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 14 Unu ga-achụkwa ha na àjà ọka ha, ya bụ, ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ. Ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka oké ehi nke ọ bụla n’ime oké ehi iri na atọ ahụ, ụzọ abụọ n’ụzọ iri abụrụ maka nke ọ bụla n’ime ebule abụọ ahụ, 15 otu ụzọ n’ụzọ iri abụrụ maka nwa ebule nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule iri na anọ ahụ. 16 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
17 “‘N’ụbọchị nke abụọ, unu ga-eji oké ehi iri na abụọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 18 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 19 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ha na ha na-agakọ.+
20 “‘N’ụbọchị nke atọ, unu ga-eji oké ehi iri na otu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 21 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 22 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
23 “‘N’ụbọchị nke anọ, unu ga-eji oké ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 24 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 25 Unu ga-achụkwa otu nwa ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
26 “‘N’ụbọchị nke ise, unu ga-eji oké ehi itoolu, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 27 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 28 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
29 “‘N’ụbọchị nke isii, unu ga-eji oké ehi asatọ, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 30 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 31 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ha na ya na-agakọ.+
32 “‘N’ụbọchị nke asaa, unu ga-eji oké ehi asaa, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọ àjà. Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 33 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 34 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
35 “‘N’ụbọchị nke asatọ, unu ga-enwe nzukọ pụrụ iche. Unu arụla ọrụ ọ bụla siri ike.+ 36 Unu ga-eji otu oké ehi, otu ebule, na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ chụọrọ Jehova àjà a na-esu ọkụ, ka ọ bụrụ àjà na-esi ísì ọma.* Ha niile ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 37 Ọ bụ ole oké ehi, ebule, na ụmụ ebule ndị ahụ dị ka unu ga-eji mara otú àjà ọka na àjà mmanya unu ga-achụ ga-aha. Unu ga-achụ ha otú e nyere n’iwu ka e si na-achụ ha. 38 Unu ga-achụkwa otu ewu n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie, ya na àjà a na-esu ọkụ a na-achụ mgbe niile na àjà ọka ya na ya na-agakọ, nakwa àjà mmanya ya na ya na-agakọ.+
39 “‘Unu ga na-achụrụ Jehova ihe ndị a n’àjà mgbe unu na-eme ememme unu na-eme n’oge dị iche iche,+ ha na onyinye ndị unu kwere ná nkwa+ na onyinye ndị si unu n’obi,+ ka ha bụrụ àjà unu a na-esu ọkụ+ na àjà ọka unu+ na àjà mmanya unu+ na àjà udo unu.’”+ 40 Mosis gwara ndị Izrel ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.
30 Mosis wee gwa ndị isi+ ebo dị iche iche e nwere n’Izrel, sị: “Ihe a bụ ihe Jehova nyere n’iwu: 2 Ọ bụrụ na nwoke ekwe Jehova nkwa+ ma ọ bụ ṅụọ iyi+ na e nwere ihe ya na-agaghị eme, ya ahapụla ime ihe o kwuru.+ O kwesịrị imezu ihe niile o kwere nkwa na ya ga-eme.+
3 “Ọ bụrụkwa na nwaanyị nke bi n’ụlọ nna ya ekwe Jehova nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi mgbe ọ bụ agbọghọ na e nwere ihe ya na-agaghị eme, 4 nna ya ewee nụ nkwa o kwere ma ọ bụ iyi ọ ṅụrụ na e nwere ihe ọ na-agaghị eme, ma nna ya ekwughị na nwa ya agaghị emezu ihe ahụ o kwuru, nkwa niile nwa ya nwaanyị ahụ kwere agaghị agbanwe, iyi ọ ṅụrụ na e nwere ihe ọ na-agaghị eme agaghịkwa agbanwe. 5 Ma ọ bụrụ na nna ya anụ na o kwere nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi na e nwere ihe ọ na-agaghị eme, ma nna ya ajụ na ọ gaghị emezu ihe ahụ o kwuru, ihe ahụ nwaanyị ahụ kwuru agaghị enwe isi. Jehova ga-agbaghara ya maka na nna ya ekweghị.+
6 “Ma, ọ bụrụ na tupu ya alụọ di na o kwere nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi n’echeghị echiche na e nwere ihe ya na-agaghị eme, 7 di ya ewee nụ ya, ma o kwughị n’ụbọchị ọ nụrụ ihe ahụ na nwunye ya agaghị emezu ya, nkwa nwaanyị ahụ kwere ma ọ bụ iyi ọ ṅụrụ na e nwere ihe ya na-agaghị eme agaghị agbanwe. 8 Ma ọ bụrụ na n’ụbọchị di ya nụrụ ya, na ọ jụrụ na nwunye ya agaghị eme ihe ahụ o kwuru, di ya akagbuola nkwa ahụ nwunye ya kwere ma ọ bụ iyi ahụ ọ ṅụrụ n’echeghị echiche.+ Jehova ga-agbaghara nwaanyị ahụ.
9 “Ma ọ bụrụ na nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwaanyị a gbara alụkwaghịm ekwe nkwa, nkwa ọ bụla o kwere na e nwere ihe ya na-agaghị eme agaghị agbanwe.
10 “Ma, ọ bụrụ na nwaanyị nke nọ n’ụlọ di ya* ekwe nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi na e nwere ihe ya na-agaghị eme, 11 di ya ewee nụ ya, ma ọ kagbughị ihe ahụ nwunye ya kwuru, o kwughịkwa na nwunye ya agaghị eme ihe ahụ, nkwa niile nwaanyị ahụ kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na e nwere ihe ya na-agaghị eme agaghị agbanwe. 12 Ma ọ bụrụ na n’ụbọchị di ya nụrụ ihe ahụ o kwuru, na ọ kagburu nkwa ọ bụla nwunye ya kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na e nwere ihe ya na-agaghị eme, nkwa ahụ ma ọ bụ iyi ahụ agaghịzi enwe isi.+ Di ya akagbuola ya, Jehova ga-agbagharakwa nwaanyị ahụ. 13 Ọ bụ di ya ga-ekwu ma nkwa ọ bụla o kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na ya agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya ọ̀ ga-enwe isi ma ọ bụ na ọ gaghị enwe isi. 14 Ma ọ bụrụ na ka ụbọchị na-aga, na di ya ekwughị na nwunye ya agaghị emezu nkwa ahụ, o kwetala ka nwunye ya mezuo nkwa niile o kwere ma ọ bụ iyi niile ọ ṅụrụ na e nwere ihe ọ na-agaghị eme. Otú o si kweta bụ na n’ụbọchị ọ nụrụ ihe nwunye ya kwuru, o kwughị na nwunye ya agaghị eme ihe ahụ. 15 Ma ọ bụrụ na di ya mechara kagbuo ihe nwunye ya kwuru mgbe ụbọchị ọ nụrụ ihe nwunye ya kwuru gaferela, ọ ga-eburu nsogbu ga-esi ná mmehie nwaanyị ahụ pụta.+
16 “Ihe ndị a bụ iwu Jehova nyere Mosis gbasara di na nwunye nakwa gbasara nna na nwa ya nwaanyị, bụ́ nwa agbọghọ ya na ya bi n’ụlọ.”
31 Jehova gwaziri Mosis, sị: 2 “Megwara+ ndị Midian ihe ha mere ndị Izrel.+ E mechaa, ị ga-anwụ, e liekwa gị otú e liri ndị nna nna gị.”+
3 Mosis wee gwa ndị Izrel, sị: “Kwadebenụ ụfọdụ ụmụ nwoke n’ime unu ka ha gaa lụso ndị Midian agha, ka ha bọọrọ Jehova ọbọ n’isi ndị Midian. 4 Unu ga-esi n’ebo ọ bụla e nwere n’Izrel họpụta otu puku otu puku mmadụ ka ha soro gaa agha.” 5 E wee si n’ime puku kwuru puku ndị Izrel+ họpụta otu puku otu puku mmadụ n’ebo nke ọ bụla, ya bụ, puku mmadụ iri na abụọ (12,000) a kwadebere maka ịga agha.
6 Mosis wee dunye otu puku otu puku mmadụ ahụ si n’ebo nke ọ bụla agha, ha na Finihas+ nwa Elieza onye nchụàjà. Finihas bu arịa ndị dị nsọ na opi agha.+ 7 Ha lụsoro ndị Midian agha otú Jehova nyere Mosis n’iwu. Ha gburu ụmụ nwoke niile. 8 Ndị ọzọ ha gbukwara bụ ndị eze Midian, ya bụ, Ivaị, Rikem, Zọọ, Họọ, na Riba, bụ́ ndị eze ise na-achị Midian. Ha jikwa mma agha gbuo Belam+ nwa Biọ. 9 Ma ndị Izrel dọọrọ ụmụ nwaanyị na ụmụaka ndị Midian n’agha. Ha chịkọkwaara anụ ụlọ ha niile na anụmanụ ha ndị ọzọ, bukọrọkwa akụ̀ ha niile. 10 Ha gbara obodo niile ha bi ọkụ, gbaakwa ebe niile ha mara ụlọikwuu* ọkụ. 11 Ha bukọọrọ ihe niile ha kwatara, ma ndị mmadụ ha dọtara n’agha ma anụmanụ ha kpụtara. 12 Ha wee kpọrọ ndị ahụ ha dọtara n’agha, chịrịkwa anụ ndị ha kpụtara na ihe ndị ha kwatara bịakwute Mosis na Elieza onye nchụàjà nakwa nzukọ Izrel n’ebe ha mara ụlọikwuu n’ọzara Moab,+ n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko.
13 Mosis na Elieza onye nchụàjà na ndị niile bụ́ ndị isi nzukọ Izrel sizi n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu pụọ gawa izute ha. 14 Ma Mosis wesara ndị e mere ndị isi ndị agha ahụ iwe, ya bụ, ndị isi otu puku otu puku ndị agha nakwa ndị isi otu narị otu narị ndị agha, bụ́ ndị si agha ahụ na-alọta. 15 Mosis sịrị ha: “Ùnu hapụrụ ụmụ nwaanyị niile ndụ? 16 Ọ bụ ha ka Belam gwara okwu, ha arafuo ndị Izrel, ndị Izrel ahapụ Jehova+ gaa fewe chi ụgha nke Piọ,+ nke mere ọrịa ọjọọ ji rịawa nzukọ Jehova.+ 17 Ugbu a, gbuonụ nwoke ọ bụla n’ime ụmụaka ndị ahụ, gbuokwanụ nwaanyị ọ bụla ya na nwoke nwetụrụla mmekọahụ. 18 Ma, unu nwere ike ịhapụ ụmụ agbọghọ niile ha na nwoke na-enwetụbeghị mmekọahụ.+ 19 Unu ga-ama ụlọikwuu n’ebe dị iche n’ebe anyị mara ụlọikwuu ma nọrọ n’ebe ahụ ruo ụbọchị asaa. Onye ọ bụla n’ime unu nke gburu mmadụ* na onye ọ bụla metụrụ onye e gburu egbu aka+ ga-eme onwe ya ka ọ dị ọcha+ n’ụbọchị nke atọ nakwa n’ụbọchị nke asaa, ma ununwa ma ndị unu dọtara n’agha. 20 Unu ga-emekwa ka uwe ọ bụla dị ọcha* nakwa ihe ọ bụla e ji akpụkpọ anụ mee, ihe ọ bụla e ji ajị ewu rụọ, na ihe ọ bụla e ji osisi rụọ.”
21 Elieza onye nchụàjà wee gwa ụmụ nwoke ahụ gara agha, sị: “Ihe a bụ iwu Jehova nyere Mosis: 22 ‘Ọ bụ naanị ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, ígwè, gbamgbam, na nkume led,* 23 ihe ọ bụla ọkụ na-agaghị emebili, ka unu ga-eji ọkụ mee ka ọ dị ọcha. Ma, a ga-ejikwa mmiri e ji eme ka ihe dị ọcha mee ka ọ dị ọcha.+ Ihe ọ bụla ga-emebi ma e tinye ya n’ọkụ, jirinụ mmiri ahụ sachaa ya. 24 Unu ga-asakwa uwe unu n’ụbọchị nke asaa wee dị ọcha, unu abatazie n’ebe anyị mara ụlọikwuu.’”+
25 Jehova gwaziri Mosis, sị: 26 “Gị na Elieza onye nchụàjà na ndị isi ọnụmara nzukọ a dee ihe ndị a kwatara n’agha n’akwụkwọ. Unu ga-agụ ndị unu dọtara n’agha ọnụ, gụọkwa anụmanụ ndị unu kpụtara ọnụ. 27 Keenụ ihe ndị ahụ a kwatara n’agha ụzọ abụọ. Werenụ otu ụzọ nye ndị so gaa agha, werekwanụ nke ọzọ nye ndị niile fọrọ ná nzukọ a.+ 28 Ka ndị agha ahụ gara agha kpọnye gị otu onye* n’ime narị mmadụ ise (500) ọ bụla, kpụnyekwa gị otu ehi n’ime narị ehi ise (500) ọ bụla, otu jakị n’ime narị jakị ise (500) ọ bụla, otu ewu ma ọ bụ atụrụ n’ime narị ewu na atụrụ ise (500) ọ bụla, ka ha bụrụ ụtụ a ga-atụrụ Jehova. 29 Unu ga-esi n’ihe ha ketara were ya nye Elieza onye nchụàjà ka ọ bụrụ onyinye e nyere Jehova.+ 30 Ị ga-esikwa n’ihe e kenyere ndị Izrel kpọrọ otu onye n’ime mmadụ iri ise ọ bụla, kpụrụkwa otu ehi n’ime ehi iri ise, otu jakị n’ime jakị iri ise, otu ewu ma ọ bụ atụrụ n’ime ewu na atụrụ iri ise, nakwa ụdị anụ ụlọ ọ bụla. Ị ga-ewere ha nye ndị Livaị,+ bụ́ ndị na-arụ ọrụ gbasara ụlọikwuu Jehova.”+
31 Mosis na Elieza onye nchụàjà mere nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu. 32 Ihe ndị fọrọ n’anụmanụ ndị ahụ gara agha kpụ lọta nakwa ndị fọrọ ná ndị ha dọtara n’agha dị narị puku ewu na atụrụ isii na puku iri asaa na ise (675,000), 33 puku ehi iri asaa na puku abụọ (72,000), 34 puku jakị iri isii na otu puku (61,000), 35 na puku ụmụ nwaanyị iri atọ na puku abụọ (32,000) ndị ha na nwoke na-enwetụbeghị mmekọahụ.+ 36 Otu ọkara e kenyere ndị ahụ gara agha dị narị puku ewu na atụrụ atọ, puku iri atọ na asaa na narị ise (337,500). 37 Ewu na atụrụ a tụụrụ Jehova n’ụtụ dị narị isii na iri asaa na ise (675). 38 Ehi niile dị puku iri atọ na puku isii (36,000). Ehi a tụụrụ Jehova n’ụtụ dị iri asaa na abụọ. 39 Jakị niile dị puku iri atọ na narị ise (30,500). Jakị a tụụrụ Jehova n’ụtụ dị iri isii na otu. 40 Mmadụ* niile dị puku iri na isii (16,000). Mmadụ* a tụụrụ Jehova n’ụtụ dị iri atọ na abụọ. 41 Mosis wee nye Elieza onye nchụàjà ụtụ ahụ ka ọ bụrụ onyinye e nyere Jehova,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
42 Ihe ndị a bụ ọkara nke ọzọ e kenyere ndị Izrel, ya bụ, ihe ndị Mosis si n’ihe ndị ahụ gara agha kwatara kepụta: 43 ọkara ewu na atụrụ ahụ dị narị puku atọ, puku iri atọ na asaa na narị ise (337,500), 44 ehi dị puku iri atọ na puku isii (36,000), 45 jakị dị puku iri atọ na narị ise (30,500), 46 mmadụ* adịrị puku iri na isii (16,000). 47 Mosis wee si n’ọkara ahụ ndị Izrel ketara kpọrọ otu onye n’ime mmadụ iri ise ọ bụla, kpụrụkwa otu anụmanụ n’ime anụmanụ iri ise ọ bụla ma nye ha ndị Livaị,+ bụ́ ndị na-arụ ọrụ gbasara ụlọikwuu Jehova,+ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.
48 Ndị e mere ndị isi puku kwuru puku ndị agha ahụ,+ ya bụ, ndị isi otu puku otu puku ndị agha nakwa ndị isi otu narị otu narị ndị agha, bịakwutere Mosis. 49 Ha wee sị Mosis: “Anyị bụ́ ndị ohu gị agụọla ndị agha anyị na-achị ọnụ. E nweghị otu onye n’ime ha a na-achọ achọ.+ 50 N’ihi ya, ka onye ọ bụla n’ime anyị nye ihe o nwetara ka ọ bụrụ onyinye a ga-enye Jehova, ya bụ, ihe ndị e ji ọlaedo mee, ọla ụkwụ, ọla aka, mgbaaka ndị e ji aka ihe akara, ọla ntị, ihe ndị ọzọ e ji achọ mma, ka e jiri ha kpuchiere anyị* mmehie n’ihu Jehova.”
51 Mosis na Elieza onye nchụàjà wee nara ha ọlaedo ndị ahụ, ihe niile ahụ e ji achọ mma. 52 Ọlaedo niile ha nyere Jehova n’onyinye, bụ́ ndị ha natara ndị isi otu puku otu puku ndị agha na ndị isi otu narị otu narị ndị agha, dị puku shekel* iri na isii, narị asaa na iri ise (16,750). 53 Onye ọ bụla n’ime ndị agha ahụ ketara ihe n’ihe ha kwatara. 54 Mosis na Elieza onye nchụàjà naara ndị isi otu puku otu puku ndị agha na ndị isi otu narị otu narị ndị agha ọlaedo ndị ahụ ma webata ha n’ụlọikwuu nzute ka ndị Izrel wee na-echeta ihe Jehova meere ha.*
32 Ụmụ Ruben+ na ụmụ Gad+ nwere ọtụtụ anụ ụlọ. Ha wee hụ na ala Jeza+ na Gilied dị mma ịzụ anụ ụlọ. 2 N’ihi ya, ụmụ Gad na ụmụ Ruben bịakwutere Mosis, Elieza onye nchụàjà, na ndị isi nzukọ ahụ, sị: 3 “Atarọt, Daịbọn, Jeza, Nimra, Heshbọn,+ Iliele, Sibam, Nibo,+ na Bion,+ 4 bụ́ obodo ndị Jehova meriiri nzukọ Izrel,+ bụ ala dị mma ịzụ anụ ụlọ. Anyị bụ́ ndị ohu unu nwekwaranụ ọtụtụ anụ ụlọ.”+ 5 Ha sịkwara: “Ọ bụrụ na ihe anyị masịrị unu, ka e nye anyị bụ́ ndị ohu unu ala a ka ọ bụrụ nke anyị. Amanyela anyị ka anyị gafee Osimiri Jọdan.”
6 Mosis wee gwa ụmụ Gad na ụmụ Ruben, sị: “Ụmụnne unu hà ga-agawa agha ununwa ebiri ebe a? 7 Gịnị mere unu ga-eji mee ka obi ghara isi ndị Izrel ike ịbanye n’ala ahụ Jehova ga-enye ha? 8 Ọ bụ ihe a ka nna unu hà mere mgbe m si na Kedesh-bania ziga ha ka ha gaa hụ ala ahụ.+ 9 Mgbe ha ruru na Ndagwurugwu Eshkọl+ hụ ala ahụ, ha mere ka obi ghara isi ndị Izrel ike ịbanye n’ala ahụ Jehova ga-enye ha.+ 10 Ezigbo iwe were Jehova n’ụbọchị ahụ. O wee ṅụọ iyi, sị:+ 11 ‘Ụmụ nwoke ndị si n’Ijipt pụta, malite ná ndị dị afọ iri abụọ gbagowe, agaghị ahụ ala ahụ+ m ṅụrụ iyi na m ga-enye Ebreham, Aịzik, na Jekọb,+ n’ihi na ha ejighị obi ha niile rubere m isi, 12 ma e wepụ Keleb+ nwa Jefune onye Kinaz na Joshụa+ nwa Nọn, n’ihi na ha ji obi ha niile rubere Jehova isi.’+ 13 Jehova wee wesa Izrel iwe dị ọkụ. O mere ka ha gagharịa n’ala ịkpa ruo afọ iri anọ,+ ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke nọ na-eme ihe ọjọọ n’anya Jehova nwụchara.+ 14 Unu anọchiela nna unu hà, unu ndị ajọ omume, ndị na-eme ka iwe Jehova na-ewesa Izrel dịkwuo ọkụ. 15 Ọ bụrụ na unu akwụsị irubere ya isi, ọ ga-ahapụ ha ọzọ n’ala ịkpa, unu ga-emekwa ka e bibie ndị a niile.”
16 Ha mechara bịakwute ya, sị: “Ka anyị jiri nkume gbaara anụ ụlọ anyị ogige, rụọkwara ụmụ anyị obodo. 17 Ma anyịnwa ga-ejikere ịlụ agha+ ma na-aga n’ihu ndị Izrel ruo mgbe anyị kpọgara ha n’obodo ha. Ma ụmụ anyị ga-ebi n’obodo ndị a rụsiri ike, e nweghịkwa ihe ndị bi n’obodo a ga-eme ha. 18 Anyị agaghị alaghachi n’ụlọ anyị ruo mgbe onye ọ bụla n’ime ndị Izrel ketara ala nke ya.+ 19 Anyị agaghị eso ha keta ala ọ bụla dị malite n’ofe Osimiri Jọdan gbagowe, n’ihi na anyị eketala nke anyị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.”+
20 Mosis sịrị ha: “Ọ bụrụ na unu ga-eme ihe a: Jikerenụ ịga lụọ agha otú Jehova kwuru.+ 21 Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu ejikere ịga agha ma gafee Osimiri Jọdan ka ọ lụọrọ Jehova agha, ọ ga-achụpụrụ ya ndị iro ya.+ 22 Unu ga-alụ agha ruo mgbe Jehova nyeere unu aka, unu emerie ndị obodo ahụ.+ Mgbe ahụ, unu nweziri ike ịlaghachi,+ ikpe agaghịkwa ama unu n’anya Jehova nakwa n’anya ndị Izrel. Ala a ga-abụzi ala unu nke Jehova nyere unu.+ 23 Ma ọ bụrụ na unu emeghị ihe a, ọ pụtara na unu emehiela Jehova. Marakwanụ na unu ga-ata ahụhụ mmehie unu. 24 Unu nwere ike ịrụrụ ụmụ unu obodo, jirikwa nkume gbaara ìgwè ewu na atụrụ unu ogige.+ Ma unu ga-emerịrị ihe unu kwere ná nkwa.”
25 Ụmụ Gad na ụmụ Ruben gwara Mosis, sị: “Anyị bụ́ ndị ohu gị ga-eme nnọọ ihe gịnwa bụ́ onyenwe anyị nyere n’iwu. 26 Ụmụ anyị, ndị nwunye anyị, anụmanụ anyị, na anụ ụlọ anyị niile ga-anọrọ n’ebe ahụ n’obodo ndị dị na Gilied,+ 27 ma anyị bụ́ ndị ohu gị ga-agafere, ya bụ, onye ọ bụla dị njikere ịlụ agha n’ihu Jehova,+ otú gịnwa bụ́ onyenwe anyị kwuru.”
28 Mosis wee nye Elieza onye nchụàjà, Joshụa nwa Nọn, na ndị isi ọnụmara dị iche iche n’ebo Izrel iwu banyere ha. 29 Mosis sịrị ha: “Ọ bụrụ na ụmụ Gad na ụmụ Ruben, ya bụ, nwoke ọ bụla dị njikere ịga lụọrọ Jehova agha, esoro unu gafee Osimiri Jọdan, unu ewee merie ndị ala ahụ, unu ga-enye ha ala Gilied ka ọ bụrụ ala ha ketara.+ 30 Ma ọ bụrụ na ha ejikereghị ịga agha, ọ bụrụkwa na ha esoghị unu gafee, ha ga-eso unu biri n’ala Kenan.”
31 Ụmụ Gad na ụmụ Ruben wee sị: “Ihe Jehova gwara anyị bụ́ ndị ohu gị ka anyị ga-eme. 32 Anyị ga-ejikere banye n’ala Kenan gaa lụọ agha otú Jehova kwuru.+ Ma, ala anyị ga-eketa ga-adị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan.” 33 Mosis wee nye ụmụ Gad na ụmụ Ruben+ na ọkara ebo Manase,+ nwa Josef, ebe Saịhọn+ eze ndị Amọraịt chịrị na ebe Ọg+ eze Beshan chịrị, ya bụ, obodo ndị dị n’ala ndị ahụ nakwa obodo ndị dị n’ala gbara ha gburugburu.
34 Ụmụ Gad wee rụọ* Daịbọn,+ Atarọt,+ Aroa,+ 35 Atrọt-shofan, Jeza,+ Jọg-beha,+ 36 Bet-nimra,+ na Bet-heran,+ bụ́ obodo ndị a rụsiri ike. Ha jikwa nkume gbaara anụ ụlọ ha ogige. 37 Ụmụ Ruben rụrụ Heshbọn,+ Iliele,+ Kiriateyim,+ 38 Nibo,+ na Bel-mion+ (a gbanwere aha ha agbanwe) nakwa Sibma. Ha malitere ịgụgharị obodo ndị ahụ ha rụrụ aha.
39 Ụmụ Mekia+ nwa Manase gara lụso Gilied agha, weghara ya ma chụpụ ndị Amọraịt bi na ya. 40 Mosis wee nye ụmụ Mekia nwa Manase ala Gilied. Ha wee biri na ya.+ 41 Jeya nwa Manase gakwara lụọ agha ma weghara obodo ndị a mara ụlọikwuu. O wee malite ịkpọ ha Havọt-jeya.*+ 42 Noba gara lụso Kinat agha ma weghara ya na ime obodo ndị dị ya nso.* O wee malite ịkpọ ya aha ya bụ́ Noba.
33 Otú a ka ndị Izrel si gaa mgbe ha si n’Ijipt pụta+ n’ìgwè ha n’ìgwè ha.+ Ọ bụ Mosis na Erọn nọ na-edu ha.+ 2 Mosis nọ na-ede ebe ndị ha si pụọ gaa ebe dị iche iche ha gara, otú Jehova nyere n’iwu. Otú a ka ha si gaa, ha si otu ebe ha agaa ebe ọzọ:+ 3 Ha si na Ramesis pụọ+ n’abalị iri na ise n’ọnwa nke mbụ.+ N’ụbọchị na-esote ụbọchị Ememme Ngabiga,+ ndị Izrel ji obi ike* pụọ n’ihu ndị Ijipt niile. 4 N’oge ahụ, ndị Ijipt nọ na-eli ụmụ niile ha bu ụzọ mụọ bụ́ ndị Jehova gburu,+ n’ihi na Jehova kpere chi ha dị iche iche ikpe ma taa ha ahụhụ.+
5 Ndị Izrel si na Ramesis pụọ gaa maa ụlọikwuu na Sọkọt.+ 6 Ha wee si na Sọkọt pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Itam,+ n’ebe ala ịkpa ahụ jedebere. 7 Ha sizi n’Itam pụọ, tụgharịa gawa Paịhahaịrọt, nke chere Bel-zifọn ihu.+ Ha wee maa ụlọikwuu n’ihu Migdọl.+ 8 Ha mechara si na Paịhahaịrọt pụọ wee si n’etiti oké osimiri gafere+ banye n’ala ịkpa.+ Ha gara ije ụbọchị atọ n’ala ịkpa Itam+ wee maa ụlọikwuu na Mera.+
9 Ha sizi na Mera pụọ bịarute Ilim. N’Ilim, e nwere isi iyi iri na abụọ na nkwụ iri asaa, ha wee maa ụlọikwuu n’ebe ahụ.+ 10 Ha sizi n’Ilim pụọ gaa maa ụlọikwuu n’akụkụ Oké Osimiri Uhie. 11 Ha mechara si n’Oké Osimiri Uhie pụọ gaa maa ụlọikwuu n’ala ịkpa Sin.+ 12 Ha sizi n’ala ịkpa Sin pụọ gaa maa ụlọikwuu na Dọfka. 13 Ha mechara si na Dọfka pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Elọsh. 14 Ha sizi n’Elọsh pụọ gaa maa ụlọikwuu na Refidim,+ bụ́ ebe ha na-ahụghị mmiri ha ga-aṅụ. 15 Ha mechara si na Refidim pụọ gaa maa ụlọikwuu n’ala ịkpa Saịnaị.+
16 Ha si n’ala ịkpa Saịnaị pụọ gaa maa ụlọikwuu na Kibrọt-hateeva.+ 17 Ha sizi na Kibrọt-hateeva pụọ gaa maa ụlọikwuu na Hazirọt.+ 18 Ha mechara si na Hazirọt pụọ gaa maa ụlọikwuu na Ritma. 19 Ha sizi na Ritma pụọ gaa maa ụlọikwuu na Rimọn-pirez. 20 Ha wee si na Rimọn-pirez pụọ gaa maa ụlọikwuu na Libna. 21 Ha si na Libna pụọ gaa maa ụlọikwuu na Riza. 22 Ha sizi na Riza pụọ gaa maa ụlọikwuu na Kiheleta. 23 Ha wee si na Kiheleta pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Ugwu Shifa.
24 Ha mechara si n’Ugwu Shifa pụọ gaa maa ụlọikwuu na Hareda. 25 Ha wee si na Hareda pụọ gaa maa ụlọikwuu na Makhilọt. 26 Ha sizi na Makhilọt pụọ+ gaa maa ụlọikwuu na Tehat. 27 Ha mechara si na Tehat pụọ gaa maa ụlọikwuu na Tira. 28 Ha wee si na Tira pụọ gaa maa ụlọikwuu na Mitka. 29 Ha mechara si na Mitka pụọ gaa maa ụlọikwuu na Hashmona. 30 Ha sizi na Hashmona pụọ gaa maa ụlọikwuu na Mosirọt. 31 Ha wee si na Mosirọt pụọ gaa maa ụlọikwuu na Bene-jeekan.+ 32 Ha si na Bene-jeekan pụọ gaa maa ụlọikwuu na Họọ-hagidgad. 33 Ha sizi na Họọ-hagidgad pụọ gaa maa ụlọikwuu na Jọtbata.+ 34 Ha mechara si na Jọtbata pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Abrona. 35 Ha wee si n’Abrona pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Iziọn-giba.+ 36 Ha mechara si n’Iziọn-giba pụọ gaa maa ụlọikwuu n’ala ịkpa Zin,+ ya bụ, Kedesh.
37 Ha mechara si na Kedesh pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Ugwu Họọ,+ n’ókè nke ala Ịdọm. 38 Erọn onye nchụàjà wee gbagoo n’Ugwu Họọ otú Jehova nyere ya n’iwu. Ọ nwụrụ n’ebe ahụ n’afọ nke iri anọ ndị Izrel pụtachara n’Ijipt, n’abalị mbụ n’ọnwa nke ise.+ 39 Erọn dị otu narị afọ na iri abụọ na atọ (123) mgbe ọ nwụrụ n’Ugwu Họọ.
40 Onye Kenan, bụ́ eze na-achị Erad,+ onye bi na Negeb* nke dị n’ala Kenan, wee nụ na ndị Izrel na-abịa.
41 Ka oge na-aga, ndị Izrel si n’Ugwu Họọ+ pụọ gaa maa ụlọikwuu na Zalmona. 42 Ha mechara si na Zalmona pụọ gaa maa ụlọikwuu na Punọn. 43 Ha sizi na Punọn pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Obọt.+ 44 Ha wee si n’Obọt pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Aịye-abarim, n’ókè Moab.+ 45 Ha mechara si n’Aịyim pụọ gaa maa ụlọikwuu na Daịbọn-gad.+ 46 Ha sizi na Daịbọn-gad pụọ gaa maa ụlọikwuu n’Almọn-diblateyim. 47 Ha wee si n’Almọn-diblateyim pụọ gaa maa ụlọikwuu n’ugwu ndị dị n’Abarim,+ n’ihu Nibo.+ 48 N’ikpeazụ, ha si n’ugwu ndị dị n’Abarim pụọ gaa maa ụlọikwuu n’ọzara Moab, n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko.+ 49 Ha wee biri n’ụlọikwuu n’akụkụ Osimiri Jọdan malite na Bet-jeshimọt ruo n’Ebel-shitim+ nke dị n’ọzara Moab.
50 Jehova gwara Mosis okwu n’ọzara Moab, n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko, sị: 51 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Unu ga-agafe Osimiri Jọdan ka unu banye n’ala Kenan.+ 52 Chụpụnụ ndị niile bi n’ala ahụ, bibiekwanụ nkume niile ha tụrụ ihe na ha+ nakwa arụsị ha niile ha kpụrụ akpụ.+ Kwatụchaanụ ebe niile dị elu ha na-anọ efe chi ụgha ha.+ 53 Unu ga-eweghara ala ahụ ma biri na ya n’ihi na m ga-enye unu ala ahụ ka ọ bụrụ nke unu.+ 54 Unu ga-efe nza keere+ ezinụlọ unu dị iche iche ala ahụ ka ọ bụrụ nke unu. Unu ga-ekenye ndị dị ọtụtụ ala buru ibu, kenye ndị na-adịghị ọtụtụ ala na-ebughị ibu.+ Ala ọ bụla nza maara onye ọ bụla ka onye ahụ ga-eketa. Unu ga-eketa ala unu n’ebe e kenyere ebo nna unu hà ala.+
55 “‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị bi n’ala ahụ,+ ndị unu hapụrụ ka ha nọrọ ga-adị ka ogwu nke na-arụkpọ unu anya ma na-ama unu n’ahụ́.* Ha ga-emesi unu ike n’ala unu ga-ebi.+ 56 M ga-emekwa unu ihe m bu n’obi ime ha.’”+
34 Jehova gwakwara Mosis, sị: 2 “Gwa ndị Izrel ihe ndị a m na-agwa gị: ‘Mgbe unu banyere n’ala Kenan,+ bụ́ ala a ga-ekere unu ka ọ bụrụ nke unu, ebe ndị a ga-abụ ókè ala Kenan ahụ.+
3 “‘Ókè ebe ndịda unu ga-amalite n’ala ịkpa Zin n’akụkụ Ịdọm. Ókè ebe ndịda unu n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-amalite na nsọtụ Oké Osimiri Nnu.+ 4 Ókè unu ga-echezi ihu ebe ọzọ gaa n’ebe ndịda ụzọ e si agbago Akrabim+ wee ruo Zin. Ọ ga-ejedebe na ndịda Kedesh-bania.+ Ọ ga-eru Heza-ada,+ ruokwa Azmọn. 5 Ókè ahụ ga-eche ihu ebe ọzọ n’Azmọn wee ruo na Ndagwurugwu* Ijipt. Ọ ga-ejedebe n’Oké Osimiri Mediterenian.*+
6 “‘Ókè unu n’ebe ọdịda anyanwụ ga-abụ Oké Osimiri Mediterenian* na ụsọ ya. Ọ bụ ya bụ ókè unu n’ebe ọdịda anyanwụ.+
7 “‘Ihe a ga-abụ ókè unu n’ebe ugwu: Ókè unu ga-amalite n’Oké Osimiri Mediterenian ruo n’Ugwu Họọ. 8 Ókè unu ga-amalite n’Ugwu Họọ ruo Libo-hemat.*+ Ebe ókè ahụ ga-ejedebe bụ na Zidad.+ 9 Ókè ahụ ga-erukwa Zifrọn. Ebe ọ ga-ejedebe bụ na Heza-inan.+ Ọ ga-abụ ókè unu n’ebe ugwu.
10 “‘Ókè unu n’ebe ọwụwa anyanwụ ga-amalite na Heza-inan ruo Shifam. 11 Ókè ahụ ga-esi na Shifam ruo Ribla, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Eyin. Ókè ahụ ga-agbada ma gafere mkpọda ebe ọwụwa anyanwụ Oké Osimiri Kineret.*+ 12 Ókè ahụ ga-eru n’Osimiri Jọdan. Ebe ọ ga-ejedebe bụ n’Oké Osimiri Nnu.+ Ọ bụ ya bụ ala unu+ na ókè ya niile gbaa gburugburu.’”
13 Mosis wee gwa ndị Izrel, sị: “Ọ bụ ala a ka unu ga-efe nza kee ka ọ bụrụ nke unu,+ otú Jehova nyere n’iwu ka e keere ebo itoolu na ọkara. 14 N’ihi na ebo ụmụ Ruben n’ọnụmara n’ọnụmara na ebo ụmụ Gad n’ọnụmara n’ọnụmara nakwa ọkara ebo Manase enwetala ala nke ha.+ 15 Ebo abụọ na ọkara ahụ enwetala ala nke ha ná mpaghara Osimiri Jọdan n’akụkụ Jeriko, n’ebe ọwụwa anyanwụ.”+
16 Jehova gwakwara Mosis, sị: 17 “Ihe a bụ aha ụmụ nwoke ndị ga-ekere unu ala unu ga-ebi na ya: Elieza+ onye nchụàjà na Joshụa+ nwa Nọn. 18 Unu ga-akpọrọ otu onyeisi n’ebo nke ọ bụla ka ha nye aka kee ala ahụ ka ọ bụrụ nke unu.+ 19 Ihe a bụ aha ụmụ nwoke ndị ahụ: n’ebo Juda,+ Keleb+ nwa Jefune; 20 n’ebo ụmụ Simiọn,+ Shemuel nwa Amaịhọd; 21 n’ebo Benjamin,+ Elaịdad nwa Kislọn; 22 n’ebo ụmụ Dan,+ Bọkaị nwa Jọglaị, onye bụ́ onyeisi; 23 n’ime ụmụ Josef+ ndị si n’ebo ụmụ Manase,+ Haniel nwa Ịfọd, onye bụ́ onyeisi; 24 n’ebo ụmụ Ifrem,+ Kemuel nwa Shiftan, onye bụ́ onyeisi; 25 n’ebo ụmụ Zebulọn,+ Elizefan nwa Panak, onye bụ́ onyeisi; 26 n’ebo ụmụ Ịsaka,+ Paltiel nwa Azan, onye bụ́ onyeisi; 27 n’ebo ụmụ Asha,+ Ahaịhọd nwa Shilomaị, onye bụ́ onyeisi; 28 n’ebo ụmụ Naftalaị,+ Pedahel nwa Amaịhọd, onye bụ́ onyeisi.” 29 Ọ bụ ndị a ka Jehova nyere iwu ka ha keere ndị Izrel ala Kenan.+
35 Jehova wee gwa Mosis okwu n’ọzara Moab, n’akụkụ Osimiri Jọdan,+ n’ebe dị nso na Jeriko, sị: 2 “Gwa ndị Izrel ka ha si n’ala ha ga-eketa nye ndị Livaị obodo ndị ha ga-ebi.+ Ha ga-enyekwa ndị Livaị ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa bụ́ ndị ga-agba obodo ndị ahụ gburugburu.+ 3 Ha ga-ebi n’obodo ndị ahụ. Ala ebe anụmanụ na-ata ahịhịa ga-abụ maka anụ ụlọ ha, maka ihe ndị ha ji elekọta ha, nakwa maka anụmanụ ha ndị ọzọ niile. 4 Ala unu ga-enye ndị Livaị ka anụmanụ ha na-ata ahịhịa ga-adị otu puku (1,000) kubit* malite ná mgbidi obodo nke ọ bụla gazuo ya gburugburu. 5 Obodo nke ọ bụla ga-adị n’etiti, unu atụọ ala dị puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ọwụwa anyanwụ ya, puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ndịda ya, puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ọdịda anyanwụ ya, nakwa puku kubit abụọ (2,000) n’ebe ugwu ya. Ala ndị ahụ ga-abụ ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa n’obodo ha dị iche iche.
6 “Obodo ndị unu ga-enye ndị Livaị ga-abụ obodo mgbaba isii,+ ndị unu ga-enye ha ka onye gburu mmadụ gbaga na ha.+ Unu ga-enyekwa ha obodo iri anọ na abụọ ọzọ. 7 Obodo niile unu ga-enye ndị Livaị ga-adị iri anọ na asatọ, ha na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.+ 8 Unu ga-esi n’ala ndị Izrel ga-eketa nye ha obodo ndị ahụ.+ Unu ga-anara ndị dị ọtụtụ ọtụtụ obodo, narakwa ndị dị ole na ole obodo ole na ole.+ Otú ala ebo nke ọ bụla ga-eketa ga-aha ka ha ga-eji mara obodo ole ha ga-enye ndị Livaị.”
9 Jehova gwakwara Mosis, sị: 10 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Unu ga-agafe Osimiri Jọdan ka unu banye n’ala Kenan.+ 11 Họrọnụ obodo ndị ga-adịrị unu mfe iru ka ha bụrụ obodo mgbaba, ebe onye gburu mmadụ* n’amaghị ụma ga-agbaga.+ 12 Obodo ndị ahụ ga-abụrụ unu ebe onye gburu mmadụ ga-agbaga, ka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ+ ghara igbu onye ahụ ruo mgbe nzukọ unu ga-ekpe ya ikpe.+ 13 Ọ bụ uru obodo mgbaba isii ahụ unu ga-ahọrọ ga-abara unu. 14 Unu ga-ahọrọ obodo atọ n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan,+ họrọkwa obodo atọ n’ala Kenan+ ka ha bụrụ obodo mgbaba. 15 Obodo isii ndị a ga-abụrụ ndị Izrel, onye mbịarambịa,+ na onye binyeere ha ebe mgbaba, ebe onye ọ bụla gburu mmadụ* n’amaghị ụma ga-agbaga.+
16 “‘Ma ọ bụrụ na ọ kụrụ ya ígwè, ya anwụọ, o gburu mmadụ.* A ga-egburịrị onye ahụ gburu mmadụ.+ 17 Ọ bụrụ na ọ tụrụ ya nkume nke nwere ike igbu mmadụ, ya anwụọ, o gburu mmadụ.* A ga-egburịrị onye ahụ gburu mmadụ. 18 Ọ bụrụ osisi nke nwere ike igbu mmadụ ka ọ kụrụ ya, ya anwụọ, o gburu mmadụ.* A ga-egburịrị onye ahụ gburu mmadụ.
19 “‘Ọ bụ onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ga-egbu onye ahụ gburu mmadụ.* Ọ bụ yanwa ga-egbu ya ma o zute ya. 20 Ọ bụrụ na ọ kwara ya aka maka na ọ kpọrọ ya asị ma ọ bụkwanụ tụọ ya ihe maka na o buuru ya iwe n’obi, ya anwụọ,+ 21 ma ọ bụ, ọ bụrụ na o ji aka tigbuo ya maka na ọ kpọrọ ya asị, a ga-egburịrị onye ahụ tigburu ya. O gburu mmadụ.* Onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ga-egbu onye ahụ gburu mmadụ ma o zute ya.
22 “‘Ma ọ bụrụ na ọ kwara ya aka na mberede, ọ bụghịkwa maka na ọ kpọrọ ya asị, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ tụrụ ya ihe n’eburughị ya iwe n’obi,+ 23 ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ hụghị ya mgbe ọ tụrụ nkume, nkume ahụ atụgbuo onye ahụ, ma ọ bụghị na ọ bụ onye iro ya ma ọ bụ na ọ chọrọ imerụ ya ahụ́, 24 nzukọ unu ga-esoro ntụziaka ndị a kpeere onye ahụ gburu mmadụ na onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ikpe.+ 25 Nzukọ unu ga-anapụta onye ahụ gburu mmadụ n’aka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ma kpọghachi ya n’obodo mgbaba ọ gbagara. Ọ ga-ebi ebe ahụ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà e tere mmanụ nsọ nwụrụ.+
26 “‘Ma ọ bụrụ na onye ahụ gburu mmadụ agafee ókè obodo mgbaba ọ gbagara, 27 onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ewee hụ onye ahụ gburu mmadụ n’ebe na-esoghị n’obodo ahụ ọ gbagara wee gbuo ya, ikpe ọbara amaghị ya. 28 N’ihi na onye ahụ gburu mmadụ ga-ebirịrị n’obodo ọ gbagara ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ. Ma nnukwu onye nchụàjà nwụọ, o nwere ike ịlaghachi n’ala ya.+ 29 Ọ bụ iwu ndị a ka unu ga-eji na-ekpe ikpe n’ọgbọ unu niile n’ebe niile unu ga-ebi.
30 “‘A ga-egbu onye ọ bụla gburu mmadụ*+ ma ndị akaebe gbaa akaebe na o gburu mmadụ.+ Ma, a gaghị egbu mmadụ* ma ọ bụrụ naanị otu onye gbara akaebe. 31 Unu anarala ihe a ga-eji gbapụta onye gburu mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ kwesịrị ịnwụ, n’ihi na a ga-egburịrị ya.+ 32 Unu anarala ihe a ga-eji gbapụta onye gbagara n’obodo mgbaba, ka e wee hapụ ya ka ọ gaa biri n’ala ya tupu nnukwu onye nchụàjà anwụọ.
33 “‘Unu emerụla ala unu bi na ya n’ihi na igbu mmadụ* na-emerụ ala.+ E wepụ igbu onye gburu mmadụ,* e nweghị otú ọzọ e nwere ike isi mee ka ala e merụrụ dị ọcha.+ 34 Unu emerụla ala unu bi na ya, bụ́ ebe m bi; n’ihi na mụnwa, bụ́ Jehova, binyeere ndị Izrel.’”+
36 Ndị isi ezinụlọ ụmụ Gilied nwa Mekia,+ nwa nwa Manase, bụ́ ndị si n’ezinụlọ ụmụ Josef, bịara gwa Mosis na ndị isi, ya bụ, ndị isi ọnụmara dị iche iche e nwere n’Izrel okwu. 2 Ha sịrị: “Onyenwe anyị, Jehova nyere gị iwu ka i fee nza nye ndị Izrel ala+ ha ga-eketa. Jehova nyekwara gịnwa bụ́ onyenwe anyị iwu ka o nye ụmụ nwaanyị Zelofehad mụrụ ala nwanne anyị nwoke, bụ́ Zelofehad, kwesịrị iketa.+ 3 Ọ bụrụ na ụmụ nwoke ndị si n’ebo ọzọ alụọ ụmụ nwaanyị a, ala ụmụ nwaanyị a ga-eketa n’ala nna anyị hà ga-abụzi nke ebo ụmụ nwoke lụrụ ha si. Ala ụmụ nwaanyị a agaghịzi eso n’ala e fere nza kenye anyị. 4 Mgbe afọ Nnwere Onwe*+ ndị Izrel ga-eru, ala ụmụ nwaanyị a ga-eketa ga-abụzi nke ebo ebe ha lụrụ di. Ihe a ga-eme ka ala ebo nna anyị hà ga-eketa bụrụzie nke ndị ọzọ.”
5 Mosis wee gwa ndị Izrel ihe Jehova nyere n’iwu. Ọ sịrị: “Ihe ebo ụmụ Josef kwuru bụ eziokwu. 6 Ihe a bụ ihe Jehova nyere n’iwu ka ụmụ Zelofehad mee: ‘Ha nwere ike ịlụ onye ọ bụla ha chọrọ ịlụ. Ma, ọ ga-abụ ndị si n’ezinụlọ e nwere n’ebo nna ha ka ha ga-alụ. 7 E nweghị ala ndị Izrel nke ga-esi n’otu ebo gafeere ebo ọzọ n’ihi na ndị Izrel ekwesịghị ịhapụ ala ebo ndị nna nna ha ketara. 8 Nwaanyị ọ bụla ketara ala n’ebo ndị e nwere n’Izrel kwesịrị ịlụ onye si n’ezinụlọ ebo nna ya,+ ka ndị Izrel ghara ịhapụ ala ndị nna nna ha ketara. 9 E nweghị ala ga-esi n’otu ebo gafeere ebo ọzọ, n’ihi na ebo nke ọ bụla e nwere n’Izrel ekwesịghị ịhapụ ala o ketara.’”
10 Ụmụ nwaanyị Zelofehad mere nnọọ otú Jehova nyere Mosis n’iwu.+ 11 Mala, Teza, Họgla, Milka, na Noa, bụ́ ụmụ Zelofehad,+ lụrụ ụmụ ụmụnne nna ha. 12 Ha lụrụ ụmụ nwoke ndị si n’ezinụlọ ụmụ Manase nwa Josef ka ala ha ketara wee dịgide n’ebo ezinụlọ nna ha.
13 Ihe ndị a bụ ihe ndị Jehova kpebiri na iwu ndị o si n’ọnụ Mosis nye ndị Izrel n’ọzara Moab, n’akụkụ Osimiri Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko.+
Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”
Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla.”
Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”
Na Hibru, “ụmụ.”
Na Hibru, “chere ọkụ.”
Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.
Na Hibru, “nwa mbụ ọ bụla meghere akpa nwa.”
Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “shekel dị nsọ.”
Otu gira bụ gram 0.57. Gụọ B14.
Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “ntụ ya na abụba gwakọtara,” ya bụ, abụba si n’àjà ndị a chụrụ.
Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
Ma ọ bụ “ákwà ọnụ ụzọ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “Ha.”
Na Hibru, “ha.”
O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu ebe a bụ ma ọ bụrụ na onye o mejọrọ anwụọla.
O nwere ike ịbụ onye nchụàjà ka a na-ekwu.
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 2.2. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “kemgbe ị nọ n’okpuru di gị.”
Na Hibru, “iyi nke ya na ọbụbụ ọnụ so.”
O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị.
Ma ọ bụ “mịkpọọ.” O nwere ike ịpụta na nwaanyị ahụ agaghịzi amụ nwa.
O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị.
Ma ọ bụ “mịkpọọ.” O nwere ike ịpụta na nwaanyị ahụ agaghịzi amụ nwa.
Ma ọ bụ “Ka ọ dị otú ahụ! Ka ọ dị otú ahụ!”
O nwere ike ịbụ na ihe a na-ekwu bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị.
Ma ọ bụ “ga-amịkpọ.” O nwere ike ịpụta na nwaanyị ahụ agaghịzi amụ nwa.
Hibru na·zir′. Ọ pụtara “Onye E Wepụtara Iche; Onye E Nyefere Chineke.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “merụọ isi o ji bụrụ onye Naziraịt.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.
O nwere ike ịbụ na otú ọ ga-esi eme ya bụ ịhapụ ntutu isi ya ka o bidokwa towe.
Ma ọ bụ “isi o ji bụrụ onye Naziraịt.”
Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”
Na Hibru, “Ka Jehova mee ka ihu ya nwuoro unu ìhè.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”
Ma ọ bụ “obere efere.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Na Hibru, “ya.”
Na Hibru, “igbe Ihe Àmà.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “oriọna.”
Ma ọ bụ “ihe e ji adọsa oriọna.”
Na Hibru, “ga-efegharị,” ya bụ, mee ka ha gaa ihu na azụ.
Na Hibru, “fegharịa,” ya bụ, mee ka ha gaa ihu na azụ.
Na Hibru, “fegharịa,” ya bụ, mee ka ha gaa ihu na azụ.
Ma ọ bụ “nwa mbụ ọ bụla meghere akpa nwa.”
Na Hibru, “fegharịrị,” ya bụ, mee ka ha gaa ihu na azụ.
O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.
O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi bụ́ mmadụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi bụ́ mmadụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.
Na Hibru, “a ga-esi ná ndị ya gbupụ mkpụrụ obi ahụ.”
Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”
Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”
Ya bụ, Jetro.
Ma ọ bụ “Ị ga-abụ anya anyị.”
Tabera pụtara “Nnukwu Ọkụ.”
O nwere ike ịbụ ndị na-abụghị ndị Izrel so ha.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “gọm.”
Na Hibru, “Aka Jehova ọ̀ dị mkpụmkpụ?”
Ma ọ bụ “malitere ibu amụma.”
Ya bụ, n’ụlọikwuu nzute.
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Homa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu homa bụ lita 220. Gụọ B14.
O nwere ike ịbụ na ha nọ na-eme ihe a ka anụ nnụnụ ndị ahụ kpọọ.
Kibrọt-hateeva pụtara “Ebe E Liri Ndị Akpịrị Ogologo.”
Na Hibru, “N’ụlọ m niile, ọ na-egosi na e kwesịrị ịtụkwasị ya obi.”
Na Hibru, “ọnụ na ọnụ.”
Ma ọ bụ “Jehoshụa.” Ọ pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Ma ọ bụ “n’ebe e si abanye Hemat.”
Eshkọl pụtara “Ụyọkọ Mkpụrụ Osisi Vain.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “ndị bụ́ ụmụ.”
Ma ọ bụ “ịtamu ntamu n’ihi.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Na Hibru, “n’ihi na ha bụụrụ anyị achịcha.”
Ma ọ bụ “ihe àmà niile m mere.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya ya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche nke.”
Ma ọ bụ “ihe àmà ndị m mere.”
Na Hibru, “na Keleb nwere mmụọ dị iche.”
Ma ọ bụ “ntamu a ha na-atamu n’ihi m.”
Ma ọ bụ “tamuru ntamu n’ihi m.”
Na Hibru, “maka na unu gbara akwụna.”
Ma ọ bụ “ihe ịbụ onye iro m pụtara.”
Ma ọ bụ “tamuwe ntamu n’ihi ya.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 2.2. Gụọ B14.
Hin bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu hin bụ lita 3.67. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Na Hibru, “achịcha.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “A ga-esi ná ndị ya gbupụ ya.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “na-atamu ntamu n’ihi ya.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Ma ọ bụ “ime ka ọ̀ bụ gị nwe anyị?”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
O nwere ike ịbụ na ihe ha na-ekwu bụ na Mosis chọrọ ka ha sowe ya ka ndị ìsì.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Na Hibru, “Chineke nke mmụọ anụ ahụ́ niile.”
Na Hibru, “meghee ọnụ ya.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “meghee ọnụ ya.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “E wee si n’ọgbakọ ahụ bibie ha.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Na Hibru, “onye mbịarambịa.”
Ma ọ bụ “ịtamu ntamu n’ihi.”
Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Na Hibru, “Ihe Àmà.”
Ma ọ bụ “ịtamu ntamu n’ihi m.”
Na Hibru, “n’ụlọikwuu Ihe Àmà.”
Na Hibru, “n’ụlọikwuu Ihe Àmà.”
Na Hibru, “Ihe Àmà.”
Ma ọ bụ, “ịtamu ntamu n’ihi m.”
Na Hibru, “ụlọikwuu Ihe Àmà.”
Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.
Na Hibru, “Onye mbịarambịa ọ bụla,” ya bụ, nwoke na-esighị n’ezinụlọ Erọn.
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ya bụ, ihe ọ bụla e dooro Chineke nsọ, bụ́ ihe e nyere Chineke nke a na-enweghị ike ịgbara agbara.
Na Hibru, “nke anụ ahụ́ niile.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “e jiri shekel dị nsọ.”
Otu gira bụ gram 0.57. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “gburugburu obi; mkpunala.”
Na Hibru, “ọgbụgba ndụ nnu.”
Ya bụ, ụmụ anụmanụ ha nakwa ihe ndị ha nwetara n’ubi.
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “ozu mkpụrụ obi ọ bụla bụ́ mmadụ.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “A ga-egbupụ mkpụrụ obi ahụ n’Izrel.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ndị.”
Na Hibru, “Ọ ga-asachapụ ya mmehie.”
Na Hibru, “a ga-egbupụ mkpụrụ obi ahụ n’ọgbakọ ahụ.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”
Meriba pụtara “Esemokwu.”
Ma ọ bụ “e wee doo ya nsọ n’ihu ha.”
Na Hibru, “ụbọchị.”
Ya bụ, okporo ụzọ awara awara.
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Họma pụtara “Ibibi Ihe.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
O nwere ike ịbụ, “ọzara; ala ịkpa.”
Ya bụ, okporo ụzọ awara awara.
Ma ọ bụ “gbara ya gburugburu.”
Ma ọ bụ “gbara ya gburugburu.”
Na Hibru, “n’akụkụ osimiri.”
Na Hibru, “nne jakị.”
Na Hibru, “meghere ọnụ nne jakị ahụ.”
Ma ọ bụ “chụrụ ehi na atụrụ n’àjà.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “na-akwa ụta.”
Ma ọ bụ “majik.”
O nwere ike ịbụ, “ọzara; ala ịkpa.”
O nwere ike ịbụ Izrel ka a na-ekwu.
O nwere ike ịbụ, “Ụmụ ya ga-ebi.”
Ma ọ bụ “ná ngwụcha ụbọchị ndị a.”
Na Hibru, “n’ihu anyanwu.”
Na Hibru, “meghee ọnụ ya.”
Ma ọ bụ “ga-esoro aha mmadụ ole e depụtara.”
Na Hibru, “chere ọkụ.”
Na Hibru, “Chineke nke mmụọ anụ ahụ́ niile.”
Na Hibru, “nwoke mmụọ dị n’ime ya.”
Ma ọ bụ “ùgwù.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu efa bụ lita 2.2. Gụọ B14.
Hin bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu hin bụ lita 3.67. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
O nwere ike ịbụ n’agbata oge anyanwụ dara na mgbe chi bidoro iji.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Na Hibru, “ọnwa unu.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
“Mmadụ imekpa onwe ya ahụ́” pụtara na onye ahụ agaghị emere onwe ya ihe ndị o kwesịrị imere onwe ya. Ibu ọnụ so na ya.
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ma ọ bụ “àjà ísì ya na-eme ka obi jụrụ.”
Ya bụ, nwaanyị nọ na di.
Ma ọ bụ “ụlọikwuu ha a gbara ogige.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “sachapụ uwe ọ bụla mmehie.”
Ma ọ bụ “opu.”
Na Hibru, “mkpụrụ obi.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi bụ́ mmadụ.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi bụ́ mmadụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
O nwere ike ịbụ, “ka Jehova wee na-echeta ndị Izrel.”
Ma ọ bụ “rụgharịa.”
Havọt-jeya pụtara “Obodo Jeya Ndị A Mara Ụlọikwuu.”
Ma ọ bụ “gbara ya gburugburu.”
Na Hibru, “weliri aka elu.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Na Hibru, “ga-abụ ogwu n’anya unu nakwa n’akụkụ abụọ unu.”
Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Hibru, “Oké Osimiri ahụ.”
Na Hibru, “Oké Osimiri ahụ.”
Ma ọ bụ “ebe e si abanye Hemat.”
Ya bụ, ọdọ mmiri Genesaret, ma ọ bụ Oké Osimiri Galili.
Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
Ma ọ bụ “gburu ọchụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Hibru, “n’ihi na ọbara.”
Na Hibru, “ịwụfu ọbara onye wụfuru ọbara.”
Ma ọ bụ “afọ Jubili.”